Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Merie Ihe Ndị Na-egbochi Gị Inwe Ọganihu!

Merie Ihe Ndị Na-egbochi Gị Inwe Ọganihu!

 Merie Ihe Ndị Na-egbochi Gị Inwe ganihu!

I TINYERE ụgbọala gị na gịa, injin ya ana-asụkwa, ma o kweghị aga. Ọ̀ dị ihe mebiri na ya? Ee e, otu nnukwu nkume dị n’ihu otu n’ime taya ya. Iwepụ ya bụ nanị ihe dị mkpa iji mee ka ụgbọala ahụ gawa.

N’ụzọ yiri nke ahụ, ụfọdụ ndị so Ndịàmà Jehova amụ Bible nwere ihe ndị pụrụ igbochi ha inwe ọganihu ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, Jisọs dọrọ aka ná ntị na ihe ndị dị ka “nchegbu nke oge a na aghụghọ nke akụ̀” pụrụ ‘ịkpagbu okwu’ nke eziokwu ahụ ma gbochie uto.—Matiu 13:22.

Àgwà ma ọ bụ adịghị ike ndị gbanyere mkpọrọgwụ na-egbochi ndị ọzọ inwe ọganihu. Otu nwoke bụ́ onye Japan aha ya bụ Yutaka nwere mmasị n’ozi Bible, ma o nwere nsogbu siri ike nke ịgba chaa chaa. Ọ gbalịwo mgbe mgbe ịkwụsị àgwà ọjọọ a ma o nwebeghị ike ime ya. Ihe a riri ya ahụ emeela ka nnukwu ego, ụlọ atọ, ùgwù ezinụlọ ya, na ùgwù onwe onye ya funahụ ya. Ọ̀ pụrụ iwepụ ihe mkpọbi ụkwụ a ma ghọọ onye Kraịst?

Ma ọ bụ tụlee ihe banyere nwanyị aha ya bụ Keiko. Site n’enyemaka Bible, ọ kwụsịla omume ọjọọ  ndị dị ka ikpere arụsị, omume rụrụ arụ, na ịgba afa. Otú ọ dị, Keiko na-ekweta, sị: “Ihe mgbochi kasịnụ m nwere bụ ise siga. Agbalịrị m ọtụtụ ugboro ịkwụsị ya ma akwụsịlighị m ya.”

N’otu aka ahụ, ihe yiri ka a pụghị iwepụ ya ewepụ pụrụ ịdị na-egbochi gị inwe ọganihu. Ihe ọ sọrọ ya ya bụrụ, jide n’aka na site n’enyemaka Chineke, ị pụrụ imeri ya.

Cheta ndụmọdụ Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha na-achụpụlighị mmụọ ọjọọ n’ahụ otu nwoke àkwụ́kwụ̀ na-adọ. Mgbe Jisọs mesịrị ihe ndị na-eso ụzọ ya na-emelighị, ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe dị ka mkpụrụ mustard, unu ga-asị ugwu a, Si n’ebe a gabiga n’ebe ahụ; ọ ga-agabigakwa; ihe ọ bụla agaghị adịkwa nke unu na-apụghị ime.” (Matiu 17:14-20; Mak 9:17-29) Ee, nsogbu nke pụrụ iyi anyị nnukwu ugwu bụ ihe pere mpe ma dị nta n’anya Onye Okike anyị kasị ike.—Jenesis 18:14; Mak 10:27.

Ịmata Ihe Ndị Na-egbochi Inwe Ọganihu

Tupu i nwee ike imeri ihe mgbochi ndị ị na-enwe, ị ghaghị ịmata ihe mgbochi ndị ahụ kpọmkwem. Ị̀ pụrụ isi aṅaa mee ya? Mgbe ụfọdụ, onye òtù ọgbakọ, dị ka onye okenye ma ọ bụ onye na-amụrụ gị Bible, pụrụ ime ka ị mara banyere ihe ụfọdụ. Kama iwe iwe na ndụmọdụ ịhụnanya dị otú ahụ, i kwesịrị iji obi umeala ‘nụrụ ịdọ aka ná ntị, wee mara ihe.’ (Ilu 8:33) N’oge ndị ọzọ, ị pụrụ ịmata adịghị ike gị site n’ịmụ Bible. Ee, okwu Chineke dị “ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Ịgụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible pụrụ ime ka ị mata echiche, mmetụta, na ebumnobi ndị kasị mie emie i nwere. Ọ na-enyere gị aka inyocha onwe gị n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Jehova. Ọ na-ekpughe ma na-eme ka ị mata ihe ndị pụrụ igbochi gị inwe ọganihu ime mmụọ.—Jemes 1:23-25.

Dị ka ihe atụ, were ya na onye a na-amụrụ Bible enweela àgwà nke iche echiche efu rụrụ arụ. O nwere ike ọ gaghị ahụcha ihe mmerụ ahụ dị na ya, na-eche na ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla ya na-eme n’ezie. Ka ọ na-amụ ihe, ya agụta okwu ndị dị na Jemes 1:14, 15: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụwooro ime, o wee mụpụta mmehie: mmehie ahụ, mgbe o tozuru okè, o wee mụpụta ọnwụ.” Ugbu a, ya ahụ nnọọ otú ịnọgide n’ụzọ a ga-esi bụrụ ihe ize ndụ nye ọganihu ya! Olee otú ọ pụrụ isi wepụ ihe mgbochi a?—Mak 7:21-23.

Imeri Ihe Mgbochi

Ikekwe site n’enyemaka nke onye Kraịst tozuru okè, onye ahụ a na-amụrụ ihe pụrụ imekwu nnyocha n’Okwu Chineke, na-eji Watch Tower Publications Index eme ihe. * Dị ka ihe atụ, isiokwu bụ́ “Echiche” na-eduga onye na-agụ ya n’ọtụtụ isiokwu ndị e bipụtara ebipụta bụ́ ndị na-ekwu banyere imeri echiche efu ndị na-emerụ ahụ. Isiokwu ndị a na-eme ka akụkụ Bible ndị bara uru pụta ìhè, dị ka Ndị Filipaị 4:8, nke na-asị: “Ka ihe bụ́ eziokwu hà, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ha hà, bụ́ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.” Ee, a ghaghị iji echiche ndị dị ọcha ma na-ewuli elu dochie echiche ndị rụrụ arụ!

N’oge ọ na-eme nnyocha, obi abụọ adịghị ya na onye ahụ a na-amụrụ ihe ga-achọta ụkpụrụ ndị ọzọ dị na Bible bụ́ ndị ga-enyere ya aka izere ịmụba nsogbu ya. Dị ka ihe atụ, Ilu 6:27 na Matiu 5:28 na-adọ aka ná ntị megide mmadụ iji ihe ndị na-akpali mmekọahụ na-emeju uche ya. “Mee ka anya m abụọ si n’ile ihe efu gabiga,” ka ọbụ abụ ahụ kpere n’ekpere. (Abụ Ọma 119:37) N’ezie, nanị ịgụ akụkụ Bible ndị a abụghị ebe ọ gwụrụ. “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche,” ka onye amamihe ahụ na-ekwu. (Ilu 15:28) Site n’ịtụgharị uche ọ bụghị nanị n’ihe Chineke nyere n’iwu kamakwa n’ihe mere o ji nye iwu ahụ, onye ahụ a na-amụrụ ihe pụrụ inwe nghọta mikwuru emi  banyere otú ụzọ Jehova si bụrụ ihe amamihe na ezi uche dị na ya.

N’ikpeazụ, onye na-agbalịsi ike imeri ihe a na-egbochi ya inwe ọganihu kwesịrị ịchọ enyemaka Jehova ozugbo. E kwuwerị, Chineke maara nnọọ ihe ndị e ji mee anyị, na anyị ezughị okè, e ji ájá kpụọ anyị. (Abụ Ọma 103:14) Ikpeku Chineke ekpere maka enyemaka n’esepụghị aka, tinyere mgbalị siri ike izere imikpu onwe anyị n’echiche efu rụrụ arụ, ga-emesị rụpụta ihe dị nnọọ mma—akọ na uche dị ọcha, nke ikpe na-amaghị.—Ndị Hibru 9:14.

Ike Agwụla Gị

N’agbanyeghị ụdị ihe isi ike gị na ya na-alụ, ghọta na ị pụrụ inwe ihe ndọghachi azụ mgbe ụfọdụ. Mgbe nke ahụ mere, ọ bụ nnọọ ihe a na-ahụkarị bụ́ inwe nkụda mmụọ na ndakpọ olileanya. Otú ọ dị, cheta okwu ndị dị ná Ndị Galetia 6:9: “Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.” Ndị ohu Chineke raara onwe ha nye dị ka Devid na Pita dara ọdịda ụfọdụ ndị wedara ha n’ala. Ma ha akwụsịghị. Ha ji obi umeala nakwere ndụmọdụ, mee mgbanwe ndị dị mkpa, ma gaa n’ihu igosipụta na ha bụ ndị ohu Chineke pụtara ìhè. (Ilu 24:16) N’agbanyeghị ụzọ Devid hiere, Jehova kpọrọ ya “nwoke nke dị ka obi m si achọ, onye ga-eme ihe nile M na-achọ.” (Ọrụ 13:22) N’otu aka ahụ, Pita meriri ihie ụzọ ya ma ghọọ idé n’ọgbakọ ndị Kraịst.

Ọtụtụ ndị taa enweela ihe ịga nke ọma yiri nke ahụ n’imeri ihe mgbochi. Yutaka, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, kwetara ka a mụọrọ ya Bible. Ọ na-akọ, sị: “Nkwado na ngọzi Jehova na nke ọ bụla n’ime nzọụkwụ ndị m weere n’inwe ọganihu, nyeere m aka imeri nsogbu nke ịgba chaa chaa. Enwere m ọṅụ dị ukwuu n’ịhụ eziokwu nke okwu Jisọs—na a pụrụ iji okwukwe bupụ ọbụna ‘ugwu.’” Ka oge na-aga, Yutaka ghọrọ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ.

Gịnị banyere Keiko, bụ́ onye siga riri ahụ? Nwanna nwanyị na-amụrụ ya ihe tụọrọ ya aro ịgụ isiokwu dị iche iche nke Teta! bụ́ ndị kwuru banyere siga iri mmadụ ahụ. Ọbụna Keiko dere okwu ndị dị ná 2 Ndị Kọrint 7:1 n’ụgbọala ya dị ka ihe ga na-echetara ya kwa ụbọchị ịnọgide na-adị ọcha n’anya Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ pụghị ịkwụsị ya. “Enwere m nnọọ nkụda mmụọ,” ka Keiko na-echeta. “Ya mere, amalitere m ịjụ onwe m ihe m chọrọ n’ezie—ọ̀ bụ Jehova ka m chọrọ ijere ozi ka ọ bụ Setan?” Ozugbo o kpebiri na ọ bụ Jehova ka ọ chọrọ ijere ozi, o kpesiri ekpere ike maka enyemaka. “N’ụzọ tụrụ m n’anya,” ka ọ na-echeta, “akwụsịrị m ise siga n’enweghị oké ihe mgbu. Nanị ụta m na-akwa bụ na emeghị m ihe ngwa ngwa karị.”

Gị onwe gị kwa pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’imeri ihe ndị na-egbochi gị inwe ọganihu. Ka ị na-emekwu ka echiche, ọchịchọ, okwu, na omume gị kwekọọ n’ụkpụrụ Bible, otú ahụ ka ị ga na-enwekwu ùgwù onwe onye na obi ike. Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ gị, nakwa ndị òtù ezinụlọ gị, ga-enweta ume ọhụrụ na agbamume mgbe gị na ha na-akpakọ. Nke kasị mkpa, ị ga-eme ka mmekọrịta gị na Jehova Chineke mikwuo emie. O kwere nkwa na ya ‘ga-ebupụ ihe ịsụ ngọngọ n’ụzọ ndị ya’ mgbe ha na-agbapụ ná nchịkwa Setan. (Aịsaịa 57:14) Obi pụkwara isi gị ike na ọ bụrụ na i tinye mgbalị iji wepụ na iji merie ihe ndị na-egbochi gị inwe ọganihu ime mmụọ, Jehova ga-agọzi gị n’ụba.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara n’ọtụtụ asụsụ.

[Foto dị na peeji nke 28]

Jisọs kwere nkwa na a pụrụ iji okwukwe merie ihe mgbochi ndị yiri ugwu

[Foto dị na peeji nke 30]

Ịgụ Bible na-eme ka mgbalị anyị na-eme iji merie ntụpọ ime mmụọ sikwuo ike