Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Izuzu Pụrụ Isi Chebe Gị?

Olee Otú Izuzu Pụrụ Isi Chebe Gị?

 Olee Otú Izuzu Pụrụ Isi Chebe Gị?

OKÉ ebili mmiri bụ ihe na-adọrọ mmasị, ma nye ndị ọrụ ụgbọ mmiri, ọ bụ mgbaàmà nke ihe ize ndụ. Mmiri ahụ na-asọ n’ike pụrụ ịnapụ ha ndụ ha.

N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị ohu Chineke pụrụ inwe nrụgide ndị na-esiwanye ike bụ́ ndị pụrụ iyi ka ha ga-akarị ha ike. Ị pụrụ ịchọpụtawo na ọtụtụ ule na ọnwụnwa ndị yiri ebili mmiri na-anyịgbu Ndị Kraịst. N’ezie, ị chọrọ iji obi ike merie ha, na-ekpebisi ike izere ụgbọ okpukpu n’ụzọ ime mmụọ. (1 Timoti 1:19) Izuzu bụ otu ihe dị oké mkpa n’ihe ndị ị ga-eji chebe onwe gị. Gịnị ka ọ bụ, oleekwa otú e si enweta ya?

Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “izuzu,” bụ́ mezim·mahʹ, sitere na mkpọrọgwụ okwu nke pụtara “ime atụmatụ ma ọ bụ ịkpa nkata.” (Ilu 1:4) N’ihi ya, nsụgharị Bible ụfọdụ sụgharịrị mezim·mahʹ ịbụ “ịdị akọ” ma ọ bụ “ilepụ anya n’ihu.” Ndị ọkà mmụta Bible bụ́ Jamieson, Fausset, na Brown kọwara mezim·mahʹ dị ka “iji nlezianya mara banyere ihe, bụ́ nke ga-enye aka n’ịgbanahụ ihe ọjọọ ma chọta ezi ihe.” Nke a pụtara iburu n’uche ihe ga-esi n’omume anyị pụta mgbe ogologo oge gasịrị nakwa ihe ndị ga-esi na ya pụta ozugbo. Site n’inwe izuzu, anyị ga-eji nlezianya tụlee ihe ndị anyị chọrọ ime tupu anyị emee ha, karịsịa mgbe a na-aghaghị ime mkpebi ndị dị mkpa.

Mgbe onye nwere izuzu na-eme mkpebi banyere ọdịnihu ma ọ bụ banyere ọnọdụ ọ nọ na ya ugbu a, ọ na-ebu ụzọ tụlee ihe ize ndụ ma ọ bụ ọnyà ndị pụrụ ịdị na ya. Ozugbo ọ chọpụtara ihe ndị pụrụ ịbụ ihe ize ndụ, ọ na-achọpụta otú ọ pụrụ isi zere ha, na-eburu n’uche mmetụta ebe obibi ya na ndị enyi ya pụrụ inwe n’ahụ́ ya. N’ụzọ dị otú a, ọ pụrụ ime atụmatụ maka ụzọ ndụ nke ga-arụpụta ezi ihe, ikekwe ọbụna ngọzi Chineke. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ dị irè bụ́ ndị na-akọwa usoro ime ihe a.

Zere Ọnyà nke Mmekọahụ Rụrụ Arụ

Mgbe ifufe nuuru oké ebili mmiri chee ụgbọ mmiri ihu, a na-ekwu na ebili mmiri na ụgbọ na-aga izute. Ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-anọ n’ihe ize ndụ nke ụgbọ ha ikpu ọ gwụla ma ha jiri nkà mee ihe n’izute ebili mmiri ahụ ihu na ihu.

Anyị na-eche ọnọdụ yiri nke ahụ ihu, ka anyị na-ebi n’ụwa nke ara mmekọahụ na-agba. Kwa ụbọchị, anyị na-anụ ọtụtụ echiche ma na-ahụ ọtụtụ ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Anyị apụghị ileghara mmetụta ha pụrụ inwe n’agụụ mmekọahụ ndị kwesịrị ekwesị anyị na-enwe anya. Anyị aghaghị iji izuzu na-eme ihe iji jiri obi ike na-anagide ọnwụnwa ndị ahụ kama ịdaba nnọọ n’ọnọdụ ndị dị ize ndụ.

Dị ka ihe atụ, ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst na ndị na-enwechaghị nkwanye ùgwù maka ndị inyom, bụ́ ndị na-ele ha anya dị ka nanị ihe e ji emeju agụụ mmekọahụ, na-arụkọ ọrụ ọtụtụ mgbe. Ndị ọrụ ibe ha pụrụ itinyetụ okwu ọchị na okwu njakịrị ndị metụtara mmekọahụ ná mkparịta ụka ha. Ịnọ ebe dị otú a pụrụ imesị kụnye echiche rụrụ arụ n’uche Onye Kraịst.

A pụkwara iwe nwanyị bụ́ Onye Kraịst n’ọrụ,  ọ pụkwara isi otú ahụ nwee ihe isi ike dị iche iche. Ọ pụrụ isoro ndị ikom na ndị inyom na-enweghị ụkpụrụ omume o nwere na-arụkọ ọrụ. Ikekwe otu n’ime ndị ọrụ ibe ya bụ́ nwoke na-egosi mmasị n’ebe ọ nọ. Na mbụ, nwoke ahụ pụrụ iji nchebara echiche na-emeso ya ihe, ọbụna na-akwanyere echiche okpukpe ya ùgwù. Mmasị ọ nọgidere na-enwe n’ebe ọ nọ na ọhụhụ ha na-ahụrịta onwe ha pụrụ ime ka nwanyị ahụ bụ́ Onye Kraịst chọọ ka ha na-akpachikwu anya.

Dị ka Ndị Kraịst, olee otú izuzu pụrụ isi nyere anyị aka n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Nke mbụ, ọ pụrụ ime ka anyị mata ihe ize ndụ ime mmụọ dị na ha, nke abụọ, ọ pụrụ ịkpali anyị ime atụmatụ banyere ihe kwesịrị ekwesị anyị ga-eme. (Ilu 3:21-23) N’ọnọdụ ndị dị ka ndị a, onye ahụ pụrụ ịgwa ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ n’ụzọ doro anya na ụkpụrụ anyị dị iche n’ihi nkwenkwe anyị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. (1 Ndị Kọrint 6:18) Okwu ọnụ na omume anyị pụrụ imesi nke ahụ ike. Ọzọkwa, onye ahụ pụrụ ibelata mkpakọrịta nke ya na ụfọdụ ndị ọrụ ibe ya.

Otú ọ dị, ọ bụghị nanị n’ebe ọrụ ka a na-enwe nrụgide ime omume rụrụ arụ. Di na nwunye pụkwara inwe ya ma ọ bụrụ na ha ekwere ka nsogbu mebie ịdị n’otu ha. Otu onye ozi na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Nkewa nke alụmdi na nwunye adịghị eme na mberede. Di na nwunye ahụ pụrụ iji nwayọọ nwayọọ na-ekewa, ya ana-esiri ha ike ikwurịta okwu ma ọ bụ ịnọkọrịta ọnụ. Ha pụrụ ịchụsowe ihe onwunwe iji chefuo owu ọmụma nke dị n’alụmdi na nwunye ha. Ebe ọ bụkwa na ọ na-esiri ha ike ịjarịta ibe ha mma, ha pụrụ ịbụ ndị ndị ọzọ na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha dọtara mmasị ha.”

Onye ozi a nwere ahụmahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Site n’oge ruo n’oge, di na nwunye kwesịrị ịnọdụ ọdụ tụlee ma ọ dị ihe na-emebi mmekọrịta ha. Ha kwesịrị ime atụmatụ otú ha pụrụ isi na-amụkọ ihe ọnụ, na-ekpekọ ekpere ọnụ, ma na-emekọ nkwusa ọnụ. Ha ga-erite uru dị ukwuu site n’ikwurịta okwu ‘n’ụlọ, n’ụzọ, mgbe ha na-edina ala, na mgbe ha na-ebilite ọtọ,’ dị nnọọ ka ndị nne na nna na ụmụ ha na-eme.”—Deuterọnọmi 6:7-9.

Ịnagide Àgwà Na-ekwesịghị Ndị Kraịst

E wezụga inyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọnwụnwa, izuzu pụkwara inyere anyị aka ịnagide nsogbu nke dapụtara n’etiti anyị na Ndị Kraịst ibe anyị. Mgbe ifufe nuuru ebili mmiri bịawa n’azụ ụgbọ, ọ na-eme ka ebili mmiri ahụ na-esochi ụgbọ ahụ azụ. Ebili mmiri ahụ pụrụ ibuli azụ ụgbọ ahụ elu ma kwaga ya n’aka ekpe ma ọ bụ n’aka nri. Nke a na-eme ka akụkụ ụgbọ ahụ chee ebili mmiri ahụ ihu, na-eme ka o nwee ike ibibi ụgbọ ahụ.

Anyị onwe anyị pụkwara ịbanye n’ihe ize ndụ nke sitere n’ebe a na-atụghị anya ya. Anyị na ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-ekwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi “n’otu ubu.” (Zefanaịa 3:9) Ọ bụrụ na otu onye n’ime ha akpaa àgwà n’ụzọ na-ekwesịghị Ndị Kraịst, ọ pụrụ ịdị ka nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu, ọ pụkwara ịkpatara anyị oké obi erughị ala. Olee otú izuzu pụrụ isi gbochie anyị inwewe echiche na-ezighị ezi na inwe mwute gabiga ókè?

Cheta na “ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị emehie.” (1 Ndị Eze 8:46) N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na nwanna Onye Kraịst pụrụ ịkpasu anyị iwe ma ọ bụ mejọọ anyị mgbe ụfọdụ. Ebe anyị maara nke a, anyị pụrụ ịdị njikere maka ihe ndapụta ahụ ma chee echiche otú anyị kwesịrị isi meghachi omume. Olee otú Pọl onyeozi si meghachi omume mgbe ụfọdụ n’ime ụmụnna ya Ndị Kraịst kwuru okwu banyere ya n’ụzọ na-akpasu iwe na n’ụzọ nlelị? Kama ikwe ka o metụta ya n’ụzọ ime mmụọ, o kpebiri na inweta ihu ọma Jehova dị mkpa karịa inweta nke mmadụ. (2 Ndị Kọrint 10:10-18) Àgwà dị otú ahụ ga-enyere anyị aka izere imeghachi omume ọkụ ọkụ mgbe a kpasuru anyị iwe.

O yitụrụ ịkpọbi ụkwụ. Mgbe nke a mere, e nwere ike anyị agaghị eche echiche nke ọma ruo otu minit ma ọ bụ abụọ. Ma mgbe ihe mgbu ahụ belatara, anyị pụrụ iche echiche ma ọ bụ mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị ekwesịghị imeghachi omume ozugbo mgbe a gwara anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ mesoo anyị ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Kama nke ahụ, cheretụ ma tụlee ihe ndị pụrụ isi n’imegwara ihe n’echeghị echiche pụta.

 Malcolm, onye bụworo onye ozi ala ọzọ ruo ọtụtụ afọ, na-akọwa ihe ọ na-eme mgbe a kpasuru ya iwe. “Ihe mbụ m na-eme bụ ịtụle ajụjụ ndị m detuburu edetu: Àna m ewesa nwanna a iwe n’ihi na anyị nwere nghọtahie? Ihe o kwuru ọ̀ dị mkpa n’ezie? Mmetụta ọrịa ịba nwere n’ahụ́ m ọ̀ na-eme ka iwe m na-adị ọkụ? M̀ pụrụ ile ihe anya n’ụzọ dị iche ma awa ole na ole gasịa?” Mgbe mgbe, dị ka Malcolm chọpụtaworo, nghọtahie ahụ anaghị adị mkpa, a pụkwara ileghara ya anya. *

Malcolm na-agbakwụnye sị: “Mgbe ụfọdụ, n’agbanyeghị mgbalị nile m na-eme iji dozie nsogbu ahụ, nwanna ahụ na-anọgide na-eburu m iro. Ana m agbalị ịghara ikwe ka nke a kpasuo m iwe. Ozugbo m meworo ihe nile m pụrụ ime, ana m ele okwu ahụ anya n’ụzọ dị iche. N’uche m ana m ele okwu ahụ anya dị ka ihe ga-adị mma ka oge na-aga kama ile ya anya dị ka ihe m na-aghaghị idozi n’onwe m. Agaghị m ekwe ka o merụọ m ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụ ka o metụta mmekọrịta mụ na Jehova nakwa nke mụ na ụmụnna m.”

Dị ka Malcolm, anyị ekwesịghị ikwe ka àgwà na-ezighị ezi nke otu onye nye anyị nsogbu gabiga ókè. N’ime ọgbakọ ọ bụla, e nwere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-ekwesị ntụkwasị bụ́ ndị na-eme ka obi na-adị anyị ụtọ. Ọ na-enye obi ụtọ iso ha ‘na-ejekọ ije ọnụ’ n’ụzọ nke Ndị Kraịst. (Ndị Filipaị 1:27) Icheta nkwado ịhụnanya nke Nna anyị nke eluigwe ga-enyekwara anyị aka ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.—Abụ Ọma 23:1-3; Ilu 5:1, 2; 8:12.

Ịghara Ịhụ Ihe Ndị Dị n’Ụwa n’Anya

Izuzu pụrụ inyere anyị aka ịnagide nrụgide ọzọ dị aghụghọ. Mgbe ifufe nugara ebili mmiri n’akụkụ ụgbọ, a na-asị na ebili mmiri si n’akụkụ kwagharịa ụgbọ mmiri. Mgbe ihu igwe dị otú o kwesịrị, ebili mmiri dị otú ahụ pụrụ iji nwayọọ nwayọọ kwapụ ụgbọ ahụ ebe o chere ihu. Otú  ọ dị, mgbe e nwere oké ifufe, ebili mmiri pụrụ ime ka ụgbọ mmiri kpuo.

N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na anyị ekwenyere nrụgide nke ịchụso ihe ọ bụla a pụrụ inweta n’ajọ ụwa a, ụzọ ndụ a nke ịhụ ihe onwunwe n’anya pụrụ ịkwapụ anyị n’ụzọ ime mmụọ. (2 Timoti 4:10) Ọ bụrụ na a chịkwaghị ya achịkwa, ịhụ ihe nke ụwa n’anya pụrụ imesị mee ka anyị kwụsị ije ije n’ụzọ Ndị Kraịst. (1 Jọn 2:15) Olee otú izuzu pụrụ isi nyere anyị aka?

Nke mbụ, ọ ga-enyere anyị aka ịgbakọ ihe ize ndụ ndị anyị pụrụ izute. Ụwa na-eji aghụghọ azụmahịa ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche ara anyị ụrà. Ọ na-akwalite ụzọ ndụ nke e lere anya na onye ọ bụla kwesịrị ịchụso—ụzọ ndụ nke ime oké ngosipụta bụ́ nke ndị ọgaranya, ndị mara mma, na ndị nwere “ihe ịga nke ọma” na-ebi. (1 Jọn 2:16 ) A na-ekwe anyị nkwa na mmadụ nile, karịsịa ndị ọgbọ anyị na ndị agbata obi anyị, ga-enwe mmasị n’ebe anyị nọ ma nabata anyị. Izuzu ga-enyere anyị aka iguzogide okwu nduhie a, na-echetara anyị mkpa ọ dị ‘ịghara inwe ịhụnanya ego,’ ebe ọ bụ na Jehova ekwewo nkwa na ‘ya agaghị ahapụ anyị.’—Ndị Hibru 13:5.

Nke abụọ, izuzu ga-egbochi anyị iso ndị ‘wezụgaworo onwe ha n’eziokwu ahụ’ na-akpakọrịta. (2 Timoti 2:18 ) O siri nnọọ ike ịjụ ndị anyị nweburu mmasị na ntụkwasị obi n’ebe ha nọ. (1 Ndị Kọrint 15:12, 32-34) Ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị mmetụta dị nta ka ndị gbahapụworo ụzọ nke Ndị Kraịst na-enwe n’ahụ́ anyị, ọ pụrụ igbochi anyị inwe ọganihu ime mmụọ ma tinye anyị n’ihe ize ndụ n’ikpeazụ. Anyị pụrụ ịdị ka ụgbọ mmiri nke chipụtụrụ n’ụzọ ya. Mgbe ọ gbara ruo ogologo oge, isi n’ebe ọ gbaruru gaa n’ebe o bu n’obi ịga pụrụ ịdị anya nke ukwuu.—Ndị Hibru 3:12.

Izuzu pụrụ inyere anyị aka ịmata kpọmkwem ọnọdụ anyị n’ụzọ ime mmụọ na otú ọ pụrụ ịdị n’ọdịnihu. Ikekwe anyị ghọtara mkpa ọ dị ikere òkè zuru ezu karị n’ọrụ Ndị Kraịst. (Ndị Hibru 6:11, 12) Rịba ama otú otu Onyeàmà na-eto eto si jiri izuzu nyere onwe ya aka ịchụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ: “Enwere m ohere nke ịchụso ọrụ nkà ide akụkọ. Nke a dọọrọ mmasị m n’ezie, ma echetara m amaokwu Bible nke kwuru na ‘ụwa na-agabiga,’ ebe ‘onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.’ (1 Jọn 2:17) Echere m echiche na ihe m ji ndụ m na-eme kwesịrị igosipụta nkwenkwe m. Nne na nna m ahapụwo okwukwe Ndị Kraịst, achọghịkwa m ịgbaso ihe nlereanya ha. N’ihi ya, ekpebisiri m ike ibi ndụ nwere nzube ma banye n’ozi oge nile dị ka ọsụ ụzọ oge nile. Ka m bisịrị ndụ na-eju afọ ruo afọ anọ, amatara m na m mere nhọrọ ziri ezi.”

Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Iche Oké Ifufe Ime Mmụọ Ihu

N’ihi gịnị ka o ji dị ngwa ka anyị na-egosipụta izuzu taa? Ndị ọrụ ụgbọ mmiri aghaghị ịnọ na nche banyere mgbaàmà dị iche iche nke ihe ize ndụ, karịsịa mgbe oké ifufe na-efe. Ọ bụrụ na ihu igwe amalite ịtụ oyi karị, ifufe efesiwekwa ike, ha na-ekwesi ákwà ifufe ha ike ma dịrị njikere maka ihe kasị njọ ime. N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị aghaghị ịdị njikere iche nrụgide ndị siri oké ike ihu ka ajọ usoro ihe a na-eru nso ọgwụgwụ ya. Ọnọdụ omume nke ọha mmadụ na-etisasị etisasị, ‘ndị ajọ mmadụ na-anọgidekwa na-ajọwanye njọ.’ (2 Timoti 3:13) Dị nnọọ ka ndị ọrụ ụgbọ mmiri si ege ntị mgbe nile n’akụkọ banyere otú ihu igwe ga-adị n’ọdịnihu, anyị aghaghị ịdị na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị e buru n’amụma bụ́ ndị dị n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ.—Abụ Ọma 19:7-11.

Mgbe anyị ji izuzu na-eme ihe, anyị na-etinye ihe ọmụma ahụ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi n’ọrụ. (Jọn 17:3) Anyị pụrụ ịtụ anya nsogbu ma kpebie otú anyị pụrụ isi merie ha. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga-ekpebisi ike ịghara ịbụ ndị a kwapụrụ n’ụzọ nke Ndị Kraịst, anyị pụkwara ịtọ “ezi ntọala maka ọdịnihu” site n’isetịpụ na ịchụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ dị iche iche.—1 Timoti 6:19.

Ọ bụrụ na anyị echebe nzube ihe na izuzu, ọ dịghị anyị mkpa ‘ịtụ egwu site n’oké egwu mberede.’ (Ilu 3:21, 25, 26) Kama nke ahụ, anyị pụrụ inweta nkasi obi ná nkwa Chineke bụ́: “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; izuzu ga na-eche gị nche.”—Ilu 2:10, 11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Ndị Kraịst kwesịrị ịgbalị ịdị na-eme udo, n’ikwekọ na ndụmọdụ dị na Matiu 5:23, 24. Ọ bụrụ na okwu ahụ metụtara mmehie dị oké njọ, ha kwesịrị ịgbalị irite nwanna ha n’uru, dị ka e depụtara na Matiu 18:15-17. Lee Ụlọ Nche nke October 15, 1999, peeji nke 17-22.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ikwurịta okwu mgbe nile na-ewulite alụmdi na nwunye