Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Ejiri Ìhè Chọọ Ndị Ya Mma

Jehova Ejiri Ìhè Chọọ Ndị Ya Mma

 Jehova Ejiri Ìhè Chọọ Ndị Ya Mma

“Bilie, nwuo; n’ihi na ìhè gị abịawo, ebube Jehova awawokwa n’ahụ́ gị dị ka anyanwụ.”—AỊSAỊA 60:1.

1, 2. (a) Olee ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya? (b) Olee ndị na-akpata ọchịchịrị nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya?

“EWO, a sị na ọ bụ Aịzaịa ma ọ bụ Senti Pọl!” Nke ahụ bụ ákwá arịrị President Harry Truman nke United States bere laa azụ n’afọ ndị 1940. Gịnị mere o ji kwuo okwu ndị ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ mkpa ọ dị inwe ndị ndú nwere ụkpụrụ omume ọma kasị elu n’ụwa nke oge ya. Ihe a kpọrọ mmadụ ka gabigasịrị oge kasị njọ na narị afọ nke 20, bụ́ agha ụwa nke abụọ. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na agha ahụ ebiela, udo adịghị n’ụwa. Ụwa ka gbara ọchịchịrị. N’ezie, afọ 57 ka agha ahụ bisịrị, ụwa ka nọ n’ọchịchịrị. A sị na President Truman dị ndụ taa, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ka ga-ahụ mkpa ọ dị inwe ndị ndú nwere ụkpụrụ omume ọma dị ka Aịzaịa ma ọ bụ Pọl onyeozi.

2 Ma President Truman ọ ma ma ọ bụ na ọ maghị, Pọl onyeozi kwuru banyere ọchịchịrị nke na-ekpuchi ihe a kpọrọ mmadụ, ọ dọkwara aka ná ntị banyere ya n’ihe odide ya. Dị ka ihe atụ, ọ dọrọ ndị kwere ekwe ibe ya aka ná ntị, sị: “Anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị, megide ikike, megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Pọl ji okwu ndị a gosi na ọ bụghị nanị na ya maara banyere ọchịchịrị ime mmụọ nke na-ekpuchi ụwa kamakwa na ya maara kpọmkwem ndị o si n’aka—ndị mmụọ ọjọọ dị ike bụ́ ndị a kọwara dị ka “ndị na-achị ụwa.” Ebe ọ bụ ndị mmụọ dị ike na-akpata ọchịchịrị nke ụwa, gịnị ka ụmụ mmadụ efu pụrụ ime iji wepụ ya?

3. N’agbanyeghị ọchịchịrị nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya, gịnị ka Aịzaịa buru n’amụma maka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi?

3 N’ụzọ yiri nke ahụ, Aịzaịa kwuru banyere ọchịchịrị nke na-ekpuchi ihe a kpọrọ mmadụ. (Aịsaịa 8:22; 59:9) Otú ọ dị, n’ilega anya n’oge anyị, o buru amụma na ọbụna n’oge ndị a gbara ọchịchịrị, Jehova ga-eme ka atụmanya nke ndị hụrụ ìhè n’anya na-egbuke egbuke. Ee, ọ bụ ezie na anyị na Pọl na Aịzaịa anọghị n’anụ ahụ́, anyị nwere ihe ndị ha dere n’ike mmụọ nsọ iduzi anyị. Iji hụ ụdị ngọzi nke ahụ bụụrụ ndị hụrụ Jehova n’anya, ka anyị tụlee okwu amụma Aịzaịa ndị a na-achọta n’isi 60 nke akwụkwọ ya.

Nwanyị E Kwuru Maka Ya n’Amụma Egbukepụ Ìhè

4, 5. (a) Gịnị ka Jehova nyere otu nwanyị iwu ka o mee, nkwa dịkwa aṅaa ka ọ na-ekwe? (b) Ihe ọmụma dị aṅaa na-akpali akpali dị n’Aịsaịa isi 60?

4 Ọ bụ otu nwanyị nke nọ n’ọnọdụ dị nnọọ mwute—n’ọchịchịrị, nke makpu n’ala—ka a gwara okwu mmalite nke Aịsaịa isi 60. Na mberede, ìhè nwubara n’ọchịchịrị ahụ, Jehova wee kpọọkwa òkù, sị: ‘Nwanyị, bilie, nwuo; n’ihi na ìhè gị abịawo, ebube Jehova awawokwa n’ahụ́ gị dị ka anyanwụ.’ (Aịsaịa 60:1) Oge eruwo ka nwanyị ahụ bilie ọtọ ma gbukepụ ìhè Chineke, bụ́ ebube Ya. N’ihi gịnị? Anyị na-ahụ azịza ya n’amaokwu na-esonụ: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ́ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube Ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ́ gị.” (Aịsaịa 60:2) Mgbe nwanyị ahụ rubere isi  n’iwu Jehova, e mesiri ya obi ike na ihe dị ebube ga-esi na ya pụta. Jehova na-asị: “Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze ejeruo onwu maramara nke ọwụwa gị.”—Aịsaịa 60:3.

5 Okwu ndị na-akpali akpali dị n’amaokwu atọ a bụ ma okwu mmalite ma nchịkọta nke ihe dị n’akụkụ ndị ọzọ nke Aịsaịa isi 60. Ọ na-ebu amụma banyere ahụmahụ nke otu nwanyị e kwuru maka ya n’amụma ma na-akọwa otú anyị pụrụ isi nọrọ n’ìhè Jehova n’agbanyeghị ọchịchịrị nke kpuchiworo ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, gịnị ka ihe atụ ndị a dị n’amaokwu atọ mbụ a pụtara?

6. Ònye bụ nwanyị ahụ e kwuru banyere ya n’Aịsaịa isi 60, oleekwa ndị na-anọchite anya ya n’elu ala?

6 Nwanyị ahụ e kwuru banyere ya n’Aịsaịa 60:1-3 bụ Zaịọn, bụ́ nzukọ eluigwe Jehova nke ndị mmụọ e kere eke mejupụtara. Taa, ihe fọdụrụ ‘n’Izrel nke Chineke,’ bụ́ ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị nwere olileanya nke iso Kraịst chịa n’eluigwe, na-anọchite anya Zaịọn n’elu ala. (Ndị Galeshia 6:16) Mba ime mmụọ a bịara nwee ndị òtù di 144,000, mmezu nke oge a nke Aịsaịa isi 60 hiwekwara isi n’ebe ndị nke dị ndụ n’ụwa “n’ụbọchị ikpeazụ” nọ. (2 Timoti 3:1; Mkpughe 14:1) Amụma ahụ nwekwara ihe dị ukwuu ikwu banyere ndị ibe Ndị Kraịst a e tere mmanụ, bụ́ “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ—Mkpughe 7:9; Jọn 10:16.

7. Olee ọnọdụ Zaịọn nọ na ya na 1918, oleekwa otú e siworo buo nke a n’amụma?

7 Ọ̀ dị mgbe “Izrel nke Chineke” dina n’ọchịchịrị, dị ka nwanyị ahụ e kwuru maka ya n’amụma ahụ sere onyinyo ya? Ee, nke a mere ihe karịrị afọ 80 gara aga. N’oge agha ụwa mbụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ gbalịsiri ike ịhụ na ọrụ ịgba àmà ahụ na-aga n’ihu. Ma na 1918, bụ́ afọ ikpeazụ nke agha ahụ, ọ fọrọ nke nta ka ọrụ ime nkwusa nke nzukọ haziri kwụsị. A mara Joseph F. Rutherford, bụ́ onye na-elekọta ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ, na Ndị Kraịst ndị ọzọ a ma ama, ikpe ịga mkpọrọ ruo ogologo oge n’ihi ebubo ụgha ndị e boro ha. N’akwụkwọ Mkpughe, a kọwara Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa n’oge ahụ n’ụzọ amụma dị ka ozu ndị tọgbọ “n’okporo ámá nke obodo ukwu ahụ bụ́ nke a na-akpọ n’echiche ime mmụọ Sọdọm na Ijipt.” (Mkpughe 11:8) Oge ahụ bụ n’ezie oge gbara ọchịchịrị nye Zaịọn, nke ụmụ ya e tere mmanụ nọ n’ụwa nọchitere anya ya!

8. Mgbanwe dị aṅaa dị ịrịba ama weere ọnọdụ na 1919, gịnị si na ya pụta?

 8 Otú ọ dị, e nwere mgbanwe dị ịrịba ama n’afọ 1919. Jehova mụkwasịrị Zaịọn ìhè! Ndị fọdụrụ ndụ n’ime Izrel nke Chineke biliri ọtọ iji gbukepụ ìhè Chineke, na-amaliteghachi ikwusa ozi ọma ahụ n’atụghị ụjọ. (Mat. 5:14-16) N’ihi ịnụ ọkụ n’obi nke Ndị Kraịst a nwetaghachiri, a dọtara ndị ọzọ n’ìhè Jehova. Ná mmalite, e tere ndị ọhụrụ a mmanụ isonye n’Izrel nke Chineke. A kpọrọ ha ndị eze n’Aịsaịa 60:3, ebe ọ bụ na ha na Kraịst ga-eketakọ ihe n’Alaeze eluigwe nke Chineke. (Mkpughe 20:6) Ka oge na-aga, a dọtara oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ n’ìhè Jehova. Ndị a bụ “mba nile” ahụ e hotara n’amụma ahụ.

Ụmụ nke Nwanyị ahụ Alọta!

9, 10. (a) Ihe dị aṅaa dị ịrịba ama ka nwanyị ahụ hụrụ, gịnịkwa ka nke a na-anọchite anya ya? (b) Olee ihe mere Zaịọn ga-eji ṅụrịa ọṅụ?

9 Ugbu a, Jehova malitere ịkọwa ihe ọmụma ahụ dị n’Aịsaịa 60:1-3 n’ụzọ zuru ezu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. O nyere nwanyị ahụ iwu ọzọ. Gee ntị n’ihe ọ na-ekwu: “Welie anya gị abụọ lee gburugburu, hụ.” Nwanyị ahụ mere otú ahụ, leekwa ihe na-enye obi ụtọ ọ hụrụ! Ụmụ ya na-alọta. Amaokwu ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ha nile achịkọtawo onwe ha, ha abịakwutewo gị: ụmụ gị ndị ikom ga-esi n’ebe dị anya bịa, a ga-ekukwa ụmụ gị ndị inyom n’akụkụ gị.” (Aịsaịa 60:4) Ime nkwusa Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ nke malitere na 1919 dọtara ọtụtụ puku ndị ọhụrụ n’ozi Jehova. Ndị a ghọkwara ‘ụmụ ndị ikom’ na ‘ụmụ ndị inyom’ nke Zaịọn, bụ́ ndị e tere mmanụ so n’Izrel nke Chineke. N’ụzọ dị otú a, Jehova chọrọ Zaịọn mma site n’ịkpọbata ndị ikpeazụ so na 144,000 n’ìhè ahụ.

10 Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche ụdị ọṅụ Zaịọn nwere na ya na ụmụ ya nọ? N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova gwara Zaịọn ihe ndị ọzọ mere ọ ga-eji nwee ọṅụ. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ahụ ị ga-ahụ wee nwuo enwuo, obi gị ga-atụkwa oké egwu, saa mbara; n’ihi na a ga-echigharịkwute gị ihe bara ụba nke oké osimiri, akụ̀ nke mba dị iche iche ga-abịakwute gị.” (Aịsaịa 60:5) N’ikwekọ n’ihe ndị e kwuru n’amụma ahụ, kemgbe afọ ndị 1930, ọtụtụ ìgwè mmadụ ndị nwere olileanya elu ala enugawo na Zaịọn. Ha esiwo ‘n’oké osimiri’ nke ihe a kpọrọ mmadụ e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ pụta, ha na-anọchitekwa anya akụ̀ nke mba dị iche iche. Ha bụ “ihe a na-achọsi ike nke mba nile.” (Hagaị 2:7; Aịsaịa 57:20) Rịbakwa ama na ndị a bụ́ “ihe a na-achọsi ike” adịghị efe Jehova, onye ọ bụla n’ụzọ nke ya. Ee e, ha na-eme ka Zaịọn makwuo mma site n’ịbịa soro ụmụnna ha e tere mmanụ na-efe ofufe, ha na ha ewee ghọọ “otu ìgwè atụrụ” n’okpuru “otu onye ọzụzụ atụrụ.”—Jọn 10:16.

Ndị Ọchụnta Ego, Ndị Ọzụzụ Atụrụ, na Ndị Ahịa Abịa na Zaịọn

11, 12. Kọwaa ìgwè ndị a hụrụ ka ha na-aga Zaịọn.

11 Ihe si ná mgbakọta a e buru n’amụma pụta bụ mmụba dị ịrịba ama n’ọnụ ọgụgụ ndị na-eto Jehova. E buru nke a n’amụma n’okwu ọzọ nke amụma ahụ. Were ya na gị na nwanyị ahụ e kwuru maka ya n’amụma ahụ guzo n’Ugwu Zaịọn. I lee anya n’ebe ọwụwa anyanwụ, gịnịkwa ka ị na-ahụ? “Ìgwè camel ga-ekpuchi gị, ụmụ camel nke Midian na Ifa: ha nile ga-esi na Sheba bịa: ọlaedo na frankincense ka ha ga-ebute, ọ bụkwa ozi ọma otuto Jehova ka ha ga-ezisa.” (Aịsaịa 60:6) Ìgwè ndị ọchụnta ego du usuu camel ha na-aga n’ụzọ ndị e si aga Jeruselem. Leenụ, camel ndị ahụ yiri idei mmiri nke na-ekpuchi ala! Ndị ahịa a bu onyinye ndị bara uru, “ọlaedo na frankincense.” Ndị ọchụnta ego a bịakwara n’ìhè Chineke iji too ya n’ihu ọha, ‘izisa ozi ọma otuto nke Jehova.’

12 Ọ bụghị nanị ndị ọchụnta ego nọ na-eme njem. Ndị ọzụzụ atụrụ na-enugakwa na Zaịọn. Amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ìgwè ewu na atụrụ nile nke Kida ka a ga-achịkọtara gị, ebulu nile nke Nebaiot ga-ejere gị ozi.”  (Aịsaịa 60:7a) Agbụrụ ndị na-azụ anụ na-abịa n’obodo nsọ ahụ inye Jehova anụ ndị kasị mma n’ime ìgwè anụ ha. Ọbụna ha na-ewepụta onwe ha ijere Zaịọn ozi! Olee otú Jehova si anabata ndị ala ọzọ a? Chineke n’onwe ya na-aza, sị: “Ha ga-arịgota n’ebe ịchụàjà m dị ka ihe na-atọ ụtọ, M ga-emekwa ụlọ nke ịma mma m ka ọ maa mma.” (Aịsaịa 60:7b) Jehova ji amara anakwere onyinye na ozi nke ndị ala ọzọ a na-eje. Ọnụnọ ha nọ n’ụlọ nsọ ya na-achọ ụlọ nsọ ya mma.

13, 14. Gịnị ka a hụrụ ka ha si n’ọdịda anyanwụ na-abịa?

13 Ugbu a tụgharịa isi gị ma lee anya n’ebe ọdịda anyanwụ. Gịnị ka ị na-ahụ? N’ebe dị nnọọ anya, e nwere ihe dị ka urukpuru dị ọcha nke gbasapụrụ n’elu oké osimiri. Jehova ajụọ ajụjụ i bu n’obi ịjụ, sị: “Olee ndị bụ́ ndị a nke na-efe efe dị ka igwe ojii, ndị na-efekwa dị ka nduru si eferu windo ha?” (Aịsaịa 60:8) Jehova ejiri aka ya zaa ajụjụ ya, sị: “Mụ ka àgwàetiti nile ga-echere, ụgbọ nile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, ime ka ụmụ gị ndị ikom si n’ebe dị anya bịa, ha na ọlaọcha ha na ọlaedo ha, ịbịakwute aha Jehova, bụ́ Chineke gị, na ịbịakwute Onye Nsọ nke Israel, n’ihi na O mewo ka ị maa mma.”—Aịsaịa 60:9.

14 Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ ihe omume ahụ? Urukpuru ahụ abịatụwo nso ma yizie ụmụ obere ihe na-acha ọcha nke dị n’ebe dị anya n’ebe ọdịda anyanwụ. O yiri ìgwè nnụnụ ndị na-efegharị n’ikuku. Ma ka ha na-abịarukwu nso, ị na-ahụ na ha bụ ụgbọ mmiri ndị a gbasara ákwà ifufe ha agbasa iji na-ejide ifufe. Imerime ụgbọ mmiri na-aga Jeruselem nke na ha yiri ìgwè nduru. Site n’ọdụ ụgbọ mmiri dị anya, ìgwè ụgbọ mmiri  ndị ahụ na-agba oké ọsọ, na-ebute ndị kwere ekwe na Jeruselem ife Jehova.

Nzukọ Jehova Ebuwanye Ibu

15. (a) Mmụba dị aṅaa ka okwu ndị dị n’Aịsaịa 60:4-9 buru amụma banyere ya? (b) Mmụọ dị aṅaa ka ezi Ndị Kraịst na-egosipụta?

15 Lee nkọwa doro anya amaokwu 4 ruo 9 na-enye n’ụzọ amụma banyere mmụba zuru ụwa ọnụ nke werewooro ọnọdụ kemgbe 1919! Gịnị mere Jehova ji jiri mmụba dị otú ahụ gọzie Zaịọn? Ọ bụ n’ihi na kemgbe 1919, Izrel nke Chineke ejiriwo nrubeisi nọgide na-egbukepụ ìhè Jehova. Ma, ị̀ chọpụtara na dị ka amaokwu nke 7 si kwuo, ndị ahụ bịara ọhụrụ ‘na-arịgota n’elu ebe ịchụàjà Chineke’? Ebe ịchụàjà bụ ebe a na-achụ àjà, ihe a a kpọtụrụ aha n’amụma ahụ na-echetakwara anyị na ozi Jehova na-agụnye àjà. Pọl onyeozi dere, sị: ‘Ana m arịọsi unu ike ka unu na-enyefe ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anara nke ọma, ozi dị nsọ site n’ikike iche echiche unu.’ (Ndị Rom 12:1) N’ikwekọ n’okwu Pọl, ezi Ndị Kraịst adịghị enwe afọ ojuju nanị n’ịga ihe omume okpukpe otu ugboro kwa izu. Ha na-etinye oge ha, ume ha, na ihe onwunwe ha iji kwalite ofufe dị ọcha. Ọ̀ bụ na ọnụnọ nke ndị dị otú ahụ ji obi ha dum na-efe ofufe na-anọ ya adịghị achọ ụlọ Jehova mma? Amụma Aịzaịa kwuru na ọ ga-eme otú ahụ. Anyị pụkwara ijide n’aka na n’aka nke ha, ndị dị otú ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi na-efe ofufe, mara mma n’anya Jehova.

16. Olee ndị nyere aka n’ọrụ ihe owuwu n’oge ochie, oleekwa ndị meworo otú ahụ n’oge a?

16 Ndị ahụ bịara ọhụrụ chọrọ ịrụ ọrụ. Amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ụmụ ala ọzọ ga-ewukwa mgbidi gị nile, ndị eze ha ga-ejekwara gị ozi.” (Aịsaịa 60:10) Ná mmezu mbụ nke okwu ndị a laa azụ n’oge nlọtaghachi site ná ndọrọ n’agha na Babilọn, ndị eze na ndị ọzọ sitere ná mba dị iche iche nyere aka n’ezie ná mwughachi nke ụlọ nsọ ahụ na obodo Jeruselem. (Ezra 3:7; Nehemaịa 3:26) Ná mmezu ya nke oge a, oké ìgwè mmadụ ahụ akwadowo ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ n’iwulite ezi ofufe. Ha enyewo aka n’iwulite ọgbakọ Ndị Kraịst wee si otú a na-ewusi ‘mgbidi nile’ yiri obodo nke nzukọ Jehova ike. Ha na-ekerekwa òkè n’iwu ihe owuwu nkịtị—iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na ihe owuwu Betel. N’ụzọ ndị a nile, ha na-akwado ụmụnna ha e tere mmanụ n’igbo mkpa nke nzukọ Jehova na-ebuwanye ibu!

17. Olee otu ụzọ Jehova si eme ka ndị ya maa mma?

17 Lee ka okwu ndị ikpeazụ nke Aịsaịa 60:10 si bụrụ ihe na-agba ume! Jehova na-ekwu, sị: “N’iwe m ka M tiworo gị ihe, ma na mgbe ihe gị na-atọ m ụtọ ka M nweworo obi ebere n’ahụ́ gị.” Ee, laa azụ na 1918/1919, Jehova dọrọ ndị ya aka ná ntị n’ezie. Ma nke ahụ bụ n’oge gara aga. Ugbu a bụ oge maka Jehova igosipụta ebere n’ahụ́ ndị ohu ya e tere mmanụ na ndị ibe ha bụ́ atụrụ ọzọ ahụ. Ihe àmà na-egosi na nke a bụ eziokwu bụ mmụba na-enweghị atụ nke o jiworo gọzie ha, ‘na-eme ka ha maa mma,’ dị ka a pụrụ isi kwuo ya.

18, 19. (a) Olee nkwa Jehova kwere banyere ndị ọhụrụ ịbata ná nzukọ ya? (b) Gịnị ka amaokwu ndị fọdụrụnụ n’Aịsaịa isi 60 na-agwa anyị?

18 Kwa afọ, ọtụtụ narị puku “ụmụ ala ọzọ” na-esonyekwuru nzukọ Jehova, ụzọ ahụ ka ga-eghekwa oghe maka ọtụtụ ndị ọzọ isonyere ha. Jehova na-agwa Zaịọn, sị: “Ọnụ ụzọ  ámá gị nile ga-eghekwa oghe mgbe nile; a gaghị emechi ha n’ehihie ma ọ bụ n’abalị; ka mmadụ wee bubatara gị akụ̀ nke mba dị iche iche, ndị eze ha abụrụkwa ndị a na-edu edu.” (Aịsaịa 60:11) Ụfọdụ ndị mmegide na-agbalị imechi “ọnụ ụzọ ámá” ndị ahụ, ma anyị ma na ha agaghị emeli ya. Jehova n’onwe ya ekwuwo na n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ ga-eghe oghe. A ga-anọgide na-amụba.

19 A ka nwere ụzọ ndị ọzọ Jehova siworo gọzie ndị ya, na-eme ka ha maa mma, n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. Amaokwu ndị fọdụrụnụ n’Aịsaịa 60 ji amụma eme ka a mara ụzọ ndị ahụ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Ònye bụ “nwanyị” Chineke, oleekwa ndị na-anọchite anya ya n’ụwa?

• Olee mgbe ụmụ Zaịọn makpu n’ala, olee mgbe ha ‘biliri,’ ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

• Site n’iji ihe atụ dị iche iche mee ihe, olee otú Jehova si buo amụma banyere mmụba a na-enwe taa n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova siworo mee ka ìhè ya mụkwasị ndị ya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

E nyere “nwanyị” Jehova iwu ibili

[Foto dị na peeji nke 12]

Ìgwè ụgbọ mmiri ndị ahụ yiri nduru ka ha nọ n’ebe dị anya