Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkwenkwe Okpukpe Ò Kwesịrị Ịdabere n’Ọgụgụ Isi?

Nkwenkwe Okpukpe Ò Kwesịrị Ịdabere n’Ọgụgụ Isi?

 Nkwenkwe Okpukpe Ò Kwesịrị Ịdabere n’Ọgụgụ Isi?

“E nwere imerime ndị ‘ji okpukpe kpọrọ ihe’ bụ́ ndị na-ekpe okpukpe nanị iji zere iche echiche,” ka onyeisi nke otu seminarị nkà mmụta okpukpe dị na United States na-ede. “Ihe ha na-achọ bụ ịnakwere nnọọ ihe nile ‘n’achọghị ihe nnwapụta,’” ka ọ na-agbakwụnye.

IHE ọ na-egosi bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị sị na ha nwere nkwenkwe okpukpe adịghị echebachara ihe mere ha ji kwere ihe ha kweere echiche ma ọ bụkwanụ tụlee ma nkwenkwe ha ò nwere ihe ndabere ezi uche dị na ya. Ka a sịkwa ihe mere okpukpe jiworo ghọọ ihe ọtụtụ mmadụ na-adịghị enwe mmasị ikwu banyere ya.

N’ụzọ dị mwute, omume ndị dị ka iji ihe oyiyi okpukpe eme ihe na ịgụ ekpere e bu n’isi na-egbochikwa iche echiche. Omume ndị a, tinyere ihe owuwu ndị bụ́ ịgba, nnukwu windo ndị e tinyere ugegbe ndị tụrụ àgwà àgwà, na egwú ndị dị ụtọ, bụ nanị ihe ọtụtụ nde ndị na-ekpe okpukpe maara banyere okpukpe. Ọ bụ ezie na chọọchị ụfọdụ na-ekwu na nkwenkwe ha dabeere na Bible, ozi ha bụ́ ‘kwere na Jizọs, a ga-azọpụtakwa gị’ adịghị agba ume ka a na-amụsi Bible ike. Ndị ọzọ tinyere isi n’ikwusa oziọma maka ịgwọta nsogbu ọha na eze na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Gịnị na-esi n’ihe a nile apụta?

Banyere ọnọdụ e nwere n’Ebe Ugwu America, otu onye na-ede banyere okpukpe kwuru, sị: “Iso Ụzọ Kraịst . . . yiri ka ọ bụ n’elu ọnụ, a dịghị[kwa] enye ndị nọ na ya ọzụzụ dị mma n’ihe banyere nkwenkwe.” Ọbụna otu onye nchọpụta ruru nnọọ n’ókè nke ịkọwa United States dị ka “mba nke ndị na-amaghị Bible.” N’ezie, otú ahụ ka ọ ga-adịkwa ná mba ndị ọzọ ebe ihe a sị na ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst jupụtara. N’otu aka ahụ, ọtụtụ okpukpe ndị na-abụghị nke Ndị Kraịst adịghị akwado iche echiche, kama nke ahụ, ihe ha na-emesi ike bụ ikwe ukwe, ịgụ ekpere ndị e bu n’isi na ụdị dịgasị iche iche nke ntụgharị uche bụ́ ndị na-agụnye nkwenkwe ihe omimi, kama ịbụ iche echiche n’ụzọ ezi uche dị na ya.

Ma, ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị, otu ndị ahụ na-adịghị echebachara izi ezi ma ọ bụ ịbụ eziokwu nke nkwenkwe okpukpe ha echiche na-ejikarị nlezianya echebara ihe ndị ọzọ echiche nke ọma. Ọ́ dịghị ada gị ka ihe na-adabaghị adaba na onye mere nnyocha dị ukwuu nanị iji zụọ ụgbọala—nke a ga-ebufu otu ụbọchị n’ebe a na-ebufu mkpọmkpọ ihe—ga-ekwu banyere okpukpe ya, sị, ‘Ọ bụrụ na ọ dị ndị mụrụ m mma, ọ dị m mma’?

Ọ bụrụ n’ezie na anyị nwere mmasị n’ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụle ma ihe anyị kweere banyere ya ọ̀ bụ eziokwu? Pọl onyeozi kwuru banyere ụfọdụ ndị okpukpe nke oge ya bụ́ ndị nwere “ịnụ ọkụ n’obi maka Chineke; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Ndị Rom 10:2) A pụrụ iji ndị dị otú ahụ tụnyere onye e goro ọrụ ite ágbá nke dọgburu onwe ya n’ọrụ, ma n’ihi egeghị ntị ná ntụziaka nke onye nwe ụlọ  ahụ, jiri ágbá nke ụcha ya na-abụghị nke a gwara ya ka o jiri mee ihe tee ụlọ ahụ. Onye ahụ na-ete ụlọ ágbá pụrụ inwe mmasị n’ihe ọ rụrụ, ma onye nwe ụlọ ahụ ọ̀ ga-anara ya nke ọma?

Gịnị ka Chineke na-anara nke ọma banyere ezi ofufe? Bible na-aza, sị: “Nke a dị mma ma bụrụ ihe a na-anara nke ọma n’anya Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, onye ọ bụ uche ya ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4) Ụfọdụ pụrụ iche na o kweghị omume inweta ihe ọmụma dị otú ahụ n’ime ọtụtụ okpukpe ndị e nwere taa. Ma chee echiche—ọ bụrụ na ọ bụ uche Chineke ka ụmụ mmadụ bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu, ọ̀ ga-ezochiri ha ya n’ụzọ na-ezighị ezi? Ọ gaghị eme otú ahụ dị ka Bible na-egosi, bụ́ nke na-asị: “Ọ bụrụ na ị chọọ [Chineke], Ọ ga-eme ka ị chọta Ya.”—1 Ihe E Mere 28:9.

Olee otú Chineke si eme ka ndị ji ezi obi na-achọ ya mara ya? Isiokwu na-esonụ ga-aza ya.