Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwensu—Ọ Bụghị Nkwenkwe Ụgha Nkịtị

Ekwensu—Ọ Bụghị Nkwenkwe Ụgha Nkịtị

 Ekwensu—Ọ Bụghị Nkwenkwe Ụgha Nkịtị

“N’ebe nile n’Agba Ọhụrụ, a na-ahụ ka ike nke Chineke na nke ezi ihe kwụ n’otu akụkụ na-alụso ike nke ihe ọjọọ bụ́ nke Setan na-eduzi, ọgụ. Nke a abụghị echiche nke otu onye edemede ma ọ bụ abụọ, kama ọ bụ nke ndị nile dere ya. . . . Ya mere, àmà Agba Ọhụrụ gbara doro anya. Setan bụ ajọ onye nke dị adị n’ezie, nke na-ebuso Chineke na ndị Chineke iro mgbe nile.”—“The New Bible Dictionary.”

GỊNỊZI mere ọtụtụ ndị sị na ha na-eso ụzọ Kraịst—ndị na-asịkwa na ha kweere na Bible—ji ajụ echiche bụ́ na e nwere kpọmkwem onye bụ́ Ekwensu? Ọ bụ n’ihi na, n’eziokwu, ha adịghị anakwere Bible dị ka Okwu Chineke. (Jeremaịa 8:9) Ha na-ekwu na ndị dere Bible gosipụtara nkà ihe ọmụma nke mba ndị gbara ha gburugburu, na ha edeghị, n’ụzọ ziri ezi, eziokwu sitere n’aka Chineke. Dị ka ihe atụ, ọkà mmụta okpukpe Katọlik bụ́ Hans Küng, na-ede, sị: “Akụkọ ifo  ndị a na-akọ banyere Setan na usuu ndị mmụọ ọjọọ . . . si n’akụkọ ifo ndị Babilọn gbebata n’okpukpe ndị Juu nke oge mbụ ma si ebe ahụ banye n’Agba Ọhụrụ.”—On Being a Christian.

Ma Bible abụghị nnọọ okwu si n’aka mmadụ; n’ezie, ọ bụ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee. Ya mere, anyị ga-abụ ndị maara ihe iji ihe ọ na-ekwu banyere Ekwensu kpọrọ ihe.—2 Timoti 3:14-17; 2 Pita 1:20, 21.

Gịnị Ka Jisọs Chere?

Jisọs Kraịst kweere na Ekwensu dị adị n’ezie. Ọ bụghị ihe ọjọọ ụfọdụ nke dị n’ime Jisọs nwara ya ọnwụnwa. Onye wakporo ya bụ onye dị adị n’ezie nke o mesịrị kpọọ “onyeisi nke ụwa nke a.” (Jọn 14:30; Matiu 4:1-11) O kwekwaara na ndị mmụọ ndị ọzọ e kere eke kwadoro Setan n’atụmatụ ọjọọ ya. Ọ gwọrọ ndị “mmụọ ọjọọ ji.” (Matiu 12:22-28) Ọbụna akwụkwọ nke ndị na-ekweghị na Chineke dị bụ́ A Rationalist Encyclopædia na-ekwu banyere ihe nke a pụtara mgbe o kwuru, sị: “Ọ bụworo ndị ọkà mmụta okpukpe ihe mkpọbi ụkwụ bụ́ otú Jisọs ahụ a kọrọ n’Oziọma ndị ahụ si kwere na ndị mmụọ ọjọọ dị.” Mgbe Jisọs na-ekwu banyere Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya, ọ naghị ekwu nnọọ banyere nkwenkwe ụgha e si n’akụkọ ifo ndị Babilọn nweta. Ọ maara na ha dị adị n’ezie.

Anyị na-amụta ọtụtụ ihe banyere Ekwensu mgbe anyị tụlere ihe Jisọs gwara ndị nkụzi okpukpe nke oge ya: “Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ [mgbe ọ malitere, NW], o guzoghịkwa n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ bụla ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu ihe si n’ihe nke aka ya pụta: n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.”—Jọn 8:44.

Dị ka ihe ndekọ a si kwuo, Ekwensu, bụ́ aha nke pụtara “onye nkwutọ,” bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna ya.” Ọ bụ ihe e kere eke mbụ ghara ụgha megide Chineke, o mekwara nke ahụ laa azụ n’ogige Iden. Jehova ekwuwo na nne na nna anyị mbụ ‘aghaghị ịnwụ’ ma ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. Setan si n’ọnụ agwọ kwuo na okwu ndị ahụ abụghị eziokwu. (Jenesis 2:17; 3:4) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, a kpọrọ ya “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.”—Mkpughe 12:9.

Ekwensu ghara ụgha banyere osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. Ọ zọọrọ na iwu e nyere ka a ghara iri mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, ezighị ezi; na ọ bụ iji ike mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. O kwuru na Adam na Iv pụrụ ‘ịdị ka Chineke’ n’ikpebiri onwe ha ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ.  Setan nyere echiche na dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, ha kwesịrị ịdị na-ekpebiri onwe ha ihe nile. (Jenesis 3:1-5) Aka a a mara izi ezi nke ụzọ Chineke si achị isi kpalitere ihe iseokwu ndị dị mkpa. Ya mere, Jehova ahapụwo oge iji dozie ihe iseokwu ndị a. Nke a pụtara na e kwewo ka Setan nọgide na-adị ndụ ruo oge ụfọdụ. Oge ya a kpaara ókè jizi ọsọ na-agwụ. (Mkpughe 12:12) Ma, ọ na-anọgide na-eji ụgha na aghụghọ ekewapụ ihe a kpọrọ mmadụ n’ebe Chineke nọ, na-eji mmadụ ndị dị ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nke oge Jisọs akwalite ozizi ya.—Matiu 23:13, 15.

Jisọs kwukwara na Ekwensu bụ “ogbu mmadụ [mgbe ọ malitere, NW],” na “o guzoghịkwa n’eziokwu.” Nke a apụtaghị na Jehova kere Ekwensu ịbụ “ogbu mmadụ.” E keghị ya ịbụ ajọ anụ nke ga na-elekọta ebe a na-akpọ ndị ọ bụla megidere Chineke ọkụ ma na-enye ha ntaramahụhụ. “Hel” dị ka Bible si jiri ya mee ihe abụghị ebe obibi Setan. Ọ bụ nanị ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Ọrụ 2:25-27; Mkpughe 20:13, 14.

Ekwensu nọ “n’eziokwu” na mbụ. O sobu n’ezinụlọ eluigwe nke Jehova dị ka mmụọ zuru okè nke bụ́ nwa Chineke. Ma o ‘guzoghị n’eziokwu.’ Ọ họọrọ ụzọ nke aka ya na ụkpụrụ ya ndị dabeere n’ụgha. “Ọ malitere,” ọ bụghị mgbe e kere ya dị ka nwa Chineke bụ́ mmụọ ozi, kama ọ bụ mgbe o ji ọchịchọ obi ya nupụrụ Jehova isi ma ghaara Adam na Iv ụgha. Ekwensu dị ka ndị ahụ nupụụrụ Jehova isi n’oge Mosis. Anyị na-agụ banyere ha, sị: “Ha ebibiwo onwe ha; ha abụghị ụmụ ya, ọrụ ahụ dị ha n’ahụ.” (Deuterọnọmi 32:5, NW) A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere Setan. Ọ ghọrọ “ogbu mmadụ” mgbe o nupụrụ isi ma kpata ọnwụ nke Adam na Iv nakwa, n’ezie, nke ezinụlọ nile nke mmadụ.—Ndị Rom 5:12.

Ndị Mmụọ Ozi Nupụrụ Isi

Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sonyeere Setan ná nnupụisi ya. (Luk 11:14, 15) N’oge Noa, ndị mmụọ ozi a “hapụrụ ebe obibi nke aka ha” ma nwoghata ahụ mmadụ iji soro “ụmụ ndị inyom nke mmadụ” nwee mmekọahụ. (Jud 6; Jenesis 6:1-4; 1 Pita 3:19, 20) Ọ bụ “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando nke eluigwe,” ma ọ bụ ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị mmụọ e kere eke, gbasoro ụzọ a.—Mkpughe 12:4.

Akwụkwọ Mkpughe bụ́ nke na-ejikarị ihe atụ ekwu okwu na-akọwa Ekwensu dị ka “oké dragọn nke na-acha ọkụ ọkụ.” (Mkpughe 12:3) N’ihi gịnị? Ọ bụghị n’ihi na ahụ ya jọrọ njọ ma na-eyi egwu. N’ezie, anyị amaghị ụdị ahụ ndị mmụọ e kere eke nwere, ma o yikarịrị ka a bịa n’akụkụ ahụ, Setan adịghị iche ná ndị mmụọ ozi ndị ọzọ e kere eke. Otú ọ dị, “oké dragọn nke na-acha ọkụ ọkụ” bụ nkọwa kwesịrị mmụọ nke oké ọchịchọ, nke iyi egwu, nke ike, na nke imebi ihe bụ́ nke Setan nwere.

Ugbu a, a kpaarala Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ókè n’ụzọ dị ukwuu. Ha apụghịzi inwogha onwe ha dị ka o doro anya na ha pụrụ imebu. N’oge na-adịghị anya mgbe e guzobesịrị Alaeze Chineke n’aka Kraịst na 1914, a chụdatara ha n’ụwa.—Mkpughe 12:7-9.

Ekwensu Bụ Onye Iro Siri Ike Mmeri

N’agbanyeghị nke ahụ, Ekwensu nọgidere na-abụ onye iro siri ike mmeri. “Ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Ọ bụghị ụkpụrụ ihe ọjọọ a na-adịghị ahụ anya nke bi n’ahụ anyị na-ezughị okè. N’eziokwu, anyị na-alụso ọchịchọ mmehie anyị ọgụ kwa ụbọchị. (Ndị Rom 7:18-20) Ma ọgụ bụ́ isi anyị na-alụ bụ “imegide ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a, imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.”—Ndị Efesọs 6:12.

 Ókè ha aṅaa ka mmetụta Setan gbasaruru? “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” ka Jọn onyeozi na-ekwu. (1 Jọn 5:19) N’ezie, ọ dịghị anyị mkpa ichegbuwe onwe anyị banyere Ekwensu ma ọ bụ kwe ka egwu nkwenkwe ụgha banyere ya jichie anyị. Otú ọ dị, anyị ga-abụ ndị maara ihe ịnọ na nche megide mgbalị ndị ọ na-eme ime ka ìsì kpuo anyị n’ebe eziokwu ahụ dị na imebi iguzosi ike n’ezi ihe anyị nye Chineke.—Job 2:3-5; 2 Ndị Kọrint 4:3, 4.

Ọ bụghị mgbe nile ka Ekwensu na-eji ụzọ obi ọjọọ awakpo ndị na-achọ ime uche Chineke. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme onwe ya ka o yie “mmụọ ozi nke ìhè.” Pọl onyeozi dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị banyere ihe ize ndụ a mgbe o dere, sị: “Ana m atụ egwu, ma ò nwere ụzọ ọ bụla a ga-emebi uche unu ka unu pụọ n’afọ ofufo na ịdị ọcha nke dị n’ebe Kraịst nọ, dị ka agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.”—2 Ndị Kọrint 11:3, 14.

Ya mere, ọ dị anyị mkpa ‘inwe anya udo, na-eche nche, ma na-eguzogide ya, n’ihi na anyị dị ike n’okwukwe anyị.’ (1 Pita 5:8, 9; 2 Ndị Kọrint 2:11) Zere ịkpa nkụ n’ubi Setan site n’itinye aka n’ihe ọ bụla metụtara anwansi. (Deuterọnọmi 18:10-12) Bụrụ onye ji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, na-echeta na Jisọs Kraịst zoro aka ugboro ugboro n’Okwu Chineke mgbe Ekwensu nwara ya. (Matiu 4:4, 7, 10) Kpekuo Chineke ekpere maka mmụọ ya. Mkpụrụ ya pụrụ inyere gị aka izere ọrụ nile nke anụ ahụ, bụ́ nke Setan na-akwalite n’ụzọ dị nnọọ irè. (Ndị Galetia 5:16-24) Ọzọkwa, jiri ezi obi kpekuo Jehova ekpere mgbe ọ dị gị ka Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya hà na-anwa gị n’ụzọ ụfọdụ.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Ọ dịghị mkpa ịtụ Ekwensu ụjọ. Jehova kwere nkwa inye anyị ezigbo nchebe pụọ n’ihe ọ bụla Setan pụrụ ime. (Abụ Ọma 91:1-4; Ilu 18:10; Jemes 4:7, 8) “Meenụ onwe unu ka unu dị ike n’ime Onyenwe anyị, ya na n’ime ịdị ike nke ike Ya,” ka Pọl onyeozi na-ekwu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike “iguzogide ihe nile ekwensu na-ezupụta.”—Ndị Efesọs 6:10, 11.

[Foto dị na peeji nke 5]

Jisọs maara na Ekwensu bụ onye dị adị n’ezie

[Foto dị na peeji nke 6]

“Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto NASA

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Guzogide Ekwensu site n’ịmụ Okwu Chineke na ikpechi ekpere anya