Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya Onye Kraịst ịga ememe olili ozu ma ọ bụ nke agbamakwụkwọ na chọọchị?

Anyị ikere òkè n’ụdị ọ bụla nke okpukpe ụgha adịghị amasị Jehova, a ghaghịkwa izere ya. (2 Ndị Kọrint 6:14-17; Mkpughe 18:4) Ememe olili ozu nke a na-eme na chọọchị bụ ihe omume okpukpe nke na-agụnye ma eleghị anya, okwuchukwu nke na-akwado echiche ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na ndị ọma nile ịga eluigwe. Ọ pụkwara ịgụnye ihe omume ndị dị ka ime akara nke obe na isonye n’ekpere nke ụkọchukwu ma ọ bụ onye ozi na-ekpe. Ekpere na ihe omume okpukpe ndị ọzọ bụ́ ndị megidere ozizi Bible pụkwara iso n’ememe agbamakwụkwọ a na-eme na chọọchị. N’ihi ịnọ n’etiti ìgwè mmadụ ebe onye ọ bụla na-ekere òkè n’ihe omume okpukpe ụgha, ọ pụrụ isiri Onye Kraịst ike iguzogide nrụgide nke isonyere ha. Lee ka o si bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya mmadụ ikpughepụ onwe ya nye nrụgide dị otú ahụ!

Gịnị ma ọ bụrụ na Onye Kraịst echee na ya kwesịrị ịga ememe olili ozu ma ọ bụ agbamakwụkwọ okpukpe a na-eme na chọọchị ma ọ bụ ebe ọzọ? Dị ka ihe atụ, di na-ekweghị ekwe pụrụ ịrịọ nwunye ya bụ́ Onye Kraịst ka ọ nọnyere ya n’oge ememe dị otú ahụ. Ọ̀ pụrụ isoro ya gaa nanị iji kirie ihe a ga-eme? Iji kwanyere ọchịchọ di ya ùgwù, nwunye ahụ pụrụ ikpebi iso ya gaa, na-ekpebisi ike ịghara ikere òkè n’ememe okpukpe ọ bụla. N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ ikpebi ịghara ịga, na-eche na nrụgide mmetụta uche nke ọnọdụ ahụ pụrụ iwetara ya ga-akarị ike ya, ikekwe na-akpatara ya imebi ụkpụrụ Chineke. Ọ bụ ya ka ọ dịịrị ikpebi. N’ezie, ọ ga-achọ ka obi ruo ya ala, na-enwe akọ na uche dị ọcha.—1 Timoti 1:19.

N’ọnọdụ nke ọ bụla, ọ ga-abara ya uru ịkọwara di ya na n’ihi akọ na uche ya, na ya agaghị ekere òkè n’ihe omume okpukpe ọ bụla ma ọ bụ sonye n’ịbụ abụ ma ọ bụ hulata isi ya mgbe a na-ekpe ekpere. Na-adabere ná nkọwa o nyere, di ya pụrụ ikpebi na ọnụnọ nwunye ya n’ebe ahụ pụrụ ịkpata ọnọdụ na-agaghị amasị ya. Ọ pụrụ ịhọrọ ịgawa nanị ya n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe nwunye ya nọ, nkwanye ùgwù o nwere maka nkwenkwe ya, ma ọ bụ ọchịchọ izere mmechuihu ọ bụla. Ma ọ bụrụ na o sie ọnwụ ka o soro ya gaa, ọ pụrụ ịga nanị dị ka onye na-ekiri ekiri.

Mmadụ ekwesịghị ileghara mmetụta ịga ememe n’ụlọ okpukpe pụrụ inwe n’ebe ndị kwere ekwe ibe ya nọ. Ọ̀ pụrụ imebi akọ na uche ụfọdụ ndị? Ọ̀ pụrụ ime ka mkpebi ha izere ikere òkè n’ikpere arụsị gharazie isi ike? ‘Unu jide ihe ndị ka mkpa n’aka,’ ka Pọl onyeozi na-adụ n’ọdụ, “ka unu wee bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ, gharakwa ịbụ ndị na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ ruo ụbọchị nke Kraịst.”—Ndị Filipaị 1:10.

Ọ bụrụ na ihe omume ahụ metụtara onye ahụ, a pụrụ inwekwu nrụgide ezinụlọ. N’ọnọdụ nke ọ bụla, Onye Kraịst aghaghị iji nlezianya tụlee ihe nile ọ gụnyere. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ikpebi na ọ dịghị ihe isi ike pụrụ ịpụta site n’ịga ememe olili ozu na nke agbamakwụkwọ na chọọchị dị ka onye na-ekiri ekiri. Otú ọ dị, ọnọdụ ahụ pụrụ ịbụ nke ịga nwere ike ịkpatara akọ na uche onye ahụ ma ọ bụ nke ụmụnna ya nsogbu, nke ga-akarị uru ịnọ ebe ahụ pụrụ ịba. N’agbanyeghị nke ọ bụla ọ bụ, Onye Kraịst aghaghị ijide n’aka na mkpebi ya agaghị egbochi ya ịnọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha n’ebe Chineke na ndị mmadụ nọ.