Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ịbụ Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ Si Metụta Ndị Inyom Abụọ

Otú Ịbụ Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ Si Metụta Ndị Inyom Abụọ

Otú Ịbụ Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ Si Metụta Ndị Inyom Abụọ

SANDRA bụ nwanyị di ya nwụrụ nke bi n’Australia. Mgbe di Sandra nwụrụ afọ ole na ole gara aga, ozugbo ahụ obi mapụrụ ya. “Ịmata na di m na ezigbo enyi m anwụnahụwo m na mberede kụdara m mmụọ. N’ezie, apụghị m icheta otú m si site n’ụlọ ọgwụ ahụ laruo ụlọ ma ọ bụ ihe m mere n’oge fọdụrụnụ n’ụbọchị ahụ. N’izu ole na ole sochirinụ, egwu na-atụ m ghọziri ahụ mgbu na-ekweghị akwụsị akwụsị.”

Sandra nwere enyi nke tọrọ ya, bụ́ Elaine, bụ́ onye bụworo nwanyị di ya nwụrụ ruo ihe dị ka afọ isii. Elaine lekọtara di ya bụ́ David ruo ọnwa isii tupu ọ nwụọ n’ihi ọrịa cancer. Iru újú ya siri nnọọ ike nke na n’oge na-adịghị anya di ya nwụsịrị, o kpuru ìsì ruo nwa oge. Afọ abụọ mgbe e mesịrị, ọ dara n’ihu ọha. Onye dọkịta ya achọpụtaghị ihe ọ bụla na-egosi na ọ na-arịa ọrịa. Otú ọ dị, ọ chọpụtara na Elaine anọwo na-akpachi mwute ya, ya mere ọ tụrụ arọ ka ọ laa ma gbalisie ike ịkwa ákwá. “O were m nnọọ oge ịnagide iru újú m,” ka Elaine na-ekweta, na-agbakwụnye na mgbe owu na-ama ya, “ọbụna ana m abanye n’ọnụ ụlọ ihi ụra ma were uwe David kpuchie isi m.”

Ee, ọnwụ nke di a hụrụ n’anya pụrụ ịkpata mmeghachi omume dịgasị iche, n’ihi na ịbụ nwanyị di ya nwụrụ gụnyere n’ezie ihe karịrị nanị ibi ndụ n’enweghị di. Dị ka ihe atụ, Sandra chere ruo oge ụfọdụ na ya enweghịzi ihe e ji mara ya. Dị ka ọ dị ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị ọzọ di ha nwụnahụrụ na nso nso a, o nwekwara mmetụta nke ịbụ onye na-anọghị ná nchebe. Sandra na-echeta, sị: “Ebe ọ bụ na di m ime mkpebi ikpeazụ amarala m ahụ, ọ hapụziri nanị m na mberede ime mkpebi ndị ahụ. Adịghịzi m ehi ụra nke ọma. Ike gwụrụ m. O siiri m ike ịma nnọọ ihe m ga-eme.”

A na-akọ akụkọ ndị yiri nke Sandra na Elaine kwa ụbọchị gburugburu ụwa. Ọrịa, ihe ọghọm, agha, mkpocha agbụrụ, na ime ihe ike n’ozuzu ha na-atụnye ụtụ n’ọnụ ọgụgụ na-amụbawanye amụbawanye nke ndị inyom di ha nwụrụ. * Ọtụtụ n’ime ndị inyom a na-ata ahụhụ n’ekwupụtaghị ya ekwupụta, n’amaghị ihe ha ga-eme. Gịnị ka ndị ikwu na ibe pụrụ ime iji nyere ndị na-agbalị ịnagide ọnọdụ nke ịbụ ndị inyom di ha nwụrụ aka? Isiokwu na-esonụ nwere aro ụfọdụ pụrụ inye aka.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ndị inyom ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ yiri nke ndị inyom di ha nwụrụ n’ihi na di ha gbahapụrụ ha. Ọ bụ ezie na nkewa na ịgba alụkwaghịm na-eweta nsogbu nke ha, ọtụtụ n’ime ụkpụrụ ndị a tụlere n’isiokwu na-esonụ pụkwara inyere ndị inyom nọ n’ọnọdụ ndị a aka.