Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obodo nke Dị n’Elu Ugwu

Obodo nke Dị n’Elu Ugwu

 Obodo nke Dị n’Elu Ugwu

“UNU bụ ìhè nke ụwa. A pụghị izo obodo ezo ma ọ bụrụ na ọ dị n’elu ugwu,” ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya n’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama.—Matiu 5:14.

Ọtụtụ obodo ndị dị na Judia na Galili dị n’elu ugwu kama ịdị na ndagwurugwu ndị dị n’okpuru. Otu isi ihe mere ha ji ahọrọ iwu obodo n’elu ugwu bụ maka nchebe. Tụkwasị n’usuu ndị agha na-awakpo ha, ìgwè ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị awakpo ebe ụmụ Izrel bi. (2 Ndị Eze 5:2; 24:2) Ọ pụrụ ịdịrị ụmụ amaala kara obi mfe ichebe ụlọ ndị dịkọtara ọnụ n’elu ugwu karịa obodo dị n’ala dị larịị, bụ́ nke chọrọ mgbidi ka ukwuu maka nchebe.

Ebe ọ bụ na a na-ejikarị lime etechi ahụ́ ụlọ ndị Juu, ọ pụrụ ịdị mfe ịnọ ọtụtụ kilomita hụ ọtụtụ ụlọ ndị a na-acha ọcha bụ́ ndị dịkọtara ọnụ n’elu ugwu. (Ọrụ 23:3) N’anwụ Palestine nke na-achasi ike, obodo ndị a dị n’elu ugwu na-egbukepụ dị ka ogidi ọkụ, dị nnọọ ka obodo ndị yiri ha n’ógbè Mediterenian ka na-eme n’oge anyị.

Jizọs ji ihe a dị ịrịba ama e ji mara ime ime obodo ndị dị na Galili na Judia kụziere ụmụazụ ya ihe bụ́ ọrụ ezi Onye Kraịst. “N’otu aka ahụ, kwenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ,” ka ọ gwara ha, “ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Matiu 5:16) Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst adịghị arụ ọrụ ọma ka ndị mmadụ wee too ha, ndị mmadụ na-ahụ àgwà ọma ha.—Matiu 6:1.

Àgwà ọma dị otú ahụ na-apụta ìhè karịsịa n’oge mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. Otu akwụkwọ akụkọ dị na Spen, ka ọ na-ezo aka n’otu mgbakọ e mere n’oge na-adịbeghị anya, kọrọ, sị: “Ọ bụ ezie na mmasị a na-enwe n’isiokwu ndị metụtara okpukpe na-ajụ oyi n’okpukpe ndị ọzọ, ọ dịghị otú ahụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Ebe ọ bụ na ha adịghị achọ ime ka Bible ghara ịba uru, ha na-etinye Okwu Chineke n’ọrụ.”

Thomas, bụ́ onye na-elekọta otu ámá egwuregwu dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Spen bụ́ nke Ndịàmà ji mee ihe mgbe mgbe, nwere mmasị ịnọ gburugburu ndị na-etinye Okwu Chineke n’ọrụ. O yigharịrị oge ọ ga-ala ezumike nká ruo ọtụtụ izu ka o wee nwee ike ịnọ ya maka mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. Mgbe ọtụtụ ndị bịara mgbakọ ahụ, gụnyere ndị na-eto eto, bịakwutere ya mgbe e mechisịrị mgbakọ iji kelee ya maka nkwado ya eri afọ ndị gafeworonụ na iji sị ya nọrọ nke ọma n’oge ezumike nká ya, anya mmiri gbara ya. “Ịmata unu abụrụwo otu n’ime ahụmahụ ndị kasị mma m nwere ná ndụ,” ka o kwuru.

Obodo nke dị n’elu ugwu na-adọrọ mmasị onye na-ekiri ya n’ihi na a na-ahụ ya nke ọma nakwa n’ihi na ụlọ ọ bụla na-acha ọcha na ya na-egbukepụ n’ìhè anyanwụ. N’otu aka ahụ, a na-ahụ ezi Ndị Kraịst dị ka ndị dị iche n’ihi na ha na-agbalịsi ike ịgbaso ụkpụrụ dị elu nke Akwụkwọ Nsọ banyere ime ihe n’eziokwu, omume ọma, na ọmịiko.

Tụkwasị na nke ahụ, Ndị Kraịst na-egbukepụ ìhè nke eziokwu site n’ọrụ nkwusa ha. Pọl onyeozi kwuru banyere Ndị Kraịst narị afọ mbụ, sị: “Ebe anyị nwere ozi a dị ka ebere nke e meere anyị si dị, anyị adịghị ada mbà . . . kama site n’ime ka eziokwu  ahụ pụta ìhè, anyị na-eme ka akọ na uche mmadụ ọ bụla nakwere anyị n’anya Chineke.” (2 Ndị Kọrint 4:1, 2) Ọ bụ ezie na ha nwetara mmegide n’ebe ọ bụla ha mere nkwusa, Jehova gọziri ozi ha nke na ka ọ na-erule ihe dị ka afọ 60 O.A., Pọl pụrụ ide na a na-ekwusa ozi ọma ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Ndị Kọlọsi 1:23.

Taa, Ndịàmà Jehova jikwa ibu ọrụ ha nke ‘ikwe ka ìhè ha na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ’ kpọrọ ihe, dị ka Jizọs nyere n’iwu. Ndịàmà Jehova ji okwu ọnụ na akwụkwọ e biri ebi ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ala 235 gburugburu ụwa. Ka ìhè nke eziokwu Bible wee rute ọtụtụ mmadụ ruo ókè o kwere mee, ha emeela ka akwụkwọ ha ndị dabeere na Bible dị n’ihe dị ka asụsụ 370.—Matiu 24:14; Mkpughe 14:6, 7.

N’ọtụtụ ebe, Ndịàmà anakwerewo ihe ịma aka nke ịmụ asụsụ nke ndị si ná mba ndị a machibidoro ọrụ nkwusa iwu kwabata ná mba ha. Dị ka ihe atụ, e nweela imerime ndị si China na Russia kwabata n’ọtụtụ obodo ukwu ndị dị n’Ebe Ugwu America. Ndịàmà bi n’ógbè ndị ahụ agbalịsiwo ike ịmụ asụsụ Chinese, Russian, na asụsụ ndị ọzọ iji nwee ike ikwusara ndị ahụ bịara ọhụrụ ozi ọma. N’ezie, a na-akụzi ihe ọmụmụ ndị e dokwara iji mee ka ndị mmadụ mụta ọtụtụ asụsụ ngwa ngwa, ka e wee nwee ike ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ mgbe ubi ahụ ka ‘chara acha maka owuwe ihe ubi.’—Jọn 4:35.

Aịzaịa onye amụma buru n’amụma, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri.” Site ma n’omume ha ma n’ozi ha, Ndịàmà Jehova na-enyere ndị mmadụ nọ n’ebe nile aka ịbịa ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova’ iji bụrụ ndị e ziri ụzọ Chineke na iji mụta ije ije n’okporo ụzọ Chineke. (Aịsaịa 2:2, 3) Ihe obi ụtọ si na ya apụta bụ na, dị ka Jizọs mere ka ọ pụta ìhè, ha na-agbakọ aka ‘enye Nna ha nke eluigwe,’ bụ́ Jehova Chineke, otuto.—Matiu 5:16; 1 Pita 2:12.