Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ntụziaka Bịara n’Ezi Oge Enyere Ndị Na-eto Eto Aka

Iji Ntụziaka Bịara n’Ezi Oge Enyere Ndị Na-eto Eto Aka

 Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè, Ndị Kwezuwokwara Ihe Nile

Iji Ntụziaka Bịara n’Ezi Oge Enyere Ndị Na-eto Eto Aka

EPAFRAS bụ onye Kraịst narị afọ mbụ nke gara Rom. Otú ọ dị, o nwere ezi ihe mere o ji nọgide na-echeta ndị Kọlọsi, bụ́ obodo dị n’Asia Minor. O kwusawo ozi ọma n’ebe ahụ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na o nyeere ụfọdụ ndị Kọlọsi aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. (Ndị Kọlọsi 1:7) Epafras nwere nchegbu miri emi banyere ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Kọlọsi, n’ihi na Pọl si na Rom degara ha akwụkwọ, sị: “Epafras . . . na-ekele unu, na-agbasi mgba ike n’ihi unu n’ekpere ya nile mgbe nile, ka unu wee guzo dị ka ndị zuru okè ndị kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ.”—Ndị Kọlọsi 4:12.

N’otu aka ahụ, ndị Kraịst bụ́ nne na nna n’oge a na-ekpesi ekpere ike maka ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ha. Ndị nne na nna a na-agbalịsi ike ịkụnye n’obi ụmụ ha ịhụnanya n’ebe Chineke nọ ka ha wee nwee ike iguzosi ike n’okwukwe.

Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst arịọwo maka enyemaka n’ịnagide ihe ịma aka ndị ha na-eche ihu n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe ndị ọzọ. Otu nwa agbọghọ dị afọ 15 kwuru, sị: “Nsogbu anyị na-akawanye njọ. E nwere ọtụtụ ihe na-eyi anyị egwu ná ndụ. Anyị chọrọ enyemaka!” À zawo arịrịọ ndị ntorobịa a na ekpere nke ndị mụrụ ha bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke? Ee! “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” enyewo ntụziaka ndị dabeere na Bible. (Matiu 24:45) N’ebe a, e depụtara ọtụtụ akwụkwọ ndị nyewooro ọtụtụ narị puku ndị ntorobịa aka ‘iguzo dị ka ndị zuru okè, ndị kwezuwokwara ihe nile.’ Ka anyị tụlee ole na ole n’ime mbipụta ndị a.

“Lee . . . Ndịàmà Ọhụrụ 15,000!”

N’August 1941, mmadụ 115,000 gbakọtara na St. Louis, Missouri, U.S.A., maka mgbakọ kasị ukwuu Ndịàmà Jehova nwetụrụla ruo mgbe ahụ. N’ụbọchị ikpeazụ ya—“Ụbọchị Ụmụaka”—ihe dị ka ụmụaka 15,000 ndị nọdụrụ ala na nso ikpo okwu, gere ntị nke ọma ka Joseph F. Rutherford na-ekwu okwu n’isiokwu bụ́ “Ụmụ Eze Ahụ.” Ka Rutherford dị afọ 71 na-ekwusị okwu ya, o ji olu onye bụ́ nna kwuo, sị:

“Unu nile . . . bụ́ ụmụaka ndị kweworo . . . irubere Chineke na Eze ya isi, biko bilienụ ọtọ.” Ụmụaka ahụ biliri ọtọ otu mgbe. “Lee,” ka Nwanna Rutherford kwuru, “ihe karịrị ndị àmà ọhụrụ 15,000 nke Alaeze ahụ!” A malitere ịkụ aka n’ụzọ dara ụda. Ọkà okwu ahụ gbakwụnyere, sị: “Unu nile ndị ga-eme ihe unu pụrụ ime iji gwa ndị ọzọ banyere alaeze Chineke . . . , biko sịnụ Ee.” Ụmụaka ahụ zara “Ee!” n’olu dara ụda. Mgbe ahụ, o gosiri akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Children, bụ́ nke e ji aka a kụrụ ruo ogologo oge nabata.

Mgbe okwu a na-akpali akpali gasịrị, ndị ahụ na-eto eto kwụụrụ n’ahịrị gbagoo n’elu ikpo okwu ahụ, bụ́ ebe Nwanna Rutherford nọ nye ha akwụkwọ ọhụrụ ahụ n’otu n’otu dị ka onyinye. Ihe omume ahụ mere ka anya mmiri gbaa ndị na-ege ntị. Otu onye hụrụ ihe omume ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ nanị onye obi ya dị ka nkume bụ onye ọ na-agaghị emetụ n’ahụ ịhụ ndị ntorobịa [na-egosipụta] ntụkwasị obi na okwukwe zuru ezu ha nwere n’ebe Chineke ha, bụ́ Jehova, nọ.”

Ná mgbakọ ahụ kwesịrị ncheta, e mere ndị na-eto eto dị 1,300 baptism ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Jehova. Ọtụtụ n’ime ha eguzosiwo ike n’okwukwe ruo taa. Ha na-enyere ọgbakọ ha aka, na-arụ ọrụ afọ ofufo na Betel, ma ọ bụ na-eje ozi ala ọzọ. N’ezie, “Ụbọchị Ụmụaka” na akwụkwọ ahụ bụ́ Children nwere mmetụta na-adịgide adịgide n’obi ọtụtụ ndị na-eto eto!

“O Yiri Ka Ha Na-abịa Kpọmkwem n’Oge Kwesịrị Ekwesị”

N’afọ ndị 1970, Ndịàmà Jehova bipụtakwuru akwụkwọ atọ bụ́ ndị ruru n’obi ọtụtụ narị puku ndị na-eto eto. Ndị a bụ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, na Akwukwọm nke Akukọ Bible. Na 1982, usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .” malitere ịpụta na magazin Teta! Ndị  na-eto eto na ndị agadi ekwuwo okwu ọma banyere isiokwu ndị a. “Ana m ekele Chineke kwa abalị maka ime ka e bipụta ha,” ka otu onye dị afọ 14 kwuru. “Isiokwu ndị ahụ na-amasị m nke ukwuu,” ka otu onye dị afọ 13 kwuru, “o yiri ka ha na-abịa kpọmkwem n’oge kwesịrị ekwesị.” Ndị nne na nna na ndị Kraịst bụ́ ndị okenye a họpụtara ahọpụta kweere na isiokwu ndị a anọwo na-abịa n’ezi oge ma na-aba uru.

Ka ọ na-erule 1989, ihe dị ka isiokwu 200 nke “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .” apụtawo na Teta! Ná Mgbakọ Distrikti “Nsọpụrụ Chineke” nke e nwere n’afọ ahụ, e wepụtara akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. Ò nyeworo ndị ntorobịa aka ịnọgidesi ike n’okwukwe? Ndị ntorobịa atọ dere, sị: “Akwụkwọ a aghọwo ihe na-enyere anyị aka n’ụzọ magburu onwe ya n’ịghọta nsogbu anyị na n’ịmata otú anyị ga-esi na-edozi ha. Unu emeela maka nchegbu unu na-enwe maka ọdịmma anyị.” Ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị na-agụ ya n’ụwa nile kweere nke a.

“O Gboro Agụụ Anyị”

Na 1999, Ndịàmà Jehova mepụtara ụdị ntụziaka ọzọ bịara n’ezi oge maka ndị ntorobịa—vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? Ọtụtụ mmadụ ekwuwo okwu ọma banyere ya. “Vidio a ruru m n’obi kpọmkwem,” ka otu onye dị afọ 14 kwuru. “Ọ ga-eso ná nri ime mmụọ anyị ga na-eri mgbe nile,” ka otu nne nanị ya na-azụ ụmụ kwuru. “Ọ na-enye obi ụtọ ịmara na ezi Enyi anyị, bụ́ Jehova, hụrụ ndị ntorobịa nọ ná nzukọ ya zuru ụwa ọnụ n’anya n’ezie ma na-elekọta ha,” ka otu nwa agbọghọ kwuru.

Gịnị ka vidio ahụ rụzuworo? Ndị na-eto eto na-asị: “O nyeworo m aka ịkpachara anya banyere ndị mụ na ha na-akpakọrịta, isoro ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-akpakọrịta, na imete Jehova enyi.” “O nyeworo m aka iguzogide nrụgide ndị ọgbọ m.” “O mewo ka mkpebi m ijere Jehova ozi ruo ókè ike kwere m, sie ike.” Otu di na nwunye dekwara, sị: “Anyị ji obi anyị na-ekele unu maka inye anyị ‘nri’ a. O gboro agụụ anyị.”

N’ikwesị ntụkwasị obi n’ọrụ Chineke nyere ya, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” e tere mmanụ enyewo ndị nile ga-anakwere ya nri ime mmụọ nke na-abịa n’ezi oge. Leekwa ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ otú ntụziaka dị otú ahụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ si enyere ndị na-eto eto aka taa ‘iguzo dị ka ndị zuru okè, ndị kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ’!