Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Irite Uru Site n’Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Jehova

Irite Uru Site n’Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Jehova

 Irite Uru Site n’Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Jehova

“Onye ọ bụla nke maara ihe . . . ga-atụkwasịkwa uche n’ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] nile nke Jehova.”’—ABỤ ỌMA 107:43.

1. Olee mgbe mbụ e ji okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “obiọma sitere n’ịhụnanya” mee ihe na Bible, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-atụle banyere àgwà a?

IHE dị ka afọ 4,000 gara aga, nwa nwanne Ebreham bụ́ Lọt kwuru banyere Jehova, sị: “I mewokwa ka ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] gị dị ukwuu.” (Jenesis 19:19) Nke a bụ nke mbụ okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “obiọma sitere n’ịhụnanya” pụtara na Bible. Jekọb, Naomi, Devid, na ndị ọzọ bụ́ ndị ohu Chineke kwukwara banyere àgwà Jehova a. (Jenesis 32:10; Rut 1:8; 2 Samuel 2:6) N’ezie, okwu Hibru a pụtara ihe dị ka ugboro 250 n’ihe odide mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ma gịnị bụ obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova? Olee ndị e gosiri ya n’oge gara aga? Oleekwa otú anyị si erite uru na ya taa?

2. Gịnị mere okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “obiọma sitere n’ịhụnanya” ji sie nnọọ ike nkọwa, gịnịkwa bụ ụzọ ọzọ kwesịrị ekwesị e si sụgharịa ya?

2 N’Akwụkwọ Nsọ, “obiọma sitere n’ịhụnanya” bụ́ nsụgharị nke otu okwu Hibru nke nwere ọtụtụ ihe ọ pụtara nke na ọtụtụ asụsụ enweghị otu okwu ha ji akọwa ya nnọọ nke ọma. N’ihi ya, nsụgharị ndị dị ka “ịhụnanya,” “ebere,” na “ikwesị ntụkwasị obi” adịghị akọwa ya n’ụzọ zuru ezu. Otú ọ dị, nsụgharị ahụ ka saa mbara bụ́ “obiọma sitere n’ịhụnanya” “na-akọwa okwu ahụ n’ụzọ katụ zuo ezuo,” ka akwụkwọ bụ́ Theological Wordbook of the Old Testament na-ekwu. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ụzọ ọzọ New World Translation of the Holy Scriptures—With References si sụgharịa okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “obiọma sitere n’ịhụnanya” bụ “ezi ịhụnanya.”—Ọpụpụ 15:13; Abụ Ọma 5:7; ihe odide ala ala peeji nke NW.

Ọ Dị Iche n’Ịhụnanya na Iguzosi Ike n’Ihe

3. Olee otú obiọma sitere n’ịhụnanya si dị iche n’ịhụnanya?

3 Obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ezi ịhụnanya, na àgwà ndị bụ́ ịhụnanya na iguzosi ike n’ihe nwere njikọ chiri anya. Ma, ọ dị iche na ha n’ụzọ ndị pụtara ìhè. Tụlee otú obiọma sitere n’ịhụnanya na ịhụnanya si dị iche. A pụrụ igosi ịhụnanya n’ebe ihe ndị na-adịghị ndụ na echiche dị iche iche dị. Bible na-ekwu banyere ‘ịhụ mmanya vaịn na mmanụ n’anya’ na ‘ịhụ amamihe n’anya.’ (Ilu 21:17; 29:3) Ma, ọ bụ ndị mmadụ ka a na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya, ọ bụghị echiche ma ọ bụ ihe ndị na-adịghị ndụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ndị mmadụ ka Ọpụpụ 20:6 (NW) na-ekwu banyere ha mgbe ọ sịrị na Jehova “na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe ụmụ ụmụ nke otu puku nọ.”

4. Olee otú obiọma sitere n’ịhụnanya si dị iche n’iguzosi ike n’ihe?

4 Okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “obiọma sitere n’ịhụnanya” nwekwara ọtụtụ ihe ọ pụtara karịa okwu bụ́ “iguzosi ike n’ihe.” N’asụsụ ụfọdụ, a na-ejikarị “iguzosi ike n’ihe” eme ihe maka àgwà onye dị ala kwesịrị inwe n’ebe onye ka ya elu nọ. Ma dị ka otu onye nchọpụta si kwuo, site n’otú Bible si eji ya eme ihe, obiọma sitere n’ịhụnanya “na-ezokarị nnọọ aka kpọmkwem ná mmekọrịta dị iche: onye nke dị ike na-eguzosi ike n’ihe nye onye na-adịghị ike ma ọ bụ onye nọ ná mkpa ma ọ bụ onye dị ala.” Ọ bụ ya mere Eze Devid ji nwee ike ịrịọ Jehova, sị: “Mee ka ihu Gị nye ohu Gị ìhè; zọpụta m n’ihi ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] Gị.” (Abụ Ọma 31:16) A rịọrọ Jehova, bụ́ onye dị ike,  ka o gosi onye nọ ná mkpa, bụ́ Devid, obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ezi ịhụnanya. Ebe ọ bụ na onye ahụ nọ ná mkpa apụghị ịchịkwa onye ahụ dị ike, obiọma sitere n’ịhụnanya e gosiri n’ọnọdụ dị otú ahụ bụ nke e ji ọchịchọ obi mee, ọ bụghị ná mmanye.

5. (a) Ihe ndị dị aṅaa e ji amata obiọma sitere n’ịhụnanya nke Chineke ka a na-ahụ nke ọma n’Okwu ya? (b) Ụzọ ndị dị aṅaa Jehova si egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ya ka anyị ga-atụle?

5 “Onye ọ bụla nke maara ihe,” ka ọbụ abụ ahụ sịrị, “ga-atụkwasịkwa uche n’ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] nile nke Jehova.” (Abụ Ọma 107:43) Obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova pụrụ iduga ná mgbapụta na nchebe. (Abụ Ọma 6:4; 119:88, 159) Ọ bụ ihe nchebe na isi ihe na-eme ka mmadụ nwere onwe ya pụọ ná nsogbu. (Abụ Ọma 31:16, 21; 40:11; 143:12) N’ihi àgwà a, o kwere omume inweta mgbaghara mmehie. (Abụ Ọma 25:7) Site n’ịtụle akụkọ ụfọdụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ na ịrịba ihe odide ndị ọzọ dị na Bible ama, anyị ga-ahụ na obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova bụ (1) nke o ji ime ihe doro anya egosipụta na (2) nke ọ na-egosi ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi.

Nnapụta—Ngosipụta nke Obiọma Sitere n’Ịhụnanya

6, 7. (a) Olee otú Jehova si mee ka obiọma sitere n’ịhụnanya ya dị ukwuu n’ebe Lọt nọ? (b) Olee mgbe Lọt kwuru okwu banyere obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova?

6 Ikekwe ụzọ kasị mma isi chọpụta otú obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova haruru bụ inyocha ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara àgwà a. Na Jenesis 14:1-16, anyị na-ahụ na usuu ndị agha bụ́ ndị iro kpụụrụ Lọt, bụ́ nwa  nwanne Ebreham. Ma Ebreham napụtara Lọt. Ndụ Lọt dabara n’ihe ize ndụ ọzọ mgbe Jehova kpebiri ibibi ajọ obodo Sọdọm, bụ́ ebe Lọt na ezinụlọ ya bi.—Jenesis 18:20-22; 19:12, 13.

7 Kpọmkwem tupu e bibie Sọdọm, ndị mmụọ ozi Jehova dọkpụụrụ Lọt na ezinụlọ ya pụọ n’obodo ahụ. N’oge ahụ, Lọt kwuru, sị: “Ohu gị ahụtawo amara n’ihu gị, i mewokwa ka ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya ,” NW] gị dị ukwuu, nke i mewooro m n’idebe m ndụ.” (Jenesis 19:16, 19) Site n’okwu ndị a, Lọt kwetara na Jehova gosiri ya obiọma sitere n’ịhụnanya n’ụzọ pụrụ iche site n’ịnapụta ya. Na nke a, Chineke ji nnapụta na nchebe gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ya.—2 Pita 2:7.

Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Jehova na Nduzi Ya

8, 9. (a) Olee ozi e ziri ohu Ebreham? (b) Gịnị mere ohu ahụ ji kpee ekpere maka obiọma sitere n’ịhụnanya nke Chineke, gịnịkwa mere mgbe ọ na-ekpe ekpere?

8 Na Jenesis isi 24, anyị na-agụ banyere ụzọ ọzọ Chineke si gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ezi ịhụnanya. Ihe ndekọ ahụ na-akọ na Ebreham ziri ohu ya ka ọ gaa ná mba ndị ikwu Ebreham iji lụtara nwa ya nwoke bụ́ Aịzik nwunye. (Amaokwu nke 2-4) Ozi ahụ tara akpụ, ma e mesiri ohu ahụ obi ike na mmụọ ozi Jehova ga-eduzi ya. (Amaokwu nke 7) N’ikpeazụ, ohu ahụ ruru n’otu olulu mmiri dị ná mpụga “obodo Nehoa” (ma ọ́ bụghị Heran ọ bụrụ ebe dị ya nso) kpọmkwem mgbe ndị inyom na-abịa isere mmiri. (Amaokwu nke 10, 11) Mgbe ọ hụrụ ka ndị inyom ahụ na-abịarukwu nso, ọ matara na oge dị oké mkpa maka ozi ya eruola. Ma ọ̀ ga-esi aṅaa mata nwanyị nke ọ chọọrọ bịa?

9 N’ịmara na enyemaka Chineke dị ya mkpa, ohu Ebreham kpere ekpere, sị: “Jehova, bụ́ Chineke nke onye nwe m Abraham, biko, mee ka o zute m taa, bụ́ ihe m na-achọ, meekwara onye nwe m Abraham ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW].” (Amaokwu nke 12) Olee otú Jehova ga-esi gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ya? Ohu ahụ rịọrọ maka ihe ịrịba ama doro anya bụ́ nke ọ pụrụ iji mata nwa agbọghọ nke Chineke họọrọ. (Amaokwu nke 13, 14) Otu nwanyị mere kpọmkwem ihe ohu ahụ rịọrọ Jehova. Leenụ, ọ dị nnọọ ka a ga-asị na ọ nụpeere ekpere ya! (Amaokwu nke 15-20) N’ịbụ onye nke ahụ riri ọnụ, ohu ahụ nọ nnọọ “na-elegide ya anya.” Ma, a ka nwere ihe ụfọdụ ndị dị oké mkpa ịmata. Ọmarịcha nwanyị a ọ̀ bụ otu n’ime ndị ikwu Ebreham? Ọ̀ ka bụ nwanyị na-alụbeghị di? Ya mere, ohu ahụ ‘gbara nkịtị ịmara ma Jehova o mererị ka ije ya gaa nke ọma, ma ọ bụ na O meghị.’—Amaokwu nke 16, 21.

10. Gịnị mere ohu Ebreham ji kwubie na Jehova egosiwo onye nwe ya obiọma sitere n’ịhụnanya?

10 N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, nwa agbọghọ ahụ kọwara onwe ya dị ka ‘nwa Betuel, bụ́ nwa Milka, nke ọ mụrụ nye nwanne Abraham bụ́ Nehoa.’ (Jenesis 11:26; 24:24) N’otu mgbe ahụ, ohu ahụ bịara ghọta na Jehova azawo ekpere ya. N’ịbụ onye nke a riri ọnụ, ọ kpọrọ isiala ma kwuo, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke nke onye nwe m Abraham, bụ, Onye na-ahapụghị ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] Ya na eziokwu Ya n’ebe onye nwe m nọ: mụ onwe m, n’ụzọ ka Jehova duworo m ruo ụlọ ụmụnne onye nwe m.” (Amaokwu nke 27) Site n’inye nduzi, Chineke gosiri onye nwe ohu ahụ, bụ́ Ebreham, obiọma sitere n’ịhụnanya.

Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Chineke Na-eweta Nnwere Onwe na Nchebe

11, 12. (a) N’oge ọnwụnwa dị aṅaa ka obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova ruru Josef ahụ́? (b) Olee otú Chineke si gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ya n’ebe Josef nọ?

11 Ọzọ, ka anyị tụlee Jenesis isi 39. O hiwere isi n’ebe nwa nwa nwa Ebreham bụ́ Josef nọ, bụ́ onye e renyere n’ịbụ ohu n’Ijipt. Otú o sina dị,  ‘Jehova nọnyeere Josef.’ (Amaokwu nke 1, 2) N’ezie, ọbụna onye nwe Josef n’Ijipt bụ́ Pọtịfa, kwubiri na Jehova nọnyeere Josef. (Amaokwu nke 3) Otú ọ dị, Josef chere ule siri ike ihu. E boro ya ebubo ụgha na ọ nwara iso nwunye Pọtịfa nwee mmekọahụ n’ike, a tụkwara ya mkpọrọ. (Amaokwu nke 7-20) Ọ bụ “n’olulu” ụlọ mkpọrọ ka ha “weere agbụ kesie ụkwụ ya abụọ ike; mkpụrụ obi ya bara n’ígwè.”—Jenesis 40:15; Abụ Ọma 105:18.

12 Gịnị mere n’oge ahụ o nwere ahụmahụ ahụ tara nnọọ akpụ? “Jehova nọnyeere Josef, mee ka ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] Ya ruo ya ahụ́.” (Amaokwu 21a) Kpọmkwem otu obiọma sitere n’ịhụnanya e gosiri malitere usoro ihe ndị mesịrị mee ka Josef nwere onwe ya pụọ ná nsogbu ndị ọ nọ na-enwe. Jehova nyere Josef “amara n’ihu onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ.” (Amaokwu nke 21b) N’ihi ya, onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ nyere Josef ọrụ dị ùgwù. (Amaokwu nke 22) Mgbe nke ahụ gasịrị, Josef zutere nwoke nke mesịrị mee ka Fero, bụ́ onye na-achị Ijipt, nụ banyere ya. (Jenesis 40:1-4, 9-15; 41:9-14) N’aka nke ya, eze ahụ buliri Josef gaa n’ọkwá ịbụ onye nke abụọ n’Ijipt, na-eduga na ya ịrụ ọrụ zọpụtara ndụ n’ala Ijipt ahụ ụnwụ nri kpara aka ọjọọ. (Jenesis 41:37-55) Nhụjuanya Josef malitere mgbe ọ dị afọ 17 ma dịgide ruo ihe karịrị afọ 12! (Jenesis 37:2, 4; 41:46) Ma n’ime afọ ndị ahụ nile ọ tara ahụhụ ma hụjuo anya, Jehova Chineke gosipụtara obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe Josef nọ site n’ichebe ya pụọ n’ọdachi gaara  egbu ya na site n’ichebe ya maka ikere òkè dị ùgwù ná nzube Ya.

Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Chineke Adịghị Ada Ada

13. (a) Ụzọ ndị dị aṅaa Jehova si gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ka a na-ahụ n’Abụ Ọma nke 136? (b) Gịnị bụ ọdịdị nke obiọma sitere n’ịhụnanya?

13 Jehova gosipụtara obiọma sitere n’ịhụnanya ya ugboro ugboro n’ebe ụmụ Izrel nọ dị ka otu ndị. Abụ Ọma nke 136 na-akọ na o ji obiọma sitere n’ịhụnanya ya gbapụta ha (Amaokwu nke 10-15), duzie ha (Amaokwu nke 16), ma chebe ha. (Amaokwu nke 17-20) Chineke egosipụtawokwa obiọma sitere n’ịhụnanya ya n’ebe ndị mmadụ n’otu n’otu nọ. Onye na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe ụmụ mmadụ ibe ya nọ na-eji omume si ya n’obi bụ́ nke o bu n’obi iji gboo mkpa bara uru eme ya. Banyere obiọma sitere n’ịhụnanya, otu akwụkwọ ntụaka Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụ omume nke na-echebe ma ọ bụ na-akwalite ndụ. Ọ bụ ime ihe maka ọdịmma nke onye na-ahụsi anya ma ọ bụ onye dabara ná nsogbu.” Otu ọkà mmụta kọwara ya dị ka “ịhụnanya nke e ji omume gosipụta.”

14, 15. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Lọt bụ ohu Chineke a nwapụtara anwapụta?

14 Ihe ndekọ Jenesis ndị ahụ anyị nyochaworo na-egosi anyị na Jehova adịghị ahapụ igosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe ndị hụrụ ya n’anya nọ. Lọt, Ebreham, na Josef biri ndụ n’okpuru ọnọdụ ndị dịgasị iche iche ma chee ọnwụnwa ndị dịgasị iche iche ihu. Ha bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ma ha bụ ndị ohu Jehova a nwapụtara anwapụta, enyemaka Chineke dịkwa ha mkpa. Anyị pụrụ inweta nkasi obi n’eziokwu ahụ bụ́ na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe ndị dị otú ahụ nọ.

15 Lọt mere mkpebi ụfọdụ amamihe na-adịghị na ha bụ́ ndị mere ka ihe siere ya ike. (Jenesis 13:12, 13; 14:11, 12) Ma, o gosipụtakwara àgwà ndị kwesịrị ịja mma. Mgbe ndị mmụọ ozi abụọ nke Chineke bịarutere Sọdọm, Lọt lere ha ọbịa. (Jenesis 19:1-3) O ji okwukwe dọọ ndị na-alụ ụmụ ya ndị inyom aka ná ntị banyere mbibi a gaje ibibi Sọdọm. (Jenesis 19:14) A na-ahụ otú Chineke si lee Lọt anya na 2 Pita 2:7-9, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “[Jehova] gbapụtakwara onye ezi omume bụ́ Lọt, onye nwere oké mwute n’ihi mmikpu nke ndị na-eleda iwu anya mikpuru n’omume rụrụ arụ—n’ihi na onye ezi omume ahụ site n’ihe ọ hụrụ ma nụ n’oge o bi n’etiti ha site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị bụ onye a na-emekpa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ́ n’ihi omume mmebi iwu ha—Jehova maara ụzọ e si agbapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.” Ee, Lọt bụ onye ezi omume, ihe ndị e kwuru ebe a na-egosikwa na ọ bụ onye na-asọpụrụ Chineke. Dị ka ya, anyị na-enweta obiọma sitere n’ịhụnanya nke Chineke ka anyị na-ekere òkè “n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke.”—2 Pita 3:11, 12.

16. Olee okwu ọma Bible kwuru banyere Ebreham na Josef?

 16 Ihe ndekọ ahụ dị na Jenesis isi 24 mere ka nkekọ dị n’etiti Ebreham na Jehova doo nnọọ anya. Amaokwu nke mbụ na-ekwu na “Jehova gọzikwararịị Abraham n’ihe nile.” Ohu Ebreham kpọrọ Jehova “Chineke nke onye nwe m Abraham.” (Amaokwu nke 12, 27) Jems onye na-eso ụzọ na-ekwukwa na ‘a kpọrọ Ebreham onye ezi omume,’ e wee “na-akpọ ya ‘enyi Jehova.’” (Jems 2:21-23) Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe Josef nọ. E mesiri mmekọrịta chiri anya dị n’etiti Jehova na Josef ike n’ebe nile na Jenesis isi nke 39. (Amaokwu nke 2, 3, 21, 23) Ọzọkwa, banyere Josef, Stifen onye na-eso ụzọ kwuru, sị: “Chineke nọnyeere ya.”—Ọrụ 7:9.

17. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya nke Lọt, Ebreham, na Josef?

17 Ndị Chineke gosiri obiọma sitere n’ịhụnanya, ndị anyị tụleworo ugbu a, bụ mmadụ ndị ha na Jehova Chineke nwere ezi mmekọrịta, ndị mezukwara nzube Chineke n’ụzọ ụfọdụ. Ha chere ihe mgbochi ndị ha na-agaraghị emeriwo n’onwe ha ihu. Ichebe ndụ Lọt, ịhụ na ámá Ebreham echighị, na ịhụ na Josef rụrụ ọrụ ahụ ọ rụrụ bụ ihe ndị nọ n’ize ndụ. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ igbo mkpa nke ndị ikom a na-atụ egwu Chineke, o mekwara nke ahụ kpọmkwem site n’igosi ha obiọma sitere n’ịhụnanya. Ọ bụrụ na anyị gaje inweta obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova Chineke ruo mgbe ebighị ebi, anyị onwe anyị kwa aghaghị iso ya na-enwe mmekọrịta chiri anya, anyị aghaghịkwa ịnọgide na-eme uche ya.—Ezra 7:28; Abụ Ọma 18:50.

Ndị Ohu Chineke Bụ Ndị A Gọziri Agọzi

18. Gịnị ka ihe odide dịgasị iche iche nke Bible na-egosi banyere obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova?

18 Obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova ‘ejupụtawo ụwa,’ leekwa ka anyị si enwe ekele maka àgwà Chineke a! (Abụ Ọma 119:64) Anyị ji obi anyị dum azaghachi n’okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Ka ha kelee Jehova ekele banyere ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] Ya, na oké ọrụ Ya nile nke Ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ!” (Abụ Ọma 107:8, 15, 21, 31) Anyị na-enwe aṅụrị na Jehova na-eme ka obiọma sitere n’ịhụnanya ya na-eru ndị ohu ya ọ nwapụtara anwapụta ahụ́—ma ọ́ bụghị n’otu n’otu ọ bụrụ dị ka otu ìgwè. N’ekpere Daniel onye amụma, ọ kpọrọ Jehova “Chineke ahụ Nke dị ukwuu dịkwa egwu, Onye na-edebere ndị na-ahụ ya n’anya, ndị na-edebekwa ihe nile O nyere n’iwu, ọgbụgba ndụ Ya na ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] Ya.” (Daniel 9:4) Eze Devid kpere ekpere, sị: “Mee ka ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] Gị dịgidere ndị maara Gị.” (Abụ Ọma 36:10) Lee ekele anyị na-enwe na Jehova na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe ndị ohu ya nọ!—1 Ndị Eze 8:23; 1 Ihe E Mere 17:13.

19. N’isiokwu na-esonụ, olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

19 N’ezie, dị ka ndị Jehova, anyị bụ ndị a gọziri agọzi! Tụkwasị n’irite uru n’ịhụnanya Chineke gosiri ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha, anyị na-enweta ngọzi ndị pụrụ iche bụ́ ndị na-esite n’obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ezi ịhụnanya, nke Nna anyị nke eluigwe. (Jọn 3:16) Anyị na-erite uru n’àgwà a dị oké ọnụ ahịa nke Jehova karịsịa n’oge anyị nọ ná mkpa. (Abụ Ọma 36:7) Ma olee otú anyị pụrụ isi na-eṅomi obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova Chineke? Ànyị na-egosipụta àgwà a dị ịrịba ama dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu? A ga-atụle ajụjụ ndị a na ndị ọzọ metụtara ha n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee ụzọ ọzọ e si sụgharịa “obiọma sitere n’ịhụnanya” n’Akwụkwọ Nsọ?

• Olee otú obiọma sitere n’ịhụnanya si dị iche n’ịhụnanya na iguzosi ike n’ihe?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si gosi obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe Lọt, Ebreham, na Josef nọ?

• Ihe mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site n’otú Jehova si gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya n’oge ndị gara aga?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Ị̀ maara otú Chineke si gosi Lọt obiọma sitere n’ịhụnanya?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Jehova ji obiọma sitere n’ịhụnanya ya duzie ohu Ebreham

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Jehova gosipụtara obiọma sitere n’ịhụnanya site n’ichebe Josef