Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Izi Ihe Gị Ọ̀ Dị Irè?

Izi Ihe Gị Ọ̀ Dị Irè?

 Izi Ihe Gị Ọ̀ Dị Irè?

NDỊ nne na nna, ndị okenye, ndị nkwusa ozi ọma—a chọrọ ka ha nile bụrụ ndị ozizi. Ndị nne na nna na-ezi ụmụ ha ihe, ndị okenye na-ezi ọgbakọ Ndị Kraịst ihe, ndị nkwusa ozi ọma na-ezi ndị nwere mmasị ọhụrụ ihe. (Deuterọnọmi 6:6, 7; Matiu 28:19, 20; 1 Timoti 4:13, 16) Gịnị ka ị pụrụ ime iji mee ka izi ihe gị dịkwuo irè? Otu ihe bụ na ị pụrụ iṅomi ihe nlereanya nke ezigbo ndị ozizi a kpọtụrụ aha n’Okwu Chineke. Ezra bụ onye ozizi dị otú ahụ.

Ịmụta Ihe Site n’Ihe Nlereanya Ezra

Ezra bụ onye nchụàjà nke sitere n’ezinụlọ Erọn, onye dịrị ndụ ihe dị ka afọ 2,500 gara aga na Babilọn. N’afọ 468 T.O.A., ọ gara Jeruselem iji kwalite ofufe dị ọcha n’etiti ndị Juu bi n’ebe ahụ. (Ezra 7:1, 6, 12, 13) Ọrụ a chọrọ na ọ ga-ezi ndị ahụ Iwu Chineke. Gịnị ka Ezra mere iji hụ na izi ihe ya dị irè? O weere ọtụtụ nzọụkwụ dị mkpa. Rịba nzọụkwụ ndị a ama dị ka e dekọrọ ha n’Ezra 7:10.

“Ezra [1] doziri obi ya [2] ịchọ iwu Jehova, na [3] ime ya, na [4] izi ụkpụrụ Ya na ikpe Ya n’Israel.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ka anyị tụlee nke ọ bụla n’ime nzọụkwụ ndị a ná mkpirikpi ma hụ ihe anyị pụrụ ịmụta site na ha.

“Ezra Doziri Obi Ya”

Dị nnọọ ka onye ọrụ ugbo si eji ọ́gụ̀ edozi ala tupu ya aghawa mkpụrụ, Ezra jiri ekpere dozie obi ya ịnara okwu Chineke. (Ezra 10:1) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ‘ọ kwadebere obi ya’ ịnakwere izi ihe Jehova.—Ilu 2:2, NW.

N’ụzọ yiri nke ahụ, Bible na-ekwu na Eze Jehoshafat ‘doziri obi ya ịchọ Chineke.’ (2 Ihe E Mere 19:3 ) N’ụzọ dị iche, a kọwara ọgbọ ndị Izrel “ndị na-edozighị obi ha” dị ka “ndị na-ewezụga onwe ha nke na-enupụkwa isi.” (Abụ Ọma 78:8) Jehova na-ahụ “mmadụ zoro ezo nke obi.” (1 Pita 3:4) Ee, “ọ na-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ ya.” (Abụ Ọma 25:9) N’ihi ya, lee ka o si dị mkpa ka ndị na-ezi ihe taa gbasoo ihe nlereanya nke Ezra site n’ibu ụzọ jiri ekpere mee ka obi ha dịrị n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị!

“Ịchọ Iwu Jehova”

Iji bụrụ ezigbo onye na-ezi ihe, Ezra chọrọ Okwu Chineke. Ọ bụrụ na ị ga-ejekwuru dọkịta,  ọ̀ bụ na ị gaghị ege ntị nke ọma ma jide n’aka na ị ghọtara ihe nile ọ na-ekwu ma ọ bụ ọgwụ ndị ọ na-agwa gị banyere ha? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-eme otú ahụ, n’ihi na ahụ́ ike gị nọ n’ihe ize ndụ. N’ihi ya, lee ka o si kwesị ekwesị karị ige nnọọ ntị nke ọma n’ihe ndị Jehova na-agwa anyị, ma ọ bụ ihe ndị ọ na-ekwu, site n’Okwu ya, bụ́ Bible, nakwa site n’ọnụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” E kwuwerị, ndụmọdụ ya metụtara ndụ anyị kpọmkwem! (Matiu 4:4; 24:45-47) N’ezie, dọkịta pụrụ ihie ụzọ, ma “iwu Jehova zuru okè.” (Abụ Ọma 19:7) Ọ dịghị mgbe anyị ga-achọ echiche ọzọ.

Akwụkwọ Ihe E Mere (bụ́ nke Ezra dere na mbụ dị ka otu mpịakọta) na-egosi na Ezra bụ n’ezie nwa akwụkwọ anya ruru ala. Iji dee akwụkwọ ndị ahụ, o zoro aka n’ọtụtụ akwụkwọ. * Nchịkọta nke akụkọ ihe mere eme nke mba ha dị ndị Juu ahụ ka si na Babilọn lọta, mkpa. Ha amachaghị banyere ememe okpukpe ha, ozi a na-eje n’ụlọ nsọ, na ọrụ ndị Livaị. Ihe ndekọ usoro ọmụmụ dị ha oké mkpa. Ezra lebaara ihe ndị ahụ anya n’ụzọ pụrụ iche. Ruo mgbe Mezaịa ga-abịa, ndị Juu ga-anọgide bụrụ otu mba nke nwere ala, ụlọ nsọ, òtù ndị nchụàjà, na onye ọchịchị nke ya. E chebere ịdị n’otu na ezi ofufe n’ihi ihe ọmụma nke Ezra wekọtara.

Olee otú ụzọ i si amụ ihe dị ma e jiri ya tụnyere nke Ezra? Iji ịdị uchu na-amụ Bible ga-enyere gị aka n’izi Bible n’ụzọ dị irè.

‘Na-achọnụ Iwu Jehova’ Dị Ka Ezinụlọ

Ọ bụghị nanị n’ọmụmụ ihe onwe onye ka a na-achọ Iwu Jehova. Ọmụmụ ihe ezinụlọ bụkwa ohere magburu onwe ya ime nke a.

Jan na Julia, bụ́ di na nwunye bi na Netherlands, anọwo na-agụrụ ụmụ ha ndị nwoke abụọ ihe n’olu dara ụda site kpọmkwem n’ụbọchị a mụrụ ha. Taa, Ivo dị afọ 15, Edo dịkwa afọ 14. Ha ka na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ha otu ugboro n’izu. Jan na-akọwa, sị: “Ebumnobi anyị bụ́ isi adịghị abụ ịmụcha ọtụtụ isiokwu n’oge ọmụmụ ihe ahụ, kama ọ bụ ka ụmụ okoro a ghọta ihe anyị na-amụ.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ụmụ okoro a na-eme nnyocha dị ukwuu. Ha na-eme nchọpụta banyere ihe okwu ndị a na-amaghị nke ọma pụtara nakwa mmadụ ndị a kpọtụrụ aha na Bible—mgbe ha dịrị ndụ, ndị ha bụ, ihe bụ́ ọrụ ha, na ihe ndị ọzọ. Kemgbe ha mụtara ịgụ ihe, ha atụlewo akwụkwọ ndị dị ka Insight on the Scriptures, akwụkwọ ọkọwa okwu, na akwụkwọ nkà ihe ọmụma dị iche iche. Nke a na-eme ka ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị na-atọkwu ụtọ. Ha na-atụsi anya ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị ike ma na-adị njikere mgbe nile maka ya.” Abamuru ọzọ si na ya pụta bụ na ugbu a, ha abụọ na-agba ndị mbụ na klas ha n’ihe ọmụmụ nkà asụsụ.

John na Tini, bụ́ di na nwunye ọzọ bi na Netherlands, na nwa ha nwoke, bụ́ Esli (onye dị afọ 24 ugbu a ma na-asụ ụzọ n’ọgbakọ ọzọ), na nwa ha nwanyị, bụ́ Linda (onye dị afọ 20 ma lụọkwa otu ezigbo nwanna nwoke na-eto eto) mụrụ ihe. Otú ọ dị, kama ịmụ otu akwụkwọ site n’iji usoro ajụjụ na azịza eme ihe dị ka a na-emekarị, ha mere ka ọmụmụ ihe ezinụlọ ahụ kwekọọ n’afọ ndụ na mkpa nke ụmụaka ahụ. Olee usoro ha ji mee ihe?

Jọn na-akọwa na nwa ya nwoke na nwa ya nwanyị na-ahọrọ isiokwu na-akpali mmasị site ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ (sitere n’Ụlọ Nche) na “Echiche nke Bible” (sitere na Teta!). Mgbe e mesịrị, ha na-ekwu ihe ndị ha kwadebeworo, bụ́ nke na-eme mgbe nile ka nkwurịta okwu ezinụlọ ha na-atọ ụtọ. N’ụzọ dị otú a, ndị a na-eto eto nwetara ahụmahụ n’ime nnyocha na n’ikwurịta ihe ha nyochatara. Ị̀ na-eso ụmụ gị ‘achọ iwu Jehova’? Ọ bụghị nanị na nke a ga-eme ka nkà izi ihe gị ka mma kama, ọ ga-enyekwara ụmụ gị aka ịghọkwu ndị na-ezi ihe n’ụzọ dị irè.

“Ime Ya”

Ezra tinyere ihe ọ mụtara n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ ka nọ na Babilọn, ọ pụrụ ịbụ na o  biri ndụ dị ntụsara ahụ́. Otú o sina dị, mgbe ọ chọpụtara na ya pụrụ inyere ndị ya bụ́ ndị nọ ná mba ọzọ aka, ọ hapụrụ ndụ dị ntụsara ahụ́ ọ na-ebi na Babilọn iji gaa obodo Jeruselem dị anya n’agbanyeghị ihe isi ike, nsogbu, na ihe ize ndụ nile dị na ya. N’ụzọ doro anya, ọ bụghị nanị na Ezra anọwo na-ewekọta ihe ọmụma Bible kama, ọ dị njikere ime ihe ọ mụtara.—1 Timoti 3:13.

Ka oge na-aga, mgbe o bi na Jeruselem, Ezra gosighachikwara na ọ na-etinye ihe ọ mụtara ma na-ezi, n’ọrụ. Nke a pụtara ìhè mgbe ọ nụrụ banyere alụmdi na nwunye ndị dị n’etiti ndị ikom bụ́ ndị Izrel na ndị inyom na-ekpere arụsị. Ihe ndekọ Bible na-agwa anyị na ọ ‘dọwara uwe ya na uwe mwụda ya, fopụkwa ụfọdụ n’agịrị isi nke isi ya na ajị afụ ọnụ ya, wee nọdụ, ibobo wee nwụọ ya n’ahụ́ ruo anyasị.’ Ọbụna ‘ihere mere ya, ihu ya nwugharịkwara n’ihi ihere, iweliri Jehova isi ya elu.’—Ezra 9:1-6.

Lee ka Iwu Chineke ọ na-amụ si metụta ya! Ezra ghọtara nke ọma ọdachi ga-esi ná nnupụisi nke ndị ahụ pụta. Ọnụ ọgụgụ nke ndị Juu lọghachirinụ dị ntakịrị. Ọ bụrụ na ha amalite iso ndị mba ọzọ na-alụrịta di na nwunye, ha pụrụ imesị soro mba ndị na-ekpere arụsị gbara ha gburugburu jikọọ aka, ofufe dị ọcha pụkwara ịpụ n’anya n’ụwa n’ụzọ dị mfe!

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ihe nlereanya Ezra nke egwu nsọpụrụ ofufe na ịnụ ọkụ n’obi siri ike kpaliri ụmụ Izrel imezi ụzọ ha. Ha chụpụrụ ndị nwunye ha lụtara ná mba ọzọ. N’ime ọnwa atọ, e doziri ihe nile. Iguzosi ike n’ihe nke Ezra nye Iwu Chineke nyere nnọọ aka n’ime ka izi ihe ya dị irè.

Otú ahụ ka ọ dị taa. Otu Onye Kraịst bụ́ nna kwuru, sị: “Ụmụaka adịghị eme ihe i kwuru; ha na-eme ihe i mere!” Otu ụkpụrụ ahụ dịkwa irè n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị okenye na-egosipụta ezi ihe nlereanya pụrụ ịtụ anya na ọgbakọ ga-eme ihe kwekọrọ n’ihe ha na-ezi.

“Izi Ụkpụrụ Ya na Ikpe Ya n’Israel”

E nwekwara ihe ọzọ mere ka izi ihe Ezra dị irè. O zighị echiche nke onwe ya, kama o ziri ‘ụkpụrụ na ikpe.’ Ya bụ, ụkpụrụ, ma ọ bụ iwu, Jehova. Nke a bụ ọrụ dịịrị ya dị ka onye nchụàjà. (Malakaị 2:7) Ọ kụzikwara ikpe ziri ezi, o setịpụkwara ihe nlereanya nke ihe o ziri site n’ịrapagidesi ike n’iji ikpe ziri ezi na eleghị mmadụ anya n’ihu na-eme ihe kwekọrọ n’iwu, n’ịgbaso ụkpụrụ. Mgbe ndị na-achị isi na-ekpe ikpe ziri ezi, a na-enwe nkwụsi ike, a na-arụpụtakwa ihe na-adịgide adịgide. (Ilu 29:4) N’ụzọ yiri nke ahụ, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, ndị nne na nna, na ndị nkwusa Alaeze bụ́ ndị maara Okwu Chineke nke ọma, ga-eme ka e nwee nkwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ mgbe ha na-ezi ụkpụrụ Jehova na ikpe n’ọgbakọ, n’ezinụlọ ha, na mgbe ha na-ezi ha ndị nwere mmasị.

Ọ̀ bụ na i kweghị na izi ihe gị pụrụ ịdịkwu irè mgbe i ṅomiri ihe nlereanya nke Ezra kwesịrị ntụkwasị obi, n’ụzọ zuru ezu? N’ihi ya, ‘dozie obi gị, na-achọ iwu Jehova, na-eme ya, na-ezikwa ụkpụrụ na ikpe ziri ezi nke Jehova.’Ezra 7:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 A pụrụ ịchọta akwụkwọ 20 Ezra si na ha nweta ihe o dere n’Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peeji nke 444-445, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]

GỊNỊ MERE KA IZI IHE EZRA DỊ IRÈ?

1. O mere ka obi ya nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị

2. Ọ chọrọ Iwu Jehova

3. O setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’itinye ihe ọ mụtara n’ọrụ

4. O tinyere uchu n’ịkụzi echiche Akwụkwọ Nsọ