Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mee Baptizim?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mee Baptizim?

 N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mee Baptizim?

“Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim.”—MATIU 28:19.

1, 2. (a) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka e meworo baptizim ụfọdụ? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a na-ajụ banyere baptizim?

EZE Charlemagne nke Frank manyere ndị Saxon o meriri n’agha ịbụ ndị e mere baptizim n’ìgwè na 775-777 O.A. “O ji ike tọghata ha gaa n’ihe a sị na ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ John Lord dere. N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe onye chịrị Russia bụ́ Vladimir nke Mbụ lụsịrị adaeze bụ́ onye Ọtọdọks nke Gris na 987 O.A., o kpebiri na ndị ọ na-achị aghaghị ịghọ “Ndị Kraịst.” O nyere iwu ka e mee ndị ya baptizim n’ìgwè—ka e jiri mma agha yie ndị jụrụnụ egwu ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa!

2 Baptizim ndị dị otú ahụ hà kwesịrị ekwesị? È nwere ezi ihe ha pụtara? È kwesịrị ime nnọọ onye ọ bụla a hụrụ baptizim?

Ime BaptizimN’ụzọ Dị Aṅaa?

3, 4. N’ihi gịnị ka ifesa mmiri n’isi ma ọ bụ ịwụsa ya awụsa na-ejighị bụrụ baptizim kwesịrị ekwesị nke Ndị Kraịst?

3 Mgbe Charlemagne na Vladimir nke Mbụ manyere ndị mmadụ ịbụ ndị e mere baptizim, ha mere ihe na-ekwekọghị n’Okwu Chineke. N’ezie, ọ dịghị ezi ihe na-esi na ya apụta mgbe baptizim gụnyere ifesa mmiri, ịwụ mmiri n’isi, ma ọ bụ ọbụna imikpu ndị a na-akụzibeghịrị eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ n’ime mmiri.

4 Tụlee ihe mere mgbe Jizọs nke Nazaret jekwuuru Jọn Onye Na-eme Baptizim na 29 O.A. Jọn na-eme ndị mmadụ baptizim n’Osimiri Jọdan. Ha ejiwo aka ha bịakwute ya ka o mee ha baptizim. Ihe o mere ọ̀ bụ nnọọ ime ka ha guzoro n’ime Jọdan wee kwọsatụ ha mmiri n’isi ma ọ bụ fesa ha ya efesa? Gịnị mere mgbe Jọn mere Jizọs baptizim? Matiu na-akọ na mgbe e mesịrị ya baptizim “Jizọs siri na mmiri ahụ pụta ozugbo.” (Matiu 3:16) Mmiri kpuchiri ya, ebe ọ bụ na e mikpuru ya n’Osimiri Jọdan. N’otu aka ahụ, e mere ọnaozi Etiopia ahụ nwere obi eziokwu baptizim n’ime “mmiri.”  Mmiri dị otú ahụ dị mkpa n’ihi na baptizim e mere Jizọs na ụmụazụ ya gụnyere imikpu ná mmiri kpam kpam.—Ọrụ 8:36.

5. Olee otú Ndị Kraịst mbụ si mee ndị mmadụ baptizim?

5 Okwu Grik ndị a sụgharịrị ịbụ “mee baptizim,” “baptizim,” na ihe ndị yiri ha, na-ezo aka n’imikpu, ịsụkpu, ma ọ bụ ịdakpu ná mmiri. Akwụkwọ bụ́ Smith’s Bible Dictionary na-asị: “N’ụzọ kwesịrị ekwesị na n’ụzọ nkịtị, baptizim pụtara imikpu ná mmiri.” N’ihi ya, ụfọdụ nsụgharị Bible na-ezo aka n’ebe “Jọn Onye Na-emikpu ná Mmiri” na “Jọn onye na-asụkpu ná mmiri,” nọ. (Matiu 3:1, Rotherham; Diaglott, nke a sụgharịrị n’asụsụ dị iche iche) Akwụkwọ Augustus Neander bụ́ History of the Christian Religion and Church, During the Three First Centuries na-ekwu, sị: “Na mbụ e mere baptizim site n’imikpu ná mmiri.” Akwụkwọ France a ma ama bụ́ Larousse du XXe Siècle (Paris, 1928) na-asị: “E mere Ndị Kraịst mbụ baptizim site n’imikpu ha ná mmiri n’ebe ọ bụla a hụrụ mmiri.” Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-ekwukwa, sị: “Ihe àmà na-egosi na Baptizim e mere na Chọọchị mbụ ahụ bụ site n’imikpu ná mmiri.” (1967, Mpịakọta nke Abụọ, peeji nke 56) N’ihi ya, taa, ịbụ onye e mere baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ nzọụkwụ e ji ọchịchọ obi eme nke na-agụnye imikpu ná mmiri kpam kpam.

Ihe Ọhụrụ Mere E Ji Eme Baptizim

6, 7. (a) Nzube dị aṅaa ka Jọn ji mee ndị mmadụ baptizim? (b) Gịnị dị ọhụrụ banyere baptizim e mere ụmụazụ Jizọs?

6 Nzube nke baptizim ndị Jọn mere dị iche site ná mmikpu ụmụazụ Jizọs mikpuru ndị mmadụ ná mmiri. (Jọn 4:1, 2) Jọn mere ndị mmadụ baptizim dị ka ngosipụta ihu ọha nke nchegharị ha n’ihi mmehie ha mere megide Iwu ahụ. * (Luk 3:3) Ma ọ dị ihe ọhụrụ baptizim e mere ụmụazụ Jizọs gụnyere. Na Pentikọst 33 O.A., Pita onyeozi gbara ndị na-ege ya ntị ume, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst maka mgbaghara mmehie unu.” (Ọrụ 2:37-41) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ka Pita na-agwa okwu, ọ dịghị ekwu banyere baptizim iji gosipụta nchegharị n’ihi mmehie ndị e mere megide Iwu ahụ; ọ dịghịkwa ekwu na baptizim n’aha Jizọs na-ese onyinyo nsachapụ nke mmehie.—Ọrụ 2:10.

7 N’oge ahụ, Pita ji nke mbụ n’ime “mkpịsị ugodi nke Alaeze” ahụ mee ihe. N’ihi nzube dị aṅaa? Iji kpugheere ndị na-ege ya ntị ihe ọmụma banyere ohere ha nwere ịbanye n’Alaeze eluigwe. (Matiu 16:19) Ebe ọ bụ na ndị Juu ajụwo Jizọs dị ka Mezaịa ahụ, ichegharị na igosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ bụ ihe ọhụrụ na ihe dị oké mkpa n’ịchọ na n’inweta mgbaghara Chineke. Ha pụrụ inye ihe àmà nke okwukwe dị otú ahụ n’ihu ọha site n’ịbụ ndị e mikpuru ná mmiri n’aha Jizọs Kraịst. N’ụzọ dị otú ahụ, ha ga-egosipụta nrara ha raara onwe ha nye Chineke site na Kraịst. Ndị nile na-achọ inweta ihu ọma Chineke taa aghaghị igosipụta okwukwe yiri nke ahụ, rara onwe ha nye Jehova Chineke, e meekwa ha baptizim Ndị Kraịst ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha dum nye Chineke Onye Kasị Ihe Nile Elu.

Ezi Ihe Ọmụma Dị Oké Mkpa

8. Gịnị mere baptizim Ndị Kraịst na-ejighị bụrụ maka onye ọ bụla?

8 Baptizim Ndị Kraịst abụghị maka onye ọ bụla. Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Tupu e mee ndị mmadụ baptizim, a ghaghị ‘izi ha ihe nile Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya n’iwu.’ N’ihi ya, baptizim e ji mmanye mee ndị na-enweghị okwukwe nke dabeere n’ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke abaghị uru, o megidekwara ọrụ Jizọs nyere ezi ụmụazụ ya.—Ndị Hibru 11:6.

9. Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha nke Nna” pụtara?

9 Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha  nke Nna” pụtara? Ọ pụtara na onye ahụ a gaje ime baptizim na-anakwere ọkwá na ikike Nna anyị nke eluigwe. N’ụzọ dị otú ahụ, a na-anakwere Jehova Chineke dị ka Onye Okike, “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile,” na Ọkaaka Eluigwe na Ala.—Abụ Ọma 83:18; Aịsaịa 40:28; Ọrụ 4:24.

10. Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim ‘n’aha nke Ọkpara’ pụtara?

10 Ịbụ onye e mere baptizim ‘n’aha nke Ọkpara’ pụtara ịnakwere ọkwá Jizọs na ikike ya dị ka Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya. (1 Jọn 4:9) Ndị ruru eru ka e mee ha baptizim na-anakwere Jizọs dị ka onye Chineke si n’aka ya nye “ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28; 1 Timoti 2:5, 6) Ndị a gaje ime baptizim aghaghịkwa ịnakwere ‘ọkwá ka elu’ nke Chineke buliworo Ọkpara ya gaa na ya.—Ndị Filipaị 2:8-11; Mkpughe 19:16.

11. Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim ‘n’aha nke mmụọ nsọ’ pụtara?

11 Gịnị ka baptizim ‘n’aha nke mmụọ nsọ’ pụtara? Nke a na-egosi na ndị a gaje ime baptizim ghọtara na mmụọ nsọ bụ ike Jehova nọ n’ọrụ, bụ́ nke o ji eme ihe n’ụzọ dịgasị iche iche n’ikwekọ ná nzube ya. (Jenesis 1:2; 2 Samuel 23:1, 2; 2 Pita 1:21) Ndị na-eru eru ka e mee ha baptizim na-ekwere na mmụọ nsọ na-enyere ha aka ịghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke,” ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, na igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ndị bụ́ “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”—1 Ndị Kọrint 2:10; Ndị Galeshia 5:22, 23; Joel 2:28, 29.

Mkpa Nchegharị na Nchigharị Dị

12. Olee otú baptizim Ndị Kraịst na nchegharị si nwee njikọ?

12 E wezụga n’ihe banyere nwoke ahụ na-emeghị mmehie bụ́ Jizọs, baptizim bụ ihe ngosipụta Chineke nwapụtara nke e jikọrọ ya na nchegharị. Mgbe anyị chegharịrị, anyị na-akwa arịrị, ma ọ bụ kwaa ụta, n’ihi ihe anyị meworo ma ọ bụ ghara ime. Ndị Juu narị afọ mbụ bụ́ ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ aghaghị ichegharị site ná mmehie ha mere megide Kraịst. (Ọrụ 3:11-19) Ụfọdụ ndị Jentaịl kwere ekwe nọ na Kọrint si n’ịkwa iko, ikpere arụsị, izu ohi, na mmehie ndị ọzọ dị oké njọ chegharịa. N’ihi nchegharị ha, ‘a sachara’ ha n’ime ọbara Jizọs; e ‘doro ha nsọ,’ ma ọ bụ debe ha iche, maka ozi Chineke; a ‘kpọkwara ha ndị ezi omume’ n’aha Kraịst nakwa site ná mmụọ Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Nchegharị bụ nzọụkwụ dị oké mkpa n’inweta ezi akọ na uche na nnwere onwe Chineke na-enye pụọ n’obi amamikpe e nwere n’ihi mmehie.—1 Pita 3:21.

13. N’ihe banyere baptizim, gịnị ka nchigharị na-agụnye?

13 Nchigharị aghaghị iwere ọnọdụ tupu e mee anyị baptizim dị ka Ndịàmà Jehova. Nchigharị bụ ihe onye jiworo obi ya dum kpebie iso Kraịst Jizọs ji obi ọcha ya eme n’abụghị ná mmanye. Ndị dị otú ahụ na-ajụ ụzọ ndụ ọjọọ mbụ ha ma kpebisie ike ime ihe ziri ezi n’anya Chineke. N’Akwụkwọ Nsọ, ngwaa Hibru na nke Grik metụtara nchigharị nwere echiche nke ịtụgharị atụgharị. Omume a na-apụta isi n’ụzọ ọjọọ chigharịkwuru Chineke. (1 Ndị Eze 8:33, 34) Nchigharị na-achọ ka a rụọ “ọrụ kwesịrị nchegharị.” (Ọrụ 26:20) Ọ chọrọ anyị ịhapụ ofufe ụgha, mee ihe kwekọrọ n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ma fee Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Deuterọnọmi 30:2, 8-10; 1 Samuel 7:3) Nchigharị na-eme ka anyị mee mgbanwe n’echiche, ebumnobi, na n’àgwà anyị. (Ezikiel 18:31) Anyị ‘na-echigharị’ ka anyị ji mmadụ ọhụrụ na-edochi àgwà asọpụrụghị Chineke.—Ọrụ 3:19; Ndị Efesọs 4:20-24; Ndị Kọlọsi 3:5-14.

Nraranye E Ji Obi Dum Mee Dị Oké Mkpa

14. Gịnị ka nraranye nke ụmụazụ Jizọs na-egosi?

14 Ụmụazụ Jizọs aghaghịkwa iji obi ha dum rara onwe ha nye Chineke tupu e mee ha baptizim. Nraranye na-egosi idebe ihe iche maka nzube dị nsọ. Nzọụkwụ a dị oké mkpa nke na anyị kwesịrị iji ekpere gwa Jehova mkpebi anyị ife ya ofufe a na-ekewaghị ekewa ruo mgbe ebighị ebi. (Deuterọnọmi 5:9) N’ezie, anyị araraghị onwe anyị nye ịrụ ọrụ ma ọ bụ nye mmadụ kama ọ bụ nye Chineke n’onwe ya.

15. N’ihi gịnị ka e ji emikpu ndị a na-eme baptizim n’ime mmiri?

 15 Mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke site n’aka Kraịst, anyị na-ekwupụta mkpebi anyị ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke dị ka e depụtara ya n’Akwụkwọ Nsọ. Ná ngosipụta nke nraranye ahụ, a na-emikpu ndị ahụ a gaje ime baptizim ná mmiri, ọbụna dị ka e mere Jizọs baptizim n’Osimiri Jọdan iji gosi mwepụta o wepụtara onwe ya n’ihu Chineke. (Matiu 3:13) O kwesịrị ka a rịba ama na Jizọs nọ na-ekpe ekpere n’oge ahụ dị oké mkpa.—Luk 3:21, 22.

16. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ọṅụ anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe anyị hụrụ ka a na-eme ndị mmadụ baptizim?

16 Baptizim e mere Jizọs bụ ihe omume dị mkpa ma na-enye ọṅụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa baptizim a na-eme Ndị Kraịst n’oge a. Mgbe anyị hụrụ ndị mmadụ ka ha na-egosipụta nrara ha raara onwe ha nye Chineke, anyị pụrụ igosipụta ọṅụ anyị site n’iji nkwanye ùgwù na-akụ aka nakwa site n’ịja mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Ma a na-ezere iti mkpu, ịfụ mkpọrọhịhị, na ihe ndị yiri ha n’ihi nkwanye ùgwù maka ịdị nsọ nke ngosipụta nke okwukwe a. Anyị ga-egosipụta ọṅụ anyị n’ụzọ dị ùgwù.

17, 18. Gịnị na-enye aka ikpebi ma mmadụ o ruru eru ịbụ onye e mere baptizim?

17 N’adịghị ka ndị na-efesa ụmụaka mmiri n’isi ma ọ bụ amanye ìgwè mmadụ na-enweghị ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ ịbụ ndị e mere baptizim, Ndịàmà Jehova adịghị amanye onye ọ bụla ịbụ onye e mere baptizim. N’ezie, ha adịghị eme ndị na-erughị eru n’ụzọ ime mmụọ baptizim. Ọbụna tupu onye ọ bụla aghọọ onye na-ekwusa ozi ọma a na-emebeghị baptizim, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ejide n’aka na ọ ghọtara ozizi ndị bụ́ isi nke Bible, na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ha, ma zaa ee n’ajụjụ dị ka nke a, “Ị̀ chọrọ n’ezie ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?”

18 N’ọnọdụ ka ukwuu, mgbe ndị mmadụ na-ekere òkè buru ibu n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ma kwupụta ọchịchọ ha ịbụ ndị e mere baptizim, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-esoro ha kwurịta okwu iji jide n’aka na ha bụ ndị kwere ekwe rarawooro onwe ha nye Jehova ma ruo ihe ndị Chineke chọrọ maka ịbụ ndị e mere baptizim. (Ọrụ 4:4; 18:8) Mmadụ ịza 100 ajụjụ dabeere n’ozizi Bible n’onwe ya na-enyere ndị okenye aka ikpebi ma ndị na-aza ajụjụ ndị ahụ hà ruru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ maka ịbụ ndị a ga-emikpu ná mmiri. Ụfọdụ adịghị eru eru, n’ihi ya kwa, a dịghị ekwe ka e mee ha baptizim Ndị Kraịst.

Ọ̀ Dị Ihe Na-adọla Gị Azụ?

19. N’iburu Jọn 6:44 n’uche, ole ndị ka ha na Jizọs ga-eketakọ ihe?

19 Ọ pụrụ ịbụ na a gwara ọtụtụ ndị a manyere ịbụ ndị e mere baptizim n’ìgwè na ha ga-aga eluigwe ma ha nwụọ. Ma n’izo aka n’ebe ụmụazụ ya nọ, Jizọs sịrị: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.” (Jọn 6:44) Jehova adọtawo n’ebe Kraịst nọ 144,000, bụ́ ndị ga-abụ ndị ha na Jizọs ga-eketakọ ihe n’Alaeze eluigwe. Ịbụ onye e mere baptizim ná mmanye edotụbeghị onye ọ bụla nsọ maka ọnọdụ ahụ dị ebube ná ndokwa Chineke.—Ndị Rom 8:14-17; 2 Ndị Tesalonaịka 2:13; Mkpughe 14:1.

20. Gịnị pụrụ inyere ndị ụfọdụ na-emebeghị baptizim aka?

20 Karịsịa, kemgbe etiti afọ ndị 1930, ìgwè mmadụ ndị nwere olileanya ịlanarị ‘oké mkpagbu ahụ’ ma biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi esonyewo n’òtù “atụrụ ọzọ” nke Jizọs. (Mkpughe 7:9, 14; Jọn 10:16) Ha ruru eru ịbụ ndị e mere baptizim n’ihi na ha emewo ka ndụ ha kwekọọ n’Okwu Chineke ma jiri ‘obi ha dum, mkpụrụ obi ha dum, ike ha dum, na uche ha dum’ hụ Chineke n’anya. (Luk 10:25-28) Ọ bụ  ezie na ụfọdụ ndị ghọtara na Ndịàmà Jehova ‘na-efe Chineke n’ime mmụọ na n’eziokwu,’ ha agbasobeghị ihe nlereanya Jizọs ma nye ihe àmà ihu ọha nke ezi ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ nakwa nrara ha raara onwe ha dum nye ya site n’ịbụ ndị e mere baptizim. (Jọn 4:23, 24; Deuterọnọmi 4:24; Mak 1:9-11) Ekpere e ji ezi obi kpee na nke a kpọrọ okwu aha na ya banyere nzọụkwụ a dị oké mkpa pụrụ ime ka ha nwee mkpali na obi ike dị ha mkpa iji na-eme ihe kwekọrọ n’Okwu Chineke n’ụzọ zuru ezu, iji rara onwe ha dum nye Jehova Chineke, na iji bụrụ ndị e mere baptizim.

21, 22. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji ala azụ ịrara onwe ha nye na ịbụ ndị e mere baptizim?

21 Ụfọdụ na-ala azụ ịrara onwe ha nye na ịbụ ndị e mere baptizim n’ihi na ha tinyere nnọọ onwe ha n’ihe omume ụwa ma ọ bụ ná nchụso nke akụ̀ na ụba nke na ha nwere ntakịrị oge maka ihe ime mmụọ. (Matiu 13:22; 1 Jọn 2:15-17) Lee ka ha ga-esi nwee obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha agbanwee echiche na ihe mgbaru ọsọ ha! Ịbịaru Jehova nso ga-eme ka ha baa ụba n’ụzọ ime mmụọ, ọ ga-enyere ha aka ibelata nchegbu, ọ ga-ewetakwara ha udo na afọ ojuju bụ́ ndị na-abịa site n’ime uche Chineke.—Abụ Ọma 16:11; 40:8; Ilu 10:22; Ndị Filipaị 4:6, 7.

22 Ndị ọzọ na-ekwu na ha hụrụ Jehova n’anya ma ha achọghị ime nraranye ma bụrụ ndị e mere baptizim n’ihi na ha chere na ha ga-esi otú ahụ zere ịbụ ndị ga-aza ajụjụ. Ma onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịza Chineke ajụjụ. Anyị na-aghọ ndị ga-aza ajụjụ mgbe anyị nụrụ okwu Jehova. (Ezikiel 33:7-9; Ndị Rom 14:12) Dị ka ‘ndị a họpụtara,’ a mụnyere ndị Izrel oge ochie ná mba a raara nye Jehova, n’ihi ya kwa, ha nwere ibu ọrụ nke iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi n’ụzọ kwekọrọ n’iwu ya. (Deuterọnọmi 7:6, 11) Ọ dịghị onye a na-amụnye n’ime mba dị otú ahụ taa, ma ọ bụrụ na anyị enwetawo ezi ntụziaka Akwụkwọ Nsọ, ọ dị anyị mkpa iji okwukwe mee ihe banyere ya.

23, 24. Olee egwu ndị na-ekwesịghị ịdọla mmadụ azụ n’ịbụ onye e mere baptizim?

23 Egwu na ha enweghị ihe ọmụma zuru ezu pụrụ ịdọghachi ụfọdụ azụ n’ịbụ ndị e mere baptizim. Ma, anyị nile nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’ihi na “mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke rụworo site ná mmalite wee ruo na nsọtụ.” (Eklisiastis 3:11) Tụlee ihe banyere ọnaozi Etiopia. Dị ka onye na-eso ụzọ ndị Juu,  o nwere ihe ọmụma ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ, ma ọ pụghị ịza ajụjụ nile banyere nzube Chineke. Otú ọ dị, mgbe ọ mụtasịrị banyere ndokwa Jehova mere maka nzọpụta site n’àjà mgbapụta Jizọs, e mere ọnaozi ahụ baptizim ime mmiri ozugbo.—Ọrụ 8:26-38.

24 Ụfọdụ ndị na-ala azụ ịrara onwe ha nye Chineke n’ihi na egwu ọdịda na-atụ ha. Monique dị afọ 17 na-ekwu, sị: “Anọwo m na-ala azụ ịbụ onye e mere baptizim n’ihi egwu nke ịghara inwe ike ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye m.” Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi anyị dum, ‘ọ ga-eme ka okporo ụzọ anyị zie ezie.’ Ọ ga-enyere anyị aka ‘ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ’ dị ka ndị ohu ya raara onwe ha nye bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.—Ilu 3:5, 6; 3 Jọn 4.

25. Ajụjụ dị aṅaa kwesịrị ka a tụlee ya ugbu a?

25 N’ihi ntụkwasị obi zuru ezu na ịhụnanya sitere n’obi nke ha nwere n’ebe Jehova nọ, kwa afọ a na-akpali ọtụtụ puku mmadụ ime nraranye ma bụrụ ndị e mere baptizim. N’eziekwa, ndị nile bụ́ ndị ohu Chineke raara onwe ha nye chọrọ ikwesị ntụkwasị obi nye ya. Ma, anyị na-ebi n’oge siri ike, anyị na-echekwa ule dịgasị iche iche nke okwukwe ihu. (2 Timoti 3:1-5) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova? Ọ bụ ya ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ebe ọ bụ na Jizọs emeghị mmehie ọ bụla, e meghị ya baptizim iji gosipụta nchegharị. Baptizim e mere ya na-egosipụta mwepụta o wepụtara onwe ya n’ihu Chineke maka ime uche Nna ya.—Ndị Hibru 7:26; 10:5-10.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú e si eme baptizim Ndị Kraịst?

• Ihe ọmụma dị aṅaa dị mkpa ka mmadụ wee bụrụ onye e mere baptizim?

• Nzọụkwụ ndị dị aṅaa na-eduga na baptizim nke ezi Ndị Kraịst?

• N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji ala azụ ịbụ ndị e mere baptizim, ma olee otú a pụrụ isi nyere ha aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Ị̀ maara ihe ịbụ onye e mere baptizim ‘n’aha nke Nna, nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ’ pụtara?