Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Mmụọ nke Na-adịghị Anwụ Anwụ?

Ì Nwere Mmụọ nke Na-adịghị Anwụ Anwụ?

Ì Nwere Mmụọ nke Na-adịghị Anwụ Anwụ?

“IHE ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume,” ka Pọl onyeozi dere. (2 Timoti 3:16) Ee, Bible bụ akwụkwọ eziokwu nke sitere n’aka ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.—Abụ Ọma 83:18.

Ebe Jehova bụ Onye Okike nke ihe nile, gụnyere ụmụ mmadụ, ọ maara nke ọma ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ. (Ndị Hibru 3:4; Mkpughe 4:11) O nyewokwa azịza ndị bụ́ eziokwu na ndị na-eju afọ banyere ajụjụ ndị metụtara ndụ mgbe a nwụsịrị n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible.

Gịnị Bụ Mmụọ?

Na Bible, okwu ndị a sụgharịrị ịbụ “mmụọ” pụtara n’ụzọ bụ́ isi “nkuume.” Ma nke a na-enye echiche karịrị nnọọ iku ume. Dị ka ihe atụ, Jemes onye so dee Bible, kwuru, sị: “Ahụ bụ ihe nwụrụ anwụ ma mmụọ adịghị ya.” (Jemes 2:26) N’ihi ya, mmụọ bụ ihe ahụ na-eme ka ahụ dị ndụ.

Ike a nke na-eme ka a dị ndụ apụghị ịbụ nanị ume, ma ọ bụ ikuku, nke na-abanye ma na-esi n’akpa ume apụta. N’ihi gịnị? N’ihi na mgbe a kwụsịrị iku ume, mkpụrụ ndụ nke ahụ na-anọgide na-adị ndụ ruo obere oge—“ruo ọtụtụ minit,” dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo. N’ihi nke a, mgbalị ndị e mere iji tụtee mmadụ pụrụ ịga nke ọma. Ma ozugbo ihe ji ndụ na-adịkwaghị n’ime mkpụrụ ndụ nke ahụ, mgbalị nile a na-eme iji weghachi ndụ na-akụ afọ n’ala. Ume, ma ọ bụ ikuku, nile dị n’ụwa apụghị ịtụte ọbụna otu mkpụrụ ndụ. Ya mere, mmụọ bụ ike ndụ a na-adịghị ahụ anya—ihe ji ndụ nke na-eme ka mkpụrụ ndụ na mmadụ dịgide ndụ. Iku ume na-eme ka ike ndụ a dịgide.—Job 34:14, 15.

Mmụọ ahụ ọ̀ na-arụ ọrụ nanị n’ahụ ụmụ mmadụ? Bible na-enyere anyị aka iru nkwubi okwu ziri ezi n’ihe banyere nke a. Eze Solomọn maara ihe kwetara na ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nwere “otu mmụọ,” ọ jụkwara, sị: “Ònye maara mmụọ nke ụmụ mmadụ, ma nke ahụ na-arịgo arịgo, na mmụọ nke anụmanụ, ma nke ahụ na-arịda n’okpuru ruo ala?” (Eklisiastis 3:19-21) Ya mere, a na-ekwu banyere ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ dị ka ndị nwere mmụọ. Olee otú nke ahụ pụrụ isi dị otú ahụ?

A pụrụ iji mmụọ, ma ọ bụ ike ndụ, tụnyere ike eletrik na-abanye n’ígwè ọrụ ma ọ bụ ngwá eletrik. A pụrụ iji ike a na-adịghị ahụ anya nke eletrik rụọ ọrụ dịgasị iche iche, na-adabere n’ụdị ngwá ọ na-enye ike. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ime ka stovu nwuo ọkụ, ka kọmputa hazie ihe ọmụma, nakwa ka telivishọn wepụta onyinyo na ụda olu. Ma, ọ dịghị mgbe ọ bụla ike eletrik ga-enwe ọdịdị ngwá ndị ọ na-enye ike nwere. Ọ na-anọgide na-abụ nanị ike. N’otu aka ahụ, ike ndụ adịghị enwe ọdịdị ọ bụla nke ihe e kere eke ndị ọ na-eme ka ha dịrị ndụ nwere. O nweghị àgwà, o nweghịkwa ikike iche echiche. Ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nwere “otu mmụọ.” (Eklisiastis 3:19) N’ihi ya, mgbe mmadụ nwụrụ, mmụọ ya adịghị adịgide ndụ n’ógbè ọzọ dị ka mmụọ e kere eke.

Gịnịzi bụ ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ? Gịnịkwa na-eme mmụọ mgbe mmadụ nwụrụ?

“Ọ Bụkwa Ájá Ka Ị Ga-alọta”

Mgbe mmadụ mbụ, bụ́ Adam, kpachaara anya nupụ isi n’iwu Chineke, Ọ gwara ya, sị: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alọta n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) Olee ebe Adam nọ tupu Jehova ejiri ájá kee ya? Ọ dịghị ebe ọ bụla ọ nọ! Ọ dịghị adị n’ezie. Ya mere, ihe Jehova Chineke na-ekwu mgbe ọ sịrị na Adam “ga-alọta n’ala” bụ na Adam ga-anwụ ma ghọghachi ụmụ irighiri ihe ndị dị n’ala. Adam agaghị agafe n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. Mgbe Adam nwụrụ, ọ ga-alaghachikwa n’ọnọdụ nke adịghị adị. Ntaramahụhụ e nyere ya bụ ọnwụ—ọnọdụ nke adịghị ndụ—ọ bụghị ịgafe n’ógbè ọzọ.—Ndị Rom 6:23.

Gịnị banyere ndị ọzọ nwụworo anwụ? E mere ka ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ pụta ìhè n’Eklisiastis 9:5, 10, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla . . . Nchụso, atụmatụ, ihe ọmụma ma ọ bụ ọgụgụ isi, adịghị n’ime ili.” (Moffatt) N’ihi ya, ọnwụ bụ ọnọdụ nke adịghị adị. Ọbụ abụ ahụ dere na mgbe mmadụ nwụrụ, “mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”—Abụ Ọma 146:4.

O doro anya na ndị nwụrụ anwụ adịghị adị. Ha apụghị ịma ihe ọ bụla. Ha apụghị ịhụ gị, ịnụ ihe ị na-ekwu, ma ọ bụ ịgwa gị okwu. Ha apụghị inyere gị aka ma ọ bụ imerụ gị ahụ. N’ezie, ọ dịghị gị mkpa ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu. Ma olee otú o si bụrụ na mmụọ “na-apụ apụ” n’ahụ mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nwụọ?

Mmụọ “Alaghachikwurukwa Chineke”

Bible na-ekwu na mgbe mmadụ nwụrụ, “mmụọ alaghachikwurukwa Chineke Onye nyere ya.” (Eklisiastis 12:7) Nke a ọ̀ pụtara na mmụọ na-agabiga mbara igwe n’ụzọ nkịtị ma gaa n’ihu Chineke? Ọ dịghị ma ọlị! Ụzọ Bible si eji okwu ahụ bụ́ ‘alaghachi’ eme ihe adịghị egosi na a ga-esi n’otu ebe gaa ebe ọzọ n’ezie. Dị ka ihe atụ, a gwara ụmụ Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi, sị: “Laghachikwutenụ m, Mụ onwe m ga-alaghachikwutekwa unu, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” (Malakaị 3:7) ‘Nlaghachikwute’ ụmụ Israel ga-alaghachikwute Jehova pụtara ichigharị hapụ ụzọ ọjọọ ma mee ka ụzọ ha kwekọghachi n’ụzọ ezi omume nke Chineke. ‘Nlaghachikwute’ Jehova ga-alaghachikwutekwa ụmụ Israel pụtara inweghachi ihu ọma n’ebe ndị ya nọ. N’ọnọdụ abụọ ndị a ‘nlaghachi’ metụtara àgwà, ọ bụghị isi n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ n’ụzọ nkịtị.

N’otu aka ahụ, mgbe mmadụ nwụrụ, mmụọ adịghị esi n’ụwa gaa n’eluigwe n’ezie mgbe ọ ‘na-alaghachikwuru’ Chineke. Ozugbo ike ndụ na-adịkwaghị n’ahụ mmadụ, ọ bụ nanị Chineke nwere ike nke inyeghachi ya onye ahụ. Ya mere, mmụọ ‘na-alaghachikwuru Chineke’ n’echiche nke na olileanya ọ bụla nke onye ahụ nwere ịdị ndụ n’ọdịnihu dịzi kpam kpam n’aka Chineke.

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ọnwụ Jisọs Kraịst. Luk bụ́ onye so dee Oziọma ndị ahụ, na-akọ, sị: “Mgbe Jisọs tisịrị mkpu n’oké olu, Ọ sị, Nna, n’aka Gị ka M na-enye mmụọ m idebe: mgbe O kwusịrị nke a, O wee kubie ume.” (Luk 23:46) Ka mmụọ Jisọs si n’ahụ ya pụọ, ọ gawaghị n’eluigwe n’ụzọ nkịtị. A kpọliteghị Jisọs n’ọnwụ ruo n’ụbọchị nke atọ, ọ bụkwa mgbe ụbọchị 40 gasịrị ka ọ rịgoro n’eluigwe. (Ọrụ 1:3, 9) Otú ọ dị, mgbe Jisọs na-anwụ, o ji obi ike nyefee Nna ya mmụọ ya, na-enwe ntụkwasị obi zuru ezu n’ikike Jehova nwere ime ka ọ dịghachi ndụ.

Ee, Chineke pụrụ ime ka mmadụ dịghachi ndụ. (Abụ Ọma 104:30) Lee atụmanya dị ebube nke a na-eme ka e nwee!

Olileanya E Ji n’Aka

Bible na-ekwu, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili [ncheta, NW] ga-anụ olu [Jisọs], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Ee, Jisọs Kraịst kwere nkwa na a ga-akpọlite ndị nile nọ ná ncheta Jehova n’ọnwụ, ma ọ bụ mee ka ha dịghachi ndụ. N’ezie, ndị ga-eso n’ime ha ga-abụ ndị gbasoworo ụzọ nke ezi omume dị ka ndị ohu Jehova. Ma ọtụtụ nde ndị ọzọ anwụwo n’egosighị ma ha ga-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke. Ma ọ bụghị na ha amaghị banyere ihe Jehova na-achọ n’aka ha, ya abụrụ na ha enweghị oge zuru ezu ime mgbanwe ndị dị mkpa. Ndị dị otú a nọkwa ná ncheta Chineke, ọ ga-akpọlitekwa ha n’ọnwụ, n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 24:15.

Taa, ụwa jupụtara n’ịkpọasị na esemokwu, ime ihe ike na mwụfu ọbara, mmetọ na ọrịa. Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ ga-adịghachi ndụ n’ụwa nke dị otú a, n’ezie, obi ụtọ a ga-enwe agaghị adịte aka. Ma Onye Okike ekwewo nkwa na ya ga-eweta ụwa ọha mmadụ dị ugbu a, bụ́ nke nọ n’okpuru nchịkwa Setan bụ́ Ekwensu, ná njedebe n’isi nso. (Ilu 2:21, 22; Daniel 2:44; 1 Jọn 5:19) Ọha mmadụ bụ́ ndị ezi omume—“ụwa ọhụrụ”—ga-abụzi ihe dị adị n’ezie n’ụzọ dị ebube.—2 Pita 3:13.

N’oge ahụ “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) A ga-ewepụ ọbụna oké ihe mgbu nke ọnwụ, n’ihi na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:4) Lee olileanya magburu onwe ya nke a bụụrụ ‘ndị nọ n’ili ncheta’!

Mgbe Jehova ga-ekpochapụ ajọ omume n’ụwa, ọ gaghị ebibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (Abụ Ọma 37:10, 11; 145:20) N’ezie, “oké ìgwè mmadụ” ndị “si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” ga-alanarị “oké mkpagbu ahụ,” bụ́ nke ga-ebibi ajọ ụwa dị ugbu a. (Mkpughe 7:9-14) N’ihi ya, oké ìgwè mmadụ ga-anọ ya ịnabata ndị e si n’ọnwụ kpọlite.

Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ịhụ ndị ị hụrụ n’anya ọzọ? Ị̀ chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala? Mgbe ahụ, ị ghaghị inweta ezi ihe ọmụma banyere uche na nzube Chineke. (Jọn 17:3) Ọ bụ uche Jehova “ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.”—1 Timoti 2:3, 4.

[Foto dị na peeji nke 4]

“Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta”

[Foto dị na peeji nke 5]

A pụrụ iji mmụọ tụnyere ike eletrik

[Foto dị na peeji nke 7]

Mbilite n’ọnwụ ga-eweta ọṅụ na-adịgide adịgide