Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Egbugbere Ọnụ Eziokwu Ga-eguzosi Ike Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

“Egbugbere Ọnụ Eziokwu Ga-eguzosi Ike Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

 “Egbugbere Ọnụ Eziokwu Ga-eguzosi Ike Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

DỊ KA obere ọkụ nke pụrụ ịbanye n’oké ọhịa ma repịa ya, o nwere ikike nke imebi ndụ mmadụ kpam kpam. Ọ pụrụ ịbụ nke èlù jupụtara na ya, ma ọ pụkwara ịbụ “osisi na-enye ndụ.” (Ilu 15:4) Ọnwụ na ndụ dị n’ike aka ya. (Ilu 18:21) Ikike ndị a ka akụkụ ahụ́ a dị ntakịrị, bụ́ ire anyị, nwere, bụ́ nke pụrụ inye ahụ́ dum ntụpọ. (Jems 3:5-9) Anyị bụ ndị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị na-akwa ire anyị nga.

Ná nkebi nke abụọ nke isi 12 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu, Eze Solomọn nke Izrel oge ochie na-enye ndụmọdụ bara uru bụ́ nke ga-enyere anyị aka ịkwa ire anyị nga. Site n’iji ilu ndị dị mfe ma gbaa ọkpụrụkpụ mee ihe, eze ahụ maara ihe gosiri na okwu ọnụ na-akpata ọtụtụ ihe ma na-ekpughe ọtụtụ ihe banyere àgwà nke onye na-ekwu ha. Ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke Solomọn nyere dị oké mkpa nye onye ọ bụla nke na-achọ ‘ichebe ọnụ ụzọ egbugbere ọnụ ya abụọ.’—Abụ Ọma 141:3.

‘Njehie nke Na-amata Mmadụ n’Ọnyà’

“Ná njehie nke egbugbere ọnụ ka ọnyà onye ọjọọ dị: ma onye ezi omume ga-esi n’ahụhụ pụta,” ka Solomọn na-ekwu. (Ilu 12:13) Ịgha ụgha bụ njehie nke egbugbere ọnụ bụ́ nke na-aghọrọ onye na-agha ụgha ọnyà na-egbu egbu. (Mkpughe 21:8) Emeghị ihe n’eziokwu pụrụ iyi ụzọ dị mfe isi gbanahụ ntaramahụhụ ma ọ bụ isi zere ọnọdụ ọjọọ. Ma ọ̀ bụ na otu ụgha adịghị eduga n’ọzọ? Dị nnọọ ka onye ji obere ego malite ịgba chaa chaa si abụ onye a na-adọba n’iji ego buru ibu eti ebé ka ọ na-agbalị inwetaghachi ego ndị e riri ya, onye ụgha na-ahụta onwe ya n’oge na-adịghị anya dị ka onye ọ na-esiri ike ịkwụsị ịgha ụgha.

Njehie nke egbugbere ọnụ na-emekwu ka mmadụ ma n’ọnyà n’ụdị na onye na-aghara ndị ọzọ ụgha pụrụ imesị na-aghara onwe ya ụgha. Dị ka ihe atụ, onye ụgha pụrụ ikwenye nnọọ na ya maara nnọọ ihe ma nwee ọgụgụ isi, ọ bụ ezie ọ na-amachaghị ihe n’ezie. N’ụzọ dị otú ahụ, ọ na-amalite ịbụ onye ịgha ụgha riri ahụ́. N’ezie, “ọ na-agwa onwe ya okwu ire ụtọ n’anya onwe ya, banyere ịchọpụta ajọ omume ya na ịkpọ ya asị.” (Abụ Ọma 36:2) Lee ka ịgha ụgha siworo ghọọ ọnyà! N’aka nke ọzọ, onye ezi omume agaghị etinye onwe ya n’ọnọdụ dị otú ahụ tara akpụ. Ọbụna mgbe ihe na-esiri ya ike, ọ gaghị aga ghawa ụgha.

‘Mkpụrụ nke Na-eme Ka Afọ Ju Mmadụ’

“Ekwela ka e duhie gị: Chineke abụghị onye a ga-akwa emo,” ka Pọl onyeozi na-adọ aka  ná ntị. “N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.” (Ndị Galeshia 6:7) N’ezie, ụkpụrụ a metụtara okwu ọnụ anyị nakwa omume anyị. Solomọn na-ekwu, sị: “Site ná mkpụrụ nke ọnụ onwe ya ka afọ ga-eju onye ọ bụla n’ezi ihe: ọzọ, mmeso aka mmadụ nke ọ na-emeso ibe ya, nke ahụ ka a ga-enyeghachi ya.”Ilu 12:14.

Ọnụ nke “na-ekwu okwu amamihe” na-amịpụta mkpụrụ nke na-eme ka afọ ju mmadụ. (Abụ Ọma 37:30) Amamihe chọrọ ihe ọmụma, ọ dịghịkwa mmadụ ọ bụla nke maara ihe nile. Ọ dị onye ọ bụla mkpa ige ntị na ndụmọdụ dị mma ma na-agbaso ya. “Ụzọ nke onye gbagọrọ agbagọ n’uche ya ziri ezi n’anya ya onwe ya,” ka eze Izrel na-ekwu, “ma onye na-ege ntị ndụmọdụ ka onye maara ihe bụ.”Ilu 12:15.

Jehova na-enye anyị ndụmọdụ bụ́ ịgba site n’Okwu ya na site ná nzukọ ya, na-eji akwụkwọ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ebipụta na-eme ihe. (Matiu 24:45; 2 Timoti 3:16) Lee ka o si bụrụ ihe nzuzu ịjụ ndụmọdụ dị mma ma na-esi ọnwụ ịnọgide na-eme ihe masịrị anyị! Anyị “aghaghị ịdị ngwa n’ịnụ ihe” mgbe Jehova, bụ́ “Onye na-ezi mmadụ ihe ọmụma,” si n’aka ndị o ji agwa anyị okwu nye anyị ndụmọdụ.—Jems 1:19; Abụ Ọma 94:10.

Olee otú onye maara ihe na onye gbagọrọ agbagọ n’uche si emeghachi omume mgbe a kparịrị ha ma ọ bụ katọọ ha mgbe ọ na-enweghị ihe ha mere? Solomọn na-aza, sị: “Onye gbagọrọ agbagọ n’uche ya, n’otu ụbọchị ahụ ka a na-amara iwe a na-akpasu ya: ma onye na-ekpuchi nlelị ka onye nwere ezi uche bụ.”Ilu 12:16.

Mgbe a kparịrị onye gbagọrọ agbagọ n’uche, ọ na-azaghachi ozugbo n’iwe—“n’otu ụbọchị ahụ.” Ma onye maara ihe na-ekpe ekpere maka mmụọ Chineke iji nwee ike ijide onwe ya. Ọ na-ewepụta oge iji tụgharịa uche na ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke ma jiri ekele na-atụgharị uche n’okwu Jizọs bụ́: “Onye ọ bụla mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịakwara ya nke ọzọ.” (Matiu 5:39) N’ịchọ ịghara ‘iji ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ,’ onye maara ihe na-akwa ire ya nga ka ọ ghara ikwu okwu n’echeghị ya eche. (Ndị Rom 12:17) N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe anyị kpuchiri nlelị ọ bụla a pụrụ ilelị anyị, anyị na-egbochi esemokwu.

‘Ire nke Na-agwọ Mmadụ’

Njehie nke egbugbere ọnụ pụrụ imebi ọtụtụ ihe mgbe a na-ekpe ikpe. Eze Izrel na-ekwu sị: “Onye na-ekupụ ikwesị ntụkwasị obi dị ka ume na-egosi ezi omume, ma onye àmà okwu ụgha na-egosi aghụghọ.” (Ilu 12:17) Onye àmà eziokwu na-ekupụ ikwesị ntụkwasị obi dị ka ume n’ihi na akaebe ọ na-agba bụ nke a pụrụ ịdabere na ya na nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Okwu ya na-enye aka eme ka e kpee ikpe ziri ezi. N’aka nke ọzọ, onye àmà okwu ụgha bụ akpa aghụghọ ma na-akwalite ikpe na-ezighị ezi.

“O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha,” ka Solomọn gara  n’ihu ikwu, “ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Okwu ọnụ pụrụ ịdụpu ahụ́ dị ka mma agha, na-emebi ọbụbụenyi ma na-akpata nsogbu. Ma ọ bụkwanụ ọ pụrụ ịdị ụtọ ná ntị ma na-enye obi ụtọ, na-echebe ọbụbụenyi. Gịnị ọzọ ka ịkpọ iyi, iti mkpu, oké nkatọ, na ajọ mkparị bụ ma ọ́ bụghị ndụpu nke na-akpata obi mgbawa? Lee ka o si dị mma iji okwu na-ajụrụ obi bụ́ ịrịọ mgbaghara sitere n’obi emezi ihe anyị mehiere n’akụkụ a!

N’oge a pụrụ iche nke anyị na-ebi n’ime ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị bụ “ndị obi ha tiwara etiwa” na “ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Mgbe anyị ‘na-agụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà’ ma ‘na-akwado ndị na-adịghị ike,’ ọ̀ bụ na anyị adịghị eji ikike okwu ọnụ nwere ịgwọ mmadụ na-eme ihe? (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Ee, okwu ọmịiko pụrụ ịgba ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị ha na nrụgide ndị ọgbọ dị njọ na-alụ ume. Okwu e chere eche kwuo pụrụ imesighachi ndị agadi obi ike na ha dị mkpa nakwa na a hụrụ ha n’anya. N’ezie, okwu e ji obiọma kwuo pụrụ ime ka ụbọchị dịtụrụ ndị na-arịa ọrịa mma. Ọbụna ọ na-adị mfe ịnakwere ịdọ aka ná ntị mgbe e nyere ya “na mmụọ nke ịdị nwayọọ.” (Ndị Galeshia 6:1) Leekwa ka ire nke onye ji ire ya ezi ndị ga-ege ntị ozi ọma nke Alaeze Chineke si bụrụ nnọọ nke na-agwọ mmadụ!

‘Egbugbere Ọnụ nke Na-eguzosi Ike’

N’iji okwu ahụ bụ́ “egbugbere ọnụ” mee ihe dị ka ihe ya na “ire” pụtara otu ihe, Solomọn na-ekwu, sị: “Egbugbere ọnụ eziokwu ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi: ma nanị ruo otu ntabi anya ka ire okwu ụgha dị.” (Ilu 12:19) Okwu ahụ bụ́ “egbugbere ọnụ eziokwu” dị n’ụdị okwu na-egosi ihe dị otu n’asụsụ Hibru ma nwee ihe gbara ọkpụrụkpụ ọ pụtara karịa nanị ikwu eziokwu. “Ọ na-egosi àgwà ndị dị ka ịdịte aka, ịdịgide adịgide na ịbụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi,” ka otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu. “Okwu e ji ihe ndị a mara ga-eguzosi ike . . . ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na a ga-achọpụta na o kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, ebe a na-agaghị atụkwasị obi n’ire okwu ụgha . . . bụ́ nke pụrụ iduhie mmadụ ruo nwa oge ma o nweghị ike iguzosi ike mgbe a nwalere ya.”

“Aghụghọ dị n’obi ndị na-echepụta ihe ọjọọ,”  ka eze ahụ maara ihe na-ekwu, “ma ndị na-adụ ọdụ udo nwere ọṅụ.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ dịghị ajọ ihe ọ bụla ga-adakwasị onye ezi omume: ma ndị na-emebi iwu ejupụtawo n’ihe ọjọọ.”Ilu 12:20, 21.

Nanị ihe ndị na-echepụta ihe ọjọọ pụrụ ịkpata bụ ihe mgbu na nhụjuanya. N’aka nke ọzọ, ndị na-adụ ọdụ udo na-enweta afọ ojuju site n’ime ihe ziri ezi. Ha na-enwetakwa ọṅụ nke ịhụ ezi ihe ndị na-esi na ya apụta. Nke kasị mkpa, ha na-enweta ihu ọma Chineke, n’ihi na “ihe arụ n’anya Jehova ka egbugbere ọnụ okwu ụgha bụ: ma ndị ji eziokwu eme ihe bụ ndị ihe ha na-atọ Ya ụtọ.”Ilu 12:22.

‘Okwu nke Na-ekpuchi Ihe Ọmụma’

N’ịkọwakwu ihe ọzọ dị iche n’etiti onye na-akwa ire ya nga na onye na-adịghị eme otú ahụ, eze Izrel na-ekwu, sị: “Mmadụ nke nwere ezi uche na-ekpuchi ihe ọmụma: ma obi ndị nzuzu na-akpọsa uche gbagọrọ agbagọ.”Ilu 12:23.

Onye maara ihe maara mgbe o kwesịrị ikwu okwu na mgbe ọ na-ekwesịghị. Ọ na-ekpuchi ihe ọmụma site n’ịghara ịdị na-egosipụta na ya maara ihe. Nke a adịghị apụta na ọ na-ezochi ihe ọmụma ya mgbe nile. Kama nke ahụ, ọ na-eji ezi uche egosipụta ya. N’ụzọ megidere nke ahụ, onye uche ya gbagọrọ agbagọ na-adị ngwa ikwu okwu ma mee ka a mara na ọ dị nzuzu. N’ihi ya, ka anyị ghara ịdị na-ekwu oké okwu ma ghara iji ire anyị na-etu ọnụ.

N’ịga n’ihu n’igosipụta ọdịiche dị n’etiti onye maara ihe na onye nzuzu, Solomọn kwuru ihe dị ịrịba ama banyere ịdị nkọ na ịdị umengwụ. Ọ na-ekwu, sị: “Aka ndị dị nkọ ga-achị achị: ma onye umengwụ ga-adị n’usuu ndị na-efe ofufe.” (Ilu 12:24) Ịrụsi ọrụ ike pụrụ iduga n’inwe ọganihu na mmadụ inwe ike ịkwado onwe ya n’ụzọ ego, ịdị umengwụ na-eduga n’ịrụ ọrụ mmanye ma ọ bụ ịgba ohu. “Ka oge na-aga,” ka otu ọkà mmụta na-ekwu, “onye umengwụ na-aghọrọ onye dị nkọ ohu.”

‘Okwu nke Na-eme Ka A Ṅụrịa’

Eze Solomọn laghachiri n’ihe metụtara okwu ọnụ na-eburu nnọọ n’uche otú e si mee mmadụ. “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala,” ka ọ na-ekwu, “ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.”Ilu 12:25.

Nchekasị na nchegbu ndị pụrụ ime ka obi nwee oké mwute dị ọtụtụ. Ihe dị mkpa iji belata ihe mwute ahụ ma mee ka obi ṅụrịa bụ okwu agbamume dị mma nke onye nwere nghọta kwuru. Ma olee otú ndị ọzọ ga-esi mara otú anyị nweruru nchegbu ma ọ bụrụ na anyị ekwupụtaghị ya? Ee, mgbe anyị na-enwe ihe isi ike ma ọ bụ daa mbà n’obi, ọ dị mkpa ka anyị kọtụrụ onye nwere ọmịiko bụ́ onye pụrụ inye aka. Ọzọkwa, ikwupụta mmetụta na-ebelatatụ ihe mgbu nke obi. N’ihi ya, ọ dị mma ịkọtụrụ onye òtù ọlụlụ, nne ma ọ bụ nna, ma ọ bụ enyi nwere ọmịiko nke tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, ihe na-enye anyị nsogbu n’obi.

Ọ̀ dị okwu agbamume ndị dị mma karịa ndị nke dị na Bible? Ya mere, anyị aghaghị ịbịaru Chineke nso site n’iji ekele na-atụgharị uche n’Okwu ya e dere site n’ike mmụọ nsọ. Ntụgharị uche dị otú ahụ pụrụ ime ka obi nke nwere nsogbu ṅụrịa ọṅụ ma mee ka ihu onye ihe na-ewute gbasapụ. Ọbụ abụ ahụ kwetara na nke a bụ eziokwu, na-asị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachi mkpụrụ obi; ihe àmà  Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Ụkpụrụ nile Jehova tọrọ ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ: ihe Jehova nyere n’iwu na-enwu enwu, na-enye anya ìhè.”—Abụ Ọma 19:7, 8.

Ụzọ nke Na-akwụghachi Ụgwọ

N’igosi ọdịiche dị n’etiti ụzọ onye ziri ezi na nke onye ajọ omume, eze Izrel na-asị: “Onye ezi omume na-eleru ebe anụ ya na-ata nri anya, ma ụzọ nke ndị ajọ omume na-eme ka ha na-awagharị awagharị.” (Ilu 12:26, NW) Onye ezi omume na-eleru anya banyere ebe anụ ụlọ ya na-ata nri—ndị ya na ha na-akpakọrịta na ụdị ndị enyi ọ na-ahọrọ. Ọ na-eji amamihe ahọrọ ha, na-agbalịsi ike izere ndị enyi ọjọọ. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ndị ajọ omume, bụ́ ndị na-ajụ ndụmọdụ ma na-agba isi akwara ịnọgide n’ụzọ nke ha. N’ịbụ ndị e duhiere, ha na-awagharị awagharị.

Eze Solomọn kwuziri ụzọ ọzọ onye umengwụ na onye dị nkọ si dịrịta iche. “Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara ná ntá,” ka ọ na-ekwu, “ma akụ̀ mmadụ nke dị oké ọnụ ahịa dịịrị onye dị nkọ.” (Ilu 12:27) Onye umengwụ “adịghị ahụ” anụ ọ chụtara ná ntá n’ọkụ. N’ihi ya, ọ dịghị emecha ihe ọ malitere. N’aka nke ọzọ, ịdị nkọ na akụ̀ na ụba na-agakọ.

Ịdị umengwụ dị nnọọ njọ ruo n’ókè nke na Pọl onyeozi hụrụ na ọ dị mkpa idegara Ndị Kraịst ibe ya nọ na Tesalonaịka akwụkwọ ka ha na-agbazi ndị ụfọdụ nọ n’ebe ahụ bụ́ ndị “na-eje ije n’ụzọ aghara”—ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọlị, kama nke ahụ, na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha. Ndị dị otú ahụ na-akpatara ndị ọzọ oké mmefu. Ya mere Pọl nyere ha ndụmọdụ n’ihu ọha na-agba ha ume ka ha ‘na-arụ ọrụ n’ịdị nwayọọ, ka ha wee nwee ike iri nri ha onwe ha na-akpata.’ Ọ bụrụkwa na ha agaghị anakwere ndụmọdụ a siri ike, Pọl dụrụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ọdụ ka ha “wezụga” onwe ha n’ebe ndị dị otú ahụ nọ—na-ezere ha, ikekwe na-ezere iso ha enwe nnọkọ ntụrụndụ.—2 Ndị Tesalonaịka 3:6-12.

Ọ bụghị nanị ndụmọdụ Solomọn nyere banyere ịdị nkọ ka anyị ga-eburu n’uche kamakwa anyị ga-eburu n’uche ndụmọdụ ya banyere otú e kwesịrị isi jiri ire na-eme ihe. Ka anyị na-agbalịsi ike iji akụkụ ahụ́ a dị ntakịrị na-agwọ mmadụ ma na-eme ka ha na-aṅụrị ọṅụ ka anyị na-ezere njehie nke egbugbere ọnụ ma na-ebi ndụ ziri ezi. “N’ụzọ ezi omume ka ndụ dị,” ka Solomọn na-emesi anyị obi ike, “ọzọ, n’ụzọ nke okporo ụzọ ya, ọ dịghị ọnwụ dị ya.”Ilu 12:28.

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

“Onye na-ege ntị ndụmọdụ ka onye maara ihe bụ”

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

“Ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ”

[Foto dị na peeji nke 29]

Ịkọrọ enyi a tụkwasịrị obi nsogbu anyị pụrụ iweta nkasi obi

[Foto dị na peeji nke 30]

Iji ekele na-atụgharị uche n’Okwu Chineke na-eme ka obi ṅụrịa