Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Gboro Mkpa Ime Mmụọ Ya

E Gboro Mkpa Ime Mmụọ Ya

 Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

E Gboro Mkpa Ime Mmụọ Ya

SAỊPRỌS bụ àgwàetiti nke dị n’akụkụ ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Mediterranean. N’oge Bible, a ma Saịprọs ama maka ọla copper na osisi ọma ya. Pọl na Banabas kwusara ozi ọma Alaeze n’ebe ahụ n’oge ha nọ na njem ozi ala ọzọ mbụ ha. (Ọrụ 13:4-12) Taa, ozi ọma ahụ ka na-enwe mmetụta dị mma ná ndụ ọtụtụ ndị Saịprọs. N’ezie, otú a ka ọ dị Lucas, bụ́ nwoke nọ n’afọ ndị 40 ya. Ọ na-akọ, sị:

“A mụrụ m n’ime ezinụlọ e nwere ụmụaka asaa, n’ebe a na-azụ ehi. Malite n’oge m bụ nwata, enwere m agụụ maka ịgụ ihe. Akwụkwọ na-amasịkarị m bụ mbipụta na-aba n’akpa uwe nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Mgbe m dị afọ iri, mụ na ụfọdụ ndị enyi m guzobere obere ìgwè ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, ọ dịteghị aka n’ihi na ụfọdụ ndị okenye nọ n’obodo ahụ kpọrọ anyị ndị jụrụ okwukwe.

“Mgbe e mesịrị, ka m na-aga akwụkwọ na United States, ezutere m ndị a zụlitere n’ọtụtụ okpukpe. Nke ahụ kpalighachiri ọchịchọ m maka ihe ime mmụọ. Eji m ọtụtụ ụbọchị mụọ banyere okpukpe dị iche iche n’ọ́bá akwụkwọ mahadum ahụ. Agakwara m ọtụtụ chọọchị, ma n’agbanyeghị mgbalị m nile, aka m nọgidere bụrụ onye na-enweghị afọ ojuju n’ụzọ ime mmụọ.

“Mgbe m gụsịrị akwụkwọ, alọghachiri m Saịprọs ma nweta ọrụ dị ka onye nduzi nke otu ụlọ ọrụ na-eme nnyocha ọgwụ. Otu agadi nwoke aha ya bụ Antonis, otu n’ime Ndịàmà Jehova, na-eleta m n’oge ahụ n’ebe m na-arụ ọrụ. Otú ọ dị, Chọọchị Ọtọdọks nke Gris matara banyere nleta ya.

“N’oge na-adịghị anya, otu ọkà mmụta okpukpe bịakwutere m ma gwa m ka m ghara iso Ndịàmà Jehova na-ekwurịta okwu. Ebe ọ bụ na a kụziiri m site n’oge m bụ nwata na Chọọchị Ọtọdọks nke Gris nwere eziokwu ahụ, ekwenyere m ma kwụsị iso Antonis na-ekwurịta okwu, amalitekwara m iso onye ọkà mmụta okpukpe ahụ na-ekwurịta banyere Bible. Agakwara m ọtụtụ ebe obibi ndị mọnk dị na Saịprọs. Agara m ọbụna n’ebe ugwu Gris ma leta Ugwu Athos, bụ́ nke ndị Kraịst bụ́ ndị Ọtọdọks na-ewere dị ka ugwu kasị nsọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ajụjụ m ndị dabeere na Bible nọgidere bụrụ ndị a na-azaghị.

“E mesịa, ekpekuru m Chineke ekpere ka o nyere m aka ịchọta eziokwu ahụ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Antonis bịara leta m ọzọ n’ebe m na-arụ ọrụ, echekwara m na nke a bụ azịza nye ekpere m. Ya mere, akwụsịrị m ileta ọkà mmụta okpukpe ahụ ma malite iso Antonis na-amụ Bible. Anọgidere m na-enwe ọganihu, n’October 1997 kwa, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri.

“Nwunye m na ụmụ anyị ndị nwanyị abụọ kasị okenye, ndị dị afọ 14 na 10 n’oge ahụ, megidere m ná mmalite. Ma n’ihi àgwà ọma m, nwunye m kpebiri ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Obiọma nke Ndịàmà nakwa mmasị onwe onye ha gosiri ya masịrị ya nke ukwuu. Ihe masịrị ya karịsịa bụ ojiji ha ji Bible eme ihe. N’ihi ya, nwunye m na ụmụ anyị ndị nwanyị abụọ kasị okenye kwetara iso Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Cheedị banyere aṅụrị m nwere mgbe e mere ha atọ baptism ná Mgbakọ Distrikti ‘Okwu Amụma Chineke’ na 1999!

“Ee, e mere ka m chọta eziokwu ahụ. Ugbu a, ezinụlọ anyị dum, gụnyere nwunye m na ụmụ anyị anọ, na-efe otu ofufe dị ọcha nke Jehova.”