Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe E Kenyere Anyị Ozi Ala Ọzọ Ghọrọ Obodo Anyị

Ebe E Kenyere Anyị Ozi Ala Ọzọ Ghọrọ Obodo Anyị

 Akụkọ Ndụ

Ebe E Kenyere Anyị Ozi Ala Ọzọ Ghọrọ Obodo Anyị

DỊ KA DICK WALDRON SI KỌỌ

Ọ bụ n’otu ehihie Sunday na September 1953. Anyị ka bịara ọhụrụ na South-West Africa (ebe bụ́zi Namibia). Anyị anọrubeghị otu izu ná mba a, anyị na-agakwa ịmalite iduzi nzukọ ihu ọha n’isi obodo ya, bụ́ Windhoek. Gịnị kpaliri anyị isi Australia bịa n’ala a dị n’Africa? Mụ na nwunye m, nakwa ụmụ agbọghọ atọ, bịara dị ka ndị ozi ala ọzọ nke ozi ọma Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.

AMALITERE m ndụ m n’ebe dịpụrụ adịpụ nke ụwa, bụ́ Australia, n’afọ ahụ dị ịrịba ama bụ́ 1914. Afọ ndị iri na ụma m dabakọrọ n’oge Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba ahụ, aghaghịkwa m ime òkè m iji hụ na ezinụlọ anyị hụrụ ihe ha riri. Ọrụ adịghị, ma echepụtara m ụzọ isi na-achụ nta ewi, bụ́ nke dị ọtụtụ n’Australia. N’ihi ya, ụtụ bụ́ isi m na-atụnye n’ihe oriri ezinụlọ anyị bụ ịhụ na e nwere anụ ewi mgbe nile.

Ka ọ na-erule oge agha ụwa nke abụọ dara na 1939, agbalịwo m nweta ọrụ n’ebe a na-arụzi obere ụgbọala na bọs n’obodo Melbourne. E nwere ihe dị ka ndị ikom 700 na-arụ onye rụtụ ibe ya agbanwee ya n’ọrụ bọs ahụ, mgbe ọ bụla a gbanwere oge ọrụ m, ana m ahụ ndị ọkwọ ụgbọala ma ọ bụ ndị na-eso bọs dị iche ná ndị m hụrụ mbụ. Ana m ajụkarị ha, sị, “Olee okpukpe unu na-ekpe?” ma na-agwa ha ka ha kọọrọ m ihe ndị ha kweere. Nanị onye pụrụ inye m azịza ndị juru m afọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ kọwaara m ozi dabeere na Bible banyere ụwa paradaịs, bụ́ ebe ụmụ mmadụ na-atụ egwu Chineke ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:29.

 Ka ọ dịgodị, nne m zutekwara Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na m esi ọrụ abalị lọta, nri m na-adị eche m eche, tinyere magazin Consolation (nke bụ́zi Teta!). Ihe m gụtara kpaliri mmasị m. Ka oge na-aga, ekwubiri m na nke a bụ ezi okpukpe ahụ, abịakwara m sonye nnọọ na ya, e meekwa m baptizim na May 1940.

Na Melbourne, e nwere ebe obibi ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ebe ihe dị ka mmadụ 25 bụ́ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova bi. Agara m soro ha biri. Kwa ụbọchị, ana m ege ahụmahụ ndị na-akpali akpali ha na-akọ banyere ọrụ nkwusa, abịakwara m nwee ọchịchọ isonyere ha. N’ikpeazụ, etinyere m akwụkwọ maka ije ozi ọsụ ụzọ. A nakweere m ma kpọọ m ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Australia. Otú a ka m si ghọọ onye òtù ezinụlọ Betel.

Ịga Mkpọrọ na Mmachibido Iwu

Otu n’ime ọrụ ndị e kenyere m na Betel bụ iji ígwè e ji awa osisi na-awa osisi. N’ebe ahụ, anyị wara osisi iji nweta unyì e ji akwọ ụgbọala. A na-eji ya akwọ ụgbọala ndị dị n’alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ihi na mmanụ ụgbọala kọrọ ụkọ n’ihi agha a na-alụ. Anyị dị mmadụ 12 na-arụ ọrụ n’ebe ahụ a na-awa osisi, anyị nile torukwara ịbụ ndị a ga-edeba aha ha n’òtù ndị agha. O teghị aka a maa anyị ikpe ịga mkpọrọ ọnwa isii maka ọjụjụ anyị jụrụ ije agha n’ihi ihe ndị dabeere na Bible. (Aịsaịa 2:4) E zigara anyị n’otu ugbo ụlọ mkpọrọ ịrụ ọrụ mmanye. Olee ọrụ ha nyere anyị ịrụ? N’ụzọ dị ịtụnanya, ọ bụ ọrụ ịwa osisi, kpọmkwem ihe a zụrụ anyị ịrụ na Betel!

Anyị wara osisi ahụ nke ọma nke na onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ nyere anyị Bible na akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible, n’agbanyeghị iwu siri ike e nyere na e kwesịghị inye anyị ihe ndị dị otú ahụ. Ọ bụ n’oge a ka m mụtara ihe bara uru banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ka m na-arụ ọrụ na Betel, e nwere otu nwanna nwoke ihe na-adịtụghị adabara mụ na ya. Àgwà anyị dị nnọọ iche. Ònye ka i chere na e tinyere mụ na ya n’otu ọnụ ụlọ ụlọ mkpọrọ? Ọ bụ nwanna nwoke ahụ. Ugbu a, anyị nwere nnọọ ohere ịmata ibe anyị, ihe sikwa na ya pụta bụ na anyị bịara ghọọ ezigbo ndị enyi na-akwụsi ike.

Ka oge na-aga, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’Australia. E jichiri ego nile, ego ụmụnna na-arụ ọrụ na Betel na-enweta bịakwara dị nnọọ nta. N’otu oge, otu n’ime ha bịakwutere m ma, sị: “Dick, achọrọ m ịga gbaa àmà, ma enweghị m akpụkpọ ụkwụ, nanị ihe m nwere bụ buutu m ji arụ ọrụ.” Obi dị m ụtọ inyere ya aka, o yikwaara akpụkpọ ụkwụ m gawa ime nkwusa.

Mgbe e mesịrị, anyị nụrụ na e jidewo ya ma tụọ ya mkpọrọ maka ime nkwusa. Apụghị m nnọọ ịhapụ idegara ya obere akwụkwọ ozi, sị: “Ihe mere gị wutere m. Obi dị m ụtọ na eyighị m akpụkpọ ụkwụ m.” Ma n’oge na-adịghị anya, e jidekwara mụ onwe m ma tụọ m mkpọrọ nke ugboro abụọ ya n’ihi nnọpụiche m. Mgbe a tọhapụsịrị m, e kenyere m ọrụ ilekọta ugbo ezinụlọ Betel si enweta ihe oriri. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, anyị meriri n’otu okwu ikpe, a kagbukwara iwu a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova.

Ịlụ Onye Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Ezisa Ozi Ọma

Ka m nọ n’ugbo ahụ, amalitere m ichesi echiche ike banyere ịlụ nwanyị, abịakwara m nwee mmasị n’ebe otu nwanna nwanyị na-eto eto nke na-asụ ụzọ, bụ́ Coralie Clogan, nọ. Nne nne Coralie bụ onye mbụ nwere mmasị n’ozi Bible n’ezinụlọ ha. Mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ gwara nne Coralie, bụ́ Vera, sị: “Zụlite ụmụ gị ịhụ Chineke n’anya na ijere ya ozi, otu ụbọchị, anyị ga-ezutekwa n’ụwa Paradaịs.” E mesịa, mgbe otu onye ọsụ ụzọ ji akwụkwọ nta bụ́ Millions Now Living Will Never Die (Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị) bịa n’ụlọ Vera, okwu ndị ahụ malitere ịda ya ka ihe ezi uche dị na ha. Akwụkwọ nta ahụ mere ka Vera kwenye na ọ bụ nzube Chineke ka ihe a kpọrọ mmadụ bie ndụ n’ụwa paradaịs. (Mkpughe 21:4) E mere ya baptizim ná mmalite afọ ndị 1930, dịkwa nnọọ ka nne ya gbara ya ume ime, o nyeere ụmụ ya nwanyị atọ—Lucy, Jean, na Coralie—aka ịzụlite ịhụnanya n’ebe Chineke  nọ. Otú ọ dị, nna Coralie megidesiri mmasị ezinụlọ ya nwere n’okpukpe ike, dị nnọọ ka Jizọs dọrọ aka ná ntị na ọ ga-adị n’ezinụlọ dị iche iche.—Matiu 10:34-36.

Ezinụlọ Clogan bụ ezinụlọ nwere nkà n’ịkpọ egwu; nwa ha nke ọ bụla nwekwara ngwá egwu nke ọ na-akpọ. Coralie na-akpọ violin, na 1939 kwa, bụ́ mgbe ọ dị afọ 15, e nyere ya diplọma n’ịkpọ egwú. Ntiwapụ nke Agha Ụwa nke Abụọ mere ka Coralie chesie echiche ike banyere ọdịnihu ya. Oge eruwo ka o kpebie ihe ọ gaje iji ndụ ya mee. N’otu akụkụ, o nwere ike inweta ọrụ n’ịkpọ egwú. A kpọọla ya rịị ka ọ bịa kpọwa egwú n’Òtù Egwu Melbourne Symphony. N’aka nke ọzọ, o nwere ike itinye oge ya ná nnukwu ọrụ nke ikwusa ozi Alaeze ahụ. Mgbe o chebasiiri ya echiche ike, e mere Coralie na ụmụnne ya nwanyị abụọ baptizim na 1940, ha mekwara nkwadebe ịbanye n’ọrụ izisa ozi ọma oge nile.

N’oge na-adịghị anya mgbe Coralie kpebiri ịbanye n’ozi oge nile, otu nwanna nwoke nwere ibu ọrụ nke si n’alaka ụlọ ọrụ Australia, bụ́ Lloyd Barry, onye mesịrị jee ozi dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bịakwutere ya. Ọ ka kwusịrị nnọọ okwu na Melbourne ma gwa Coralie, sị: “Ana m alaghachi Betel. Gịnị ma i soro m laghachi n’ụgbọ okporo ígwè ma sonye n’ezinụlọ Betel?” O ji ọchịchọ obi ya kwere.

Coralie na ụmụnna nwanyị ndị ọzọ so n’ezinụlọ Betel keere òkè dị mkpa n’inye ụmụnna nọ n’Australia akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’afọ ndị ahụ a lụrụ agha bụ́ oge a machibidoro ọrụ anyị iwu. N’ezie, ha rụrụ akụkụ ka ukwuu nke ọrụ ibi akwụkwọ, bụ́ nke Nwanna Malcolm Vale, lekọtara. A nọ na-ebipụta ma na-amachite akwụkwọ ndị bụ́ The New World na Children, ọ dịghịkwa mbipụta magazin Ụlọ Nche a na-ebipụtaghị n’ime ihe karịrị afọ abụọ mmachibido iwu ahụ dịruru.

A ghaghị ịkwagharị ebe a nọ ebi akwụkwọ ihe dị ka ugboro 15 iji gbanahụ ndị uwe ojii. N’otu oge, a nọ n’okpukpu nke ime ala nke otu ụlọ a nọ ebipụta ụdị akwụkwọ ọzọ iji megharịa ndị mmadụ anya wee na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Mgbe ọ bụla e nwere ihe ize ndụ, nwanna nwanyị nọ n’ebe nnabata ndị ọbịa pụrụ ịpị mgbịrịgba nke a na-anụ ụda ya n’okpukpu nke ime ala ahụ, ka ụmụnna nwanyị nọ n’ebe ahụ wee nwee ike izo akwụkwọ ọ bụla tupu onye ọ bụla amalite ime nnyocha.

Mgbe a na-eme otu n’ime nnyocha ndị dị otú ahụ, obi mapụrụ ụfọdụ n’ime ụmụnna nwanyị ahụ mgbe ha chọpụtara na otu Ụlọ Nche dị n’elu tebụl ebe onye ọ bụla ga-ahụ ya. Onye uwe ojii ahụ batara, busa akpa ya kpọmkwem n’elu Ụlọ Nche ahụ, ma malite ime nnyocha. Mgbe ọ na-adịghị ihe ọ hụrụ, o buuru akpa ya pụọ!

Mgbe e wepụrụ mmachibido iwu ahụ ma nyeghachi ụmụnna alaka ụlọ ọrụ ha, e nyere ọtụtụ n’ime ha ohere ịga n’ubi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ mgbe ahụ ka Coralie wepụtara onwe ya ịga Glen Innes. Esonyeere m ya n’ebe ahụ mgbe anyị lụrụ na January 1, 1948. Ka ọ na-erule oge anyị hapụrụ ebe ahụ, e guzobere ọgbakọ na-eme nke ọma n’ebe ahụ.

Ebe ọzọ e kenyere anyị ọrụ bụ Rockhampton, ma anyị apụghị inweta ụlọ n’ebe ahụ. Ya mere, anyị mara ụlọ ntu n’otu ala tọgbọ chakoo nke dị n’ugbo nke otu onye nwere mmasị. Ụlọ ntu ahụ gaje ịbụ ebe obibi anyị ruo ọnwa itoolu na-esonụ. Anyị gaara ebi na ya karịa otú  ahụ, ma mgbe udu mmiri bịara, oké ifufe fekasịrị ụlọ ntu ahụ, oké mmiri ozuzo eburukwa ya. *

Anyị Ịkwaga n’Ebe E Kenyere Anyị Ọrụ n’Ala Ọzọ

Ka anyị nọ na Rockhampton, a kpọrọ anyị òkù ịga klas nke 19 nke Watchtower Bible School of Gilead iji nweta ọzụzụ maka ozi ala ọzọ. Nke ahụ bụkwa otú e si ziga anyị, mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ na 1952, n’ebe a maara n’oge ahụ dị ka South-West Africa.

N’egbughị oge, ndị ụkọchukwu Krisendọm gosipụtara otú ọrụ ozi ala ọzọ anyị dị ha. Kwa Sunday ruo izu isii n’esepụghị aka, ha nọ n’ọlta dọọ ndị òtù ha aka ná ntị banyere anyị. Ha gwara ha ka ha ghara imeghere anyị ụzọ, ka ha gharakwa ikwe ka anyị gụọrọ ha Bible, ebe ọ bụ na ọ ga-emegharị ha anya. N’otu ógbè, anyị nyefere ọtụtụ akwụkwọ, ma ụkọchukwu sochiri anyị azụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma napụtachaa ha. Otu ụbọchị, anyị nwere nkwurịta okwu n’ọnụ ụlọ onye ụkọchukwu ahụ nọ amụ ihe ma hụ na o nwere ọtụtụ n’ime akwụkwọ anyị.

O teghị aka tupu ndị ọchịchị obodo amalitekwa igosi nchegbu ha banyere ọrụ anyị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na site ná nkwali nke ndị ụkọchukwu, ha malitere inyo anyị enyo na a pụrụ inwe ihe jikọrọ anyị na ọchịchị Kọmụnist. N’ihi ya, ha nwetara akara mkpụrụ aka anyị, a gbakwara ụfọdụ n’ime ndị anyị na-aga na nke ha ajụjụ ọnụ. N’agbanyeghị mmegide a nile, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ anyị mụbawanyere.

Site n’oge anyị malitere ịnọ ebe a, anyị zụlitere ọchịchọ siri ike nke ịgbasa ozi Bible n’etiti ụmụ amaala Ovambo, Herero, na Nama. Otú ọ dị, nke a adịghị mfe. Laa azụ n’oge ahụ, South-West Africa nọ n’okpuru ọchịchị ịkpa ókè agbụrụ nke South Africa. Ebe anyị bụ ndị ọcha, e kweghị ka anyị gbaa àmà n’ógbè ndị isi ojii n’enwetaghị ikike n’aka gọọmenti. Anyị tinyere akwụkwọ site n’oge ruo n’oge, ma ndị ọchịchị jụrụ nnọọ inye anyị ikike.

Mgbe anyị nọsịrị n’ebe e kenyere anyị ọrụ n’ala ọzọ ruo afọ abụọ, ihe ịtụnanya mere anyị. Coralie dịịrị ime. N’October 1955, a mụrụ nwa anyị nwanyị, bụ́ Charlotte. Ọ bụ ezie na anyị apụghịzi ịnọgide na-eje ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ, enwetara m ọrụ nwa oge ma nọgide na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ ruo oge ụfọdụ.

Azịza Nye Ekpere Anyị

Na 1960, anyị chere ihe ịma aka ọzọ ihu. Coralie nwetara akwụkwọ ozi nke kwuru na nne ya na-arịasi ọrịa ike nke na ọ bụrụ na Coralie alọtaghị, o nwere ike ọ gaghị ahụkwa nne ya anya ọzọ. Ya mere, anyị mere atụmatụ  isi South-West Africa laghachi Australia. Mgbe ahụ, otu ihe mere—kpọmkwem n’izu ahụ anyị ga-apụ, enwetara m akwụkwọ n’aka ndị ọchịchị obodo bụ́ nke nyere anyị ikike ịbanye n’ógbè ndị isi ojii, bụ́ Katutura. Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? Ọ̀ bụ inyeghachi ha akwụkwọ ikike ahụ ka anyị gbalịsịrị ruo afọ asaa iji nweta ya? Ọ dị mfe iche n’echiche na ndị ọzọ pụrụ ịmalite ebe anyị kwụsịrị. Ma, nke a ọ́ bụghị ngọzi sitere n’aka Jehova, azịza nye ekpere anyị?

Emere m mkpebi n’egbughị oge. Agaghị m ala, ka mgbalị anyị mere iji nweta ikike ibiwezi ebe a wee ghara ịla n’iyi ma ọ bụrụ na anyị nile agaa Australia. N’echi ya, akagburu m ndokwa m mere iso ụgbọ mmiri ma ziga Coralie na Charlotte Australia maka ezumike ga-ewe ogologo oge.

Ka ha na-anọghị ya, amalitere m ịgbara ndị bi n’ógbè ndị isi ojii àmà. Mmasị ha gosiri dị nnọọ ukwuu. Mgbe Coralie na Charlotte lọghachiri, ụfọdụ ndị si n’ógbè ndị isi ojii abịawala nzukọ.

Ka ọ na-erule n’oge a, enwere m ụgbọala ochie m ji ebute ndị nwere mmasị ná nzukọ. Ana m aga ugboro anọ ma ọ bụ ise ná nzukọ nke ọ bụla, na-ebute mmadụ asaa, asatọ, ma ọ bụ itoolu na nke ọ bụla. Mgbe onye ikpeazụ rịturu, Coralie na-eji egwuregwu jụọ, sị: “Mmadụ ole ka fọdụrụ n’okpuru oche gị?”

Iji dịkwuo irè n’ọrụ nkwusa ahụ, ọ dị anyị mkpa inwe akwụkwọ anyị n’asụsụ nke ụmụ amaala obodo ahụ. Ya mere, enwere m ihe ùgwù nke ime ndokwa ka a sụgharịa traktị bụ́ Life in a New World n’asụsụ anọ a na-asụ n’ógbè ahụ: Herero, Nama, Ndonga, na Kwanyama. Ndị nsụgharị ya bụ ndị gụrụ akwụkwọ anyị na-eduziri ọmụmụ Bible, ma aghaghị m iso ha nọrọ iji jide n’aka na a sụgharịrị ahịrịokwu nke ọ bụla nke ọma. Nama bụ asụsụ na-enweghị ìgwè okwu hiri nne. Dị ka ihe atụ, anọ m na-anwa ịkọwa isi ihe bụ́: “Ná mmalite, Adam bụ nwoke zuru okè.” Onye nsụgharị ahụ kọrọ ọkọ n’isi ma kwuo na ya apụghị icheta okwu Nama ọ ga-eji sụgharịa “zuru okè.” “Echetawo m ya,” ka o mesịrị kwuo. “Ná mmalite, Adam dị ka mkpụrụ osisi peach chara acha.”

Anyị Nwere Afọ Ojuju ná Mba E Kenyere Anyị Ọrụ

Ihe dị ka afọ 49 agafeela kemgbe anyị bịara ná mba a, nke a na-akpọzi Namibia. Ọ dịghịzi mkpa inweta ikike iji banye n’ógbè ndị isi ojii. Namibia bụ mba gọọmenti ọhụrụ nke dabeere n’ụkpụrụ iwu nke na-adịghị akpa ókè agbụrụ, na-achị. Taa, na Windhoek, anyị nwere ọgbakọ anọ buru ibu bụ́ ndị na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị ntụsara ahụ́.

Anyị na-echebakarịrị okwu ndị a anyị nụrụ na Gilead echiche: “Mee ka ebe e kenyere gị ọrụ n’ala ọzọ bụrụ obodo gị.” Site n’ụzọ Jehova siworo gbanwee ihe, anyị kwenyesiri ike na ọ bụ uche ya ka ala ọzọ a bụrụ obodo anyị. Anyị abịawo hụ ụmụnna ndị ahụ n’anya, tinyere ọdịbendị ha dịgasị iche iche na-akpali mmasị. Anyị esorowo ha chịkọọ ọchị n’oge ọṅụ ha ma soro ha kwakọọ ákwá n’oge iru újú ha. Ụfọdụ n’ime ndị ọhụrụ anyị na-ejibu ụgbọala anyị ebute ná nzukọ na-ejezi ozi dị ka idé ji ọgbakọ ha. Mgbe anyị bịarutere n’ala a sara mbara na 1953, e nwere ihe na-erughị ndị nkwusa ozi ọma iri n’ógbè a. Site n’ọnụ ọgụgụ ahụ dị nta anyị ji malite, anyị amụbawo ruo ihe karịrị mmadụ 1,200. N’imezu nkwa ya, Jehova emewo ka e nwee mmụba n’ebe anyị na ndị ọzọ ‘kụworo mkpụrụ ma kwọsa mmiri.’—1 Ndị Kọrint 3:6.

Ka mụ na Coralie na-eleghachi anya azụ n’ọtụtụ afọ anyị ji jee ozi, na mbụ n’Australia nakwa ugbu a, na Namibia, anyị na-enwe afọ ojuju dị ukwuu. Anyị na-enwe olileanya ma na-ekpe ekpere ka Jehova nọgide na-enye anyị ike iji na-eme uche ya ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 A kọrọ akụkọ na-akpali akpali a na-ekwughị ndị a kọrọ maka ha banyere otú Waldron na nwunye ya si tachie obi n’ebe a siri ike e kenyere ha ọrụ n’Ụlọ Nche (Bekee), December 1, 1952, peeji nke 707-708.

[Foto dị na peeji nke 26, 27]

Ịkwaga n’ebe e kenyere anyị ọrụ na Rockhampton, Australia

[Foto dị na peeji nke 27]

N’ọdụ ụgbọ mmiri mgbe anyị na-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilead

[Foto dị na peeji nke 28]

Ịgba àmà na Namibia na-enye anyị ọṅụ dị ukwuu