Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaanụ N’ihu N’ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ!

Gaanụ N’ihu N’ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ!

 Gaanụ N’ihu N’ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ!

“Ndị ji anya mmiri agha mkpụrụ ga-eji iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi.”—ABỤ ỌMA 126:5.

1. N’ihi gịnị ka a ga-eji ‘rịọ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ’ taa?

MGBE Jisọs Kraịst gasịrị njem nkwusa nke atọ o mere na Galili, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” (Matiu 9:37) Otú ahụ ka ọ dịkwa na Judia. (Luk 10:2) Ebe ọ dị otú ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, olee otú ọ dị taa? N’afọ ije ozi gara aga, ihe karịrị Ndịàmà Jehova 6,000,000 gara n’ihu n’ọrụ owuwe ihe ubi ihe atụ ahụ n’etiti mmadụ 6,000,000,000 nọ n’ụwa, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ‘a na-esogbu, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ Ya mere, agbamume Jisọs bụ́ ‘ịrịọ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya’ kwesịrị ekwesị ugbu a dị ka ọ dị ọtụtụ narị afọ gara aga.—Matiu 9:36, 38.

2. Gịnị na-eme ka ndị mmadụ mara anyị?

2 Jehova Chineke, bụ́ Onye Nwe owuwe ihe ubi ahụ, emezuwo arịrịọ ahụ a rịọrọ ya ka o zipụkwuo ndị ọrụ. Leekwa ihe ọṅụ ọ bụ ikere òkè n’ọrụ owuwe ihe ubi a Chineke na-eduzi! Ọ bụ ezie na anyị dị ole na ole ma e jiri anyị tụnyere mba dị iche iche, òkè anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ na-eme ka ụwa mara anyị. N’ọtụtụ ala, a na-akpọ anyị aha ugboro ugboro n’usoro mgbasa ozi. Ọ bụrụ na a pịa mgbịrịgba ụzọ n’ihe nkiri telivishọn, ọ pụrụ ime ka mmadụ kwuo na Ndịàmà Jehova nọ n’ọnụ ụzọ. Ee, a maara ọrụ ndị Kraịst anyị na-arụ dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi ihe atụ nke ọma na narị afọ nke 21 a.

3. (a) Olee otú anyị si mara na a rịbara ọrụ nkwusa Alaeze a rụrụ na narị afọ mbụ ama? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ndị mmụọ ozi na-akwado ozi anyị?

 3 Ndị nọ n’ụwa chọpụtakwara ọrụ nkwusa Alaeze a rụrụ na narị afọ mbụ ma kpagbuo ndị kwusara ozi ọma ahụ. N’ihi ya, Pọl onyeozi dere, sị: “Ana m eche na Chineke weere anyị, bụ́ ndị ozi, gosi, dị ka ndị ikpeazụ, dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ: n’ihi na e mere anyị [ndị ozi] ihe nkiri nye ụwa na ndị mmụọ ozi na mmadụ.” (1 Ndị Kọrint 4:9) N’ụzọ yiri nke ahụ, nnọgidesi ike anyị dị ka ndị nkwusa Alaeze n’agbanyeghị mkpagbu na-eme ka ụwa na-ahụ anyị, ọ dịkwa ndị mmụọ ozi mkpa. Mkpughe 14:6 na-ekwu, sị: “M [Jọn onyeozi] wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” Ee, ndị mmụọ ozi na-akwado anyị n’ozi anyị—ọrụ owuwe ihe ubi anyị!—Ndị Hibru 1:13, 14.

‘Ndị A Kpọrọ Asị’

4, 5. (a) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya? (b) Gịnị mere ndị ohu Chineke nke oge a ji bụrụ ‘ndị a kpọrọ asị’?

4 Mgbe Jisọs zipụrụ ndị ozi ya dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi, ha ṅara ntị ná ntụziaka o nyere ka ha bụrụ “ndị nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru.” Jisọs gbakwụnyere, sị: “Na-ezenụ mmadụ: N’ihi na ha ga-arara unu nye n’aka nnọkọ ikpe dị iche iche, n’ụlọ nzukọ nile ha ka ha ga-apịakwa unu ihe; ee, n’ihu ndị isi na ndị eze ka a ga-ekurukwa unu jee n’ihi m, ịbụrụ ha na ndị mba ọzọ àmà. . . . Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m: ma onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 10:16-22.

5 Anyị bụ ‘ndị a kpọrọ asị’ taa n’ihi na ‘ụwa dum na-atọgbọ n’aka ajọ onye ahụ,’ Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye iro ukwu nke Chineke na ndị Ya. (1 Jọn 5:19) Ndị iro anyị na-ahụ ọganihu ime mmụọ anyị ma ha adịghị ekweta na o si n’aka Jehova. Ndị mmegide na-ahụ obi ụtọ na ihu ọchị anyị ka anyị ji ọṅụ na-ekere òkè n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ. Ịdị n’otu anyị na-eju ha anya! N’ezie, ha pụrụ iji ịma ọsụ kwupụta ya mgbe ha gara n’ala ọzọ ma hụ na Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ na-arụ kpọmkwem otu ọrụ ahụ ha hụrụ na ha na-arụ n’ala nna ha. N’ezie, anyị maara na mgbe oge ya ruru, a ga-eme ka ọbụna ndị iro anyị mara Jehova, bụ́ onye na-akwado anyị na isi iyi nke ịdị n’otu anyị.—Ezikiel 38:10-12, 23.

6. Mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị na-enwe ka anyị na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ahụ, ma ajụjụ dị aṅaa na-ebilite?

6 Onye Nwe owuwe ihe ubi ahụ enyewo Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Matiu 28:18) N’ụzọ dị otú a, Jehova ji Jisọs na-eduzi ọrụ owuwe ihe ubi ahụ site n’aka ndị mmụọ ozi nke eluigwe na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke e tere mmanụ nọ n’ụwa ebe a. (Matiu 24:45-47; Mkpughe 14:6, 7) Ma, olee otú anyị pụrụ isi na-edi mmegide ndị iro ma nọgidekwa na-enwe ọṅụ ka anyị na-aga n’ihu n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ?

7. Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịnọgide na-enwe mgbe a na-emegide ma ọ bụ na-akpagbu anyị?

 7 Mgbe anyị na-eche mmegide ma ọ bụ ọbụna mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ihu, ka anyị rịọ Chineke maka enyemaka ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-enwe àgwà yiri nke Pọl. O dere, sị: “Mgbe a na-ekwutọ anyị, anyị na-agọzi: mgbe a na-esogbu anyị, anyị na-anagide: mgbe a na-ekwulu anyị, anyị na-arịọ arịrịọ.” (1 Ndị Kọrint 4:12, 13) Àgwà a, tinyere ozi anyị ji akọ na-eje maka ọha, na-eme mgbe ụfọdụ ka ndị na-emegide anyị gbanwee àgwà ha.

8. Mmesighachi obi ike dị aṅaa ka ị na-enweta site n’okwu Jisọs e dekọrọ na Matiu 10:28?

8 Ọbụna egwu ọnwụ adịghị eme ka ịnụ ọkụ n’obi anyị na-enwe dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi jụọ oyi. Anyị na-akpọsa ozi Alaeze ahụ n’ihu ọha ruo ókè o kwere mee, n’atụghị egwu. Anyị na-enwetakwa ihe mmesighachi obi ike na-agba ume site n’okwu Jisọs, bụ́: “Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ, ma ha apụghị igbu mkpụrụ obi: kama na-atụnụ egwu Onye ahụ Nke pụrụ ịla mkpụrụ obi na ahụ n’iyi [na Gehena, NW].” (Matiu 10:28) Anyị maara na Nna anyị nke eluigwe bụ Onye Na-enye ndụ. Ọ na-akwụghachi ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe nye ya ụgwọ ọrụ, bụ́ ndị jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-aga n’ihu n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ.

Ozi Na-azọpụta Ndụ

9. Olee otú ụfọdụ ndị si meghachi omume n’okwu Ezikiel, oleekwa otú ihe yiri nke ahụ si na-eme taa?

9 Mgbe Ezikiel onye amụma ji anyaike kwusaara “mba dị iche iche ndị na-enupụ isi”—alaeze Israel na Juda—ozi Jehova, obi dị ụfọdụ ndị ụtọ ịnụ ihe o nwere ikwu. (Ezikiel 2:3) “Lee,” ka Jehova kwuru, “ị dịịrị ha ka abụ nke ịhụnanya hiri nne, dị ka onye nwere olu mara mma, nke na-akpọkwa ụbọ nke ọma.” (Ezikiel 33:32) Ọ bụ ezie na okwu Ezikiel masịrị ha, ha emeghị ihe o kwuru. Gịnị na-eme taa? Mgbe ihe fọdụrụ e tere mmanụ na ndị enyi ha ji obi ike na-akpọsa ozi Jehova, ọ na-amasị ụfọdụ ndị ịnụ banyere ngọzi Alaeze ahụ, ma ha adịghị eji obi ekele anabata ya, ghọọ ndị na-eso ụzọ, ma sonye n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ.

10, 11. N’ọkara mbụ nke narị afọ nke 20, gịnị ka e mere iji kpọsaa ozi anyị na-azọpụta ndụ, ihe ndị dịkwa aṅaa ka ọ rụpụtara?

10 N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị emeghachiwo omume n’ụzọ dị mma n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ ma kerekwa òkè n’ịkpọsa ozi Chineke. Dị  ka ihe atụ, ná mgbakọ ndị Kraịst e mere site na 1922 ruo 1928, a kpọsara, n’ụzọ doro anya, ozi banyere ikpe a mara ajọ usoro ihe Setan. Ụlọ ọrụ redio dị iche iche kpọsara okwu ọmụma ikpe ndị a e kwuru ná mgbakọ ndị ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị Chineke kesara ọtụtụ nde akwụkwọ ndị na-ekwu banyere okwu ọmụma ikpe a.

11 N’ọgwụgwụ afọ ndị 1930, a malitere ụdị ọzọ nke ọrụ ịgba àmà—ngagharị mgbasa ozi. Na mbụ, ndị Jehova nyaara kaadị mkpọsa bụ́ ndị ha ji ama ọkwà okwu ihu ọha. Mgbe e mesịrị, ha nyaara kaadị mkpọsa ndị e dere okwu ndị dị ka “Okpukpe bụ ọnyà na ihe aghụghọ” nakwa “Jeere Chineke na Kraịst Bụ́ Eze Ozi.” Mgbe ha zọọrọ ije na-aga n’okporo àmà dị iche iche, ha na-adọrọ mmasị ndị na-agafenụ. ‘Nke a nyere nnọọ aka mee ka a mara Ndịàmà Jehova, meekwa ka obi sikwuo ha ike,’ ka otu nwanna nwoke kwuru bụ́ onye kerechiiri òkè anya n’ọrụ a n’okporo ámá ndị na-ekwo ekwo na London, England.

12. Tụkwasị n’ozi ikpe Chineke, olee ozi ọzọ anyị na-akpọsa, oleekwa ndị dị n’otu ugbu a n’ikwusa ozi ọma ahụ?

12 Ka anyị na-akpọsa ozi ikpe Chineke, anyị na-ekwukwa banyere akụkụ ndị dị mma nke ozi Alaeze ahụ. Àmà anyị ji anyaike agba n’ụwa na-enyere anyị aka ịchọpụta ndị kwesịrị ekwesị. (Matiu 10:11) Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ikpeazụ so ná ndị e tere mmanụ zara òkù ahụ dara ụda a kpọrọ maka owuwe ihe ubi n’afọ ndị 1920 na 1930. E mesịa, n’otu mgbakọ e mere na 1935, a nụrụ ozi dị ebube banyere ọdịnihu dị ngọzi maka “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ n’ụwa paradaịs. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Ha aṅawo ntị n’ozi ikpe Chineke, ha na ndị e tere mmanụ dịkwa n’otu n’ikwusa ozi ọma ahụ na-azọpụta ndụ.

13, 14. (a) Nkasị obi dị aṅaa ka a pụrụ inweta n’Abụ Ọma 126:5, 6? (b) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-agha mkpụrụ ma na-akwọsa ha mmiri?

13 Okwu ndị dị n’Abụ Ọma 126:5, 6 bụ ihe na-akasị obi n’ụzọ dị ukwuu nye ndị ọrụ owuwe ihe ubi Chineke, nakwa karịsịa ndị ahụ a na-akpagbu: “Ndị ji anya mmiri agha mkpụrụ ga-eji iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi. Onye na-ebu njụaka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụ ezie na ọ na-eje ije na-akwa ákwá; ma ọ ghaghị iwere iti mkpu ọṅụ bịaghachi, na-ebu ùkwù ọka ya nile.” Okwu ọbụ abụ ahụ banyere ịgha mkpụrụ na iwe ihe ubi bụ ihe atụ nke nlekọta Jehova lekọtara ihe fọdụrụ  ahụ si ná ndọrọ n’agha na Babilọn oge ochie lọta na ngọzi ọ gọziri ha. Obi tọrọ ha ụtọ nke ukwuu mgbe a tọhapụrụ ha, ma ha nwere ike ịkwawo ákwá mgbe ha na-agha mkpụrụ n’ala ahụ tọgbọọrọ n’efu bụ́ nke a na-arụghị ọrụ na ya n’ime afọ 70 ha nọ n’ala ọzọ. Otú ọ dị, ndị gara n’ihu n’ọrụ ịgha mkpụrụ na nke iwu ihe owuwu ha nụrụ ụtọ ihe si n’ọrụ ha pụta ma nwee afọ ojuju na ya.

14 Anyị pụrụ ịkwa ákwá mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa ma ọ bụkwanụ mgbe anyị ma ọ bụ ndị kwere ekwe ibe anyị na-ata ahụhụ n’ihi ezi omume. (1 Pita 3:14) N’ọrụ owuwe ihe ubi anyị, anyị pụrụ inwe ihe isi ike ná mmalite n’ihi na o yiri ka ọ dịghị ihe na-esi ná mgbalị ndị anyị na-etinye n’ozi apụta. Ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-agha mkpụrụ ma na-akwọsa ha mmiri, Chineke ga-eme ka ha too, mgbe mgbe karịa otú anyị tụrụ anya ya. (1 Ndị Kọrint 3:6) A na-ahụ nke a nke ọma n’ihe ndị anyị na-arụpụta ná nkesa anyị na-ekesa Bible na mbipụta ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.

15. Nye ihe atụ nke uru mbipụta ndị Kraịst bara n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ.

15 Tụlee ihe atụ nke otu nwoke aha ya bụ Jim. Mgbe mama ya nwụrụ, ọ hụrụ n’ime ngwongwo ya otu akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?  * O ji mmasị gụọ ya. Mgbe Jim na otu Onyeàmà bịakwutere ya n’okporo àmà kparịtara ụka, o kwetara ka o letaghachi ya, nke a dugakwara n’ọmụmụ Bible. Jim nwere ọganihu ime mmụọ dị ngwa, rara onwe ya nye Jehova, e meekwa ya baptism. Ọ gwara ndị ọzọ so n’ezinụlọ ya banyere ihe ọ mụtaworo. N’ihi ya, nwanne ya nwanyị na nwanne ya nwoke ghọrọ Ndịàmà Jehova, Jim mesịkwara nwee ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye ọrụ afọ ofufo oge nile na Betel dị na London.

Ndị A Na-akpagbu Ma Ha Ana-enwe Ọṅụ

16. (a) N’ihi gịnị ka e jiworo nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jisọs nyere banyere mmetụta ozi ọma ahụ ga-enwe, ma àgwà dị aṅaa ka anyị ji agakwuru ndị mmadụ?

16 N’ihi gịnị ka e jiworo nwee ihe ịga nke ọma dị otú ahụ n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ? Ọ bụ n’ihi na ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha aṅawo ntị ná ntụziaka Jisọs, bụ́: “Okwu M na-agwa unu n’ọchịchịrị, kwuonụ ya n’ìhè: ihe unu na-anụkwa ná ntị, kwusaanụ ya n’elu ụlọ.” (Matiu 10:27) Otú ọ dị, anyị pụrụ ịtụ anya ihe isi ike, n’ihi na Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Nwanne ga-ararakwa nwanne ya nye n’ọnwụ, nna ga-ararakwa nwa ya nye: ụmụ ga-ebilikwa megide ndị mụrụ ha, mee ka ha nwụọ anwụọ.” Jisọs kwukwara, sị: “Unu echela na abịara m ịtụba udo n’elu ụwa: abịaghị m ịtụba udo, kama ọ bụ mma agha.” (Matiu 10:21, 34) Jisọs ebughị n’obi ịma ụma na-ekewa ezinụlọ. Ma ozi ọma ahụ na-enwe mmetụta dị otú ahụ mgbe ụfọdụ. Otú ahụ ka ọ dị ndị ohu Chineke taa. Mgbe anyị na-eleta ezinụlọ dị iche iche, anyị adịghị ebu n’obi iwebata ihe ga-ekewa mmadụ na ibe ya. Ọchịchọ anyị bụ ka onye ọ bụla nakwere ozi ọma ahụ. N’ihi ya, anyị na-agbalị iji ụzọ obiọma na nke ọmịiko agakwuru onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ, bụ́ nke na-eme ka ozi anyị na-amasị ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 13:48.

17. Olee otú e si doo ndị na-akwado ọbụbụeze Chineke iche, gịnịkwa bụ otu ihe atụ ya?

17 Ozi Alaeze ahụ edowo ndị na-akwado ọbụbụeze Chineke iche. Dị ka ihe atụ, tụlee otú ndị ofufe ibe anyị si gbapụ iche n’ihi na ha ‘nyeghachiri Siza ihe nke Siza, nyeghachikwa Chineke ihe nke Chineke’ n’oge Ọchịchị Ndị Nazi, na Germany. (Luk 20:25) N’ụzọ dị iche n’ebe ndị ndú okpukpe na ndị Kraịst elu ọnụ bụ́ ndị nọ na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm nọ, ndị ohu Jehova guzosiri ike, na-ajụ imebi ụkpụrụ Bible. (Aịsaịa 2:4; Matiu 4:10; Jọn 17:16) Prọfesọ Christine King, onye dere akwụkwọ bụ́ The Nazi State and the New Religions, na-ekwu, sị: “Ọ bụ nanị megide Ndịàmà ka ọchịchị [Nazi] kụrụ afọ n’ala, n’ihi na ọ bụ ezie na ha gburu ọtụtụ puku n’ime ha, ọrụ ha gara n’ihu, na May 1945 kwa, okpukpe Ndịàmà Jehova ka nọ, ebe Ọchịchị Ndị Nazi na-adịghịzi.”

18. Àgwà dị aṅaa ka ndị Jehova na-egosipụta n’agbanyeghị mkpagbu?

18 N’ezie, ihe dị nnọọ ịrịba ama bụ àgwà ndị Jehova na-egosipụta mgbe ha chere mkpagbu  ihu. Ọ bụ ezie na okwukwe anyị pụrụ ịmasị ndị ọchịchị, iwe ma ọ bụ ọnụma anyị na-adịghị enwe na-eju ha anya. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà lanahụrụ Oké Mgbukpọ ahụ na-egosipụta ọṅụ na afọ ojuju ugboro ugboro ka ha na-echeta ahụmahụ ndị ha nwere. Ha maara na Jehova nyere ha “ọkịka nke ike.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Obi siri ndị e tere mmanụ nọ n’etiti anyị ike na “e dewo aha [ha] n’akwụkwọ n’eluigwe.” (Luk 10:20) Ntachi obi ha na-arụpụta olileanya nke na-adịghị eme ka ihere mee ha, ndị ọrụ owuwe ihe ubi na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwere olileanya ibi ndụ n’elu ala nwere nkwenkwe yiri nke ahụ.—Ndị Rom 5:4, 5.

Nọgidesienụ Ike n’Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ

19. Ụzọ ndị dị aṅaa dị irè ka e jiworo mee ihe n’ozi ndị Kraịst?

19 Anyị amabeghị ogologo oge Jehova ga-ekwe ka anyị rụruo ọrụ owuwe ihe ubi ihe atụ ahụ. Ka ọ dịgodị, anyị kwesịrị iburu n’uche na ndị na-ewe ihe ubi nwere ụzọ ndị a kapịrị ọnụ ha si arụ ọrụ ha. N’otu aka ahụ, anyị pụrụ ijide n’aka na ikwesị ntụkwasị obi anyị n’iji ụzọ ndị a nwaleworo iji mee nkwusa na-eme ihe, ga-arụpụta ihe dị mma. Pọl gwara ndị Kraịst ibe ya, sị: “Arịọ m unu, bụrụnụ ndị na-eṅomi m.” (1 Ndị Kọrint 4:16) Mgbe Pọl zutere ndị okenye Efesọs na Militọs, o chetaara ha na ya alabeghị azụ izi ha ihe “n’ihu ọha mmadụ, n’ụlọ nke aka [ha].” (Ọrụ 20:20, 21) Onye ya na Pọl rụkọrọ ọrụ bụ́ Timoti mụtara usoro onyeozi ahụ ji mee ihe, ya mere, o mere ka ndị Kọrint mara ha. (1 Ndị Kọrint 4:17) Chineke gọziri usoro Pọl ji zie ihe, ọbụna dị ka ọ ga-agọzi nnọgidesi ike anyị n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ihu ọha site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ná nletaghachi, n’ọmụmụ Bible ebe obibi, nakwa n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ndị mmadụ.—Ọrụ 17:17.

20. Olee otú Jisọs si gosi na a ga-enwe owuwe ihe ubi ime mmụọ n’ụba n’isi nso, oleekwa otú nke a siworo mezuo n’afọ ndị na-adịbeghị anya?

20 Mgbe ọ gbasịịrị nwanyị Sameria àmà na nso Saịka na 30 O.A., Jisọs kwuru banyere owuwe ihe ubi ime mmụọ. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Welienụ anya unu elu, kirie ubi, na ha chara acha ugbu a ka e were ihe dị n’ime ha. Onye na-ewere ihe ubi na-anara ụgwọ ọrụ ya, na-achịkọtakwa mkpụrụ nye ná ndụ ebighị ebi; ka onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewere ihe ubi wee ṅụrịa ọṅụ n’otu.” (Jọn 4:34-36) Ikekwe Jisọs ahụlarị mmetụta nzute o zutere nwanyị Sameria a ga-enwe, n’ihi na ọtụtụ mmadụ nọ na-enwe okwukwe n’ebe Jisọs nọ n’ihi àmà nwanyị ahụ gbara. (Jọn 4:39) N’afọ ndị na-adịbeghị anya, mba dị iche iche ewepụwo ihe mgbochi ndị ha tinyeere Ndịàmà Jehova ma ọ bụ mee ka a mara ha n’ụzọ iwu kwadoro, si otú a na-eme ka e nwee ubi ọhụrụ ndị a ga-ewe ihe ubi na ha. Ihe si na ya na-apụta bụ na owuwe ihe ubi ime mmụọ bara ụba na-aga n’ihu. N’ezie, n’ụwa nile, anyị na-enweta ngọzi ndị bara ụba ka anyị ji ọṅụ na-anọgide na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ.

21. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee ihe mere anyị ga-eji gaa n’ihu dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi na-enwe ọṅụ?

21 Mgbe ihe ọkụkụ chara ma ruo ka e wee ha, ndị ọrụ aghaghị ime ihe ngwa ngwa. Ha aghaghị ịrụsi ọrụ ike n’egbughị oge. Taa, ọ dị anyị mkpa iji ịdị uchu na echiche nke ịdị ngwa na-arụ ọrụ n’ihi na anyị na-ebi na “mgbe ọgwụgwụ.” (Daniel 12:4) Ee, anyị na-enweta ule dị iche iche, ma e nwere owuwe ihe ubi dị ukwuu nke ndị na-efe Jehova ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, ugbu a bụ oge ịṅụrị ọṅụ. (Aịsaịa 9:3) Ya mere, dị ka ndị ọrụ na-enwe ọṅụ, ka anyị gaa n’ihu n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma na-ekesa.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

Olee otú Onye Nwe owuwe ihe ubi ahụ siworo mezuo arịrịọ ahụ a rịọrọ ya ka o zipụkwuo ndị ọrụ?

Ọ bụ ezie na anyị bụ ‘ndị a kpọrọ asị,’ àgwà dị aṅaa ka anyị na-anọgide na-enwe?

N’ihi gịnị ka anyị ji enwe ọṅụ n’agbanyeghị na a na-akpagbu anyị?

Gịnị mere anyị ji kwesị iji echiche nke ịdị ngwa na-anọgidesi ike n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ndị mmụọ ozi na-akwado ndị na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ

[Foto dị na peeji nke 18]

E ji ngagharị mgbasa ozi mee ka ihe ka ọtụtụ mara ozi Alaeze ahụ

[Foto dị na peeji nke 18]

Anyị na-akụ ma na-akwọsa mmiri, ma, ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-eto