Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa nke Nwere Echiche Ndị Gbagọrọ Agbagọ Banyere Iguzosi Ike n’Ihe

Ụwa nke Nwere Echiche Ndị Gbagọrọ Agbagọ Banyere Iguzosi Ike n’Ihe

 Ụwa nke Nwere Echiche Ndị Gbagọrọ Agbagọ Banyere Iguzosi Ike n’Ihe

N’OTU uhuruchi Friday e nwere okpomọkụ na Tel Aviv, Izrel, otu nwa okorobịa bịara nọnyere ìgwè ndị ntorobịa nọ na-echere n’ihu otu ụlọ oriri na nkwari abalị. Obere oge ka e mesịrị, bọmbụ dị oké njọ gbawara n’etiti ìgwè mmadụ ahụ.

Onye ọzọ nke tụrụ bọmbụ tara isi ya enyewo ndụ ya ma napụ ndị ntorobịa 19 ọzọ ndụ ha n’ike. “Akụkụ ahụ́ ndị mmadụ juru ebe nile, ha nile bụ ndị ntorobịa, ndị ka na-eto nnọọ eto—ihe kasị awụ akpata oyi n’ahụ́ m hụtụrụla,” ka otu dibịa Bekee mesịrị gwa ndị nta akụkọ.

“Ọ bụ àgwà na-amasị onye ọ bụla, dịkwa ka iguzosi ike n’ihe . . . , bụ́ nke pụrụ ime ka agha bụrụ ma ihe nwekwuru ike ịmalite ma ihe sikwuru ike nkwụsị,” ka Thurstan Brewin dere n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Lancet. Ee, site n’Agha Ntụte nke Krisendọm ruo ná mgbukpọ nke Nazi Germany, e jiriwo ọbara nke ndị e gburu n’aha iguzosi ike n’ihe tetọọ akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.

Ndị Eguzosighị Ike n’Ihe Na-emetụta Na-arịwanye Elu

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na iguzosibiga ike ókè n’ihe pụrụ imebi ihe, ma eguzosighị ike n’ihe pụkwara itisasị ọha mmadụ. Iguzosi ike n’ihe, ka Webster’s New Encyclopedic Dictionary na-ekwu, pụtara ‘ikwesị ntụkwasị obi nye mmadụ ma ọ bụ ihe’ ma “na-egosi mmadụ ịrapagidesi ike n’ihe n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla nke ịhapụ ma ọ bụ ịgọnahụ ya.” Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-asị na ụdị iguzosi ike n’ihe a na-amasị ha, oké ụkọ nke iguzosi ike n’ihe kọrọ n’ebe bụ́ isi e kwesịrị ịdị na-egosipụta ya—n’ime ezinụlọ—na-akpa ọha mmadụ aka ọjọọ. Ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịgba alụkwaghịm arịwo elu, bụ́ nke ojiji e ji imeju ọchịchọ onwe onye akpọrọ oké ihe, nrụgide na nchekasị nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị, na mmetụta nke ekwesịghị ntụkwasị obi juru ebe nile n’ihe banyere mmekọahụ meworo ka ọ na-amụba. Dịkwa ka ndị ahụ nwụrụ na bọmbụ ahụ gbawara na Tel Aviv, ndị ntorobịa na-abụkarị ndị aka ha dị ọcha na-ata ahụhụ ya.

“Agụmakwụkwọ nke nwatakịrị na-abụkarị otu n’ime ihe ndị na-emebinụ n’ihi ezinụlọ akwụsighị ike bụ́ nke ịgba alụkwaghịm, nkewa, na nne ma ọ bụ nna ịzụ ụmụ nanị ya na-akpata,” ka otu akụkọ na-ekwu. Ụmụ okoro ndị si n’ezinụlọ nanị nne na-azụ ụmụ yiri ka ha kasị nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị na-agaghị agụ akwụkwọ, ndị ga-egbu onwe ha, na ndị ga-eme mpụ mgbe ha na-eto eto. Kwa afọ, otu nde ụmụaka na United States na-ahụ ka ndị mụrụ ha gbara alụkwaghịm, n’afọ ọ bụla kwa, o yikarịrị ka ọkara nke ụmụaka nile nne ha na nna ha lụrụ alụ ná mba ahụ hà ga-abụ ndị ịgba alụkwaghịm ga-emetụta mgbe ha ga-erule afọ 18. Ndekọ ọnụ ọgụgụ e nwere na-egosi na atụmanya nke ndị  ntorobịa nọ n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa bụ ihe na-agbawa obi n’ụzọ yiri nke ahụ.

Iguzosi Ike n’Ihe—Ọ̀ Bụ Ụkpụrụ Magburu Nnọọ Onwe Ya?

Ndakpọ nke iguzosi ike n’ihe n’ime ezinụlọ na-adakpọ n’oge a na-eme ka okwu Eze Devid yie ihe dabara adaba ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ: “Jehova, zọpụta; n’ihi na onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW] agwụsịwo; n’ihi na ndị kwesịrị ntụkwasị obi agwụpụwo n’etiti ụmụ mmadụ.” (Abụ Ọma 12:1) N’ihi gịnị ka eguzosighị ike n’ihe ji mụbaa otú a? Roger Rosenblatt, kwuru ka ọ na-ede ihe na magazin bụ́ Time, sị: “Ọ bụ ezie na iguzosi ike n’ihe bụ ụkpụrụ magburu onwe ya, e nwere nnọọ egwu dị ukwuu, oké enweghị obi ike banyere onwe onye, omume nke iji ohere ọ bụla e nwere mee ihe maka ọdịmma onwe onye nanị na oké ọchịchọ n’àgwà anyị dị ka mmadụ nke ịbịa tụwa anya ka ụmụ mmadụ na-adịghị ike gbasoo ya.” N’ịkọwa oge anyị bi na ya, Bible kwuru n’ezoghị ọnụ, sị: “Ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, . . . ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ.”—2 Timoti 3:1-5.

N’iburu mmetụta dị ike nke iguzosi ike n’ihe—ma ọ bụ eguzosighị ike n’ihe—na-enwe n’echiche na n’omume mmadụ n’uche, anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ònye ka o ziri ezi ka anyị na-eguzosi ike n’ihe nye?’ Rịba ama ihe isiokwu na-esonụ nwere ikwu banyere ajụjụ a.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Foto dị n’elu: © AFP/CORBIS