Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Nkwarụ Ga-esi Bịa ná Njedebe

Otú Nkwarụ Ga-esi Bịa ná Njedebe

 Otú Nkwarụ Ga-esi Bịa ná Njedebe

WERE anya nke uche gị hụ ka anya ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ntị ndị ntị chiri ana-anụ ụda nile, ire ndị ogbi ejiri ọṅụ na-abụ abụ, ụkwụ ndị ngwụrọ akwụrụ chịm ma nwee ike ịgagharị agagharị! Ihe anyị na-ekwu abụghị banyere ọganihu a ga-enwe na mberede na nkà mmụta ọgwụ, kama ọ bụ ihe ga-esi n’ihe Chineke n’onwe ya ga-eme maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ pụta. Bible na-ebu amụma, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:5, 6) Ma olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na amụma a dị ịtụnanya n’ezie ga-emezu?

Iji malitegodị, mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ gwọrọ ndị mmadụ ụdị ọrịa na nrịanrịa nile n’ezie. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị àmà—ọbụna ndị iro ya—hụrụ ihe ka ọtụtụ n’ọrụ ebube ndị ọ rụrụ. N’ezie, n’otu oge ma ọ dịkarịa ala, ndị mmegide na-arụ eziokwu ụka ji nlezianya nyochaa otu ọrịa Jizọs gwọrọ iji katọọ ya. Ma n’ụzọ mechuru ha ihu, nanị ihe ha mere bụ ịnwapụta na ọrụ ebube ahụ mere eme. (Jọn 9:1, 5-34) Mgbe Jizọs rụsịrị ọrụ ebube ọzọ a na-apụghị ịgbagha agbagha, ha ji obi nkoropụ kwuo, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme, n’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama?” (Jọn 11:47) Otú ọ dị, ndị nkịtị akpọghị ekwo nkụ dị ka ha, n’ihi na ọtụtụ n’ime ha malitere inwe okwukwe n’ebe Jizọs nọ.—Jọn 2:23; 10:41, 42; 12:9-11.

Ọrụ Ebube Jizọs—Ihe Atụ nke Ọgwụgwọ Ga-ezu Ụwa Ọnụ

Ọrụ ebube Jizọs mere ihe karịrị ịnwapụta na Jizọs bụ Mezaịa na Ọkpara Chineke. Ha nyere ihe ndabere maka inwe okwukwe ná nkwa Bible bụ́ na a ga-agwọ ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi n’ọdịnihu. Nkwa a na-agụnye amụma ahụ dị n’Aịsaịa isi 35, bụ́ nke e hotara na paragraf nke mbụ. Aịsaịa 33:24 na-ekwu banyere ahụ́ ike ụmụ mmadụ na-atụ egwu Chineke ga-enwe n’ọdịnihu, sị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” N’otu aka ahụ, Mkpughe 21:4 na-ekwe nkwa, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ [ọnwụnwa na nhụjuanya nke oge a] agabigawo.”

Ndị mmadụ na-ekpe ekpere mgbe nile maka mmezu nke amụma ndị a mgbe ha na-ekpe ekpere nlereanya Jizọs, nke ụfọdụ n’ime ihe e kwuru na ya bụ: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe  Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10, Union Version) Ee, ihe Chineke na-achọ na-emetụtakwa ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ. Ọrịa na nkwarụ, ọ bụ ezie na ọ dị ihe mere e ji kwere ka ha dịrị, ga-abịa ná njedebe n’oge na-adịghị anya; ha agaghị anọgide na-emebi “ihe mgbakwasị ụkwụ” Chineke ruo mgbe ebighị ebi.—Aịsaịa 66:1. *

Ndị A Gwọrọ n’Emeghị Ka Ọ Fụọ Ha Ụfụ Ma Ọ Bụ Naa Ha Ego

N’agbanyeghị ụdị nsogbu ndị mmadụ nwere, Jizọs gwọrọ ha n’emeghị ka ọ fụọ ha ụfụ, n’egbughị oge, n’anaghịkwa ha ego. N’ụzọ a na-apụghị igbochi egbochi, akụkọ banyere nke a gbasara dị ka ọkụ na-agba n’ọhịa, n’oge na-adịghịkwa anya, “oké ìgwè mmadụ wee bịakwute ya, na-akpọrọ ndị dara ngwụrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, ndị ogbi, na ọtụtụ ndị na-arịa ihe ndị ọzọ, ha tụsakwara ha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ụkwụ ya, o wee gwọọ ha.” Olee otú ndị mmadụ si meghachi omume? Matiu gara n’ihu ịkọ ihe o ji anya ya hụ, sị: “O juru ìgwè mmadụ ahụ anya ka ha hụrụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu na ndị ngwụrọ ka ha na-eje ije na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ, ha wee nye Chineke nke Izrel otuto.”—Matiu 15:30, 31.

Rịba ama na Jizọs ejighị nlezianya si n’ìgwè mmadụ ahụ họpụta ndị ahụ ọ gwọrọ—aghụghọ ndị nduhie na-aghọ. Kama nke ahụ, ọtụtụ ndị ikwu na ndị enyi nke ndị ahụ na-arịa ọrịa ‘tụsara ha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ụkwụ Jizọs, o wee gwọọ ha.’ Ugbu a, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe atụ ndị a kapịrị ọnụ banyere ikike Jizọs nwere ịgwọ ọrịa.

Ìsì: Ka Jizọs nọ na Jeruselem, o mere ka otu nwoke “kpuru ìsì site n’ọmụmụ” malite ịhụ ụzọ. A maara nwoke a nke ọma n’obodo ahụ dị ka onye arịrịọ kpuru ìsì. Ya mere, ị pụrụ iji anya nke uche gị hụ oké mkpali na oké mkpọtụ e nwere mgbe ndị mmadụ hụrụ ka ọ na-agagharị na-ahụ ụzọ! Ma, ọ bụghị ha nile nwere obi ụtọ. N’ịbụ ndị ọgbụgba Jizọs gbara ajọ omume ha n’anwụ tupu mgbe ahụ na-ewute, ụfọdụ ndị so n’otu ịrọ òtù a ma ama a na-akwanyekwara ùgwù nke ndị Juu nke a na-akpọ ndị Farisii chọsiri ike ịchọpụta ihe àmà ga-egosi na Jizọs ghọrọ aghụghọ. (Jọn 8:13, 42-44; 9:1, 6-31) N’ihi ya, ha gbara nwoke ahụ a gwọrọ ajụjụ ọnụ, mesịa gbaa ndị mụrụ ya, mesịakwa gbaghachi nwoke ahụ ajụjụ ọnụ. Ma nanị ihe ajụjụ ndị ahụ ndị Farisii gbara mere bụ ịnwapụta na Jizọs rụrụ ọrụ ebube ahụ, nke a kpasukwuru ha iwe. N’ịbụ onye ịkpọ ekwo nkụ nke ndị ihu abụọ okpukpe a juru anya, nwoke ahụ a gwọrọ kwuru, sị: “Malite n’oge ochie, a nụtụbeghị na mmadụ meghere anya onye kpuru ìsì site na mgbe a mụrụ ya. Ọ bụrụ na nwoke a esighị na Chineke, ọ pụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.” (Jọn 9:32, 33) N’ihi iji ọgụgụ isi gosipụta okwukwe ya otú ahụ n’ezoghị ọnụ, ndị Farisii ‘chụpụrụ ya,’ nke na-enye echiche na ha chụpụrụ nwoke a bụbu onye ìsì n’ụlọ nzukọ ha.—Jọn 9:22, 34.

Ntị ochichi: Ka Jizọs nọ na Dikapọlis, bụ́ ógbè dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan, ndị nọ n’ebe ahụ “kpọtaara ya otu nwoke ntị chiri nke nwekwara ihe na-egbochi ya ikwu okwu.” (Mak 7:31, 32) Ọ bụghị nanị na Jizọs gwọrọ onye a kama o gosikwara na ya nwere nghọta miri emi banyere mmetụta onye ahụ ntị chiri na-enwe, bụ́ onye nwere ike ịdị na-eme ihere n’etiti ìgwè mmadụ. Bible na-agwa anyị na Jizọs kpọọrọ “nanị [nwoke ahụ ntị chiri] pụọ n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ” ma gwọọ ya. Ọzọkwa, ndị ji anya ha hụ ya ‘nwere ihe ijuanya n’ụzọ pụrụ nnọọ iche,’ ha wee kwuo, sị: “O mewo ihe nile nke ọma. Ọ na-eme ọbụna ka ndị ntị chiri nụ ihe na ka ndị na-adịghị ekwu okwu kwuo okwu.”—Mak 7:33-37.

Ahụ́ mkpọnwụ: Ka Jizọs nọ na Kapaniọm, ndị mmadụ buuru otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nke dina n’ihe ndina bịakwute ya. (Matiu 9:2) Amaokwu nke 6 ruo 8 kọwara ihe merenụ. “[Jizọs] gwara onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: ‘Bilie, buru ihe ndina gị, laakwa n’ebe obibi gị.’ O wee bilie lawa n’ebe obibi ya. Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ nke a, egwu jidere ha, ha wee nye Chineke otuto, bụ́ onye nyere ụmụ mmadụ ikike dị otú ahụ.” Jizọs rụkwara ọrụ ebube a n’ihu ndị na-eso ụzọ ya na ndị iro ya. Rịba ama na ndị na-eso ụzọ ya, n’abụghị ndị nwere ịkpọasị na ajọ mbunobi, ‘nyere Chineke otuto’ n’ihi ihe ha ji anya ha hụ.

 Ọrịa: “Otu onye ekpenta bịakwutekwara [Jizọs], ọbụna gbuo ikpere n’ala na-arịọsi ya arịrịọ ike, na-asị ya: ‘Ọ bụrụ nnọọ na ị chọọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.’ N’ihi nke ahụ o nwere ọmịiko, o wee matịa aka ya bitụ ya aka, wee sị ya: ‘Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.’ Ozugbo ahụkwa, ekpenta ahụ pụrụ n’ahụ́ ya.” (Mak 1:40-42) Rịba ama na Jizọs agwọghị onye a dị ka a ga-asị na ọ masịghị ya kama o ji ezi ọmịiko gwọọ ya. Were ya na ị bụ onye ekpenta. Olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na e ji ụzọ dị ngwa nke na-adịghịkwa afụ ụfụ gwọọ gị ọrịa a na-atụ oké egwu nke jiworo nwayọọ nwayọọ kwarụọ ahụ́ gị ma mee ka ị bụrụ onye ọha mmadụ na-asọ asọ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị pụrụ ịghọta ihe mere onye ekpenta ọzọ a gwọrọ n’ụzọ ọrụ ebube ji “daa kpuo ihu n’ala n’ụkwụ Jizọs, na-ekele ya.”—Luk 17:12-16.

Mmerụ ahụ́: Ọrụ ebube ikpeazụ Jizọs rụrụ tupu e jide ya ma kpọgbuo ya bụ ịgwọ mmerụ ahụ́. N’ime ihe ọkụ ọkụ megide ndị na-aga ịkpụrụ Jizọs, Pita onyeozi, “ebe o bu mma agha, mịịrị ya wee gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà wee bepụ ntị aka nri ya.” (Jọn 18:3-5, 10) Ihe ndekọ ya na ya yiri na Luk na-agwa anyị na Jizọs ‘bitụrụ ntị ahụ aka wee gwọọ ya.’ (Luk 22:50, 51) Ọzọkwa, Jizọs mere omume obiọma a n’ebe ndị enyi ya nakwa ndị iro ya nọ—na nke ugbu a, ọ bụ ndị jidere ya.

Ee, ka anyị na-enyochakwu ọrụ ebube Jizọs, otú ahụ ka anyị na-aghọtakwu akara ndị e ji amata ha dị ka ndị bụ́ ezigbo ya. (2 Timoti 3:16) Dịkwa ka e kwuru na mbụ, ihe ọmụmụ dị otú ahụ kwesịrị ime ka okwukwe anyị nwere ná nkwa Chineke kwere ịgwọ ụmụ mmadụ na-erube isi sikwuo ike. Bible na-akọwa okwukwe Ndị Kraịst dị ka “atụmanya e ji n’aka nke ihe ndị a na-ele anya ha, ngosipụta pụtara ìhè nke ihe ndị bụ ezie n’agbanyeghị na a dịghị ahụ ha anya.” (Ndị Hibru 11:1) N’ụzọ doro anya, Chineke adịghị akwado ikwere ihe n’ajụghị ase ma ọ bụ ịrọ nrọ efu, kama ọ na-akwado inwe okwukwe siri ike nke dabeere n’ihe àmà. (1 Jọn 4:1) Ka anyị na-enweta okwukwe dị otú ahụ, anyị na-ahụ na anyị na-aghọ ndị sikwuru ike n’ụzọ ime mmụọ, nwekwuo ezi ahụ́ ike, ma na-enwekwu obi ụtọ.—Matiu 5:3; Ndị Rom 10:17.

Ọgwụgwọ Ime Mmụọ Aghaghị Ibute Ụzọ!

Ọtụtụ ndị nwere ezi ahụ́ ike adịghị enwe obi ụtọ. Ọbụna ụfọdụ na-anwa igbu onwe ha n’ihi na ha enweghị olileanya maka ọdịnihu ma ọ bụ n’ihi na ọ na-adị ha ka nsogbu ha na-enwe ọ̀ na-akarị ha ike. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha nwere nkwarụ n’ụzọ ime mmụọ—ọnọdụ dị nnọọ oké njọ n’anya Chineke karịa nkwarụ nkịtị. (Jọn 9:41) N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị nwere nkwarụ, dị ka Christian na Junior bụ́ ndị e kwuru banyere ha n’isiokwu bu ụzọ, na-enwe obi ụtọ na afọ ojuju ná ndụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ahụ́ siri ha ike n’ụzọ ime mmụọ, ha na-enwetakwa ume site n’olileanya e ji n’aka nke dabeere na Bible.

N’izo aka ná mkpa pụrụ iche anyị nwere dị ka ụmụ mmadụ, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.” (Matiu 4:4) Ee, n’adịghị ka ihe ndị e kere eke bụ́ anụmanụ, ọ bụghị nanị nri nkịtị dị ụmụ mmadụ mkpa. N’ịbụ ndị e kere “n’onyinyo” Chineke, nri ime mmụọ—ihe ọmụma banyere Chineke na otú anyị si kwekọọ ná nzube ya nakwa n’ime uche ya—dị anyị mkpa. (Jenesis 1:27; Jọn 4:34) Ihe ọmụma banyere Chineke na-eme ka ndụ anyị nwee nzube na ike ime mmụọ. Ọ na-emekwa ka e nwee ihe ndabere maka ndụ agwụghị agwụ n’ụwa paradaịs. “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi,” ka Jizọs kwuru, “ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ndị ha na Jizọs dịkọrọ ndụ adịghị akpọ ya “Ọgwọ Ọrịa” kama ha kpọrọ ya “Onye Ozizi.” (Luk 3:12; 7:40) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs kụziiri ndị mmadụ banyere ihe ngwọta na-adịgide adịgide nye nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ—Alaeze Chineke. (Luk 4:43; Jọn 6:26, 27) Ọchịchị eluigwe a nke dị n’aka Jizọs Kraịst ga-achị ụwa nile ma mezuo nkwa nile e kwere n’ime Bible banyere ịkpụzigharị uche ụmụ mmadụ bụ́ ndị ezi omume na ịrụzigharị ebe obibi ha bụ́ ụwa n’ụzọ zuru ezu ma na-adịgide adịgide. (Mkpughe 11:15) Ọ bụ ya mere Jizọs, n’ekpere nlereanya ya, ji jikọta ọbịbịa nke Alaeze ahụ na ime uche Chineke n’ụwa.—Matiu 6:10.

 Nye ọtụtụ ndị nwere nkwarụ, ịmata banyere olileanya a na-akpali akpali emewo ka anya mmiri ákwá ha ghọọ anya mmiri ọṅụ. (Luk 6:21) N’ezie, Chineke ga-eme ọbụna ihe karịrị iwepụ ọrịa na nkwarụ; ọ ga-ekpochapụ kpọmkwem ihe na-akpata nhụjuanya nke mmadụ—mmehie n’onwe ya. N’ezie, Aịsaịa 33:24 na Matiu 9:2-7, bụ́ ndị e hotara na mbụ, jikọtara ọrịa na ọnọdụ mmehie anyị. (Ndị Rom 5:12) N’ihi ya, ọ bụrụ na e kpochapụ mmehie, ihe a kpọrọ mmadụ ga-enweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke” n’ikpeazụ, bụ́ nnwere onwe nke na-agụnye izu okè nke uche na nke ahụ́.—Ndị Rom 8:21.

Ọ pụrụ ịdịrị ndị nwetụrụ ezi ahụ́ ike mfe ịbụ ndị na-ejighị ọnọdụ ha kpọrọ ihe. Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ndị na-ahụsi anya n’ihi nkwarụ. Ha maara nnọọ otú ahụ́ ike na ndụ si bụrụ ihe dị oké ọnụ ahịa na otú ihe pụrụ isi gbanwee na mberede nakwa n’ụzọ a na-atụghị anya ya. (Eklisiastis 9:11) N’ihi ya, anyị na-enwe olileanya na ndị nwere nkwarụ n’etiti ndị na-agụ akwụkwọ anyị ga-echebara nkwa ndị dị ebube Chineke kwere dị ka e dekọrọ ha na Bible echiche n’ụzọ pụrụ iche. Jizọs nyere ndụ ya iji jide n’aka na ha ga-emezu. Ọ̀ dị ihe mmesi obi ike karịrị nke ahụ?—Matiu 8:16, 17; Jọn 3:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Maka ntụle zuru ezu nke ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị, lee broshuọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.