Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Pụrụ “Ịmata Ọdịiche Dị N’ihe Ziri Ezi Na Ihe Ọjọọ”?

Ị̀ Pụrụ “Ịmata Ọdịiche Dị N’ihe Ziri Ezi Na Ihe Ọjọọ”?

 Ị̀ Pụrụ “Ịmata Ọdịiche Dị N’ihe Ziri Ezi Na Ihe Ọjọọ”?

“Na-anwapụta ihe dị Onyenwe anyị ezi mma.”—NDỊ EFESỌS 5:10.

1. N’ụzọ dị aṅaa ka ndụ pụrụ isi bụrụ ihe na-agbagwoju anya taa, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

“JEHOVA, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Eziokwu a dị mkpa nke Jeremaịa matara na-emetụta anyị taa n’ụzọ dị ukwuu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị na-ebi ‘n’oge dị oké egwu,’ dị ka Bible buru n’amụma. (2 Timoti 3:1) Kwa ụbọchị, anyị na-ezute ọnọdụ ndị dị mgbagwoju anya, bụ́ ndị na-achọ ka anyị mee mkpebi. Ma hà bụ mkpebi ndị siri ike ma hà bụ ndị dị mfe, ha pụrụ imetụta ọdịmma anyị n’ụzọ dị ukwuu—n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ mmetụta uche, na n’ụzọ ime mmụọ.

2. Olee nhọrọ ndị a pụrụ iwere dị ka ndị na-adịchaghị mkpa, ma, olee otú ndị Kraịst raara onwe ha nye si ele ha anya?

2 A pụrụ iwere ọtụtụ nhọrọ anyị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị dị ka ihe ndị a na-eme mgbe dum ma ọ bụ ndị na-adịchaghị mkpa. Dị ka ihe atụ, kwa ụbọchị, anyị na-ahọrọ uwe ndị anyị ga-eyi, nri anyị ga-eri, ndị anyị ga-ahụ, na ihe ndị ọzọ. Anyị na-eme nhọrọ ndị a ngwa ngwa, n’echereghị ha oké echiche. Ma ihe ndị ahụ hà bụ ihe na-adịchaghị mkpa n’ezie? Dị ka ndị Kraịst raara onwe ha nye, ọ bụ ihe anyị na-echebara echiche nke ọma ka nhọrọ ndị anyị na-eme n’ejiji na n’ọdịdị, n’ihe oriri na n’ihe ọṅụṅụ, nakwa n’okwu na n’omume, na-egosipụta mgbe nile na anyị bụ ndị ohu nke Onye Kasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova Chineke. A na-echetara anyị okwu Pọl onyeozi bụ́: “Ma unu na-eri ihe, ma unu na-aṅụ ihe, ma unu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrint 10:31; Ndị Kọlọsi 4:6; 1 Timoti 2:9, 10.

3. Olee nhọrọ ndị kwesịrị ka anyị chebasiere ha echiche ike?

3 Ma, e nwere nhọrọ ndị e kwesịrị ichebasiri echiche ike ọbụna karị. Dị ka ihe atụ, mmadụ ikpebi ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ịghara ịlụ, na-enwe mmetụta dị ukwuu na nke na-adịgide adịgide ná ndụ ya n’ezie. N’ezie, mmadụ ịhọrọ onye kwesịrị ekwesị ọ ga-alụ, bụ́ onye ya na ya ga-ebi ogologo ndụ ha nile, abụghị obere okwu. * (Ilu 18:22) Tụkwasị na nke ahụ, ndị anyị na-ahọrọ dị ka ndị enyi na ndị anyị na ha na-akpakọrịta, nhọrọ anyị na-eme n’agụmakwụkwọ, n’ọrụ, nakwa ná ntụrụndụ, na-enwe mmetụta pụtara ìhè na ọbụna nke dị oké mkpa n’ọnọdụ ime mmụọ anyị—nakwa n’ọdịmma ebighị ebi anyị.—Ndị Rom 13:13, 14; Ndị Efesọs 5:3, 4.

4. (a) Olee ikike ga-akasị aba uru? (b) Olee ajụjụ ndị ọ dị mkpa ka a tụlee?

 4 N’ezie, n’ịbụ ndị nwere nhọrọ ndị a nile ime, ọ bara uru ka anyị nwee ikike ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe ọjọọ ma ọ bụ n’etiti ihe yiri ka o ziri ezi na ihe ziri ezi n’ezie. “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ,” ka Bible na-adọ aka ná ntị. (Ilu 14:12) N’ihi ya, anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ikike ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe ọjọọ? Ebee ka anyị pụrụ inweta nduzi dị anyị mkpa n’ime mkpebi? Gịnị ka ndị mmadụ meworo banyere nke a n’oge gara aga na n’oge a, gịnịkwa siworo na ya pụta?’

“Nkà Ihe Ọmụma na Aghụghọ Efu” nke Ụwa

5. N’ụwa dị aṅaa ka ndị Kraịst oge mbụ bi?

5 Ndị Kraịst narị afọ mbụ biri ndụ n’ụwa nke jupụtara n’ụkpụrụ na echiche ndị Gris na Rom. N’otu akụkụ, e nwere ụzọ ndụ okomoko nke ndị Rom, bụ́ nke ọtụtụ ndị weere dị ka ihe na-adọrọ mmasị. N’aka nke ọzọ, ndị ụbụrụ ha na-aghọ nkọ n’oge ahụ nwere mmasị, ọ bụghị nanị n’echiche nkà ihe ọmụma nke Plato na Aristotle kamakwa na nke ndị ọkà mmụta ka pụtara ọhụrụ, dị ka ndị Epikurean na ndị Stoik. Mgbe Pọl onyeozi gara Atens na njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ, o zutere ndị ọkà ihe ọmụma bụ́ ndị Epikurean na ndị Stoik, ndị chere na ha karịrị “onye ekwukwu a,” bụ́ Pọl.—Ọrụ 17:18.

6. (a) Gịnị ka a nwara ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ ime? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Pọl nyere?

6 N’ihi ya, o sighị ike ịghọta ihe mere ụfọdụ n’ime ndị Kraịst oge mbụ ji bụrụ ndị ndụ okomoko na ụzọ ibi ndụ nke ndị gbara ha gburugburu dọọrọ. (2 Timoti 4:10) Ndị bụ kpọmkwem akụkụ nke usoro ihe ahụ yiri ka ha na-enweta ọtụtụ abamuru, nhọrọ ndị ha mere yikwara ka ha ziri ezi. O yiri ka ọ dị ihe bara uru mmadụ na-enweta n’ụwa bụ́ nke ọ na-adịghị enweta site n’ibi ndụ dị ka onye Kraịst raara onwe ya nye. Otú ọ dị, Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere [nkà ihe ọmụma, NW] na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.” (Ndị Kọlọsi 2:8) N’ihi gịnị ka Pọl ji kwuo otú ahụ?

7. Uru dị aṅaa ka amamihe nke ụwa bara n’ezie?

7 Pọl nyere ịdọ aka ná ntị ahụ n’ihi na ọ ghọtara na ajọ ihe ize ndụ dị n’otú ndị ahụ ụwa dọọrọ si eche echiche. Ojiji o ji okwu ahụ bụ́ “nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu” mee ihe, dị nnọọ ịrịba ama. Okwu ahụ bụ́ “nkà ihe ọmụma” pụtara n’ụzọ nkịtị, “ịhụ amamihe n’anya na ịchụso ya.” Nke ahụ n’onwe ya pụrụ ịba uru. N’ezie, Bible, karịsịa n’akwụkwọ Ilu, na-agba anyị ume ịchụso ụdị ihe ọmụma na amamihe ziri ezi. (Ilu 1:1-7; 3:13-18) Otú ọ dị, Pọl jikọtara “nkà ihe ọmụma” na “aghụghọ efu.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Pọl weere amamihe nke a na-enweta n’ụwa dị ka ihe efu na ihe na-eduhie eduhie. Dị ka bolombolo a fụrụ afụ, ọ na-adị ka ihe siri ike, ma ọ dịghị ihe dị n’ime ya. N’ezie, ọ ga-abụ ihe efu, ọbụna ihe na-eweta ọdachi, bụ́ mmadụ ịdabere n’ihe na-abaghị uru dị ka “nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu” nke ụwa a na-eme nhọrọ n’etiti ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.

Ndị Na-asị na ‘Ezi Ihe Bụ Ihe Ọjọọ Nakwa na Ihe Ọjọọ Bụ Ezi Ihe’

8. (a) Ole ndị ka ndị mmadụ na-agakwuru maka ndụmọdụ? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa ka ha na-enye?

8 Ihe adịghị nnọọ iche taa. E nwere ọtụtụ ndị ọkachamara n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla mmadụ na-eme ná ndụ. Ndị na-enye ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye na ezinụlọ, ndị edemede, ndị sị na ha na-agwọ ọrịa, ndị na-agụ kpakpando, ndị na-eme anwansi, na ndị ọzọ dịcha njikere inye ndụmọdụ—iji nweta ego. Ma, ndụmọdụ dị aṅaa ka ha na-enye? A na-edebekarị ụkpụrụ Bible maka omume ọma n’ụsọ ma were ihe a sị na ọ bụ ụkpụrụ omume ọhụrụ dochie ya. Dị ka ihe atụ, n’ikwu banyere ọjụjụ gọọmenti jụrụ idebanye “ọlụlụ nke nwoke na nwoke na nwanyị na nwanyị” n’akwụkwọ, uche akwụkwọ akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ a ma ama na Canada bụ́ The Globe and Mail na-ekwu, sị: “N’afọ 2000, ọ bụ ihe jọgburu  onwe ya na a dịghị ekwe ka mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n’anya ma na-akpachi anya mezuo ọchịchọ kasị dịrị ha n’obi n’ihi na ha bụ nwoke nwoke ma ọ bụ nwanyị nwanyị.” Ihe na-ewu taa bụ ịnabata ihe nile, ọ bụghị ịkatọ ihe nile. E weere ihe nile dị ka ihe ndị a pụrụ ime nhọrọ na ha; ọ dịghịzi ihe ọ bụla a kapịrị ọnụ n’ihe banyere ezi ihe na ihe ọjọọ.—Abụ Ọma 10:3, 4.

9. Gịnị ka ndị e weere dị ka ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù na-emekarị?

9 Ndị ọzọ na-elegara ndị aha ha na-ede ude n’obodo na ndị nwere ego anya—ndị ọgaranya na ndị a ma ama—dị ka ihe nlereanya n’ime mkpebi. Ọ bụ ezie na ọha mmadụ nke taa na-ewere ndị ọgaranya na ndị a ma ama dị ka ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù, ha na-ejikarị ọnụ eme omume ọma ndị dị ka ịkwụwa aka ọtọ na ikwesị ntụkwasị obi. Ọ dịghị emetụ ọtụtụ ndị n’ahụ na ha na-eleghara ụkpụrụ ụfọdụ anya ma na-emebi ụkpụrụ omume ọma mgbe ha na-azọ ọchịchị na mgbe ha na-achụ ego. Iji bụrụ ndị a na-anụ aha ha na ndị a ma ama, ụfọdụ ndị na-eji omume ọ gbasaghị m ahapụ ụkpụrụ ndị dịwara tupu a mụọ ha, na-ahọrọkwa akparamàgwà gbapụrụ iche ma na-awụ akpata oyi n’ahụ. Ihe ọ kpataworo bụ ọha mmadụ ebe a na-achọkarị uru na ebe a na-anabata ihe ọ bụla, bụ́ ebe ụkpụrụ nduzi bụ, “Onye mere otú masịrị ya.” Ọ̀ bụ ihe ijuanya na ndị mmadụ na-enwe mgbagwoju anya n’amaghịkwa aka nri na aka ekpe mgbe a bịara n’ihe banyere ihe ziri ezi na ihe ọjọọ?—Luk 6:39.

10. Olee otú okwu Aịsaịa kwuru banyere ezi ihe na ihe ọjọọ siworo mezuo?

10 Ihe ọjọọ mkpebi ndị na-ezighị ezi kpatara, bụ́ ndị a dabeere ná nduzi hiere ụzọ mee, juru ebe nile—alụmdi na nwunye na ezinụlọ ndị kewara ekewa, iji ọgwụ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, òtù ndị ntorobịa na-eme ihe ike, inwe mmekọahụ aghara aghara, ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, n’ịkpọtụ nanị ole na ole. N’ezie, olee otú anyị ga-esi tụọ anya ka ihe dị mma mgbe ndị mmadụ gbahapụrụ ụkpụrụ nile ma ọ bụ ebe ndị e kwesịrị ilega anya mgbe a bịara n’ihe banyere ihe ziri ezi na ihe ọjọọ? (Ndị Rom 1:28-32) Ọ dị nnọọ ka Aịsaịa onye amụma si kwuo ya, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe, ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ; ndị na-etinye ọchịchịrị n’ọnọdụ ìhè, na ìhè n’ọnọdụ ọchịchịrị; ndị na-etinye ihe ilu n’ọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ n’ọnọdụ ihe ilu! Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe n’anya onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nghọta!”—Aịsaịa 5:20, 21.

11. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya mmadụ ịdabere n’onwe ya mgbe ọ na-ekpebi ihe ziri ezi na ihe ọjọọ?

11 Eziokwu ahụ bụ́ na ndị Juu oge ochie bụ́ ndị ghọrọ “ndị maara ihe n’anya onwe ha,” zara ajụjụ n’ihu Chineke na-eme ka ọ bụrụ ihe dị mkpa ọbụna karị na anyị ga-ezere ịdabere n’onwe anyị n’ikpebi ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. Ọtụtụ ndị taa na-ekwenyere echiche bụ́ “nanị mee ihe obi gị gwara gị” ma ọ bụ “mee ihe i chere na o ziri ezi.” Echiche dị otú ahụ ò ziri ezi? O zighị ezi, dị ka Bible si kwuo, bụ́ nke  na-ekwu hoo haa, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya?” (Jeremaịa 17:9) Ị̀ ga-adabere n’ebe onye aghụghọ na onye na-enweghị olileanya nọ iduzi gị n’ime mkpebi? Ọ dịghị ma ọlị. A sị kwuwe, o yiri ka ị ga-eme ihe dị iche n’ihe onye ahụ ga-agwa gị. Ọ bụ ya mere Bible ji echetara anyị, sị: “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu: ma onye na-eje ije n’amamihe, onye ahụ ka a ga-eme ka o wepụga onwe ya.”—Ilu 3:5-7; 28:26.

Ịmụ Banyere Ihe Dị Chineke Ezi Mma

12. N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịnwapụtara onwe anyị ihe bụ́ “ihe Chineke na-achọ”?

12 Ebe ọ bụ na anyị ekwesịghị ịdabere n’amamihe nke ụwa ma ọ bụ na nke onwe anyị mgbe a bịara n’ihe banyere ihe ziri ezi na ihe ọjọọ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Rịba ndụmọdụ a doro anya Pọl onyeozi nyere ama: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ́ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnwapụtara onwe anyị ihe Chineke na-achọ? Na Bible, Jehova na-ekwu kpọmkwem ezigbo ihe kpatara ya, na-asị: “Dị ka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otú a ka ụzọ m nile dị elu karịa ụzọ nile unu, ọ bụkwa otú a ka echiche m nile dị elu karịa echiche nile unu.” (Aịsaịa 55:9) N’ihi ya, kama ịdabere n’ihe a sị na ọ bụ ezi uche ma ọ bụ n’ihe ndị anyị chere na ha ziri ezi, a dụrụ anyị ọdụ, sị: “Na-anwapụta ihe dị Onyenwe anyị ezi mma.”—Ndị Efesọs 5:10.

13. Olee otú okwu Jisọs nke e dekọrọ na Jọn 17:3 si emesi ike mkpa ọ dị ịmara ihe dị Chineke ezi mma?

13 Jisọs Kraịst mesiri mkpa a ike mgbe ọ sịrị: “Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ihe okwu Grik mbụ a sụgharịrị ịbụ ‘ịmara’ pụtara dị nnọọ omimi. Dị ka Vine’s Expository Dictionary si kwuo, ọ “na-egosi njikọ dị n’etiti onye maara otu ihe na ihe ahụ ọ maara; na nke a, onye ahụ na-eji ihe ahụ ọ maara akpọrọ ihe ma ọ bụ ihe ahụ na-adị ya mkpa, otú ahụkwa ka mmekọrịta ya na ihe ahụ ọ maara na-adị ya.” Iso mmadụ enwe mmekọrịta pụtara ihe karịrị nanị ịmara onye onye ahụ bụ ma ọ bụ aha ya. Ọ na-agụnyekwa ịmara ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-adịghị amasị ya, ịmara ihe ndị o ji akpọrọ ihe, ụkpụrụ ya—ma na-edebe ha.—1 Jọn 2:3; 4:8.

Ịzụ Ikike Nghọta Anyị

14. Gịnị ka Pọl kwuru na ọ bụ isi ihe dị iche n’etiti ndị bụ́ ụmụ ọhụrụ na ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ?

14 Oleezi otú anyị pụrụ isi nweta ikike ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe ọjọọ? Okwu Pọl gwara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst na narị afọ mbụ na-enye azịza ya. O dere, sị: “Onye na-aṅụ  mmiri ara amatabeghị okwu nke ezi omume, n’ihi na ọ bụ nwa ọhụrụ. Ma nri siri ike dịịrị ndị tozuru okè, ndị siteworo n’iji ya eme ihe zụọ ikike nghọta ha ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.” N’ebe a, Pọl gosiri ọdịiche dị n’etiti “mmiri ara,” bụ́ nke ọ kọwara n’amaokwu bu ụzọ dị ka “ihe ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta,” na “nri siri ike,” bụ́ nke dịịrị “ndị tozuru okè,” bụ́ ndị ‘zụworo ikike nghọta ha ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’—Ndị Hibru 5:12-14, NW.

15. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịrụsi ọrụ ike iji nweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke?

15 Nke a pụtara na, nke mbụ, anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji nweta nghọta ziri ezi banyere ụkpụrụ Chineke dị ka ọ dị n’Okwu ya, bụ́ Bible. Anyị adịghị achọ ogologo ụkpụrụ iwu e dere ede ịgwa anyị ihe anyị ga-eme na ihe anyị na-agaghị eme. Bible abụghị akwụkwọ dị otú ahụ. Kama nke ahụ, Pọl kọwara, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Iji rite uru n’ozizi, ịtụ mmehie n’anya, na nzụpụta ahụ, anyị aghaghị ịdị na-eji uche na ikike iche echiche anyị na-eme ihe. Nke a chọrọ mgbalị, ma ihe na-esi na ya apụta—ịbụ onye ‘zuru okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla’—kwesịrị mgbalị e mere maka ya.—Ilu 2:3-6.

16. Gịnị ka mmadụ ịzụ ikike nghọta ya pụtara?

16 Mgbe ahụ, dị ka Pọl gosiri, ndị tozuru okè ‘azụwo ikike nghọta ha ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’ N’ebe a ka anyị bịara n’isi sekpụ ntị n’okwu ahụ. Okwu ahụ bụ́ “zụọ ikike nghọta ha” pụtara n’ụzọ nkịtị, “akụkụ ahụ ndị e ji aghọta ihe ịbụ ndị a zụrụ azụ (dị ka onye na-eme egwuregwu mmega ahụ).” (Kingdom Interlinear Translation) Ọkà n’ime egwuregwu mmega ahụ pụrụ ịtụli onwe ya elu ma tụgharịa ugboro ugboro n’ikuku n’otu ntabi anya dị ka a ga-asị na ike ndọda ma ọ bụ iwu okike ndị ọzọ adịghị enwe mmetụta n’ahụ ya. Ọ na-achịkwa ahụ ya nke ọma mgbe nile, ọ na-aghọta ihe ọ na-aghaghị ime n’ụzọ fọrọ nke ka ọ bụrụ n’echeghị ya eche ka o wee nwee ike inwe ihe ịga nke ọma n’imezu egwuregwu ya ugboro ole a chọrọ. Ọ na-emezu ihe a nile n’ihi ọzụzụ siri ike ọ na-enweta na mmụgharị ọ na-amụgharị ya mgbe nile.

17. N’echiche dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịdị ka ndị na-eme egwuregwu mmega ahụ?

17 N’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, a ghaghịkwa ịzụ anyị dị ka onye na-eme egwuregwu mmega ahụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ijide n’aka na mkpebi na nhọrọ ndị anyị na-eme ga-abụ ndị ziri ezi mgbe nile. Anyị aghaghị ịdị na-achịkwa echiche na akụkụ ahụ anyị mgbe nile. (Matiu 5:29, 30; Ndị Kọlọsi 3:5-10) Dị ka ihe atụ, ị̀ na-akwa anya gị ngá ka ọ ghara ile ihe rụrụ arụ, ma ọ bụ ntị gị, ka ọ ghara ige egwú ma ọ bụ okwu rụrụ arụ? Ọ bụ eziokwu na ihe ndị dị otú ahụ rụrụ arụ gbara anyị gburugburu. Otú ọ dị, ọ bụkwa anyị ga-ekpebi ma anyị ga-ekwe ka ha gbanye mkpọrọgwụ n’obi na n’uche anyị. Anyị pụrụ iṅomi ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye sịrị: “M gaghị edo ihe jọgburu onwe ya n’ihu m: akpọwo m ọrụ nke ndị na-ejehie asị; ọ gaghị arapara n’ahụ m. . . . Onye na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzosi ike n’ihu anya m.”—Abụ Ọma 101:3, 7.

 Na-azụ Ikike Nghọta Gị Site n’Iji Ya Na-eme Ihe

18. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘site n’iji ya eme ihe,’ nke dị ná nkọwa Pọl nyere banyere mmadụ ịzụ ikike nghọta ya, pụtara?

18 Buru n’uche na ọ bụ site ‘n’iji ikike nghọta anyị na-eme ihe’ ka anyị pụrụ isi zụọ ya ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mgbe ọ bụla anyị nwere mkpebi ime, anyị kwesịrị ịmụta iji ikike uche anyị ghọta ụkpụrụ Bible ndị a pụrụ iji mee ihe na otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe. Zụlite àgwà nke ime nnyocha ná mbipụta ndị dabeere na Bible bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta. (Matiu 24:45) N’ezie, anyị pụrụ ịchọ enyemaka nke ndị Kraịst tozuru okè. Otú o sina dị, mgbalị anyị na-eme n’onwe anyị ịmụ Okwu Chineke, tinyere ekpere anyị na-ekpeku Jehova maka nduzi na mmụọ ya, ga-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu n’ikpeazụ.—Ndị Efesọs 3:14-19.

19. Ngọzi ndị dị aṅaa pụrụ ịbụ nke anyị ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-azụ ikike nghọta anyị?

19 Ka anyị na-anọgide na-azụ ikike nghọta anyị, ebumnobi anyị bụ ka “anyị wee ghara ịbụ ụmụ ọhụrụ ọzọ, ndị ifufe nile ọ bụla nke ozizi na-efegharị na-ebugharịkwa, n’ime ịtụ ntụ nke mmadụ, n’ime aghụghọ, nke ha ji ezupụta nduhie.” (Ndị Efesọs 4:14) Kama nke ahụ, na-adabere n’ihe ọmụma na nghọta anyị nwere banyere ihe dị Chineke ezi mma, anyị pụrụ ime mkpebi ndị amamihe dị na ha, ma ndị siri ike ma ndị dị mfe, bụ́ ndị ga-abara anyị uru, ndị ga-ewuli ndị anyị na ha na-efekọ ofufe elu, karịsịakwa, ndị ga-eme ka Nna anyị nke eluigwe na-aṅụrị ọṅụ. (Ilu 27:11) Lee ngọzi na ihe nchebe nke ahụ bụ n’oge ndị a dị oké egwu!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 N’ihe 40 ndị kasị enye ụmụ mmadụ nsogbu, bụ́ ndị Dr. Thomas Holmes na Dr. Richard Rahe depụtara, ọnwụ nke onye òtù ọlụlụ, ịgba alụkwaghịm, na nkewa, nọ n’ọnọdụ atọ mbụ. Ịlụ di ma ọ bụ nwunye nọ n’ọnọdụ nke asaa.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Ikike dị aṅaa dị mkpa iji na-eme mkpebi ndị ziri ezi?

• N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya ilegara ndị a ma ama anya ma ọ bụ ịdabere ná mmetụta onwe anyị mgbe anyị na-ekpebi ihe ziri ezi na ihe ọjọọ?

• Gịnị mere anyị ji kwesị ijide ihe dị Chineke ezi mma n’aka mgbe anyị na-eme mkpebi, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ya?

• Gịnị ka ‘ịzụ ikike nghọta anyị’ pụtara?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ilegara ndị ọgaranya na ndị a ma ama anya maka nduzi enweghị isi

[Foto dị na peeji nke 10]

Dị ka onye na-eme egwuregwu mmega ahụ, anyị aghaghị ịdị na-achịkwa echiche na akụkụ ahụ anyị n’ụzọ zuru ezu