Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịrịọ Mgbaghara—Ụzọ Dị Irè E Si Eme Udo

Ịrịọ Mgbaghara—Ụzọ Dị Irè E Si Eme Udo

 Ịrịọ Mgbaghara—Ụzọ Dị Irè E Si Eme Udo

“ỊRỊỌ mgbaghara na-akpa ike. Ọ na-edozi ọgba aghara n’emeghị ihe n’ike, dozie esemokwu dị n’etiti mba dị iche iche, nyere ọchịchị aka ikweta na ụmụ amaala ha na-ata ahụhụ, ma na-eme ka mmadụ na ibe ya dịghachi ná mma.” Ihe a ka Deborah Tannen, bụ́ onye edemede a kasị azụ akwụkwọ ya na ọkà mmụta asụsụ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya na Mahadum Georgetown dị na Washington, D.C., dere.

Bible na-akwado na arịrịọ e ji ezi obi rịọ na-abụkarị ụzọ dị irè isi mezie mmekọrịta mebiri emebi. Dị ka ihe atụ, n’ilu Jizọs banyere nwa mmefu ahụ, mgbe nwa ahụ lọghachiri n’ụlọ ma jiri obi ya nile rịọ mgbaghara, nna ya dị nnọọ njikere ịnabataghachi ya n’ezinụlọ ya. (Luk 15:17-24) Ee, mmadụ ekwesịtụghị ịdị oké mpako nke ịghara ichefu nganga ya, rịọ mgbaghara, ma chọọ ka a gbaghara ya. N’ezie, ọ dịghị esiri ndị dị umeala n’obi n’ezie oké ike ịrịọ mgbaghara.

Ike nke Ịrịọ Mgbaghara

Abigail, bụ́ nwanyị maara ihe n’Izrel oge ochie, mere ihe n’ụzọ na-egosi ike ịrịọ mgbaghara nwere, ọ bụ ezie na mgbaghara ọ rịọrọ bụ n’ihi ihe ọjọọ nke di ya meworo. Mgbe Devid, bụ́ onye mesịrị bụrụ eze Izrel, bi n’ọzara, ya na ndị ikom ya chebere ìgwè atụrụ nke di Abigail, bụ́ Nebal. Ma, mgbe ụmụ okorobịa Devid rịọrọ maka achịcha na mmiri, Nebal ji nnọọ okwu mkparị zilaga ha. N’ịbụ onye a kpasuru iwe, Devid kpọọrọ ihe dị ka ndị ikom 400 ịga wakpoo Nebal na ezinụlọ ya. Mgbe Abigail nụrụ ihe merenụ, ọ gawara izute Devid. Mgbe ọ hụrụ Devid, ọ dara n’ala n’ụkwụ  ya. Mgbe ahụ ọ sịrị: “Onyenwe m, ka ajọ omume ahụ dịkwasị mụ onwe m: ma biko, ka ohu gị nwanyị kwuo ná ntị gị, gị nụrụkwa okwu nile nke ohu gị nwanyị.” Abigail kọwaziri ihe merenụ ma nye Devid nri na mmiri n’onyinye. Mgbe o mere nke ahụ, Devid sịrị: “Rịgoruo ụlọ gị n’udo; lee, egewo m ntị olu gị, hụkwa gị ihu ọma.”—1 Samuel 25:2-35.

Àgwà ịdị umeala n’obi nke Abigail na ịrịọ mgbaghara ya maka akparamàgwà ọjọọ nke di ya, chebere ezinụlọ ya. Ọbụna Devid kelere ya maka igbochi ya ịba n’ikpe ọmụma ọbara. Ọ bụ ezie na ọ bụghị Abigail mesoro Devid na ndị ikom ya omume ọjọọ, o kwetara na ụta dịịrị ya n’aha ezinụlọ ya ma soro Devid mee udo.

Ihe atụ ọzọ nke onye maara mgbe o kwesịrị ịrịọ mgbaghara bụ Pọl onyeozi. N’otu oge, ọ ghaghị ịgọpụrụ onwe ya n’ihu Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe ukwu nke ndị Juu. N’ịbụ onye ihe Pọl kwuru n’ezoghị ọnụ kpasuru iwe, nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ananaịas nyere ndị nọ Pọl nso iwu ka ha tie ya ihe n’ọnụ. Mgbe ahụ, Pọl gwara ya, sị: “Chineke gaje iti gị ihe, gị mgbidi e tere nzu. Ị̀ nọ ọdụ ikpe m ikpe n’ụzọ kwekọrọ n’Iwu ahụ ma n’otu mgbe ahụ na-emebikwa Iwu ahụ, na-enye iwu ka e tie m ihe?” Mgbe ndị na-ekiri ihe na-emenụ boro Pọl ebubo ikwujọ nnukwu onye nchụàjà, Pọl kwetara mmejọ ya ozugbo, na-asị: “Ụmụnna m, amaghị m na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà. N’ihi na e dere, sị, ‘Ekwula ihe ọjọọ banyere onye na-achị ndị gị.’”—Ọrụ 23:1-5.

Ihe Pọl kwuworo—na onye a họpụtara ịbụ onyeikpe ekwesịghị ime ihe ike—bụ eziokwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ rịọrọ mgbaghara n’ihi amaghị ụma gwa nnukwu onye nchụàjà okwu n’ụzọ a pụrụ iwere ya dị ka enweghị nsọpụrụ. * Mgbaghara Pọl rịọrọ meghere ụzọ maka ndị Sanhedrin ige ntị n’ihe o nwere ikwu. Ebe ọ bụ na Pọl maara banyere esemokwu dị n’etiti ndị òtù ụlọikpe ahụ, ọ gwara ha na a na-ekpe ya ikpe n’ihi na ya kweere ná mbilite n’ọnwụ. N’ihi ya, nkewa dị ukwuu bilitere n’etiti ha, na-eme ka ndị Farisii dụnyere Pọl úkwù.—Ọrụ 23:6-10.

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ abụọ a sitere na Bible? N’ihe atụ abụọ ahụ, iji ezi obi arịọ mgbaghara meghere ụzọ maka inwekwu nkwurịta okwu. Ya mere, ịrịọ mgbaghara pụrụ inyere anyị aka ime udo. Ee, ikweta mmejọ anyị na ịrịọ mgbaghara maka ihe anyị mebiri pụrụ imeghe oghere maka nkwurịta okwu bara uru.

‘Ma Ọ Dịghị Ihe Ọjọọ Ọ Bụla M Mere’

Mgbe anyị chọpụtara na ọ dị onye ihe anyị kwuru ma ọ bụ mee wutere, ọ pụrụ ịdị anyị ka ọ̀ bụ na onye ahụ adịghị edi ihe ma ọ bụ na ihe na-ewutekarị ya. Ma, Jizọs Kraịst dụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na ị  na-ewega onyinye gị n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na o nwere ihe nwanne gị nwere megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, pụọkwa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụkwa, mgbe ị bịaghachiworo, nye onyinye gị.”—Matiu 5:23, 24.

Dị ka ihe atụ, nwanna pụrụ iche na i mehiewo megide ya. N’ọnọdụ dị otú ahụ, Jizọs na-ekwu na i kwesịrị ịga ma “mee ka gị na nwanne gị dị n’udo,” ma ì chere na i mejọrọ ya ma ọ bụ na i cheghị otú ahụ. Dị ka ihe odide Grik si kwuo, okwu Jizọs ji mee ihe n’ebe a ‘na-enye echiche nke ịnakwerịta mmejọ mgbe e nwesịrị esemokwu.’ (Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words) N’ezie, mgbe mmadụ abụọ na-ese okwu, ọ pụrụ ịbụ na o nwere otú ụta si dịrị onye nke ọ bụla n’ime ha, ebe ọ bụ na ha abụọ ezughị okè ma nwee ike ihie ụzọ. Nke a na-achọkarị ịnakwerịta mmejọ.

Ihe bụ isiokwu abụchaghị onye e mejọrọ na onye mejọrọ, kama ọ bụ onye ga-ebute ụzọ n’ime udo. Mgbe Pọl onyeozi chọpụtara na Ndị Kraịst nọ na Kọrint nọ na-akpụpụ ndị ohu Chineke ibe ha n’ụlọikpe ụwa n’ihi esemokwu ndị dị ka nghọtahie n’ihi ego, ọ gbaziri ha, sị: “N’ihi gịnị ka unu na-ekweghị ka ọ bụrụ unu ka a ga-emejọ? N’ihi gịnị ka unu na-ekweghị ka ọ bụrụ unu ka a ga-erigbu?” (1 Ndị Kọrint 6:7) Ọ bụ ezie na Pọl kwuru nke a iji gbochie Ndị Kraịst ibe ya iwere esemokwu ha gawa n’ụlọikpe ụwa, ụkpụrụ dị na ya doro anya: Ọ dị mkpa ka ndị kwere ekwe na ibe ha na-adị n’udo karịa ha igosipụta onye mejọrọnụ na onye e mejọrọ. Iburu ụkpụrụ a n’uche na-eme ka ọ dịkwuo mfe ịrịọ mgbaghara maka mmejọ onye ọzọ chere na anyị mejọrọ ya.

Ọ Dị Mkpa Ka E Jiri Ezi Obi Rịọ Ya

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-eji okwu ndị bụ maka ịrịọ mgbaghara eme ihe n’ụzọ gabigara ókè. Dị ka ihe atụ, na Japan, a na-anụkarị okwu bụ́ sumimasen, bụ́ okwu a na-ejikarị arịọ mgbaghara, ọtụtụ puku ugboro. Ọbụna a pụrụ iji ya gosipụta ekele, na-eji ya egosipụta ihere ji mmadụ n’ihi enwelighị ike ime òkè ya. N’ihi otú e si eji ya egosipụta ọtụtụ ihe, ụfọdụ pụrụ iche na a na-ejikarị nnọọ okwu ahụ eme ihe ma na-enwe obi abụọ ma o sikwa ndị na-ekwu ya n’obi n’ezie. Ọ pụrụ iyikwa ka a na-eji okwu ndị e ji arịọ mgbaghara eme ihe gabiga ókè n’ọdịbendị ndị ọzọ.

N’asụsụ ọ bụla, ọ dị mkpa iji ezi obi eme ihe mgbe a na-arịọ mgbaghara. Ihe e kwuru na otú e si kwuo ya kwesịrị igosi na ihe ahụ wutere anyị n’eziokwu. Jizọs Kraịst kụziiri ndị na-eso ụzọ ya n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, sị: “Nanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, Ee e unu abụrụ Ee e; n’ihi na ihe karịrị ndị a sitere n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 5:37) Ọ bụrụ na ị rịọ mgbaghara, ya si gị n’obi! Iji maa atụ: Otu nwoke nke kwụ n’ahịrị n’ebe a na-enyocha ndị njem n’ọdụ ụgbọelu rịọrọ mgbaghara mgbe akpa ya dụtụrụ nwanyị kwụ ya n’azụ. Minit ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe ahịrị ahụ gara n’ihu, akpa ahụ dụtụkwara nwanyị ahụ ọzọ. Nwoke ahụ jikwa nkwanye ùgwù rịọ mgbaghara ọzọ. Mgbe otu ihe ahụ mekwara ọzọ, onye ya na nwanyị ahụ so na-eme njem gwara nwoke ahụ na ọ bụrụ na ihe o kwuru si ya n’obi, o kwesịrị ịhụ na akpa ahụ emetụghị nwanyị ahụ ọzọ. Ee, e kwesịrị ikpebisi ike ịghara imeghachi mmejọ mgbe a rịọrọ mgbaghara.

Ọ bụrụ na anyị ji ezi obi na-arịọ mgbaghara, ọ ga-agụnye ikweta mmejọ, ịchọ ịbụ onye a gbaghaara, na mgbalị imezi ihe e mebiri ruo n’ókè o kwere mee. N’aka nke ya, onye ahụ e mejọrọ kwesịrị ịgbaghara onye ahụ mejọrọ ya nke gosiri nchegharị, n’egbughị oge. (Matiu 18:21, 22; Mak 11:25; Ndị Efesọs 4:32; Ndị Kọlọsi 3:13) Ebe ọ bụ na ha abụọ ezughị okè, ime udo nwere ike ghara ịga were were mgbe nile. N’agbanyeghị nke ahụ, ịrịọ mgbaghara bụ ihe dị ike na-akpata ime udo.

Mgbe Ịrịọ Mgbaghara Na-ekwesịghị Ekwesị

Ọ bụ ezie na okwu ndị na-egosi mwute na-eme ka obi dajụọ ma na-enye aka eme ka udo dị, onye maara ihe na-ezere ikwu ha mgbe ọ  na-ekwesịghị ekwesị ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, were ya na ihe merenụ metụtara iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke. Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, “o wedara onwe ya n’ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.” (Ndị Filipaị 2:8) Otú ọ dị, ọ rịọghị mgbaghara n’ihi ihe o kweere iji belata ahụhụ ya. Jizọs arịọghịkwa mgbaghara mgbe nnukwu onye nchụàjà nyere ya iwu, sị: “Eji m aha Chineke dị ndụ na-agba gị iyi ka ị gwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke!” Kama iji ụjọ rịọwa mgbaghara, Jizọs ji obi ike zaghachi, sị: “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m asị unu, Site ugbu a gaa n’ihu, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-anọdụ ala n’aka nri nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.” (Matiu 26:63, 64) Ọ dịghị mgbe echiche nke ime ka ya na nnukwu onye nchụàjà dịrị n’udo ma mebie iguzosi ike n’ezi ihe ya nye Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, batara Jizọs n’obi.

Ndị Kraịst na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù ma na-asọpụrụ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị ha mkpa ịrịọ mgbaghara n’ihi irubere Chineke isi nakwa n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ụmụnna ha nọ.—Matiu 28:19, 20; Ndị Rom 13:5-7.

A Gaghị Enwe Ihe Ndị Na-eme Ka A Ghara Ịdị n’Udo

Taa, anyị na-ehie ụzọ n’ihi na anyị ketara ezughị okè na mmehie n’aka nna nna anyị bụ́ Adam. (Ndị Rom 5:12; 1 Jọn 1:10) Ọ bụ isi Adam nupụụrụ Onye Okike ya kpatara ọnọdụ mmehie ya. Otú ọ dị, Adam na Iv zuru okè na mbụ n’enweghịkwa mmehie, Chineke ekwewokwa nkwa iweghachi ụmụ mmadụ n’ọnọdụ izu okè ahụ. Ọ ga-ekpochapụ mmehie na ihe nile ọ na-akpata.—1 Ndị Kọrint 15:56, 57.

Cheedị echiche ihe nke ahụ ga-apụta! Na ndụmọdụ ya banyere iji ire eme ihe, onye otu nne ji ya na Jizọs bụ́ Jems kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, onye a bụ nwoke zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” (Jems 3:2) Onye zuru okè pụrụ ịchịkwa ire ya ka o wee ghara ịrịọ mgbaghara n’ihi iji ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. O “nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe magburu onwe ya mgbe anyị ga-ezu okè! Mgbe ahụ, a gaghịzi enwe ihe ndị na-eme ka mmadụ na ibe ya ghara ịdị n’udo. Otú ọ dị, ka ọ dịgodị, iji ezi obi arịọ mgbaghara na ịrịọ mgbaghara kwesịrị ekwesị mgbe anyị mejọrọ mmadụ, ga-enye aka nke ukwuu n’ime udo.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Eleghị anya ọ pụrụ ịbụ n’ihi nsogbu anya Pọl ka ọ na-ejighị mata nnukwu onye nchụàjà ahụ.

[Foto dị na peeji nke 5]

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Pọl?

[Foto dị na peeji nke 7]

Mgbe mmadụ nile ga-ezu okè, a gaghị enwe ihe ndị na-eme ka mmadụ na ibe ya ghara ịdị n’udo