Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Yikwasịnụ Ogologo Ntachi Obi’

‘Yikwasịnụ Ogologo Ntachi Obi’

 ‘Yikwasịnụ Ogologo Ntachi Obi’

“Yikwasịnụ obi ebere, . . . ogologo ntachi obi.”—NDỊ KỌLỌSI 3:12.

1. Kọọ otu ezi ihe nlereanya nke ogologo ntachi obi.

RÉGIS, bụ́ onye bi n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ France, ghọrọ Onyeàmà Jehova e mere baptism na 1952. Ruo ọtụtụ afọ, nwunye ya mere ihe nile ọ pụrụ ime iji gbochie mgbalị ọ na-eme ijere Jehova ozi. Ọ gbalịrị ịmapusị taya ụgbọala ya iji gbochie ya ịga nzukọ, n’otu oge kwa, o sooro ya ọbụna ka ọ na-ezisa ozi Bible site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, na-eme ya akaje ka ọ na-agwa ndị nwe ụlọ banyere ozi ọma nke Alaeze ahụ. N’agbanyeghị mmegide a Régis na-enweta n’esepụghị aka, ọ nọgidere na-enwe ogologo ntachi obi. N’ụzọ dị otú a, Régis bụụrụ ndị Kraịst nile ezi ihe nlereanya, ebe ọ bụ  na Jehova chọrọ ka ndị nile na-efe ya ofufe na-enwe ogologo ntachi obi ná mmekọrịta nke ha na ndị ọzọ.

2. Gịnị ka okwu Grik e ji eme ihe maka “ogologo ntachi obi” pụtara n’ụzọ nkịtị, gịnịkwa ka okwu ahụ na-egosi?

2 Okwu Grik e ji eme ihe maka ogologo ntachi obi” pụtara n’ụzọ nkịtị “ịdị ogologo nke mmụọ.” New World Translation nke Bekee sụgharịrị okwu a ugboro iri ịbụ “ogologo ntachi obi,” sụgharịa ya ugboro atọ ịbụ “ndidi,” na otu ugbo ịbụ “inwe ndidi.” Ma okwu Hibru ma nke Grik a sụgharịrị ịbụ “ogologo ntachi obi” na-agụnye echiche nke ndidi, ntachi obi, na eweghị iwe ọsọ ọsọ.

3. N’ụzọ dị aṅaa ka otú ndị Kraịst si ele ogologo ntachi obi anya si dị iche n’otú ndị Gris nke narị afọ mbụ si ele ya anya?

3 Ndị Gris nke narị afọ mbụ eleghị ogologo ntachi obi anya dị ka omume ọma. Ọ dịghị mgbe ndị ọkà ihe ọmụma Stoic ji okwu ahụ n’onwe ya mee ihe. Dị ka ọkà mmụta Bible bụ́ William Barclay si kwuo, ogologo ntachi obi “dị nnọọ iche n’omume ọma n’asụsụ Grik,” nke otu n’ime isi ihe ndị ọ pụtara bụ “ịghara idi mkparị ma ọ bụ mkpasu iwe ọ bụla.” Ọ na-ekwu, sị: “Nye ndị Gris, dimkpa bụ nwoke nke na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji megwara ihe e mere ya. Nye ndị Kraịst, dimkpa bụ nwoke nke na-ajụ ime otú ahụ ọbụna mgbe ọ pụrụ ime ya.” Ndị Gris pụrụ iwerewo ogologo ntachi obi dị ka ihe àmà nke adịghị ike, ma n’ebe a, dị ka n’ebe ndị ọzọ, “ihe nzuzu nke Chineke karịrị mmadụ nile n’amamihe; adịghị ike nke Chineke [karịkwara] mmadụ nile n’ike.”—1 Ndị Kọrint 1:25.

Ihe Nlereanya Kraịst nke Ogologo Ntachi Obi

4, 5. Ihe nlereanya dị aṅaa magburu onwe ya nke ogologo ntachi obi ka Jisọs setịpụrụ?

4 Kraịst Jisọs setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke ogologo ntachi obi, bụ́ nke nanị ya na-esote nke Jehova. Mgbe Jisọs nọ n’oké nrụgide, o gosipụtara njide onwe onye dị ịtụnanya. E buru amụma banyere ya, sị: “A chịrị ya n’ihe ike, ma ya onwe ya wedara onwe ya n’ala, wee ghara ịsaghe ọnụ ya; dị ka atụrụ nke a na-akpụrụ ije n’ogbugbu ya, na dị ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị; ee, ọ dịghị asaghe ọnụ ya.”—Aịsaịa 53:7.

5 Lee ogologo ntachi obi dị ịrịba ama Jisọs gosipụtara n’oge nile o jere ozi n’elu ala! O diri ajụjụ aghụghọ nke ndị iro ya na mkparị nke ndị na-emegide ya. (Matiu 22:15-46; 1 Pita 2:23) O nwere ndidi n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ọbụna mgbe ha nọgidere na-ese okwu banyere onye kasị ukwuu. (Mak 9:33-37; 10:35-45; Luk 22:24-27) Leekwa njide onwe onye magburu onwe ya Jisọs gosipụtara n’abalị ahụ a raara ya nye mgbe Pita na Jọn nọ na-ehi ụra ka a gwasịrị ha ka ha ‘na-eche nche’!—Matiu 26:36-41.

6. Olee otú Pọl si rite uru site n’ogologo ntachi obi nke Jisọs, gịnịkwa ka anyị na-amụta na nke a?

6 Mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, ọ nọgidere na-enwe ogologo ntachi obi. Pọl maara nke a karịsịa, ebe ọ bụ na ọ bụbu onye na-akpagbu ndị Kraịst. Pọl dere, sị: “Okwu a kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịkwa ka a nara ya nke ọma n’ụzọ nile ọ bụla, na Kraịst Jisọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie; ndị mụ onwe m bụ onyeisi ha: otú ọ dị, ọ bụ n’ihi nke a ka e meere m ebere, ka o wee bụrụ n’ime mụ onwe m, bụ́ onyeisi, ka Jisọs Kraịst ga-egosi ogologo ntachi obi Ya nile, ka m bụrụ ihe ilereanya n’etiti ndị gaje ikwere na Ya ka ha nata ndụ ebighị ebi.” (1 Timoti 1:15, 16) N’agbanyeghị ihe anyị mere n’oge gara aga, ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’ebe Jisọs nọ, ọ ga-enwe ogologo ntachi obi n’ebe anyị nọ—ọ bụrịị ezie na ọ ga na-atụ anya ka anyị na-arụpụta “ọrụ kwesịrị nchegharị.” (Ọrụ 26:20; Ndị Rom 2:4) Ozi ndị ahụ Kraịst zigaara ọgbakọ asaa ahụ dị n’Asia Minor na-egosi na ọ bụ ezie na ọ na-enwe ogologo ntachi obi, ọ na-atụ anya ka a na-enwe ọganihu.—Mkpughe isi 2 na nke 3.

Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ

7. Gịnị bụ njikọ dị n’etiti ogologo ntachi obi na mmụọ nsọ?

7 N’isi nke 5 nke akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Galetia, o gosiri ọdịiche dị n’etiti ọrụ nile nke anụ ahụ na mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Ndị Galetia 5:19-23) Ebe ọ bụ na ogologo ntachi obi bụ otu n’ime àgwà Chineke, àgwà a malitere n’aka  ya, ọ bụkwa mkpụrụ nke mmụọ ya. (Ọpụpụ 34:6, 7) N’ezie, ogologo ntachi obi bụ nke anọ ná nkọwa Pọl nke mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ya na “ịhụnanya, ọṅụ, udo, . . . obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” (Ndị Galetia 5:22, 23) N’ihi ya, mgbe ndị ohu Chineke gosipụtara ndidi, ma ọ bụ ogologo ntachi obi yiri nke ya, ọ bụ mmụọ nsọ na-akwali ha.

8. Gịnị ga-enyere anyị aka ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ, gụnyere ogologo ntachi obi?

8 Otú ọ dị, nke a apụtaghị na Jehova na-enye mmadụ mmụọ ya ná mmanye. Anyị aghaghị iji obi anyị kwere ka ọ na-akwali anyị. (2 Ndị Kọrint 3:17; Ndị Efesọs 4:30) Anyị na-ekwe ka mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ná ndụ anyị site n’ịzụlite mkpụrụ ya n’ihe ọ bụla anyị na-eme. Mgbe Pọl depụtasịrị ọrụ nile nke anụ ahụ na mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ọ gbakwụnyere, sị: “Ọ bụrụ na anyị dị ndụ site ná Mmụọ Nsọ, ka anyị na-agazikwa site ná Mmụọ Nsọ. Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi; ma onye na-agha mkpụrụ nye Mmụọ Nsọ ga-esite ná Mmụọ Nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.” (Ndị Galetia 5:25; 6:7, 8) Ka anyị wee nwee ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ogologo ntachi obi, anyị aghaghịkwa ịzụlite mkpụrụ ndị ọzọ bụ́ ndị mmụọ nsọ na-amịpụta n’ime ndị Kraịst.

“Ịhụnanya Nwere Ogologo Ntachi Obi”

9. Gịnị ma eleghị anya mere Pọl ji gwa ndị Kọrint na “ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi”?

9 Pọl gosipụtara na e nwere njikọ pụrụ iche n’etiti ịhụnanya na ogologo ntachi obi mgbe ọ sịrị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi.” (1 Ndị Kọrint 13:4) Otu ọkà mmụta Bible, bụ́ Albert Barnes, na-atụ aro na Pọl mesiri nke a ike n’ihi nkewa na esemokwu dị n’ọgbakọ ndị Kraịst dị na Kọrint. (1 Ndị Kọrint 1:11, 12) Barnes na-ekwu, sị: “Okwu e ji mee ihe n’ebe a [maka ogologo ntachi obi] na-emegide ime ihe ọkụ ọkụ: ọ na-emegidekwa ọnụma na ibu iwe n’obi, nakwa inwe ahụ mgbakasị. Ọ pụtara ọnọdụ obi nke pụrụ ime ka mmadụ DIE IHE RUO OGOLOGO OGE mgbe e megburu ya ma ọ bụ kpasuo ya iwe.” Ịhụnanya na ogologo ntachi obi na-atụnyekwa ụtụ dị ukwuu n’udo nke ọgbakọ ndị Kraịst.

10. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ịhụnanya si enyere anyị aka inwe ogologo ntachi obi, ndụmọdụ dịkwa aṅaa ka Pọl onyeozi nyere banyere nke a? (b) Gịnị ka otu ọkà mmụta Bible kwuru banyere ogologo ntachi obi na obiọma Chineke? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

10 “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi, o nwekwara obiọma; ịhụnanya adịghị . . . achọ ihe nke aka ya, oké iwe adịghị ewe ya.” Ya mere, n’ọtụtụ ụzọ, ịhụnanya na-enyere anyị aka inwe ogologo ntachi obi. * (1 Ndị Kọrint  13:4, 5) Ịhụnanya na-enyere anyị aka iji ndidi na-anagiderịta ibe anyị ma na-echeta na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè ma nwee emezighị emezi na mmejọ. Ọ na-enyere anyị aka ịdị na-echebara ndị ọzọ echiche ma na-agbaghara ha. Pọl onyeozi na-agba anyị ume ijegharị “n’obi dị umeala na ịdị nwayọọ nile, n’ogologo ntachi obi, na-anagiderịta ibe [anyị] n’ime ịhụnanya; na-anụ ọkụ n’obi idebe ịdị n’otu nke Mmụọ Nsọ n’ime ihe okiké nke bụ́ udo.”—Ndị Efesọs 4:1-3.

11. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa karịsịa inwe ogologo ntachi obi n’etiti ìgwè ndị Kraịst?

11 Ogologo ntachi obi nke ndị so n’ìgwè ndị Kraịst na-enwe na-atụnye ụtụ n’udo na obi ụtọ nke ìgwè ahụ, ma ọ̀ bụ n’ọgbakọ, n’ebe obibi Betel, n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, n’etiti ìgwè ndị na-ewu ihe owuwu, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi ndịrịta iche ndị e nwere n’àgwà, mmasị, nzụlite, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ọbụna n’ịdị ọcha, ọnọdụ ndị tara akpụ pụrụ ibilite site n’oge ruo n’oge. Otú a ka ọ dịkwa n’ezinụlọ dị iche iche. Ịbụ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị oké mkpa. (Ilu 14:29; 15:18; 19:11) Ogologo ntachi obi—iji ndidi na-atachi obi, na-enwe olileanya na ihe ga-aka mma—dị mkpa ka anyị nile nwee ya.—Ndị Rom 15:1-6.

Ogologo Ntachi Obi Na-enyere Anyị Aka Inwe Ndidi

12. N’ihi gịnị ka ogologo ntachi obi ji dị mkpa mgbe e nwere ọnọdụ ndị tara akpụ?

12 Ogologo ntachi obi na-enyere anyị aka idi ọnọdụ ndị tara akpụ bụ́ ndị yiri ka ha agaghị akwụsị akwụsị ma ọ bụ ndị yiri ka a gaghị agwọtali ha ozugbo. Otú a ka ọ dị Régis, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite. Ruo ọtụtụ afọ, nwunye ya megidere mgbalị ndị o mere iji jeere Jehova ozi. Otú ọ dị, otu ụbọchị, o bu anya mmiri bịakwute ya ma kwuo, sị: “Ama m na ọ bụ eziokwu ahụ. Nyere m aka. Achọrọ m ka a mụwara m Bible.” E mesịrị mee ya baptism dị ka Onyeàmà. Régis na-ekwu, sị: “Nke a gosiri na Jehova gọziri afọ ndị ahụ m nọ na-agba mbọ, na-enwe ndidi, ma na-atachi obi.” A kwụghachiri ogologo ntachi obi ya ụgwọ.

13. Gịnị nyeere Pọl aka inwe ndidi, oleekwa otú ihe nlereanya anya ya pụrụ isi nyere anyị aka inwe ndidi?

13 Laa azụ na narị afọ mbụ O.A., Pọl onyeozi bụ ezi ihe nlereanya nke inwe ogologo ntachi obi. (2 Ndị Kọrint 6:3-10; 1 Timoti 1:16) Ka Pọl na-eru n’ọgwụgwụ nke ndụ ya, mgbe ọ na-enye onye ọrụ ibe ya ọ tọrọ bụ́ Timoti ndụmọdụ, ọ dọrọ ya aka ná ntị na ndị Kraịst nile ga-eche ọnwụnwa dị iche iche ihu. Pọl zoro aka n’ihe nlereanya nke onwe ya ma tụọ aro àgwà ndị bụ́ isi nke ndị Kraịst bụ́ ndị dị mkpa maka ntachi obi. O dere, sị: “Gị onwe gị sooro ozizi m, omume m, ihe m zubere, okwukwe m, ogologo ntachi obi m, ịhụnanya m, ntachi obi m, nsogbu m nile, ahụhụ m nile; aha ihe dakwasịrị m n’Antiọk, n’Aịkoniọm, na Listra; aha nsogbu m nagidere: Onyenwe anyị dọpụtakwara m n’ime ha nile. Ee, a ga-esogbukwa ndị nile ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke n’ime Kraịst Jisọs.” (2 Timoti 3:10-12; Ọrụ 13:49-51; 14:19-22) Iji na-enwe ndidi, okwukwe, ịhụnanya, na ogologo ntachi obi dị anyị nile mkpa.

 Ndị Yikwasịrị Ogologo Ntachi Obi

14. Gịnị ka Pọl ji tụnyere àgwà nsọpụrụ Chineke ndị dị ka ogologo ntachi obi, ndụmọdụ dịkwa aṅaa ka o nyere ndị Kraịst nọ na Kọlọsi?

14 Pọl onyeozi ji ogologo ntachi obi na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ tụnyere uwe nke onye Kraịst kwesịrị iyikwasị mgbe ọ hapụsịworo omume ndị e ji amata “mmadụ ochie.” (Ndị Kọlọsi 3:5-10) O dere, sị: “Dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ ndị a hụwokwara n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obiọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi; na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a: ma n’elu ihe ndị a nile yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ́ ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:12-14.

15. Gịnị na-esi na ya apụta mgbe ndị Kraịst ‘yikwasịrị’ ogologo ntachi obi na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ?

15 Mgbe ndị nọ n’ọgbakọ ‘yikwasịrị’ obi ebere, obiọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi, na ịhụnanya, ha na-enwe ike idozi nsogbu ma gaa n’ihu n’ijere Jehova ozi n’ịdị n’otu. Ọ dị ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta mkpa karịsịa inwe ogologo ntachi obi. A pụrụ inwe mgbe ọ ga-adị mkpa ka ha tụọ onye Kraịst ọzọ mmehie ya n’anya, ma e nwere ụzọ dị iche iche e si eme nke a. Pọl kọwara àgwà kasị mma inwe mgbe o degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, baa mba, rịọ arịrịọ, n’ogologo ntachi obi nile na ozizi nile.” (2 Timoti 4:2 ) Ee, e kwesịrị iji ogologo ntachi obi, nkwanye ùgwù, na ịdị nro na-emeso atụrụ Jehova ihe mgbe nile.Matiu 7:12; 11:28; Ọrụ 20:28, 29; Ndị Rom 12:10.

“Ogologo Ntachi Obi n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”

16. Gịnị pụrụ isi na ya pụta mgbe anyị nwere “ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ”?

16 Ogologo ntachi obi Jehova nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ na-eme ka anyị nwee ibu ọrụ omume nke ‘inwe ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Nke a pụtara ịdị na-enwe ndidi n’ebe ndị òtù ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà, ndị agbata obi anyị, ndị ọrụ ibe anyị, na ụmụ klas anyị, nọ. Ndịàmà bụ́ ndị na-anagide okwu mkparị ma ọ bụ mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ, mgbe ụfọdụ ruo ọtụtụ afọ, site n’aka ndị ha na ha na-emekọ ihe n’ebe ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, emeriwo ọtụtụ ajọ mbunobi. (Ndị Kọlọsi 4:5, 6) Pita onyeozi dere, sị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 2:12.

17. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ịhụnanya na ogologo ntachi obi Jehova, gịnịkwa mere anyị ji kwesị ime otú ahụ?

17 Ogologo ntachi obi Jehova ga-apụtara ọtụtụ nde mmadụ nzọpụta. (2 Pita 3:9, 15) Ọ bụrụ na anyị eṅomie ịhụnanya na ogologo ntachi obi Jehova, anyị ga-eji ndidi nọgide na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke ma na-akụziri ndị ọzọ ido onwe ha n’okpuru ịchịisi Alaeze Kraịst.  (Matiu 28:18-20; Mak 13:10) Ọ bụrụ na anyị akwụsị ime nkwusa, ọ ga-adị ka anyị chọrọ ịkpara ogologo ntachi obi Jehova ókè ma ghara ịghọta nzube ya, nke bụ́ ime ka ndị mmadụ chegharịa.—Ndị Rom 2:4.

18. Gịnị bụ ekpere Pọl maka ndị Kọlọsi?

18 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Kọlọsi, Asia Minor, o dere, sị: “Nke ahụkwa mere na anyị, site n’ụbọchị anyị nụrụ banyere ya, akwụsịbeghị ikpe ekpere maka unu na ịrịọ ka unu jupụta n’ezi ihe ọmụma nke uche ya n’amamihe nile na nghọta ime mmụọ, ka unu wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu, ka unu na-anọgide na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla ma na-aba ụba n’ezi ihe ọmụma nke Chineke, n’ịbụ ndị e ji ike nile na-eme ka ha dị ike ruo n’ókè nke ike ya dị ebube, iji wee tachie obi n’ụzọ zuru ezu ma jiri ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 1:9-11, NW.

19, 20. (a) Olee otú anyị pụrụ isi zere ịdị na-ele ogologo ntachi obi Jehova nọgidere na-enwe anya dị ka ule? (b) Abamuru ndị dị aṅaa ga-esi n’anyị inwe ogologo ntachi obi pụta?

19 Ogologo ntachi obi, ma ọ bụ ndidi Jehova nọgidere na-enwe, agaghị abụrụ anyị ule ma ọ bụrụ na anyị ‘ejupụta ná mmazu nke ihe Ọ na-achọ,’ nke bụ́ ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Anyị ga “na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla,” karịsịa n’ọrụ nke ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe.” (Matiu 24:14) Ọ bụrụ na anyị ejiri ikwesị ntụkwasị obi nọgide na-eme nke a, Jehova ga-eme ka anyị “dị ike n’ime ike nile,” na-eme ka anyị nwee ike ‘iru ntachi obi na ogologo ntachi obi nile, ya na ọṅụ.’ Mgbe anyị na-eme otú ahụ, anyị ga ‘na-ejegharị n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị,’ anyị ga-enwekwa udo nke na-abịa site n’ịmara na anyị ‘na-eme otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile.’

20 Ka anyị kwenye n’ụzọ zuru ezu na amamihe dị n’ogologo ntachi obi Jehova. Ọ bụ maka nzọpụta anyị nakwa maka nzọpụta nke ndị na-ege ntị ná nkwusa na izi ihe anyị. (1 Timoti 4:16) Ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ—ịhụnanya, obiọma, ịdị mma, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè—ga-enyere anyị aka iji ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi. Anyị ga-enwe ike karị iso ndị òtù ezinụlọ anyị tinyekwara ụmụnna anyị nwoke na ụmụnna anyị nwanyị nọ n’ọgbakọ na-adị n’udo. Ogologo ntachi obi ga-enyekwara anyị aka inwe ndidi n’ebe ndị ọrụ ibe anyị na ụmụ akwụkwọ ibe anyị nọ. Ogologo ntachi obi anyị ga-enwekwa nzube, nke bụ́ ịzọpụta ndị na-eme ihe ọjọọ na ibuli Chineke nke ogologo ntachi obi, bụ́ Jehova, elu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 N’ikwu banyere okwu Pọl kwuru na “ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi, o nwekwara obiọma,” ọkà mmụta Bible bụ́ Gordon D. Fee na-ede, sị: “Na nkà mmụta okpukpe nke Pọl kụziri, ha [ogologo ntachi obi na obiọma] na-anọchi anya akụkụ abụọ nke otú Chineke si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe (cf. Rom 2:4). N’otu akụkụ, Chineke gosipụtara ntachi obi o ji ịhụnanya na-enwe site n’ijichi ọnụma ya n’ebe ụmụ mmadụ na-enupụ isi nọ; n’aka nke ọzọ, a na-ahụ obiọma ya n’ọtụtụ puku ugboro o gosipụtara ebere ya. N’ụzọ dị otú a, nkọwa Pọl nke ịhụnanya ji nkọwa a gbara mkpị nke Chineke malite, bụ́ onye sitere n’aka Kraịst gosi onwe ya ịbụ onye nwere ntachi obi na obiọma n’ebe ndị kwesịrị inweta ikpe ọmụma Chineke nọ.”

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Kraịst si bụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya nke ogologo ntachi obi?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ịzụlite ogologo ntachi obi?

• Olee otú ogologo ntachi obi si enyere ezinụlọ, ìgwè ndị Kraịst, na ndị okenye aka?

• Olee otú inwe ogologo ntachi obi ga-esi abara anyị na ndị ọzọ uru?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọbụna mgbe Jisọs nọ n’oké nrụgide, o nwere ndidi n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ

[Foto dị na peeji nke 16]

A na-agba ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta ume ịdị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya nke ogologo ntachi obi n’otú ha si emeso ụmụnna ha ihe

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọ bụrụ na anyị eṅomie ịhụnanya na ogologo ntachi obi Jehova, anyị ga-anọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ

[Foto dị na peeji nke 18]

Pọl kpere ekpere ka ndị Kraịst ‘jiri ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi’