Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nweta Obi nke Dị Ka Jehova Si Chọọ

Nweta Obi nke Dị Ka Jehova Si Chọọ

 Nweta Obi nke Dị Ka Jehova Si Chọọ

“Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.”—ABỤ ỌMA 51:10.

1, 2. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe mmasị n’obi anyị?

OTORO ogologo ma maa mma nwoke. Ozugbo Samuel onye amụma hụrụ ya, ọ masịrị ya nke ukwuu nke na o kwubiri na diọkpara Jesi a bụ onye Chineke họpụtaworo ịbụ eze ga-anọchi Sọl. Ma Jehova kwupụtara, sị: “Elegidela ihu [nwa nwoke ahụ] anya, elegidekwala ogologo nke ịdị elu ya; n’ihi na ajụwo m ya: . . . mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” Jehova mesịrị họrọ nwa Jesi nke a tọchara, bụ́ Devid—“nwoke dị ka obi Ya si chọọ.”—1 Samuel 13:14; 16:7.

2 Chineke pụrụ ịma ihe mmadụ bu n’obi, dị ka o mesịrị mee ka o doo anya, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, na-enyocha obi, na-anwa akụrụ, ọbụna inye onye ọ bụla dị ka ụzọ ya nile si dị, dị ka mkpụrụ nke omume ya nile si dị.” (Jeremaịa 17:10) Ee, “Onye [na-enyocha] obi bụ Jehova.” (Ilu 17:3) Otú ọ dị, gịnị bụ obi dị n’ime mmadụ nke Jehova na-enyocha? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ime iji nweta obi nke dị ka o si chọọ?

“Mmadụ Zoro Ezo nke Obi”

3, 4. N’echiche dị aṅaa ka a na-eji okwu ahụ bụ́ “obi” eme ihe n’ụzọ bụ́ isi n’ime Bible? Nye ihe atụ.

3 Okwu ahụ bụ́ “obi” pụtara ihe dị ka otu puku ugboro n’Akwụkwọ Nsọ. N’ọnọdụ ka ukwuu, a na-eji ya eme ihe n’ụzọ ihe atụ. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara onye amụma bụ́ Mosis, sị: “Gwa ụmụ Israel ka ha wetara m àjà mbuli: n’aka nwoke ọ bụla nke obi ya na-eme ya ka o nwee afọ ofufo ka unu ga-anara àjà mbuli m.” Ndị ahụ na-enye onyinye afọ ofufo wee “bịa, onye ọ bụla nke obi ya kwaliri ya.” (Ọpụpụ 25:2; 35:21) N’ụzọ doro anya, otu akụkụ nke obi ihe atụ bụ nkwali—ikike dị n’ime nke na-agba anyị ume ime ihe. Obi ihe atụ anyị na-egosipụtakwa mmetụta nkịtị na mmetụta uche anyị, ọchịchọ na mmasị anyị. Obi pụrụ  ịbụ nke iwe ma ọ bụ ụjọ ji, nke na-eru újú ma ọ bụ na-aṅụrị ọṅụ. (Abụ Ọma 27:3; 39:3; Jọn 16:22; Ndị Rom 9:2) Ọ pụrụ ịdị mpako ma ọ bụ obi umeala, ịbụ nke na-ahụ n’anya ma ọ bụ nke na-akpọ asị.—Ilu 16:5; Matiu 11:29; 1 Pita 1:22.

4 N’ihi ya, “obi” bụ nke a na-ejikọtakarị ya na nkwali na mmetụta uche, ebe “uche” metụtara kpọmkwem ọgụgụ isi. Otú a ka e kwesịrị isi na-aghọta okwu ndị a mgbe ha nọkọtara ọnụ n’Akwụkwọ Nsọ. (Matiu 22:37; Ndị Filipaị 4:7) Ma, obi na uche nwere njikọ. Dị ka ihe atụ, Mosis gbara ụmụ Israel ume, sị: “Chetakwara obi gị [ma ọ bụ, ‘ị ghaghị ichetara uche gị,’ ihe odide ala ala peeji nke NW], na Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke.” (Deuterọnọmi 4:39) Jisọs gwara ndị odeakwụkwọ na-akpa nkata megide ya, sị: “Gịnị mere unu na-eche ajọ ihe n’obi unu?” (Matiu 9:4) Obi bụkwa nke a pụrụ ijikọta ya na ‘nghọta,’ “ihe ọmụma,” na ‘ịtụgharị ihe n’obi.’ (1 Ndị Eze 3:12; Ilu 15:14; Mak 2:6) Ya mere, obi ihe atụ pụkwara ịgụnye ọgụgụ isi anyị—echiche anyị ma ọ bụ nghọta anyị.

5. Gịnị ka obi ihe atụ na-anọchi anya ya?

5 Dị ka otu akwụkwọ ntụaka si kwuo, obi ihe atụ na-anọchi anya “akụkụ bụ́ isi n’ozuzu ya, ime ahụ, n’ihi ya kwa, ọ pụtara mmadụ ime dị ka o si egosipụta onwe ya n’ihe omume ya nile dị iche iche, n’ọchịchọ, mmetụta ịhụnanya, mmetụta uche, oké agụụ, nzube ya, echiche, nghọta, ntụghachi uche ya, amamihe, ihe ọmụma, nkà ya, nkwenkwe ya na ihe ndị ọ na-atụgharị n’uche, ikike ncheta ya na ikike ịmata ihe ya.” Ọ na-anọchi anya ihe anyị bụ n’ezie n’ime, “mmadụ zoro ezo nke obi.” (1 Pita 3:4, NW) Ọ bụ ya ka Jehova na-ahụ ma na-enyocha. Ọ bụ ya mere Devid ji nwee ike ikpe ekpere, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke;  meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.” (Abụ Ọma 51:10) Ànyị pụrụ isi aṅaa nweta obi dị ọcha?

“Tụkwasị Obi Unu” n’Okwu Chineke

6. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Mosis nyere ụmụ Israel ka ha mara ụlọikwuu ha n’Ọzara Moab?

6 Mgbe Mosis na-adụ ụmụ Israel bụ́ ndị gbakọtara n’Ọzara Moab tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ ọdụ, ọ sịrị: “Tụkwasị obi unu n’okwu nile nke mụ onwe m na-agbara unu àmà taa; nke unu ga-enye ụmụ unu n’iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.” (Deuterọnọmi 32:46) Ụmụ Israel gaje “ịṅa ntị nke ọma.” (Knox) Ọ bụ nanị site n’ịmara iwu Chineke nke ọma ka ha ga-eji nwee ike ịkụnye ha n’obi ụmụ ha.—Deuterọnọmi 6:6-8.

7. Gịnị ka ‘ịtụkwasị obi anyị’ n’Okwu Chineke na-agụnye?

7 Otu isi ihe a chọrọ iji nweta obi dị ọcha bụ inweta ezi ihe ọmụma nke uche na nzube Chineke. E nwere nanị otu ebe e si enweta ihe ọmụma ahụ, Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ. (2 Timoti 3:16, 17) Otú ọ dị, nanị ihe ọmụma e bu n’isi agajeghị inyere anyị aka inweta obi nke na-atọ Jehova ụtọ. Ka ihe ọmụma wee metụta ihe anyị bụ n’ime n’ezie, anyị aghaghị ‘ịtụkwasị obi anyị’ n’ihe anyị na-amụta, ma ọ bụ ‘buru ya n’obi.’ (Deuterọnọmi 32:46, An American Translation) Olee otú e si eme nke a? Ọbụ abụ bụ́ Devid na-akọwa, sị: “Echetawo m ụbọchị nile nke mgbe ochie; atụgharịwo m uche n’omume Gị nile: n’ọrụ aka Gị abụọ ka m tụgharịworo obi.”—Abụ Ọma 143:5.

8. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụgharị uche na ha ka anyị na-amụ ihe?

8 Anyị onwe anyị kwesịkwara iji obi ekele na-atụgharị uche n’ọrụ Jehova. Mgbe anyị na-agụ Bible ma ọ bụ mbipụta ndị dabeere na Bible, ọ dị anyị mkpa ịtụgharị uche n’ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị ka nke a na-akụziri m banyere Jehova? Olee àgwà Jehova nke m hụrụ e gosipụtara ebe a? Gịnị ka ihe ndekọ a na-akụziri m banyere ihe ndị na-amasị Jehova na ihe ndị na-adịghị amasị ya? Olee ihe ndị na-esi n’ịgbaso ụzọ nke na-amasị Jehova apụta ma e jiri ya tụnyere ịgbaso nke ọ kpọrọ asị? Olee ihe jikọrọ ihe ọmụma a na ihe m dịbu mbụ mara?’

9. Ókè hà aṅaa ka ọmụmụ ihe onwe onye na ntụgharị uche baruru n’uru?

9 Lisa * dị afọ 32 na-akọwa otú o si malite iji abamuru nke ịmụ ihe na ịtụgharị uche n’ụzọ nwere nzube, kpọrọ ihe, sị: “Mgbe e mesịrị m baptism na 1994, agbasiri m nnọọ ike n’eziokwu ruo ihe dị ka afọ abụọ. Ana m agazu nzukọ nile nke ndị Kraịst, na-etinye site n’awa 30 ruo 40 kwa ọnwa n’ozi ubi, ma soro ndị Kraịst ibe m na-akpakọ. E mesịa, amalitere m ịkpafu. Abịara m laa azụ nke ukwuu nke na ọbụna emebiri m iwu Chineke. Ma amatara m onwe m ma malite ime ka ndụ m dị ọcha. Lee ka obi si dị m ụtọ na Jehova aghọtawo nchegharị m ma nabataghachi m! Mgbe mgbe, ana m eche, sị: ‘Gịnị mere m ji dapụ?’ Azịza na-agbabata m n’uche mgbe nile bụ na eleghaara m ịmụ ihe na ịtụgharị uche n’ụzọ nwere nzube anya. Eziokwu Bible erughị m nnọọ n’obi. Site ugbu a gaa n’ihu, ọmụmụ ihe onwe onye na ntụgharị uche ga-anọgide na-abụ akụkụ dị ịrịba ama nke ndụ m.” Ka anyị na-enwetakwu ihe ọmụma banyere Jehova, Ọkpara ya, na Okwu ya, lee ka o si dị oké mkpa ka anyị na-ewepụta oge iji tụgharịa uche n’ụzọ nwere nzube!

10. N’ihi gịnị ka o ji dị ngwa ka anyị na-ewepụta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye na ịtụgharị uche?

10 N’ụwa a onye ọ bụla ji ọrụ n’aka na ya, iwepụta oge maka ọmụmụ ihe na ntụgharị uche bụ ihe ịma aka n’ezie. Otú ọ dị, ndị Kraịst taa na-eguzo n’ọnụ ọnụ nke Ala Nkwa dị ebube—ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke. (2 Pita 3:13) Ihe omume ndị na-eju anya, dị ka mbibi “Babilọn Ukwu ahụ” na mwakpo “Gọg, nke ala Megọg” ga-awakpo ndị Jehova, dị nso. (Mkpughe 17:1, 2, 5, 15-17; Ezikiel 38:1-4, 14-16; 39:2) Ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu pụrụ itinye ịhụnanya anyị nwere n’ebe  Jehova nọ n’ule. Ọ dị ngwa ugbu a ka anyị zụchapụta oge kwesịrị ekwesị ma tụkwasị obi anyị n’Okwu Chineke!—Ndị Efesọs 5:15, 16.

‘Dozie Obi Gị Ịchọ Okwu Chineke’

11. Olee otú a pụrụ isi jiri obi anyị tụnyere ala?

11 A pụrụ iji obi ihe atụ tụnyere ala nke a pụrụ ịkụ mkpụrụ nke eziokwu na ya. (Matiu 13:18-23) A na-akọkarị ala nkịtị akọ iji jide n’aka na mkpụrụ a kụrụ na ya ga-eto nke ọma. N’ụzọ yiri nke ahụ, e kwesịrị idozi, ma ọ bụ ịkwadebe, obi ka o wee na-anabatakwu Okwu Chineke. Onye nchụàjà bụ́ Ezra “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya.” (Ezra 7:10) Olee otú anyị pụrụ isi dozie obi anyị?

12. Gịnị ga-enye aka idozi obi maka ọmụmụ ihe?

12 Ụzọ magburu onwe ya isi dozie obi anyị mgbe anyị na-achọ Okwu Chineke bụ ikpe ekpere sitere n’ala ala obi. A na-eji ekpere emeghe ma na-emechi nzukọ ndị Kraịst nke ndị na-efe ezi ofufe. Lee ka o si kwesị ekwesị ka anyị jiri ekpere sitere n’obi na-amalite nke ọ bụla n’ime ọmụmụ Bible onwe onye anyị, mgbe ahụ kwa, nọgide na-enwe àgwà itinye uche n’ihe n’oge ahụ anyị na-amụ ihe!

13. Iji nweta obi nke dị ka Jehova si chọọ, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?

13 A ghaghị idozi obi ihe atụ iji wepụ echiche ndị a dị mbụ nwee. Ndị ndú okpukpe nke oge Jisọs adịghị njikere ime nke a. (Matiu 13:15) N’aka nke ọzọ, nne Jisọs, bụ́ Meri, ruru ná nkwubi okwu “n’obi ya” na-adabere n’eziokwu ndị ọ nụrụla. (Luk 2:19, 51) Ọ ghọrọ onye ji ikwesị ntụkwasị obi soo ụzọ Jisọs. Lidia nke Tayataịra gere Pọl ntị, “Onyenwe anyị wee meghee obi ya, ịṅa ntị.” Ya onwe ya ghọkwara onye kwere ekwe. (Ọrụ 16:14, 15) Ka anyị ghara ma ọlị iji ịkpọ ekwo nkụ na-ejigide echiche nke aka anyị ma ọ bụ nkwenkwe ndị anyị ji kpọrọ ihe. Kama nke ahụ, ka anyị dị njikere ime “ka ọ pụta ìhè na Chineke bụ Onye eziokwu, ma mmadụ nile n’otu n’otu bụ ndị ụgha.”—Ndị Rom 3:4.

14. Ànyị pụrụ isi aṅaa dozie obi anyị ige ntị ná nzukọ ndị Kraịst?

14 Ọ dị mkpa, karịsịa, idozi obi iji gee ntị ná nzukọ ndị Kraịst. Ihe ndọpụ uche pụrụ ime ka uche anyị ghara ịdị n’ihe a na-ekwu. Ihe e kwuru pụrụ inwe mmetụta dị nta n’ahụ anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eche banyere ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ ma ọ bụ banyere ihe anyị ga-eme echi ya. Ọ dị anyị mkpa ikpebisi ike ige ntị na ịmụta ihe ma ọ bụrụ na anyị gaje irite uru site n’ihe a na-ekwu. Lee uru ndị anyị pụrụ irite ma ọ bụrụ na anyị ekpebisie ike ịghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-agụpụta nke ọma ma na-eme ka a mata isi ha!—Nehemaịa 8:5-8, 12.

15. Olee otú obi umeala si enyere anyị aka ịbụ ndị a pụrụ izi ihe karị?

15 Dị nnọọ ka itinye ihe ndị kwesịrị ekwesị n’ala pụrụ isi mee ka ọdịdị ya ka mma, n’ụzọ dị otú ahụ, anyị ịzụlite obi umeala, agụụ maka ihe ime mmụọ, ntụkwasị obi, egwu Chineke, na ịhụnanya n’ebe Chineke nọ pụrụ ime ka obi ihe atụ anyị ka mma. Obi umeala na-eme ka obi dị nro, na-enyere anyị aka ịghọ ndị a pụrụ izi ihe karị. Jehova gwara Eze Josaịa nke Juda, sị: “N’ihi na obi gị dị nro, i wee huru ala n’ihu Jehova, mgbe ị nụrụ ihe M kwuru . . . , kwaa ákwá n’ihu m; Mụ onwe m anụwokwa.” (2 Ndị Eze 22:19) Obi Josaịa bụ nke dị umeala ma na-anabata ihe. Obi umeala mere ka ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ́ “ndị na-amaghị ihe na ndị na-amụtaghị akwụkwọ hie nne” ghọta ma tinye n’ọrụ, eziokwu ime mmụọ nke “ndị amamihe na ndị nwere nghọta” na-aghọtalighị. (Ọrụ 4:13; Luk 10:21) Ka anyị ‘wedaa onwe anyị n’ala n’ihu Chineke anyị’ ka anyị na-agbalị inweta obi nke dị ka Jehova si chọọ.—Ezra 8:21.

16. N’ihi gịnị ka mgbalị ji dị mkpa iji zụlite agụụ maka nri ime mmụọ?

16 Jisọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3, NW) Ọ bụ ezie na e nyere anyị ikike nke iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, nrụgide ndị sitere n’ajọ ụwa a ma ọ bụ àgwà ndị dị ka umengwụ pụrụ ime ka anyị ghara ịmatacha ihe ndị na-akpa anyị. (Matiu 4:4) Anyị aghaghị ịzụlite ezigbo agụụ maka nri ime mmụọ. Ọ bụrụgodị na na mbụ, ọgụgụ Bible na ọmụmụ  ihe onwe onye adịghị atọ anyị ụtọ, ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike na ya, anyị ga-ahụ na ihe ọmụma ‘ga-adị mkpụrụ obi anyị ụtọ,’ nke na anyị ga na-atụsi anya oge ọmụmụ ihe ike.—Ilu 2:10, 11.

17. (a) Gịnị mere Jehova ji ruo eruo ịbụ onye anyị ga-atụkwasị obi kpam kpam? (b) Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ?

17 “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị,” ka Eze Solomọn dụrụ n’ọdụ. (Ilu 3:5) Obi nke na-atụkwasị Jehova obi maara na ihe ọ bụla Ọ chọrọ ma ọ bụ nye ntụziaka ya site n’Okwu ya na-abụ ihe ziri ezi mgbe nile. (Aịsaịa 48:17) N’ezie, Jehova ruru eru ịbụ onye anyị ga-atụkwasị obi kpam kpam. O nwere ikike imezu ihe nile o zubeworo. (Aịsaịa 40:26, 29) Leenụ, aha ya pụtara n’ụzọ nkịtị “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ,” bụ́ nke na-eme ka a zụlite obi ike n’ikike ya imezu ihe o kweworo ná nkwa! Ọ bụ ‘Onye ezi omume n’ụzọ Ya nile, Ọ dịkwa ebere n’ọrụ Ya nile.’ (Abụ Ọma 145:17) N’ezie, iji zụlite ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ, ọ dị anyị mkpa ‘idetụ ire, hụ na Jehova dị mma’ site n’itinye ihe anyị na-amụta site na Bible n’ọrụ ná ndụ anyị nakwa site n’ịtụgharị uche n’ezi ihe ndị si na nke a apụta.—Abụ Ọma 34:8.

18. Olee otú egwu Chineke si enyere anyị aka ịbụ ndị na-anabata nduzi Chineke?

18 N’ịrụtụ aka n’àgwà ọzọ nke na-eme ka obi anyị na-anabata nduzi Chineke, Solomọn kwuru, sị: “Tụọ egwu Jehova, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị.” (Ilu 3:7) Jehova kwuru banyere Israel oge ochie, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na mkpụrụ obi ha dị ha otú a, ịtụ egwu m, na idebe ihe nile M nyere n’iwu ụbọchị nile, ka o wee dịrị ha mma, dịkwara ụmụ ha, ruo mgbe ebighị ebi!” (Deuterọnọmi 5:29) Ee, ndị na-atụ egwu Chineke na-erubere ya isi. Jehova nwere ikike nke “igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ” na ịta ndị na-enupụrụ ya isi ahụhụ. (2 Ihe E Mere 16:9) Ka egwu nsọpụrụ nke ime ihe na-adịghị atọ Chineke ụtọ na-achịkwa omume, echiche, na mmetụta uche nile anyị.

‘Were Obi Gị Dum Hụ Jehova n’Anya’

19. Òkè dị aṅaa ka ịhụnanya na-ekere n’ime ka obi anyị bụrụ nke na-anabata nduzi Jehova?

19 Karịa àgwà nile ọzọ, ịhụnanya na-eme n’ezie ka obi anyị na-anabata nduzi Jehova. Obi nke jupụtara n’ịhụnanya n’ebe Chineke nọ na-eme ka mmadụ na-enwe agụụ nke ịmụta ihe na-atọ Chineke ụtọ na ihe na-adịghị atọ ya ụtọ. (1 Jọn 5:3) Jisọs kwuru, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Ka anyị mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ mikwuo emi site n’ime ka ọ bụrụ àgwà anyị igosipụta ịdị mma ya, site n’ịgwa ya okwu mgbe nile dị ka ezi enyi anyị, nakwa site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ndị ọzọ banyere ya.

20. Olee otú anyị pụrụ isi nweta obi nke dị ka Jehova si chọọ?

20 Ná ntụleghachi: Inweta obi nke dị ka Jehova si chọọ na-agụnye ikwe ka Okwu Chineke na-emetụta ihe anyị bụ n’ime, mmadụ zoro ezo nke obi. Ọ bụ iwu na anyị ga na-amụ Akwụkwọ Nsọ n’onwe anyị n’ụzọ nwere nzube ma na-eji ekele atụgharị uche. Ọ na-akasị mma iji obi e doziri edozi—obi ọcha, nke jupụtara n’àgwà ndị na-eme ka anyị bụrụ ndị a pụrụ izi ihe—na-eme nke a! Ee, site n’enyemaka Jehova, a pụrụ inweta ezi obi. Otú ọ dị, olee ihe ndị anyị pụrụ ime iji chebe obi anyị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 A gbanweela aha ahụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị bụ obi ihe atụ nke Jehova na-enyocha?

• Olee otú anyị pụrụ isi ‘tụkwasị obi anyị’ n’Okwu Chineke?

• Olee otú anyị kwesịrị isi dozie obi anyị ịchọ Okwu Chineke?

• Mgbe ị tụlesịrị isiokwu a, gịnị ka ọ dị gị ka a na-akwali gị ime?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 17]

Devid ji ekele tụgharịa uche n’ihe ime mmụọ. Ị̀ na-eme otú ahụ?

[Foto dị na peeji nke 18]

Dozie obi gị tupu ị malite ịmụ Okwu Chineke