Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-elekọtanụ Ụmụ Mgbei na Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ ná Mkpagbu Ha

Na-elekọtanụ Ụmụ Mgbei na Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ ná Mkpagbu Ha

 Na-elekọtanụ Ụmụ Mgbei na Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ ná Mkpagbu Ha

O sighị ike ịmata na anyị bi n’ụwa nke ịhụnanya na-adịghị na ya. N’ikwu banyere ụdị mmadụ ndị ga-ebi na “mgbe ikpeazụ,” Pọl onyeozi dere, sị: “Oge dị oké egwu ga-abịa . . . N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, . . . ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ.” (2 Timoti 3:1-3) Lee otú okwu ndị ahụ si bụrụ eziokwu!

ỌNỌDỤ e nwere n’oge anyị n’ihe banyere omume so n’ihe ndị na-eme ka ọtụtụ mmadụ ghara ịdị na-enwe ọmịiko. N’ụzọ na-ebelatawanye ebelata, ndị mmadụ adịghịzi enwe mmasị n’ọdịmma nke ndị ọzọ, n’ọnọdụ ụfọdụ ọbụna n’ọdịmma nke ndị ezinụlọ nke aka ha.

Nke a na-enwe mmetụta dị njọ n’ahụ ọtụtụ ndị bụ́ ndị nọ n’ụkọ n’ihi ọnọdụ ndị dịgasị iche iche. Ọnụ ọgụgụ ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei nọgidere na-arị elu n’ihi agha, ọdachi ndị na-emere onwe ha, na mgbasa ndị mmadụ na-agbasasị mgbe ha na-agba ọsọ ndụ. (Eklisiastis 3:19) “Ihe karịrị otu nde [ụmụaka] aghọwo ụmụ mgbei ma ọ bụ ndị e kewapụrụ n’ebe ezinụlọ ha nọ n’ihi agha,” ka otu akụkọ si n’aka Òtù Na-ahụ Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu. Ị makwaara banyere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ, ndị nke a gbahapụrụ agbahapụ, ma ọ bụ ndị nke a gbara alụkwaghịm bụ́ ndị na-eche ọrụ siri ike ihu, bụ́ ịnọgide na-adị ndụ ma zụlite ezinụlọ ha n’onwe ha. Eziokwu ahụ bụ́ na mba ụfọdụ nwere oké nsogbu akụ̀ na ụba, bụ́ nke na-eme ka ọtụtụ ụmụ amaala ha bụrụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, emewo ka ọnọdụ ahụ ka njọ.

N’ihi nke a, è nwere olileanya ọ bụla dịịrị ndị nọ ná mkpagbu? Olee otú a pụrụ isi belata nhụjuanya nke ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei? Ọ̀ dị mgbe ọ bụla a ga-agwọta nsogbu a?

Nlekọta Ịhụnanya n’Oge Bible

Ilekọta mkpa anụ ahụ na nke ime mmụọ nke ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei abụrụwo mgbe nile akụkụ dị mkpa nke ife Chineke ofufe. Mgbe ndị Israel na-ewe ihe ubi, ha agaghị achịkọta ihe fọdụrụ n’ubi ha, na-alọghachi azụ ịchịkọrọ ihe ha hapụrụ. Ọ bụ “ọbịa, na nwa mgbei, na nwanyị di ya nwụrụ” ka ọ dịịrị ịchịkọta ihe ndị ahụ. (Deuterọnọmi 24:19-21) Iwu Mosis kwuru kpọmkwem, sị: “Nwanyị ọ bụla di  ya nwụrụ, ma ọ bụ nwa mgbei, unu ewedala ya n’ala.” (Ọpụpụ 22:22, 23) N’ụzọ dabara adaba, ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei ndị e kwuru okwu ha na Bible nọchiri anya ndị dara ogbenye karị, ebe ọ bụ na mgbe di na nna ma ọ bụ nne na nna nwụrụ, ndị fọdụrụ n’ezinụlọ ahụ pụrụ ịbụ ndị a hapụrụ nanị ha na ndị nọ n’ụkọ. Nna ochie ahụ bụ́ Job kwuru, sị: “M mere onye e wedara n’ala nke na-etiku m ka o wepụga onwe ya, ya na nwa mgbei, bụ́ onye na-enweghị onye na-enyere ya aka.”—Job 29:12.

N’oge ọgbakọ ndị Kraịst malitere ọhụrụ, ilekọta ndị nọ ná mkpagbu na ndị nọ ná mkpa n’ezie n’ihi ọnwụ nke nne na nna ma ọ bụ nke di bụ otu n’ime ihe ndị e ji mara ezi ofufe. N’inwe ezi mmasị n’ọdịmma nke ndị dị otú ahụ, Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: “Okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a, ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha, na idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”—Jemes 1:27.

E wezụga ịkpọtụ ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ aha, Jemes gosipụtakwara nchegbu miri emi maka ndị ọzọ bụ́ ndị dara ogbenye na ndị nọ n’ụkọ. (Jemes 2:5, 6, 15, 16) Pọl onyeozi gosipụtakwara mmetụta yiri nke ahụ. Mgbe e nyere ya na Banabas ọrụ ime nkwusa, ‘icheta ndị ogbenye’ so ná ntụziaka ndị ha natara. “M nụrụ ọkụ n’obi ime otu ihe ahụ,” ka Pọl ji akọ na uche dị ọcha kwuo. (Ndị Galetia 2:9, 10) Ihe ndekọ banyere ọrụ ọgbakọ ndị Kraịst rụrụ n’oge na-adịghị anya e guzobesịrị ya kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’etiti ha mkpa na-akpa: . . . e wee na-eke òkè enye ha nile n’otu n’otu, dị ka ọ dị onye ọ bụla mkpa.” (Ọrụ 4:34, 35) Ee, e webatara ndokwa ahụ e guzobere n’Israel oge ochie maka ilekọta ụmụ mgbei, ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị nọ n’ụkọ, n’ime ọgbakọ ndị Kraịst.

 N’ezie, enyemaka ahụ weere ọnọdụ n’ụzọ dị otú kwesịrị nakwa n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ọgbakọ nke ọ bụla nwere. E mefusịghị ego, ndị e nyekwaara aka nọ ná mkpa n’ezie. Ọ dịghị onye Kraịst ọ bụla ga-eji ndokwa a mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, a gaghịkwa ebukwasị ọgbakọ ibu arọ na-adịghị mkpa. Nke a pụtara nnọọ ìhè ná ntụziaka Pọl nke e depụtara na 1 Timoti 5:3-16. N’ebe ahụ, anyị na-ahụ na ọ bụrụ na ndị ikwu nke onye ahụ nọ ná mkpa nwere ike inyere ha aka, ọ bụ ha ga-ebu ibu ọrụ ahụ. Ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị nọ ná mkpa aghaghị iru ihe ụfọdụ a chọrọ n’aka ha iji ruo eruo ịbụ ndị a ga-enyere aka. Ihe a nile na-egosipụta ndokwa amamihe dị na ya nke Jehova ji elekọta ndị nọ ná mkpa. Ma, ọ na-egosikwa na a ghaghị iji ezi uche mee ihe ka onye ọ bụla ghara iji obiọma e gosipụtara mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.—2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12.

Ilekọta Ụmụ Mgbei na Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ Taa

Ụkpụrụ ndị ahụ ndị ohu Chineke gbasoro n’oge gara aga ka dịkwa irè taa n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ma a bịa n’ihe banyere igosipụta nchegbu maka ndị nọ ná mkpagbu na inyere ha aka. Ịhụnanya ụmụnna bụ ihe e ji amata ha, dị nnọọ ka Jisọs kwuru: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ọ bụrụ na ụfọdụ nọ ná mkpa ma ọ bụ bụrụ ndị ọdachi dakwasịrị ma ọ bụ ndị na-ata ahụhụ n’ihi ihe agha ma ọ bụ ọgụ ime obodo kpatara, ndị ọzọ so n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ na-achọsi ike ịchọpụta ụzọ ndị ha pụrụ isi nyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ ihe onwunwe. Ka anyị hụ ụfọdụ ahụmahụ ndị e nwere n’oge a bụ́ ndị na-egosi ihe a na-eme banyere nke a.

Pedro adịghị echeta ihe dị ukwuu banyere mama ya bụ́ onye nwụrụ mgbe ọ dị nanị otu afọ na ọkara. Mgbe Pedro dị afọ ise, papa ya nwụkwara. N’ihi ya, a hapụrụ nanị Pedro na ụmụnne ya. Ndịàmà Jehova anọworị na-akpọtụrụ papa ha, ya mere a malitere iduziri Pedro na ụmụnne ya ndị tọrọ ya ọmụmụ Bible ebe obibi.

Pedro na-akọ, sị: “Kpọmkwem n’izu sochirinụ, anyị malitere ịga nzukọ. Ka anyị na-eso ụmụnna na-akpakọrịta, anyị nwere mmetụta nke ịhụnanya ha na-egosipụta n’ebe anyị nọ. Ọgbakọ bụụrụ m ebe mgbaba n’ihi na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị gosipụtara ịhụnanya na mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe m nọ, dị nnọọ ka a ga-asị na ọ bụ ha mụrụ m.” Pedro na-echeta na otu n’ime ndị Kraịst bụ́ okenye na-akpọ ya ka ọ bịa n’ụlọ ya. N’ebe ahụ, Pedro na-eso ezinụlọ ya ekere òkè ná mkparịta ụka nakwa ná ntụrụndụ. “Obi na-adị m nnọọ mma ma m cheta ihe ndị a,” ka Pedro na-ekwu, bụ́ onye malitere ime nkwusa banyere okwukwe ya mgbe ọ dị afọ 11, e meekwa ya baptism mgbe ọ dị afọ 15. N’ịbụ ndị ndị nọ n’ọgbakọ nyeere aka, n’otu aka ahụ, ụmụnne ya ndị tọrọ ya nwekwara ọganihu dị ukwuu n’ụzọ ime mmụọ.

Onye ọzọ bụ David. A gbahapụrụ ya na ejima ya bụ́ nwanyị mgbe ndị mụrụ ha kewara. Nne na nna ha ochie na nwanne mama ha nke nwanyị zụlitere ha. “Mgbe anyị tolitetụrụ ma chọpụta ọnọdụ anyị nọ na ya, anyị nwere mmetụta nke anọghị ná nchebe, nweekwa mwute. Nkwado dị anyị mkpa. Nwanne mama anyị nke nwanyị ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, n’ihi ya kwa, e ji eziokwu nke Bible zie anyị ihe. Ụmụnna gosiri anyị mmetụta na-ekpo ọkụ na omume enyi. Ha nwere mmasị dị ukwuu n’ebe anyị nọ ma gbaa anyị ume iru ihe mgbaru ọsọ dị iche iche na ịnọgide na-arụrụ Jehova ọrụ. Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri, otu ohu na-eje ozi na-abịa akpọ m aga ozi ubi. Nwanna nwoke ọzọ kwụụrụ m ụgwọ ihe m mefuru mgbe m gara mgbakọ dị iche iche. Ọbụna onye ọzọ nyeere m aka ka m wee nwee ike inye onyinye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.”

E mere David baptism mgbe ọ dị afọ 17, mgbe  e mesịkwara, ọ malitere ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico. Ọbụna ugbu a, ọ na-ekweta, sị: “E nwere ọtụtụ ndị okenye tụnyere ụtụ n’agụmakwụkwọ m ma nye m ndụmọdụ ndị nyeere m aka. N’ụzọ dị otú a, m na-emeri mmetụta nke anọghị ná nchebe na nke owu ọmụma.”

Abel, bụ́ okenye n’otu ọgbakọ dị na Mexico bụ́ ebe e nwere ọtụtụ ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị enyemaka dị mkpa, na-akọ, sị: “Ekwenyere m na mkpa kasị chọọ nlebara anya nke ndị inyom di ha nwụrụ nwere bụ ịkwado ha n’ụzọ mmetụta uche. Mgbe ụfọdụ, ha na-ada mbà n’obi; ha na-enwe mmetụta nke owu ọmụma. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ịdị na-enye ha nkwado, na-ege ha ntị. Anyị [ndị okenye ọgbakọ] na-eleta ha ugboro ugboro. Ọ dị mma iwepụta oge iji hụ maka nsogbu ha. Nke a so eme ka ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a kasiri obi n’ụzọ ime mmụọ.” Otú ọ dị, ọ dịkwa mkpa inyere ha aka mgbe ụfọdụ n’ụzọ ihe onwunwe. “Ugbu a, anyị na-ewuru otu nwanna nwanyị di ya nwụrụ ụlọ,” ka Abel kọrọ n’oge na-adịbeghị anya. “Anyị na-eji Saturday ụfọdụ na ehihie ụfọdụ n’izu arụ ọrụ n’ụlọ ya.”

Banyere ahụmahụ o nwere n’onwe ya n’inyere ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ aka, onye ọzọ bụ́ okenye ọgbakọ na-ekwu, sị: “Ekweere m na ụmụ mgbei nwere mkpa dị ukwuu maka ịhụnanya ndị Kraịst ọbụna karịa ka ndị inyom di ha nwụrụ nwere. Achọpụtara m na o yiri ka ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a jụrụ ajụ karịa ụmụaka na ndị nọ n’oge uto bụ́ ndị nwere nne na nna. Ọ dị ha mkpa ịbụ ndị a na-egosi ịhụnanya ụmụnna n’ụzọ dị ukwuu. Ọ dị mma ịchọ ha mgbe nzukọ gbasasịrị iji chọpụta otú ha mere. E nwere otu nwanna nwoke lụrụ nwunye bụ́ onye ghọrọ nwa mgbei mgbe ọ dị obere. Ana m ekele ya mgbe nile n’ụzọ na-ekpo ọkụ, ọ na-amakụkwa m mgbe ọ bụla ọ hụrụ m. Nke a na-eme ka ihe nkekọ nke ezi ịhụnanya ụmụnna sikwuo ike.”

Jehova “Ga-anapụta Ogbenye”

Ịtụkwasị Jehova obi bụ isi ihe na-enye aka n’ịnagide ọnọdụ nke ịbụ ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei. E kwuru banyere Ya, sị: “Jehova na-edebe ndị ala ọzọ; nwa mgbei na nwanyị di ya nwụrụ ka Ọ na-eme ka ha guzo ọtọ.” (Abụ Ọma 146:9) Ọ bụ nanị Alaeze Chineke nke dị n’aka Jisọs Kraịst ga-agwọta ụdị nsogbu a kpam kpam. Mgbe ọbụ abụ ahụ na-akọwa ịchịisi Mesaịa ahụ n’ụzọ amụma, o dere, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.”—Abụ Ọma 72:12, 13.

Ka ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a na-erukwu nso, nrụgide ndị Kraịst n’ozuzu ha na-enwe ga-amụbarịrị. (Matiu 24:9-13) Ọ dị mkpa kwa ụbọchị ka ndị Kraịst na-egosipụtakwu nchegbu n’ebe ibe ha nọ ma ‘na-eme ka ịhụnanya ha na-ahụrịta onwe ha dị ike.’ (1 Pita 4:7-10) Ọ dị ndị ikom bụ́ ndị Kraịst, karịsịa ndị okenye, mkpa igosipụta nchegbu na ọmịiko n’ebe ụmụ mgbei nọ. Ndị inyom tozuru okè nọ n’ọgbakọ pụkwara inye ndị inyom di ha nwụrụ nkwado dị ukwuu ma bụụrụ ha ndị ngụgụ obi. (Taịtọs 2:3-5) N’ezie, onye ọ bụla pụrụ ịtụnye ụtụ site n’ịdị na-egosipụta nchegbu n’ebe ndị ọzọ bụ́ ndị nọ ná mkpagbu nọ.

Ezi ndị Kraịst adịghị ‘emechi obi ebere ha’ mgbe ha hụrụ ‘nwanna ha ka ọ nọ ná mkpa.’ Ha maara nnọọ na ha kwesịrị ịṅa ntị na ndụmọdụ Jọn onyeozi, bụ́: “Ụmụntakịrị m, ka anyị ghara ịhụ n’anya n’okwu, ma ọ bụ n’ire; kama ka anyị na-ahụ n’anya n’ọrụ na eziokwu.” (1 Jọn 3:17, 18) Ya mere ka anyị ‘na-elekọta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ ná mkpagbu ha.’—Jemes 1:27.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

“Ka anyị ghara ịhụ n’anya n’okwu, ma ọ bụ n’ire; kama ka anyị na-ahụ n’anya n’ọrụ na eziokwu.”—1 Jọn 3:18

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ezi ndị Kraịst na-elekọta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ụzọ ihe onwunwe, n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ mmetụta uche