Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ehichapụwo Ya Anya Mmiri

Chineke Ehichapụwo Ya Anya Mmiri

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Chineke Ehichapụwo Ya Anya Mmiri

A NA-AGỌZI ndị mere ka ndụ ha kwekọọ n’iwu na ụkpụrụ Jehova, n’ụzọ dị ukwuu. Ọ bụ ezie na ime mgbanwe ndị dị mkpa anaghị adị mfe mgbe nile, a na-enweta enyemaka na agbamume ngwa ngwa. (Abụ Ọma 84:11) Ahụmahụ na-esonụ nke si Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia na-akọwa nke a.

Mgbe otu Onyeàmà si France gara ezumike, ọ gwara otu onye nwere ụlọ ahịa nke aha ya bụ́ Kim * banyere Jehova na nzube ya maka ụwa. Ọ hapụkwaara Kim otu akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Ka Kim na-enyocha akwụkwọ ahụ, ọ hụrụ okwu bụ́, “ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” (Mkpughe 21:4) “Amaokwu a metụrụ m n’ahụ n’ezie,” ka Kim na-echeta. “Onye hụrụ ka m nọ na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-akparịta ụka n’ụlọ ahịa n’ụbọchị ahụ nile agaghị ama na ozugbo m ruru ụlọ n’uhuruchi, aga m ebegide ákwá ruo mgbe m hiiri ụra.” N’ikwu ihe na-akpatara ya mwute, ọ na-ekwu, sị: “Mụ na otu nwoke anọwo na-ebi ruo afọ 18, obi adịtụghịkwa m mma n’ihi na ọ jụrụ ịlụ m. Achọrọ m ịkwụsị ụdị ndụ a, ma ebe mụ na ya biworo ogologo oge, obi esighị m ike ime otú ahụ.”

N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, Kim kwetara iso otu n’ime Ndịàmà Jehova aha ya bụ Linh, na-amụ Bible. “Achọsiri m ike itinye ozizi Bible n’ọrụ” ka Kim na-ekwu. “Dị ka ihe atụ, akwụsịrị m ife ndị nna nna m ofufe, ọ bụ ezie na nke a kpatara mmegide site n’aka ezinụlọ m. Ọzọkwa, anwara m ime ka mụ na enyi m nwoke dejupụta akwụkwọ n’ụzọ iwu dị ka di na nwunye, ma ọ jụrụ ime otú ahụ. N’oge a ihe siiri m ike, Onyeàmà ahụ si France nọgidere na-ezitere m mbipụta ndị dabeere na Bible, Linh na-agbakwa m ume nke ukwuu. Ndidi na nkwado ịhụnanya nke ụmụnna nwanyị a, nyeere m aka ịnọgidesi ike ruo mgbe m chọpụtara onye enyi m nwoke bụ n’ezie. Achọpụtara m na ọ lụọlarị ‘nwunye’ 5 mụtakwa ụmụ 25! Nke a mere ka obi sie m ike ịhapụ ya.

“Ịhapụ nnukwu ụlọ dị ntụsara ahụ gaa biri ná ntakịrị ụlọ adịghịrị m mfe. Tụkwasị na nke ahụ, enyi m nwoke mbụ rụgidere m ịbịaghachi ka mụ na ya biri, ọbụna na-eyi m egwu iji acid kwarụọ m ahụ ma ọ bụrụ na mụ ajụ. Site n’enyemaka Jehova, emere m ihe ziri ezi.” Kim nọgidere na-enwe ọganihu, e mesịakwa mee ya baptism n’April 1998. Tụkwasị na nke ahụ, abụọ n’ime ụmụnne ya ndị nwanyị na nwa ya nwoke nọ n’afọ iri na ụma malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible.

“Ana m echebu na ndụ m ga-anọgide bụrụ nke olileanya na-adịghị na ya,” ka Kim na-ekwu. “Otú ọ dị, ana m enwe obi ụtọ taa, anaghịzikwa m ebe ákwá n’abalị. Jehova ehichapụla m rịị anya mmiri n’anya.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A gbanwewo aha ndị ahụ.