Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Ndị Agbata Obi Bara Uru

Ezi Ndị Agbata Obi Bara Uru

 Ezi Ndị Agbata Obi Bara Uru

“Ọ dị mma, bụ́ agbata obi nke nọ nso, karịa nwanne nke nọ n’ebe dị anya.”—Ilu 27:10.

OTU ọkà mmụta na narị afọ mbụ O.A., jụrụ Jizọs, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Ná nzaghachi, Jizọs agwaghị ya onye bụ́ onye agbata obi ya, kama ihe na-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo onye agbata obi. Eleghị anya ị maara ihe atụ a nke Jizọs nke ọma. Ọtụtụ ndị maara ya dị ka ilu nke onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi, e dekọkwara ya n’Oziọma Luk. Otú a ka Jizọs si kọọ akụkọ ahụ:

“Otu nwoke si Jeruselem na-agbada Jeriko ma daba n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ ndị gbara ya ọtọ, kụọkwa ya ihe, wee pụọ, hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma. Ma, ná ndapụta, otu onye nchụàjà na-agbada n’okporo ụzọ ahụ, ma, mgbe ọ hụrụ ya, o si n’akụkụ nke ọzọ gafere. N’otu aka ahụ, onye Livaị kwa, mgbe o rutere ebe ahụ hụ ya, siri n’akụkụ nke ọzọ gafere. Ma otu onye Sameria nke na-eme njem n’ụzọ ahụ bịakwutere ya na mberede, mgbe ọ hụrụ ya, o nwere ọmịiko. Ya mere ọ gakwuuru ya wee kechie ọnyá ya, na-awụkwasị ha mmanụ na mmanya. O wee kukwasị ya n’anụ ụlọ nke ya ma kpọta ya n’ụlọ ndị njem wee lekọta ya. N’echi ya kwa, o wepụtara mkpụrụ ego dinarịọs abụọ, nye ha onye na-elekọta ụlọ ndị njem ahụ, wee sị, ‘Lekọta ya, m ga-akwụghachikwa  gị ihe ọ bụla i mefuru n’elu nke a mgbe m ga-abịaghachi n’ebe a.’ Ònye n’ime mmadụ atọ a yiri gị onye meworo onwe ya onye agbata obi nke nwoke ahụ dabara n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe?”—Luk 10:28-36.

O doro anya na ọkà mmụta ahụ ghọtara isi ihe dị n’ilu ahụ. N’egbughị oge, o kwuru kpọmkwem onye bụ́ onye agbata obi nke nwoke ahụ merụrụ ahụ́: “Onye ahụ nke mesoro ya ihe n’obi ebere.” Jizọs gwaziri ya sị: “Gawara onwe gị, na-emekwa otú ahụ n’onwe gị.” (Luk 10:37) Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe atụ dị irè nke ihe ịbụ ezi onye agbata obi pụtara! Ilu Jizọs pụrụ ọbụna ịkpali anyị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ụdị onye agbata obi dị aṅaa ka m bụ? Agbụrụ na mba a zụlitere m na ya ọ̀ na-emetụta otú m si ekpebi ndị bụ ndị agbata obi m? Ihe ndị ahụ hà na-ebelata ọrụ dịịrị m inyere mmadụ ibe m ọ bụla m hụrụ nọ ná nsogbu aka? M̀ na-eme ihe nile m pụrụ ime iji bụrụ ezi onye agbata obi?’

Ebee Ka A Ga-amalite?

Ọ bụrụ na anyị chere na ọ dị mkpa imeziwanye ihe n’akụkụ a, anyị aghaghị ịmalite n’otú anyị si eche echiche. Nchegbu anyị kwesịrị ihiwe isi n’ịbụ ezi ndị agbata obi. Nke a pụkwara iso mee ka anyị nwee ezi ndị agbata obi. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Jizọs mesiri ụkpụrụ ahụ dị mkpa nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya ike n’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama. Ọ sịrị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Iji nkwanye ùgwù, nsọpụrụ, na obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe na-akpali ha imeso gị ihe n’otu ụzọ ahụ.

N’isiokwu bụ́ “Ịhụ Onye Agbata Obi Gị n’Anya,” bụ́ nke pụtara na magazin bụ́ The Nation Since 1865, odeakụkọ na onye edemede bụ́ Lise Funderburg kwuru ihe ụfọdụ ndị dị mfe a pụrụ ime iji mee ka e nwee ezi ndị agbata obi. O dere, sị: “Achọrọ m . . . ka ndị agbata obi na-akpakọrịta, tụkwasị n’ọtụtụ obere ihe ọma ndị ha na-emere ibe ha—. . . ilekọta ụmụaka, ịzụtara mmadụ ihe n’ahịa. Achọrọ m ka mmekọrịta a dịrị n’ụwa nke kewasịworo nnọọ ekewasị, bụ́ ebe ụjọ na mpụ meworo ka obodo dị iche iche ghara inwe obi iru ala na ịnọ ná ntụkwasị obi.” Ọ na-agbakwụnyezi, sị: “Ị ghaghị ịmalite ya n’otu ebe. Ọ pụkwara ịbụ n’ebe onye bi n’ọnụ ụlọ nke ọzọ nọ.”

Magazin bụ́ Canadian Geographic kwukwara isi ihe bara uru bụ́ nke pụrụ inyere ndị agbata obi aka n’ịzụlite àgwà dị mma n’ebe ibe ha nọ. Onye edemede bụ́ Marni Jackson, kwuru, sị: “Dị ka mmadụ na-apụghị ịhọrọ ndị ga-abụ ndị òtù ezinụlọ ya, otú ahụ ka ọ na-abụghị mgbe nile ka mmadụ pụrụ ịhọrọ ndị ga-abụ ndị agbata obi ya. Mmekọrịta ahụ chọrọ inwe akọ, àgwà ọma na ịnagide ihe ụfọdụ.”

Ezi Ndị Agbata Obi —Ezi Ndị Na-enye Ihe

N’eziokwu, ọ pụrụ isiri ọtụtụ n’ime anyị ike ịdị na-ejekwuru ndị agbata obi ha. Ọ pụrụ iyi ka ọ dị mfe karị izere mmekọrịta na ịnọrọ onwe onye. Otú ọ dị, Bible na-ekwu na “a na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) N’ihi ya, ezi onye agbata obi na-agbalịsi ike ịmara ndị bi ya nso. Ọ bụ ezie na ọ pụchaghị ịchọ ka ya na ha na-akpachi anya, ọ na-agbalị iso ha na-ekwurịtatụ okwu site n’oge ruo n’oge, ikekwe na-eji ịmụmụ ọnụ ọchị ma ọ bụ ife aka ma ọ bụkwanụ ikwe n’isi na-amalite.

Dị ka e kwuru n’elu, ọ bụ ‘ọtụtụ obere ihe ọma’ ndị agbata obi na-emere ibe ha dị mkpa n’ezie iji zụlite ma nọgide na-enwe mkpakọrịta dị ka ndị agbata obi. N’ihi ya, ọ dị mma ịchọ ihe ọma ị pụrụ imere onye agbata obi gị, n’ihi na nke a ga-akwalite mmụọ nke imekọrịta ihe na ịkwanyerịta ùgwù. Ọzọkwa, site n’ime otú ahụ, anyị ga-agbaso ndụmọdụ Bible bụ́: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya.”—Ilu 3:27; Jems 2:14-17.

Ezi Ndị Agbata Obi —Ndị Ji Ekele Na-anara Ihe

Ọ ga-abụ ihe magburu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị pụrụ ịsị na mmadụ nile na-eji ekele anabata enyemaka na onyinye. N’ụzọ dị mwute, ọ naghị adị otú ahụ mgbe nile. A nakwerewo ọtụtụ enyemaka na onyinye ndị e ji ezi obi nye n’ụzọ na-egosipụta enwetụghị ekele nke na  onye ahụ ji ezi obi nye ya pụrụ iche sị, ‘Nke ahụ bụ nke ikpeazụ m ga-eme nke ahụ!’ Mgbe ụfọdụ, mgbalị nile ị na-eme ikele ndị agbata obi gị na ifere ha aka pụrụ ịbụ ndị a na-eji ikwe n’isi na-esighị n’obi azaghachi.

Ma, n’ọtụtụ ọnọdụ, ọ bụchaghị na onye ahụ e meere ihe enweghị ekele, ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ọ dị otú ahụ ma e lee ya anya elu elu. Ikekwe ọdịnala nke ebe a zụlitere ya na-eme ka ọ na-esiri ya ike ma ọ bụ ka ọ na-eme ihere, ma na-eme ka ọ na-eme omume dị ka onye na-enweghị mmasị na onye na-enwechaghị omume enyi. N’aka nke ọzọ, n’ụwa a a na-enweghị ekele, ụfọdụ ndị pụrụ ile omume enyi ị na-egosipụta anya dị ka ihe ọhụrụ, ma ọ bụ ọbụna na-enyo ebumnobi gị enyo. Mmesighachi obi ike pụrụ ịdị ha mkpa. N’ihi ya, inwe mmekọrịta enyi na enyi pụrụ iwe oge ma chọọ ndidi. Otú ọ dị, ndị agbata obi bụ́ ndị mụtara ịbụ ezi ndị na-enye ihe na ndị ji ekele na-anara anara ga-eme ka e nwee ọnọdụ udo na nke na-enye obi ụtọ n’agbata obi.

Mgbe Ọdachi Mere

Ezi onye agbata obi bara uru karịsịa mgbe ọdachi mere. Mgbe ọdachi mere, a na-ahụ kpọmkwem mmụọ nke ịbụ onye agbata obi. E nwere ọtụtụ akụkọ banyere omume achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke ndị agbata obi gosipụtara n’oge ndị dị otú ahụ. Ọdachi ndị na-eme mgbe mgbe yiri ka ha na-eme ka ndị agbata obi na-emekọrịta ihe site ná mkpali nakwa ịrụsi ọrụ ike maka ọdịmma nke ibe ha. Ọbụna ndị nwere echiche dịrịtara iche na-arụkọ ọrụ ọnụ ọtụtụ mgbe.

Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ The New York Times kọrọ na mgbe ala ọma jijiji na-emebi ihe kpara Turkey aka na 1999, ndị bụbu ndị iro kemgbe gboo nyerịtaara ibe ha aka. “A kụziworo anyị ịkpọ ndị Turkey asị kemgbe ọtụtụ afọ,” ka onye Gris na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Anna Stergiou dere n’otu akwụkwọ akụkọ Atens. “Ma ihe mgbu dị egwu dakwasịrị ha enyeghị anyị ọṅụ. O metụrụ anyị n’ahụ́, anyị bekwara ákwá dị ka a ga-asị na asị anyị kpọrọ ha kemgbe ụwa bịara ná njedebe mgbe anyị hụrụ ụmụ ọhụrụ nwụrụ anwụ.” Mgbe a kwụsịrị ọrụ a haziri maka ịnapụta ndị mmadụ, ìgwè ndị si Gris jụrụ ịkwụsị ịchọ ndị dị ndụ.

N’ezie, ikere òkè n’ọrụ nnapụta mgbe ọdachi mesịrị bụ ọrụ dị mma ma chọọ obi ike bụ́ nke ndị agbata obi na-arụ. Ya bụrụgodị otú ahụ, a pụrụ n’ezie ile ichebe ndụ onye agbata obi site n’ịdọ ya aka ná ntị tupu ọdachi emee anya dị ka ọrụ bara uru ọbụna karị bụ́ nke ndị agbata obi na-arụ. N’ụzọ dị mwute, akụkọ ihe mere eme na-ekpughe na a dịghị anabatakarị ndị na-adọ ndị agbata obi ha aka ná ntị banyere ọdachi na-abịanụ, ebe ọ bụ na mgbe a na-adọ ha aka ná ntị, ha apụghị ịhụ ọdachi ahụ na-aga ime, ngwa ngwa. A dịghị ekwenyekarị n’ihe ndị ahụ na-adọ aka ná ntị na-ekwu. Ọ na-achọ ịnọgidesi ike na ịchụ onwe onye n’àjà n’aka onye ọ bụla na-agbalị inyere ndị na-amaghị banyere ọnọdụ dị ize ndụ nke ha nọ na ya, aka.

Ọrụ Kasị Egosi Ịbụ Onye Agbata Obi

Taa, ihe dị nnọọ egwu karịa ọdachi ndị na-emere onwe ha na-aga ịdakwasị ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ ihe e buru n’amụma nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ga-eme iji kpochapụ mpụ, ajọ omume, na nsogbu ndị ha na ha na-agakọ,  n’ụwa. (Mkpughe 16:16; 21:3, 4) Ihe omume a dị egwu abụghị ihe a na-ejichaghị n’aka kama ọ bụ ihe na-aghaghị ime! Ọ na-agụsi Ndịàmà Jehova agụụ ike isoro ọtụtụ ndị dị ka o kwere mee kerịta ihe ọmụma dị mkpa maka ịlanarị ihe a na-aga ime bụ́ nke ga-eme ka ụwa mee mkpatụ. Ọ bụ ya mere ha ji nọgide na-arụ ọrụ nkwusa ha a maara nke ọma n’ụwa nile. (Matiu 24:14) Ha ji obi ha eme nke a, n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi ha nọ.

N’ihi ya, ekwela ka ajọ mbunobi ma ọ bụ iwe gbochie gị ige ntị mgbe Ndịàmà bịara n’ọnụ ụzọ gị ma ọ bụ bịakwute gị n’ebe ọzọ. Ha na-agbalị ịbụ ezi ndị agbata obi. Ya mere kwere iso ha mụọ Bible. Mụta otú Okwu Chineke si emesi anyị obi ike na oge ndị agbata obi ga-ebikọ ọnụ n’ọṅụ n’ọdịnihu, dị nso. N’oge ahụ, ịkpa ókè agbụrụ, nke okpukpe, ma ọ bụ nke ọkwá, agaghịzikwa emebi mmekọrịta dị mma nke ọtụtụ n’ime anyị na-achọ n’ezie.

[Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]

Ọ dị mma ịdị na-eme ihe ọma n’agbata obi gị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.