Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Ndị Kraịst Nile Bụ Ndị Na-ezisa Ozi Ọma

Ezi Ndị Kraịst Nile Bụ Ndị Na-ezisa Ozi Ọma

 Ezi Ndị Kraịst Nile Bụ Ndị Na-ezisa Ozi Ọma

“Bụkuonụ Jehova abụ, gọzienụ aha Ya; na-ezisanụ ozi nzọpụta Ya site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ.”—ABỤ ỌMA 96:2.

1. Ozi ọma dị aṅaa dị ndị mmadụ mkpa ịnụ, oleekwa otú Ndịàmà Jehova siworo bụrụ ezi ihe nlereanya n’ịgbasa ozi dị otú ahụ?

N’ỤWA ebe ọdachi na-eme kwa ụbọchị, ọ bụ ihe na-akasi obi n’ezie ịmara na, dị ka Bible si kwuo, agha, mpụ, agụụ, na mmegbu ga-akwụsị n’isi nso. (Abụ Ọma 46:9; 72:3, 7, 8, 12, 16) N’ezie, nke a ọ́ bụghị ozi ọma dị onye ọ bụla mkpa ịnụ? Ndịàmà Jehova chere na ọ bụ. A maara ha n’ebe nile dị ka ndị na-ezisa “ozi ọma nke ezi ihe.” (Aịsaịa 52:7) N’eziokwu, a kpagbuwo ọtụtụ Ndịàmà n’ihi mkpebi siri ike ha mere izisa ozi ọma ahụ. Ma, ha bu ọdịmma kasịnụ nke ndị mmadụ n’obi. Leekwa ihe ndekọ nke ịnụ ọkụ n’obi na nnọgidesi ike nke Ndịàmà nweworo!

2. Olee otu ihe mere Ndịàmà Jehova ji anụ ọkụ n’obi?

2 Ịnụ ọkụ n’obi nke Ndịàmà Jehova taa yiri nke Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. Banyere ha, akwụkwọ akụkọ Roman Katọlik bụ́ L’Osservatore Romano kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ozugbo e mere Ndị Kraịst mbụ baptizim, ha na-ewere ya na ọ bụ ọrụ dịịrị ha ịgbasa Oziọma ahụ. Ndị ohu ji ọnụ zisaa Oziọma ahụ.” Dị ka Ndị Kraịst mbụ ahụ, n’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji anụ nnọọ ọkụ n’obi? Nke mbụ, ọ bụ n’ihi na ozi ọma ha na-ezisa sitere n’aka Jehova Chineke n’onwe ya. Ọ̀ dị ihe ka ya mma mere a ga-eji na-anụ ọkụ n’obi? Nkwusa ha na-eme bụ mmeghachi omume nye okwu ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Bụkuonụ Jehova abụ, gọzienụ aha Ya; na-ezisanụ ozi nzọpụta Ya site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ.”—Abụ Ọma 96:2.

3. (a) Gịnị bụ ihe nke abụọ mere Ndịàmà Jehova ji anụ ọkụ n’obi? (b) Gịnị ka “nzọpụta [Chineke]” na-agụnye?

3 Okwu ọbụ abụ ahụ na-echetara anyị ihe nke abụọ mere Ndịàmà Jehova ji anụ ọkụ n’obi. Ozi ha bụ nke nzọpụta. Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ ndị metụtara ahụ́ ike, ọha na eze, akụ̀ na ụba, ma ọ bụ ọrụ ndị ọzọ iji mee ka ụmụ mmadụ ibe ha na-ebi ndụ ka mma, mgbalị ndị dị otú ahụ kwesịkwara ịja mma. Ma ihe ọ bụla mmadụ pụrụ imere mmadụ ibe ya dị nnọọ nta ma e jiri ya tụnyere “nzọpụta [Chineke].” Site n’aka Jizọs Kraịst, Jehova ga-azọpụta ndị dị umeala n’obi pụọ ná mmehie, ọrịa, na ọnwụ. Ndị ga-erite uru na ya ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi! (Jọn 3:16, 36; Mkpughe 21:3, 4) Taa, nzọpụta so ‘n’oké ọrụ’ Ndị Kraịst na-akpọsa mgbe ha na-emeghachi omume n’okwu ahụ bụ́: “Kọsaanụ akụkọ ebube [Chineke] n’etiti mba nile, akụkọ oké ọrụ Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche. N’ihi na Jehova dị ukwuu, bụrụkwa onye a na-eto nke ukwuu: Onye a na-atụ egwu Ya ka Ọ bụ n’elu chi nile.”—Abụ Ọma 96:3, 4.

Ihe Nlereanya nke Onyenwenụ Ahụ

4-6. (a) Olee ihe nke atọ mere Ndịàmà Jehova ji anụ ọkụ n’obi? (b) Olee otú Jizọs si gosipụta ịnụ ọkụ n’obi maka ọrụ ikwusa ozi ọma?

4 Ọ dị ihe nke atọ mere Ndịàmà Jehova ji anụ ọkụ n’obi. Ha na-agbaso ihe nlereanya Jizọs Kraịst. (1 Pita 2:21) Nwoke ahụ zuru okè ji obi ya nile nakwere ọrụ “izi ndị e wedara n’ala ozi ọma.” (Aịsaịa 61:1; Luk 4:17-21) N’ụzọ dị otú ahụ, ọ ghọrọ onye na-ezisa ozi  ọma. O jegharịrị na Galili na Judia dum, ‘na-ekwusa ozi ọma alaeze ahụ.’ (Matiu 4:23) N’ihi na ọ makwaara na ọtụtụ ndị ga-anabata ozi ọma ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Nna Nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.”—Matiu 9:37, 38.

5 N’ikwekọ n’ekpere ya, Jizọs zụrụ ndị ọzọ ịbụ ndị na-ezisa ozi ọma. Ka oge na-aga, o zipụrụ ndị ozi ya nanị ha ma gwa ha, sị: “Ka unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze nke eluigwe eruwo nso.’” Ha iguzobe usoro ihe omume iji belata nsogbu ọha mmadụ ọ̀ gaara aka baa uru? Ka hà kwesịrị itinyewo aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị iji gbalịa igbochi nrụrụ aka jupụtara ebe nile n’oge ahụ? Ee e. Kama nke ahụ, Jizọs setịpụụrụ Ndị Kraịst nile na-ezisa ozi ọma ụkpụrụ mgbe ọ gwara ụmụazụ ya, sị: “Ka unu na-aga, na-ekwusanụ.”—Matiu 10:5-7.

6 Mgbe e mesịrị, Jizọs zipụrụ ìgwè ọzọ nke ndị na-eso ụzọ ịkpọsa, sị: “Alaeze nke eluigwe eruwo nso.” Mgbe ha lọghachiri ịkọ ihe ịga nke ọma ha nwere na njem nzisa ozi ọma ha, Jizọs ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu. O kpere ekpere, sị: “Ana m enye gị otuto n’ihu ọha, Nna, Onyenwenụ nke eluigwe na ala, n’ihi na i zonahụwo ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a nke ọma, i kpughewokwa ha nye ụmụ ọhụrụ.” (Luk 10:1, 8, 9, 21) Ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị bụbu ndị na-arụsị ọrụ ike n’ọrụ ịkụ azụ, ọrụ ugbo, na n’ọrụ ndị ọzọ, dị ka ụmụ ọhụrụ ma e jiri ha tụnyere ndị ndú okpukpe nke mba ahụ bụ́ ndị gụrụ oké akwụkwọ. Ma a zụrụ ndị ahụ na-eso ụzọ ịkpọsa ozi kasị mma.

7. Mgbe Jizọs rịgosịrị n’eluigwe, olee ndị ụmụazụ ya bu ụzọ kwusaara ozi ọma ahụ?

7 Mgbe Jizọs rịgosịrị n’eluigwe, ụmụazụ ya nọgidere na-ezisa ozi ọma nke nzọpụta. (Ọrụ 2:21, 38-40) Ole ndị ka ha bu ụzọ kwusaara ya? Hà gara ná mba ndị na-amaghị Chineke? Ee e, ndị mbụ ha kwusaara ya bụ ndị Izrel, bụ́ ndị mawooro Jehova ruo ihe karịrị afọ 1,500. Hà nwere ikike nke ikwusa ozi ọma n’ala ebe a narịị efe Jehova? Ee. Jizọs agwawo ha, sị: “Unu ga-agbakwa àmà banyere m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria dum nakwa ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Ọ dị Izrel mkpa ịnụ ozi ọma ahụ dịkwa ka ọ dị mba ọ bụla ọzọ.

8. Olee otú Ndịàmà Jehova taa si eṅomi ụmụazụ Jizọs nke narị afọ mbụ?

 8 N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova taa na-eme nkwusa n’ụwa nile. Ha na mmụọ ozi ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ bụ́ onye ‘nwere ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla’ na-arụkọ ọrụ. (Mkpughe 14:6) N’afọ 2001, ha rụsiri ọrụ ike n’ala na ókèala 235, gụnyere ụfọdụ bụ́ ndị a na-ewerekarị dị ka ala Ndị Kraịst. Ọ̀ dị njọ Ndịàmà Jehova ikwusa ozi ọma n’ebe Krisendọm guzobeworo chọọchị ya dị iche iche? Ụfọdụ na-asị na ọ dị njọ, ọbụnadị ha pụrụ iwere nzisa ozi ọma dị otú ahụ dị ka “izu ohi atụrụ.” Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova na-echeta mmetụta Jizọs nwere n’ebe ndị Juu dị umeala n’obi biri ndụ n’oge ya nọ. Ọ bụ ezie na ha nwererịị òtù ndị nchụàjà, Jizọs alaghị azụ n’izi ha ozi ọma. O “nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Mgbe Ndịàmà Jehova chọtara ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị na-amaghị banyere Jehova na Alaeze ya, hà kwesịrị ịhapụ izi ndị dị otú ahụ ozi ọma n’ihi na okpukpe ụfọdụ na-azọrọ na ha bụ ndị òtù ha? N’ịgbaso ihe nlereanya nke ndịozi Jizọs, anyị na-aza ee e. A ghaghị ikwusa ozi ọma ahụ “ná mba nile,” n’ahapụghị nke ọ bụla.—Mak 13:10.

Ndị Kraịst Oge Mbụ Nile Zisara Ozi Ọma

9. Na narị afọ mbụ, olee ndị n’ọgbakọ Ndị Kraịst keere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ?

9 Olee ndị na narị afọ mbụ keere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ? Ihe ndị bụ́ eziokwu na-egosi na Ndị Kraịst nile bụ ndị na-ezisa ozi ọma. Onye edemede bụ́ W. S. Williams na-ekwu, sị: “Ihe àmà nile e nwere bụ na Ndị Kraịst nile nọ na Chọọchị oge mbụ . . . kwusara oziọma ahụ.” Banyere ihe ndị mere n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., Bible na-asị: “Ha nile [ndị ikom na ndị inyom] jupụtakwara na mmụọ nsọ wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, dị nnọọ ka mmụọ nsọ ahụ nọ na-enye ha ikike ikwu okwu.” Ndị na-ezisa ozi ọma bịara gụnye ndị ikom na ndị inyom, ndị na-eto eto na ndị agadi, ohu na onye nweere onwe ya. (Ọrụ 1:14; 2:1, 4, 17, 18; Joel 2:28, 29; Ndị Galeshia 3:28) Mgbe mkpagbu manyere ọtụtụ Ndị Kraịst ịgbapụ na Jeruselem, “ndị ahụ a chụsasịworo gazuru ala ahụ na-akpọsa ozi ọma banyere okwu ahụ.” (Ọrụ 8:4) “Ndị ahụ a chụsasịworo,” ọ bụghị nanị mmadụ ole na ole a họpụtara ahọpụta, zisara ozi ọma.

10. Ọrụ dị aṅaa gbara mkpị ka a rụzuru tupu mbibi nke usoro ihe ndị Juu?

10 Nke a bụ eziokwu n’afọ ndị mbụ ahụ nile. Jizọs buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ná mmezu nke okwu ndị ahụ na narị afọ mbụ, e kwusara ozi ọma ahụ n’ụzọ sara mbara tupu usuu ndị agha Rom ebibie usoro okpukpe na nke ọchịchị ndị Juu. (Ndị Kọlọsi 1:23) Ọzọkwa, ụmụazụ Jizọs nile rubere isi n’iwu ya bụ́: “Ya mere gaanụ mee ndị nke  mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha na-edebe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ndị Kraịst oge mbụ agbaghị ndị dị umeala n’obi ume ikwere na Jizọs ma hapụzie ha ijere Chineke ozi otú masịrị ha, dị ka ụfọdụ ndị nkwusa nke oge a na-eme. Kama nke ahụ, ha kụziiri ha ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, hazie ha gaa n’ọgbakọ dị iche iche, ma zụọ ha ka ha onwe ha kwa wee nwee ike ikwusa ozi ọma ma mee ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ. (Ọrụ 14:21-23) Ndịàmà Jehova taa na-agbaso ụkpụrụ ahụ.

11. Olee ndị taa na-ekere òkè n’ịkpọsara ihe a kpọrọ mmadụ ozi kasị mma?

11 N’ịgbaso ihe nlereanya Pọl, Banabas, na ndị ọzọ na narị afọ mbụ, ọtụtụ Ndịàmà Jehova agawo n’ala ndị ọzọ dị ka ndị ozi ala ọzọ. Ọrụ ha abawo uru n’ezie, ebe ọ bụ na ha etinyebeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ si n’ụzọ ọ bụla ọzọ hapụ ọrụ ha nke ikwusa ozi ọma. Ha erubewo nnọọ isi n’iwu Jizọs bụ́: “Ka unu na-aga, na-ekwusanụ.” Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà Jehova abụghị ndị na-eje ozi n’ala na-abụghị nke ha. Ọtụtụ n’ime ha na-enweta ihe ha ji ebi ndụ site n’ịrụ ọrụ ego, ndị ọzọ ka nọkwa n’ụlọ akwụkwọ. Ụfọdụ na-azụ ụmụ. Ma Ndịàmà nile na-eso ndị ọzọ ekerịta ozi ọma nke ha mụtaworo. Ndị na-eto eto na ndị agadi, ndị ikom na ndị inyom, ha nile ji ọṅụ na-anabata agbamume Bible bụ́: “Kwusaa okwu ahụ, nọgidesie ike na ya n’oge dị mma, n’oge nsogbu.” (2 Timoti 4:2) Dị ka ndị narị afọ mbụ bu ha ụzọ, ha nọgidere “n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.” (Ọrụ 5:42) Ha na-akpọsara ihe a kpọrọ mmadụ ozi kasị mma.

Tọghata Ka Ọ̀ Bụ Zisaa Ozi Ọma?

12. Gịnị bụ ime ntọghata, oleekwa otú e sizi ele ya anya?

12 E nwere okwu bụ́ pro·se’ly·tos n’asụsụ Grik, bụ́ nke pụtara “onye a tọghatara atọghata.” Ọ bụ ebe a ka e si nweta okwu Bekee a sụgharịrị ịbụ “ime ntọghata.” N’ụbọchị ndị a, ụfọdụ na-ekwu na ime ntọghata na-enwe mmetụta dị njọ. Otu akwụkwọ nke Kansụl nke Chọọchị Ndị Dị n’Ụwa bipụtara kwuru ọbụna banyere “mmehie nke ime ntọghata.” N’ihi gịnị? Akwụkwọ bụ́ Catholic World Report na-ekwu, sị: “N’ihi mkpesa ndị Chọọchị Ọtọdọks nọgidere na-eme, ‘ime ntọghata’ na-enyezi echiche nke ịmanye mmadụ ịgbanwe okpukpe ya.”

13. Gịnị bụ ụfọdụ ihe atụ nke ime ntọghata ndị nwere mmetụta dị njọ?

13 Ime ntọghata ọ̀ na-enwe mmetụta dị njọ? Ọ pụrụ inwe. Jizọs kwuru na ntọghata ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii mere nwere mmetụta dị njọ n’ahụ́ ndị ha tọghatara. (Matiu 23:15) N’ezie, “ịmanye mmadụ ịgbanwe okpukpe ya” dị njọ. Dị ka ihe atụ, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, mgbe John Hyrcanus bụ́ onye Maccabee meriri ndị Idumea, o kwere ka ha “nọrọ ná mba nke aka ha ma ọ bụrụhaala na ha ebie onwe ha úgwù ma dị njikere idebe iwu ndị Juu.” Ọ bụrụ na ndị Idumea gaje ibi n’okpuru ọchịchị ndị Juu, ha aghaghị ikpe okpukpe ndị Juu. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị na na narị afọ nke asatọ O.A., Charlemagne  meriri ndị Saxon na-ekpere arụsị bụ́ ndị bi n’ebe ugwu Europe, ma jiri obi ọjọọ manye ha ịgbanwe okpukpe ha. * Otú ọ dị, ruo ókè ha aṅaa ka mgbanwe ndị Saxon ma ọ bụ ndị Idumea gbanwere okpukpe ha bụ nke si n’ezi obi? Dị ka ihe atụ, ruo ókè ha aṅaa ka nkwenye Eze Herọd bụ́ onye Idumea—onye gbalịrị ime ka e gbuo nwa ọhụrụ bụ́ Jizọs—kwenyere n’Iwu Mozis nke sitere n’aka Chineke bụ nke si n’ezi obi?—Matiu 2:1-18.

14. Olee otú ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm si arụgide ndị mmadụ ịgbanwe okpukpe ha?

14 À na-amanye ndị mmadụ ịgbanwe okpukpe ha taa? N’otu echiche, ụfọdụ na-eme otú ahụ. E kwuru na e nwere ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm bụ́ ndị na-enye ndị ha na-achọ ịtọghata ohere agụmakwụkwọ n’efu ná mba ofesi. Ma ọ bụ, ha pụrụ ime ka onye gbara ọsọ ndụ agụụ na-agụgbu gee ntị n’ozizi ha ka e wee nyetụ ya ihe oriri. Dị ka e kwuru na 1992 ná mgbakọ ndị Bishọp nke Ọtọdọks, “mgbe ụfọdụ, a na-atọghata ndị mmadụ site n’iji ihe onwunwe adọta ha nakwa mgbe ụfọdụ site n’iji ụdị dịgasị iche iche nke ime ihe ike eme ihe.”

15. Ndịàmà Jehova hà na-eme ntọghata n’echiche nke ihe okwu ahụ pụtara n’oge a? Kọwaa.

15 Ịrụgide ndị mmadụ ịgbanwe okpukpe ha dị njọ. N’ezie, Ndịàmà Jehova adịghị eme otú ahụ. * N’ihi ya, ha adịghị eme ntọghata n’echiche nke ihe okwu ahụ pụtara n’oge a. Kama nke ahụ, dị ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ, ha na-ekwusara mmadụ nile ozi ọma ahụ. A na-agwa onye ọ bụla ji ọchịchọ obi ya ṅaa ntị ka o nwetakwuo ihe ọmụma site n’ọmụmụ Bible. Ndị dị otú ahụ nwere mmasị na-amụta inwe okwukwe, bụ́ nke dabesiri ike n’ezi ihe ọmụma nke Bible, n’ebe Chineke nọ na n’ebe nzube ya dị. N’ihi ya, ha na-akpọku aha Chineke, bụ́ Jehova, maka nzọpụta. (Ndị Rom 10:13, 14, 17) Ma hà ga-anakwere ozi ọma ahụ ma ọ bụ na ha agaghị anakwere ya bụ mkpebi onwe onye. A dịghị amanye ha amanye. Ọ bụrụ na ọ bụ ná mmanye, ntọghata ga-abụ ihe na-enweghị isi. Ka ofufe wee bụrụ nke Chineke na-anakwere, ọ ghaghị isite n’obi.—Deuterọnọmi 6:4, 5; 10:12.

Izisa Ozi Ọma n’Oge A

16. Olee otú ọrụ izisa ozi ọma nke Ndịàmà Jehova siworo mụbaa n’oge a?

16 N’oge a nile, Ndịàmà Jehova ekwusawo ozi ọma nke Alaeze ahụ ná mmezu ka ukwuu nke Matiu 24:14. Ngwá ọrụ pụtara ìhè ha ji arụ ọrụ izisa ozi ọma ha abụwo magazin Ụlọ Nche. * Na 1879, bụ́ mgbe e wepụtara mbipụta mbụ nke Ụlọ Nche, e kesara ihe dị ka mkpụrụ 6,000 nke magazin ahụ n’otu asụsụ. N’afọ 2001, bụ́ ihe karịrị afọ 122 ka e mesịrị, ọnụ ọgụgụ e kesara eruwo mkpụrụ 23,042,000 n’asụsụ 141. Ihe ya na ịrị elu ahụ na-agakọ abụwo mmụba a na-enwe n’ọrụ izisa ozi ọma nke Ndịàmà Jehova. Jiri puku awa ole na ole e  tinyere kwa afọ n’ọrụ izisa ozi ọma ahụ na narị afọ nke 19 tụnyere awa 1,169,082,225 e tinyere n’ọrụ nkwusa ahụ n’afọ 2001. Tụlee ọmụmụ Bible 4,921,702 e duziri n’efu ná nkezi kwa ọnwa. Lee ezi ọrụ dị ukwuu a rụzuru! Ọ bụkwa ndị nkwusa Alaeze 6,117,666 rụsiri ọrụ ike rụzuru ya.

17. (a) Chi ụgha ndị dị aṅaa ka a na-efe ofufe taa? (b) Gịnị dị onye ọ bụla mkpa ịnụ n’agbanyeghị asụsụ, mba, na ọnọdụ ya ná ndụ?

17 Ọbụ abụ ahụ na-asị: “Chi nile nke ndị nile dị iche iche bụ ihe efu: ma Jehova mere eluigwe.” (Abụ Ọma 96:5) N’ụwa taa nke na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe, e mewo ka ịhụ mba n’anya, ihe nnọchianya mba, ndị a ma ama, ihe onwunwe, na ọbụna akụ̀ na ụba n’onwe ya bụrụ ihe a na-efe ofufe. (Matiu 6:24; Ndị Efesọs 5:5; Ndị Kọlọsi 3:5) Mohandas K. Gandhi kwuru n’otu oge, sị: ‘Ekwenyesiri m ike na taa, ndị Europe bụ Ndị Kraịst nanị n’ọnụ. N’ezie, ha na-efe Mammon [akụ̀ na ụba].’ Nke bụ́ eziokwu bụ, ọ dị ndị nọ n’ebe nile mkpa ịnụ ozi ọma ahụ. Ọ dị onye ọ bụla mkpa ịmara banyere Jehova na nzube ya n’agbanyeghị asụsụ, mba, ma ọ bụ ọnọdụ ya ná ndụ. Ọ dị anyị ka ya bụrụ na mmadụ nile ga-emeghachi omume nye okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Nyenụ Jehova nsọpụrụ na ike. Nyenụ Jehova nsọpụrụ aha Ya”! (Abụ Ọma 96:7, 8) Ndịàmà Jehova na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova ka ha wee nwee ike inye ya nsọpụrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ndị meghachikwara omume n’ụzọ dị mma na-erite uru dị ukwuu. Uru ndị dị aṅaa ka ha na-erite? A ga-atụle ha n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Dị ka akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia, si kwuo, n’oge Ndozigharị ahụ, ụkpụrụ nduzi bụ́: Cuius regio, illius et religio (N’ụzọ bụ́ isi, nke a pụtara: “Onye ọ bụla na-achị ala na-ekpebikwa okpukpe a ga na-ekpe na ya.”) gosipụtara mmanye a manyere ndị mmadụ ikpe otu okpukpe.

^ par. 15 Ná nzukọ Ụlọ Ọrụ United States Maka Nnwere Onwe Okpukpe ná Mba Nile nwere na November 16, 2000, otu onye gara ya gosipụtara ọdịiche dị n’etiti ndị na-agbalị ịmanye ndị ọzọ ịgbanwe okpukpe ha na ọrụ Ndịàmà Jehova. E kwuru na mgbe Ndịàmà Jehova na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ, ha na-eme ya n’ụzọ ga-eme ka mmadụ nwee ike ịsị “Enweghị m mmasị” ma mechie ụzọ ya.

^ par. 16 Aha zuru ezu nke magazin ahụ bụ Ụlọ Nche, Ikwupụta Alaeze Jehova.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji bụrụ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi ezisa ozi ọma?

• N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji eme nkwusa ọbụna n’ebe ndị Krisendọm guzobeworo chọọchị ha dị iche iche?

• Gịnị mere na Ndịàmà Jehova abụghị ndị ntọghata n’echiche nke ihe okwu ahụ pụtara n’oge a?

• Olee otú ọrụ izisa ozi ọma nke Ndịàmà Jehova siworo mụbaa n’oge a?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Jizọs bụ onye ji ịnụ ọkụ n’obi zisaa ozi ọma, ọ zụkwara ndị ọzọ ịrụ otu ọrụ ahụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị nile nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ keere òkè n’izisa ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 11]

Ịmanye ndị mmadụ ịgbanwe okpukpe ha dị njọ