Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

 Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ò kwesịrị ekwesị ikpegara Chineke ekpere n’ekwughị ihe dị ka “n’aha Jizọs”?

Bible na-egosi na Ndị Kraịst bụ́ ndị chọrọ ikpegara Jehova ekpere kwesịrị ime otú ahụ n’aha Jizọs. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ihe ọ bụla unu rịọrọ n’aha m, m ga-eme nke a, ka e wee nye Nna ahụ otuto n’ihe metụtara Ọkpara ya. Ọ bụrụ na unu arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya.”—Jọn 14:6, 13, 14.

N’izo aka n’ọkwá pụrụ iche nke Jizọs, akwụkwọ bụ́ Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature na-ekwu, sị: “Ọ bụ Chineke ka e kwesịrị ịdị na-ekpegara ekpere site n’aka Jizọs Kraịst dị ka Onye Ogbugbo. Ya mere, arịrịọ nile siri ike a na-arịọ ndị nsọ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi abụghị nanị na ha abaghị uru, kama ha bụ nkwulu. Otú ọ dị, ofufe nile a na-efe ihe e kere eke, n’agbanyeghị otú ihe ahụ e kere eke dịruru elu, bụ ikpere arụsị, bụrụkwa nke a machibidoro kpam kpam n’ime iwu dị nsọ nke Chineke.”

Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ asị “Jehova i meela” mgbe o nwesịrị ahụmahụ na-enye obi ụtọ n’agbakwụnyeghị “n’aha Jizọs”? Nke a ọ̀ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị? Ọ bụchaghị. Ka e were ya na Onye Kraịst zutere ihe ize ndụ na mberede wee tie, sị: “Jehova, nyere m aka!” Chineke agaghị ajụ ma ọlị inye aka n’ihi na ohu ya ekwughị “n’aha Jizọs.”

Otú ọ dị, e kwesịrị ịmata na nanị ịgwa Chineke okwu n’olu dara ụda abụghị n’onwe ya, ekpere. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova kpesịrị ya ikpe maka igbu nwanne ya nwoke bụ́ Ebel, Ken sịrị: “Ahụhụ ajọ omume m dị ukwuu karị obubu. Lee, ị chụpụwo m taa n’ihu ala; ọ bụkwa n’ihu Gị ka a ga-ezopụ m; m ga-abụkwa onye na-aṅagharị n’ọsọ n’ụwa; ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke na-ahụ m ga-egbu m.” (Jenesis 4:13, 14) Ọ bụ ezie na ọ bụ Jehova ka Ken na-agwa okwu, ihe o jiri oké mmetụta kwuo bụ ime mkpesa banyere ihe ọjọọ nke mmehie rụpụtara.

Bible na-agwa anyị, sị: “Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.” Ịgwa Onye Kachasị Ihe Nile Elu okwu n’ụzọ nkịtị dị ka mmadụ efu ga-abụ n’ezie adịghị umeala n’obi. (Jems 4:6; Abụ Ọma 47:2; Mkpughe 14:7) Ọ ga-abụkwa enweghị nkwanye ùgwù bụ́ ịmatacha ihe Okwu Chineke na-ekwu banyere ọrụ Jizọs na-arụ, ma mara ụma kpee ekpere n’abụghị site na Jizọs Kraịst.—Luk 1:32, 33.

Nke a apụtaghị na ọ dị otu usoro Jehova na-atụ anya ka anyị gbasoo mgbe anyị na-ekpe ekpere. Otu ihe bụ́ isi bụ ọnọdụ obi mmadụ. (1 Samuel 16:7) Na narị afọ mbụ O.A., otu onye ọchịagha Rom aha ya bụ Kọnịliọs “na-arịọsikwa Chineke arịrịọ ike mgbe nile.” Kọnịliọs, bụ́ onye Jentaịl a na-ebighị úgwù, araraghị onwe ya nye Jehova. Ọ bụ ezie na o yighị ka o kpere ekpere ya n’aha Jizọs, ha ‘rịgooro dị ka ihe ncheta n’ihu Chineke.’ N’ihi gịnị? N’ihi na “onye na-anwa obi,” hụrụ na Kọnịliọs ‘bụ nwoke obi ya dị ọcha, onye na-atụ egwu Chineke.’ (Ọrụ 10:2, 4; Ilu 17:3) Mgbe ọ mụtara ihe banyere “Jizọs onye Nazaret,” Kọnịliọs natara mmụọ nsọ ma ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs e mere baptizim.—Ọrụ 10:30-48.

Ná nkwubi okwu, ọ dịghịrị ụmụ mmadụ ikpebi ekpere ndị Chineke na-anụ. Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na Onye Kraịst agwa Chineke okwu ma ghara ikwu ihe dị ka “n’aha Jizọs,” nke a ekwesịghị ime ka o nwee oké obi amamikpe. Jehova maara adịghị ike anyị n’ụzọ zuru ezu, ma chọọ inyere anyị aka. (Abụ Ọma 103:12-14) Anyị pụrụ inwe obi ike na ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe ‘n’Ọkpara Chineke, n’agbanyeghị ihe ọ bụ nke anyị na-arịọ dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.’ (1 Jọn 5:13, 14) Otú ọ dị, ezi Ndị Kraịst na-egosi na ha matara ọrụ ndị Akwụkwọ Nsọ setịpụrụ nke Jizọs na-arụ ná nzube Jehova, karịsịa mgbe ha na-anọchite anya ndị ọzọ n’ekpere ihu ọha. Ha na-ejikwa nrubeisi na-agbalị ịkwanyere Jizọs ùgwù site n’ikpegara Chineke ekpere site na ya.