Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ùgwù nke Ikere Òkè n’Ọrụ Mgbasawanye Ihe Ka Agha Gasịrị

Ihe Ùgwù nke Ikere Òkè n’Ọrụ Mgbasawanye Ihe Ka Agha Gasịrị

 Akụkọ Ndụ

Ihe Ùgwù nke Ikere Òkè n’Ọrụ Mgbasawanye Ihe Ka Agha Gasịrị

DỊ KA FILIP S. HOFFMANN SI KỌỌ

Agha Ụwa nke Abụọ ka bisịrị nnọọ na May 1945. Na December nke afọ ahụ, Nathan H. Knorr, bụ́ onye na-elekọta ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, na odeakwụkwọ ya dị afọ 25, bụ́ Milton G. Henschel, letara Denmark. A gbazitere otu ụlọ nzukọ buru ibu maka nleta ahụ a tụsiri anya ya ike. Okwu Nwanna Henschel na-adọrọ mmasị karịsịa nye anyị bụ́ ndị na-eto eto, ebe ọ bụ na ọ bụ ọgbọ anyị ma họrọ isiokwu ya ịbụ: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.”—Eklisiastis 12:1.

N’OGE nleta ahụ, anyị mụtara na ihe ndị na-akpali akpali nọ na-ewere ọnọdụ iji mee ka ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ na-aga n’ihu nakwa na anyị pụrụ ikere okè na ha. (Matiu 24:14) Dị ka ihe atụ, e meghewo otu ụlọ akwụkwọ na United States iji zụọ ndị ikom na ndị inyom na-eto eto maka ozi ala ọzọ. Nwanna Knorr mesiri ya ike na ọ bụrụ na a kpọọ anyị ịga, anyị agaghị alọtakwa ọzọ nakwa na anyị agaghị ama ebe a ga-eziga anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ n’ime anyị tinyere akwụkwọ.

Tupu mụ akọwa ahụmahụ ndị m nwere mgbe a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ, ka m laghachi na mgbe a mụrụ m na 1919. E nwere ọtụtụ ihe mere tupu na n’oge agha ahụ bụ́ ndị nwere mmetụta dị ukwuu ná ndụ m.

Eziokwu ahụ Site n’Aka Ajọ Nwa

Mgbe mama m dị ime m—nwa mbụ ya—o kpere ekpere na ọ bụrụ na m bụrụ nwa nwoke, na m ga-abụ onye ozi ala ọzọ. Nwanne ya nwoke bụ Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ  Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, ma ndị ezinụlọ ya weere ya dị ka ajọ nwa. Ụlọ anyị dị nso na Copenhagen, mgbe Ndị Mmụta Bible nwekwara mgbakọ ndị ha na-enwe kwa afọ n’ebe ahụ, mama m na-akpọ Deede Thomas, bụ́ onye bi n’ebe dịtụ anya site n’ebe ahụ, ka ọ nọrọ na nke anyị. Ka ọ na-erule na 1930, ihe ọmụma Bible dị ịtụnanya o nwere na arụmụka ya ezi uche dị na ya emewo ka mama m kwenye ịghọ Onye Mmụta Bible.

Mama m nwere mmasị na Bible. N’ịgbaso iwu ahụ e nyere na Deuterọnọmi 6:7, ọ kụziiri mụ na nwanne m nwanyị ihe ‘mgbe ọ na-anọdụ n’ụlọ ya, mgbe ọ na-eje ije n’ụzọ, mgbe ọ na-edina ala, ma ọ bụ mgbe ọ na-ebili ọtọ.’ Ka oge na-aga, amalitere m ikere òkè ná nkwusa ụlọ n’ụlọ. Ọ na-amasị m ikwurịta isiokwu ndị dị ka mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ na ọkụ ala mmụọ, bụ́ nke chọọchị dị iche iche na-akụzi. Apụrụ m isi na Bible gosi n’ụzọ dị irè na ozizi ndị dị otú ahụ hiere ụzọ.—Abụ Ọma 146:3, 4; Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4.

Ezinụlọ Anyị Adị n’Otu

Mgbe e mesịrị mgbakọ ahụ e mere na Copenhagen na 1937, e nwere mkpa maka inye aka ruo nwa oge n’ebe mbusa akwụkwọ nke alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Denmark. Aka m gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ kọmashal, enweghịkwa m ọrụ, n’ihi ya, ewepụtara m onwe m maka inye aka n’ebe mbusa akwụkwọ ahụ. Mgbe e jesịrị ozi dị n’ebe mbusa akwụkwọ ahụ, a gwara m ka m nye aka n’alaka ụlọ ọrụ. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, ahapụrụ m ụlọ anyị ma kwaga n’alaka ahụ dị na Copenhagen, ọ bụ ezie na e mebeghị m baptizim mgbe ahụ. Iso Ndị Kraịst tozuru okè na-akpakọrịta kwa ụbọchị nyeere m aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. N’afọ sochirinụ, na January 1, 1938, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke site na baptizim ime mmiri.

Na September 1939, Agha Ụwa nke Abụọ malitere. E mesịa, n’April 9, 1940, ndị agha Germany weghaara Denmark. Ebe ọ bụ na e nyere nnọọ ụmụ amaala Denmark nnwere onwe, anyị nọgidere na-arụ ọrụ nkwusa anyị.

Otu ihe dị ịtụnanya meziri. Papa m ghọrọ Onyeàmà na-eguzosi ike n’ihe nke na-arụsi ọrụ ike, na-eme ka obi ụtọ nke ezinụlọ anyị zuo ezuo. N’ihi ya, mgbe a kpọrọ mụ na ụmụ amaala anọ ọzọ nke Denmark òkù ịga klas nke asatọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead, ezinụlọ m dum kwadoro m. E nwere ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ  ahụ nke were ọnwa ise, bụ́ nke malitere na September 1946, n’otu ogige ụlọ akwụkwọ mara mma nke dị nnọọ ná mpụga South Lansing, n’ebe ugwu nke New York.

Ọzụzụ M Nwetara na Gilead na Mgbe M Pụtasịrị na Gilead

Gilead nyere m ohere imete ezigbo ndị enyi ọhụrụ. N’otu uhuruchi, ka mụ na Harold King nke si England nọ na-akpagharị n’ogige ụlọ akwụkwọ ahụ, anyị kwurịtara banyere ebe a pụrụ iziga anyị mgbe e nyesịrị anyị ọzụzụ. “Agaghị m ekweta na ahụla m ọnụ ọnụ ugwu ọcha ndị dị na Dover anya ikpeazụ,” ka Harold kwuru. O kwuru eziokwu, ma o were afọ 17 tupu ya ahụ ọnụ ọnụ ugwu ndị ahụ ọzọ, ọ nọkwara afọ anọ na ọkara n’ime afọ ndị ahụ n’ọnụ ụlọ mkpọrọ otu onye nke dị na China! *

Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ, e zigara m Texas, U.S.A., ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, na-eleta ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova iji nyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. A nabatara m n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Nye ụmụnna nọ na Texas, ọ bụ ihe na-akpali mmasị inwe nwa okorobịa bụ́ onye Europe, bụ́ onye ka gụsịrị nnọọ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ma mgbe m nọsịrị nanị ọnwa asaa na Texas, a kpọrọ m òkù ịbịa n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York. N’ebe ahụ, Nwanna Knorr kenyere m ọrụ n’ọfịs, na-enye m ntụziaka ka m mụọ usoro ọrụ si aga ná ngalaba nile. E mesịa, mgbe m laghachiri Denmark, m gaje itinye ihe m mụtara n’ọrụ, na-ejide n’aka na e mere ihe nile n’otu ụzọ ahụ e si eme ha na Brooklyn. Ihe e bu n’uche bụ ka a na-arụ ọrụ n’otu ụzọ n’alaka ndị dị gburugburu ụwa ka e wee na-arụpụtakwu ihe. Mgbe e mesịrị, Nwanna Knorr kpọfere m Germany.

Itinye Ntụziaka n’Ọrụ n’Alaka Dị Iche Iche

Mgbe m rutere na Wiesbaden, Germany, na July 1949, ọtụtụ obodo ndị dị na Germany ka bụ mkpọmkpọ ebe. Ndị na-edu ndú n’ọrụ nkwusa bụ ndị ikom a kpagbuworo malite n’oge Hitler weghaara ọchịchị na 1933. Ụfọdụ anọwo n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ afọ asatọ ruo iri ma ọ bụ karịa! Esoro m ndị ohu Jehova dị otú ahụ rụọ ọrụ ruo afọ atọ na ọkara. Ihe nlereanya ha pụrụ iche na-echetara m ihe onye Germany na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Gabriele Yonan kwuru, bụ́ onye dere, sị: “E wezụga ihe nlereanya nke ìgwè Ndị Kraịst a guzosiri ike n’okpuru Ọchịchị aka ike nke ndị Nazi—ka oge Auschwitz na oge Oké Mgbukpọ ahụ gasịrị—anyị gaara enwe obi abụọ ma ọ̀ ga-ekwe omume ma ọlị ịgbaso ozizi Ndị Kraịst nke Jizọs kụziri.”

Ọrụ m n’alaka ahụ na nke m rụrụ na Denmark bụ otu ihe: iwebata usoro ọhụrụ e si ahazi ihe bụ́ nke ya na ndị nke alaka ndị ọzọ bụ otu. Ozugbo ụmụnna ndị Germany ghọtara na mgbanwe ndị a abụtụghị iji katọọ ọrụ ha—kama na oge eruwo ka alaka dị iche iche na isi ụlọ ọrụ na-arụkọ ọrụ ọnụ—ha nwere obi ụtọ ma nwee mmụọ dị mma nke inye nkwado.

Na 1952, enwetara m akwụkwọ ozi sitere n’ọfịs Nwanna Knorr, na-agwa m ka m kwaga n’alaka dị na Bern, Switzerland. E kenyere m ije ozi dị ka onye nlekọta alaka n’ebe ahụ, malite na January 1, 1953.

 Ọṅụ Ọhụrụ Ndị M Nwere na Switzerland

N’oge na-adịghị anya ka m rutesịrị Switzerland, ezutere m Esther ná mgbakọ, n’oge na-adịghịkwa anya, anyị kwekọrịtara ịlụ. N’August 1954, Nwanna Knorr nyere m ntụziaka ịbịa Brooklyn, bụ́ ebe a gwara m otú a ga-esi arụ otu ọrụ ọhụrụ na-akpali akpali. Ebe ọ bụ na alaka ụlọ ọrụ ndị dị gburugburu ụwa amụbawo n’ọnụ ọgụgụ ma sawanye mbara nke ukwuu, e mere ndokwa ọhụrụ. E kewara ụwa nile gaa na zoonu na zoonu, onye nlekọta zoonu ga na-eleta zoonu nke ọ bụla. E nyere m abụọ n’ime zoonu ndị a ilekọta: Europe na ógbè Mediterenian.

N’oge na-adịghị anya ka m nọsịrị obere oge na Brooklyn, alaghachiri m Switzerland ma kwadebe maka ọrụ zoonu. Mụ na Esther lụrụ, o sonyekwara m n’ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Switzerland. Njem mbụ m mere kpọgara m n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ na n’alaka ndị dị n’Ịtali, Gris, Saịprọs, mba ndị dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nakwa n’akụkụ ụsọ oké osimiri nke Ebe Ugwu Africa, na Spen, na Portugal—mba 13 n’ozuzu. Mgbe m letaghachichara Bern, emere m njem gaa mba Europe ndị ọzọ nile na-akwadoghị Mba Soviet Union. N’ime afọ mbụ nke alụmdi na nwunye anyị, emere m njem ruo ọnwa isii, na-elekọta ụmụnna anyị Ndị Kraịst.

Mgbanwe nke Ọnọdụ

Na 1957, Esther chọpụtara na ya dị ime, ebe ọ bụkwa na e guzobeghị alaka maka ndị nne na nna nwere ụmụ, anyị kpebiri ịkwaga Denmark, bụ́ ebe papa m nabatara anyị isoro ya biri. Esther lekọtara nwa anyị nwanyị bụ́ Rakel, na papa m, ebe m nyere aka n’ọrụ ndị e nwere n’alaka ụlọ ọrụ ahụ e wuru ọhụrụ. Ejere m ozi dị ka onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze maka ndị nlekọta ọgbakọ ma nọgidekwa na-eje ozi dị ka onye nlekọta zoonu.

Ọrụ ilekọta zoonu pụtara ime njem ruo ogologo oge, bụ́ nke mere n’ụzọ dị mwute ka m ghara ịnọ nwa m nwanyị nso ruo ogologo oge. Nke ahụ kpatara nsogbu nke ya. Ọ dị mgbe m nọrọ oge ụfọdụ na Paris, bụ́ ebe m guzobere otu ntakịrị ụlọ ọrụ na-ebi akwụkwọ. Esther na Rakel ji ụgbọ okporo ígwè bịa ileta m ma rute na Gare du Nord. Mụ na Léopold Jontès nke si n’alaka ụlọ ọrụ gara izute ha. Rakel guzooro na steepu nke ụgbọ okporo ígwè ahụ, lee Léopold anya, lee m, ma leghachi Léopold anya, ma makụzie Léopold!

Mgbanwe ọzọ dị ịrịba ama mere mgbe m dị afọ 45, bụ́ mgbe m hapụrụ ozi oge  nile iji rụọ ọrụ ego iji kwado ezinụlọ m. N’ihi ahụmahụ m dị ka onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, enwetara m ọrụ dị ka manịja na-ahụ maka ibupụ ngwá ahịa ná mba ọzọ. Mgbe m rụwooro otu ụlọ ọrụ ahụ ọrụ ruo ihe dị ka afọ itoolu, Rakel agụchaakwa akwụkwọ, anyị kpebiri ime ihe banyere agbamume e nyere ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze.

Mgbe m tụlesịrị ohere inweta ọrụ na Norway, ajụrụ m otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka iwe ndị ọrụ ma ọ ga-ekwe omume inweta ọrụ. Azịza m nwetara adịghị agba ume. E nwere olileanya dị nta maka nwoke dị afọ 55. N’agbanyeghị nke ahụ, akpọtụụrụ m alaka ụlọ ọrụ dị n’Oslo ma gbaziri otu ụlọ nke dị nso n’obodo Drøbak, na-enwe nchekwube na ọrụ ga-adapụta. Otu dapụtara, oge ije ozi Alaeze na-enye ọṅụ na Norway sochikwara.

Oge ndị kasị mma anyị nwere bụ mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ọgbakọ anyị mere njem gaa ebe ugwu ije rụọ ókèala a na-eketaghị ọrụ na ya. Anyị gbaziiri ntakịrị ụlọ ndị dị n’ebe ndị bịara ezumike na-anọ, kwa ụbọchị kwa, anyị kpọtụụrụ ndị nọ n’ugbo ndị dịsasịrị adịsasị n’ọmarịcha ugwu. Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịgwa ndị a nwere omume enyi banyere Alaeze Chineke. Anyị nyefere ọtụtụ akwụkwọ, ma ime nletaghachi ga-abụ n’afọ na-eso ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ahụ echefughị anyị! Esther na Rakel ka na-echeta oge anyị laghachiri, ha amakụọ anyị dị ka ndị òtù ezinụlọ a na-ahụbeghị eri oge dị anya. Mgbe anyị nọsịrị afọ atọ na Norway, anyị laghachiri Denmark.

Ọṅụ nke Ndụ Ezinụlọ

N’oge na-adịghị anya, Rakel na Niels Højer, bụ́ onye ozi oge nile na-anụ ọkụ n’obi, kwere onwe ha nkwa ọlụlụ. Mgbe ha lụsịrị, Niels na Rakel nọgidere na-asụ ụzọ ruo mgbe ha mụrụ ụmụ. Niels abụwo ma ezigbo di ma ezigbo nna, na-egosi nnọọ ezi mmasị n’ebe ezinụlọ ya nọ. N’otu isi ụtụtụ, ọ kwọọrọ nwa ya nwoke n’ịnyịnya ígwè ya gbadaa n’ụsọ mmiri iji kirie ka anwụ na-awa. Otu onye agbata obi ha jụrụ nwa okoro ahụ ihe ha gara mee n’ebe ahụ. Ọ zara, sị: “Anyị kpegaara Jehova ekpere.”

N’afọ ole na ole ka e mesịrị, mụ na Esther kiriri mgbe e mere ụmụ ụmụ anyị ndị kasị okenye, bụ́ Benjamin na Nadja, baptizim. Otu n’ime ndị kiriri ihe merenụ bụ Niels, bụ́ onye guzo m n’ihu n’ụzọ m na-atụghị anya ya. O lere m anya ma kwuo, sị, “Ndị dimkpa adịghị ebe ákwá.” N’agbanyeghị nke ahụ, n’oge sochirinụ, anyị abụọ makụrụ onwe anyị na-ebe ákwá. Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ inwe ọgọ gị na ya pụrụ ịchịkọ ọchị ma bekọọ ákwá!

Ịnọ Na-eme Mgbanwe Iji Kwekọọ n’Ọnọdụ M

Ngọzi ọzọ bịara mgbe a gwara mụ na Esther ka anyị lọghachi n’alaka ụlọ ọrụ Denmark iji jee ozi. Otú ọ dị, ka ọ na-erule mgbe ahụ, a malitewo ime nkwadebe iwu alaka ụlọ ọrụ buru ibu karị na Holbæk. Enwere m ihe ùgwù nke ikere òkè n’ilekọta ọrụ owuwu ihe ahụ, bụ́ nke ọ bụ ndị ọrụ a na-akwụghị ụgwọ wuru. N’agbanyeghị oké oyi e nwere, ka ọ na-erule ná ngwụsị afọ 1982, e wuchara akụkụ bụ́ isi nke ihe owuwu ahụ, anyị nile nwekwara obi ụtọ ịkwafe n’ihe owuwu e mere ka o buwanye ibu ma ka mma!

N’oge na-adịghị anya, amalitere m ịrụ ọrụ ọfịs, bụ́ nke nyere m afọ ojuju dị ukwuu, ebe Esther na-ahụ maka telifon. Otú ọ dị, ka oge na-aga, a wara ya ahụ́ iji gbanwee úkwù ya, mgbe otu afọ na ọkara gasịkwara, a wara ya ahụ́ na mgbuilu. N’agbanyeghị nchebara echiche ndị na-arụ ọrụ n’alaka ahụ ji obiọma gosipụta n’ebe anyị nọ, anyị kpebiri na ọ ga-akara ndị nile o metụtara mma ma ọ bụrụ na anyị ahapụ alaka ahụ. Anyị kwagara n’ọgbakọ nwa anyị nwanyị na ezinụlọ ya nọ na ya.

Taa, ahụ́ ike Esther adịghị mma. N’agbanyeghị nke ahụ, apụrụ m ikwu n’ezie na n’oge nile anyị jekọrọ ozi, nakwa n’ọtụtụ ọnọdụ ndị gbanwerenụ, ọ bụwo ezigbo onye nkwado na onye ibe. N’agbanyeghị ahụ́ ike anyị nke na-adịwanye njọ, anyị abụọ ka na-ekeretụ òkè n’ọrụ nkwusa. Mgbe m tụgharịrị uche banyere ndụ m, ana m eji obi ekele echeta okwu nke ode abụ ahụ, bụ́: “Chineke, I ziwo m ihe site na nwata.”—Ọma 71:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Lee Ụlọ Nche (Bekee), July 15, 1963, peeji nke 437-442.

[Foto dị na peeji nke 24]

Ka anyị na-ebutu akwụkwọ e bubatara n’alaka Germany a ka na-ewu ewu na 1949

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị mụ na ha rụkọrọ ọrụ gụnyere Ndịàmà dị ka ndị a si n’ogige ịta ahụhụ lọta

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Mụ na Esther taa, na n’ụbọchị agbamakwụkwọ anyị na Betel dị na Bern, October 1955