Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgide Na-eme Ihe Ndị Ị Mụtaworo

Nọgide Na-eme Ihe Ndị Ị Mụtaworo

 Nọgide Na-eme Ihe Ndị Ị Mụtaworo

“Ihe ndị unu mụtara ma nakwere, nke unu nụkwara ma hụ n’ihe metụtara m, na-emenụ ndị a; Chineke nke udo ga-anọnyekwara unu.”—NDỊ FILIPAỊ 4:9.

1, 2. N’ozuzu, Bible ọ̀ na-enwe mmetụta ná ndụ ndị na-ewere onwe ha dị ka ndị ji okpukpe kpọrọ ihe? Kọwaa.

“OKPUKPE Na-agbanye Mkpọrọgwụ, Ma Omume Ọma Na-ala Ala.” Isi akụkọ a nke gbara n’obere akwụkwọ akụkọ bụ́ Emerging Trends, chịkọtara ihe a chọpụtara ná njụta echiche e mere na United States dum. N’ụzọ doro anya, mba ahụ enwewo mmụba n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-aga chọọchị ma na-asị na okpukpe na-ewere ọnọdụ dị mkpa ná ndụ ha. Otú ọ dị, akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “N’agbanyeghị ọnụ ọgụgụ a buru ibu, o doro anya na ọtụtụ ndị America na-enwe obi abụọ banyere mmetụta okpukpe na-enwe ná ndụ ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa n’ebe ọha mmadụ n’ozuzu ha nọ.”

2 Ọ bụghị nanị n’otu mba ka e nwere ọnọdụ a. N’ụwa nile, ọtụtụ ndị na-asị na ha kwere na Bible ma bụrụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe adịghị ekwe ka Akwụkwọ Nsọ nwee mmetụta ná ndụ ha n’ezie. (2 Timoti 3:5) “Anyị ka ji Bible kpọrọ ihe nke ukwuu,” ka onyeisi nke otu òtù ndị nnyocha kwuru, “ma a bịa n’ihe banyere iwepụta oge n’ezie iji na-agụ ya, na-amụ ya ma na-etinye ya n’ọrụ—nke ahụ bụ ihe mgbe ochie.”

3. (a) Olee otú Bible si enwe mmetụta n’ahụ́ ndị ghọrọ ezi Ndị Kraịst? (b) Olee otú ụmụazụ Jizọs si etinye ndụmọdụ Pọl e dekọrọ ná Ndị Filipaị 4:9 n’ọrụ?

 3 Otú ọ dị, n’ebe ezi Ndị Kraịst nọ, ọnọdụ ahụ dị iche. Itinye ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke n’ọrụ agbanwewo ụzọ ha si eche echiche na àgwà ha. Ndị ọzọ na-ahụkwa ụdị mmadụ ọhụrụ ha bụ ngwa ngwa. (Ndị Kọlọsi 3:5-10) Nye ụmụazụ Jizọs, Bible abụghị akwụkwọ a na-adịghị eji eme ihe nke na-ekpo uzuzu n’elu shelf. N’ụzọ dị iche, Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ na Filipaị, sị: “Ihe ndị unu mụtara ma nakwere, nke unu nụkwara ma hụ n’ihe metụtara m, na-emenụ ndị a; Chineke nke udo ga-anọnyekwara unu.” (Ndị Filipaị 4:9) Ndị Kraịst na-eme ihe karịrị ịnakwere eziokwu nke Okwu Chineke. Ha na-eme ihe ha na-amụta, nọgide na-etinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ—n’ezinụlọ, n’ebe ọrụ, n’ọgbakọ, na n’akụkụ nile ọzọ nke ndụ.

4. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ịma aka itinye iwu Chineke n’ọrụ?

4 Itinye iwu na ụkpụrụ Chineke n’ọrụ adịghị mfe. Anyị na-ebi n’ụwa nke nọ n’okpuru ike Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye Bible na-akpọ “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19) N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ịnọ na nche megide ihe ọ bụla ga-egbochi anyị ịgbaso ụzọ ndụ nke iguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova Chineke. Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe?

Na-ejide “Ụkpụrụ nke Okwu Na-enye Ezi Ndụ”

5. Gịnị ka okwu Jizọs bụ́: ‘Nọgide na-eso m,’ pụtara?

5 Otu akụkụ nke ime ihe anyị mụtaworo na-agụnye iji iguzosi ike n’ihe na-akwado ezi ofufe, n’agbanyeghị mmegide sitere n’aka ndị na-ekweghị ekwe. Ntachi obi chọrọ ịdị na-eme mgbalị. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ,” ka Jizọs kwuru, “ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Matiu 16:24) Jizọs asịghị na anyị kwesịrị iso ya ruo nanị otu izu, otu ọnwa, ma ọ bụ otu afọ. Kama nke ahụ, o sịrị: ‘Nọgide na-eso m.’ Okwu ya na-egosi na anyị ịbụ ndị na-eso ụzọ apụghị ịbụ ihe omume na-adịru nanị nwa oge ná ndụ anyị ma ọ bụ ofufe nkịtị nke na-adịru nanị nwa oge. Iji iguzosi ike n’ihe na-akwado ezi ofufe pụtara na anyị ga-eji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ụzọ ndụ nke anyị họrọwooro, n’agbanyeghị ihe pụrụ ime. Olee otú anyị pụrụ isi na-eme nke ahụ?

6. Gịnị bụ ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ mụtara n’ọnụ Pọl?

6 Pọl gbara onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti ume, sị: “Nọgide na-ejide ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ bụ́ ndị ị nụrụ n’ọnụ m n’okwukwe na ịhụnanya ndị dị n’ihe metụtara Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 1:13) Gịnị ka Pọl bu n’uche? Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ụkpụrụ” na-ezo aka n’ụzọ nkịtị n’ihe onye na-ese ihe sere ọkụ ọkụ. Ọ bụ ezie na ihe osise dị otú ahụ adịghị egosipụtacha otú ihe a chọrọ ise ga-adị, ọ na-egosipụta nke ọma ihe a chọrọ ise, nke na onye ji nghọta na-ele ya pụrụ ịghọtacha ihe ihe osise ahụ bụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, e meghị ụkpụrụ nke eziokwu ahụ Pọl kụziiri Timoti na ndị ọzọ ka o nye azịza a kapịrị ọnụ maka ajụjụ ọ bụla a pụrụ ịjụ. Otú ọ dị, ozizi ahụ n’ozuzu ya na-enye nduzi zuru ezu—ihe e sere ọkụ ọkụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya—ka ndị nwere obi eziokwu wee nwee ike ịghọta ihe Jehova na-achọ n’aka ha. N’ezie, iji na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ ga-adị ha mkpa ịnọgide na-ejide ụkpụrụ nke eziokwu ahụ site n’ime ihe ha mụtaworo.

7. Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi na-arapagidesi ike n’ụkpụrụ nke okwu ahụ na-enye ezi ndụ?

7 Na narị afọ mbụ, ndị dị ka Haịmeniọs, Alekzanda, na Faịlitọs nọ na-akwalite echiche ndị na-ekwekọghị ‘n’okwu ahụ na-enye ezi ndụ.’ (1 Timoti 1:18-20; 2 Timoti 2:16, 17) Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ pụrụ isi zere ịbụ ndị ndị si n’ezi ofufe dapụ duhiere? Ọ bụ site n’iji nlezianya na-amụ ihe odide ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ ma na-etinye ha n’ọrụ ná ndụ ha. Ndị na-agbaso ihe nlereanya nke Pọl na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi ghọtara ma jụ ihe ọ bụla na-ekwekọghị n’ụkpụrụ nke eziokwu ahụ a kụziiri ha. (Ndị Filipaị 3:17; Ndị Hibru 5:14) Kama ịbụ ndị “oké ajụjụ na nrụrịta ụka banyere okwu na-agba ara,” ha nọgidere na-aga n’ihu n’ụzọ ndụ ha ziri ezi nke ịsọpụrụ Chineke. (1 Timoti 6:3-6 ) Anyị na-eme otu ihe ahụ mgbe anyị nọgidere  na-etinye eziokwu ahụ anyị mụtaworo n’ọrụ. Lee ka o si bụrụ ihe na-ewusi okwukwe ike ịhụ na ọtụtụ nde ndị na-ejere Jehova ozi n’ụwa nile nọgidere na-ejidesi ụkpụrụ nke eziokwu nke Bible a kụziwooro ha ike.—1 Ndị Tesalonaịka 1:2-5.

Jụ ‘Akụkọ Ụgha’

8. (a) Olee otú Setan si achọ imebi okwukwe anyị taa? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa nke Pọl ka a na-achọta na 2 Timoti 4:3, 4?

8 Setan na-agbalị imebi iguzosi ike n’ezi ihe anyị site n’ime ka anyị malite inwe obi abụọ banyere ihe ndị a kụziwooro anyị. Taa, dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ na-achọ imebi okwukwe nke ndị aka ha dị ọcha. (Ndị Galeshia 2:4; 5:7, 8) Mgbe ụfọdụ, ha na-eji usoro mgbasa ozi agbasa ihe ọmụma ndị a gwagburu agwagbu ma ọ bụ ọbụna ụgha ọcha banyere ụzọ ndị Jehova si eme ihe na ebumnobi ha. Pọl dọrọ aka ná ntị na a ga-ewezụga ụfọdụ n’eziokwu ahụ. “A ga-enwe oge,” ka o dere, “mgbe ha na-agaghị anagide ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha, ha ga-akpọkọjuru onwe ha ndị ozizi iji mee ka ntị ha na-akọ ha ọkọ; ha ga-ewepụkwa ntị ha n’ebe eziokwu ahụ dị, ebe a ga-eme ka ha chigharịa gaa n’akụkọ ụgha.”—2 Timoti 4:3, 4.

9. Gịnị ka ọ pụrụ ịbụ na Pọl bu n’uche mgbe o kwuru banyere ‘akụkọ ụgha’?

9 Kama ijide ụkpụrụ nke okwu ahụ na-enye ezi ndụ, ‘akụkọ ụgha’ dọọrọ mmasị ụfọdụ ndị. Gịnị bụ akụkọ ụgha ndị a? Ikekwe ihe Pọl bu n’uche bụ akụkọ mgbe ochie ndị e chepụtara echepụta, dị ka ndị a na-achọta n’akwụkwọ apọkrịfa bụ́ Tobit. * Akụkọ ụgha ndị ahụ pụkwara ịgụnye kepu kepu ndị na-akpali akpali a na-ejighị n’aka. N’oge ahụ kwa, ụfọdụ—“n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha”—pụrụ ịbụwo ndị ndị na-akwado echiche nke mmadụ idebe ụkpụrụ Chineke ndị masịrị ha ma ọ bụ ndị na-akatọkarị ndị na-edu ndú n’ọgbakọ duhiere. (3 Jọn 9, 10; Jud 4) N’agbanyeghị ihe mkpọbi ụkwụ ọ bụla e nwere, o doro anya na ụfọdụ họọrọ ụgha karịa eziokwu nke Okwu Chineke. N’oge na-adịghị anya, ha kwụsịrị ime ihe ndị ha mụtaworo, nke a merụkwara ha ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ.—2 Pita 3:15, 16.

10. Olee ụfọdụ akụkọ ụgha e nwere n’oge a, oleekwa otú Jọn si kọwapụta mkpa ọ dị ịmụrụ anya?

10 Anyị pụrụ izere ịbụ ndị akụkọ ụgha dọtara taa ma ọ bụrụ na anyị na-eme nnyocha nke ọma ma na-ahọrọ ihe ndị anyị na-ege ntị na ha na ihe ndị anyị na-agụ ahọrọ. Dị ka ihe atụ, usoro mgbasa ozi na-akwalitekarị omume rụrụ arụ. Ọtụtụ mmadụ na-agba ume ka a ghara ịchọ ịmara ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụkwanụ ka a ghara ikwere ma ọlị na ọ dị. Ndị oké nkatọ Bible na-akwa ihe Bible kwuru, bụ́ na e  dere ya n’ike mmụọ nsọ Chineke, emo. Ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge a nọgidekwara na-agbalị ịkụnye mkpụrụ nke obi abụọ iji mebie okwukwe nke Ndị Kraịst. Banyere ihe ize ndụ yiri ya nke ndị amụma ụgha kpatara na narị afọ mbụ, Jọn onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu nile sitere ná mkpali nke mmụọ, kama nwaleenụ okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ ịhụ ma hà sitere na Chineke, n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abawo n’ime ụwa.” (1 Jọn 4:1) Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịdị na-elezi anya.

11. Olee otu ụzọ anyị ga-esi nwalee ma hụ ma anyị nọ n’okwukwe ahụ?

11 Banyere nke a, Pọl dere, sị: “Nọgidenụ na-anwale ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ.” (2 Ndị Kọrint 13:5) Onyeozi ahụ gbara anyị ume ịnọgide na-anwale onwe anyị iji mata ma anyị na-agbaso nkwenkwe nile nke Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị na-adị na-ege ndị na-adịghị enwe afọ ojuju ntị, ọ dị anyị mkpa iji ekpere nyochaa onwe anyị. (Abụ Ọma 139:23, 24) Ànyị na-atụchakarị ndị Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Okwu ọnụ ma ọ bụ omume nke otu onye ò wutewo anyị? Ọ bụrụ otú ahụ, ànyị na-ele ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị? Mkpagbu ọ bụla anyị pụrụ iche ihu n’usoro ihe a ga-adị nwa oge. (2 Ndị Kọrint 4:17) Ọ bụrụgodị na anyị ezute ọnwụnwa ụfọdụ n’ọgbakọ, gịnị mere anyị ga-eji kwụsị ijere Chineke ozi? Ọ bụrụ na anyị na-ewe iwe n’ihi otu ihe, ọ̀ bụ na ọ kaghị nnọọ mma ime ihe anyị pụrụ ime iji dozie okwu ahụ ma hapụzie ya n’aka Jehova?—Abụ Ọma 4:4; Ilu 3:5, 6; Ndị Efesọs 4:26.

12. Olee otú ndị Beria si setịpụrụ anyị ezi ihe nlereanya?

12 Kama ịdị na-eme nkatọ, ka anyị nọgide na-ele ihe ọmụma ndị anyị na-enweta n’ọmụmụ ihe onwe onye na ná nzukọ ọgbakọ anya otú kwesịrịnụ n’ụzọ ime mmụọ. (1 Ndị Kọrint 2:14, 15) Kamakwa inwewe obi abụọ banyere Okwu Chineke, lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya karị inwe àgwà ndị Beria narị afọ mbụ nwere bụ́ ndị nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma! (Ọrụ 17:10, 11) Ya mere, ka anyị na-eme ihe anyị na-amụta, na-ajụ akụkọ ụgha ma na-arapagidesi ike n’eziokwu ahụ.

13. Olee otú anyị pụrụ isi na-agbasa akụkọ ụgha n’amaghị ama?

13 E nwere ụdị akụkọ ụgha ọzọ nke ọ dị mkpa ka anyị nọrọ na nche megide. A na-agbasa ọtụtụ akụkọ ndị na-akpali akpali, ọtụtụ mgbe site n’ozi E-mail. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịkpachara anya banyere akụkọ ndị dị otú ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị amaghị ebe ihe ọmụma ahụ sitere. Ọ bụrụgodị na ọ bụ Onye Kraịst nwere ezi aha zitere otu ahụmahụ ma ọ bụ akụkọ, ọ pụrụ ịbụ na onye ahụ ejighị anya ya hụ otú ihe ahụ si mee. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ịkpachara anya banyere ịkọrọ onye ọzọ ma ọ bụ izipụ akụkọ a na-achọpụtaghị ma ọ̀ bụ eziokwu. N’ezie, anyị agaghị achọ ịkọrọ ndị ọzọ “akụkọ ifo ndị na-emegide Chineke,” ma ọ bụ “akụkọ ụgha bụ́ ndị na-emerụ ihe dị nsọ.” (1 Timoti 4:7; New International Version) Ebe ọ bụ na anyị nwekwara  ibu ọrụ ịgwarịta ibe anyị eziokwu, anyị ga-abụ ndị na-eme ihe n’ụzọ amamihe site n’izere ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na-agbasa ihe ndị na-abụghị eziokwu, ọbụna n’amaghị ama.—Ndị Efesọs 4:25.

Ezi Ihe Ndị Na-esi n’Ime Ihe Kwekọrọ n’Eziokwu ahụ Apụta

14. Uru ndị dị aṅaa ka anyị na-erite site n’ime ihe ndị anyị mụtaworo site n’Okwu Chineke?

14 Ime ihe ndị anyị na-amụta site n’ọmụmụ Bible onwe onye na nzukọ Ndị Kraịst ga-eweta ọtụtụ abamuru. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịchọpụta na mmekọrịta anyị na ndị anyị na ha nọ n’okwukwe na-aka mma. (Ndị Galeshia 6:10) Àgwà anyị ga-agbanwe n’ụzọ ka mma mgbe anyị na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. (Abụ Ọma 19:8) Ọzọkwa, site n’ime ihe anyị na-amụta, anyị ‘na-achọ ozizi Chineke mma,’ o yikwara ka ànyị ga-adọta ndị ọzọ n’ezi ofufe.—Taịtọs 2:6-10.

15. (a) Olee otú otu onye na-eto eto si kata obi gbaa àmà n’ụlọ akwụkwọ? (b) Gịnị ka ị mụtara n’ahụmahụ a?

15 E nwere ọtụtụ ndị na-eto eto nọ n’etiti Ndịàmà Jehova bụ́ ndị na-eme ihe ha mụtaworo site n’ịmụ Bible na akwụkwọ dị iche iche nke Ndị Kraịst n’onwe ha nakwa site n’ịnọ ya mgbe nile ná nzukọ ọgbakọ. Àgwà ọma ha na-agba àmà siri ike nye ndị nkụzi ha na ụmụ akwụkwọ ibe ha n’ụlọ akwụkwọ. (1 Pita 2:12) Tụlee ihe banyere Leslie, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 13 nke bi na United States. O kwetara na ọ na-esiburu ya ike ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe ya banyere nkwenkwe ya, ma nke ahụ gbanwere otu ụbọchị. “Ndị klas m nọ na-ekwu banyere otú ndị mmadụ si agbalị ire ihe. Otu nwa agbọghọ weliri aka elu ma kpọọ Ndịàmà Jehova aha.” Dị ka Onyeàmà, olee otú Leslie si meghachi omume? “Agọpụụrụ m okwukwe m,” ka ọ na-ekwu, “bụ́ nke m ji n’aka na o juru onye ọ bụla anya, ebe ọ bụ na m na-anọkarị nnọọ nwayọọ n’ụlọ akwụkwọ.” Gịnị si ná nkwuwa okwu Leslie pụta? “Enyefere m nwa akwụkwọ ahụ broshuọ na traktị, ebe ọ bụ na o nwere ajụjụ ndị ọzọ,” ka Leslie na-ekwu. Lee ka Jehova na-aghaghị isi na-aṅụrị ọṅụ mgbe ndị na-eto eto bụ́ ndị na-eme ihe ha mụtaworo katara obi ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ!—Ilu 27:11; Ndị Hibru 6:10.

16. Olee otú Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke siworo baara otu Onyeàmà na-eto eto uru?

16 Ihe atụ ọzọ bụ nke Elizabeth. Malite mgbe ọ dị afọ asaa ruokwa oge nile ọ nọrọ n’ụlọ akwụkwọ elementrị, nwa agbọghọ nta a na-akpọ ndị nkụzi ya òkù ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ọ bụla o nwere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọ bụrụ na onye nkụzi apụghị ịbịa, Elizabeth na-echere ma a gbasaa akwụkwọ iji meere onye nkụzi ahụ ihe omume ahụ. N’afọ ikpeazụ ya n’ụlọ akwụkwọ dị elu, Elizabeth dere akụkọ dị peeji iri banyere uru Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bara ma gụọ ya n’ihu otu ìgwè ndị nkụzi anọ. A gwakwara ya ka o mee ihe omume nlereanya nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ nke ọ họọrọ iji isiokwu bụ́ “N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?” mee. Elizabeth eritewo uru site n’usoro mmụta nke Ndịàmà Jehova mere ndokwa ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọ bụ nanị otu n’ime Ndị Kraịst na-eto eto bụ́ ndị na-ewetara Jehova otuto site n’ime ihe ndị ha mụtaworo site n’Okwu ya.

17, 18. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Bible na-enye banyere ime ihe n’eziokwu? (b) Olee otú ime ihe n’eziokwu nke otu n’ime Ndịàmà Jehova si metụta otu nwoke?

17 Bible na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ịdị na-eme ihe  n’eziokwu n’ihe nile. (Ndị Hibru 13:18) Emeghị ihe n’eziokwu pụrụ imebi mmekọrịta anyị na ndị ọzọ na, nke ka mkpa, nke anyị na Jehova n’onwe ya. (Ilu 12:22) Omume anyị a pụrụ ịtụkwasị obi na-agba akaebe na anyị na-eme ihe ndị anyị mụtaworo, o mewokwa ka ọtụtụ ndị na-akwanyekwuru Ndịàmà Jehova ùgwù.

18 Tụlee ahụmahụ nke otu onye agha aha ya bụ Phillip. O dohiere akwụkwọ ndọrọ ego a na-edeghị ihe nke a bịanyeworo aka na ya, ọ maghịkwa ruo mgbe e si na post ọfịs weghachiri ya akwụkwọ ahụ. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova hụrụ akwụkwọ ndọrọ ego ahụ, mpempe akwụkwọ e zitekọtakwara ya na ya kwuru na nkwenkwe okpukpe nke onye hụrụ ya kpaliri ya iweghachi ya. Akpata oyi wụrụ Phillip n’ahụ́. “Ha gaara ezu m $9,000!” ka o kwuru. E mechuwo ya ihu n’oge ọzọ mgbe e zuru okpu ya na chọọchị. O doro anya na ọ bụ onye maara ya weere okpu ya, ebe onye na-amaghị ya weghachiri akwụkwọ ndọrọ ego nke ọnụ ego ya ruru puku dollar itoolu! N’ezie, Ndị Kraịst na-eme ihe n’eziokwu na-ewetara Jehova Chineke nsọpụrụ!

Nọgide Na-eme Ihe Ị Mụtaworo

19, 20. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịdị na-eme ihe kwekọrọ n’ihe ndị anyi na-amụta n’Akwụkwọ Nsọ?

19 Ndị na-eme ihe ha mụtaworo site n’Okwu Chineke na-enweta ọtụtụ abamuru. Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Onye na-enyonye anya n’iwu ahụ zuru okè nke dịịrị nnwere onwe, onye na-anọgidekwa na ya, onye a, n’ihi na ọ ghọwo, ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama onye na-arụ ọrụ ahụ, ga-enwe obi ụtọ na ọ na-arụ ya.” (Jems 1:25) Ee, ọ bụrụ na anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ihe ndị anyi na-amụta n’Akwụkwọ Nsọ, anyị ga-enwe ezi obi ụtọ, anyị ga-enwekwa ike karị ịnagide nrụgide dị iche iche nke ndụ. Nke kasị mkpa, anyị ga-enweta ngọzi Jehova na atụmanya nke ndụ ebighị ebi!—Ilu 10:22; 1 Timoti 6:6.

20 Ya mere, nọgidesie nnọọ ike na-amụ Okwu Chineke. Soro ndị na-efe Jehova ofufe na-ezukọ mgbe nile, ma na-ege ntị n’ihe ndị a na-amụ ná nzukọ Ndị Kraịst. Na-etinye ihe ị na-amụta n’ọrụ, nọgide na-eme ya, “Chineke nke udo ga-anọnyekwara [gị].”—Ndị Filipaị 4:9.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Tobit, nke e dere ma eleghị anya na narị afọ nke atọ T.O.A., na-agụnye akụkọ jupụtara na nkwenkwe ụgha banyere otu onye Juu aha ya bụ Tobias. E kwuru na o nwere ike inweta ikike ịgwọ ọrịa na nke ịchụpụ mmụọ ọjọọ site n’iji obi, òlùlù, na imeju nke otu azụ dị egwu eme ihe.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị bụ “ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ,” oleekwa otú anyị pụrụ isi nọgide na-ejide ya?

• ‘Akụkọ ụgha’ ndị dị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa ịjụ?

• Uru ndị dị aṅaa ka ndị na-eme ihe ndị ha na-amụta site n’Okwu Chineke na-erite?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 17]

Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ pụrụ isi zere ịbụ ndị ndị si n’ezi ofufe dapụ duhiere?

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

A pụrụ ịkụnye mkpụrụ nke obi abụọ site n’usoro mgbasa ozi, n’Intanet, nakwa site n’aka ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge a

[Foto dị na peeji nke 19]

Ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ịkọsa akụkọ a na-achọpụtaghị ma ọ̀ bụ eziokwu

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

N’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, na n’ebe ọ bụla ọzọ, Ndịàmà Jehova na-etinye ihe ha na-agụta n’Okwu Chineke n’ọrụ