Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkwupụta Mmehie nke Na-eduga n’Ọgwụgwọ

Nkwupụta Mmehie nke Na-eduga n’Ọgwụgwọ

Nkwupụta Mmehie nke Na-eduga n’Ọgwụgwọ

“MGBE m gbara nkịtị, ọkpụkpụ m nile kara nká site n’ọgbụgbọ ụja m ogologo ụbọchị nile. N’ihi na ehihie na abalị aka Gị dị arọ n’ahụ m: ume m gbanwere n’ihe ịkpọ nkụ nke ụgụrụ.” (Abụ Ọma 32:3, 4) Okwu ndị ahụ na-emetụ nnọọ n’ahụ pụrụ igosipụtawo ihe mgbu mmetụta uche miri emi nke Eze Devid nke Israel oge ochie nwere, bụ́ ihe mgbu o wetawooro onwe ya site n’izochi kama ikwupụta otu mmehie dị oké njọ.

Devid bụ nwoke nwere ike pụtara ìhè. Ọ bụ dike nwere obi ike, onye nwere nkà n’ọchịchị, onye na-ede uri, na onye na-agụ egwú. Ma, ọ dabeere, ọ bụghị n’ike nke onwe ya, kama n’ebe Chineke ya nọ. (1 Samuel 17:45, 46) A kọwara ya dị ka nwoke nke obi ya ‘zuru okè n’ebe Jehova nọ.’ (1 Ndị Eze 11:4) Ma otu mmehie o mere bụ nnọọ nke kwesịrị nkatọ, ọ pụkwara izowo aka na ya n’Abụ Ọma nke 32. Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’inyocha ọnọdụ ndị dugara ná mmehie ya. Anyị ga-ahụ ọnyà ndị anyị ga-ezere, hụkwa mkpa ọ dị ikwupụta mmehie anyị iji soroghachi Chineke na-enwe mmekọrịta.

Eze Na-eguzosi Ike n’Ihe Adaba ná Mmehie

Mba Israel na-alụso ndị Amọn agha, ma Devid bi na Jerusalem. Otu anyasị, ka ọ na-agagharị n’elu ụlọ nke obí ya, ọ hụrụ otu nwanyị mara mma ka ọ na-asa ahụ n’ebe obibi ndị ha na ya gbara agbata obi. O jideghị onwe ya kama ọ malitere inwe agụụ mmekọahụ n’ebe ọ nọ nke ukwuu. Mgbe ọ matara na ọ bụ Bat-sheba, nwunye Uraịa, bụ́ onye agha nọ n’usuu ndị agha ya, Devid kpọrọ nwanyị ahụ, ma soro ya kwaa iko. Ka oge na-aga, Bat-sheba gwara Devid na ya adịla ime.—2 Samuel 11:1-5.

Devid amala n’ọnyà. Ọ bụrụ na e kpughee mmehie ha, ntaramahụhụ a ga-enye ha abụọ bụ ọnwụ. (Levitikọs 20:10) Ya mere, o chepụtara otu atụmatụ. O si n’ọgbọ agha kpọlata di Bat-sheba, bụ́ Uraịa. Mgbe Devid jụsịrị Uraịa ajụjụ zuru ezu banyere agha ahụ, ọ gwara ya ka ọ laghachi n’ebe obibi ya. Devid nwere olileanya na nke a ga-eme ka o yie ka ọ̀ bụ Uraịa bụ nna nwa Bat-sheba.—2 Samuel 11:6-9.

N’ịbụ ihe nkoropụ obi nye Devid, Uraịa agaghị hụ nwunye ya. Uraịa sịrị na ọ bụ ihe na-adịghị mma ya ịlaghachi n’ebe obibi ya mgbe usuu ndị agha ha na-ahụsi anya n’ọgbọ agha. Mgbe ndị agha Israel nọ n’agha, ndị ikom ahụ na-ezere inwe mmekọahụ, ọbụna ha na nwunye ha. Ha aghaghị ịnọgide na-adị ọcha dị ka omenala si dị. (1 Samuel 21:5) Devid kpọziri Uraịa maka iri ihe ma mee ka ọ ṅụbiga mmanya ókè, ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ lakwurughị nwunye ya. Omume ikwesị ntụkwasị obi Uraịa mara mmehie dị oké njọ nke Devid ikpe.—2 Samuel 11:10-13.

Ọnyà mmehie ya siri na-ekechikwu Devid. N’enweghịzi olileanya, ọ hụrụ nanị otu ụzọ ọ ga-esi lanahụ. O nyere Uraịa akwụkwọ ọ ga-enye onyeisi agha, bụ́ Joab, ma zighachi ya n’ọgbọ agha. Ebumnobi o ji dee ihe odide ahụ dị mkpirikpi doro anya: “Doonụ Uraịa ná ncherịta ihu agha ahụ nke siri ike karị, sinụ n’iso ya laa azụ, ka e wee tigbuo ya, o wee nwụọ.” Site n’ihe e ji mkpịsị akwụkwọ dee, eze ahụ dị ike yiri ka o zochiela ihe ndị o mere ma mee ka Uraịa nwụọ.—2 Samuel 11:14-17.

Ozugbo oge Bat-sheba ji ruo újú ọnwụ di ya gasịrị, Devid lụrụ ya. Oge gafere, a mụkwara nwa ha. N’oge ihe a nile na-eme, Devid gbachiri nkịtị banyere mmehie ya. Ikekwe ọ nọ na-anwa igosi onwe ya na ihe ndị o mere ziri ezi. Ọ̀ bụ na Uraịa anwụghị n’ụzo dị ùgwù n’agha dị ka ndị ọzọ nwụworo? Ọzọkwa, ọ̀ bụ na o nupụbeghịrị eze ya isi site n’ịjụ ịlakwuru nwunye ya? “Obi dị aghụghọ” ga-eji echiche dịgasị iche iche mee ihe iji nwaa ime ka mmehie yie ihe ziri ezi.—Jeremaịa 17:9; 2 Samuel 11:25.

Ngahie Ndị Na-eduga ná Mmehie

Olee otú Devid, bụ́ nwoke hụrụ ezi omume n’anya, ga-eji wedaa onwe ya ala gaa n’ịkwa iko na igbu ọchụ? O doro anya na o were ya oge ụfọdụ iji kụnye mkpụrụ nke mmehie ya. Anyị pụrụ iche echiche ihe mere na Devid anọnyeghịrị ndị ikom ya, na-akwado ha n’agha ha na-alụso ndị iro Jehova. N’ụzọ megidere nke ahụ, Devid nọ na-atụsara ahụ n’obí ya, bụ́ ebe nchegbu nke agha na-abatachaghị ya n’obi iji wepụ nnọọ ọchịchọ ya na-ezighị ezi maka nwunye nke onye agha na-ekwesị ntụkwasị obi. Taa, ọ bụ ihe nchebe nye ezi ndị Kraịst ịbụ ndị na-eso ọgbakọ ha na-ekere òkè chiri anya n’ihe ime mmụọ nakwa ikerechi òkè anya n’ọrụ izisa ozi ọma.—1 Timoti 6:12.

E nyere eze Israel iwu idepụta Iwu ahụ na ịgụ ya kwa ụbọchị. Bible kwuru ihe mere e ji nye ntụziaka ahụ: “Ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke ya, idebe okwu nile nke iwu a na ụkpụrụ ndị a, ime ha: ka obi ya wee ghara ịdị elu karịa ụmụnne ya, ka ọ gharakwa isi n’ihe e nyere n’iwu wezụga onwe ya, n’aka nri, ma ọ bụ n’aka ekpe.” (Deuterọnọmi 17:18-20) O yiri ka, ma eleghị anya, Devid anọghị na-agbaso ntụziaka ahụ n’oge o mere ajọ mmehie ndị a. Ịmụ Okwu Chineke na ịtụgharị uche na ya mgbe nile ga-enye aka n’ezie ichebe anyị pụọ n’omume ọjọọ n’oge ndị a dị oké egwu.—Ilu 2:10-12.

Ọzọkwa, nke ikpeazụ n’ime Iwu Iri ahụ kwuru kpọmkwem, sị: “Gị enwela anyaukwu n’ebe nwunye mmadụ ibe gị nọ.” (Ọpụpụ 20:17) Ka ọ na-erule n’oge a, Devid nwere ọtụtụ nwunye na ndị iko nwanyị. (2 Samuel 3:2-5) Ma nke ahụ echebeghị ya pụọ n’inwe anyaukwu n’ebe nwanyị ọzọ mara mma nọ. Ihe ndekọ a na-echetara anyị ịdị mkpa nke okwu Jisọs, bụ́: “Nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:28) Kama ịnọgide na-enwe ọchịchọ ndị dị otú ahụ na-ezighị ezi, ka anyị dị ngwa n’iwepụ ha n’uche nakwa n’obi anyị.

Nchegharị na Ebere

N’ezie, ihe ndekọ ahụ bụ́ eziokwu nke Bible banyere mmehie Devid adịghị n’ebe ahụ iji mejuo ọchịchọ mmekọahụ mmadụ. Ihe ndekọ ahụ na-enye anyị ohere iji hụ ngosipụta dị ike ma na-akpali akpali nke otu n’ime àgwà Jehova ndị pụtara ìhè—ebere ya.—Ọpụpụ 34:6, 7.

Mgbe Bat-sheba mụsịrị nwa nwoke, Jehova zigara Netan onye amụma ịgakwuru Devid. Nke a bụ omume ebere. Ọ bụrụ na e jekwughịrị Devid, o wee nọgide na-agbachi nkịtị, o kwere omume na ọ gaara akpọwo ekwo nkụ n’ụzọ mmehie. (Ndị Hibru 3:13) N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Devid nabatara ebere Chineke. Okwu ndị doro anya Netan ji nkà kwuo mere ka akọ na uche Devid maa ya ikpe, o jikwa obi umeala kweta na ya emehiewo megide Chineke. N’ezie, e dere Abụ Ọma nke 51, bụ́ nke na-ekwu banyere mmehie Devid n’ihe banyere Bat-sheba, mgbe o chegharịsịrị ma kwupụta ajọ mmehie ya. Ka anyị ghara ikwe ka obi anyị kpọọ nkụ ma ọ bụrụ na anyị emee mmehie dị oké njọ.—2 Samuel 12:1-13.

A gbaghaara Devid, ma e chebeghị ya pụọ n’ahụhụ ma ọ bụ n’ihe ndị si ná mmehie ya pụta. (Ilu 6:27) Ọ̀ ga-esi aṅaa ghara ịdị otú ahụ? Ọ bụrụ na Chineke na-eleghara nnọọ ihe nile anya, a ga-elelị ụkpụrụ ya. Ọ ga-abụ onye ihe ọ na-ekwu na-agaghị na-adị irè dị ka Onyeisi Nchụàjà bụ́ Ilaị, bụ́ onye ji olu dị nro baara ajọ ụmụ ya ndị ikom mba ma hapụ ha ka ha gaa n’ihu n’ajọ omume ha. (1 Samuel 2:22-25) Ma, Jehova adịghị ajụ igosi onye nwere mwute ebere ịhụnanya Ya. Ebere ya, dị ka mmiri jụrụ oyi nke na-enye ume ọhụrụ, ga-enyere onye na-ejehie ejehie aka ịnagide ihe ndị si ná mmehie ya pụta. Obi ụtọ mgbaghara Chineke na-enye na mkpakọrịta na-ewuli elu dị n’etiti mmadụ na ndị ya na ha na-efekọ ofufe pụrụ iweghachi ọnọdụ ime mmụọ nke onye na-ejehie ejehie. Ee, ná ndabere nke ihe mgbapụta Kraịst, onye ahụ nwere nchegharị pụrụ ịbịa detụ “akụ̀ nke amara [Chineke]” ire.—Ndị Efesọs 1:7.

“Obi Dị Ọcha” na ‘Mmụọ Dị Ọhụrụ’

Mgbe Devid kwupụtasịrị mmehie ya, ọ dabaghị n’inwe mmetụta na-ezighị ezi nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe. Ihe ndị o kwuru n’Abụ Ọma ndị o dere banyere nkwupụta mmehie na-egosipụta ahụ efe o nwetara na mkpebi ya siri ike ijere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Lee, dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma nke 32. N’amaokwu nke 1, anyị na-agụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye e bupụworo njehie ya, onye e kpuchiworo mmehie ya.” N’agbanyeghị otú mmehie jọruru ná njọ, ọ bụrụ na mmadụ ejiri ezi obi nwee ncheghari, o kwere omume ịrụpụta obi ụtọ. Otu ụzọ isi gosipụta ezi obi a bụ site n’ịnabata ihe nile si n’ihe mmadụ mere pụta, dị ka Devid mere. (2 Samuel 12:13) Ọ nwaghị igosi Jehova na ihe o mere ziri ezi ma ọ bụ nwaa ịta ndị ọzọ ụta. Amaokwu nke 5 na-ekwu, sị: “Ana m emerị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; Gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.” Ezi nkwupụta mmehie na-eweta ahụ efe, nke na ọ dịghịzi mmadụ mkpa inwe akọ na uche na-ama ikpe n’ihi mmehie ndị gara aga o mere.

Mgbe Devid rịọsịrị Jehova mgbaghara, ọ rịọrọ, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.” (Abụ Ọma 51:10) Ịrịọ maka “obi dị ọcha” na ‘mmụọ dị ọhụrụ’ na-egosi na Devid maara banyere ọchịchọ ime mmehie nke dị n’ime ya nakwa na enyemaka Chineke dị ya mkpa n’ime ka obi ya dị ọcha nakwa n’ịmalitezi n’isi. Kama ịmalite imetewere onwe ya ebere, o kpebisiri ike ịga n’ihu n’ozi ọ na-ejere Chineke. O kpere ekpere, sị: “Onyenwe anyị, Ị ga-emeghe egbugbere ọnụ m abụọ; ọnụ m ga-egosikwa otuto Gị.”—Abụ Ọma 51:15.

Gịnị bụ mmeghachi omume Jehova n’ezi nchegharị Devid nwere na mgbalị siri ike o mere ijere ya ozi? O mesighachiri Devid obi ike n’ụzo a na-ekpo obi ọkụ: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ.” (Abụ Ọma 32:8) Nke a bụ ihe mmesi obi ike nye onye ahụ nwere nchegharị na Jehova n’onwe ya na-echebara mmetụta na mkpa ya echiche. Jehova mere ihe iji nyekwuo Devid nghọta, bụ́ ikike nke ịhụ ihe gabiga elu elu ya. Ọ bụrụ na o nwee ule n’ọdịnihu, ọ ga-enwe ike ịmata ihe ndị ga-esi n’omume ya pụta na mmetụta ọ ga-enwe n’ebe ndị ọzọ nọ, ọ ga-enwekwa ike ime ihe n’ụzọ ezi uche dị na ya.

Ihe a mere ná ndụ Devid bụ ihe agbamume nye ndị nile dabaworo ná mmehie dị oké njọ. Site n’ikwupụta mmehie anyị na igosipụta ezi nchegharị, anyị pụrụ inwetaghachi ihe onwunwe anyị kasị oké ọnụ ahịa, bụ́ mmekọrịta anyị na Jehova Chineke. Ihe mgbu na ihere na-adịru nwa oge nke anyị na-aghaghị inwe dị nnọọ mma karịa nhụjuanya nke ịgbachi nkịtị na-akpata, ma ọ bụ ọdachi na-esite n’ikwe ka ekwo kpọọ anyị nkụ n’ụzọ nnupụisi. (Abụ Ọma 32:9) Kama nke ahụ, anyị pụrụ inweta mgbaghara ịhụnanya nke Chineke na-ahụ n’anya, onye obi ebere, bụ́ “Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3.

[Foto dị na peeji nke 31]

Devid nwere olileanya ịgbanahụ ihe ndị ga-esi ná mmehie ya pụta site n’ime ka Uraịa nwụọ