Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ Jupụtara n’Ihe Ịtụnanya n’Ozi Jehova

Ndụ Jupụtara n’Ihe Ịtụnanya n’Ozi Jehova

 Akụkọ Ndụ

Ndụ Jupụtara n’Ihe Ịtụnanya n’Ozi Jehova

DỊ KA ERIC NA HAZEL BEVERIDGE SI KỌỌ

“Ana m ama gị ikpe ịga mkpọrọ ọnwa isii.” Ka okwu ndị ahụ na-ada m ná ntị, a kpụụrụ m gaa n’Ụlọ Mkpọrọ Strangeways dị na Manchester, England. Ọ bụ na December 1950, adịkwa m afọ 19. Aka m chesịrị nnọọ otu n’ime ule ndị kasị taa akpụ m nwetara n’oge m ka na-eto eto ihu—ajụwo m ideba aha m maka ije ozi agha.—2 Ndị Kọrint 10:3-5.

ABỤ m onye ozi ọsụ ụzọ oge nile nke Ndịàmà Jehova, nke kwesịrị ịpụta na a ga-agụpụ m n’ije ozi agha, ma iwu Britain anabataghị ọnọdụ anyị. N’ihi ya, nanị m nọ n’otu ọnụ ụlọ ụlọ mkpọrọ. Echetakwara m nna m. N’ụzọ na-apụtachaghị ìhè, anọ m n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ya.

Ihe merenụ bụ na papa m, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ, bụ onye Yorkshire nke nwere nkwenkwe nakwa ụkpụrụ ndị siri ike. N’ihi ahụmahụ ndị o nwere n’ọrụ agha nakwa n’ọrụ ụlọ mkpọrọ, ọ kpọrọ okpukpe Katọlik asị nke ukwuu. O zutere Ndịàmà na nke mbụ ya laa azụ ná mmalite afọ ndị 1930 bụ́ mgbe ọ gara n’ụlọ ha igbuchapụ ha—ma jiri ụfọdụ n’ime akwụkwọ ha lọghachi! Mgbe e mesịrị, ọ tụrụ ụtụ magazin Consolation (bụ́ Teta! ugbu a). Ndịàmà na-abịa eleta ya kwa afọ iji gbaa ya ume ịtụghachi ụtụ ya. Mgbe m dị ihe dị ka afọ 15, ha na papa m nwekwara mkparịta ụka ọzọ, akwụnyekwaara m Ndịàmà. Ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere ịmụ Bible.

Mgbe m dị afọ 17, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site n’ịbụ onye e mere baptism na March 1949. Mgbe e mesịrị n’afọ ahụ, ezutere m John na Michael Charuk, bụ́ ndị ka gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead, ka ha na-aga Nigeria. Mmụọ ije ozi ala ọzọ ha masịrị m nke ukwuu. Ikekwe ha amaghị na ha kụnyere mmụọ ahụ n’obi m.

Ka m na-amụ Bible, enweghịzi m mmasị ịbanye mahadum. N’ime otu afọ m hapụrụ ụlọ iji rụọ ọrụ n’Ụlọ Ọrụ A Na-akwụ Ụgwọ Maka Ntụbata na Mbupụ Ngwa Ahịa bụ́ nke dị na London, echere m na apụghị m ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nrara m raara onwe m nye Chineke site n’ịnọgide n’ọrụ Bekee. Mgbe m kwụsịrị ịrụ n’ọfịs, otu onye ọrụ ibe m maara nke a na-akọ jara m mma maka ịhapụ “ọrụ na-egbu mmụọ.”

Tupu nke a, echere m ule ọzọ ihu—otú m ga-esi agwa nna m na achọrọ m ịkwụsị ọrụ m e ji n’aka iji ghọọ onye ozi oge nile. Otu uhuruchi ka m lara ụlọ maka ezumike, akachiri m obi gwa ya. Echeere m ka papa m gwakasịa m okwu ahụ. N’ụzọ tụrụ m n’anya, nanị ihe o kwuru bụ: “Otú i si tụọ ute gị ka ị ga-esi edina na ya. Ma, ọ bụrụ na ọ ghọ gị ahịa, agbakwutekwala m.” Ihe m deturu n’akwụkwọ ndetu ihe m maka January 1, 1950, na-asị: “Agwara m papa m maka ọrụ ịsụ ụzọ. Àgwà enyemaka ya ezi uche dị na ya tụrụ m nnọọ n’anya. Ọ dịghị ihe ọzọ m pụrụ ime karịa ibe ákwá n’ihi obiọma ya.” Agbara m arụkwaghịm n’ọrụ Bekee ahụ ma nakwere ọrụ ọsụ ụzọ oge nile.

Ọrụ E Kenyere M nke Gụnyere Ibi n’Otu “Ụlọ Nta”

Mgbe ahụ, enwetara m ule ọzọ nke nrara m raara onwe m nye Chineke. E kenyere mụ na Lloyd Griffiths, bụ́ onye Kraịst ibe m nke si Wales, ibi n’otu “ụlọ nta” na-asụ ụzọ na Lancashire. Ka m nọ na-eche echiche ma na-ese onyinyo otú ụlọ nta ahụ ga-adị, abịarutere m n’obodo Bacup na-adịghị agụ agụụ obibi nke mmiri ozuzo derela. O riri m ọnụ n’oge na-adịghị anya mgbe ụlọ nta ahụ mesịrị bụrụ ụlọ dị n’okpukpu ime ala! Òké na ọchịcha adịghị ekwe anyị hie ụra n’abalị. Ọ fọrọ nke nta ka m gbanwee obi m ma laghachi n’ebe obibi anyị. Kama nke ahụ, ekpere m ekpere n’ime obi m ma rịọ maka ume iji nagide ule a. Na mberede, ahụ bịara ruo m ala, amalitekwara m iji obi ọcha lewe ọnọdụ ahụ anya. Nke a bụ ọrụ nzukọ Jehova kenyere m. Aga m atụkwasị Jehova obi maka enyemaka. Lee ekele m na-enwe na ediri m ọnọdụ ahụ, n’ihi na ịkwụsị gaara agbanwewo ndụ m ruo mgbe ebighị ebi!—Aịsaịa 26:3, 4.

Emere m nkwusa ruo ihe dị ka ọnwa itoolu n’ihe bụ n’oge ahụ Ndagwurugwu Rossendale nke nwere ndakpọ akụ̀ na ụba, tupu a tụba m n’ụlọ mkpọrọ maka ịjụ ije agha. Mgbe m nọsịrị izu abụọ n’Ụlọ Mkpọrọ Strangeways, a kpọgara m n’Ụlọ Mkpọrọ Lewes nke dị n’ụsọ oké osimiri nke ndịda England. N’ikpeazụ, anyị bịara dị Ndịàmà ise nọkọtara ọnụ n’ebe ahụ, anyị mekwara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ.

Papa m bịara leta m otu ugboro. Nke ahụ aghaghị ịbụrụ ya ule n’ihi ùgwù ya—onye a ma ama na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ ileta nwa ya a tụrụ nga! Aga m anọgide na-enwe ekele maka nleta ahụ. N’ikpeazụ, a tọhapụrụ m n’April nke 1951.

Mgbe a tọhapụrụ m na Lewes, ejiri m ụgbọ okporo ígwè gaa Cardiff, Wales, bụ́ ebe nna m na-eje ozi n’oge ahụ dị ka onyeisi n’ụlọ mkpọrọ dị ebe ahụ. Abụ m nwa mbụ n’ime ụmụaka anọ—ụmụ nwoke atọ na otu nwanyị. Aghaghị m ịchọta ọrụ nwa oge ka m wee nwee ike ilekọta onwe m ma nọgide na-abụ onye ọsụ ụzọ. Agara m rụwa ọrụ n’ebe a na-akwa ákwà, ma nzube m bụ́ isi ná ndụ bụ ozi m dị ka onye Kraịst. Ihe dị ka n’oge a, nne anyị hapụrụ anyị. Nke ahụ kpara papa m na anyị bụ́ ụmụaka dị site n’afọ 8 ruo 19, aka ọjọọ. N’ụzọ dị mwute, papa anyị na mama anyị gbara alụkwaghịm.

Onye Chọtara Ezi Nwunye . . .

E nwere ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ anyị. Otu n’ime ha bụ otu nwanna nwanyị nke na-esi na Ndagwurugwu Rhondda nke a na-egwupụta coal na ya abịa maka ọrụ ego ya na ọrụ nkwusa kwa ụbọchị. Aha ya bụ Hazel Green—ezigbo onye ọsụ ụzọ. Hazel amatawo eziokwu ahụ ọtụtụ afọ tupu m mata ya—ndị mụrụ ya na-aga nzukọ nke Ndị Mmụta Bible (ndị a maara ugbu a dị ka Ndịàmà Jehova) laa azụ n’afọ ndị 1920. Ma ka o jiri ọnụ ya kọọrọ gị banyere onwe ya.

“Ejighị m Bible kpọrọ ihe ruo 1944 bụ́ mgbe m gụrụ akwụkwọ nta bụ́ Religion Reaps the  Whirlwind. Nne m kwaliri m ịga otu mgbakọ sekit na Cardiff. Ahụrụ m onwe m n’ógbè azụmahịa bụ́ isi n’obodo ahụ ka m nya kaadị mkpọsa n’olu na-akpọsa okwu ihu ọha n’enwetụghịdị ihe ọmụma ọ bụla banyere Bible. Alanahụrụ m ahụmahụ ahụ n’agbanyeghị na ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ majara m. E mere m baptism na 1946, amalitekwara m ịsụ ụzọ na December nke afọ ahụ. E mesịa na 1951, otu ọsụ ụzọ na-eto eto bụ́ onye ka si n’ụlọ mkpọrọ pụta, bịara Cardiff. Ọ bụ Eric.

“Anyị mekọrọ nkwusa ọnụ. Ihe bịara dabara anyị. Anyị nwere otu ebumnobi ná ndụ—ime ka ihe ndị metụtara Alaeze Chineke gaa n’ihu. Ya mere, anyị lụrụ na December 1952. Ọ bụ ezie na anyị abụọ nọ n’ozi ọsụ ụzọ oge nile ma na-akpata obere ego, ọ dịtụbeghị mgbe nke ọ bụla n’ime ihe ndị bụ́ isi kọrọ anyị. Mgbe ụfọdụ anyị na-enweta onyinye site n’aka Onyeàmà nke zụtara ihe karịrị ihe ga-ezuru ya—ọ na-abụkwa kpọmkwem mgbe ha dị anyị mkpa! Anyị nwere ekele dị ukwuu maka omume mmesapụ aka ndị dị otú ahụ. Ma ihe ndị dị ịtụnanya karị ka na-eche anyị.”

Ihe Ịtụnanya nke Gbanwere Ndụ Anyị

Na November 1954, mụ na Hazel nwetara ihe ịtụnanya nke anyị na-atụghị anya ya—akwụkwọ ndejupụta si n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na London nke e ji kpọọ m ịbụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, nke ga na-eleta ọgbakọ dị iche kwa izu. Anyị kwenyesiri ike na ha mehiere ihe, n’ihi ya anyị agwaghị onye ọ bụla n’ọgbakọ anyị. Otú ọ dị, edejupụtara m akwụkwọ ahụ ma zighachi ya, anyị chịkwa obi n’aka na-echere ya. Ụbọchị ole na ole mgbe e mesịrị, a zaghachiri ya: “Bịa London maka ọzụzụ”!

N’alaka ụlọ ọrụ London, apụghị m ikweta na mụ, bụ́ onye dị afọ 23, na ụmụnna ndị dị otú ahụ a ma ama bụ́ ndị yiri m ndị dike ime mmụọ nọ—Pryce Hughes, Emlyn Wynes, Ernie Beavor, Ernie Guiver, Bob Gough, Glynn Parr, Stan na Martin Woodburn, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha nwụrụla kemgbe. Ha tọrọ ntọala bụ́ ịgba nke ịnụ ọkụ n’obi na iguzosi ike n’ezi ihe na Britain laa azụ n’afọ ndị 1940 na 1950.

Ọrụ Sekit n’England —Ọ Dịghị Agwụ Ike Ma Ọlị

Mgbe anyị malitere ọrụ njegharị bụ n’oge oyi snow nke afọ 1954/1955. E kenyere anyị ọrụ na East Anglia, bụ́ ógbè dị larịị nke England nke ikuku jụrụ oyi nke Oké Osimiri Ebe Ugwu na-efe na ya. N’oge ahụ, e nwere nanị Ndịàmà 31,000 na Britain. Sekit mbụ ahụ bụụrụ anyị ahụmahụ tara akpụ nke anyị mụtara ihe na ya; ọ dịghịkwa adịkebere ụmụnna ndị anyị letara mfe. N’ihi ahụmahụ m na-enweghị na omume ezoghị ọnụ e ji mara ndị Yorkshire, mgbe ụfọdụ akpasuru m ụfọdụ ndị iwe. N’afọ ndị gafeworonụ, amụtawo m na obiọma dị mkpa karịa ịrụpụta ihe nakwa na ndị mmadụ dị mkpa karịa ịgbaso ụkpụrụ. Aka m na-agbalị ịgbaso ihe nlereanya Jisọs nke ime ka ndị ọzọ nwee ume ọhụrụ, ma adịghị m enwe ihe ịga nke ọma mgbe nile.—Matiu 11:28-30.

Mgbe anyị nọsịrị ọnwa 18 na East Anglia, e kenyere anyị ije ozi n’otu sekit nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ England, bụ́ Newcastle upon Tyne na Northumberland. Ahụrụ m ndị bi n’ógbè ahụ n’anya bụ́ ndị nwere omume enyi. Onye nlekọta distrikti nke bịara nleta bụ́ Don Ward, nke si Seattle, Washington, U.S.A., nyeere m aka nke ukwuu. Ọ gụsịrị akwụkwọ na klas nke 20 nke Gilead. Dị ka ọkà okwu, ana m ekwubu okwu ọkụ ọkụ. Ọ kụziiri m iji nwayọọ na-ekwu okwu, ime nkwụsịtụ, na izi ihe.

 Ihe Ịtụnanya Ọzọ nke Gbanwere Ndụ Anyị

Na 1958 anyị nwetara akwụkwọ ozi nke gbanwere ndụ anyị. A kpọrọ anyị ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead nke dị na South Lansing, New York, U.S.A. Anyị rere obere ụgbọala Austin Seven nke 1935 anyị ma gbata tiketi anyị ji gbaa ụgbọ mmiri gaa New York. Anyị bu ụzọ gaa mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova e mere na New York City. Anyị si ebe ahụ gaa Peterborough, Ontario, maka ịsụ ụzọ ruo ọnwa isii tupu anyị etinye isi n’ebe ndịda maka Ụlọ Akwụkwọ Gilead.

Ndị nkụzi ụlọ akwụkwọ ahụ gụnyere Albert Schroeder, onye sozi n’Òtù Na-achị Isi, tinyere Maxwell Friend na Jack Redford, bụ́ ndị nwụrụla kemgbe. Mkpakọrịta anyị bụ́ ụmụ akwụkwọ 82 si n’ala 14 nwere bụ ihe na-ewuli nnọọ elu. Anyị malitere ịghọtatụ banyere ọdịbendị ibe anyị. Iso ụmụ akwụkwọ si ala ọzọ bụ́ ndị ịsụ Bekee na-esiri ike mekọọ ihe tụpenyetụrụ anyị azụ banyere nsogbu anyị ga-eche ihu mgbe anyị mụwara asụsụ ọzọ. N’ime ọnwa ise, anyị natasịrị ọzụzụ, e zigakwara anyị ná mba 27. Mgbe ahụ, anyị mere ememe ngụsị akwụkwọ, n’ime ụbọchị ole na ole kwa, anyị gara New York City, na-eche ụgbọ mmiri anyị, bụ́ Queen Elizabeth, ibughachi anyị Europe.

Ọrụ Mbụ E Kenyere Anyị n’Ala Ọzọ

Ebee ka e kenyere anyị ọrụ? Ọ bụ na Portugal! Anyị bịarutere Lisbon na November 1959. Ugbu a, anyị nwetara ule nke ime mgbanwe iji kwekọọ n’asụsụ na ọdịbendị ọhụrụ. Na 1959 e nwere Ndịàmà 643 na-arụsi ọrụ ike na Portugal, bụ́ ebe ọnụ ọgụgụ ndị bi na ya fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde 9. Ma iwu obodo akwadoghị ọrụ nkwusa anyị. Ọ bụ ezie na anyị nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị adịghị edebe saịn bọọdụ n’èzí.

Mgbe onye ozi ala ọzọ bụ́ Elsa Piccone kụzisịịrị mụ na Hazel asụsụ Portuguese, anyị letara ọgbakọ na ìgwè dị iche iche dị gburugburu Lisbon, Faro, Evora, na Beja. E mesịa, na 1961 ihe malitere ịgbanwe. Anọ m na-amụrụ otu nwa okorobịa aha ya bụ João Gonçalves Mateus Bible. O kpebiri iwere nguzo ya dị ka onye Kraịst nọpụrụ iche n’ihe metụtara ọrụ agha. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, a kpọrọ m n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii maka ịgba m ajụjụ. Lee ihe ịtụnanya ọzọ m nwetara! Ụbọchị ole na ole mgbe nke a gasịrị, a gwara anyị na anyị nwere nanị ụbọchị 30 iji si ná mba ahụ pụọ! Otu ihe ahụ mekwara ndị anyị na ha na-ejekọ ozi ala ọzọ bụ́ Eric na Christina Britten nakwa Domenick na Elsa Piccone.

Etinyere m akwụkwọ ka e kwe ka anyị zara ọnụ anyị, e kwekwara ka anyị hụ onyeisi ndị uwe ojii nzuzo. Ọ gwara anyị hoo haa ihe mere e ji sị ka anyị pụọ ma kpọọ aha—João Gonçalves Mateus—onye m na-amụrụ Bible! O kwuru na, n’adịghị ka Britain, Portugal apụghị inye ndị mmadụ nnwere onwe nke ịjụ ihe n’ihi akọ na uche ha. N’ihi ya, anyị aghaghị isi Portugal pụọ, mmekọrịta mụ na João kwụsịkwara. E mesịa, afọ 26 ka nke ahụ gasịrị, lee ọṅụ ọ bụụrụ m ịhụ ya na nwunye ya na ụmụ ha nwanyị atọ ná nraranye nke Betel ọhụrụ dị na Portugal! Ozi anyị jere na Portugal alaghị n’iyi!—1 Ndị Kọrint 3:6-9.

Olee ebe ọzọ e kenyere anyị ọrụ? Ihe ịtụnanya ọzọ! Ọ bụ na Spain nke ya na ya gbara. Na February 1962, ka anya mmiri juru anyị anya,  anyị banyere ụgbọ okporo ígwè na Lisbon ma tinye isi na Madrid.

Ime Mgbanwe Iji Kwekọọ n’Ọdịbendị Ọzọ

Na Spain anyị aghaghị ime ka ụzọ nzuzo e si eme nkwusa ma na-enwe nzukọ mara anyị ahụ. Mgbe anyị na-eme nkwusa, anyị adịkebeghị aga ma ọlị n’ụlọ abụọ dịketere ibe ha. Mgbe anyị gbasịrị àmà n’otu ọnụ ụzọ, anyị na-aga n’okporo ámá ọzọ, n’ụlọ ọzọ. Nke ahụ mere ka o siere ndị uwe ojii—ma ọ bụ ndị ụkọchukwu—ike ijide anyị. Cheta na anyị bi n’okpuru ọchịchị ndị Fascist, bụ́ ọchịchị aka ike nke ndị Katọlik, a machibidokwara ọrụ nkwusa anyị iwu. Dị ka ndị ala ọzọ, anyị zawara aha Spanish dị ka ihe nchebe ka a ghara ịmata anyị. Azawara m Pablo, Hazel zawakwara Juana.

Mgbe anyị nọsịrị ọnwa ole na ole na Madrid, e kenyere anyị ọrụ sekit na Barcelona. Anyị letara ọgbakọ dị iche iche n’obodo ahụ, mgbe mgbe anyị na-anọ izu abụọ ma ọ bụ atọ na nke ọ bụla. Nleta ahụ na-ewe ogologo oge otú ahụ n’ihi na anyị aghaghị ileta ìgwè ọmụmụ akwụkwọ nke ọ bụla dị ka a ga-asị na ọ bụ otu ọgbakọ, nke ahụ na-apụtakarịkwa na anyị ga-eleta ìgwè abụọ kwa izu.

Ihe Ịma Aka Anyị Na-atụghị Anya Ya

Na 1963 a kpọrọ anyị ịnakwere ọrụ distrikti na Spain. Iji jeere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ndịàmà 3,000 ahụ na-arụsị ọrụ ike ozi, anyị aghaghị ijezu mba ahụ dum, na-eleta sekit itoolu e nwere n’oge ahụ. Anyị nọ n’ọdọ osisi dị nso na Seville, n’otu ugbo dị nso na Gijon, nakwa n’akụkụ osimiri ndị dị nso na Madrid, Barcelona, na Logroño, nwee ụfọdụ n’ime mgbakọ sekit ndị kasị dị ịrịba àmà anyị nwere na nzuzo.

Dị ka ihe nchebe, mgbe anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, m na-ebu ụzọ mara otú okporo àmà ndị dị nso dị iji mara ebe anyị ga-esi gbapụ a dịghị ama ama ọ dịrị ka ihe si gahie. N’otu oge ka anyị na-eme nkwusa na Madrid, mụ na Onyeàmà ọzọ nọ n’okpukpu dị n’elu mgbe anyị nụrụ na mberede ka a na-eti mkpu ọnwụ ọnwụ n’ala. Mgbe anyị gbaturu steepụ ụlọ ahụ, lekwa ìgwè ụmụ nwanyị dị afọ iri na ụma, bụ́ ndị so n’ìgwè Katọlik a na-akpọ Hijas de María (Ụmụ Meri). Ha nọ na-adọ ndị agbata obi aka ná ntị banyere anyị. Anyị apụghị iso ha tụgharịwa uche, amakwaara m na anyị aghaghị isi ebe ahụ pụọ ozugbo, ma ọ́ bụghị ya, ndị uwe ojii ga-ejide anyị. N’ihi ya, anyị gbapụrụ—anyị jikwa ọsọ!

Ndị ahụ bụ afọ ndị na-akpali akpali anyị nọrọ na Spain. Anyị nọ na-agbalị ịgba ezigbo ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nọ n’ebe ahụ ume, gụnyere ndị ozi ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ha tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ nke ịga mkpọrọ ma nọrọ n’ụkọ mgbe mgbe iji kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke na iji guzobe ma wulie ọgbakọ dị iche iche elu.

N’oge a, anyị nwetakwara akụkọ ọjọọ. Hazel na-akọ, sị: “Na 1964 nne m, bụ́ Onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi, nwụrụ. Ọ bụ ihe dị nnọọ mwute na anyị apụghị ọbụna ịsị ya nọrọ nke ọma tupu ya anwụọ. Nke ahụ bụ otu n’ime ihe ndị ọrụ ozi ala ọzọ na-efu bụ́ nke mewokwara ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ.”

Nnwere Onwe n’Ikpeazụ

Mgbe ọtụtụ afọ nke mkpagbu gasịrị, na July 1970, ọchịchị Franco debara ọrụ anyị n’akwụkwọ n’ikpeazụ n’ụzọ iwu. Mụ na Hazel nwere nnọọ obi ụtọ ná mmepe nke Ụlọ Nzukọ Alaeze, nke mbụ bụ na Madrid, nke abụọ bụkwa na Lesseps, Barcelona. Ha na-enwekarị saịn bọọdụ buru ibu, bụ́ ndị na-enwu ọkụ mgbe mgbe. Anyị chọrọ ka ndị mmadụ mara na iwu kwadoro  anyị nakwa na ụkwụ esiela anyị ike n’ala! N’oge a, bụ́ 1972, e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ndịàmà 17,000 na Spain.

Ihe dị ka n’oge a, enwetara m ozi ụfọdụ na-agba nnọọ ume bụ́ nke si England. Nna m letara anyị na Spain na 1969. Otú Ndịàmà nọ na Spain si mesoo ya ihe masịrị ya nke ukwuu nke na mgbe ọ laghachiri England, ọ malitere ịmụ Bible. E mesịa, na 1971, a gwara m na e meela papa m baptism! Ọ bụ ihe na-emetụ n’ahụ mgbe anyị letara ụlọ, ebe ọ bụzi nwanna bụ́ onye Kraịst, ya eduo anyị n’ekpere tupu anyị erie ihe. Echerewo m ruo ihe karịrị afọ 20 ka ụbọchị ahụ ruo. Nwanne m nwoke bụ́ Bob na nwunye ya, bụ́ Iris, aghọọla Ndịàmà na 1958. Nwa ha nwoke, bụ́ Phillip, na-eje ozi ugbu a dị ka onye nlekọta sekit na Spain, ya na nwunye ya bụ́ Jean. Ọ na-eme anyị obi ụtọ nke ukwuu ịhụ ka ha na-eje ozi ná mba ahụ magburu onwe ya.

Ihe Ịtụnanya Anyị Nwetara Nnọọ na Nso Nso A

Na February 1980, otu onye so n’Òtù Na-achị Isi letara Spain dị ka onye nlekọta zoonu. N’ụzọ tụrụ m n’anya, ọ chọrọ iso m gaa ozi. Amaghị m na ọ nọ na-enyocha m! E mesịa, na September, a kpọrọ anyị ịkwaga n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile dị na Brooklyn, New York! O riri anyị ọnụ. Anyị nakweere ọkpụkpọ òkù ahụ, n’agbanyeghị na anyị ịhapụ ụmụnna anyị nọ na Spain bụụrụ anyị ihe na-agbawa obi. N’oge ahụ, e nwere Ndịàmà 48,000!

Mgbe anyị pụrụ, otu nwanna nwoke nyere m klọọkụ a na-etinye n’akpa uwe n’onyinye. O dere akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ na ya—“Lucas 16:10; Lucas 17:10.” O kwuru na ha bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị m ga-eji mere isiokwu. Luk 16:10 na-emesi ya ike na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihe nta, Luk 17:10 na-ekwukwa na anyị bụ “ohu ndị na-abaghị n’ihe,” n’ihi ya kwa, anyị enweghị ihe mere anyị ga-eji na-anya isi. Aghọtawo m mgbe nile na ihe ọ bụla anyị mere n’ozi Jehova bụ nnọọ ọrụ dịịrị anyị dị ka ndị Kraịst raara onwe ha nye.

Ihe Ịtụnanya nke Ahụ Ike

Na 1990, amalitere m inwe nsogbu obi. N’ikpeazụ, a ghaghị itinye otu opi n’ahụ m iji mepee akwara kpọchiri akpọchi. N’ime oge a tara akpụ ahụ na-adịghị m, Hazel akwadowo m n’ọtụtụ ụzọ, mgbe mgbe ọ na-ebu akpa na igbe ndị ike na-adịtụghị m ibu. E mesịa na May 2000, e tinyere otu ihe na-enye aka ime ka obi na-akụ nke ọma n’ime ahụ m. Lee ka nke ahụ siworo nye aka!

N’ihe karịrị afọ 50 gara aga, mụ na Hazel ahụwo na aka Jehova adịghị mkpụmkpụ nakwa na ọ na-emezu nzube ya mgbe oge ya, ọ bụghị nke anyị, zuru. (Aịsaịa 59:1; Habakuk 2:3) Anyị enwetala ọtụtụ ihe ịtụnanya ndị nyere anyị ọṅụ ná ndụ nakwa ole na ole ndị dị mwute, ma Jehova akwagidewo anyị na ha nile. N’ebe a, n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke ndị Jehova, a na-agọzi anyị kwa ụbọchị site ná mmekọrịta anyị na Òtù Na-achị Isi. Mgbe ụfọdụ ana m ajụ onwe m, sị, ‘Ànyị nọ ebe a n’ezie?’ Ọ bụ obiọma na-erughịrị anyị. (2 Ndị Kọrint 12:9) Anyị nwere ntụkwasị obi na Jehova ga-anọgide na-echebe anyị pụọ n’ihe aghụghọ nile nke Setan ma na-echekwa anyị ka anyị wee nwee ike ịnụ ụtọ oge ịchịisi ezi omume ya n’ụwa.—Ndị Efesọs 6:11-18; Mkpughe 21:1-4.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ụlọ Mkpọrọ Strangeways, Manchester, bụ́ ebe mbụ a tụrụ m mkpọrọ

[Foto dị na peeji nke 27]

Ka anyị nọ n’akụkụ ụgbọala Austin Seven anyị n’ọrụ sekit n’England

[Foto dị na peeji nke 28]

Mgbakọ e mere na nzuzo na Cercedilla, Madrid, Spain, na 1962

[Foto dị na peeji nke 29]

Ka anyị nọ n’akụkụ tebụl anyị ji eme ihe n’ịgba àmà na Brooklyn