Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụrụnụ Anya Ugbu A Karịa Mgbe Ọ Bụla Ọzọ!

Mụrụnụ Anya Ugbu A Karịa Mgbe Ọ Bụla Ọzọ!

 Mụrụnụ Anya Ugbu A Karịa Mgbe Ọ Bụla Ọzọ!

“Ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi, kama ka anyị mụrụ anya ma nọgide na-enwe uche ziri ezi.”—1 NDỊ TESALONAỊKA 5:6.

1, 2. (a) Olee ụdị obodo Pompeii na Herculaneum bụ? (b) Olee ịdọ aka ná ntị ọtụtụ ndị bi na Pompeii na Herculaneum leghaara anya, gịnị sikwa na ya pụta?

NA NARỊ afọ mbụ nke Oge Anyị, Pompeii na Herculaneum bụ obodo abụọ bara ọgaranya dị na Rom bụ́ ndị dịdewere Ugwu Vesuvius. Ha bụụrụ ndị Rom bara ọgaranya ebe ntụrụndụ a ma ama. Ebe ndị a na-eme ihe nkiri na ha pụrụ ịba ihe karịrị otu puku mmadụ, na Pompeii kwa, e nwere otu nnukwu ọgbọ egwuregwu nke pụrụ ịba ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile bi n’obodo ahụ. Ndị na-egwupụta ihe mgbe ochie na Pompeii agụtawo ụlọ mmanya 118, ndị e ji ụfọdụ n’ime ha mere ụlọ ịgba chaa chaa ma ọ bụ ụlọ akwụna. Omume rụrụ arụ na ịhụ ihe onwunwe n’anya jupụtara n’obodo ndị ahụ, dị ka ihe ndị e sere n’ahụ́ ájá na ihe ndị ọzọ e gwupụtara na ha na-agba akaebe ya.

2 N’August 24, 79 O.A., Ugwu Vesuvius malitere ịgbawa. Ndị ọkà n’ihe banyere ugwu mgbawa kweere na mgbawa nke mbụ ya, bụ́ nke wụsasịrị nkume na ntụ n’obodo abụọ ahụ, agaghị egbochiwo ndị bi na ha ịgbapụ ma eleghị anya. N’ezie, o yiri ka ọtụtụ ndị ha mere otú ahụ. Otú ọ dị, ndị ọzọ, bụ́ ndị weere ya na ọ dịghị ihe ihe ize ndụ ahụ bụ ma ọ bụ leghara nnọọ ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị ndị ahụ anya, họọrọ ịnọgide n’ebe ahụ. E mesịa, n’ihe dị ka n’etiti abalị, nnukwu anwụrụ ọkụ, nkume ukwu na nkume nta ndị dị oké ọkụ, wụsasịrị na Herculaneum, na-eme ka ndị nile fọdụrụ n’obodo ahụ kubie ume. N’isi ụtụtụ echi ya, ihe yiri nke ahụ gburu ndị nile nọ na Pompeii. Lee ihe dị mwute aṅaghị ntị n’ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị kpatara!

Ọgwụgwụ nke Usoro Ihe Ndị Juu

3. Olee otú mbibi Jeruselem na nke Pompeii na Herculaneum si yie?

3 Ajọ mbibi e bibiri Jeruselem afọ itoolu tupu mgbe ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ mmadụ kpatara nke ahụ, karịrị nnọọ ọdachi ahụ dị egwu nke mere ka Pompeii na Herculaneum pụọ n’anya. N’ịbụ nke a kọwara dị ka “otu n’ime mwakpo ndị kasị dị egwu n’akụkọ ihe mere eme nile,” a kọrọ na ihe karịrị otu nde ndị Juu nwụrụ na ya. Otú ọ dị, dị ka ọdachi ahụ mere na Pompeii na Herculaneum, e bibighị Jeruselem n’enyeghị ịdọ aka ná ntị.

4. Olee ihe ịrịba ama Jizọs nyere n’ụzọ amụma iji dọọ ụmụazụ ya aka ná ntị na ọgwụgwụ nke otu usoro ihe na-eru nso, oleekwa otú o si mezuo nke mbụ ya na narị afọ mbụ?

4 Jizọs Kraịst ebuwo ụzọ kwuo banyere mbibi a ga-ebibi obodo ahụ, o bukwara amụma banyere ihe ndị ga-ebu ya ụzọ mee—ihe omume ndị na-enye nsogbu n’obi dị ka agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, na mmebi iwu. Ndị amụma ụgha ga-anọ n’ọrụ, ma a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa nile. (Matiu 24:4-7, 11-14) Ọ bụ ezie na okwu Jizọs na-enwe mmezu ha ka ukwuu taa, ha nwere mmezu dị nta laa azụ n’oge ahụ. A kọrọ na e nwere oké ụnwụ nri na Judia. (Ọrụ 11:28) Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus na-akọ na ala ọma jijiji mere n’ógbè Jeruselem n’oge na-adịghị anya tupu e bibie obodo ahụ. Ka ọgwụgwụ Jeruselem na-eru nso, e nwere ọgba aghara n’esepụghị aka, agha obodo n’etiti òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ndị Juu, na mgbuchapụ n’ọtụtụ obodo ndị Juu na ndị Jentaịl bikọtara ọnụ na ha. Otú o sina dị, a nọ na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ  “n’etiti ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Ndị Kọlọsi 1:23.

5, 6. (a) Olee okwu amụma Jizọs nke mezuru na 66 O.A.? (b) N’ihi gịnị ka ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụnụ mgbe e mesịrị bibie Jeruselem na 70 O.A. ji dị nnọọ ukwuu?

5 N’ikpeazụ, na 66 O.A., ndị Juu nupụụrụ Rom isi. Mgbe Cestius Gallus kpọ usuu ndị agha gbaa Jeruselem gburugburu, ụmụazụ Jizọs chetara okwu Jizọs bụ́: “Mgbe unu hụrụ Jeruselem ka usuu ndị agha mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso. Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya wezụga onwe ha, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya.” (Luk 21:20, 21) Oge eruwo isi na Jeruselem pụọ—ma olee otú a ga-esi pụọ? N’ụzọ a na-atụghị anya ya, Gallus kpọọrọ ndị agha ya laa, na-eme ka Ndị Kraịst nọ na Jeruselem na Judia nwee ohere irube isi n’okwu Jizọs ma gbaga n’ugwu.—Matiu 24:15, 16.

6 Afọ anọ ka e mesịrị, ihe dị ka n’oge Ememe Ngabiga, Ọchịagha Titus, bụ́ onye kpebisiri ike ikpochapụ nnupụisi ndị Juu, kpọọrọ ndị agha Rom lọghachi. Usuu ndị agha ya gbara Jeruselem gburugburu ma “[jiri] osisi a pịrị ọnụ wuo ihe e wusiri ike,” na-eme ka ọ ghara ikwe omume isi na ya gbapụ. (Luk 19:43, 44) N’agbanyeghị na e ji agha na-eyi ha egwu, ndị Juu si n’ebe nile n’Alaeze Ukwu Rom enubatawo Jeruselem maka Ememe Ngabiga. Ugbu a, ha atọla. Dị ka Josephus si kọọ, ọ bụ ndị ọbịa a nwere ihe ndabara ọjọọ mejupụtara ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị hụsiri anya ná nnọchibido ahụ ndị Rom mere. * Mgbe Jeruselem mesịrị daa, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ asaa nke ndị Juu nile nọ n’Alaeze Ukwu Rom lara n’iyi. Mbibi e bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya pụtara na obodo ndị Juu na usoro okpukpe ya bụ́ nke dabeere n’Iwu Mozis abịala ná njedebe. *Mak 13:1, 2.

7. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ji lanahụ mbibi Jeruselem?

7 Na 70 O.A., a gaara egbuwo Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ma ọ bụ mee ka ha bụrụ ndị ohu dị ka e mere ndị nile ọzọ nọ na Jeruselem. Otú ọ dị, dị ka ihe àmà dabeere n’akụkọ ihe mere eme na-egosi, ha ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs nyere afọ 37 tupu mgbe ahụ. Ha esiwo n’obodo ahụ pụọ ma ghara ịlọghachi azụ.

Ịdọ Aka ná Ntị Ndị Bịara n’Oge Ha Site n’Aka Ndịozi

8. Gịnị ka Pita ghọtara na ọ dị mkpa, oleekwa okwu Jizọs o bu n’uche ma eleghị anya?

8 Taa, mbibi nke ka nnọọ nke ahụ na-eru nso, bụ́ nke ga-eweta usoro ihe a dum ná njedebe. Afọ isii tupu e bibie Jeruselem, Pita onyeozi nyere ndụmọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa na nke bịara n’ezi oge bụ́ nke metụtara Ndị Kraịst nke oge anyị karịsịa, bụ́: Nọrọnụ na nche! Pita hụrụ mkpa ọ dị Ndị Kraịst ịkpali “ezi ikike iche echiche” ha ka ha wee ghara ileghara ‘ihe Onyenwe  anyị Jizọs Kraịst nyere n’iwu’ anya. (2 Pita 3:1, 2) N’ịgba Ndị Kraịst ume ịnọrọ na nche, ma eleghị anya Pita bu n’uche ihe ọ nụrụ Jizọs gwara ndịozi Ya ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ Ya: “Nọgidenụ na-ele anya, nọgidenụ na-amụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ.”—Mak 13:33.

9. (a) Àgwà dị aṅaa dị ize ndụ ka ụfọdụ pụrụ ịzụlite? (b) N’ihi gịnị ka àgwà obi abụọ ji dị nnọọ ize ndụ?

9 Taa, ụfọdụ na-eji ịkwa emo ajụ, sị: “Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị?” (2 Pita 3:3, 4) Ihe àmà na-egosi na mmadụ ndị ahụ na-eche na ọ dịbeghị ihe gbanwere n’ezie kama na ihe nile dị otú ha dịworo site n’oge e kere ụwa. Obi abụọ dị otú ahụ dị ize ndụ. Inwe obi abụọ pụrụ ime ka anyị kwụsị inwe echiche nke ịdị ngwa, na-akpali anyị ilekwasị anya n’imeju ọchịchọ onwe anyị. (Luk 21:34) Ọzọkwa, dị ka Pita mere ka ọ pụta ìhè, ndị ọkwa emo dị otú ahụ na-echezọ Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, bụ́ nke bibiri otu usoro ihe zuru ụwa ọnụ. N’ezie, ụwa gbanwere n’oge ahụ!—Jenesis 6:13, 17; 2 Pita 3:5, 6.

10. Olee okwu Pita ji na-agba ndị pụrụ ịkwụsị inwe ndidi ume?

10 Pita na-enyere ndị na-agụ akwụkwọ ya aka ịzụlite ndidi site n’ichetara ha ihe mere Chineke na-ejikarịghị eme ihe ozugbo. Nke mbụ, Pita na-ekwu, sị: “Otu ụbọchị dị ka otu puku afọ n’ebe Jehova nọ, otu puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị.” (2 Pita 3:8) Ebe Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi, ọ pụrụ ịtụle ihe nile gbara ihe gburugburu ma họrọ oge kasị mma iji mee ihe. Mgbe ahụ, Pita kwuru banyere ọchịchọ Jehova chọrọ ka ndị nọ n’ebe nile chegharịa. Ndidi Chineke bụụrụ ọtụtụ ndị gaara ala n’iyi ma a sị na o mere ihe ngwa ngwa nzọpụta. (1 Timoti 2:3, 4; 2 Pita 3:9) Otú ọ dị, ndidi Jehova adịghị apụta na ọ gaghị eme ihe ma ọlị. “Ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi,” ka Pita na-ekwu.—2 Pita 3:10.

11. Gịnị ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, oleekwa otú nke a ga-esi mee ka ụbọchị Jehova ‘gbapụ ọsọ,’ dị ka a pụrụ isi kwuo ya?

11 Ntụnyere Pita ji mee ihe kwesịrị ka a rịba ya ama. Ọ naghị adị mfe ijide ndị ohi, ma o yikarịrị ka onye nche mụ anya n’abalị dum ọ ga-ahụ  onye ohi karịa onye nke nọ na-ero ụra site n’oge ruo n’oge. Olee otú onye nche pụrụ isi mụrụ anya? Ịgagharị agagharị na-eme ka a nọrọ na nche karịa ịnọdụ ala n’abalị dum. N’ụzọ yiri nke ahụ, iji ọrụ n’aka n’ụzọ ime mmụọ ga-enyere anyị aka dị ka Ndị Kraịst ịmụrụ anya. N’ihi ya, Pita na-agba anyị ume ịnọ na-egosipụta ‘àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke’ mgbe nile. (2 Pita 3:11) Ọrụ dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ịnọgide “na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche.” Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘iburu n’uche’ bụ nke a pụrụ ịsụgharị n’ụzọ nkịtị ịbụ ‘ịgbapụ ihe ọsọ.’ (2 Pita 3:12, ihe odide ala ala peeji nke NW) N’eziokwu, anyị apụghị ịgbanwe usoro ọgụgụ oge Jehova. Ụbọchị ya ga-abịa n’awa ọ kara aka. Ma oge ga-agafe site ugbu a ruo mgbe ahụ yiri ka ọ ga-aka agwụ ngwa ngwa ma ọ bụrụ na anyị na-ejere ya ozi mgbe nile.—1 Ndị Kọrint 15:58.

12. Olee otú anyị n’otu n’otu ga-esi erite uru na ndidi Jehova?

12 N’ihi ya, a na-agba onye ọ bụla nke na-eche na ụbọchị Jehova na-anọ ọdụ ume ịṅa ntị na ndụmọdụ Pita nke iji ndidi na-echere oge Jehova kara aka. N’ezie, anyị pụrụ iji oge Chineke gbakwụnyere n’ihi ndidi ya na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịnọgide na-azụlite àgwà Ndị Kraịst ndị dị oké mkpa nakwa iso ọtụtụ ndị ọzọ na-agaraghị enwe ohere ịnụ ozi ọma ahụ ma a sị na Chineke enweghị ndidi na-ekerịta ya. Ọ bụrụ na anyị amụrụ anya, Jehova ga-ahụta anyị dị ka “ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-agbaghị ọrụ na ndị nọ n’udo” n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a. (2 Pita 3:14, 15) Lee ngọzi nke ahụ ga-abụ!

13. Olee ihe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka nke dabara adaba taa karịsịa?

13 Pọl, n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka, kwukwara banyere mkpa ọ dị ịmụrụ anya. Ọ na-adụ ọdụ, sị: “Ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi, kama ka anyị mụrụ anya ma nọgide na-enwe uche ziri ezi.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 6) Lee ka nke ahụ si dị mkpa taa, ka mbibi nke usoro ihe ụwa dum na-eru nso! Ndị na-efe Jehova ofufe bi n’ụwa nke ndị na-enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ jupụtara na ya, nke a pụkwara imetụta ha. N’ihi ya, Pọl na-adụ ọdụ, sị: “Ka anyị nọgide na-enwe uche ziri ezi ma yiri ihe mgbochi obi ahụ bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu ígwè.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:8) Ịmụchi Okwu Chineke anya na iso ụmụnna anyị na-akpachi anya ná nzukọ ga-enyere anyị aka ịgbaso ndụmọdụ Pọl na ịnọgide na-enwe echiche nke ịdị ngwa.—Matiu 16:1-3.

Ọtụtụ Nde Mmadụ Nọgidere Na-eche Nche

14. Olee ihe ndekọ na-egosi na ọtụtụ mmadụ taa na-agbaso ndụmọdụ Pita nke ịmụrụ anya?

14 È nwere ọtụtụ ndị taa na-aṅa ntị n’agbamume ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ịnọ na nche? Ee. N’ime afọ ije ozi 2002, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa 6,304,645—ihe ji pasent 3.1 karịa nke 2001—nyere ihe àmà nke ịbụ ndị nọ na nche n’ụzọ ime mmụọ site n’iji awa 1,202,381,302 gwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. Nye ha, ọrụ dị otú ahụ abụghị ihe a rụrụ iji mezuo iwu. Ọ bụ akụkụ bụ́ isi nke ndụ ha. Eduardo na Noemi bụ́ ndị nọ n’El Salvador gosipụtara àgwà ọtụtụ n’ime ha nwere.

15. Ahụmahụ dị aṅaa e si El Salvador nweta na-egosi na ọtụtụ ndị nọ na nche n’ụzọ ime mmụọ?

15 Afọ ụfọdụ gara aga, Eduardo na Noemi rịbara okwu Pọl ama, bụ́: “Ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” (1 Ndị Kọrint 7:31) Ha mere ka ndụ ha dị mfe ma banye n’ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ka oge na-aga, a gọziri ha n’ọtụtụ ụzọ, ọbụna ha kekwaara òkè n’ọrụ sekit na distrikti. N’agbanyeghị na ha nwetara nsogbu ndị siri ike, Eduardo na Noemi kwenyesiri ike na ha mere mkpebi dị mma mgbe ha chụrụ ntụsara ahụ́ nke ihe onwunwe n’àjà n’ihi ozi oge nile. Ọtụtụ n’ime ndị nkwusa 29,269—gụnyere ndị ọsụ ụzọ 2,454—n’El Salvador egosiwo mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà yiri nke ahụ, nke bụ́ ihe mere mba ahụ ji nwee mmụba dị pasent 2 n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa n’afọ gara aga.

16. Olee àgwà otu nwa okorobịa gosipụtara na Côte d’Ivoire?

16 Na Côte d’Ivoire, otu nwa okorobịa bụ́ Onye Kraịst nke degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ  gosipụtara otu àgwà ahụ: “Abụ m ohu na-eje ozi. Ma apụghị m ịgwa ụmụnna ka ha sụwa ụzọ mgbe m na-adịghị esetịpụ ezi ihe nlereanya n’onwe m. N’ihi ya, ahapụwo m ọrụ a na-akwụ m ezigbo ego na ya ma na-arụziri onwe m ọrụ, bụ́ nke nyekwuru m ohere maka ozi ahụ.” Nwa okorobịa a ghọrọ otu n’ime ndị ọsụ ụzọ 983 na-eje ozi na Côte d’Ivoire, bụ́ nke ndị nkwusa 6,701 nyere akụkọ ozi na ya n’afọ gara aga, bụ́ mmụba dị pasent 5.

17. Olee otú otu Onyeàmà na-eto eto na Belgium si gosi na ụjọ ajọ mbunobi adịghị atụ ya?

17 Ekweghị ibe nọrọ, ajọ mbunobi, na ịkpa ókè nọgidere na-akpatara ndị nkwusa Alaeze dị 24,961 na Belgium nsogbu. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-anụ ọkụ n’obi, ụjọ adịghịkwa atụ ha. Mgbe otu Onyeàmà dị afọ 16 nụrụ ka a kọwara Ndịàmà Jehova dị ka ịrọ òtù ka ha na-amụ banyere àgwà ọma n’ụlọ akwụkwọ, ọ rịọrọ ka e nye ya ike ịkọwa ihe bụ́ echiche Ndịàmà Jehova n’okwu ahụ. Site n’iji vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name na broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? mee ihe, ọ kọwara ndị Ndịàmà bụ n’ezie. A nabatara ihe ọmụma ahụ nke ọma, n’izu sochirinụ, e nyere ụmụ akwụkwọ ahụ nnwale nke ajụjụ nile a jụrụ na ya bụ banyere okpukpe Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova.

18. Olee ihe àmà na-egosi na nsogbu akụ̀ na ụba adọpụghị uche ndị nkwusa nọ n’Argentina na Mozambique n’ijere Jehova ozi?

18 Ihe ka ọtụtụ ná Ndị Kraịst aghaghị iche nsogbu ndị dị oké njọ ihu n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-agbalị ịghara ịbụ ndị a dọpụrụ uche ha. N’agbanyeghị nsogbu akụ̀ na ụba a maara nke ọma, ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke Ndịàmà dị 126,709 nyere akụkọ ozi n’Argentina n’afọ gara aga. Imerime mmadụ ka dara ogbenye na Mozambique. Otú o sina dị, a kọrọ na mmadụ 37,563 keere òkè n’ọrụ ịgba àmà ahụ, bụ́ mmụba dị pasent 4. Ndụ na-esiri ọtụtụ ndị ike n’Albania, n’agbanyeghị nke ahụ, mba ahụ nyere akụkọ ozi nke ezi mmụba dị pasent 12, na-eru ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa 2,708. N’ụzọ doro anya, ọnọdụ ndị tara akpụ adịghị egbochi mmụọ Jehova mgbe ndị ohu ya na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ụzọ.—Matiu 6:33.

19. (a) Gịnị na-enye ihe àmà na a ka nwere ọtụtụ ndị yiri atụrụ bụ́ ndị agụụ eziokwu Bible na-agụ? (b) Olee ihe ụfọdụ ndị ọzọ dị n’akụkọ mgbaafọ ahụ bụ́ ndị na-egosi na ndị ohu Jehova mụ anya n’ụzọ ime mmụọ? (Lee chaatị dị na peeji nke 12-15.)

19 Ọmụmụ Bible nke nkezi ya kwa ọnwa bụ 5,309,289 bụ́ nke e nyere akụkọ ozi ya n’ụwa nile n’afọ gara aga na-egosi na a ka nwere ọtụtụ ndị yiri atụrụ bụ́ ndị agụụ eziokwu Bible na-agụ. N’ime ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke mmadụ 15,597,746 bịara Ememe Ncheta, ihe ka ọtụtụ n’ime ha amalitebeghị ijere Jehova ozi. Ka ha nọgide na-eto eto n’ihe ọmụma na n’ịhụnanya ha nwere n’ebe ma Jehova ma òtù ụmụnna ahụ nọ. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” nọgidere na-arụpụta ihe ka ha so ụmụnna ha e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na-ejere Onye Okike ozi “ehihie na abalị n’ụlọ nsọ ya.”—Mkpughe 7:9, 15; Jọn 10:16.

Ihe A Na-amụta Site n’Ihe Mere Lọt

20. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe atụ Lọt na nwunye ya?

20 N’ezie, ọbụna ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ịkwụsịtụ inwe echiche nke ịdị ngwa. Chee banyere nwa nwanne Ebreham bụ́ Lọt. Ọ nụrụ n’ọnụ ndị mmụọ ozi abụọ bịara na nke ya na Chineke na-aga ibibi Sọdọm na Gọmọra. Akụkọ ahụ apụghị ịbụwo ihe  ijuanya nye Lọt, bụ́ “onye nwere oké mwute n’ihi mmikpu nke ndị na-eleda iwu anya mikpuru n’omume rụrụ arụ.” (2 Pita 2:7) N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ndị mmụọ ozi abụọ ahụ bịara ịkpọrọ ya pụọ na Sọdọm, ọ “nọgidere na-egbu oge.” Ọ fọrọ nke nta ka ndị mmụọ ozi ahụ dọkpụrụ ya na ezinụlọ ya adọkpụrụ pụọ n’obodo ahụ. Mgbe e mesịrị, nwunye Lọt leghaara ịdọ aka ná ntị ndị mmụọ ozi ahụ nyere ka ha ghara ile anya n’azụ anya. Àgwà ejighị ihe kpọrọ ihe ya furu ya ihe dị ukwuu. (Jenesis 19:14-17, 26, NW) “Chetanụ nwunye Lọt,” ka Jizọs dọrọ aka ná ntị.—Luk 17:32.

21. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịmụrụ anya ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ?

21 Ebelebe ahụ gburu na Pompeii na Herculaneum na ihe omume ndị gbara mbibi Jeruselem gburugburu, nakwa ihe atụ Iju Mmiri nke ụbọchị Noa na nke ụbọchị Lọt, na-egosicha mkpa ọ dị iji ịdọ aka ná ntị na-akpọrọ ihe. Dị ka ndị ohu Jehova, anyị na-amata ihe ịrịba ama nke ọgwụgwụ. (Matiu 24:3) Anyị ekewapụwo onwe anyị n’okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:4) Dị ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ, ọ dị anyị mkpa ‘iburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche.’ (2 Pita 3:12) Ee, anyị aghaghị ịmụrụ anya ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ! Olee ihe ndị anyị pụrụ ime, oleekwa àgwà ndị anyị pụrụ ịzụlite iji mụrụ anya? Isiokwu na-esonụ ga-atụle okwu ndị ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 O yikarịghị ka ndị bi na Jeruselem na narị afọ mbụ hà karịrị mmadụ 120,000. Eusebius mere atụmatụ na mmadụ 300,000 bi n’ógbè Judia gara Jeruselem maka Ememe Ngabiga nke 70 O.A. Ọ ghaghị ịbụwo na ndị ọzọ e gburu na ya si n’akụkụ ndị ọzọ nke obodo ukwu ahụ bịa.

^ par. 6 N’ezie, a bịa n’ụzọ Jehova si ele ihe anya, e ji ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dochie anya Iwu Mozis na 33 O.A.—Ndị Efesọs 2:15.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ihe merenụ nke mere ka ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nwee ike ịgbanahụ mbibi Jeruselem?

• Olee otú ndụmọdụ ndị dị n’ihe odide nke ndịozi bụ́ Pita na Pọl si enyere anyị aka ịmụrụ anya?

• Ole ndị taa na-enye ihe àmà na ha mụ nnọọ anya?

• Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe ndekọ banyere Lọt na nwunye ya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

 [Chaatị dị na peeji nke 12-15]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 2002 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

 (Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Foto dị na peeji nke 9]

Na 66 O.A., Ndị Kraịst nọ na Jeruselem ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Iji ọrụ n’aka na-enyere Ndị Kraịst aka ịmụrụ anya