Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịga n’Ihu n’Ụzọ Jehova Bụ Ike na Ọṅụ Anyị

Ịga n’Ihu n’Ụzọ Jehova Bụ Ike na Ọṅụ Anyị

 Akụkọ Ndụ

Ịga n’Ihu n’Ụzọ Jehova Bụ Ike na Ọṅụ Anyị

DỊ KA LUIGGI D. VALENTINO SI KỌỌ

“Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya,” ka Jehova na-adụ n’ọdụ. (Aịsaịa 30:21) Ọ bụwo ihe mgbaru ọsọ m ịgbaso ndụmọdụ a kemgbe e mere m baptism afọ 60 gara aga. Esetịpụrụ m ihe mgbaru ọsọ a tupu mgbe ahụ n’ihi ihe nlereanya nke nne na nna m, bụ́ ndị si Itali bịa biri na Cleveland, Ohio, U.S.A., na 1921. Ha zụlitere ụmụ atọ n’ebe ahụ—nwanne m nwoke tọrọ m, bụ́ Mike, nwanne m nwanyị nke m tọrọ, bụ́ Lydia, na mụ onwe m.

NNE na nna m nyochara ọtụtụ okpukpe ma mesịa kwụsịzie n’ihi ndakpọ olileanya. E mesịa, otu ụbọchị na 1932, papa m nọ na-ege otu ihe omume redio n’asụsụ Italian. Ọ bụ mkpọsa nke Ndịàmà Jehova mere, ihe papa m nụrụ masịkwara ya. O degaara ha akwụkwọ iji nwetakwuo ihe ọmụma, otu Onyeàmà bụ́ onye Itali nke si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, bịara leta anyị. Mgbe ya na nne m na nna m nwesịrị nkwurịta okwu ruo chi ọbụbọ, ha kwenyesiri ike na ha achọtawo ezi okpukpe ahụ.

Papa m na mama m malitere ịga nzukọ ndị Kraịst ma na-enye ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ebe obibi n’ụlọ anyị. N’agbanyeghị na m bụ nanị obere nwata nwoke, ndị ikom a na-ekwe ka m sonyere ha n’ọrụ nkwusa ma mee ka m malite iche banyere ijere Jehova ozi oge nile.  Otu n’ime ndị ọbịa dị otú ahụ bụ Carey W. Barber, nke sozi n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. N’oge na-adịghị anya, na February 1941, e mere m baptism mgbe m dị afọ 14, na 1944 kwa, amalitere m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ na Cleveland. Mike na Lydia malitekwara ịgbaso ụzọ nke eziokwu Bible. Mike jeere Jehova ozi ruo ọnwụ ya, Lydia sokwa di ya, bụ́ Harold Weidner n’ozi njegharị ruo afọ 28. Taa, ha na-eje ozi dị ka ndị ozi oge nile pụrụ iche.

Ụlọ Mkpọrọ Emee Ka M Kpebisikwuo Ike Ịga n’Ihu

Ná mmalite 1945, a tụrụ m mkpọrọ n’Ụlọ Mkpọrọ Etiti nke Chillicothe dị n’Ohio n’ihi na akọ na uche m e ji Bible zụọ kwaliri m ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’Aịsaịa 2:4, bụ́ nke na-ekwu banyere ịkpụgharị mma agha ka ha bụrụ mma ogè. N’otu oge, ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ kwere ka Ndịàmà bụ́ ndị mkpọrọ nwee nanị ole na ole n’akwụkwọ ndị e ji amụ Bible nke Ndịàmà Jehova na-ebipụta. Otú ọ dị, Ndịàmà si n’ọgbakọ dị nso nyere aka. Mgbe ụfọdụ, ha na-atụsa mbipụta ole na ole n’ala ahịhịa dị nso n’ụlọ mkpọrọ ahụ. N’echi ya, ka a na-akpọga ndị mkpọrọ ahụ n’ebe ọrụ ha, ha na-achọta mbipụta ndị a ma gbalịa weba ha n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Ka ọ na-erule mgbe m bịaruru n’ụlọ mkpọrọ ahụ, e kwere ka anyị na-enwekwu akwụkwọ. N’agbanyeghị nke ahụ, amụtara m karịa mgbe ọ bụla ọzọ, iji nri ime mmụọ Jehova na-enye akpọrọ ihe—ihe mmụta m ka na-echeta mgbe ọ bụla m natara mbipụta ọhụrụ nke Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta!

Ọ bụ ezie na e kwere ka anyị na-enwe nzukọ ọgbakọ n’ụlọ mkpọrọ, e kweghị ka ndị na-abụghị Ndịàmà na-abịa. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị isi ụlọ mkpọrọ na ndị mkpọrọ ụfọdụ nọ na-abịa na nzuzo, ọbụna ole na ole nakwekwaara eziokwu ahụ. (Ọrụ 16:30-34) Nleta ndị Nwanna A. H. Macmillan letara anyị bụụrụ anyị ihe nkasi obi pụtara ìhè. O mesiri anyị obi ike mgbe nile na oge anyị nọrọ n’ụlọ mkpọrọ abụghị n’efu n’ihi na ọ zụrụ anyị maka ọrụ ndị dị n’ihu. Nwanna nwoke ahụ m hụrụ n’anya mere ihe metụrụ m n’obi ma mee ka mkpebi m mere ije ije n’ụzọ Jehova mikwuo emi.

Enweta M Onye Ibe

Agha Ụwa nke Abụọ biri, a tọhapụrụ ndị mkpọrọ, amalitekwara m ịsụ ụzọ, bụ́ ozi oge nile. Ma na 1947, nna m nwụrụ. Iji kwado ezinụlọ anyị, amalitere m ịrụ ọrụ ego ma ruokwa eru iji ịhịa aka n’ahụ na-agwọ ọrịa—nkà nke ga-enyere m aka n’oge mụ na nwunye m ga-anọ n’ọnọdụ tara akpụ ihe dị ka afọ 30 mgbe e mesịrị. Cheredị, akụkọ m a adịghị n’usoro. Ka m buru ụzọ kọọrọ gị banyere nwunye m.

Otu ehihie na 1949, ka m nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, fon kụrụ. Ewelitere m ya ma nụ otu olu dị ụtọ sịrị: “Aha m bụ Christine Genchur. Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Akwatara m na Cleveland ịchọ ọrụ, achọkwara m isonyere otu ọgbakọ.” Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị anya n’ebe o bi, ma ụda olu ya masịrị m, ya mere enyere m ya ntụziaka otú ọ ga-esi rute ụlọ nzukọ anyị ma gbaa ya ume ịbịa na Sunday ahụ—ụbọchị m ga-ekwu okwu ihu ọha. Na Sunday, ọ bụ m bụ onye mbụ bịarutere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ dịghị nwanna nwanyị ọ bụla m na-amabughị bịaranụ. N’oge nile m nọ na-ekwu okwu, anọgidere m na-ele anya n’ebe mbata, ma ọ dịghị onye bataranụ. N’echi ya, akpọrọ m ya na fon, o kwukwara na ebe ndị a na-anọ aba bọs edochabeghị ya anya. Ya mere ewepụtara m onwe m izute ya iji kọwazikwuoro ya.

Abịara m mata na nne na nna ya, bụ́ ndị si na Czechoslovakia kwata, malitere iso Ndị Mmụta Bible na-akpakọrịta mgbe ha gụsịrị akwụkwọ nta bụ́ Where Are the Dead? E mere nne na nna ya baptism na 1935. Na 1938, papa Christine ghọrọ ohu kọmpịnị (nke a na-akpọ ugbu a onyeisi oche ndị nlekọta) nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Clymer, Pennsylvania, U.S.A., na 1947 kwa, e mere Christine baptism mgbe ọ dị afọ 16. O weghị m oge ịhụ nwanna nwanyị a mara mma, nke ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, n’anya. Anyị lụrụ na June 24, 1950, kemgbe ahụkwa, Christine abụwo nwunye m na-ekwesị ntụkwasị obi, na-adị njikere mgbe nile ibute Alaeze Chineke ụzọ. Enwere m ekele n’ebe Jehova nọ na nwanyị a na-ejide onwe ya nke ọma kwetara iso m biri.—Ilu 31:10.

 Ihe Ịtụnanya Dị Ukwuu

Na November 1, 1951, anyị malitere ịsụkọ ụzọ ọnụ. Afọ abụọ mgbe e mesịrị, n’otu mgbakọ e nwere na Toledo, Ohio, Nwanna Hugo Riemer na Nwanna Albert Schroeder gwara ìgwè ndị ọsụ ụzọ nwere mmasị n’ozi ala ọzọ okwu. Anyị so n’ime ha. A gbara anyị ume ịnọgide na-asụ ụzọ na Cleveland, ma kpọmkwem n’ọnwa sochirinụ, anyị nwetara ihe ịtụnanya dị ukwuu—ọkpụkpọ òkù ịbịa klas nke 23 nke Watchtower Bible School of Gilead, nke ga-amalite na February 1954!

Ka anyị kwọ ụgbọala na-aga n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, nke dị n’oge ahụ na South Lansing, New York, ụjọ jidere nnọọ Christine nke na ọ nọgidere na-agwa m, sị, “Jiritụkwuo nwayọọ na-agba!” M sị ya, “Christine, iji nwayọọ karịa nke a pụtazirinụ ịkwụsị akwụsị.” Otú ọ dị, mgbe anyị rutesịrị n’ogige ahụ, n’oge na-adịghị anya, ahụ ruru anyị ala karị. Nwanna Nathan Knorr nabatara ìgwè ụmụ akwụkwọ ahụ ma dugharịa anyị n’ogige ahụ. Ọ kọwakwara otú anyị pụrụ isi ghara ịdị na-emebisi mmiri na eletrik, na-emesi ya ike na ichekwa ihe bụ omume ọma mgbe a na-ahụ maka ọdịmma Alaeze. Ndụmọdụ ahụ dịgidere n’uche anyị. Anyị ka na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị.

Iji Ụgbọelu Gaa Rio

N’oge na-adịghị anya, anyị gụsịrị akwụkwọ, na December 10, 1954 kwa, anyị banyere ụgbọelu na New York City oké oyi dị, na-enwe oké mkpali banyere atụmanya nke ifega n’ebe ọhụrụ e nyere anyị ọrụ na Rio de Janeiro, Brazil, nke anwụ na-acha. Peter na Billie Carrbello, bụ́ ndị ozi ala ọzọ ibe anyị, so anyị mee njem ahụ. Njem ụgbọelu ahụ gaje iwe awa 24, na-enwe ebe ndị a ga-akwụsịtụ na Puerto Rico, Venezuela, na Belém nke dị n’ebe ugwu Brazil. Otú ọ dị, n’ihi nsogbu injin, o were awa 36 tupu anyị ahụ Rio de Janeiro n’okpuru anyị. Ma lee ebe magburu onwe ya ọ bụ! Ọkụ ndị dị n’obodo ukwu ahụ na-egbukepụ dị ka diamọnd na-eke ọkụ nke dị n’elu kapet ojii, ìhè ọnwa nke na-egbukepụkwa ka ọlaọcha na-achakwasị na mmiri Guanabara Bay.

Ọtụtụ ndị so n’ezinụlọ Betel nọ na-eche anyị n’ọdụ ụgbọelu. Mgbe ha nabatasịrị anyị n’ụzọ kporo ọkụ, ha kwọgara anyị n’alaka ụlọ ọrụ, n’ihe dịkwa ka elekere anya atọ nke ụtụtụ, anyị lakpuru ụra. Mgbe awa ole na ole gasịrị, mgbịrịgba na-akpọte mmadụ n’ụra chetaara anyị na ụbọchị mbụ anyị dị ka ndị ozi ala ọzọ amalitela!

Ihe Mmụta Mbụ

Anyị mụtara otu ihe dị mkpa n’oge na-adịghị anya. Anyị nọrọ otu uhuruchi n’ebe obibi nke otu ezinụlọ nke Ndịàmà. Mgbe anyị chọrọ iji ụkwụ laghachi n’alaka anyị, onye anyị letara jụrụ, sị, “Ee e, unu apụghị ịla; mmiri na-ezo,” o sikwara ọnwụ ka anyị hie. “Mmiri na-ezokwa n’ebe anyị si bịa,” ka m kwuru, jiri ọchị kụpụ ihe o kwuru. Anyị wee lawa.

N’ihi ugwu ndị gbara Rio gburugburu, mmiri zoro ezo na-agbakọta ngwa ngwa ma na-asọda n’obodo ukwu ahụ, na-akpata idei mmiri mgbe mgbe. N’oge na-adịghị anya, anyị nọ na-aga na mmiri na-eru n’ikpere. Na nso alaka ahụ, okporo ámá ya aghọọla osimiri na-ekwo ekwo nke na-eru anyị n’obi. Mmiri dezuru anyị ahụ mgbe anyị mesịrị ruo Betel. N’echi ya, ahụ gwụrụ Christine, o wee malite ịrịa ịba ahụ ọkụ, bụ́ nke mere ka ahụ ghara isi ya ike ruo ogologo oge. Ọ baghị uru ikwu na, dị ka ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ, anyị kwesịrị igewo ntị na ndụmọdụ nke Ndịàmà bi n’ógbè ahụ bụ́ ndị ka anyị nwee ahụmahụ.

Nzọụkwụ Ndị Mbụ n’Ọrụ Ozi Ala Ọzọ na nke Njegharị

Mgbe anyị malitesịrị n’ụzọ a na-adịchaghị ụtọ, anyị ji ịnụ ọkụ n’obi malite ozi ubi anyị. Anyị na-agụrụ onye ọ bụla anyị zutere ihe n’asụsụ Portuguese, o yikwara ka anyị  na-enwe ọganihu hà nhata n’ịsụ Portuguese. Otu onye nwe ụlọ ga-agwa Christine, sị, “Ana m aghọta ihe ị na-agụ, ma apụghị m ịghọta ihe ọ na-agụ,” na-atụ m aka. Onye ọzọ nwe ụlọ ga-agwa m, sị, “Ana m aghọta ihe ị na-agụ ma anaghị m aghọta ihe ọ na-agụ.” N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere oké mkpali inweta 100 ụtụ Ụlọ Nche n’izu ndị mbụ ahụ. N’ezie, e mere ọtụtụ n’ime ndị anyị mụụrụ Bible n’afọ mbụ anyị na Brazil baptism, na-eme ka anyị mata otú ọrụ ozi ala ọzọ a ga-esi mịpụta mkpụrụ.

N’etiti afọ ndị 1950, ndị nlekọta sekit eletaghị ọtụtụ ọgbakọ ndị dị na Brazil n’ụzọ chiri anya n’ihi enwechaghị ụmụnna ruru eru. Ya mere, n’agbanyeghị na m ka na-amụ asụsụ ahụ, n’ekwutụbeghịkwa okwu ihu ọha n’asụsụ Portuguese, e nyere m ọrụ sekit na steeti São Paulo na 1956.

Ebe ọ bụ na ruo afọ abụọ, onye nlekọta sekit eletabeghị ọgbakọ mbụ anyị letara, onye ọ bụla nwere atụmanya dị elu maka okwu ihu ọha ahụ. Iji kwadebe okwu ahụ, adọkapụtara m paragraf ndị sitere n’Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’asụsụ Portuguese ma mapagide ha ná mpempe akwụkwọ. Na Sunday ahụ, Ụlọ Nzukọ Alaeze juru n’ọnụ. Ọbụna ndị mmadụ nọdụchara n’elu ikpo okwu, mmadụ nile na-echere ihe omume ukwu ahụ. Okwu ahụ, ka à ga-akpọnụ ya ịgụ ihe ahụ, malitere. Site n’oge ruo n’oge ana m elelite anya, n’ịbụkwa ihe ijuanya nye m, ọ dịghị onye na-emegharị ahụ, ọbụna ụmụaka. Mmadụ nile nọ na-ele m zii. Echere m n’echiche, sị: ‘Haa, Valentino, ị mụtawakwala Portuguese oo! Ndị a na-ege ntị.’ Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, mgbe m letara ọgbakọ ahụ ọzọ, otu nwanna nwoke bụ́ onye nọ ya ná nleta mbụ ahụ sịrị, “Ì chetara okwu ihu ọha ahụ i kwuru? Anyị aghọtaghị otu mkpụrụ ihe na ya.” Ekwetakwara m na mụ onwe m kwa aghọtaghị ihe dị ukwuu n’okwu ahụ.

N’afọ mbụ ahụ m nọrọ n’ọrụ sekit, ana m agụkarị Zekaraịa 4:6. Okwu ndị bụ́, ‘Ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ chetaara m na ọ bụ nanị mmụọ Jehova mere ọrụ Alaeze ahụ ji nwee ọganihu. O nwekwara ọganihu, n’agbanyeghị erughị eru anyị ndị pụtara ìhè.

Ihe Ịma Aka na Ngọzi Ndị Anyị Nwetara

Ọrụ sekit pụtara ịgbagharị ná mba ahụ na-ebugharị ígwè typewriter, katọn akwụkwọ, akpati, na igbe dị iche iche. Christine ji amamihe denyechaa ngwongwo anyị nọmba ka anyị wee ghara ichefu ihe ọ bụla mgbe anyị ji ngwa na-aga site n’otu bọs gaa n’ọzọ. Ọ bụghị ihe ọhụrụ iji bọs mee njem ruo awa 15 n’okporo ụzọ a na-eteghị korota iji ruo ebe ọzọ anyị na-aga. Mgbe ụfọdụ, ọ na-atụ egwu, karịsịa mgbe bọs abụọ chere ibe ha ihu na-agbafe n’otu àkwà mmiri na-esighị ike n’otu mgbe, ha na-anọkete nnọọ nso nke na ọ na-afọ nke nta ka ha metụ ibe ha ahụ. Anyị jikwa ụgbọ okporo ígwè, ụgbọ mmiri, na ịnyịnya ibu mee njem.

Na 1961, anyị malitere ịrụ ọrụ distrikti, na-ejegharị site n’otu sekit gaa n’ọzọ kama ịbụ site n’otu ọgbakọ gaa n’ọzọ. Ọtụtụ anyasị n’izu, anyị na-egosi film foto ndị nzukọ Jehova mepụtara—n’oge nke ọ bụla n’ebe dị iche. Mgbe mgbe anyị mere ihe ngwa ngwa iji merie ndị ụkọchukwu nọ n’ógbè ahụ, bụ́ ndị nwara igbochi ihe ngosi ndị a. N’otu obodo, onye ụkọchukwu manyere otu onye nwe ụlọ ezumezu ịkagbu nkwekọrịta anyị na ya nwere. Mgbe anyị mere nchọgharị ruo ọtụtụ ụbọchị, anyị chọtara ebe ọzọ, ma anyị agwaghị onye ọ bụla, anyị nọgidekwara na-akpọ mmadụ nile ka ha bịa n’ebe mbụ ahụ. Tupu ihe omume ahụ amalite, Christine gara n’ụlọ ezumezu ahụ ma jiri nwayọọ gwa ndị chọrọ ile film foto ahụ ka ha gaa n’ebe ọhụrụ ahụ. N’uhuruchi ahụ, mmadụ 150 kiriri film foto ahụ, nke nwere isiokwu dabara adaba bụ́ The New World Society in Action (Òtù Ụwa Ọhụrụ Nọ n’Ọrụ).

N’agbanyeghị na ọrụ njegharị n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ na-agwụ ike mgbe ụfọdụ, ụmụnna ahụ dị umeala n’obi bụ́ ndị bi n’ógbè ndị ahụ nwere nnọọ ekele maka nleta anyị ma nwee nnọọ omume nke ile ọbịa n’ime ka anyị soro ha nọrọ n’ebe obibi ha ndị dị mfe nke na anyị na-ekele Jehova mgbe nile na anyị pụrụ isoro ha nọkọọ. Ime ha enyi mere ka anyị nwee ngọzi na-ekpo obi ọkụ. (Ilu 19:17; Hagaị 2:7) Ya mere, lee ka o si wute anyị na, mgbe anyị jeworo ozi  ruo ihe karịrị afọ 21 na Brazil, ozi ala ọzọ anyị jedebere!

Jehova Duziri Anyị n’Oge Nsogbu

Na 1975, a wara Christine ahụ. Anyị maliteghachiri ọrụ njegharị, ma ahụ ike Christine kara njọ. O yiri ka ọ̀ kasị mma ịlaghachi United States ka o wee nwee ike inweta nlekọta ahụ ike. N’April 1976, anyị rutere Long Beach, California, ma nọnyere mama m. Ebe ọ bụ na anyị ebiwo n’ofesi ruo afọ 20, anyị amaghị otú anyị ga-esi mee ihe maka ọnọdụ a. Amalitere m iji ịhịa aka n’ahụ na-agwọ ọrịa, ihe m na-enwetakwa site n’ọrụ ahụ nọ na-akwado anyị. Steeti California nyere Christine àkwà n’otu ụlọ ọgwụ, ma ahụ ike ya kawanyere njọ kwa ụbọchị n’ebe ahụ n’ihi na ndị dọkịta jụrụ ịgwọ ya n’ejighị ọbara. Ebe ọ bụ na anyị enweghịzi olileanya, anyị rịọrọ Jehova maka nduzi.

N’otu ehihie m nọ n’ozi ubi, ahụrụ m ọfịs otu onye dọkịta, ekpebikwara m na mberede ịbanye na ya. Ọ bụ ezie na dọkịta ahụ nọ na-achọ ịla n’ebe obibi ya, o kwere ka m bata n’ọfịs ya, anyị kwurịtakwara okwu ruo awa abụọ. E mesịa, o kwuru, sị: “Ọrụ unu dị ka ndị ozi ala ọzọ na-amasị m, m ga-agwọkwa nwunye gị n’anaghị ego, n’amịnyeghịkwa ya ọbara.” Apụghị m ikweta ihe m nụrụ.

Onye dọkịta a dị obiọma, nke mesịrị bụrụ na ọ bụ ọkachamara a na-akwanyere ùgwù, kpọgara Christine n’ụlọ ọgwụ ọ na-arụ ọrụ na ya, ná nlekọta ọma ya kwa, ọnọdụ ya kara mma n’oge na-adịghị anya. Lee ekele anyị nwere na Jehova duziri anyị n’oge ahụ tara akpụ!

Ọrụ Ndị Ọhụrụ

Ka Christine nwetaghachiri ume, anyị jere ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ ma nwee ọṅụ nke inyere ọtụtụ ndị aka na Long Beach ịghọ ndị na-efe Jehova. Na 1982, a gwara anyị ka anyị rụọ ọrụ sekit na United States. Anyị kelere Jehova kwa ụbọchị maka iji anyị mee ihe ọzọ n’ọrụ njegharị—ụdị ozi na-amasị anyị. Anyị jere ozi na California, e mesịakwa na New England, bụ́ ebe sekit ahụ gụnyere ọgbakọ ụfọdụ na-asụ Portuguese. E mesịa, ọ gụnyekwara Bermuda.

Mgbe afọ anọ na-enye ume ọhụrụ gasịrị, e nyere anyị ọrụ ọzọ. A kpọrọ anyị ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe ọ bụla anyị chọrọ. Ọ bụ ezie na o wutere anyị ịhapụ ọrụ njegharị, anyị kpebisiri ike ịga n’ihu n’ọrụ ọhụrụ anyị. Ma n’ebee? Mgbe anyị na-arụ ọrụ njegharị, achọpụtara m na ọgbakọ Portuguese dị na New Bedford, Massachusetts, chọrọ enyemaka—ya mere anyị tinyere isi na New Bedford.

Mgbe anyị ruru, ọgbakọ ahụ meere anyị nnọkọ oriri nnabata buru ibu. Lee ka nke ahụ si mee ka anyị nwee mmetụta nke ịbụ ndị a chọrọ! Ọ gbara anyị anya mmiri. Otu di na nwunye nwere ụmụ ọhụrụ abụọ ji obiọma kwe ka anyị nọrọ na nke ha ruo mgbe anyị chọtara ebe obibi nke anyị. Jehova gọziri ọrụ ịsụ ụzọ pụrụ iche a karịa ka anyị tụrụ anya ya. Kemgbe 1986, anyị enyeworo ihe dị ka mmadụ 40 nọ n’obodo a aka ịghọ Ndịàmà. Ha bụ ezinụlọ ime mmụọ anyị. Tụkwasị na nke a, enwewo m ọṅụ nke ịhụ ụmụnna ndị nwoke ise nọ n’ógbè ahụ ka ha toro ghọọ ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya nke ìgwè atụrụ ahụ. Ọ dịwo ka ije ozi ala ọzọ n’ebe na-amịpụta mkpụrụ.

Ka anyị na-eleghachi anya azụ, anyị na-enwe aṅụrị na anyị ejeworo Jehova ozi site n’oge ntorobịa gaa n’ihu, meekwa ka eziokwu ahụ bụrụ ụzọ ndụ anyị. N’eziokwu, nká na ahụ esighị ike na-emetụta anyị ugbu a, ma ịga n’ihu n’ụzọ Jehova ka bụ ike na ọṅụ anyị.

[Foto dị na peeji nke 26]

Mgbe anyị ka rutere nnọọ na Rio de Janeiro

[Foto dị na peeji nke 28]

Ezinụlọ ime mmụọ anyị na New Bedford, Massachusetts