Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Kwere Omume n’Ezie Inwe Ọha Mmadụ Ebe Ịkpa Ókè Na-adịghị?

Ò Kwere Omume n’Ezie Inwe Ọha Mmadụ Ebe Ịkpa Ókè Na-adịghị?

 Ò Kwere Omume n’Ezie Inwe Ọha Mmadụ Ebe Ịkpa Ókè Na-adịghị?

JOHN ADAMS, onye ghọrọ president nke abụọ nke United States, bụ otu n’ime ndị bịanyere aka ná Nkwupụta Maka Nnwere Onwe ahụ mere ihe akụkọ, bụ́ nke gụnyere ọmarịcha okwu ndị a: “Anyị kweere na eziokwu ndị a na-agbara onwe ha akaebe, na e kere mmadụ nile dị ka ndị ha nhata.” Otú o sina dị, o doro anya na John Adams ekweghị na ndị mmadụ ha nhata n’ezie, n’ihi na o dere, sị: “Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile mere ka ahaghị nhata nke Uche na Anụ Ahụ́ gbanyesie mkpọrọgwụ ike n’Iwu nke Ọdịdị Mmadụ nke na ọ dịghị nkà ma ọ bụ ụkpụrụ ime ihe nke pụrụ ime ka ha hara nhata ma ọlị.” N’ụzọ dị iche, ọkọ akụkọ ihe mere eme onye Britain bụ́ H. G. Wells chere n’echiche ọha mmadụ ebe e nwere ịha nhata na-adabere n’ụzọ ihe atọ: otu okpukpe dị ọcha nke a na-emerụghị emerụ bụ́ nke onye ọ bụla nọ n’ụwa ga na-ekpe, otu ụdị agụmakwụkwọ maka mmadụ nile, na enweghị ndị agha.

 Ka ọ dịgodị, a nụbeghị akụkọ banyere ọha mmadụ ebe onye ọ bụla ha nhata bụ́ nke Wells chere n’echiche. Ụmụ mmadụ ahatụghị nhata, ịkpa ókè ka bụkwa ihe bụ́ isi e ji mara ọha mmadụ. Ịkpa ókè dị otú ahụ ọ̀ dịwo uru ọ baara ọha mmadụ n’ozuzu? Ee e. Ịkpa ókè na-ekewa ndị mmadụ, na-akpata ekworo, ịkpọasị, obi mgbawa, na oké nkwafu ọbara. Echiche e nwere n’otu oge n’Africa, Australia, nakwa n’Ebe Ugwu America na ndị ọcha bụ ndị ka elu, mere ka ndị na-abụghị ndị ọcha hụsie anya—gụnyere mgbuchapụ e gbuchapụrụ ndị Aborigine na Van Diemen’s Land (nke bụzi Tasmania). Na Europe, iwere ndị Juu dị ka ndị dị ala bụ ihe dugara n’Oké Mgbukpọ ahụ. Oké akụ̀ na ụba nke ndị oké ozu na enweghị afọ ojuju nke ndị nọ n’ọkwá dị ala nakwa na nke etiti, bụ isi ihe ndị dugara ná Mgbanwe Ọchịchị France mere na narị afọ nke 18 nakwa nke Òtù Bolshevik mere na Russia na narị afọ nke 20.

Otu onye amamihe n’oge gara aga dere, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Ihe o kwuru bụ eziokwu ma ndị na-emejọ emejọ hà bụ ndị mmadụ n’otu n’otu ma hà bụ òtù dị iche iche. Mgbe otu ìgwè ndị mmadụ buliri onwe ya elu karịa ìgwè ọzọ, nhụsianya na ahụhụ ga-esirịrị na ya pụta.

Mmadụ Nile Ha Nhata n’Ihu Chineke

Ụfọdụ ìgwè mmadụ hà ka ìgwè ndị ọzọ elu site n’ọmụmụ? Ọ dịghị otú ahụ n’anya Chineke. Bible na-ekwu, sị: “[Chineke] sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.” (Ọrụ 17:26) Ọzọkwa, Onye Okike ‘adịghị ahụ ndị isi ihu ọma, ọ dịghị amatakwa ọgaranya karịa onye na-enweghị ike. N’ihi na ọrụ nke aka Ya ka ha nile bụ.’ (Job 34:19) Mmadụ nile si n’otu eriri, e kekwara ha nile dị ka ndị ha nhata n’ihu Chineke.

Chetakwa na mgbe mmadụ nwụrụ, nzọrọ nile ọ na-azọrọ na ya ka ndị ọzọ na-apụ n’anya. Ndị Ijipt oge ochie ekweghị nke ahụ. Mgbe Fero nwụrụ, ha na-etinye ihe ndị dara oké ọnụ n’ili ya ka o wee jiri ha mee ihe ka ọ na-anọgide na-anọ n’ọkwá ya dị elu ná ndụ ọ na-adị mgbe ọ nwụsịrị. Ò ji ha mee ihe? Ee e. Ndị ohi ili zuuru ihe ka ọtụtụ n’akụ̀ na ụba ndị ahụ, a pụkwara ịhụ ọtụtụ ihe ndị ohi ahụ zufọrọ n’ebe ndebe ihe mgbe ochie taa.

Ebe ọ bụ na Fero nwụrụ anwụ, o jitụghị ihe ndị ahụ dara oké ọnụ mee ihe. N’ọnwụ, e nweghị ọkwá ka elu, e nweghịkwa nke ka ala, e nweghị akụ̀ na ụba, e nweghịkwa ịda ogbenye. Bible na-ekwu, sị: “Ndị amamihe ga-anwụ, n’otu ka onye nzuzu na onye bụ́ anụ ọhịa na-alakọ n’iyi. [Mmadụ] yiri anụ nke e meworo ka ha debe ọnụ ha duu n’ọnwụ.” (Abụ Ọma 49:10, 12) Ma ànyị bụ ndị eze ma ọ bụ ndị ohu, okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ metụtara anyị nile: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Shiol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.”—Eklisiastis 9:5, 10.

E kere anyị nile dị ka ndị ha nhata n’anya Chineke, anyị nile na-anwụkwa dị ka ndị ha nhata. Lezie ka o si bụrụ ihe na-enweghị isi ibuli otu ìgwè elu karịa ọzọ n’ime oge ndụ anyị dị mkpirikpi!

Ọha Mmadụ Ebe Ịkpa Ókè Na-adịghị—N’ụzọ Dị Aṅaa?

Otú ọ dị, olileanya ọ bụla ọ̀ dị na otu ụbọchị, a ga-enwe ọha mmadụ n’etiti ndị dị ndụ ebe ịkpa ókè na-agaghị adị mkpa? Ee, ọ dị. A tọrọ ntọala maka ọha mmadụ dị otú ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga mgbe Jizọs nọ n’ụwa. Jizọs nyere ndụ ya dị ka àjà mgbapụta maka ihe nile a kpọrọ mmadụ kwere ekwe ka “e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Iji gosi na ọ dịghị onye n’ime ụmụazụ ya kwesịrị ibuli onwe ya elu karịa ndị kwere ekwe ibe ya, Jizọs kwuru, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu Rabaị, n’ihi  na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu nile bụ ụmụnna. Ọzọkwa, unu akpọla onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, bụ́ Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, bụ́ Kraịst ahụ. Ma onye kasị ukwuu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi. Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala.” (Matiu 23:8-12) N’anya Chineke, ndị nile bụ́ ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs ha nhata n’okpukpe.

Ndị Kraịst oge mbụ hà lere onwe ha anya dị ka ndị ha nhata? Ndị ghọtara ihe Jizọs kụziri mere otú ahụ. Ha lerịtara ibe ha anya dị ka ndị ha nhata n’okpukpe ma gosipụta nke a site n’ịkpọrịta ibe ha “nwanna.” (Faịlimọn 1, 7, 20) Ọ dịghị onye a gbara ume ile onwe ya anya dị ka onye ka ndị ọzọ mma. Dị ka ihe atụ, tụlee ụzọ obi umeala Pita si kọwaa onwe ya n’akwụkwọ ozi nke abụọ ya: “Saịmọn Pita, ohu na onyeozi nke Jizọs Kraịst, nye ndị nataworo okwukwe, bụ́ ihe ùgwù anyị na ha nwere n’ụzọ há nhata.” (2 Pita 1:1) Jizọs ejiwo aka ya zie Pita ihe, ebe ọ bụkwa onyeozi, o bu ibu ọrụ dị mkpa. N’agbanyeghị nke ahụ, o weere onwe ya dị ka ohu ma mata na Ndị Kraịst ndị ọzọ nwere ihe ùgwù há ka nke ya n’okwukwe ahụ.

Ụfọdụ pụrụ ikwu na eziokwu ahụ bụ́ na tupu oge Ndị Kraịst Chineke mere ka Izrel bụrụ mba pụrụ iche megidere echiche nke ịha nhata. (Ọpụpụ 19:5, 6) Ha pụrụ ịzọrọ na nke a bụ ihe atụ nke ibuli agbụrụ elu, ma nke ahụ abụghị eziokwu. Ọ bụ eziokwu na ụmụ Izrel, dị ka ụmụ Ebreham, so Chineke nwee mmekọrịta pụrụ iche, e sirikwa n’aka ha kpughee ihe ndị sitere n’aka Chineke. (Ndị Rom 3:1, 2) Ma nzube e ji mee nke a abụghị iji bulie ha elu. Kama, ọ bụ ka ‘e wee gọzie mba nile.’—Jenesis 22:18; Ndị Galeshia 3:8.

Ọ bịara bụrụ na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ Izrel eṅomighị okwukwe nke nna nna ha bụ́ Ebreham. Ha ekwesịghị ntụkwasị obi, ha jụkwara Jizọs dị ka Mezaịa ahụ. N’ihi ya, Chineke jụrụ ha. (Matiu 21:43) Otú ọ dị, ngọzi ndị ahụ e kwere ná nkwa efunahụghị ndị dị obi umeala n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. Na Pentikọst 33 O.A., e guzobere ọgbakọ Ndị Kraịst. A kpọrọ nzukọ a nke Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ mejupụtara “Izrel nke Chineke,” ọ ghọkwara ebe a ga-esi weta ngọzi ndị ahụ.—Ndị Galeshia 6:16.

Ọ dị ụfọdụ ndị so n’ọgbakọ ahụ mkpa ịbụ ndị e nyere ọzụzụ n’ihe banyere ịha nhata. Dị ka ihe atụ, Jems onye na-eso ụzọ dụrụ ndị nọ na-asọpụrụ Ndị Kraịst bara ọgaranya karịa ndị ka daa ogbenye ọdụ. (Jems 2:1-4) Nke ahụ dị njọ. Pọl onyeozi gosiri na ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst adịtụghị ala karịa ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst, ụmụ nwanyị bụ́ Ndị Kraịst adịtụghịkwa ala karịa ụmụ nwoke. O dere, sị: “N’eziokwu, unu nile bụ ụmụ Chineke site n’okwukwe unu nwere na Kraịst Jizọs. N’ihi na unu nile ndị e mere baptizim baa na Kraịst eyikwasịwo Kraịst. E nweghịkwa onye Juu ma ọ bụ onye Grik, e nweghịkwa ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya, e nweghịkwa nwoke ma ọ bụ nwanyị; n’ihi na unu nile bụ otu onye n’ihe metụtara Kraịst Jizọs.”—Ndị Galeshia 3:26-28.

Ndị Na-adịghị Akpa Ókè Taa

Ndịàmà Jehova taa na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. Ha na-aghọta na ịkpa ókè adịghị uru ọ bara n’anya Chineke. N’ihi ya, e kewaghị ha gaa n’òtù ndị ụkọchukwu na ndị aghasa, ha adịghịkwa akpa iche iche na-adabere n’ụcha akpụkpọ ahụ́ ma ọ bụ akụ̀  na ụba ha. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime ha bara ọgaranya, ha adịghị atụkwasị uche ‘n’oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ,’ n’ihi na ha na-aghọta na ihe ndị dị otú ahụ na-adịru nanị nwa oge. (1 Jọn 2:15-17) Kama nke ahụ, e jikọrọ ha nile ọnụ n’ofufe nke Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova Chineke.

Onye ọ bụla n’ime ha na-anakwere ibu ọrụ nke ikere òkè n’ọrụ nke ikwusara mmadụ ibe ya ozi ọma nke Alaeze ahụ. Dị ka Jizọs, ha na-asọpụrụ ndị e wedara n’ala na ndị e leghaara anya site n’ileta ha n’ebe obibi ha, na-agwa ha ka ha kụziere ha Okwu Chineke. Ndị nọ n’ọnọdụ dị ala ná ndụ so ndị ụfọdụ mmadụ pụrụ iwere dị ka ndị nọ n’ọkwá dị elu na-arụkọ ọrụ. Ihe kasị mkpa bụ àgwà ime mmụọ, ọ bụghị ọkwá. Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ha nile bụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị n’okwukwe ahụ.

Ịha Nhata Na-ekwe Ka E Nwee Ụdị Ihe Dị Iche Iche

N’ezie, ịha nhata adịghị apụta ịbụ otu kpam kpam. Ndị ikom na ndị inyom, ndị agadi na ndị na-eto eto, ha nile so ná nzukọ Ndị Kraịst a nke na-agụnye ndị a zụlitere n’imerime agbụrụ, asụsụ, mba, na ọnọdụ akụ̀ na ụba. Dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, ha dịgasị iche iche n’ike iche echiche na nke ọkpụkpụ aka. Ma ọdịiche ndị ahụ adịghị eme ka ụfọdụ dị elu ma ọ bụ ka ndị ọzọ dị ala. Kama nke ahụ, ọdịiche ndị dị otú ahụ na-eme ka e nwee ụdị ihe dị iche iche magburu onwe ha. Ndị Kraịst ahụ na-aghọta na nkà ọ bụla ha nwere bụ onyinye si n’aka Chineke, ọ bụghịkwa ihe mere ha ga-eji na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị ka elu.

Ihe na-akpata ịkpa ókè bụ mmadụ ịnwa ịchị onwe ya kama ịgbaso nduzi Chineke. N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eweghara ịchịisi nke ụwa a site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, ihe ga-esikwa na ya pụta ga-abụ ọgwụgwụ nke ịkpa ókè nke mmadụ ji aka ya kpata, tinyere ihe ndị ọzọ nile kpataworo nhụjuanya n’ọgbọ ndị gafeworonụ. Mgbe ahụ, n’echiche bụ́ ezie, ‘ndị dị umeala n’obi ga-eketa ụwa.’ (Abụ Ọma 37:11) Ihe nile na-eme ka mmadụ na-etu ọnụ banyere ihe o weere dị ka ihe o ji kara ibe ya ga-apụ n’anya. Ọ dịghị mgbe ọ bụla a ga-ekwe ọzọ ka ịkpa ókè kewaa òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke mmadụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Onye Okike ‘adịghị ahụ ndị isi ihu ọma, ọ dịghị amatakwa ọgaranya karịa onye na-enweghị ike. N’ihi na ọrụ nke aka Ya ka ha nile bụ.’—Job 34:19.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndịàmà Jehova na-asọpụrụ ndị agbata obi ha

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe kasị mkpa n’ebe ezi Ndị Kraịst nọ bụ àgwà ime mmụọ