Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ṅomie Jehova Mgbe Ị Na-enye Ụmụ Gị Ọzụzụ

Ṅomie Jehova Mgbe Ị Na-enye Ụmụ Gị Ọzụzụ

 Ṅomie Jehova Mgbe Ị Na-enye Ụmụ Gị Ọzụzụ

“Ọ̀ bụ na ndị nne na nna nile adịghị agbazi ụmụ ha?”—NDỊ HIBRU 12:7, Contemporary English Version.

1, 2. Gịnị mere o ji esiri ndị nne na nna ike ịzụ ụmụ ha taa?

NNYOCHA e mere na Japan n’afọ ole na ole gara aga gosiri na ihe dị ka ọkara nke ndị toworo eto a gbara ajụjụ ọnụ chere na ndị nne na nna na ụmụ ha na-enwe nkwurịta okwu dị nnọọ nta nakwa na ndị nne na nna na-azụtọ nnọọ ụmụ ha nke ukwuu. Ná nnyocha ọzọ e mere ná mba ahụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị zaghachirinụ kwetara na ha amaghị otú e si eso ụmụaka emekọrịta ihe. Ihe a abụghị nanị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ka ọ na-eme. “Ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị Canada kwetara na o doghị ha anya otú e si abụ ezigbo nne na nna,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star kọrọ. N’ebe nile, ọ na-esiri ndị nne na nna ike ịzụlite ụmụ ha.

2 Gịnị mere o ji esiri ndị nne na nna ike ịzụ ụmụ ha? Otu isi ihe kpatara ya bụ na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ,” e nwekwara “oge dị oké egwu.” (2 Timoti 3:1) Tụkwasị na nke ahụ, “nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata,” ka Bible na-ekwu. (Jenesis 8:21) Ndị ntorobịa bụkwa ndị e kpughepụrụ karịsịa nye mwakpo Setan, bụ́ onye, dị ka “ọdụm na-agbọ ụja,” na-elomi ndị na-enweghị ahụmahụ. (1 Pita 5:8) N’ezie, ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-eche ọtụtụ ihe mgbochi ihu ka ha na-azụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka itolite ịbụ ndị tozuru okè na-efe Jehova, na-enwe ike ịmata ọdịiche dị n’etiti “ihe ọma na ihe ọjọọ”?—Ndị Hibru 5:14.

3. N’ihi gịnị ka ọzụzụ na nduzi sitere n’aka ndị nne na nna ji dị oké mkpa maka ịzụlite ụmụaka n’ụzọ na-aga nke ọma?

3 “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata,” ka Eze Solomọn maara ihe kwuru. (Ilu 13:1; 22:15) Ka ndị na-eto eto wee wepụ uche gbagọrọ agbagọ dị otú ahụ n’obi ha, ha chọrọ mgbazi ịhụnanya sitere n’aka ndị nne na nna ha. Otú ọ dị, ndị ntorobịa adịghị anabata mgbazi dị otú ahụ mgbe nile. N’ezie, ha na-ajụkarị ndụmọdụ n’agbanyeghị onye na-enye ha ya. N’ihi ya, ndị nne na nna aghaghị ịmụta ‘ịzụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị.’ (Ilu 22:6) Mgbe ụmụaka nakweere ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ, ọ pụrụ ịpụtara ha ndụ. (Ilu 4:13) Lee ka o si dị oké mkpa ka ndị nne na nna mara ihe ịzụ ụmụ ha gụnyere!

Ịdọ Aka ná Ntị—Ihe Ọ Pụtara

4. Gịnị ka “ịdọ aka ná ntị” pụtara n’ụzọ bụ́ isi dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible?

4 N’ihi ụjọ nke ịbụ ndị a ga-ebo ebubo na ha na-emegbu ụmụ ha—site n’iti ha ihe, ịgwa ha okwu ọjọọ, ma ọ bụ igbu mmụọ ha—ụfọdụ ndị nne na nna na-ahapụ ịgbazi ụmụ ha. Anyị ekwesịghị ịdị na-atụ ụdị ụjọ ahụ. Okwu ahụ bụ́ “ịdọ aka ná ntị” dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible, adịghị enye echiche nke ụdị ọ bụla nke mmegbu ma ọ bụ mmekpọ ọnụ. N’ụzọ bụ́ isi, okwu Grik e ji mee ihe maka “ịdọ aka ná ntị” metụtara inye ntụziaka, izi ihe, mgbazi olu, nakwa mgbe ụfọdụ, iji ịhụnanya nye ntaramahụhụ siri ike.

5. N’ihi gịnị ka o ji baa uru ịtụle ụzọ Jehova si emeso ndị ya ihe?

5 N’inye ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ, Jehova Chineke setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè. N’iji Jehova tụnyere nna bụ́ mmadụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ̀ bụ na ndị nne na nna nile adịghị agbazi ụmụ ha? . . . Ndị nna anyị bụ́ mmadụ na-agbazi anyị ruo nwa oge, ha na-emekwa ya dị ka  ha chere na ọ kasị mma isi mee ya. Ma Chineke na-agbazi anyị maka ọdịmma anyị, n’ihi na ọ chọrọ ka anyị dị nsọ.” (Ndị Hibru 12:7-10, Contemporary English Version) Ee, Jehova na-enye ndị ya ịdọ aka ná ntị ka ha wee nwee ike ịdị nsọ, ma ọ bụ ịdị ọcha. N’ezie, anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu banyere ịdọ ụmụaka aka ná ntị site n’ịtụle otú Jehova siworo nye ndị ya ọzụzụ.—Deuterọnọmi 32:4; Matiu 7:11; Ndị Efesọs 5:1.

ỊhụnanyaIhe Ga-akwali Anyị

6. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji siere ndị nne na nna ike iṅomi ịhụnanya Jehova?

6 “Chineke bụ ịhụnanya,” ka Jọn onyeozi na-ekwu. Mgbe ahụzi, ọ bụ ịhụnanya na-akwali Jehova mgbe nile inye ọzụzụ. (1 Jọn 4:8; Ilu 3:11, 12) Nke a ọ̀ pụtara na ọ ga-adịrị ndị nne na nna nwere ịhụnanya ebumpụta ụwa n’ebe ụmụ ha nọ mfe iṅomi Jehova n’akụkụ a? Ọ pụtachaghị otú ahụ. Ịhụnanya Chineke bụ nke ụkpụrụ na-achịkwa. Otu ọkà mmụta Grik mekwara ka ọ pụta ìhè na ịhụnanya dị otú ahụ “na ọchịchọ ebumpụta ụwa adịghị agakọ mgbe nile.” Mmetụta adịghị emegharị Chineke anya. Ọ na-echekarị mgbe nile banyere ihe kasị mma maka ndị ya.—Aịsaịa 30:20; 48:17.

7, 8. (a) Ihe nlereanya dị aṅaa nke ịhụnanya ụkpụrụ na-achịkwa ka Jehova setịpụrụ n’otú o si mesoo ndị ya ihe? (b) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi ṅomie Jehova n’inyere ụmụ ha aka ịzụlite ikike nke ịgbaso ụkpụrụ Bible?

7 Tụlee ịhụnanya Jehova gosipụtara n’otú o si mesoo ndị Israel ihe. Mosis ji myirịta mara mma mee ihe iji kọwaa ịhụnanya Jehova nwere n’ebe mba Israel ahụ e guzobere ọhụrụ nọ. Anyị na-agụ, sị: “Dị ka ugo na-akpọte ụmụ dị n’akwụ ya, na-erugharị n’elu ụmụ ya, na-agbasa nku ya, na-aghọrọ ha, na-ebu ha n’elu nku ya: otú a ka Jehova, nanị Ya, na-edu [Jekọb].” (Deuterọnọmi 32:9, 11, 12) Iji kụziere ụmụ ya ka e si efe efe, nne ugo “na-akpọte ụmụ dị n’akwụ ya,” na-efegharị nku ya iji gbaa ụmụ ya ume ka ha felie. Mgbe nwa ugo mesịrị fepụta n’akwụ, bụ́ nke na-adịkarị n’elu nkume dị elu, nne ya “na-erugharị” n’elu ya. Ọ bụrụ na o yiri ka nwa ugo ahụ ọ na-aga ịda, nne ya na-efeda n’okpuru ya, na-ebu ya “n’elu nku ya.” N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova ji ịhụnanya lekọta mba Israel ahụ e guzobere ọhụrụ. O nyere ndị ahụ Iwu Mosis. (Abụ Ọma 78:5-7) E mesịa, Chineke ji nlezianya chee mba ahụ nche, dị njikere ịbịa napụta ndị ya mgbe ha nọ ná nsogbu.

8 Olee otú ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi ṅomie ịhụnanya Jehova? Nke mbụ, ha aghaghị ịkụziri ụmụ ha ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke. (Deuterọnọmi 6:4-9) Ihe mgbaru ọsọ ha bụ inyere ndị ahụ na-eto eto aka ime mkpebi n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. N’ime nke a, ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-efegharị n’elu ụmụ ha dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-ele otú ha si etinye ụkpụrụ ndị ha mụtaworo n’ọrụ. Ka ụmụaka ahụ na-emekwu okenye ma na-enwekwuru onwe ha nke nta nke nta, ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-adị njikere “ifeda n’okpuru” ma ‘buru ụmụ ha n’elu nku ha’ mgbe ọ bụla e nwere ihe ize ndụ. Ihe ize ndụ dị aṅaa?

9. Ihe ize ndụ dị aṅaa karịsịa ka ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-aghaghị ịnọ na nche megide? Nye ihe atụ.

9 Jehova Chineke dọrọ ụmụ Israel aka ná ntị  banyere ihe ndị na-esi ná mkpakọrịta ọjọọ apụta. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-18; Ezra 10:10-14) Iso ndị na-ekwesịghị ekwesị na-akpakọrịta bụkwa ihe ize ndụ zuru ebe nile taa. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ga-eme nke ọma iṅomi Jehova n’akụkụ a. Otu nwa agbọghọ dị afọ 15 aha ya bụ́ Lisa malitere inwe mmasị n’ebe otu nwa okorobịa na-enweghị ụkpụrụ omume ọma na nke ime mmụọ nke ezinụlọ Lisa nwere, nọ. “Nne m na nna m chọpụtara ozugbo na àgwà m agbanwewala ma gosipụta nchegbu,” ka Lisa na-akọ. “Mgbe ụfọdụ ha na-agbazi m, n’oge ndị ọzọkwa, ha na-agba m ume n’ụzọ dị nro.” Ha sooro Lisa nọdụ ala ma jiri ndidi gee ya ntị, si otú ahụ na-enyere ya aka imeri ihe ha ghọtara na ọ bụ isi nsogbu ya—ọchịchọ ịbụ onye ndị ọgbọ ya nabatara. *

Mee Ka Ụzọ Nkwurịta Okwu Ghere Oghe

10. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si setịpụ ezi ihe nlereanya n’iso ụmụ Israel kwurịta okwu?

10 Iji nwee ihe ịga nke ọma n’ịzụ ụmụaka, ndị nne na nna aghaghị ịgbalịsi ike ime ka ụzọ nkwurịta okwu nke ha na ụmụ ha ghere oghe. Ọ bụ ezie na Jehova maara ihe dị anyị n’obi, ọ na-agba anyị ume ịgwa ya okwu. (1 Ihe E Mere 28:9) Mgbe Jehova nyesịrị ụmụ Israel Iwu ahụ, o nyere ndị Livaị ọrụ inye ha ntụziaka, o zigakwara ndị amụma iso ha tụgharịa uche na ịgbazi ha. O gosipụtakwara njikere ọ dị ịnụ ekpere ha.—2 Ihe E Mere 17:7-9; Abụ Ọma 65:2; Aịsaịa 1:1-3, 18-20; Jeremaịa 25:4; Ndị Galetia 3:22-24.

11. (a) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi soro ụmụ ha na-enwe ezi nkwurịta okwu? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị nne na nna bụrụ ndị na-ege ntị nke ọma mgbe ha na ụmụ ha na-enwe nkwurịta okwu?

11 Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi ṅomie Jehova mgbe ha na ụmụ ha na-enwe nkwurịta okwu? Nke mbụ, ha aghaghị iwepụta oge maka ha. Ndị nne na nna ga-emekwa nke ọma izere ikwu okwu ụfọdụ n’echeghị echiche bụ́ ndị pụrụ imenye ụmụ ha ihere, dị ka “Ọ̀ gwụla? Echebu m na ọ bụ ihe dị mkpa ka ị chọrọ ịgwa m”; “Nke ahụ bụ nnọọ nzuzu”; “Gịnịkwanụ ka ị tụrụ anya ya? Ị ka bụ nnọọ nwata.” (Ilu 12:18) Iji gbaa ụmụaka ume ikwupụta ihe dị ha n’obi, ndị nne na nna maara ihe na-agbalịsi ike ịbụ ndị na-ege ntị nke ọma. Ndị nne na nna bụ́ ndị leghaara ụmụ ha anya mgbe ha dị obere ga-abụ ndị ụmụ ha ga-eleghara anya mgbe ha toro. Jehova adịwo njikere mgbe nile ige ndị ya ntị. Ntị ya ghere oghe mgbe nile nye ndị ji obi umeala abịakwute ya n’ekpere.—Abụ Ọma 91:15; Jeremaịa 29:12; Luk 11:9-13.

12. Olee àgwà ndị nne na nna ga-enwe bụ́ ndị pụrụ ime ka ọ dịrị ụmụ ha mfe ịbịakwute ha?

12 Tụleekwa otú akụkụ ụfọdụ nke àgwà Chineke siworo mee ka ọ dịrị ndị ya mfe ịbịakwute ya n’enweghị ihe mgbochi. Dị ka ihe atụ, Eze  Devid nke Israel oge ochie mere mmehie dị oké njọ site n’iso Bat-sheba nwee mmekọahụ. N’ihi ịbụ mmadụ na-ezughị okè, Devid mere mmehie ndị ọzọ dị oké njọ ná ndụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mgbe ọ kwụsịrị ijekwuru Jehova ma chọọ mgbaghara na ịdọ aka ná ntị ya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ezi ịhụnanya na obi ebere Chineke mere ka ọ dịrị Devid mfe ịlaghachikwuru Jehova. (Abụ Ọma 103:8) Site n’igosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke ndị dị otú ahụ dị ka ọmịiko na ebere, ndị nne na nna pụrụ inye aka ime ka ụzọ nkwurịta okwu ghere oghe ọbụna mgbe ụmụ ha jehiere.—Abụ Ọma 103:13; Malakaị 3:17.

Nwee Ezi Uche

13. Gịnị ka inwe ezi uche na-agụnye?

13 Mgbe ndị nne na nna na-ege ụmụ ha ntị, ha aghaghị inwe ezi uche ma na-egosipụta “amamihe ahụ nke si n’elu bịa.” (Jemes 3:17) “Ka inwe ezi uche unu bụrụ nke mmadụ nile maara,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Filipaị 4:5, NW) Gịnị ka inwe ezi uche pụtara? Otu nkọwa e nyere okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ezi uche” bụ “ịghara isi ọnwụ ka e debezuo iwu.” Ka ndị nne na nna na-ejigide ụkpụrụ omume ọma na nke ime mmụọ, olee otú ha pụrụ isi nwee ezi uche?

14. Olee otú Jehova si gosipụta ezi uche n’otú o si mesoo Lọt ihe?

14 Jehova na-esetịpụ ihe nlereanya bụ́ ịgba n’inwe ezi uche. (Abụ Ọma 10:17) Mgbe ọ gbara Lọt na ezinụlọ ya ume ka ha hapụ obodo Sọdọm ahụ a mara ikpe mbibi, Lọt “[nọgidere na-akwụgharị, NW].” Ka e mesịrị, mgbe mmụọ ozi Jehova gwara ya ka ọ gbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu, Lọt sịrị: “Mụ onwe m apụghịkwa iwepụga onwe m jee ugwu, . . . biko, lee, obodo a [Zoa] dị nso ịgbalaga n’ebe ahụ, nke ahụ bụkwa obodo nta: biko, ka m wepụga onwe m jee ebe ahụ, (ọ́ bụghị obodo nta?).” Olee otú Jehova si meghachi omume na nke a? Ọ sịrị: “Lee, m hụwokwa gị ihu ọma n’okwu a, na m gaghị akwatu obodo a nke i kwuworo okwu banyere ya.” (Jenesis 19:16-21, 30) Jehova dị njikere ịnakwere arịrịọ Lọt. Ee, ọ dị mkpa ka ndị nne na nna na-agbaso ụkpụrụ ndị Jehova Chineke setịpụrụ n’Okwu ya, bụ́ Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ pụrụ ikwe ha omume ịnakwere ọchịchọ ụmụ ha mgbe ọ na-adịghị ụkpụrụ Bible e mebiri.

15, 16. Olee ihe ndị nne na nna pụrụ ịmụta site n’ihe atụ ahụ dị n’Aịsaịa 28:24, 25?

15 Inwe ezi uche na-agụnye ịkwadebe obi ụmụaka ka ha wee nwee ike ịnakwere ndụmọdụ. N’ụzọ ihe atụ, Aịsaịa ji Jehova tụnyere onye ọrụ ugbo ma kwuo, sị: “Ọ̀ bụ ụbọchị nile ka onye plough na-egwu ala ịgha mkpụrụ? ọ̀ bụ ụbọchị nile ka ọ na-egwughe na-eme ka ala ubi ya dị larịị? Ọ bụrụ na o mewo ka ihu ya dị larịị, ọ́ dịghị aghasa fitch, ghaa cummin, kụọ ọka wheat n’ahịrị, ghaa ọka barley n’ebe a kara aka, ghaa ọka spelt n’ókèala ya?”—Aịsaịa 28:24, 25.

16 Jehova “na-egwu ala ịgha mkpụrụ,” ‘ọ na-egwughekwa na-eme ka ala ubi ya dị larịị.’ O si otú a akwadebe obi ndị ya tupu ya adọwa ha aka ná ntị. Mgbe ndị nne na nna na-agbazi ụmụ ha, olee otú ha pụrụ isi “na-egwu” obi ụmụ ha? Otu nna ṅomiri Jehova mgbe ọ na-agbazi nwa ya nwoke dị afọ anọ. Mgbe nwa ya nwoke tiri nwata nwoke bụ́ onye agbata obi ha ihe, nna ya gerechaara ihe nwa ya kwuru mere o ji tie nwata ahụ ihe. Mgbe o kwusịrị, dị ka ọ bụ iji ‘gwuo’ obi nwa ahụ, nna ahụ kọrọ banyere otu obere nwa nke hụsiri anya n’aka otu onye ọchọ okwu. Mgbe nwata ahụ nụsịrị akụkọ ahụ, a kpaliri ya ikwu na e kwesịrị inye ọchọ okwu ahụ ntaramahụhụ. ‘Igwu ihe’ dị otú ahụ kwadebere obi nwa ahụ ma mee ka ọ dịrị ya mfe karị ịhụ na iti onye agbata obi ha ahụ ihe bụ ịchọ okwu nakwa na ọ dị njọ.—2 Samuel 12:1-14.

17. Ihe mmụta dị aṅaa nke otú ndị nne na nna ga-esi na-enye mgbazi ka e nyere n’Aịsaịa 28:26-29?

17 Aịsaịa gara n’ihu iji otú Jehova si enye mgbazi tụnyere akụkụ ọzọ nke ọrụ ugbo—nzọcha. Onye ọrụ ugbo na-eji ngwá ọrụ dị iche iche e ji azọcha ọka eme ihe na-adabere n’otú igbogbo ọka siruru n’ike. A na-eji ndele azọcha cummin ojii dị nro, na-ejikwa mkpanaka azọcha cummin nkịtị, ma a na-eji wheel nke ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ azọcha ọka ndị igbogbo ha siri ike karị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ gaghị azọsi nnọọ ọka ndị ka sie ike ike ruo n’ókè nke igweri ha. N’otu aka ahụ, mgbe Jehova chọrọ  iwepụ ihe ọ bụla na-adịghị mma n’ebe ndị ya nọ, ọ na-eji ụzọ dịgasị iche iche emeso ha ihe na-adabere ná mkpa na ọnọdụ dịnụ. Ọ dịghị aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ ma ọlị. (Aịsaịa 28:26-29) Ụfọdụ ụmụaka na-emeghachi omume nanị site n’anya ndị nne na nna ha lere ha, ọ dịghịkwa ihe ọzọ dị mkpa. Ndị ọzọ chọrọ ka a na-echetara ha ihe ugboro ugboro, ebe ndị ọzọ na-achọkwa ka a basitụrụ ha mba ike. Ndị nne na nna nwere ezi uche ga-enye mgbazi na-adabere ná mkpa nwa nke ọ bụla.

Mee Ka Nkwurịta Okwu Ezinụlọ Gị Na-enye Ọṅụ

18. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi wepụta oge maka inwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya?

18 Otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi zie ụmụ gị ihe bụ site n’ịdị na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya nakwa site n’ịdị na-atụle Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị. Ọmụmụ ihe ezinụlọ na-akasị adị irè mgbe a na-enwechi ya anya. Ọ bụrụ na a na-enwe ya mgbe ohere dapụtara ma ọ bụ mgbe e chetara ya, o yiri ka a gaghị na-emechi ya anya. N’ihi ya, ndị nne na nna aghaghị ‘ịzụchapụta oge’ maka ọmụmụ ihe. (Ndị Efesọs 5:15-17) Iwepụta otu oge nke ga-adịrị mmadụ nile mma, pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Otu onyeisi ezinụlọ chọpụtara na ka ụmụ ya na-eto, usoro ihe omume ha nke dịrịtara iche mere ka ọ na-esiri mmadụ nile nọ n’ezinụlọ ahụ ike ịnọkọta ọnụ. Ma, mmadụ nile nọ n’ezinụlọ ahụ na-anọ ya n’abalị nke ụbọchị nzukọ dị iche iche. N’ihi ya, nna ahụ mere ndokwa ka ha na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ n’otu n’ime abalị ndị ahụ. Nke a gara nke ọma. Ugbu a, ụmụaka atọ ahụ bụcha ndị ohu Jehova e mere baptism.

19. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi ṅomie Jehova mgbe ha na-eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ?

19 Otú ọ dị, nanị ịmụcha isiokwu ụfọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mgbe a na-enwe ọmụmụ ihe ezughị ezu. Jehova ziri ndị Israel e weghachiri eweghachi ihe site n’aka ndị nchụàjà, bụ́ ndị ‘gụpụtara Iwu ahụ nke ọma ma mee ka a mata isi’ ya, ‘na-eme ka a ghọta ọgụgụ ya.’ (Nehemaịa 8:8) Otu nna nke nwere ihe ịga nke ọma n’inyere ụmụ ya asaa aka ịhụ Jehova n’anya na-aba n’ọnụ ụlọ nke ya mgbe nile tupu ọmụmụ ihe ezinụlọ ha amalite iji kwadebe, na-ahazi isiokwu ahụ ka o kwekọọ ná mkpa nke nwata nke ọ bụla. O mere ka ọmụmụ ihe ahụ na-atọ ụmụ ya ụtọ. “Ọmụmụ ihe ahụ na-atọ ụtọ mgbe nile,” ka otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke toworo eto na-echeta. “Ọ bụrụ na anyị na-agba bọl  n’èzí mgbe a kpọrọ anyị òkù maka ọmụmụ ihe ezinụlọ, anyị na-edebe bọl anyị ozugbo ma gbaba n’ime ụlọ maka ọmụmụ ihe ahụ. Ọ bụ otu n’ime uhuruchi ndị anyị kasị enwe obi ụtọ na ha n’izu.”

20. Nsogbu dị aṅaa nke a pụrụ inwe n’ịzụlite ụmụaka ka a na-aghaghị ịtụle?

20 Ọbụ abụ ahụ kwupụtara, sị: “Lee, ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ: ụgwọ ọrụ Ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ.” (Abụ Ọma 127:3) Ịzụ ụmụ anyị na-ewe oge na mgbalị, ma ime nke ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị pụrụ ịpụtara ụmụ anyị ndụ ebighị ebi. Lee ụgwọ ọrụ magburu onwe ya nke ahụ ga-abụ! Ya mere, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eṅomi Jehova mgbe anyị na-enye ụmụ anyị ọzụzụ. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na e nyere ndị nne na nna ibu ọrụ nke ‘ịzụpụta ụmụ ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị,’ e kweghị ha nkwa na ha aghaghị inwe ihe ịga nke ọma. (Ndị Efesọs 6:4) Ọbụna mgbe e lekọtara nwatakịrị n’ụzọ kasị mma, ọ pụrụ ịghọ onye nnupụisi ma kwụsị ijere Jehova ozi. Gịnịzi ka a ga-eme? Nke ahụ ga-abụ isi ihe a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ahụmahụ ndị dị n’isiokwu a nakwa n’isiokwu na-esonụ pụrụ isite n’ala ndị omenala ha dị iche na nke unu. Gbalịa ịghọta ụkpụrụ ndị dị na ha, ma jiri ha mee ihe n’ọnọdụ e nwere n’ọdịbendị nke ebe i bi.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi ṅomie ịhụnanya Jehova bụ́ nke a kọwara na Deuterọnọmi 32:11, 12?

• Gịnị ka ị mụtaworo site n’ụzọ Jehova si soro ndị Israel kwurịta okwu?

• Gịnị ka ntị Jehova ṅara n’arịrịọ Lọt na-akụziri anyị?

• Gịnị ka ị mụtaworo site n’Aịsaịa 28:24-29 banyere ịgbazi ụmụaka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Mosis ji ụzọ Jehova si enye ndị ya ọzụzụ tụnyere ụzọ nne ugo si azụ nwa ya

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ọ dị ndị nne na nna mkpa iwepụta oge iji soro ụmụ ha nọkọọ

[Foto dị na peeji nke 12]

“Ọ bụ otu n’ime uhuruchi ndị anyị kasị enwe obi ụtọ na ha n’izu”