Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Izonahụ Ifufe

Ebe Izonahụ Ifufe

 Ebe Izonahụ Ifufe

Ị PỤRỤ ịhụ osisi nta nke gbasiri ike a na-akpọ alpine rose ka ọ na-eto n’elu ugwu Alps nke Europe. Alpine rose a dị mkpụmkpụ na-etokarị n’etiti osisi nta ndị tụhịkọtara ọnụ n’ala, iji guzogide oké ifufe si n’elu ugwu. Ifufe na-adịghị akwụsị akwụsị na-eyi ịdị adị nke osisi ndị dị na Alps egwu site n’ime ka okpomọkụ ha na-enweta belata, na-eme ka ikuku na ájá na-ekpo ọkụ, na ịbụpụta mkpọrọgwụ ha.

Alpine rose a na-alanarịkarị oké ifufe ahụ site n’ito n’ime oghere ndị dị n’etiti oké nkume. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ájá ndị dị n’ebe ndị a adịghị ebu ibu, oghere ndị dị n’etiti nkume ndị ahụ na-echebe osisi ndị a pụọ n’ifufe ma na-eme ka ha nwee ike ichekwa mmiri ha. N’ịbụ ndị na-afọ nke nta ka ọ bụrụ na a dịghị ahụ ha anya n’ihe ka ukwuu n’ime afọ, n’oge okpomọkụ, alpine rose a na-eji okooko osisi ndị na-acha ọbara ọbara ma na-egbuke egbuke achọ ugwu ndị ha nọ n’elu ha mma.

Aịzaịa onye amụma kọwara na Chineke ga-ahọpụta “ndị isi,” nakwa na onye ọ bụla n’ime ha ga-adị ka “ebe izonahụ ifufe.” (Aịsaịa 32:1, 2) N’okpuru nduzi nke Eze ahụ, bụ́ Kraịst Jizọs, ndị a bụ́ ndị isi n’ụzọ ime mmụọ, ma ọ bụ ndị nlekọta, ga-adị ka nkume gwunyesiri ike n’ala, ndị na-akwụsi ike n’oge nsogbu ma ọ bụ ahụhụ. Ha ga-abụ ndo e kwesịrị ịtụkwasị obi n’oge ahụhụ ma nyere ndị nọ ná mkpa aka ichekwa mmiri ime mmụọ ha nwetara site n’Okwu Chineke.

Ifufe nke mkpagbu, nkụda mmụọ, ma ọ bụ ọrịa, pụrụ ifekwasị Onye Kraịst, na-eme ka okwukwe ya kpọnwụọ ma ọ bụrụ na e chebeghị ya echebe. Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ inye nchebe site n’ige ntị nke ọma ná nsogbu ya, na-enye ya ndụmọdụ ndị dabeere na Bible, nakwa agbamume na enyemaka ndị bara uru. Dị ka Eze ha a họpụtara ahọpụta, bụ́ Kraịst Jizọs, ha na-achọ inyere ndị ‘a chụsaworo achụsa’ aka. (Matiu 9:36) Ha na-achọkwa inyere ndị ọzọ aka bụ́ ndị ifufe ozizi ụgha kpaworo aka ọjọọ. (Ndị Efesọs 4:14) Enyemaka dị otú ahụ nke na-abịa n’oge ya pụrụ ịba oké uru.

“Enwere m uche mkpasasị mgbe ụfọdụ ezi ndị enyi m hapụrụ ọgbakọ, n’otu oge ahụkwa, ọbara agbaba nna m n’ụbụrụ isi,” ka Miriam na-akọwa. “Iji merie ịda mbà n’obi m, amalitere m iso otu nwa okorobịa ụwa na-eyi oge mkpapụ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, n’inwe mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru, agwara m ndị okenye ọgbakọ na ekpebiwo m ịhapụ eziokwu ahụ, ebe ọ bụ na m ji n’aka na Jehova apụghị ịhụ m n’anya.

“N’oge a ihe siiri m ike, otu okenye dị ọmịiko chetaara m afọ ndị m jeworo ozi dị ka onye ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ọ gwara m na ikwesị ntụkwasị obi m na-amasị ya mgbe nile, o jikwa obiọma gwa m ka m kwe ka ndị okenye nyere m aka, iji mesighachi m obi ike na Jehova hụrụ m n’anya. Mmasị ịhụnanya ha nwere n’ebe m nọ n’oge ahụ ihe siiri m ike dị m ka ‘ebe nzoba’ n’oge oké ifufe ime mmụọ ahụ nke fekwasịrị m. N’ime otu ọnwa, akwụsịrị m mmekọrịta mụ na enyi m nwoke, anọgidewokwa m na-ejegharị n’ụzọ nke eziokwu kemgbe ahụ.”

Ndị okenye na-enwe afọ ojuju mgbe ha hụrụ Ndị Kraịst ibe ha ka ha na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ n’ihi nchebe e nyere ha n’oge kwesịrị ekwesị. ‘Ebe nzoba’ ndị a na-emekwa ka anyị nụrụtụ ụtọ nke enyemaka ime mmụọ bara ụba anyị ga-enweta n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst.