Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgba A Gbara Iji Nwee Bible n’Asụsụ Grik Ọgbara Ọhụrụ

Mgba A Gbara Iji Nwee Bible n’Asụsụ Grik Ọgbara Ọhụrụ

 Mgba A Gbara Iji Nwee Bible n’Asụsụ Grik Ọgbara Ọhụrụ

Ọ pụrụ ịtụ gị n’anya ịmara na na Gris, bụ́ ala a na-akpọ mgbe ụfọdụ ebe nnwere onwe nke echiche malitere, ịsụgharị Bible n’asụsụ ndị nkịtị na-aghọta abụwo ihe a gbaara mgba kpụ ọkụ n’ọnụ ruo ogologo oge. Ma ònyedị ga-emegide imepụta Bible Grik nke ga-adị mfe nghọta? N’ihi gịnị ka mmadụ ọ bụla ga-eji chọọ ịkwụsị ya?

MMADỤ pụrụ iche na ndị na-asụ Grik nwere ihe ùgwù pụrụ iche, ebe ọ bụ na e dere akụkụ hiri nne nke Akwụkwọ Nsọ na mbụ n’asụsụ ha. Otú ọ dị, Grik ọgbara ọhụrụ dị nnọọ iche na Grik e ji mee ihe ná nsụgharị Septuagint nke Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa na nke e ji dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ezie, n’ime narị afọ isii gara aga, Grik e ji dee Bible na-esiri ihe ka ukwuu ná ndị na-asụ Grik ike nghọta ka a ga-asị na ọ bụ asụsụ ala ọzọ. E jiriwo okwu ndị ọhụrụ dochie okwu ndị mere ochie karị, ìgwè okwu, ụtọ asụsụ, na otú e si ahazi ahịrịokwu agbanwewokwa.

Nchịkọta nke ihe odide Grik bụ́ ndị e dere site na narị afọ nke 3 ruo nke 16 na-agba akaebe mgbalị e mere iji asụsụ Grik ọhụrụ sụgharịa Septuagint. Na narị afọ nke atọ, Gregory, bụ́ bishọp nke Neocaesarea (ihe dị ka 213 O.A. ruo ihe dị ka 270 O.A.), ji asụsụ Grik ka dịrị mfe nghọta sụgharịa akwụkwọ Eklisiastis site na Septuagint. Na narị afọ nke 11, onye Juu aha ya bụ Tobias ben Eliezer nke bi na Masedonia ji asụsụ Grik a na-asụ n’oge ahụ sụgharịa akụkụ ụfọdụ nke Pentateuch nke Septuagint. Ọbụna o ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru sụgharịa ya maka abamuru nke ndị Juu bi na Masedonia bụ́ ndị na-asụ nanị Grik ma na-agụ mkpụrụ akwụkwọ Hibru. E bipụtara Pentateuch zuru ezu a sụgharịrị n’ụzọ dị otú ahụ na Constantinople na 1547.

Obere Ìhè n’Ime Ọchịchịrị

Mgbe ndị Ottoman weghaara ógbè ndị na-asụ Grik n’Alaeze Ukwu Byzantium na narị afọ nke 15, ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ ebe ahụ amaghị akwụkwọ. Ọ bụ ezie na Chọọchị Ọtọdọks nwere ihe ùgwù pụrụ iche n’okpuru ọchịchị Alaeze Ukwu Ottoman, ha ji nleghara anya hapụ ìgwè atụrụ ha ka ha bụrụ ndị ogbenye na ndị na-amaghị akwụkwọ. Onye edemede bụ́ onye Gris bụ́ Thomas Spelios kwuru, sị: “Ihe mgbaru ọsọ kasịnụ nke Chọọchị Ọtọdọks na usoro mmụta ya bụ ichebe ndị na-eri oriri nsọ na ya pụọ ná mkpọsa echiche nke ndị Alakụba na ndị Roman Katọlik. N’ihi ya, agụmakwụkwọ na Gris ghọrọ ihe na-adịghịzi aga ihu ma ọ bụ azụ.” N’ọnọdụ ọjọọ dị otú ahụ, ndị hụrụ Bible n’anya bịara chee na ọ dị mkpa inye ndị a na-ata ahụhụ ahụ́ efe na nkasi obi site n’akwụkwọ Bible bụ́ Abụ Ọma. Site na 1543 ruo 1835, e nwere nsụgharị 18 nke Abụ Ọma bụ́ ndị e ji asụsụ Grik e ji akparịta ụka sụgharịa.

Maximus Callipolites, bụ́ onye Gris bụ́ mọnk nke Callipolis sụgharịrị nsụgharị Grik mbụ nke akwụkwọ nile nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na 1630. Nke a weere ọnọdụ n’okpuru nduzi na nkwado nke Cyril Lucaris, bụ́ bishọp nke Constantinople na onye gaara agbanwe Chọọchị Ọtọdọks. Otú ọ dị, na chọọchị ahụ, Lucaris nwere ndị mmegide, bụ́ ndị  na-anabataghị mgbalị ọ bụla e mere iji weta mgbanwe ma ọ bụ kwere ka e jiri asụsụ a na-eji akparịta ụka sụgharịa Bible. * A nyagburu ya dị ka onye sabo. Otú o sina dị, e bipụtara ihe dị ka 1,500 nke nsụgharị Maximus na 1638. N’ime ihe banyere nsụgharị a, afọ 34 ka e mesịrị, nzukọ ndị isi chọọchị Ọtọdọks nọ na Jeruselem kwupụtara na “ọ bụghị nnọọ onye ọ bụla kwesịrị ịgụ [Akwụkwọ Nsọ], kama ọ bụ nanị ndị na-enyoba anya n’ihe ime mmụọ ndị dị omimi mgbe ha mesịrị nnyocha kwesịrị ekwesị.” Nke a pụtara na ọ bụ nanị ndị ụkọchukwu gụrụ akwụkwọ kwesịrị ịgụ Akwụkwọ Nsọ.

Na 1703, Seraphim, bụ́ onye Gris bụ́ mọnk nke si n’àgwàetiti Lesbos, gbalịrị ịnọ na London bipụta nsụgharị Bible Maximus bụ́ nke e dezigharịrị edezigharị. Mgbe ndị ọchịchị England na-emezughị nkwa ha kwere inyere ya aka n’ụzọ ego, o ji ego nke ya bipụta ndezigharị ahụ. N’okwu mmalite ya kpụ ọkụ n’ọnụ, Seraphim mesiri ike mkpa ọ dị “Onye Kraịst ọ bụla ji okpukpe kpọrọ ihe” ịgụ Bible, o bokwara ndị ụkọchukwu nọ n’ọkwá dị elu na chọọchị ahụ ebubo ịbụ ndị “na-achọ ikpuchi àgwà ọjọọ ha site n’ịhapụ ndị mmadụ ka ha nọrọ n’amaghị ihe.” Dị ka a pụrụ ịtụwo anya ya, ndị Ọtọdọks na-emegide ya mere ka e jide ya na Russia ma chụga ya Siberia, bụ́ ebe ọ nọ nwụọ na 1735.

N’ikwu banyere ókè akpịrị na-akpọru ndị na-asụ Grik n’oge ahụ nkụ n’ụzọ ime mmụọ, otu ụkọchukwu bụ́ onye Gris kwuru ihe na-esonụ banyere ndezigharị ọzọ e mesịrị dezigharịa nsụgharị Maximus: “Ndị Gris ji ịhụnanya na oké agụụ nabata Bible Nsọ a, nakwa ndị ọzọ. Ha gụkwara ya. Ọ dịkwa ha ka e mere ka ihe mgbu ha na-enwe belata, okwukwe ha nwere n’ebe Chineke nọ . . . bịakwara sikwuo ike.” Otú ọ dị, ndị ndú ime mmụọ ha tụrụ egwu na ọ bụrụ na ndị mmadụ aghọta Bible, mgbe ahụ, a ga-agba ndị ụkọchukwu n’anwụ n’ihi nkwenkwe na omume ha ndị na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, na 1823 nakwa na 1836, bishọp nke Constantinople nyere iwu ka e suo nsụgharị Bible nile dị otú ahụ ọkụ.

Onye Nsụgharị Nwere Obi Ike

N’ọnọdụ a e nwere mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ na oké agụụ maka ihe ọmụma Bible, a bịara nwee otu onye a ma ama nke gaje ikere òkè bụ́ isi n’ịsụgharị Bible n’asụsụ Grik ọgbara ọhụrụ. Onye a nwere obi ike bụ Neofitos Vamvas, bụ́ ọkà mmụta asụsụ a na-akwanyere ùgwù na ọkà mmụta Bible a ma ama, onye mmadụ nile weere dị ka otu n’ime “Ndị Ozizi nke Mba Ahụ.”

Vamvas hụrụ nke ọma na ọ bụ Chọọchị Ọtọdọks ka ụta dịịrị maka amaghị ihe n’ụzọ ime mmụọ ndị mmadụ nọ na ya. O kwenyesiri ike na ka e wee kpọtee ndị mmadụ n’ụra ime mmụọ, ọ dị mkpa iji asụsụ Grik e ji akparịta ụka n’oge ahụ sụgharịa Bible. Na 1831, site n’enyemaka nke ndị ọkà mmụta ndị ọzọ, ọ malitere iji asụsụ Grik ndị ọkà mmụta ji eme ihe sụgharịa Bible. E bipụtara nsụgharị ya nile na 1850. Ebe ọ bụ na Chọọchị Ọtọdọks nke Gris akwadoghị ya, o sooro Òtù Bible nke Britain na Ofesi jikọọ aka n’ibipụta na ikesa nsụgharị ya. Chọọchị ahụ kpọrọ ya “onye Protestant,” n’oge na-adịghịkwa anya, e weere ya dị ka osu.

Nsụgharị nke Vamvas gbasochiri King James Version anya ma nwee ihe ndị na-ezichaghị ezi nsụgharị ahụ nwere n’ihi ihe ọmụma dị nta e nwere n’oge ahụ banyere Bible na nkà asụsụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ruo ọtụtụ afọ, ọ bụ Bible a kasị jiri asụsụ Grik ọgbara ọhụrụ sụgharịa nke ndị mmadụ pụrụ inweta. N’ụzọ na-akpali mmasị, aha aka Chineke pụtara na ya ugboro anọ, n’ụdị bụ́ “Ieová.”—Jenesis 22:14; Ọpụpụ 6:3; 17:15; Ndị Ikpe 6:24.

Olee otú ndị mmadụ n’ozuzu si meghachi omume nye Bible a na nsụgharị ndị ọzọ dị mfe  nghọta? O riri ha nnọọ ọnụ! Ka otu onye na-erere ndị Òtù Bible nke Britain na Ofesi Bible nọ n’ụgbọ mmiri n’otu n’ime àgwàetiti Gris ndị dịpụrụ adịpụ, “ọtụtụ ụgbọ mmiri ụmụaka ndị bịara ịzụrụ [Bible] jupụtara na ha bịakwutere [ya], nke na a manyere ya . . . inye onye na-akwọ ụgbọ mmiri ọ nọ na ya iwu isi n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ kwọpụ,” ma ọ́ bụghị ya, Bible nile o bu bịa ga-anọ otu ebe gwụ! Ma ndị mmegide agbachighị nkịtị na-ele n’anya.

Ndị ụkọchukwu Ọtọdọks dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị megide nsụgharị ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, n’obodo Atens, e jichiri Bible dị iche iche. Na 1833, bishọp Ọtọdọks nke Krit kpọrọ “Agba Ọhụrụ” ndị ọ chọtara n’otu ebe obibi ndị mọnk ọkụ. Otu ụkọchukwu zoro otu, ndị bikwa n’obodo nta ndị dị nso zokwara nke ha ruo mgbe bishọp ahụ si n’àgwàetiti ahụ pụọ.

Afọ ụfọdụ mgbe e mesịrị, n’àgwàetiti Corfu, Nzukọ Ndị Isi Chọọchị Dị Nsọ nke Chọọchị Ọtọdọks nke Gris machibidoro nsụgharị Vamvas iwu. A machibidoro ire ya ere iwu, e bibikwara ndị nke dị adị. N’àgwàetiti Kiọs, Síros, na Mykonos, mmegide nke ndị ụkọchukwu nọ n’ógbè ndị ahụ dugara n’ịkpọ Bible ọkụ. Ma a ka na-aga imekwu ihe n’ọdịnihu iji kwụsị nsụgharị Bible.

Otu Eze Nwanyị Enwee Mmasị na Bible

N’afọ ndị 1870, Eze Nwanyị Olga nke Gris chọpụtara na ndị Gris n’ozuzu ha ka nwere ihe ọmụma dị nta banyere Bible. N’ikwere na ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ ga-eme ka mba ahụ nwee ahụ́ efe na ume ọhụrụ, ọ gbalịsiri ike ịhụ na a sụgharịrị Bible n’asụsụ dị mfe nghọta karịa nke e ji mee ihe ná nsụgharị nke Vamvas.

N’agbasoghị usoro kwesịrị ekwesị, achịbishọp nke Atens na onyeisi Nzukọ Ndị Isi Chọọchị Dị Nsọ, bụ́ Prokopios, gbara eze nwanyị ahụ ume ka ọ gaa n’ihu n’ihe ọ chọrọ ime. Otú ọ dị, mgbe o degaara Nzukọ Ndị Isi Chọọchị Dị Nsọ akwụkwọ iji nweta nkwado n’ụzọ kwekọrọ n’iwu, ha jụrụ inye ya nkwado. Otú o sina dị, ọ nọgidesiri ike, na-edeghachiri ha akwụkwọ ọzọ, ha jụrụ nke ugboro abụọ ya na 1899. N’ileghara nkwado ha na-enyeghị ya anya, o kpebiri iji ego ya bipụta ọnụ ọgụgụ na-ebughị ibu. O mechara ya na 1900.

Ndị Mmegide Bụ́ Isi Ekwe Ọnwụ

Na 1901, The Acropolis, bụ́ akwụkwọ akụkọ a ma ama n’Atens, bipụtara Oziọma Matiu nke Alexander Pallis, bụ́ onye nsụgharị na-arụ ọrụ na Liverpool, England, ji asụsụ Grik ọgbara ọhụrụ e ji akparịta ụka sụgharịa. Ihe àmà na-egosi na nzube Pallis na ndị òtù ya bụ ‘izi ndị  Gris ihe’ na ‘inyere mba ahụ aka isi n’ọdịda ha dara bilie.’

Ndị na-amụ nkà mmụta okpukpe Ọtọdọks na ndị nkụzi ha kpọrọ nsụgharị ahụ “mkparị e nyere ihe mba ahụ kasị jiri kpọrọ ihe,” mmerụ e merụrụ Ihe Odide Dị Nsọ. Bishọp Joakim nke Atọ nke Constantinople dere akwụkwọ nke ọ nọ na ya katọọ nsụgharị ahụ. Esemokwu ahụ ghọrọ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ìgwè ndị na-ebu agha jikwa ya mee ihe n’ụzọ aghụghọ.

Otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi a ma ama n’Atens malitere ịkatọ nsụgharị Pallis, na-akpọ ndị na-akwado ya “ndị na-ekweghị na Chineke dị,” “ndị sabo,” na “ndị ozi nke ọchịchị ala ọzọ” bụ́ ndị kpebisiri ike itisasị obodo Gris. Site na November 5 ruo 8, 1901, site ná nkwali nke ndị nọ na Chọọchị Ọtọdọks nke Gris bụ́ ndị na-esi ọnwụ ka a ghara inwe mgbanwe, ụmụ akwụkwọ kpasuru ọgba aghara n’Atens. Ha wakporo ụlọ ọrụ nke akwụkwọ akụkọ bụ́ The Acropolis, zọrọ njem gaa mebie ihe n’obí eze, weghara Mahadum Atens, ma nye ndị ọrụ gọọmenti iwu ịgba arụkwaghịm. N’oge ọgba aghara ahụ kasị sie ike, e gburu mmadụ asatọ mgbe ha na ndị agha kwarịtara mgbọ. N’echi ya, eze kwuru ka Achịbishọp Prokopios gbaa arụkwaghịm, ụbọchị abụọ ka e mesịrị, ndị nile so na Kansụl Ndị Minista gbara arụkwaghịm.

Otu ọnwa mgbe e mesịrị, ụmụ akwụkwọ ahụ mere ngagharị iwe ọzọ ma kpọọ otu nsụgharị nke Pallis ọkụ n’ihu ọha. Ha mere mkpebi megide ikesa nsụgharị a ma kwuo ka e nye onye ọ bụla nwara ime ihe dị otú ahụ n’ọdịnihu ntaramahụhụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Nke a ghọrọ ihe mgbakwasị ụkwụ iji machibido iji Bible ọ bụla e ji Grik ọgbara ọhụrụ sụgharịa na-eme ihe iwu. Lee oge ọjọọ nke a bụ n’ezie!

“Okwu Jehova Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi”

A kagburu iwu ahụ a machibidoro iji Bible eme ihe n’asụsụ Grik ọgbara ọhụrụ na 1924. Kemgbe ahụ, Chọọchị Ọtọdọks nke Gris akụọla nnọọ afọ n’ala ná mgbalị ya ime ka ndị mmadụ ghara inweta Bible. Ka ọ dịgodị, Ndịàmà Jehova ebutewo ụzọ n’ịkụzi Bible na Gris, dị ka ha meworo n’ọtụtụ mba ndị ọzọ. Kemgbe 1905, ha ejiriwo nsụgharị Vamvas mee ihe iji nyere ọtụtụ puku ndị na-asụ Grik aka inweta ihe ọmụma nke eziokwu Bible.

N’afọ ndị gafeworonụ, ọtụtụ ndị ọkà mmụta na ndị ọkachamara emewo mgbalị ndị kwesịrị ịja mma iji mepụta Bible n’asụsụ Grik ọgbara ọhụrụ. Taa, e nwere ihe dị ka nsụgharị 30 nke Bible, n’ozuzu ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, bụ́ ndị ndị nkịtị nọ na Gris pụrụ ịgụ. Nke dị oké ọnụ ahịa n’ezie n’ime ha bụ nsụgharị Grik nke New World Translation of the Holy Scriptures, bụ́ nke e wepụtara na 1997 maka abamuru nke nde mmadụ 16 bụ́ ndị na-asụ Grik n’ụwa nile. N’ịbụ nke Ndịàmà Jehova mepụtara, nsụgharị a sụgharịrị Okwu Chineke n’ụzọ dị mfe ọgụgụ, ma na-ekwe nghọta, na-agbasochi ihe odide mbụ nke Bible anya.

Mgba a gbara iji nwee Bible n’asụsụ Grik ọgbara ọhụrụ na-egosipụta otu eziokwu dị mkpa. Ọ na-egosi n’ụzọ doro anya na n’agbanyeghị mgbalị ọjọọ ụmụ mmadụ na-eme, “okwu Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi.”—1 Pita 1:25.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere Cyril Lucaris, lee Ụlọ Nche, February 15, 2000, peeji nke 26-29.

[Foto dị na peeji nke 27]

Cyril Lucaris duziri nsụgharị Grik mbụ nke akwụkwọ nile nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na 1630

[Ebe E Si Nweta Foto]

Bib. Publ. Univ. de Genève

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ụfọdụ Bible ndị e ji asụsụ Grik e ji akparịta ụka sụgharịa: Abụ Ọma nke e bipụtara na: (1) 1828 site n’aka Ilarion, (2) 1832 site n’aka Vamvas, (3) 1643 site n’aka Julianus. “Agba Ochie” nke e bipụtara na: (4) 1840 site n’aka Vamvas

Eze Nwanyị Olga

[Ebe E Si Nweta Foto]

Bible ndị ahụ: Ọ́bá Akwụkwọ Mba Gris; Eze Nwanyị Olga: Culver Pictures

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

Papaịrọs: E mepụtaghachiri ya site n’ikike nke Ndị Nlekọta nke Ọ́bá Akwụkwọ Chester Beatty, Dublin

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]

Papaịrọs: E mepụtaghachiri ya site n’ikike nke Ndị Nlekọta nke Ọ́bá Akwụkwọ Chester Beatty, Dublin