Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Obi na Uche Gị Na-achọ Chineke

Jiri Obi na Uche Gị Na-achọ Chineke

 Jiri Obi na Uche Gị Na-achọ Chineke

Ezi Iso Ụzọ Kraịst na-agba mmadụ ume iji ma obi ma uche ya na-azụlite nkwenkwe nke na-atọ Chineke ụtọ.

N’EZIE, onye guzobere Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ Jizọs Kraịst, kụziri na anyị aghaghị iji ‘uche anyị dum,’ ma ọ bụ ọgụgụ isi, tinyere ‘obi anyị dum’ na ‘mkpụrụ obi anyị dum’ hụ Chineke n’anya. (Matiu 22:37) Ee, ikike iche echiche anyị aghaghị ikere òkè bụ́ isi n’ofufe anyị.

Mgbe Jizọs na-akpọ ndị na-ege ya ntị ka ha tụgharịa uche n’ozizi ya, ọ na-asịkarị: “Gịnị ka unu chere?” (Matiu 17:25; 18:12; 21:28; 22:42) N’ụzọ yiri nke ahụ, Pita onyeozi degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ iji ‘kpalie ezi ikike iche echiche ha.’ (2 Pita 3:1) Onye ozi ala ọzọ kasị mee njem n’oge mbụ, bụ́ Pọl onyeozi, dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha jiri ‘ikike iche echiche’ ha na-eme ihe nakwa ka ha “na-anwapụtara onwe [ha] ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.” (Ndị Rom 12:1, 2) Ọ bụ nanị site n’iji nlezianya otú ahụ na-enyocha ihe ha kweere ka Ndị Kraịst pụrụ ịzụlite nkwenkwe nke na-atọ Chineke ụtọ nakwa nke ga-enwe ike iguzogide ule ndị ha na-enweta ná ndụ.—Ndị Hibru 11:1, 6.

Iji nyere ndị ọzọ aka ịzụlite nkwenkwe dị otú ahụ, Ndị Kraịst bụ́ ndị zisara ozi ọma n’oge mbụ “so ha tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ, na-akọwa ma na-anwapụta [ihe ha kụziri] site n’izo aka n’ebe dị iche iche.” (Ọrụ 17:1-3) Omume dị otú ahụ ezi uche dị na ya kpaliri ndị nwere obi eziokwu imeghachi omume n’ụzọ dị mma. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nọ n’obodo Biria nke dị na Masedonia “ji ọchịchọ obi siri nnọọ ike nabata okwu [Chineke], jiri nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a [Pọl na ndị ya na ha so kọwara] hà dị otú ahụ.”  (Ọrụ 17:11) Ọ dị ihe abụọ e kwesịrị ịrịba ama n’ebe a. Nke mbụ, ndị Biria nwere ọchịchọ ige ntị n’Okwu Chineke; nke abụọ, ha ekwereghị na ihe ha nụrụ bụ eziokwu n’ajụghị ase, kama ha nyochara Akwụkwọ Nsọ iji mara ma hà bụ eziokwu. Onye Kraịst ahụ jere ozi ala ọzọ bụ́ Luk ji obi umeala jaa ndị Biria mma maka nke a, na-akpọ ha ndị “nwere obi sara mbara.” Ị̀ na-egosipụta obi sara mbara dị otú ahụ n’omume gị n’ebe ihe ime mmụọ dị?

Uche na Obi Na-arụkọ Ọrụ

Dị ka e kwuru ná mmalite, a na-etinye ma uche ma obi n’ezi ofufe. (Mak 12:30) Chelaa echiche azụ n’ihe atụ ahụ dị n’isiokwu bu ụzọ nke onye ahụ e goro ọrụ ite ụlọ ágbá bụ́ onye ji ágbá ụcha ya na-abụghị nke a gwara ya mee ihe mgbe ọ na-ete ụlọ ágbá. A sị na o gere ntị nke ọma ná ntụziaka nke onye were ya n’ọrụ, ọ pụrụ ijiwo obi ya dum rụọ ọrụ ahụ ma nwee obi ike na onye nwe ọrụ ahụ ga-anara ihe ọ rụụrụ ya nke ọma. Otú ahụ ka ọ dị n’ofufe anyị.

“Ndị na-efe ezi ofufe,” ka Jizọs kwuru, “ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:23) N’ihi ya, Pọl onyeozi dere, sị: “Nke ahụkwa mere na anyị . . . akwụsịbeghị ikpe ekpere maka unu na ịrịọ ka unu jupụta n’ezi ihe ọmụma nke uche ya n’amamihe nile na nghọta ime mmụọ, ka unu wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.” (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) ‘Ezi ihe ọmụma’ dị otú ahụ na-eme ka ndị nwere ezi obi jiri obi ha dum na-efe ofufe, na-enwe obi ike zuru ezu n’ihi na ha “na-efe ihe [ha] maara.”—Jọn 4:22.

N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova adịghị eme ụmụ ọhụrụ ma ọ bụ ndị nwere mmasị ọhụrụ baptizim bụ́ ndị na-ejibeghị nlezianya mụọ Akwụkwọ Nsọ. Jizọs nyere ụmụazụ ya ọrụ, sị: “Mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ọ bụ nanị mgbe ezi ndị mmụta Bible nwetaworo ezi ihe ọmụma banyere uche Chineke ka ha pụrụ ime mkpebi metụtara ofufe dabere n’ezi ihe ọmụma ha nwetara. Ị̀ na-agbalịsi ike inweta ezi ihe ọmụma dị otú ahụ?

Ịghọta Ekpere Onyenwe Anyị

Iji hụ ọdịiche dị n’etiti inwe ezi ihe ọmụma banyere Bible na inwe ihe ọmụma dị nta banyere ihe ọ na-ekwu, ka anyị tụlee ihe a na-akpọkarị Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị, bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 6:9-13.

Ọtụtụ nde mmadụ na-ekpe ekpere nlereanya Jizọs n’isi mgbe nile na chọọchị. Ma mmadụ ole ka a kụziwooro ihe ọ pụtara, karịsịa akụkụ mbụ nke ekpere ahụ bụ́ nke na-ekwu banyere aha Chineke na Alaeze ya? Ihe ndị a dị oké mkpa nke na Jizọs butere ha ụzọ n’ekpere ahụ.

Mmalite ya bụ: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ,” nke pụtara, ka e mee ka ọ dị nsọ. Rịba ama na Jizọs kwuru ka e kpee ekpere ka e doo aha Chineke nsọ. Nye ọtụtụ ndị, nke ahụ na-akpali, ma ọ dịkarịa ala, ajụjụ abụọ. Nke mbụ, gịnị bụ aha Chineke? Nke abụọkwa, gịnị mere o ji dị mkpa ka e doo ya nsọ?

A pụrụ ịhụ azịza nke ajụjụ mbụ ahụ n’ebe karịrị 7,000 n’ime Bible n’asụsụ mbụ e ji dee ya. Otu ebe bụ n’Abụ Ọma 83:18: “Ka ha wee mara na Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Banyere aha Chineke, bụ́ Jehova, Ọpụpụ 3:15 na-ekwu sị: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.” * Ma gịnị mere o ji dị mkpa ido aha Chineke, nke bụ́ ịdị ọcha na ịdị nsọ n’onwe ya, nsọ? Ọ bụ n’ihi na a kọchawo ma kwutọọ ya site nnọọ ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.

 N’Iden, Chineke gwara Adam na Iv na ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu. (Jenesis 2:17) Setan ji nlelị kwugide Chineke, na-agwa Iv, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu [ga-anwụ].” N’ụzọ dị otú ahụ, Setan boro Chineke ebubo ịgha ụgha. Ma, ọ kwụsịghị ebe ahụ. Ọ gakwuru nnọọ n’ihu ịkọcha aha Chineke, na-agwa Iv na Chineke na-ezochiri ya, n’ụzọ na-ezighị ezi, ihe ọmụma ga-abara ya uru. “N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere [n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ], mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” Lee ebubo ụgha nke ahụ bụ!—Jenesis 3:4, 5

Site n’iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, Adam na Iv kwụnyeere Setan. Kemgbe ahụ, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ, n’ịma ama ma ọ bụ n’amaghị ama, amụbawo nkọcha mbụ ahụ site n’ịjụ ụkpụrụ ezi omume nke Chineke. (1 Jọn 5:19) Ndị mmadụ ka na-ekwutọ Chineke site n’ịta ya ụta maka nhụjuanya ha—n’agbanyeghị na ọ pụrụ ịbụ ụzọ ndụ ọjọọ ha kpatara ya. “Iberibe mmadụ na-ebibi ndụ ya, o wee wesowezie Onyenwe anyị iwe,” ka Ilu 19:3 na-ekwu. (The New English Bible) Ị̀ pụrụ ịhụ ihe mere Jizọs, bụ́ onye hụrụ Nna ya n’anya n’ezie, ji kpee ekpere ka e doo aha Ya nsọ?

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Mgbe Jizọs kpesịrị ekpere ka e doo aha Chineke nsọ, o kwuru, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Anyị pụrụ ịjụ banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ, sị: ‘Gịnị bụ Alaeze Chineke? Njikọ dịkwa aṅaa ka ọbịbịa ya na ime uche Chineke n’ụwa nwere?’

N’ime Bible, okwu ahụ bụ́ “alaeze” pụtara n’ụzọ bụ́ isi “ịchịisi nke dị n’aka onye eze.” Mgbe ahụ, n’ụzọ ezi uche dị na ya, Alaeze Chineke ga-ezo aka n’ịchịisi, ma ọ bụ ọchịchị, nke dị n’aka Chineke, nke o ji aka ya họpụta eze ya. Eze a adịghị onye ọzọ ọ bụ karịa Jizọs Kraịst ahụ e si n’ọnwụ kpọlite—“Eze nke ndị eze na Onyenwenụ nke ndị nwenụ.” (Mkpughe 19:16; Daniel 7:13, 14) Daniel onye amụma dere banyere Alaeze Mezaịa nke Chineke bụ́ nke dị n’aka Jizọs Kraịst, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [ọchịchị ụmụ mmadụ ndị dị ugbu a], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

Ee, Alaeze Chineke ga-achị ụwa n’ụzọ zuru ezu, na-ewepụ ihe ọjọọ nile na ya ma na-achị “ruo mgbe ebighị ebi.” N’ụzọ dị otú a, Alaeze Chineke bụ ụzọ Jehova ga-esi doo aha ya nsọ, na-ewepụ ya ná nkọcha ụgha nile Setan na ajọ ụmụ mmadụ kọchaworo ya.—Ezikiel 36:23.

Dị ka ọchịchị nile, Alaeze Chineke nwere ndị ọ ga-achị. Olee ndị ha bụ? Bible na-aza, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.” N’ezie, ndị a nwere ezi ihe ọmụma banyere Chineke, nke bụ́ ihe a chọrọ iji dị ndụ.—Matiu 5:5; Jọn 17:3.

Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche ụwa dum ịbụ nke ndị dị umeala n’obi ma dị nwayọọ n’obi bụ́ ndị hụrụ Chineke na ibe ha n’anya n’ezie jupụtara? (1 Jọn 4:7, 8) Ọ bụ ya ka Jizọs kpere ekpere maka ya mgbe ọ sịrị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” Ị̀ ghọtara ihe mere Jizọs ji kụziere ụmụazụ ya ikpe ekpere n’ụzọ dị otú ahụ? Nke ka mkpa, ị̀ hụrụ otú mmezu nke ekpere ahụ pụrụ isi metụta gị onwe gị?

Ọtụtụ Nde Mmadụ Na-atụgharịzi Uche n’Akwụkwọ Nsọ

Jizọs buru amụma banyere ọrụ nkụzi ime mmụọ zuru ụwa ọnụ nke ga-ama ọkwa Alaeze Chineke nke na-abịanụ. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba  nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ [nke ụwa, ma ọ bụ usoro ihe dị ugbu a] ga-abịa.”—Matiu 24:14.

Gburugburu ụwa, ihe dị ka nde Ndịàmà Jehova isii so ndị agbata obi ha ekerịta ozi ọma ahụ. Ha na-akpọ gị ịmụtakwu banyere Chineke na Alaeze ya site ‘n’iji nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ,’ na-eji ikike iche echiche gị eme ihe. Ime otú ahụ ga-eme ka nkwenkwe gị sikwuo ike, meekwa ka anya gị gbukepụ n’olileanya nke ndụ n’ụwa paradaịs, bụ́ nke ‘ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta na ya, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.’—Aịsaịa 11:6-9.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ahọrọ nsụgharị bụ́ “Yahweh” kama ịhọrọ “Jehova.” Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị nsụgharị Bible nke oge a ewepụchaala aha Chineke n’ụdị ya ọ bụla ná nsụgharị ha, na-eji utu aha ndị ahụ a maara n’ebe nile bụ́ “Onyenwe anyị” ma ọ bụ “Chineke” dochie ya. Maka ntụle zuru ezu banyere aha Chineke, biko lee broshuọ bụ́ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

 [Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

ṄOMIE ONYE OZIZI UKWU AHỤ

Jizọs na-akụzikarị ihe site n’ilekwasị anya kpọmkwem n’isiokwu ndị a kapịrị ọnụ dabeere na Bible. Dị ka ihe atụ, mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, ọ kọwaara mmadụ abụọ na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị nọ na-enwe ihe ijuanya banyere ọnwụ ya, òkè ọ na-ekere ná nzube Chineke. Luk 24:27 na-ekwu, sị: “N’ibidokwa n’ihe Mozis dere na n’akwụkwọ ndị amụma nile, ọ kọwaara ha ihe ndị metụtara ya onwe ya n’ime Akwụkwọ Nsọ dum.”

Rịba ama na Jizọs họọrọ kpọmkwem otu isiokwu—“ya onwe ya,” bụ́ Mezaịa ahụ—nakwa na o hotara okwu “n’ime Akwụkwọ Nsọ dum” n’okwu nke ya. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Jizọs jikọtara akụkụ Bible ndị metụtara ihe ọ na-ekwu ọnụ, nke mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee ike ịhụ ụkpụrụ doro anya nke eziokwu ime mmụọ. (2 Timoti 1:13) N’ihi ya, ọ bụghị nanị na e mere ka ha nwee ihe ọmụma kama ihe ahụ e kwuru metụrụ ha nnọọ n’ahụ́. Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “Ha wee gwarịta ibe ha, sị: ‘Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ ka ọ nọ na-agwa anyị okwu n’okporo ụzọ, ka ọ nọ na-emepere anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?’”—Luk 24:32.

Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike iṅomi ụzọ Jizọs si eme ihe n’ozi ha. Ihe ndị bụ́ isi ha ji amụ ihe bụ broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? na akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ha na-atụle ọtụtụ isiokwu ndị na-akpali mmasị bụ́ ndị dabeere na Bible, dị ka “Ònye Bụ Chineke?,” “N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?,” “Olee Ụzọ Ị Pụrụ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ,” “Ndị A Bụ Mgbe Ikpeazụ!,” na “Iwulite Ezinụlọ nke Na-asọpụrụ Chineke.” Ihe ọmụmụ nke ọ bụla nwere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ.

A na-agba gị ume ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu ma ọ bụ ideta akwụkwọ n’adres dị na peeji nke 2 nke magazin a ka a bịa duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’isiokwu ndị a na ndị ọzọ, bụ́ nke a na-eme n’efu.

[Foto]

Ruo n’obi onye ị na-amụrụ ihe site n’ilekwasị anya kpọmkwem n’isiokwu ndị a kapịrị ọnụ dabeere na Bible

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ị̀ ghọtara ihe ekpere nlereanya Jizọs pụtara?

“Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ . . . ”

“Ka alaeze [Mezaịa] gị bịa . . . ”

“Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe”