Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Mmetụta nke Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ugbu A—Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ruo Mgbe Ebighị Ebi

Inwe Mmetụta nke Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ugbu A—Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ruo Mgbe Ebighị Ebi

 Inwe Mmetụta nke Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ugbu A—Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ruo Mgbe Ebighị Ebi

GỊNỊ mere o ji esi ike ịnọ ná ntụkwasị obi, ọ bụrụkwa na a nọrọ ná ntụkwasị obi, ọ naghị adịte aka? Ọ̀ pụrụ ịbụ na echiche anyị nwere banyere ịnọ ná ntụkwasị obi dabeere n’echiche efu—n’ihe anyị tụrụ anya inweta kama ịbụ n’ihe a pụrụ inweta n’ezie? A pụrụ ịkpọ echiche efu dị otú ahụ ịrọ nrọ.

Echiche efu na-eme ka uche mmadụ pụọ n’ihe ndị na-eme eme ná ndụ na anọghị ná ntụkwasị obi nile nke ndụ, ma kpaga n’ọnọdụ mara mma ebe a nọkwa ná ntụkwasị obi, na-eleghara ihe ọ bụla pụrụ imebi nrọ ahụ anya. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, nsogbu ndị e nwere n’ụwa na-akpaghasị nrọ ahụ na mberede ma jiri ike mebie mmetụta nke ihe adịla mma onye ahụ nwere, na-akpọghachi ọrọ nrọ ahụ n’ihe ndị dị adị.

Ka anyị leba anya n’otu ebe ndị mmadụ na-achọrọ ịnọ ná ntụkwasị obi aga—ịkwaga ebe ọzọ. Dị ka ihe atụ, obodo ukwu pụrụ iyi ebe a pụrụ ịnọ nwee ihe ịga nke ọma, na-akpali mmadụ ịrọwa nrọ ikpori ndụ, inweta ụgwọ ọnwa buru ibu, na ọmarịcha ebe obibi. Ee, ọ pụrụ iyi ka ọ bụ ebe ahụ ka a ga-achọta ịnọ ná ntụkwasị obi a nọworo na-atụ anya ya eri ogologo oge. Ma atụmanya a ọ̀ pụrụ ikwe nnweta?

Ebe A Na-akwagaỌ̀ Bụ Obodo Ukwu Ka Ọ̀ Bụ Nrọ Ukwu?

Ná mba ndị na-emepe emepe, e ji mkpọsa ngwá ahịa pụrụ ime ka e nwewa atụmanya siri ike na-eme ka obodo ukwu bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ karị. Ọ bụghị na ndị na-ahazi mkpọsa ngwá ahịa dị otú ahụ nwere mmasị na gị ịnọ ná ntụkwasị obi, kama ha nwere mmasị n’irepụ ngwá ahịa ha. Ha na-ezochi nsogbu ndị dị adị ma na-egosi foto nke ndị ihe na-agaziri bụ́ nke na-egosi ịnọ ná ntụkwasị obi. N’ụzọ dị otú ahụ, ha na-egosi na a na-anọ ná ntụkwasị obi site n’ịzụ ngwá ahịa ha kpọsara banyere ya nakwa site n’ịkwaga n’obodo ukwu.

Tụlee ihe atụ na-esonụ. Ndị ọchịchị nọ n’otu obodo ukwu dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa gwunyere bọọdụ mkpọsa bụ́ nke na-egosi n’ụzọ doro anya na ise siga bụ n’ezie ịkpọ ego a tara ahụhụ kpata ọkụ. Nke ahụ bụ otu akụkụ nke mkpọsa ha ji adọ ụmụ amaala ha aka ná ntị megide ise siga. Ndị na-emepụta siga na ndị na-ere ya ere mere ihe megide nke ahụ site n’igwunye bọọdụ mkpọsa e ji nkà chọọ mma bụ́ nke na-egosi foto na-adọrọ adọrọ nke ndị na-ese siga ka ha na-enwe obi ụtọ na ihe ịga nke ọma. Tụkwasị na nke ahụ, otu ụlọ ọrụ na-emepụta siga yikwasịrị ụfọdụ ndị ọrụ ya yunifọm mara mma na okpu a chọrọ mma iji gaa kesaara ndị na-eto eto nọ n’okporo ámá siga, na-agba onye ọ bụla n’ime ha ume ‘ịnwale ya.’ Ihe ka  n’ọnụ ọgụgụ ná ndị a na-eto eto si n’ime obodo bịa, ebe ha na-amaghịkwa aghụghọ nke usoro mkpọsa ngwá ahịa, e ji ya duhie ha. Ha ghọrọ ndị ise siga riri ahụ́. Ndị ahụ na-eto eto si n’ime obodo abịawo n’obodo ukwu iji nwee ike ịnọ ná ntụkwasị obi ka ha wee nwee ike ịkwado ezinụlọ ha ma ọ bụkwanụ kpata ego hiri nne. Kama nke ahụ, ha nọ na-akpọ ihe ka ukwuu n’ego ha gaara eji mee ihe ndị bara uru ọkụ.

Ọ bụghị nanị ndị ahịa na-emekarị mkpọsa ngwá ahịa ndị na-egosi inwe ọganihu n’obodo ukwu. Ha pụrụ isite n’ọnụ ndị kwagaworo n’obodo ukwu ma bụrụ ndị ihere na-ekweghị ka ha laghachi n’obodo nta ha si bịa. N’achọghị ime ka o yie ka ha bụ ndị na-abaghị uru, ha na-etu ọnụ banyere akụ̀ na ụba na ihe ịga nke ọma ndị ha na-eme ka ha enwetawo n’obodo ukwu. Otú ọ dị, ilerukwu ọganihu ha sị na ha na-enwe anya na-ekpughe na ụdị ndụ ha na-adị ugbu a akaghị nke ha na-adịbu n’ime obodo mma; ha na-adọga ịkpata ego dị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị ọzọ bi n’obodo ukwu na-eme.

Karịsịa, ọ bụ n’obodo ukwu ka ndị batara ọhụrụ iji nọrọ ná ntụkwasị obi na-adaba n’aka ndị agamevu. N’ihi gịnị? N’ozuzu, ha enwebeghị ohere inweta ezi ndị enyi, ha nọkwa n’ebe dị anya site n’ezinụlọ ha. N’ihi ya, ha enweghị ndị na-adụ ha ọdụ bụ́ ndị pụrụ inyere ha aka izere ihe ize ndụ dị n’ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya nke obodo ukwu.

Josué adabaghị n’ọnyà nke ise siga. Ọzọkwa, ọ bịara ghọta na ya agaghị ebuli ihe ndụ a na-ebi n’obodo ukwu na-achọ n’aka ya. N’ọnọdụ ya, nanị ihe kasị mma ọ pụrụ inweta n’obodo ukwu ahụ bụ oké atụmanya na-emezughị emezu. Ọ ghọtara na ya anọghị ná ntụkwasị obi n’ezie n’obodo ukwu ahụ; ebe ahụ ekwesịghị ya nnọọ. Ọ bịara nwee mmetụta nke ịtọgbọ chakoo, erughị eru, na nke ịbụ onye na-abaghị uru, o mesịkwara ree ihere ya ma laghachi n’ime obodo.

Ọ nọwo na-atụ ụjọ na a ga-akwa ya emo. Kama nke ahụ, ezinụlọ ya na ezi ndị enyi ya ji obi ụtọ nabata ya. N’ihi mmeso ọma ezinụlọ ya mesoro ya, gburugburu ime obodo ọ maara nke ọma, na ịhụnanya nke ndị enyi ya nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, n’oge na-adịghị anya, o nwere mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi dị ukwuu karịa ka o nwere n’obodo ukwu, bụ́ ebe atụmanya nke ọtụtụ ndị na-aghọ ịmụ anya arọ nrọ. N’ụzọ tụrụ ya n’anya, iso nna ya arụsị ọrụ ike n’ubi mere n’ezie ka ya na ezinụlọ ya kpata ihe dị ukwuu karịa ihe ọ gaara akpata n’obodo ukwu.

EgoGịnị n’Ezie Bụ Nsogbu?

Ego ọ̀ ga-eme ka i nwee mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi? Liz, bụ́ onye si Canada na-ekwu, sị: “Dị ka onye na-eto eto, ekweere m na ego na-eme ka mmadụ ghara ịdị na-echegbu onwe ya.” Ọ malitere ịhụ otu nwoke nwere ego n’anya. N’oge na-adịghị anya, ha lụrụ. Ò nwere mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi? Liz gara n’ihu, sị: “Mgbe m lụrụ di, anyị nwere ebe obibi mara mma na ụgbọala nta abụọ, ọnọdụ akụ̀ na ụba anyị mekwara ka ọ fọ nke nta ka anyị nwee ike inweta ihe onwunwe ọ bụla masịrị anyị, gaa ebe ọ bụla masịrị anyị, ma nwee ụdị ntụrụndụ ọ bụla masịrị anyị. N’ụzọ na-eju nnọọ anya, aka m na-echegbu onwe m banyere ego.” Ọ na-akọwa ihe kpatara ya: “E nwere ọtụtụ ihe ga-efunahụ anyị. O yiri ka ọ na-abụ ka ị na-enweta ihe, otú ahụ ka ị na-enwekwu mmetụta nke ịbụ onye na-anọghị ná ntụkwasị obi. Ego emeghị ka m kwụsị inwe nchegbu ma ọ bụ nchekasị.”

Ọ bụrụ na i chere na i nweghị ego ga-ezuru gị iji nọrọ ná ntụkwasị obi, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị n’ezie bụ nsogbu m? Ọ̀ bụ n’ezie enweghị ego ka ọ bụ amaghị achịkwa ego nke ọma?’ N’ịtụgharị uche ná ndụ o biri n’oge gara aga, Liz na-asị: “Ana m aghọta ugbu a na isi ihe kpatara nsogbu ezinụlọ m nwere mgbe m bụ nwata bụ amaghị achịkwa ego nke ọma. Anyị na-azụ ihe n’aka, n’ihi ya kwa, anyị na-anọ n’ụgwọ mgbe nile. Nke a wetara nchegbu.”

Otú ọ dị, taa, Liz na di ya nwere mmetụta nke ịnọkwu nnọọ ná ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na  ha enwerughị ego otú ha nweburu. Mgbe ha mụtara eziokwu nke Okwu Chineke, ha kwụsịrị ige ihe ndị na-adọrọ adọrọ a na-ekwu banyere ego ma malite ige ntị n’amamihe nke Chineke, gụnyere okwu ndị a: “Ma onye na-ege m ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.” (Ilu 1:33) Ha chọrọ ka ndụ ha nwekwuo nzube karịa nke inwe ego dị ukwuu n’ụlọ akụ̀ ga-enye ha. Ugbu a, dị ka ndị ozi ala ọzọ nọ n’ala dị anya, Liz na di ya na-akụziri ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye na Jehova Chineke ga-eweta ezi ịnọ ná ntụkwasị obi n’ụwa nile n’isi nso. Ọrụ a na-eme ka e nwee afọ ojuju na ahụ́ iru ala miri emi nke na-abịa site n’inwe nzube na ụkpụrụ ka elu, ọ bụghị site n’inwe ego.

Cheta eziokwu a bụ́ isi: Ịba ọgaranya n’ebe Chineke nọ bara nnọọ uru karịa inwe ụbara ihe onwunwe. N’akụkụ nile nke Akwụkwọ Nsọ, ihe e mesiri ike abụghị inwe ụbara ihe onwunwe, kama ọ bụ iso Jehova na-adị ná mma, bụ́ nke anyị pụrụ ịnọgide na-eme site n’iji okwukwe na-eme uche Chineke n’esepụghị aka. Kraịst Jizọs gbara anyị ume ịbụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ” na ịkpado ‘akụ̀ n’eluigwe.’—Luk 12:21, 33.

 Ọkwá—Ebee Ka Ị Na-aga?

Ọ bụrụ na ị na-eche na ịrịgo n’ọkwá bụ ụzọ e si anọ ná ntụkwasị obi, jụọ onwe gị sị: ‘Ònye n’ime ndị nọ n’ọkwá dị elu nọ ná ntụkwasị obi n’ezie? N’ọkwá dị aṅaa ka m ga-eru iji nọrọ ná ntụkwasị obi?’ Ọrụ na-aga nke ọma pụrụ ime ka i chee n’ụzọ na-ezighị ezi na ị nọ ná ntụkwasị obi, na-eduga n’inwe ndakpọ olileanya, ma ọ bụ ọbụna nke ka njọ, n’ịda ajọ ọdịda.

Ahụmahụ ndị mere eme na-egosi na inwe aha ọma n’ebe Chineke nọ na-eme ka a nọrọ ná ntụkwasị obi karịa ka inwe aha ọma n’ebe mmadụ nọ na-eme. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ inye ụmụ mmadụ onyinye nke ndụ ebighị ebi. Nke ahụ na-agụnye ide aha anyị, ọ bụghị n’akwụkwọ a na-ede aha ndị a ma ama kama, n’akwụkwọ ndụ nke Chineke.—Ọpụpụ 32:32; Mkpughe 3:5.

Ọ bụrụ na ị hapụgodị ịrọ nrọ efu, olee otú i si atụ ọnọdụ ị nọ na ya ugbu a n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, gịnị ka ị pụrụ iji ezi obi tụọ anya inweta n’ọdịnihu? Ọ dịghị onye nwere ihe nile. Dị ka otu Onye Kraịst maara ihe si kwuo ya, “Amụtawo m na ọ dịghị mgbe ndụ bụ nke a NA nke ahụ kama ọ bụ nke a MA Ọ BỤ nke ahụ.” Kwụsịtụ ma gụọ igbe bụ́ “A Kọrọ Ya na Benin.”

Ugbu a zaa ajụjụ ndị a: Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ dị mkpa ná ndụ m? Olee ụzọ kasị nso isi ruo ya? Ọ̀ pụrụ ịbụ na m nọ n’ogologo ụzọ na-abụghị ezigbo ya nke dịkwa ize ndụ nakwa na a pụrụ isi n’ụzọ na-adịchaghị mgbagwoju anya nweta ihe m na-achọ na ihe a pụrụ inweta enweta n’ezie?

Mgbe Jizọs nyechara ndụmọdụ banyere uru dị nta nke ihe onwunwe ma e jiri ya tụnyere uru nke ihe ime mmụọ, o kwuru ka anya anyị “na-elegide otu ebe.” (Matiu 6:22) O mere ka o doo anya na ihe ndị bụ́ isi ná ndụ bụ ihe ime mmụọ na ihe mgbaru ọsọ ndị hiwere isi n’aha Chineke nakwa n’Alaeze ya. (Matiu 6:9, 10) Ihe ndị ọzọ adịchaghị mkpa, ma ọ bụ dị ka a pụrụ isi kwuo ya, abụghị ihe ndị a ga-elekwasị anya.

Taa, ọtụtụ kamera, dị ka e si rụọ ha, na-elekwasị anya n’ihe ndị dị n’ebe dị anya na ndị dị nso. Ị̀ ga-achọ ịdị otú ahụ? Ị̀ na-ahụ nke ọma ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile ị na-ele anya—ya bụ, hà dị mkpa, bụrụ ihe ndị a na-achọsi ike, nakwa site n’ịrọtụ nrọ efu, ihe ndị a pụrụ inweta enweta? Ọ bụrụ na ọ dịtụ otú ahụ, ọ pụrụ ịdịrị gị mfe ichezọ ihe dị mkpa nye Ndị Kraịst, bụ́ Alaeze ahụ, ebe ọ bụ na i nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ị na-elekwasị anya, ị chọkwara inweta nke ọ bụla n’ime ha. Ndụmọdụ siri ike Jizọs nyere bụ: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:33.

Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ugbu A na Ruo Mgbe Ebighị Ebi

Anyị nile pụrụ ịdị na-atụ anya ihe ndị ka mma maka onwe anyị na ndị anyị hụrụ n’anya. Otú ọ dị, eziokwu ahụ bụ́ na anyị ezughị okè, na-ebi n’ụwa na-ezughị okè, ma nwee afọ ndụ dị mkpụmkpụ, na-amanye anyị ibelata ihe ndị anyị pụrụ ịtụ anya inweta n’ezie. Otu onye so dee Bible kọwara ọtụtụ puku afọ gara aga, sị: “M laghachiri, hụ n’okpuru anyanwụ, na ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ̀ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị; kama mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.”—Eklisiastis 9:11.

Mgbe ụfọdụ anyị na-etinye uche nke ukwuu  n’ihe ndị a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị nke na anyị na-echefu ileba anya n’ihe ndị ka mkpa bụ́ ndị metụtara ndị anyị bụ na ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie iji nọrọ ná ntụkwasị obi n’ezie. Tụlee okwu amamihe ndị a e kwuru n’oge ochie: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ: nke a bụkwa ihe efu. Ihe ụtọ ka ụra nke onye na-ala ọrụ ubi bụ, ma ọ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe hiri nne ka ọ na-eri: ma afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra.” (Eklisiastis 5:10, 12) Ee, ebee ka ịnọ ná ntụkwasị obi gị dabeere?

Ọ bụrụ na ọnọdụ gị yitụrụ nrọ efu nke Josué, ị̀ pụrụ ịgbanwe atụmatụ gị? Ndị hụrụ gị n’anya n’ezie ga-akwado gị, dị nnọọ ka ndị ezinụlọ Josué na ndị enyi ya nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst kwadoro ya. Ị pụrụ ịnọ ná ntụkwasị obi ka ukwuu n’ebe na-abaghị ọgaranya bụ́ ebe gị na ndị hụrụ gị n’anya ga-anọ karịa n’obodo ukwu bụ́ ebe gị na ndị pụrụ ịgbalị irigbu gị ga-anọ.

Ọ bụrụ na ị bararịị ọgaranya, dị ka Liz na di ya, ị̀ pụrụ ịgbanwe ụzọ ndụ gị iji tinyekwuo oge na ume gị n’inyere ndị mmadụ aka, ma hà bụ ndị ọgaranya ma hà bụ ndị ogbenye, ịmụta banyere Alaeze ahụ, bụ́ ụzọ a ga-esi nwee ike ịnọ ná ntụkwasị obi n’ezie?

Ọ bụrụ na ị nọwo na-arịgo n’ọkwá, ị pụrụ iji obi ọcha tụgharịa uche banyere ihe na-akpali gị. N’eziokwu, inwe ihe onwunwe ụfọdụ pụrụ ime ka ị nụkwuo ụtọ ndụ. Otú ọ dị, ị̀ na-elegide anya n’Alaeze ahụ—ụzọ bụ́ ezie e si anọ ná ntụkwasị obi na-adịgide adịgide? Cheta okwu Jizọs bụ́: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ọ bụrụ na ị na-ekere òkè n’ọrụ dịgasị iche iche n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ị ga-anọ ná ntụkwasị obi n’ụzọ na-eju afọ.

Ndị na-atụkwasị Jehova na Alaeze ya obi n’ụzọ zuru ezu nọ ná ntụkwasị obi n’ụzọ na-enye obi ụtọ ugbu a ma na-elepụ anya ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ezu n’ọdịnihu. Ọbụ abụ ahụ sịrị: “Edowo m Jehova n’ihu m mgbe nile: n’ihi na Ọ nọ n’aka nri m, a gaghị ewezụga m n’ọnọdụ m. N’ihi nke a obi m aṅụrịwo ọṅụ, nsọpụrụ m etegharịwokwa egwu ọṅụ: ọzọ, anụ ahụ́ m ga-ebi ná ntụkwasị obi.”—Abụ Ọma 16:8, 9.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

A Kọrọ Ya na Benin

A kọọla akụkọ a ọtụtụ puku ugboro n’ụdị dịgasị iche iche. N’oge na-adịbeghị anya, otu agadi nwoke bi n’otu ime obodo dị na Benin, nke dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, si otú a kọọrọ ya ụmụaka ụfọdụ.

Onye ọkụ azụ̀ ji ụgbọ epeepe ya lọta ma zute otu ọkachamara si mba ọzọ nke na-eje ozi ná mba a na-emepe emepe. Ọkachamara ahụ jụrụ onye ọkụ azụ̀ ahụ ihe mere o ji lọta nnọọ n’oge. Ọ zara ya na ya gaara anọtukwu ma na ya akụtala ihe ga-ezuru ya na ezinụlọ ya.

“Gịnịdị ka ị na-eji oge gị nile eme?” ka ọkachamara ahụ jụrụ ya.

Onye ọkụ azụ̀ ahụ zara, sị: “M na-akụ azụ̀ ruo nwa oge. Soro ụmụ m gwurie egwu. Anyị nile ehie ụra ehihie mgbe okpomọkụ dị. N’uhuruchi, anyị erikọta nri ọnụ. E mesịa, ana m esoro ndị enyi m nọkọọ igere egwú ụfọdụ, na ime ihe ndị ọzọ.”

Ọkachamara ahụ nabiiri ya okwu, sị: “Lee anya, enwere m akara ugo mmụta mahadum, amụwokwa m banyere ihe ndị a. Achọrọ m inyere gị aka. Ị kwesịrị ịnọ ogologo oge karị n’ịkụ azụ̀. Ị ga-enwetakwu ego, n’oge na-adịghịkwa anya, ị ga-enwe ike ịzụta ụgbọ mmiri butụrụ ibu karịa ụgbọ epeepe a. Mgbe i nwere ụgbọ mmiri butụrụ ibu, ị ga na-enwetakwukwa ego ma nwee ike ịrụ ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji akụ azụ̀ n’oge na-adịghị anya.”

“Gịnị emezie?” ka onye ọkụ azụ̀ ahụ na-ajụ.

“Mgbe ahụ, kama isi n’aka onye mgbere ahịa na-ere azụ̀ gị, ị pụrụ ịga kpọmkwem n’ụlọ ọrụ ndị na-azụ azụ̀ ma ọ bụ ọbụna meghee ụlọ ọrụ nke gị ebe a na-eji azụ̀ emepụta ihe. Ị ga-enwe ike ịhapụ obodo gị ma gaa Cotonou, ma ọ bụ Paris, ma ọ bụ New York ma si ebe ahụ na-ahazi achụmnta ego ahụ nile. Ọbụna ị pụrụ iche banyere itinye ọrụ achụmnta ego gị n’ụlọ ahịa ego ma na-enweta ego dị ọtụtụ nde.”

“Ogologo oge hà aṅaa ka ihe a nile ga-ewe?” ka onye ọkụ azụ̀ ahụ jụrụ.

“Ikekwe afọ 15 ruo 20,” ka ọkachamara ahụ zara.

“Gịnị emezie?” ka onye ọkụ azụ̀ ahụ gara n’ihu ịjụ.

“Ọ bụ mgbe ahụ ka ndụ ga-amalite ịdị ụtọ,” ka ọkachamara ahụ na-akọwa. “Mgbe ahụ ị pụrụ ịla ezumike nká. Ị pụrụ ịhapụ ndọga ahụ nile ma kwaga n’otu ime obodo.”

“Mgbe ahụ, gịnị emezie?” ka onye ọkụ azụ̀ ahụ jụrụ.

“Mgbe ahụ ị ga-enwe ohere ịdị na-akụtụ azụ̀, soro ụmụ gị na-egwuri egwu, na-ehi ụra ehihie mgbe okpomọkụ dị, soro ezinụlọ gị na-eri nri abalị, ma soro ndị enyi gị na-anọkọ igere egwú ụfọdụ.”

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Mbuli n’ọkwá ọ̀ na-eme ka a nọrọ ná ntụkwasị obi?

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Ndị Kraịst ibe gị nwere mmasị n’ezie na gị ịnọ ná ntụkwasị obi