Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nwụrụ n’Ihi Okwukwe Ha n’Oge A Na-agba Àmà na Sweden

Ndị Nwụrụ n’Ihi Okwukwe Ha n’Oge A Na-agba Àmà na Sweden

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ndị Nwụrụ n’Ihi Okwukwe Ha n’Oge A Na-agba Àmà na Sweden

OKWU Grik e ji eme ihe maka “onye àmà” bụ martyr, bụ́ nke e si na ya nweta okwu Bekee a na-asụgharị ịbụ “onye nwụrụ n’ihi okwukwe ya,” nke pụtara “onye na-agba àmà site n’ọnwụ ya.” Ọtụtụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ gbara àmà banyere Jehova site n’ịnwụ n’ihi okwukwe ha.

N’ụzọ yiri nke ahụ, na narị afọ nke 20, ọtụtụ puku Ndịàmà nwụrụ n’aka ndị dike Hitler n’ihi ịnọgide na-anọpụ iche n’okwu ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ịhụ mba n’anya. Ndị a nwụrụ n’ihi okwukwe ha n’oge a na-agbakwa àmà siri ike. Nke a bụ ihe mere na Sweden n’oge na-adịbeghị anya.

Dị ka akụkụ nke ememe mgbaafọ nke 50 e ji echeta mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, gọọmenti Sweden malitere mkpọsa maka ihe ọmụmụ zuru mba ọnụ banyere Oké Mgbukpọ ahụ. A kpọrọ ihe omume ahụ Akụkọ Mere Eme A Na-adịghị Echefu Echefu. A kpọrọ Ndịàmà Jehova iso kere òkè na ịkọ ahụmahụ ha.

Ndịàmà zara òkù ahụ site n’ime ihe ngosi isiokwu ya bụ Ndị E Chefurula n’Ime Ndị Oké Mgbukpọ ahụ Kpara Aka Ọjọọ. A malitere ya n’Ụlọ Mgbakọ nke Ndịàmà Jehova dị na Strängnäs. Ndịàmà lanarịrị Oké Mgbukpọ ahụ nọ ya ịkọrọ ihe karịrị mmadụ 8,400 bịara n’ụbọchị mbụ ahụ ahụmahụ ha! Ka ọ na-erule ọgwụgwụ 1999, ihe ngosi ahụ apụtawo n’ihe karịrị 100 ebe ngosi ihe mgbe ochie na ọ́bá akwụkwọ ọha ndị dị gburugburu Sweden, ihe dị ka mmadụ 150,000 ahụwokwa ya. Ndị gara hụ ya gụnyere ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti, bụ́ ndị kwuru okwu ọma banyere ihe ha hụrụ.

Ọ dịghị otu ihe omume ọ bụla ọzọ metụtara ọrụ Ndịàmà Jehova na Sweden nke a kpọsaara ọha na eze ma kwuo okwu ọma banyere ya otú ahụ. Ọtụtụ ndị gara hụ ya jụrụ, sị: “Gịnị mere unu agwatụbeghị anyị ahụmahụ unu nwere n’Oké Mgbukpọ ahụ?”

Mgbe e mesịrị ihe ngosi ahụ n’ógbè ha, otu ọgbakọ nyere akụkọ ozi nke mmụba dị pasent 30 n’ọmụmụ Bible ebe obibi! Otu Onyeàmà kpọrọ onye ọrụ ibe ya ka ọ bịa hụ ihe ngosi ahụ. Onye ọrụ ahụ ji obi ụtọ zaa òkù ahụ ma kpọrọ enyi ya bịa. Mgbe e mesịrị, enyi ya ahụ kwuru na o siiri ya ike ịghọta otú ndị mmadụ pụrụ isi nwee okwukwe siri ike otú ahụ nke na ha ga-ahọrọ ka e gbuo ha kama ịbịanye aka n’akwụkwọ na-egosi na ha ajụla okwukwe ha. Nke a dugara n’inwekwu mkparịta ụka, a malitekwara iduziri ya ọmụmụ Bible.

Dị ka ndị ibe ha na narị afọ mbụ, ndị a kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ n’ihi okwukwe ha na narị afọ nke 20 ejirila anyaike gbaa àmà na Jehova bụ nanị ezi Chineke nke ruru eru ịbụ onye anyị ga-enwe okwukwe siri ike ma guzosie ike n’ihe n’ebe ọ nọ.—Mkpughe 4:11.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 13]

Onye mkpọrọ: Państwowe Muzeum Oświęcim-Brzezinka, site n’aka USHMM Photo Archives