Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nọgidenụ Na-eche Nche”!

“Nọgidenụ Na-eche Nche”!

 “Nọgidenụ Na-eche Nche”!

“Ihe m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ nile, Nọgidenụ na-eche nche.”—MAK 13:37.

1, 2. (a) Gịnị ka otu nwoke mụtara banyere iche ihe onwunwe ya nche? (b) Gịnị ka anyị na-amụta banyere ịmụrụ anya site n’ihe atụ Jizọs banyere onye ohi?

JUAN debere ihe ndị dị oké ọnụ ahịa o nwere n’ụlọ ya. O debere ha n’okpuru ihe ndina ya—n’uche ya, ọ bụ ebe kasị dị nchebe n’ụlọ ahụ. Otú ọ dị, otu abalị, ka ya na nwunye ya nọ na-ehi ụra, onye ohi batara n’ọnụ ụlọ ha nọ na-ehi ụra. O doro anya na onye ohi ahụ maara kpọmkwem ebe ọ ga-achọta ihe. O ji nwayọọ were ihe nile dị oké ọnụ ahịa dị n’okpuru ihe ndina ahụ nakwa ego Juan debere n’ime drọwa tebụl dị n’akụkụ ihe ndina ya. N’ụtụtụ echi ya, Juan chọpụtara na e zuola ya ohi. Ọ gaghị echefu ihe dị mwute nke ahụ kụziiri ya: Onye na-ehi ụra apụghị iche ihe onwunwe ya nche.

2 Otú ahụ ka ọ dị n’ụzọ ime mmụọ. Anyị apụghị ichekwa olileanya anyị na okwukwe anyị ma ọ bụrụ na anyị na-ehi ụra. Ọ bụ ya mere Pọl ji nye ndụmọdụ, sị: “Ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi, kama ka anyị mụrụ anya ma nọgide na-enwe uche ziri ezi.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:6) Iji gosi otú ịmụrụ anya dịruru mkpa, Jizọs ji onye ohi mee ihe atụ. Ọ  kọwara ihe omume ndị ga-eduga n’ọbịbịa ya dị ka Onyeikpe ma dọzie aka ná ntị, sị: “Ya mere nọrọnụ na nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. Ma maranụ otu ihe, na a sị na onyeisi ezinụlọ maararị oge nche nke onye ohi ji abịa, ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka a wabanye n’ụlọ ya. N’ihi nke a, unu onwe unu kwa, gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere, n’ihi na n’awa unu na-echeghị na ọ gaje ịbụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Matiu 24:42-44) Onye ohi adịghị ebu ụzọ ekwu oge ọ ga-abịa. Ọ na-enwe olileanya ịbịa mgbe ọ na-adịghị onye na-atụ anya ya. N’ụzọ yiri ya, dị ka Jizọs kwuru, ọgwụgwụ nke usoro ihe a ga-abịa ‘n’awa anyị na-echeghị na ọ gaje ịbụ.’

“Mụrụnụ Anya, Guzosienụ Ike n’Okwukwe”

3. Olee otú Jizọs si jiri ihe atụ nke ndị ohu na-echere nna ha ukwu nke si agbamakwụkwọ alọta, gosi mkpa ọ dị ịmụrụ anya?

3 N’okwu ndị e dekọrọ n’Oziọma Luk, Jizọs ji Ndị Kraịst tụnyere ndị ohu na-echere nna ha ukwu ka o si agbamakwụkwọ na-alọta. Ọ dị ha mkpa ịnọ na nche ka ha wee mụrụ anya, dịrị njikere ịnabata ya, mgbe ọ ga-alọta. N’ụzọ yiri nke ahụ, Jizọs sịrị: “N’oge awa nke unu na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ ka Nwa nke mmadụ na-abịa.” (Luk 12:40) Ụfọdụ ndị jewooro Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ pụrụ ịkwụsị inwe echiche nke ịdị ngwa banyere oge anyị bi n’ime ya. Ha pụrụ ọbụna ikwubi na ọgwụgwụ ka pụrụ ịdị anya. Ma echiche dị otú ahụ pụrụ ime ka anyị kwụsị itinye uche n’ihe ime mmụọ ma chee ihu n’ịchụso ihe onwunwe, bụ́ ihe ndọpụ uche ndị pụrụ ime ka anyị malite iro ụra n’ụzọ ime mmụọ.—Luk 8:14; 21:34, 35.

4. Olee ihe ga-akwali anyị ịnọ na-eche nche, oleekwa otú Jizọs si gosi nke a?

4 Anyị pụrụ ịmụta ihe ọzọ site n’ihe atụ Jizọs. Ọ bụ ezie na ndị ohu ahụ amaghị awa nna ha ukwu ga-alọta, o doro anya na ha maara abalị ọ bụ. Ọ gaara esiworo ha ike ịnọgide na-amụ anya n’abalị ahụ dum ma ọ bụrụ na ha chere na nna ha ukwu pụrụ ịlọta n’abalị ọzọ. Ma n’ezie, ha maara abalị ọ ga-alọta, nke ahụ mekwara ka obi sie ha ike ịmụrụ anya. N’ụzọ yitụrụ nke ahụ, amụma Bible na-ekpughe n’ụzọ doro anya na anyị na-ebi n’oge ọgwụgwụ; ma ha adịghị agwa anyị ụbọchị ma ọ bụ awa ọgwụgwụ ahụ n’onwe ya ga-abịa. (Matiu 24:36) Nkwere anyị kweere na ọgwụgwụ na-abịa na-enyere anyị aka ịmụrụ anya, ma, ọ bụrụ na anyị kwenyesiri ike na ụbọchị Jehova dị nso n’ezie, anyị ga-enwe ihe nkwali sikwuru nnọọ ike mere anyị ga-eji nọrọ na nche.—Zefanaịa 1:14.

5. Olee otú anyị pụrụ isi meghachi omume n’agbamume Pọl nke ‘ịmụrụ anya’?

5 Ka Pọl na-edegara Ndị Kọrint akwụkwọ, ọ gbara ha ume, sị: “Mụrụnụ anya, guzosienụ ike n’okwukwe.” (1 Ndị Kọrint 16:13) Ee, e jikọtara ịmụrụ anya na anyị iguzosi ike n’okwukwe Ndị Kraịst. Olee otú anyị pụrụ isi mụrụ anya? Ọ bụ site n’inwetakwu ihe ọmụma nke Okwu Chineke. (2 Timoti 3:14, 15) Àgwà dị mma nke ịmụ ihe onwe onye na ịgachi nzukọ anya na-enye aka  eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, iburu ụbọchị Jehova n’uche bụkwa otu akụkụ dị mkpa nke okwukwe anyị. Ya mere, anyị ịtụleghachi ihe akaebe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-egosi na anyị na-ebi nso n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe a ga-enyere anyị aka ịghara ichefu eziokwu ndị dị mkpa metụtara ọgwụgwụ ahụ na-abịanụ. * Ọ dịkwa mma ịrịba ihe ndị na-eme n’ụwa bụ́ ndị na-emezu amụma Bible ama. Otu nwanna nwoke nọ na Germany dere, sị: “Oge ọ bụla m kiriri akụkọ ụwa—agha, ala ọma jijiji, ihe ike, na mmetọ nke mbara ala anyị—ọ na-eme ka m kwenyesikwuo ike na ọgwụgwụ dị nso.”

6. N’ụzọ dị aṅaa ka Jizọs si mee ihe atụ banyere inwe ọchịchọ nke ịkwụsị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ka oge na-aga?

6 Na Mak isi 13, anyị na-ahụ ebe ọzọ e dekọrọ agbamume Jizọs nyere ụmụazụ ya ka ha mụrụ anya. Dị ka isiakwụkwọ a si kwuo, Jizọs ji ọnọdụ ha tụnyere nke onye nche ọnụ ụzọ na-echere nna ya ukwu ka o si mba ọzọ na-alọta. Onye nche ọnụ ụzọ ahụ amaghị awa nna ya ukwu ga-alọta. Ọ ghaghị ịnọgide nnọọ na-eche nche. Jizọs zoro aka n’oge nche anọ bụ́ ndị nna ukwu ahụ pụrụ ịlọta na ha. Oge nche nke anọ na-amalite n’ihe dị ka elekere anya atọ nke ụtụtụ ruo mgbe anyanwụ wara. N’oge nche nke ikpeazụ ahụ, ọ pụrụ ịdị mfe onye nche ọnụ ụzọ iro ụra. Dị ka a kọworo n’akụkọ, ndị agha na-ewere isi ụtụtụ dị ka oge kasị mma iji jide onye iro na mberede. N’ụzọ yiri nke ahụ, n’awa ikpeazụ a, bụ́ mgbe n’ụzọ ime mmụọ, ụwa nke gbara anyị gburugburu nọ n’oké ụra, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịgbasi mgba ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ iji mụrụ anya. (Ndị Rom 13:11, 12) N’ihi ya, n’ihe atụ ya, Jizọs gbara ume ugboro ugboro, sị: “Nọgidenụ na-ele anya, nọgidenụ na-amụ anya . . . Ya mere nọgidenụ na-eche nche . . . Ihe m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ nile, Nọgidenụ na-eche nche.”—Mak 13:32-37.

7. Olee ajọ ihe ize ndụ dịnụ, oleekwa agbamume anyị na-agụ ugboro ugboro n’ime Bible banyere ya?

7 Ọtụtụ ugboro n’oge Jizọs jere ozi nakwa mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, ọ gbara ume ka a nọrọ na nche. N’ezie, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ oge ọ bụla Akwụkwọ Nsọ zoro aka na mgbe ọgwụgwụ nke usoro ihe a, anyị na-ahụ ịdọ aka ná ntị ịmụrụ anya ma ọ bụ ịnọgide na-eche nche. * (Luk 12:38, 40; Mkpughe 3:2; 16:14-16) N’ụzọ doro anya, iro ụra n’ụzọ ime mmụọ bụ nnọọ ihe ize ndụ n’ezie. Ịdọ aka ná ntị ndị ahụ dị  anyị nile mkpa!—1 Ndị Kọrint 10:12; 1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 6.

Ndịozi Atọ Bụ́ Ndị Na-apụghị Ịnọgide Na-amụ Anya

8. N’ogige Getsemeni, olee otú mmadụ atọ n’ime ndịozi Jizọs si meghachi omume n’arịrịọ ọ rịọrọ ka ha nọgide na-eche nche?

8 Ịnọgide na-amụ anya na-achọ ihe karịrị inwe ebumnobi dị mma, dị ka anyị na-ahụ site n’ihe nlereanya Pita, Jems, na Jọn. Ha bụ ndị ikom atọ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe bụ́ ndị ji iguzosi ike n’ihe soro Jizọs ma nwee nnọọ mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ọ nọ. Otú o sina dị, n’abalị Naịsan 14, 33 O.A., ha amụlighị anya. Ka ha hapụrụ ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu bụ́ ebe ha nọworo mee Ememe Ngabiga, ndịozi atọ ahụ sooro Jizọs gaa n’ogige Getsemeni. N’ebe ahụ, Jizọs gwara ha, sị: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m n’ụzọ miri emi, ọbụna ruo ọnwụ. Nọrọnụ n’ebe a, nọgidekwanụ soro m na-eche nche.” (Matiu 26:38) Jizọs kpekusiri Nna ya nke eluigwe ekpere ike ugboro atọ, ọ bịakwutekwara ndị enyi ya ugboro atọ ma hụ ha ka ha nọ nnọọ na-ehi ụra.—Matiu 26:40, 43, 45.

9. Gịnị, ma eleghị anya, mere ndịozi ahụ ji roo ụra?

9 N’ihi gịnị ka ndị ikom atọ a kwesịrị ntụkwasị obi ji mechuo Jizọs ihu n’abalị ahụ? Otu ihe kpatara ya bụ ike ọgwụgwụ. Mgbe ahụ bụ ime abalị, ikekwe mgbe etiti abalị gafeworo, ‘ụra jukwara ha n’anya.’ (Matiu 26:43) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs sịrị: “Nọgidenụ na-eche nche ma na-ekpe ekpere mgbe nile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa. N’ezie, mmụọ na-anụ ọkụ, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Matiu 26:41.

10, 11. (a) N’agbanyeghị ike gwụrụ Jizọs, gịnị nyeere ya aka ịnọgide na-eche nche n’ogige Getsemeni? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe mere ndịozi atọ ahụ mgbe Jizọs gwara ha ka ha nọgide na-eche nche?

10 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ike gwụkwara Jizọs n’abalị ahụ mere ihe akụkọ. Otú ọ dị, kama ihi ụra, o ji oge ikpeazụ ndị ahụ dị oké mkpa o nweere onwe ya kpesie ekpere ike. Ụbọchị ole na ole tupu mgbe ahụ, ọ gbara ụmụazụ ya ume ikpe ekpere, na-asị: “Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe nile ka unu wee nwee ihe ịga nke ọma n’ịgbanahụ ihe ndị a nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:36; Ndị Efesọs 6:18) Ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị na ndụmọdụ Jizọs ma gbasoo ezi ihe nlereanya ya n’ihe banyere ekpere, arịrịọ sitere n’obi anyị na-arịọ Jehova ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ.

11 N’ezie, Jizọs ghọtara—nke ndị na-eso ụzọ ya na-aghọtaghị n’oge ahụ—na a ga-ejide ya n’oge na-adịghị anya ma maa ya ikpe ọnwụ. Ọ gaje inweta ọnwụnwa kasịnụ, bụ́ nke na-egbu mgbu, n’elu osisi ịta ahụhụ. Jizọs adọwo ndịozi ya aka ná ntị banyere ihe ndị a, ma ha aghọtabeghị ihe ọ nọ na-ekwu. N’ihi ya, ụra buuru ha ka ọ mụ anya na-ekpe ekpere. (Mak 14:27-31; Luk 22:15-18) Dị ka ọ dị ndịozi ahụ, anụ ahụ́ anyị adịghị ike, e nwekwara ihe ndị anyị na-amabeghị. Ma, ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ịdị ngwa nke oge anyị bi na ya, ụra pụrụ iburu anyị n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ nanị site n’ịnọ na nche ka anyị ga-amụrụ anya.

Àgwà Atọ Ndị Dị Oké Mkpa

12. Olee àgwà atọ ndị Pọl jikọtara ha na anyị inwe uche ziri ezi?

12 Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe echiche nke ịdị ngwa? Anyị ahụlarị mkpa ekpere dị na mkpa ọ dị ịnọgide na-eburu ụbọchị Jehova n’uche. Tụkwasị na nke ahụ, Pọl kwuru àgwà atọ ndị dị oké mkpa anyị kwesịrị ịzụlite. Ọ na-ekwu, sị: “Anyị onwe anyị ndị dịịrị ehihie, ka anyị nọgide na-enwe uche ziri ezi ma yiri ihe mgbochi obi ahụ bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu ígwè.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:8) Ka anyị tụlee n’ụzọ dị mkpirikpi òkè okwukwe, olileanya, na ịhụnanya na-ekere n’anyị ịnọgide na-amụ anya n’ụzọ ime mmụọ.

13. Òkè dị aṅaa ka okwukwe na-ekere n’ime ka anyị nọgide na-eche nche?

13 Anyị aghaghị inwe okwukwe siri ike na Jehova dị adị nakwa na “ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Mmezu amụma Jizọs banyere mgbe ọgwụgwụ mezuru na nke mbụ ya na narị afọ mbụ na-eme ka okwukwe anyị nwere na ọ ga-enwe mmezu ka ukwuu n’oge anyị sikwuo ike. Okwukwe anyị na-emekwa  ka anyị nọgide na-atụsi anya ụbọchị Jehova ike, na-ejide n’aka na “[ọhụụ amụma ahụ aghaghị] ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakuk 2:3.

14. Olee otú olileanya si dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-amụrụ anya?

14 Olileanya anyị e ji n’aka dị ka “arịlịka maka mkpụrụ obi” nke na-eme ka anyị nwee ike ịtachi obi n’ihe isi ike ọbụna ma a sị na anyị aghaghị ichere mmezu nke nkwa Chineke bụ́ nke e ji n’aka. (Ndị Hibru 6:18, 19) Margaret, bụ́ nwanna nwanyị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nke dị afọ 90 na ụma bụ́ onye e mere baptizim ihe karịrị afọ 70 gara aga, na-ekweta, sị: “Mgbe di m na-anwụ n’ihi ọrịa cancer na 1963, ọ bịara dị m ka ọ̀ ga-amagbu onwe ya ma ọgwụgwụ bịa ọsọ ọsọ. Ma ugbu a, ana m aghọta na anọ m na-eche nanị banyere ọdịmma m. N’oge ahụ, anyị amatụghị otú ọrụ ahụ ga-agbasaru n’ụwa nile. Ọbụna ugbu a, a ka nwere ọtụtụ ebe ọrụ ahụ ka na-amalite amalite. Ya mere, obi dị m ụtọ na Jehova enwewo ndidi.” Pọl onyeozi na-emesi anyị obi ike, sị: “Ntachi obi . . . na-arụpụta ọnọdụ a nwapụtara anwapụta; ọnọdụ ahụ a nwapụtara anwapụta, n’aka nke ya, na-arụpụta olileanya, olileanya ahụ adịghịkwa eduga ná mmechuihu.”—Ndị Rom 5:3-5.

15. Olee otú ịhụnanya ga-esi na-akwali anyị ọbụna ma a sị na o yiri ka anyị anọwo na-echere ruo ogologo oge?

 15 Ịhụnanya Ndị Kraịst bụ àgwà pụtara ìhè n’ihi na ọ bụ isi ihe na-akwali anyị ime ihe ọ bụla anyị na-eme. Anyị na-ejere Jehova ozi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, n’agbanyeghị ihe bụ́ usoro ọgụgụ oge ya. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị agbata obi anyị nọ na-akpali anyị ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ, n’agbanyeghị ogologo oge ọ ga-abụ uche Chineke ka anyị mee otú ahụ nakwa n’agbanyeghị ugboro ole anyị na-aga eme nkwusa n’otu ụlọ. Dị ka Pọl dere, “ihe ndị fọdụrụ . . . bụ okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a; ma nke kasị n’ime ihe ndị a bụ ịhụnanya.” (1 Ndị Kọrint 13:13) Ịhụnanya na-eme ka anyị na-atachi obi ma na-enyere anyị aka ịnọgide na-amụrụ anya. “[Ịhụnanya] na-enwe olileanya ihe nile, na-atachiri ihe nile obi. Ịhụnanya adịghị ada ada.”—1 Ndị Kọrint 13:7, 8.

“Nọgide Na-ejidesi Ihe I Nwere Ike”

16. Kama ịkụda aka, olee àgwà anyị kwesịrị ịzụlite?

16 Anyị na-ebi n’oge dị mkpa mgbe ihe ndị na-eme n’ụwa na-echetara anyị n’esepụghị aka na anyị na-ebi n’akụkụ ikpeazụ nke ụbọchị ikpeazụ a. (2 Timoti 3:1-5) Ugbu a abụghị oge ịkụda aka kama ọ bụ oge ‘ịnọgide na-ejidesi ihe anyị nwere ike.’ (Mkpughe 3:11) Site ‘n’ịnọ na nche n’ihe metụtara ekpere’ na site n’ịzụlite okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, anyị ga-egosipụta na anyị dị njikere n’oge ule. (1 Pita 4:7) Anyị nwere ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị. Ịnọ na-eme ihe omume ndị na-egosi nsọpụrụ Chineke mgbe nile ga-enyere anyị aka ịnọgide na-amụrụ anya nke ọma.—2 Pita 3:11.

17. (a) N’ihi gịnị ka inwe ndakpọ olileanya mgbe ụfọdụ na-ejighị kwesị ịkụda anyị mmụọ? (Lee igbe dị na peeji nke 21.) (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jehova, ngọzi dịkwa aṅaa na-echere ndị mere otú ahụ?

17 “Òkè m bụ Jehova,” ka Jeremaịa dere, “n’ihi nke a ka m ga-echere Ya. Jehova dị mma n’ebe ndị na-ele anya Ya nọ, Ọ dị mma n’ebe mkpụrụ obi nke na-achọ Ya nọ. Ọ dị mma ka mmadụ chere nzọpụta Jehova, derekwa duu n’ichere ya.” (Abụ Ákwá 3:24-26) Ụfọdụ n’ime anyị anọwo na-echere ruo nanị obere oge. Ndị ọzọ echerewo ruo ọtụtụ afọ iji hụ nzọpụta Jehova. Otú ọ dị, lee ka oge nchere a si dị mkpụmkpụ ma e jiri ya tụnyere mgbe ebighị ebi nke dị n’ihu! (2 Ndị Kọrint 4:16-18) Ka anyị na-echerekwa ka oge Jehova ruo, anyị pụrụ ịzụlite àgwà Ndị Kraịst ndị dị oké mkpa ma nyere ndị ọzọ aka iji oge ndidi Jehova mee ihe ma nakwere eziokwu ahụ. Ya mere, ka anyị nile nọgide na-eche nche. Ka anyị ṅomie Jehova ma na-enwe ndidi, na-enwe ekele maka olileanya ahụ o nyeworo anyị. Ka anyị jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-anọ na nche, ka anyị jidesie olileanya nke ndụ ebighị ebi aka ike. Mgbe ahụ, anyị ga-ejide n’aka na nkwa amụma a ga-emezu n’ebe anyị nọ: “[Jehova] ga-ebulikwa gị inweta ala: mgbe a na-ebipụ ndị na-emebi iwu, ị ga-ahụ.”—Abụ Ọma 37:34.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ pụrụ ịbụ ihe enyemaka ịtụleghachi usoro ihe àmà isii ndị na-egosi na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ” bụ́ ndị e depụtara na peeji nke 12-13 nke Ụlọ Nche, January 15, 2000.—2 Timoti 3:1.

^ par. 7 Ka ọ na-ekwu banyere ngwaa Grik a sụgharịrị ịbụ “nọgidenụ na-amụ anya,” onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ W. E. Vine na-akọwa na ọ pụtara n’ụzọ nkịtị, ‘ịchụ ụra,’ ma “na-egosi, ọ bụghị ịmụ anya nkịtị, kama ịmụ anya nke ndị nwere ihe ha bu n’uche.”

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú anyị pụrụ isi mee ka nkwenye anyị kwenyere na ọgwụgwụ usoro ihe a dị nso sikwuo ike?

• Gịnị ka a pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Pita, Jems, na Jọn?

• Olee àgwà atọ ndị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-eche nche n’ụzọ ime mmụọ?

• N’ihi gịnị ka ugbu a ji bụrụ oge ‘ịnọgide na-ejidesi ihe anyị nwere ike’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]

“Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Onye ahụ Bụ nke Na-echere.”—Daniel 12:12

Were ya na onye nche na-atụ anya na onye ohi na-eme atụmatụ itika ụlọ ọ na-eche nche. Chi jie, onye nche ahụ ana-ege ntị nke ọma maka ụzụ ọ bụla pụrụ igosi na onye ohi abịala. Site n’awa ruo n’awa, ya ana-aṅa ntị, na-elegharị anya. Ọ dị mfe ịhụ otú ihe mgbaàmà ụgha—ụzụ nke osisi ikuku na-ebugharị ma ọ bụ ụda ihe nwamba kwaturu—pụrụ isi megharịa ya anya.—Luk 12:39, 40.

Ihe yiri nke ahụ pụrụ ime ndị “na-echeresi ike maka mkpughe nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 1:7) Ndịozi chere na Jizọs ‘ga-eweghachi alaeze ahụ n’Izrel’ n’oge na-adịghị anya a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ. (Ọrụ 1:6) Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, a ghaghị ichetara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka na ọnụnọ Jizọs bụ n’oge ka dị n’ihu. (2 Ndị Tesalonaịka 2:3, 8) N’agbanyeghị nke ahụ, ọhụhụ ha na-ahụghị ihe ha tụrụ anya ya banyere ụbọchị Jehova emeghị ka ụmụazụ Jizọs nke oge mbụ ahụ gbahapụ ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ.—Matiu 7:13.

N’oge anyị, inwe ndakpọ olileanya n’ihi na o yiri anyị ka ọgwụgwụ nke usoro ihe a ọ̀ na-anọ ọdụ, ekwesịghị ime ka anyị kwụsị ịnọ na nche. Ihe mgbaàmà ụgha pụrụ imegharị onye nche mụ anya anya, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ ghaghị ịnọgide na-eche nche! Nke ahụ bụ ọrụ ya! Otú ahụ ka ọ dị n’ebe Ndị Kraịst nọ.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ì kwenyesiri ike na ụbọchị Jehova dị nso?

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Nzukọ, ekpere, na àgwà dị mma nke ịmụ ihe na-enyere anyị aka ịnọgide na-eche nche

[Foto dị na peeji nke 22]

Dị ka Margaret, ka anyị jiri ndidi nọgide na-echesi nche ike