Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ike Agwụla Gị n’Ime Ihe Ọma

Ike Agwụla Gị n’Ime Ihe Ọma

 Ike Agwụla Gị n’Ime Ihe Ọma

“Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.”—NDỊ GALETIA 6:9.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ntachi obi ji dị mkpa iji na-ejere Chineke ozi? (b) Olee otú Abraham si gosipụta ntachi obi, gịnịkwa nyeere ya aka ime otú ahụ?

DỊ KA Ndịàmà Jehova, ime uche Chineke na-atọ anyị ụtọ. Anyị na-enwetakwa ume ọhụrụ n’ịnyara “yoke” nke ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 11:29) Otú o sina dị, iso Kraịst na-ejere Jehova ozi anaghị adị mfe mgbe nile. Pọl onyeozi mere ka nke a doo anya mgbe ọ gbara ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ.” (Ndị Hibru 10:36) Ntachi obi dị mkpa n’ihi na ijere Chineke ozi pụrụ ịbụ ihe na-ama aka.

2 N’ezie, ndụ Abraham na-agba akaebe banyere eziokwu ahụ. Ọtụtụ mgbe, o chere nhọrọ ndị tara akpụ na ọnọdụ ndị na-akpata nchegbu ihu. Ịbụ onye e nyere iwu ịhapụ ndụ ntụsara ahụ ọ na-ebi na Ua bụ nanị mmalite ya. N’oge na-adịghị anya, o chere ụnwụ nri, ibu iro sitere n’aka ndị agbata obi ya, ịbụ onye ọ fọrọ nke nta ka a kpọnara ya nwunye ya, ibu iro sitere n’aka ụfọdụ ndị ikwu ya, na agha kpụ ọkụ n’ọnụ, ihu. Ọnwụnwa ndị ka ukwuu ka na-abịa. Ma ọ dịghị mgbe ike gwụrụ Abraham n’ime ihe ọma. Nke a dị ịrịba ama mgbe ị tụlere na o nweghị Okwu Chineke n’ozuzu ya, dị ka anyị nwere taa. Otú o sina dị, obi abụọ adịghị ya na ọ maara banyere amụma mbụ ahụ, nke Chineke nọ na ya kwupụta, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya.” (Jenesis 3:15) Ebe Abraham bụ onye Mkpụrụ ahụ ga-esi n’eriri ya bịa, dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, Setan ga-ebusosi ya iro ike. Obi abụọ adịghị ya na ịghọta eziokwu a nyeere Abraham aka iji ọṅụ tachie obi n’ọnwụnwa ya nile.

3. (a) Gịnị mere ndị Jehova taa ji kwesị ịtụ anya mkpagbu? (b) Agbamume dị aṅaa ka Ndị Galetia 6:9 na-enye anyị?

3 Ndị Jehova taa kwesịkwara ịtụ anya mkpagbu. (1 Pita 1:6, 7) E kwuwerị, Mkpughe 12:17 na-adọ anyị aka ná ntị na Setan ‘na-ebu agha’ megide ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ. N’ihi mmekọrịta chiri anya ha na ndị e tere mmanụ nwere, Setan na-ewesokwa “atụrụ ọzọ” ahụ iwe. (Jọn 10:16) E wezụga mmegide ndị Kraịst pụrụ iche ihu n’ozi ha na-eje maka ọha, ha pụkwara inweta nrụgide ndị bụ́ ọnwụnwa ná ndụ ha. Pọl na-agba anyị ume, sị: “Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.” (Ndị Galetia 6:9) Ee, ọ bụ ezie na Setan na-esi ọnwụ imebi okwukwe anyị, anyị aghaghị iguzogide ya, na-adị ike n’okwukwe. (1 Pita 5:8, 9) Gịnị pụrụ isi n’ụzọ ndụ ikwesị ntụkwasị obi anyị pụta? Jemes 1:2, 3 na-akọwa, sị: “Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụwa dị iche iche; ebe unu maara na nnwapụta nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi.”

Mwakpo Ihu na Ihu

4. Olee otú Setan siworo jiri mwakpo ihu na ihu mee ihe ná mgbalị ya imebi nguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Chineke?

4 N’ezie, ndụ Abraham na-egosi ‘ọnwụnwa dị iche iche’ onye Kraịst pụrụ iche ihu taa. Dị ka ihe atụ, ọ ghaghị ime ihe banyere mwakpo nke ndị ahụ si Shaịna mere. (Jenesis 14:11-16) Ọ bụghị ihe ijuanya na Setan nọgidere na-eji  mwakpo ihu na ihu eme ihe n’ụdị mkpagbu. Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, ọchịchị nke ọtụtụ ala amachibidowo ọrụ nkụzi ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova na-arụ iwu. Akwụkwọ bụ́ 2001 Yearbook of Jehovah’s Witnesses na-akọ banyere ime ihe ike sitere n’aka ndị iro bụ́ nke ndị Kraịst nọ n’Angola na-aghaghị ịtachi obi na ya. N’ịdabere n’ebe Jehova nọ, ụmụnna anyị nọ n’ala ndị dị otú ahụ ejiriwo nguzosi ike jụ ịkwụsị! Ha emeghachiwo omume ọ bụghị site n’ime ihe ike ma ọ bụ inupụ isi, kama site n’iji ezi uche na-anọgide n’ọrụ nkwusa ahụ.—Matiu 24:14.

5. Olee otú ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi bụrụ ndị a na-akpagbu n’ụlọ akwụkwọ?

5 Otú ọ dị, mkpagbu adịchaghị agụnye ime ihe ike. E mesịrị jiri ụmụ ndị ikom abụọ—Ishmael na Aịsak—gọzie Abraham. Jenesis 21:8-12 na-agwa anyị na n’otu oge, Ishmael nọ ‘na-achị Aịsak ọchị.’ N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Galetia, o gosiri na nke a karịrị egwuregwu ụmụaka, n’ihi na ọ kọwara na Ishmeal na-esogbu Aịsak! (Ndị Galetia 4:29) N’ihi ya, a pụrụ izi ezi ịkpọ ịkwa emo sitere n’aka ụmụ akwụkwọ ibe anyị ma ọ bụ okwu ọjọọ sitere n’aka ndị mmegide, mkpagbu. Onye Kraịst na-eto eto aha ya bụ Ryan na-echeta ọnụ ụmụ klas ya mekpọrọ ya, sị: “Minit 15 anyị na-anọ na bọs ma anyị na-aga ma na-ala akwụkwọ na-eyi m ka ọ bụ ọtụtụ awa n’ihi okwu ọjọọ a na-agwa m. Ha na-eji mpempe akwụkwọ ha ji mkpaọkụ siga mụnye ọkụ na ya, na-ere m ọkụ n’ahụ.” Gịnị kpatara mmeso obi ọjọọ ahụ? “Ọzụzụ m nwetara ná nzukọ Chineke mere ka m dị iche n’ebe ndị ọzọ na-eto eto nọ n’ụlọ akwụkwọ nọ.” Otú o sina dị, site n’enyemaka nke dị mụrụ ya, Ryan ji ikwesị ntụkwasị obi tachie obi. Ndị na-eto eto, ihe ọchị ndị ọgbọ unu ji unu eme ò mewo ka unu nwee nkụda mmụọ? Ike agwụla unu! Site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi, unu ga-ahụ mmezu nke okwu Jisọs, bụ́: “Ngọzi na-adịrị unu mgbe ọ bụla ha na-ata unu ụta, na-esogbukwa unu, na-ekwukwa ajọ ihe nile dị iche iche megide unu n’okwu ụgha, n’ihi m.”—Matiu 5:11.

Nchegbu A Na-enwe Kwa Ụbọchị

6. Ihe ndị dị aṅaa pụrụ imebi mmekọrịta dị n’etiti onye Kraịst na ibe ya taa?

6 Ihe ka ọtụtụ n’ọnwụnwa ndị anyị na-eche ihu taa na-agụnye nchegbu nkịtị a na-enwe kwa ụbọchị. Abraham n’onwe ya aghaghị ịnagide esemokwu bilitere n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ ya na ndị nke nwa nwanne ya bụ́ Lọt.  (Jenesis 13:5-7) N’ụzọ yiri nke ahụ taa, ndịrịta iche n’àgwà na ekworo na-enweghị isi pụrụ imebi mmekọrịta nakwa ọbụna yie udo nke ọgbakọ egwu. “Ebe ekworo na ịkpa iche iche dị, n’ebe ahụ ka ịgba aghara na omume nile ọ bụla nke na-adịghị mma dị.” (Jemes 3:16) Lee ka o si dị mkpa ka ike ghara ịgwụ anyị kama ka anyị mee ka udo na-ebutere mpako ụzọ, dị ka Abraham mere, ma na-achọ ọdịmma nke ndị ọzọ!—1 Ndị Kọrint 13:5; Jemes 3:17.

7. (a) Gịnị ka mmadụ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye Kraịst ibe ya kpasuru ya iwe? (b) Olee otú Abraham si setịpụ ezi ihe nlereanya n’ịnọgide na-eso ndị ọzọ enwe ezi mmekọrịta?

7 Ịbụ ndị udo pụrụ ịbụ ihe ịma aka mgbe anyị chere na onye kwere ekwe ibe anyị emesowo anyị ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ilu 12:18 na-ekwu, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” Okwu a na-echeghị echiche kwuo, ọ bụrụgodị na e ji ezi obi kwuo ya, pụrụ iweta ihe mgbu dị ukwuu. Ihe mgbu ahụ na-adị ukwuu ọbụna karị ma ọ bụrụ na ọ dị anyị ka e kwutọwo anyị ma ọ bụ jiri anyị gbaa asịrị n’ụzọ dị oké njọ. (Abụ Ọma 6:6, 7) Ma onye Kraịst ekwesịghị ikwe ka mwute mee ka ike gwụ ya! Ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ, bute ụzọ n’idozi okwu site n’iji obiọma gwa onye ahụ mejọrọ gị okwu. (Matiu 5:23, 24; Ndị Efesọs 4:26) Nwee àgwà nke ịgbaghara onye ahụ. (Ndị Kọlọsi 3:13) Site n’ịkwụsị iwe iwe, anyị na-eme ka o kwe omume ime ka mmetụta anyị nwere nakwa mmekọrịta anyị na nwanna anyị dịghachi mma. Abraham anọgideghị na-eburu Lọt iwe n’obi maka ihe ọ bụla ọ pụrụ ịbụ na o mere ya. Leenụ, Abraham ji ọsọ bịa ichebe Lọt na ezinụlọ ya!—Jenesis 14:12-16.

Ọnwụnwa Mmadụ Ji Aka Ya Akpatara Onwe Ya

8. (a) Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi ‘were ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha’? (b) N’ihi gịnị ka Abraham ji nwee ike inwe echiche ziri ezi banyere ihe onwunwe?

8 N’eziokwu, mmadụ ji aka ya akpatara onwe ya ọnwụnwa ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Unu akpadola akụ̀ n’ụwa nye onwe unu, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-egwupukwa na-ezukwa ohi.” (Matiu 6:19) N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ụmụnna ‘na-ewere ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha’ site n’ime ka ihe onwunwe na-ebutere ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ. (1 Timoti 6:9, 10) Abraham dị njikere ịchụ ntụsara ahụ n’ụzọ ihe onwunwe n’àjà iji mee ka obi dị Chineke ụtọ. “Okwukwe ka o ji biri dị ka ọbịa n’ala nke e kwere ya rịị ná nkwa, dị ka ala na-abụghị nke aka ya, ebe o biri n’ụlọikwuu, ya na Aịsak na Jekọb, ndị sooro ya na-eketakọ otu nkwa ahụ: n’ihi na ọ na-ele anya obodo ahụ nke nwere ntọala ahụ, nke Chineke bụ onye ọkà ya na onye rụrụ ya.” (Ndị Hibru 11:9, 10) Okwukwe Abraham nwere ‘n’obodo,’ ma ọ bụ ọchịchị Chineke, nke na-abịa n’ọdịnihu nyeere ya aka ịghara ịdabere n’akụ̀. Ọ̀ bụ na anyị agaghị abụ ndị maara ihe ime otu ihe ahụ?

9, 10. (a) Olee otú ọchịchọ ịbụ onye a ma ama pụrụ isi weta ọnwụnwa? (b) Olee otú nwanna nwoke pụrụ isi na-akpa àgwà dị ka “onye dịkarị nta” taa?

9 Tụlee akụkụ ọzọ. Bible na-enye ntụziaka a siri ike, sị: “A sị na mmadụ na-eche na ya bụ ihe, mgbe ọ na-abụghị ihe ọ bụla, ọ na-aghọ onwe ya aghụghọ n’obi.” (Ndị Galetia 6:3) Ọzọkwa, a na-agba anyị ume ịghara “[ime] ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala.” (Ndị Filipaị 2:3) Ụfọdụ na-ewetara onwe ha ọnwụnwa site n’ịghara itinye ndụmọdụ a n’ọrụ. N’ihi ịbụ ndị ọchịchọ nke ịbụ ndị a ma ama kama ọchịchọ ịrụ “ezi ọrụ” kpaliri, ha na-enwe nkụda mmụọ na obi nkoropụ mgbe ha na-enwetaghị ihe ùgwù ụfọdụ n’ọgbakọ.—1 Timoti 3:1.

10 Abraham setịpụrụ ezi ihe nlereanya ‘n’ịghara ịtụkwasị uche n’onwe ya karịa nke o kwesịrị ịtụkwasị uche.’ (Ndị Rom 12:3) Mgbe Abraham zutere Melkizedek, o meghị ka a ga-asị na ihu ọma o nwere n’ebe Chineke nọ mere ka ya dị elu karị. N’ụzọ dị iche, ọ nakweere ọnọdụ ka elu Melkizedek nwere dị ka onye nchụàjà site n’inye ya otu ụzọ n’ụzọ iri. (Ndị Hibru 7:4-7) N’otu aka ahụ, ndị Kraịst taa kwesịrị ịdị njikere ịkpa àgwà dị ka ‘ndị dịkarị nta,’ ọ bụghị ịchọ ka ha bụrụ ndị a na-anụ aha  ha. (Luk 9:48) Ọ bụrụ na ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ekweghị enye gị ihe ùgwù ụfọdụ, jiri ezi obi nyochatụ onwe gị iji chọpụta ihe ndị ị pụrụ ime iji meziwanye ụdị mmadụ ị bụ ma ọ bụ ụzọ i si eme ihe. Kama iwe iwe n’ihi ihe ùgwù ndị ị na-enweghị, jiri ihe ùgwù ndị i nwere mee ihe n’ụzọ zuru ezu—ihe ùgwù nke inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara Jehova. Ee, “wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka O wee welie unu elu n’oge nke Ya.”—1 Pita 5:6.

Inwe Okwukwe n’Ihe Ndị A Na-ahụghị Anya

11, 12. (a) Gịnị mere ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ pụrụ iji kwụsị inwe echiche nke ịdị ngwa? (b) Olee otú Abraham si setịpụ ezi ihe nlereanya n’ime ka ndụ ya hiwe isi n’okwukwe o nwere ná nkwa Chineke?

11 Ọnwụnwa ọzọ pụrụ ịgụnye oyiyi o yiri ka ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a ọ̀ na-anọ ọdụ. Dị ka 2 Pita 3:12 si kwuo, ndị Kraịst ga “na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke Chineke, na-emekwa ka ọ bịa ngwa ngwa.” Otú ọ dị, ọtụtụ ndị echeela “ụbọchị” a ruo ọtụtụ afọ, ụfọdụ ruo ọtụtụ iri afọ. N’ihi ya, ụfọdụ pụrụ inwe nkụda mmụọ ma kwụsịzie inwe echiche nke ịdị ngwa.

12 Ọzọkwa, tụlee ihe nlereanya Abraham. O mere ka ndụ ya nile hiwe isi n’okwukwe o nwere ná nkwa Chineke, n’agbanyeghị na o kweghị omume na ha nile ga-emezu n’oge ndụ ya. N’eziokwu, o biri ogologo ndụ ruo n’ókè nke ịhụ ka Aịsak tolitere. Ma, ọ ga-ewe ọtụtụ narị afọ tupu e jiri ụmụ Abraham tụnyewere “kpakpando nke eluigwe” ma ọ bụ “ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.” (Jenesis 22:17) Otú ọ dị, Abraham enweghị obi ilu ma ọ bụ nkụda mmụọ. N’ihi ya, Pọl onyeozi kwuru banyere Abraham na ndị nna ochie ndị ọzọ, sị: “Ndị a nile nwụrụ n’ụzọ okwukwe, ebe ha anataghị nkwa ahụ, kama ha hụrụ ha rịị, sikwa n’ebe dị anya kelee ha, wee kwupụta na ha bụ ndị ọbịa na ndị nọ dị ka ọbịa n’elu ụwa.”—Ndị Hibru 11:13.

13. (a) Olee otú ndị Kraịst taa si dị ka “ndị ọbịa”? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji weta usoro ihe a ná njedebe?

13 Ọ bụrụ na Abraham pụrụ ime ka ndụ ya hiwe isi ná nkwa ndị mmezu ha ka “dị anya,” anyị onwe anyị, bụ́ ndị mmezu ha dịịrị nnọọ nso, kwesịrị ime otú ahụ karị! Dị ka Abraham, anyị aghaghị iwere onwe anyị dị ka “ndị ọbịa” n’usoro ihe Setan, na-ajụ ịbanye n’ụzọ ndụ nke imeju ọchịchọ onwe onye. Dị ka o kwesịrị ịdị, anyị ga-achọ ka “ọgwụgwụ ihe nile” bịa ugbu a, ọ bụghị nanị ka ọ dị nso. (1 Pita 4:7) Ikekwe anyị na-enwe nsogbu ahụ ike dị njọ. Ma ọ bụ ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba na-akpa anyị aka ọjọọ. Otú ọ dị, anyị aghaghị icheta na Jehova ga-eweta ọgwụgwụ, ọ bụghị nanị iji napụta anyị pụọ n’ọnọdụ ndị dị mwute, kama iji doo aha ya nsọ. (Ezikiel 36:23; Matiu 6:9, 10) Ọgwụgwụ ahụ ga-abịa, ọ bụchaghị n’oge dịịrị anyị mma, kama n’oge ọ ga-akasị emezu nzube Jehova.

14. Olee otú ndidi Chineke si abara ndị Kraịst uru taa?

14 Chetakwa na “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Rịba ama, Chineke “na-atachiri unu ogologo ntachi obi”—ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ihe àmà na-egosi na ụfọdụ n’ime anyị chọkwuru oge iji mee mgbanwe ụfọdụ ka  e wee “hụ [ha] n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu Ya.” (2 Pita 3:14) Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe ekele na Chineke enwewo ndidi dị otú ahụ?

Ịchọta Ọṅụ n’Agbanyeghị Ihe Mgbochi

15. Olee otú Jisọs si nwee ike ịnọgide na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị ọnwụnwa, oleekwa otú iṅomi ya si abara ndị Kraịst uru taa?

15 Ndụ Abraham na-akụziri ndị Kraịst taa ọtụtụ ihe. Ọ bụghị nanị okwukwe ka o gosipụtara, kama ndidi, akọ, obi ike, na ịhụnanya nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị. O butere ofufe Jehova ụzọ ná ndụ ya. Otú ọ dị, anyị aghaghị icheta na ọ bụ Jisọs Kraịst setịpụrụ ihe nlereanya kasịnụ anyị ga-eṅomi. Ya onwe ya kwa nwetara ọtụtụ ọnwụnwa na ule, ma n’ime ha nile, ọ dịghị mgbe ọ kwụsịrị inwe ọṅụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ tụkwasịrị uche ya n’olileanya dị n’ihu. (Ndị Hibru 12:2, 3) N’ihi ya, Pọl kpere ekpere, sị: “Ma ka Chineke nke ntachi obi na nke nkasi obi nye unu ka unu tụkwasị uche n’otu ihe ahụ n’etiti onwe unu dị ka Kraịst Jisọs si chọọ.” (Ndị Rom 15:5) Site n’inwe echiche uche ziri ezi, anyị pụrụ inweta ọṅụ n’agbanyeghị ihe mgbochi ndị Setan pụrụ idochiri anyị n’ụzọ.

16. Gịnị ka anyị pụrụ ime mgbe nsogbu anyị yiri ihe karịrị anyị ike?

16 Mgbe nsogbu yiri ihe karịrị gị ike, chetara onwe gị na Jehova hụrụ gị n’anya dị nnọọ ka ọ hụrụ Abraham n’anya. Ọ chọrọ ka i nwee ihe ịga nke ọma. (Ndị Filipaị 1:6) Nwee ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ, na-enwe obi ike na “[ọ gaghị] ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ Ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) Zụlite àgwà nke ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị. (Abụ Ọma 1:2) Nọgidesie ike n’ekpere, na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịtachi obi. (Ndị Filipaị 4:6) Ọ ga-ewere “Mmụọ Nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ Ya.” (Luk 11:13) Jiri ndokwa ndị Jehova meworo iji kwagide gị n’ụzọ ime mmụọ na-eme ihe, dị ka mbipụta anyị ndị dabeere na Bible. Ọzọkwa, chọọ nkwado nke òtù ụmụnna. (1 Pita 2:17) Jiri ikwesị ntụkwasị obi na-aga nzukọ ndị Kraịst, n’ihi na n’ebe ahụ ka ị ga-enweta agbamume dị gị mkpa iji na-atachi obi. (Ndị Hibru 10:24, 25) Na-aṅụrị ọṅụ ná nkwenye i kwenyesiri ike na ntachi obi gị na-eduga n’ọnọdụ a nwapụtara anwapụta n’anya Chineke nakwa na ikwesị ntụkwasị obi gị na-eme ka obi ya ṅụrịa!—Ilu 27:11; Ndị Rom 5:3-5.

17. Gịnị mere ndị Kraịst adịghị enwe obi nkoropụ?

17 Chineke hụrụ Abraham n’anya dị ka “enyi” ya. (Jemes 2:23) N’agbanyeghị nke ahụ, ọnwụnwa na mkpagbu ndị na-arụgide arụgide jupụtara ná ndụ Abraham. N’ihi ya, ndị Kraịst apụghị ịtụ anya ihe ka nta n’ajọ “mgbe ikpeazụ” a. N’ezie, Bible na-adọ anyị aka ná ntị na “ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ.” (2 Timoti 3:1, 13) Kama inwewa obi nkoropụ, ghọta na nrụgide ndị anyị na-enweta na-agba àmà na ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe Setan dị nso. Ma Jisọs na-echetara anyị na “onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ya mere ‘ike agwụla gị n’obi n’ime ihe ọma!’ Ṅomie Abraham, ma sonye ná ndị “ji okwukwe na ogologo ntachi obi na-eketa nkwa ahụ.”—Ndị Hibru 6:12.

Ị̀ Rịbara Ama?

• Gịnị mere ndị Jehova taa ji kwesị ịtụ anya ule na mkpagbu?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan pụrụ isi jiri mwakpo ihu na ihu mee ihe?

• Olee otú a pụrụ isi dozie esemokwu dị n’etiti ndị Kraịst?

• Olee otú mpako na ito onwe onye pụrụ isi weta ọnwụnwa?

• N’ụzọ dị aṅaa ka Abraham si setịpụ ezi ihe nlereanya n’ichere mmezu nke nkwa Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst na-enweta mkpagbu, ha bụ ndị ndị ọgbọ ha ji eme ihe ọchị

[Foto dị na peeji nke 29]

N’oge Abraham, mmezu nke nkwa Chineke “dị anya,” n’agbanyeghị nke ahụ, o mere ka ndụ ya hiwe isi na ha