Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Jọshụa Chetara

Ihe Jọshụa Chetara

 Ihe Jọshụa Chetara

“MOZIS, bụ́ ohu m, anwụrụwo,” ka Jehova kwuru, “ma ugbu a bilie, gabiga Jọdan nke a, gị onwe gị, na ndị nke a nile, ruo ala ahụ nke Mụ onwe m na-enye ha.” (Joshua 1:2) Lee ọrụ siri ike nke chere Jọshụa ihu! Ọ bụwo onye na-ejere Mozis ozi ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 40. Ugbu a, a gwara ya ka o weghara ọnọdụ nna ya ukwu ma duru ụmụ Izrel na-esikarị ike nchịkwa banye n’Ala Nkwa ahụ.

Ka Jọshụa na-eche banyere ihe chere ya ihu, eleghị anya ule ndị o cheworo ihu ma merie batara ya n’uche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe Jọshụa chetara bụụrụ ya ihe enyemaka bara oké uru n’oge ahụ, ọ pụkwara ịbụrụ Ndị Kraịst taa.

Site n’Ohu Gaa n’Ọchịagha

Ogologo oge nke ịgba ohu so n’ihe ndị Jọshụa chetara. (Ọpụpụ 1:13, 14; 2:23) Nanị ihe anyị pụrụ ime bụ ịkọ nkọ banyere kpọmkwem ahụmahụ Jọshụa nwere n’oge ahụ, ebe ọ bụ na Bible akọghị ihe nile banyere ya. Ọ pụrụ ịbụ na Jọshụa mụtara ịbụ ezigbo onye nhazi n’oge o jere ozi n’Ijipt, ọ pụkwara ịbụ na o nyere aka n’iduzi ọpụpụ nke ndị Hibru na “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” site n’ala ahụ.—Ọpụpụ 12:38.

Jọshụa si n’ezinụlọ nke ebo Ifrem. Nna nna ya bụ́ Elishama bụ onyeisi nke ebo ahụ, ihe àmà na-egosikwa na o duziri ndị agha dị 108,100 nke otu n’ime ebo atọ e kewara Izrel. (Ọnụ Ọgụgụ 1:4, 10, 16; 2:18-24; 1 Ihe E Mere 7:20, 26, 27) N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ndị Amalek wakporo Izrel n’oge na-adịghị anya ka Izrel pụtasịrị n’Ijipt, Mozis gwara Jọshụa ka o mee ndokwa ibuso ha agha. (Ọpụpụ 17:8, 9a) N’ihi gịnị ka e ji họrọ Jọshụa kama ịhọrọ, dị ka ihe atụ, nna nna ya ma ọ bụ nna ya? Otu ihe pụrụ ịkpata ya  bụ: “Dị ka onyeisi nke ebo Ifrem dị mkpa, nakwa dị ka onye a maararị nke ọma dị ka onye nwere nkà n’ịhazi ihe, na onye ndị mmadụ tụkwasịrị nnọọ obi, Mozis lere [Jọshụa] anya dị ka onye ndú kasị ruo eruo ịhọrọ na ịhazi ndị agha.”

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, mgbe a họpụtara Jọshụa, o mere nnọọ dị ka Mozis nyere n’iwu. Ọ bụ ezie na ụmụ Izrel amatụghị nke a na-akọ n’ibu agha, obi siri Jọshụa ike na Chineke ga-enyere ha aka. Ya mere, mgbe Mozis gwara ya sị, “echi mụ onwe m ga na-eguzo onwe m n’elu ugwu nta nke a, na-ejide mkpanaka Chineke n’aka m,” nke ahụ mere ka obi sie ya ike. Ọ ghaghị ịbụwo na Jọshụa chetara na Jehova ka bibisịrị usuu ndị agha kasị ike n’oge ahụ. N’echi ya, mgbe Mozis weliri aka ya elu ma mee ka ọ kwụgide ruo anwụ ọdịda, ọ dịghị onye iro ọ bụla pụrụ iguzo megide Izrel, e merikwara ndị Amalek. Mgbe e mesịrị, Jehova nyere Mozis iwu ka o dee n’akwụkwọ ma ‘mee ka ọ baa ná ntị Jọshụa,’ okwu Ya bụ́: “M ga-ehichapụsị ncheta Amalek n’okpuru eluigwe.” (Ọpụpụ 17:9-14) Ee, Jehova ga-emezurịrị nke a.

Dị Ka Onye Na-ejere Mozis Ozi

Ihe ahụ mere n’ihe banyere Amalek aghaghị ọbụna imewo ka mmekọrịta dị n’etiti Jọshụa na Mozis chikwuo anya. Jọshụa nwere ihe ùgwù nke ịbụ odibo, ma ọ bụ “onye na-ejere Mozis ozi,” “site n’oge ọ bụ okorobịa” ruo mgbe Mozis nwụrụ, bụ́ ihe dị ka afọ 40.—Ọnụ Ọgụgụ 11:28, NW.

Ọnọdụ ije ozi ahụ bụ ihe ùgwù na ibu ọrụ. Dị ka ihe atụ, eleghị anya Jọshụa so ya mgbe Mozis, Erọn, ụmụ Erọn, na mmadụ iri asaa n’ime ndị okenye Izrel gbagoro n’Ugwu Saịnaị ma hụ ọhụụ nke ebube Jehova. N’ọrụ ya dị ka oje ozi, o soro Mozis gbagoo n’elu elu ugwu ahụ ma nọrọ, dị ka ihe àmà gosiri, n’ebe dịtụ anya mgbe Mozis banyere n’igwe ojii nke na-anọchi anya ọnụnọ Jehova. N’ụzọ dị ịrịba ama, o yiri ka Jọshụa ọ nọrọ n’ugwu ahụ ruo ụbọchị 40 ehihie na abalị. O ji ikwesị ntụkwasị obi chere ruo mgbe nna ya ukwu lọghachiri, n’ihi na mgbe Mozis bu mbadamba nkume Iwu ahụ na-arịdata, Jọshụa nọ ya izute ya.—Ọpụpụ 24:1, 2, 9-18; 32:15-17.

Mgbe Izrel fesịrị nwa ehi ọlaedo ahụ ofufe, Jọshụa nọgidere na-ejere Mozis ozi n’ụlọikwuu nzute n’azụ ọmụma ụlọikwuu ahụ. N’ebe ahụ, Jehova gwara Mozis okwu ihu na ihu. Ma mgbe Mozis lọghachiri n’ọmụma ụlọikwuu ahụ, Jọshụa ‘esighị n’etiti ụlọikwuu ahụ pụọ.’ Ikekwe ọnụnọ ya n’ebe ahụ dị mkpa iji gbochie ụmụ  Izrel ịbanye n’ụlọikwuu ahụ n’ọnọdụ adịghị ọcha ha. Lee ka Jọshụa si were ibu ọrụ ahụ kpọrọ oké ihe!—Ọpụpụ 33:7, 11.

Iso Mozis kpakọrịta, bụ́ onye ji afọ 35 tọọ Jọshụa dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, aghaghị iwusiwo okwukwe Jọshụa ike nke ukwuu. A kpọwo mmekọrịta ha, “mkpakọrịta nke okenye na okorobịa, nke onye nkụzi na nwa akwụkwọ,” bụ́ nke mere ka Jọshụa bụrụ nwoke “kwụsiri ike a pụrụ ịtụkwasị obi.” Anyị enweghị ndị amụma dị ka Mozis taa, ma ndị nọ n’ọgbakọ ndị Jehova taa gụnyere ndị agadi bụ́ ndị, n’ihi ahụmahụ na ọnọdụ ime mmụọ ha, bụ́ ezi ndị na-enye ume na agbamume. Ì ji ha akpọrọ ihe? Ị̀ na-eritekwa uru site ná mkpakọrịta ha?

Onye Nledo na Kenan

Ihe omume dị oké mkpa ná ndụ Jọshụa weere ọnọdụ n’oge na-adịghị anya ka Izrel natasịrị Iwu ahụ. A họọrọ ya ịnọchite anya ebo ya n’iledo Ala Nkwa ahụ. A maara akụkọ ahụ nke ọma. Ndị nledo 12 ahụ nile kweere na ala ahụ bụ n’ezie “ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya,” dị nnọọ ka Jehova kweworo ná nkwa. Otú ọ dị, mmadụ iri ji ekwesịghị ntụkwasị obi tụọ egwu na Izrel apụghị ịchụpụ ndị bi n’ala ahụ. Ọ bụ nanị Jọshụa na Keleb gbara ndị ahụ ume ka ha ghara inupụ isi n’ihi egwu, n’ihi na Jehova ga-anọnyerịrị ha. Mgbe ha kwuru nke ahụ, nzukọ ahụ nile tamuru ntamu ma kwuo na ha ga-eji nkume tụgbuo mmadụ abụọ ahụ. Eleghị anya ha gaara eme otú ahụ ma a sị na Jehova etinyeghị aka site n’igosipụta ebube ya. N’ihi enweghị okwukwe ha, Chineke kwuru na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị Izrel site n’onye gbara afọ 20 gawa n’ihu nke ga-adị ndụ ịbanye Kenan. N’ime ha, ọ bụ nanị Jọshụa, Keleb, na ndị Livaị lanahụrụ.—Ọnụ Ọgụgụ 13:1-16, 25-29; 14:6-10, 26-30.

Ọ̀ bụ na ha nile ahụghị ọrụ dị ike nke Jehova rụrụ n’Ijipt? Gịnịzi nyeere Jọshụa aka inwe okwukwe n’enyemaka Chineke ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nwere obi abụọ? Ọ ghaghị ịbụ na Jọshụa chetara nke ọma ihe nile Jehova kweworo ná nkwa ma mezuo, tụgharịakwa uche na ha. Afọ ụfọdụ ka e mesịrị, ọ pụrụ ikwu na ‘ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova kwuru banyere Izrel. Ha nile emewo.’ (Joshua 23:14) Ya mere, Jọshụa nwere okwukwe na nkwa nile Jehova kwere banyere ọdịnihu aghaghịkwa imezu. (Ndị Hibru 11:6) Nke a kwesịrị ịkpali mmadụ ịjụ, sị: ‘Gịnị banyere m? Mgbalị m tinyeworo n’ịmụ banyere nkwa Jehova na ịtụgharị uche na ha ò mewo ka m kwenyesie ike na ha kwesịrị ntụkwasị obi? Èkweere m na Chineke pụrụ ichebe mụ na ndị ya n’oge oké mkpagbu ahụ na-abịanụ?’

Ọ bụghị nanị na Jọshụa gosipụtara okwukwe, kama o nwekwara obi ike ime ezi ihe. Ọ bụ nanị ya na Keleb guzo n’otu akụkụ, nzukọ ahụ nile kwukwara banyere iji nkume tụgbuo ha. Olee otú ọ gaara adị gị? Ụjọ ọ̀ gaara atụ gị? Ọ dịghị Jọshụa otú ahụ. Ya na Keleb jiri obi ike kwuo ihe ha kweere. Iguzosi ike n’ihe nye Jehova pụrụ ịchọ ka anyị mee otu ihe ahụ otu ụbọchị.

Akụkọ banyere ndị nledo ahụ mekwara ka anyị mata na a gbanwere aha Jọshụa. Mozis gbakwụnyere nkeji okwu nke na-anọchi anya aha Chineke n’aha mbụ ya bụ́ Hoshia, nke pụtara “Nzọpụta,” ma kpọọ ya Jehoshụa, ma ọ bụ Jọshụa—“Jehova Bụ Nzọpụta.” Septuagint sụgharịrị aha ya ịbụ “Jizọs.” (Ọnụ Ọgụgụ 13:8, 16) N’ụzọ kwekọrọ n’oké aha ahụ, Jọshụa ji obi ike kwupụta na Jehova bụ nzọpụta. Mgbanwe a a gbanwere aha Jọshụa apụghị ịbụ ihe e mere n’echebaraghị ya echiche. O gosipụtara otú Mozis si jiri àgwà Jọshụa kpọrọ ihe ma kwekọọ n’òkè pụrụ iche Jọshụa ga-ekere n’iduru ọgbọ ọhụrụ banye n’Ala Nkwa ahụ.

Ka ndị nna ha nwụsịrị, ụmụ Izrel wagharịrị n’ọzara ruo afọ 40 na-akpata ike ọgwụgwụ. Ọ dịghị ihe anyị maara banyere Jọshụa n’oge ahụ. Otú ọ dị, ọ ghaghị ịkụziworo ya ọtụtụ ihe. Eleghị anya ọ hụrụ ikpe Chineke kpere ndị nnupụisi bụ́ Kora, Detan, na Abaịram na ndị na-eso ha nakwa ndị nile tinyere aka n’ofufe rụrụ arụ nke Beal nke Peoa. Obi abụọ  adịghị ya na o wutere Jọshụa nke ukwuu ịmara na n’ihi Mozis ịghara ido aha Jehova nsọ n’ihe banyere mmiri Meriba, Mozis agajeghịkwa ịba n’ala ahụ e kwere ná nkwa.—Ọnụ Ọgụgụ 16:1-50; 20:9-13; 25:1-9.

A Họpụta Ya Dị Ka Onye Ga-anọchi Mozis

Mgbe ọnwụ Mozis na-eru nso, ọ gwara Chineke ka ọ họpụta onye ga-anọchi ya ka Izrel ghara ịdị ka “ìgwè ewu na atụrụ nke na-enweghị onye ọzụzụ.” Gịnị ka Jehova ga-eme? A ga-ahọpụta Jọshụa, bụ́ ‘nwoke nke mmụọ Chineke dị n’ime ya,’ n’ihu nzukọ ahụ nile. Ha ga na-ege ya ntị. Lee nhọpụta magburu onwe ya nke ahụ bụ! Jehova ahụwo okwukwe na ikike Jọshụa nwere. Ọ dịghị onye ọzọ pụrụ iru eru ịbụ onye ndú Izrel karịa ya. (Ọnụ Ọgụgụ 27:15-20) N’agbanyeghị nke ahụ, Mozis maara na ihe ịma aka dị ukwuu chere Jọshụa ihu. N’ihi ya, Mozis gbara onye ahụ nọchiri ya ume ‘ịdị ike, nweekwa ume,’ n’ihi na Jehova ga-anọnyere ya.—Deuterọnọmi 31:7, 8.

Chineke n’onwe ya gwaghachiri Jọshụa otu okwu agbamume ahụ, ma gbakwụnye, sị: “[Lezie] anya ime dị ka iwu ahụ nile si dị, nke Mozis, bụ́ ohu m, nyere gị n’iwu: ewezụgala onwe gị na ya n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe, ka i wee nwee uche n’ebe ọ bụla ị na-eje. Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, kama ị ga-atụgharị uche n’ime ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya: n’ihi na mgbe ahụ ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche. Ényeghị m gị iwu? Dị ike, nweekwa ume; amala jijiji, atụkwala ụjọ: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke gị, nọnyeere gị n’ebe ọ bụla ị na-eje.”—Joshua 1:7-9.

Ebe okwu Jehova gbanyere mkpọrọgwụ n’obi ya, tinyekwara ọtụtụ ahụmahụ ndị o nweworo, olee otú Jọshụa ga-esi nwee obi abụọ? Obi siri ya ike na a ghaghị imeri ala ahụ. N’ezie, a ga-enwe ihe isi ike dị iche iche, ndị nke mbụ n’ime ha bụ ịgafe Osimiri Jọdan nke tojuru etoju. Ma, Jehova n’onwe ya enyewo iwu, sị: “Bilie, gabiga Jọdan nke a.” Oleezi ihe ga-abụ nsogbu?—Joshua 1:2.

Ihe omume ndị weere ọnọdụ ná ndụ Jọshụa—imeri Jeriko, imeri ndị iro ha n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, na ike ala ahụ—gosiri na o chefughị nkwa Chineke ma ọlị. Ka ọ na-eru n’ọgwụgwụ nke ndụ ya, bụ́ mgbe Jehova meworo ka Izrel zuru ike pụọ n’aka ndị iro ha, Jọshụa kpọkọtara ndị ahụ ịtụleghachi ihe ndị Chineke mewooro ha na ịgba ha ume ka ha jiri obi ha dum na-efe Ya ofufe. N’ihi ya, ndị Izrel ji obi ha dum mee ka ọgbụgba ndụ ha na Jehova dịghachi ọhụrụ, obi abụọ adịghịkwa ya na, n’ịbụ ndị ihe nlereanya nke onye ndú ha kpaliri, ‘Izrel fere Jehova ofufe n’ụbọchị nile nke Jọshụa.’—Joshua 24:16, 31.

Jọshụa setịpụụrụ anyị ihe nlereanya magburu onwe ya. Ndị Kraịst taa na-eche ọtụtụ ule nke okwukwe ihu. Imeri ha dị oké mkpa iji nọgide na-enwe ihu ọma Jehova na n’ikpeazụ iji nweta nkwa ya. Ihe ịga nke ọma Jọshụa dabeere n’okwukwe siri ike o nwere. N’eziokwu, anyị ahụbeghị ọrụ ndị dị ike nke Chineke dị ka Jọshụa hụrụ, ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-arụ ụka, akwụkwọ Bible nke bu aha Jọshụa na-enye ihe akaebe nke onye ji anya ya hụ ihe merenụ, banyere otú okwu Jehova si kwesị ntụkwasị obi. Dị ka Jọshụa, e mesiri anyị obi ike na anyị ga-enwe amamihe na ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ana-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ma lezie anya itinye ya n’ọrụ.

Àgwà Ndị Kraịst ibe gị ọ̀ na-ewute gị mgbe ụfọdụ? Chee echiche banyere ntachi obi nke Jọshụa nwere n’afọ 40 ọ na-aghaghị iso ndị ibe ya na-enweghị okwukwe wagharịa n’ọzara n’ihi ihe ọ na-abụghị ya kpatara. Ọ̀ na-esiri gị ike ịkwụsi ike n’ihe i kweere? Cheta ihe Jọshụa na Keleb mere. N’ihi okwukwe na nrubeisi ha, ha natara ụgwọ ọrụ magburu onwe ya. Ee, Jọshụa nwere okwukwe n’ezie na Jehova ga-emezu nkwa ya nile. Ka anyị onwe anyị meekwa otú ahụ.—Joshua 23:14.

[Foto dị na peeji nke 10]

Iso Mozis kpakọrịta wusiri okwukwe Jọshụa ike

[Foto dị na peeji nke 10]

Jọshụa na Keleb nwere obi ike n’ike Jehova

[Foto dị na peeji nke 10]

Idu ndú Jọshụa kpaliri ndị ahụ ịrapara Jehova n’ahụ́