Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahụ Efe Pụọ Ná Nrụgide—Ihe Ngwọta Dị Irè

Ahụ Efe Pụọ Ná Nrụgide—Ihe Ngwọta Dị Irè

 Ahụ Efe Pụọ Ná Nrụgide—Ihe Ngwọta Dị Irè

“Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu [nwee ume ọhụrụ, NW].”—MATIU 11:28.

1, 2. (a) Olee ihe dị na Bible nke na-enye aka ebelata nrụgide gabigara ókè? (b) Olee otú ozizi Jisọs dịruru n’irè?

IKEKWE ị ga-ekweta na nrụgide gabigara ókè dị njọ; ya na obi erughị ala bụ otu ihe. Bible na-eme ka ọ pụta ìhè na ihe nile e kere eke bụ́ mmadụ bu nnọọ ibu dị arọ nke na ọtụtụ mmadụ ji oké mmasị na-eche nnwere onwe pụọ ná ndụ jupụtara ná nrụgide nke oge a. (Ndị Rom 8:20-22) Ma Akwụkwọ Nsọ na-egosikwa otú anyị pụrụ isi nweta ahụ efe dị ukwuu pụọ n’obi erughị ala ugbu a. A na-enweta ya site n’ịgbaso ndụmọdụ na ihe nlereanya nke otu nwa okorobịa biri ndụ na narị afọ 20 gara aga. Ọ bụ ọkwa nkà, ma, ọ bụ ụmụ mmadụ ka ọ ka hụ n’anya. O mere ihe ruru ndị mmadụ n’obi, gboo mkpa ha, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-akasikwa ndị dara mbà n’obi obi. Ọbụna nke ka nke ahụ, o nyeere ọtụtụ ndị aka ịghọ ihe ha pụrụ ịghọ n’ụzọ ime mmụọ. Ha si otú a nweta ahụ efe pụọ ná nrụgide gabigara ókè, ọbụna dị ka gị onwe gị pụkwara inweta.—Luk 4:16-21; 19:47, 48; Jọn 7:46.

2 Nwoke a, bụ́ Jisọs onye Nazaret, enwetaghị nduzi site n’oké mmụta nke ụfọdụ ndị nwetara na Rom, Atens, ma ọ bụ Aleksandria oge ochie. N’agbanyeghị nke ahụ, a ma ozizi ya ama. Ha nwere otu isiokwu: ọchịchị nke Chineke ga-eji chịa ụwa anyị n’ụzọ ga-aga nke ọma. Jisọs kọwakwara ụkpụrụ ndị bụ́ isi maka ibi ndụ—ụkpụrụ ndị bara uru taa n’ezie. Ndị mụtara ma tinye ihe Jisọs kụziri n’ọrụ na-enweta abamuru ozugbo, gụnyere ahụ efe pụọ ná nrụgide gabigara ókè. Nke ahụ ọ́ gaghị amasị gị?

3. Olee òkù magburu onwe ya Jisọs kpọrọ?

3 Ị pụrụ inwe obi abụọ. ‘Onye biri ndụ ogologo oge gara aga otú ahụ ọ̀ pụrụ inwe mmetụta dị mma ná ndụ m ugbu a?’ Ọ dị mma, gee ntị n’òkù Jisọs kpọrọ: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu [nwee ume ọhụrụ, NW]. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28-30) Gịnị ka o bu n’uche? Ka anyị nyochaa okwu ndị a n’ụzọ zutụrụ ezu ma hụ otú ha si enye aka eme ka e nweta ahụ efe pụọ ná nrụgide gabigara ókè.

4. Olee ndị Jisọs gwara okwu, n’ihi gịnịkwa ka ọ pụrụ ijiwo siere ndị gere ya ntị ike ime ihe a gwara ha mee?

4 Jisọs gwara ọtụtụ ndị okwu bụ́ ndị na-agbalịsi ike ime ihe ziri ezi n’iwu ma bụrụ ndị e ‘boro ibu dị arọ’ n’ihi na ndị ndú ndị Juu mere ka okpukpe bụrụ ihe dị arọ. (Matiu 23:4) Ha lekwasịrị anya n’ụkpụrụ ndị na-adịghị agwụ agwụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ. Ọ́ gaghị agwụ gị ike ịnọgide na-anụ “emela” nke a ma ọ bụ nke ọzọ? N’ụzọ dị iche, òkù Jisọs kpọrọ na-eduga n’eziokwu, n’ezi omume, ná ndụ ka mma site n’ịṅa ya ntị. Ee, ụzọ isi mara ezi Chineke na-agụnye ịṅa Jisọs Kraịst ntị, n’ihi na ụmụ mmadụ pụrụ isi n’aka  ya hụ ihe Jehova dị ka ya. Jisọs kwuru, sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.”—Jọn 14:9.

Ndụ Gị Ò Jupụtara ná Nrụgide Gabigara Ókè?

5, 6. Olee otú ọnọdụ ọrụ na ụgwọ ọrụ nke oge Jisọs dị ma e jiri ya tụnyere nke oge anyị?

5 Okwu a pụrụ imetụta gị n’ihi na ọnọdụ ọrụ ma ọ bụ nke ezinụlọ gị pụrụ ịbụrụ gị nnọọ ibu arọ. Ma ọ bụ ibu ọrụ ndị ọzọ pụrụ iyi ka ha karịrị gị ike. Ọ bụrụ otú ahụ, ị dị ka ndị nwere ezi obi Jisọs zutere ma nyere aka. Dị ka ihe atụ, tụlee nsogbu nke ịkpata ihe e ji ebi ndụ. Ya na ọtụtụ ndị na-alụ taa, otú ahụkwa ka ya na ọtụtụ ndị lụrụ n’oge Jisọs.

6 Laa azụ n’oge ahụ, onye ọrụ e goro ego na-adọgbu onwe ya n’ọrụ ruo awa 12 n’ụbọchị, ụbọchị 6 n’izu, ihe a na-akwụ ya mgbe mgbe n’ụbọchị na-abụ nanị otu shilling. (Matiu 20:2-10) Olee otú nke ahụ dị ma e jiri ya tụnyere ihe a na-akwụ gị ma ọ bụ ndị enyi gị? Ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka iji ụgwọ ọrụ oge ochie tụnyere ndị nke oge a. Otu ụzọ bụ ịtụle ikike nke ego, ihe ego pụrụ ịzụta. Otu ọkà mmụta na-ekwu na n’oge Jisọs, a na-eji ihe dị ka ego a rụtara n’otu awa azụta otu ogbe achịcha e ji iko ụtụ ọka wheat anọ mee. Ọkà mmụta ọzọ na-ekwu na a na-eji ihe dị ka ego a rụtara n’awa abụọ azụta otu iko nke ezigbo mmanya. Ị pụrụ ịhụ site ná nkọwa ndị dị otú ahụ na ndị mmadụ n’oge ahụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ruo ogologo oge iji nọgide na-adị ndụ. Ahụ efe na izu ike dị ha mkpa, dịkwa ka ọ dị anyị. Ọ bụrụ na e were gị n’ọrụ, ọ pụrụ ịdị gị ka a na-arụgide gị ịrụsikwu ọrụ ike. Mgbe mgbe, anyị adịghị enwe oge ime mkpebi ndị e chere echiche nke ọma mee. Ị pụrụ ikweta na ahụ efe na-agụsi gị agụụ ike.

7. Olee otú e si meghachi omume n’ozi Jisọs?

7 N’ụzọ doro anya, òkù Jisọs kpọrọ ndị nile “na-adọgbu onwe [ha] n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ” ga-abụwo ihe na-akpali nnọọ akpali nye ọtụtụ ndị nụrụ olu ya laa azụ n’oge ahụ. (Matiu 4:25; Mak 3:7, 8) Chetakwa na Jisọs gbakwụnyere nkwa bụ́, “M ga-emekwa ka unu [nwee ume ọhụrụ, NW].” Nkwa ahụ ka dị irè taa. Ọ pụrụ imetụta anyị ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị “na-adọgbu onwe [ha] n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ.” Ọ pụkwara imetụta ndị anyị hụrụ n’anya, bụ́ ndị ọnọdụ ha yiri nke anyị ma eleghị anya.

8. Olee otú ịzụ ụmụ na ịka nká si eme ka a na-enwekwu nrụgide?

8 E nwere ihe ndị ọzọ na-anyịgbu ndị mmadụ.  Ịzụ ụmụ bụ otu ihe ịma aka bụ́ isi. Ọbụna ịbụ nwata pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị nọ n’afọ ndụ nile na-enweta nsogbu ahụ ike uche na nke anụ ahụ. N’agbanyeghịkwa na ndị mmadụ pụrụ ịdịtekwu ndụ aka, ndị agadi nwere nsogbu ndị pụrụ iche ha na ha na-alụ n’agbanyeghị ọganihu ndị e nweworo na nkà mmụta ọgwụ.—Eklisiastis 12:1.

Ịnọ n’Okpuru Yoke Ahụ

9, 10. N’oge ochie, gịnị ka yoke bụ ihe atụ ya, n’ihi gịnịkwa ka Jisọs ji kpọọ ndị mmadụ òkù ịnyara yoke nke ya?

9 Ị̀ rịbara ama na n’okwu ndị ahụ e hotara na Matiu 11:28, 29, Jisọs kwuru, sị: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m?” Laa azụ n’oge ahụ, ọ pụrụ ịdị nwoke nkịtị ka a ga-asị na ọ na-arụ ọrụ n’okpuru yoke. Site n’oge ochie, yoke abụrụwo ihe atụ nke ịgba ohu. (Jenesis 27:40; Levitikọs 26:13; Deuterọnọmi 28:48) Ọtụtụ n’ime ndị ọrụ e goro ego bụ́ ndị Jisọs zutere bu yoke nkịtị n’ubu ha rụọ ọrụ, na-ebu ibu ndị dị arọ. Na-adabere n’otú e si rụọ yoke, ọ pụrụ ịbụ ihe dị mfe ibu n’olu nakwa n’ubu ma ọ bụ bụrụ ihe na-egbu mgbu. Dị ka ọkwa nkà, ọ pụrụ ịbụwo na Jisọs rụrụ yoke, ọ ga-amawokwa otú ọ ga-esi rụọ nke ‘na-adịghị egbu mgbu.’ Ikekwe ọ na-eji akpụkpọ anụ ma ọ bụ ákwà amachite ebe a na-atụkwasị n’olu ma ọ bụ n’ubu iji mee ka yoke ahụ ghara igbu mgbu ruo ókè o kwere mee.

10 Mgbe Jisọs sịrị, “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu,” ọ pụrụ ịbụwo na o ji onwe ya na-atụnyere onye wetara yoke a rụrụ nke ọma nke ‘na-agaghị egbu onye ọrụ mgbu’ n’olu nakwa n’ubu. N’ihi ya, Jisọs gbakwụnyere, sị: “Ibu m dịkwa mfe.” Nke a na-egosi na ígwè yoke ahụ abụghị nke na-egbu mgbu, ọrụ ahụ abụghịkwa nke ohu. N’ezie, site n’ịkpọ ndị na-ege ya ntị ka ha nyara yoke ya, Jisọs adịghị enye ha ahụ efe ozugbo pụọ n’ọnọdụ mmegbu nile e nwere n’oge ahụ. Otú o sina dị, echiche dị iche o nyere ga-eme ka ha zuru ike n’ụzọ dị ukwuu. Ime mgbanwe n’ụzọ ndụ ha nakwa n’ụzọ ha si eme ihe ga-emekwa ka ha nwee ahụ efe. Nke ka mkpa bụ na olileanya doro anya ma sie ike ga-enyere ha aka ibelata nrụgide ha na-enwe ná ndụ.

Izu Ike Pụrụ Ịbụ nke Gị

11. Gịnị mere Jisọs adịghị atụ nnọọ aro iji otu yoke gbanwere ọzọ?

11 Biko rịba ama na Jisọs adịghị ekwu na ndị mmadụ ga-eji otu yoke gbanwere ọzọ. Rom ka ga-anọgide na-achị ala ahụ, dị nnọọ ka ọchịchị nke oge a na-achị ala ebe ndị Kraịst bi. Ụtụ isi ndị Rom nara na narị afọ mbụ agaghị akwụsị. A ga na-enwe nsogbu ahụ ike na nke akụ̀ na ụba. Ezughị okè na mmehie ga-anọgide na-emetụta ndị mmadụ. N’agbanyeghị ihe ndị a, izu ike pụrụ ịbụ nke ha site na ha ịnakwere ozizi Jisọs, dị ka ọ pụrụ ịbụ nke anyị taa.

12, 13. Gịnị ka Jisọs mere ka ọ pụta ìhè na ọ ga-eweta izu ike, oleekwa otú ụfọdụ ndị si meghachi omume na ya?

12 Otu akụkụ dị mkpa isi tinye ihe atụ Jisọs banyere yoke n’ọrụ bịara pụta ìhè n’ebe ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ya dị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọrụ bụ́ isi Jisọs rụrụ bụ izi ndị ọzọ ihe, na-ekwusi okwu ike banyere Alaeze Chineke. (Matiu 4:23) Ya mere, mgbe ọ sịrị, “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu,” n’ezie nke ahụ ga-agụnyewo iso ya na-arụ otu ọrụ ahụ. Ihe ndekọ nke Oziọma ahụ na-egosi na Jisọs kpaliri ndị nwere ezi obi ịgbanwe ọrụ ha, bụ́ nchegbu bụ́ isi ná ndụ ọtụtụ ndị. Cheta òkù ọ kpọrọ Pita, Andru, Jemes, na Jọn, sị: “Bịanụ soo m n’azụ, M ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” (Mak 1:16-20) O gosiri ndị ọkụ azụ̀ ahụ otú ọ ga-esi bụrụ ihe na-enye afọ ojuju ma ọ bụrụ na ha arụọ ọrụ ọ nọ na-ebute ụzọ ná ndụ ya, na-eme ya n’okpuru nduzi na enyemaka ya.

13 Ụfọdụ n’ime ndị Juu nụrụ ihe o kwuru ghọtara ya ma tinye ya n’ọrụ. Were anya nke uche gị hụ ihe mere n’ụsọ oké osimiri bụ́ nke anyị na-agụ banyere ya na Luk 5:1-11. Ndị ọkụ azụ̀ anọ adọgbuwo onwe ha n’ọrụ n’abalị dum ma ọ dịghị azụ ha gbutere. Na mberede, azụ̀ jupụtara n’ụgbụ ha! Nke a emeghị ná ndabara; ọ bụ Jisọs mere ya. Ka ha lepụrụ anya n’ụsọ oké osimiri, ha hụrụ ìgwè mmadụ ndị nwere nnọọ mmasị n’ozizi Jisọs. Nke ahụ nyere aka ịkọwa ihe Jisọs gwara mmadụ anọ ahụ: “Site n’ugbu a  [unu] ga na-anwụta mmadụ ná ndụ.” Olee otú ha si meghachi omume? “Ha tinyere ụgbọ ha n’ala, ha wee hapụ ihe nile, [soro] Ya.”

14. (a) Olee otú anyị pụrụ isi hụ izu ike taa? (b) Ozi ọma dị aṅaa na-enye izu ike ka Jisọs kwusara?

14 N’ụzọ bụ́ isi, ị pụrụ imeghachi omume n’ụzọ yiri nke ahụ. Ọrụ nke ịkụziri ndị mmadụ eziokwu Bible ka na-aga n’ihu. Ihe dị ka nde Ndịàmà Jehova isii n’ụwa nile azawo òkù Jisọs kpọrọ ‘ịnyara yoke nke ya n’olu’ ha; ha aghọwo “ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” (Matiu 4:19) Ụfọdụ na-eme ya ọrụ ha na-arụ oge nile; ndị ọzọ na-eme ike ha nile na nwa oge. Ha nile na-ahụ ya dị ka ihe na-enye izu ike, n’ụzọ dị otú ahụ, nrụgide ha na-enwe ná ndụ na-ebelata. Ọ na-agụnye ime ihe na-atọ ha ụtọ, izi ndị ọzọ ozi ọma—“ozi ọma nke alaeze ahụ.” (Matiu 4:23) Ọ bụ ihe na-atọ ụtọ mgbe nile izi ozi ọma ma karịsịa ozi ọma nke a. Bible bu ihe ọmụma bụ́ isi dị anyị mkpa iji mee ka ndị mmadụ kwere na ha pụrụ ibi ndụ nrụgide na-adịchaghị na ya.—2 Timoti 3:16, 17.

15. Ị̀ pụrụ isi aṅaa rite uru n’ihe ndị Jisọs kụziri banyere ndụ?

15 Ruo n’ókè ụfọdụ, ọbụna ndị ka malitere ịmụ banyere Alaeze Chineke eritewo uru site n’ihe ndị Jisọs kụziri banyere ụzọ e si ebi ndụ. Ọtụtụ ndị pụrụ ikwu n’eziokwu na ozizi Jisọs emewo ka ha zuru ike ma nyere ha aka ịgbanwe ndụ ha. Ị pụrụ ịchọpụta nke ahụ n’onwe gị site n’inyocha ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị metụtara ibi ndụ bụ́ ndị e nyere n’ihe ndekọ nke ndụ na ozi Jisọs, karịsịa Oziọma ndị ahụ Matiu, Mak, na Luk dere.

 Ụzọ Isi Hụ Izu Ike

16, 17. (a) Ebee ka ị pụrụ ịchọta ụfọdụ n’ime ozizi ndị bụ́ isi nke Jisọs? (b) Gịnị dị mkpa iji hụ izu ike site n’itinye ozizi Jisọs n’ọrụ?

16 N’oge opupu ihe ubi nke 31 O.A., Jisọs kwuru okwu ihu ọha a ma ama ruo taa n’ụwa. A na-akpọkarị ya Ozizi Elu Ugwu. E dekọrọ ya na Matiu isi 5 ruo 7 nakwa na Luk isi 6, ọ chịkọtakwara ọtụtụ n’ime ozizi ya. Ị pụrụ ịchọta ozizi ndị ọzọ nke Jisọs n’ebe ndị ọzọ n’Oziọma ndị ahụ. A pụrụ ịghọta ihe ka ukwuu n’ihe o kwuru n’ebughị ụzọ nụ nkọwa ha, ọ bụ ezie na itinye ha n’ọrụ pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Gịnị ma i jiri nlezianya na ezi nchebara echiche gụọ isiakwụkwọ ndị ahụ? Kwee ka ike nke echiche ya metụta echiche na àgwà gị.

17 N’ụzọ doro anya, a pụrụ ịchịkọta ozizi Jisọs n’ụzọ dị iche iche. Ka anyị chịkọta ozizi ndị bụ́ isi n’ìgwè dị iche iche ka e wee nwee otu maka ụbọchị nke ọ bụla n’ọnwa, na-eburu n’uche itinye ha n’ọrụ ná ndụ gị. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, agụla ha ọkụ ọkụ. Cheta onyeisi ahụ bara ọgaranya bụ́ onye jụrụ Jisọs Kraịst, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?” Mgbe Jisọs kwupụtaghachiri ihe ndị dị oké mkpa Iwu Chineke chọrọ n’aka ya, nwoke ahụ zara na ya na-emezuworịị ihe ndị a. Ma, ọ chọpụtara na ọ dị ya mkpa imekwu ihe. Jisọs gwara ya ka o tinyekwuo mgbalị n’itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ n’ụzọ ndị dị irè, ịbụ ezigbo onye na-eso ụzọ. N’ụzọ doro anya, nwoke ahụ adịghị njikere imeru ihe otú ahụ. (Luk 18:18-23) N’ihi ya, ọ dị onye chọrọ ịmụta ihe ndị Jisọs kụziri mkpa taa icheta na e nwere ọdịiche dị n’ikwere na ha na ime ha eme, si otú a na-eme ka nrụgide belata.

18. Nye ihe atụ otú ị pụrụ isi jiri igbe ya na isiokwu a so mee ihe n’ụzọ bara uru.

 18 Dị ka ihe mbụ n’inyocha na itinye ozizi Jisọs n’ọrụ, lee anya n’isi ihe nke 1 n’igbe ya na isiokwu a so. Ọ na-ezo aka na Matiu 5:3-9. N’ezie, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ iji nnọọ oge dị ukwuu tụgharịa uche n’ọmarịcha ndụmọdụ e nyere n’amaokwu ndị ahụ. Otú ọ dị, n’ile ha anya n’ozuzu, gịnị ka ị na-ekwubi banyere akparamàgwà? Ọ bụrụ n’ezie na ị chọrọ ịkwụsị mmetụta nke nrụgide gabigara ókè na-enwe ná ndụ gị, gịnị gaje inye aka? Olee otú ọnọdụ gị pụrụ isi ka mma ma ọ bụrụ na ị na-elebakwuru ihe ime mmụọ anya, na-ekwe ka ọ na-emejupụta ihe ka ukwuu n’echiche gị? Ọ̀ dị ihe ndị ị na-enwe nchegbu banyere ha ná ndụ bụ́ ndị ọ dị gị mkpa iselata aka n’otú i si jiri ha kpọrọ ihe, na-eme ka i nwee ike ilebakwuru ihe ime mmụọ anya? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-eme ka i nwekwuo obi ụtọ ugbu a.

19. Gịnị ka ị pụrụ ime iji nwetakwuo nghọta?

19 Ugbu a, gatụkwuo n’ihu. Gịnị ma i soro onye ọzọ na-ejere Chineke ozi, ikekwe onye òtù ọlụlụ, onye ikwu dị nso, ma ọ bụ ezigbo enyi gị, kwurịta amaokwu ndị ahụ? (Ilu 18:24; 20:5) Cheta na onyeisi ahụ bara ọgaranya jụrụ onye ọzọ—Jisọs—ihe yiri nke ahụ. Ihe ọ zara ya pụrụ ịmụbawo atụmanya ya nke inweta obi ụtọ na ndụ ebighị ebi. Onye gị na ya na-efekọ ofufe nke ị ga-eso kwurịta banyere amaokwu ndị ahụ agaghị aha ka Jisọs; ma, mkparịta ụka banyere ozizi Jisọs ga-abara unu abụọ uru. Gbalịa mee ya ngwa ngwa.

20, 21. Olee usoro ihe omume ị pụrụ ịgbaso iji mụta ozizi Jisọs, oleekwa otú ị pụrụ isi tụlee ọganihu gị?

20 Leghachi anya n’igbe ahụ ya na isiokwu a so bụ́, “Ozizi Ndị E Ziri Iji Nyere Gị Aka.” A chịkọtara ozizi ndị a n’ìgwè dị iche iche ka i wee nwee ike inwe ma ọ dịkarịa ala otu ozizi ị ga-atụle n’ụbọchị. Ị pụrụ ibu ụzọ gụọ ihe Jisọs kwuru n’amaokwu ndị ahụ e hotara. Mgbe ahụ, chebara okwu ya echiche. Tụgharịa uche n’otú ị pụrụ isi tinye ha n’ọrụ ná ndụ gị. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị na-emerịị otú ahụ, tụgharịa uche iji hụ ihe ị pụrụ imekwu iji na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ozizi Chineke ahụ. Tinye ya n’ọrụ n’ụbọchị ahụ. Ọ bụrụ na ị ghaghị ịgbalịsi ike iji ghọta ya ma ọ bụ hụ otú ị pụrụ isi tinye ya n’ọrụ, leba ya anya n’ụbọchị ọzọ. Otú ọ dị, buru n’uche na ọ bụghị iwu na ọ ga-amarịrị gị ahụ tupu ị gafee n’ọzọ. N’ụbọchị na-esonụ, ị pụrụ ịtụle ozizi ọzọ. N’ọgwụgwụ izu, ị pụrụ ịtụleghachi otú i nweruworo ihe ịga nke ọma n’itinye ozizi Jisọs anọ ma ọ bụ ise n’ọrụ. N’izu nke abụọ, tụkwasịkwuo ya ọzọ, site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị dawo n’itinye ozizi ụfọdụ n’ọrụ, adala mbà n’obi. Nke ahụ ga-eme onye Kraịst ọ bụla. (2 Ihe E Mere 6:36; Abụ Ọma 130:3; Eklisiastis 7:20; Jemes 3:8) Gaa n’ihu n’izu nke atọ na nke anọ.

21 Mgbe ihe dị ka otu ọnwa gasịrị, ị pụrụ ịtụlewo isi ihe 31 ahụ nile. Otú o sina dị, olee otú ọ ga-adị gị n’ihi ya? Ị́ gaghị enwetụkwu obi ụtọ, ikekwe nwetụkwuo ahụ iru ala? Ọ bụrụgodị na ọganihu i nwere pere nnọọ mpe, o yikarịrị ka ọ ga-adị gị ka nrụgide ị na-enwe ò belatala, ma ọ bụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ị ga na-anagide nrụgide n’ụzọ ka mma, ị ga-enwekwa usoro ị na-agbaso iji nọgide na-eme ya. Echefula na e nwere ọtụtụ ọmarịcha isi ihe ndị ọzọ dị n’ozizi Jisọs bụ́ ndị a na-edepụtaghị n’igbe ahụ. Gịnị ma ị chọpụta ụfọdụ n’ime ha ma gbalịa itinye ha n’ọrụ?—Ndị Filipaị 3:16.

22. Gịnị pụrụ isi n’ịgbaso ozizi Jisọs pụta, ma olee akụkụ ọzọ kwesịrị ka a mụta ihe na ya?

 22 Ị pụrụ ịhụ na yoke Jisọs, ọ bụ ezie na ọ bụghị nke na-adịtụghị arọ, adịghị egbu mgbu n’ezie. Ibu nke ozizi ya na nke ime ndị na-eso ụzọ dị mfe. Mgbe Jọn onyeozi, bụ́ ezigbo enyi Jisọs, busịrị ya ruo ihe karịrị afọ 60, o kwetara, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) Ị pụrụ inwe nnọọ obi ike otú ahụ. Ka ị na-anọgide na-etinye ozizi Jisọs n’ọrụ, otú ahụ ka ị ga na-achọpụtakwu na ihe na-eme ka ọtụtụ mmadụ na-enwe nnọọ nrụgide ná ndụ agaghị eme ka i nwee nrụgide otú ahụ. Ị ga-ahụ na ị chọtawo ahụ efe dị ukwuu. (Abụ Ọma 34:8) Ma, e nwere akụkụ ọzọ nke yoke na-adịghị egbu mgbu nke Jisọs bụ́ nke ọ dị gị mkpa ịtụle. Jisọs kwukwara banyere ya onwe ya ịbụ “Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi.” Olee otú nke ahụ si kwekọọ n’anyị ịmụta ihe n’aka Jisọs na iṅomi ya? Anyị ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.—Matiu 11:29.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ilegara Jisọs anya mgbe anyị na-achọ ahụ efe pụọ ná nrụgide gabigara ókè?

• Gịnị ka yoke bụ ihe atụ ya, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

• Gịnị mere Jisọs ji kpọọ ndị mmadụ òkù ịnyara yoke ya?

• Olee otú izu ike ime mmụọ pụrụ isi bụrụ nke gị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Isiokwu dịịrị afọ maka Ndịàmà Jehova n’afọ 2002 ga-abụ: “Bịakwutenụ m . . . m ga-emekwa ka unu [nwee ume ọhụrụ, NW].”—Matiu 11:28.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 12, 13]

Ozizi Ndị E Ziri Iji Nyere Gị Aka

Olee ezi ihe ndị ị pụrụ ịchọta na Matiu isi nke 5 ruo 7? Isiakwụkwọ ndị a bu ihe ndị Onye Ozizi Bụ́ Ọkà, bụ́ Jisọs, ziri n’otu ugwu dị na Galili. Biko jiri Bible nke gị gụọ amaokwu ndị e hotara n’okpuru, jụọkwa onwe gị ajụjụ ndị ahụ ha na ha so.

1. 5:3-9 Gịnị ka nke a na-agwa m banyere àgwà m n’ozuzu ya? Olee otú m pụrụ isi mee ihe iji nwetakwuo obi ụtọ? Olee otú m pụrụ isi na-elebakwuru mkpa ime mmụọ m anya?

2. 5:25, 26 Gịnị dị mma karịa iṅomi mmụọ nkewa nke ọtụtụ ndị nwere?—Luk 12:58, 59.

3. 5:27-30 Gịnị ka okwu Jisọs na-emesi ike banyere inwe echiche efu nke agụụ mmekọahụ? Olee otú izere ihe dị otú ahụ ga-esi tụnye ụtụ n’obi ụtọ na udo nke uche m?

4. 5:38-42 Gịnị mere m ji kwesị ịgbalịsi ike izere oké ịchọ okwu bụ́ nke a na-ahụkarị n’ọha mmadụ nke oge a?

5. 5:43-48 Olee otú m ga-esi rite uru site n’ịmarukwu ndị mụ na ha na-akpakọrịta ala bụ́ ndị m pụrụ iwerewo dị ka ndị iro? Gịnị ka o yiri ka nke a ọ ga-eme iji mee ka esemokwu belata ma ọ bụ kwụsị?

6. 6:14, 15 Ọ bụrụ na mgbe ụfọdụ m na-achọ ịbụ onye na-adịghị agbaghara, isi ihe na-akpata ya ọ̀ pụrụ ịbụ anyaụfụ ma ọ bụ iwe? Olee otú m pụrụ isi gbanwee ya?

7. 6:16-18 Àna m eche banyere ọdịdị elu ahụ m karịa ụdị mmadụ m bụ? Gịnị ka m kwesịrị ịmatakwu?

8. 6:19-32 Mmetụta dị aṅaa ka ọ pụrụ inwe ma ọ bụrụ na mụ aghọọ onye na-echegbubiga onwe ya ókè banyere ego na ihe onwunwe? Iche banyere gịnị ga-enyere m aka inwe echiche ziri ezi n’akụkụ a?

9. 7:1-5 Olee otú ọ na-adị m mgbe m nọ n’etiti ndị nkatọ, ndị na-ahụchata emezighị emezi mgbe nile? Gịnị mere o ji dị mkpa ka m zere ịdị otú ahụ?

10. 7:7-11 Ọ bụrụ na nnọgidesi ike dị mma mgbe m na-arịọ Chineke arịrịọ, gịnị banyere n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ?—Luk 11:5-13.

11. 7:12 Ọ bụ ezie na m maara Ụkpụrụ Ọma ahụ, ugboro ole ka m na-etinye ndụmọdụ a n’ọrụ n’otú m si emeso ndị ọzọ ihe?

12. 7:24-27 Ebe ọ bụ m ka ọ dịịrị iduzi ndụ m, olee otú m pụrụ isi kwadebe nke ọma maka oké ihe isi ike na nsogbu? N’ihi gịnị ka m ji kwesị ịdị na-eche banyere nke a ugbu a?—Luk 6:46-49.

Ozizi ndị ọzọ m pụrụ ịtụle:

13. 8:2, 3 Olee otú m pụrụ isi gosipụta ọmịiko n’ebe ndị ụwa na-atụ n’ọnụ nọ, dị ka Jisọs mere mgbe mgbe?

14. 9:9-38 Òkè dị aṅaa ka igosipụta obi ebere na-ekere ná ndụ m, oleekwa otú m pụrụ isi na-egosipụta ya karị?

15. 12:19 N’ịmụta ihe site n’amụma a e buru banyere Jisọs, àna m agbalịsi ike izere arụmụka ndị na-akpata nkewa?

16. 12:20, 21 Olee ihe ọma m pụrụ ime site n’ịghara iji okwu ọnụ m ma ọ bụ omume m na-akụda ndị ọzọ mmụọ?

17. 12:34-37 Gịnị ka m na-ekwukarị banyere ya? Amaara m na mgbe m pịrị oroma, mmiri oroma na-apụta, n’ihi ya, gịnị mere m ji kwesị ichebara ihe dị n’ime m, n’obi m, echiche?—Mak 7:20-23.

18. 15:4-6 Site n’okwu Jisọs, gịnị ka m chọpụtara banyere iji ịhụnanya elekọta ndị agadi?

19. 19:13-15 Gịnị ka ọ dị m mkpa iwepụta oge ime?

20. 20:25-28 Gịnị mere o ji bụrụ ihe na-abaghị uru iji ike na-eme ihe iji nweta ikike? Olee otú m pụrụ isi ṅomie Jisọs n’akụkụ a?

Echiche ndị ọzọ, bụ́ ndị Mak dekọrọ:

21. 4:24, 25 Gịnị ka otú m si emeso ndị ọzọ ihe na-egosi?

22. 9:50 Ọ bụrụ na ihe m na-ekwu ma na-eme dị mma, olee ezi ihe ga-esi na ya pụta ma eleghị anya?

N’ikpeazụ, ozizi ole na ole Luk dekọrọ:

23. 8:11, 14 Ọ bụrụ na mụ ekwe ka nchegbu, akụ̀ na ụba, na ihe ụtọ na-achịkwa ndụ m, gịnị pụrụ isi na ya pụta?

24. 9:1-6 Ọ bụ ezie na Jisọs nwere ike nke ịgwọ ndị ọrịa, gịnị ka o butere ụzọ?

25. 9:52-56 Àna m ewe iwe ọsọ ọsọ? Àna m ezere mmụọ nke mmegwara?

26. 9:62 Olee otú m kwesịrị isi na-ele ibu ọrụ m nke ikwusa Alaeze Chineke anya?

27. 10:29-37 Olee otú m pụrụ isi gosipụta na abụ m onye agbata obi, ọ bụghị onye ọbịa?

28. 11:33-36 Mgbanwe ndị dị aṅaa ka m pụrụ ime ka ndụ m wee nwee ike ịdịkwu mfe?

29. 12:15 Olee njikọ dị n’etiti ndụ na ihe onwunwe?

30. 14:28-30 Ọ bụrụ na mụ ewepụta oge iji tụlee mkpebi nke ọma, gịnị ka m pụrụ izere, uru dịkwa aṅaa ka ọ ga-abara m?

31. 16:10-12 Olee uru ndị m pụrụ irite site ná ndụ iguzosi ike n’ezi ihe?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ọrụ na-azọpụta ndụ nke a na-arụ n’okpuru yoke Jisọs bụ ihe na-enye izu ike