Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-enwe Mmeri!

Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-enwe Mmeri!

 Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-enwe Mmeri!

“Okwu Jehova nọgidere na-eto eto ma na-enwe mmeri n’ụzọ dị ike.”—ỌRỤ 19:20, NW.

1. Kọwaa otú Iso Ụzọ Kraịst si too na narị afọ mbụ.

N’ỊBỤ ndị e ji ike nke mmụọ nsọ kwalie, ndị Kraịst oge mbụ ji ịnụ ọkụ n’obi a na-apụghị ịbịanyụ abịanyụ kpọsaa okwu Chineke. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme dere, sị: “Iso Ụzọ Kraịst ejiriwo nnọọ ọsọ gbasaa n’ógbè ndị Rom. Ka ọ na-erule afọ 100, ikekwe a ga-enwela ìgwè ndị Kraịst n’ime ógbè nile dị n’ókè Mediterranean.”

2. Olee otú Setan si nwaa ibelata mmetụta nke ozi ọma ahụ, oleekwa otú e siworo buo nke a n’amụma?

2 Setan bụ́ Ekwensu apụghị ịkwụsị ndị Kraịst oge mbụ. Kama nke ahụ, o ji ụzọ ọzọ—ndapụ n’ezi ofufe—belata mmetụta nke ozi ọma ahụ. Jisọs ebuwo amụma banyere ihe omume a n’ilu ya banyere ata na ọka. (Matiu 13:24-30, 36-43) Pita onyeozi adọwokwa aka ná ntị na ndị ozizi ụgha ga-ebilite n’ime ọgbakọ, na-ewebata ịrọ òtù ndị na-emebi ihe. (2 Pita 2:1-3) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi adọwo aka ná ntị kpọmkwem na ndapụ n’ezi ofufe ga-ebute ụbọchị Jehova ụzọ.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:1-3.

3. Gịnị mere mgbe ndị ozi nwụsịrị?

3 Mgbe ndị ozi nwụsịrị, ozizi na nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ bịara kpuchie ozi ọma ahụ. Dị ka e buru n’amụma, ndị ozizi ụgha gbagọrọ ma gwagbuo ozi dị ọcha nke eziokwu ahụ. Nke nta nke nta, Iso Ụzọ Kraịst adịgboroja a na-akpọ Krisendọm kpuchiri ezi Iso Ụzọ Kraịst. Òtù ndị ụkọchukwu bụ́ ndị nwara ime ka Bible ghara iru ndị nkịtị aka, bilitere. Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ nke ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst rịrị elu, ofufe ha adịghị ọcha. Krisendọm gbasara ma ghọọ òtù dị ike na nke nwere mmetụta ka ukwuu n’ọdịbendị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ma o nweghị ma ngọzi Chineke ma mmụọ ya.

4. Gịnị mere ka nkata Setan kpara imebi nzube Chineke ghara inwe ihe ịga nke ọma?

4 Otú ọ dị, nkata Setan kpara imebi nzube Jehova gaje ịkụ afọ n’ala. Ọbụna n’oge ndapụ n’ezi ofufe ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị njọ, ụfọdụ mmadụ ka nọ n’ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ndị depụtaghachiri Bible ji nnọọ nlezianya mee ya n’ụzọ ziri ezi. N’ihi ya, ọ dịghị ihe mere Bible n’onwe ya, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị bụ́ ndị zọọrọ na ha nwere ikike ịkụzi ya kọwahiere ozi dị na ya. N’ime narị afọ ndị gaferenụ, ndị ọkà mmụta dị ka Jerome na Tyndale ji obi ike sụgharịa ma kesaa Okwu Chineke. E mere ka ọtụtụ nde mmadụ  mara banyere Bible nakwa otu ụdị nke Iso Ụzọ Kraịst, ọ bụ ezie na ọ bụ nke adịgboroja ya.

5. Gịnị ka Daniel onye amụma buru n’amụma banyere ‘ezi ihe ọmụma’?

5 N’ikpeazụ, dị ka e buru n’amụma n’akwụkwọ Daniel, ‘ezi ihe ọmụma bara ụba.’ Nke a mere na “mgbe ọgwụgwụ”—oge anyị bi n’ime ya ugbu a. (Daniel 12:4) Mmụọ nsọ emewo ka ndị hụrụ eziokwu n’anya gburugburu ụwa nweta ezi ihe ọmụma nke ezi Chineke ahụ na nzube ya. Ọbụna mgbe ọtụtụ narị afọ nke ozizi ndị si n’ezi ofufe dapụ gasịrị, okwu Chineke nọgidere na-enwe mmeri! Taa, a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ebe nile, na-arụtụrụ ndị mmadụ aka n’olileanya nke ụwa ọhụrụ mara mma. (Abụ Ọma 37:11) Ka anyị nyochazie uto a okwu Chineke na-eto n’oge a.

Uto nke Okwu ahụ Taa

6. Eziokwu ndị dị aṅaa ka Ndị Mmụta Bible ghọtara ka ọ na-erule afọ 1914?

6 N’ọgwụgwụ narị afọ nke 19, eziokwu Bible kpaliri otu obere ìgwè Ndị Mmụta Bible, bụ́ ndị a maara taa dị ka Ndịàmà Jehova. Ka ọ na-erule 1914, Bible edoola ha anya. Ha ghọtara eziokwu ndị dị ebube banyere nzube Chineke. Ịhụnanya Jehova gosipụtara n’izite Ọkpara ya n’ụwa, si otú a megheere mmadụ ụzọ maka ndụ ebighị ebi, kwaliri ha n’ụzọ miri emi. Ha abịawokwa mara ma ghọta aha na àgwà Chineke. Ọzọkwa, ha ghọtara na “oge ndị Jentaịl” agwụlarị, na-egosi na oge ọchịchị Alaeze Chineke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi eruwela. (Luk 21:24, King James Version) Lee ozi ọma dị ebube ọ bụ! Eziokwu a nke dị ike bụ nke a ga-eso ndị nọ n’ebe nile kerịta. Ndụ dị n’ihe ize ndụ!

7. Olee otú eziokwu Bible siworo nwee mmeri n’oge a?

7 Jehova gọziri obere ndị Kraịst ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Taa, ọnụ ọgụgụ ndị nakweere ezi Iso Ụzọ Kraịst akarịala nde isii. Okwu Chineke agbasawokwa n’ebe dị iche iche, n’ihi na a na-ahụ Ndịàmà Jehova n’ala 235. Ọzọkwa, eziokwu Bible akpawo ike, na-emeri ihe mgbochi nile, nke okpukpe na ndị ọzọ. Ọrụ nkwusa a zuru ụwa ọnụ na-akwado ihe akaebe ahụ a na-apụghị ịgbagha agbagha bụ́ na Jisọs nọ anọ n’ike Alaeze.—Matiu 24:3, 14.

8. Gịnị ka ụfọdụ ndị kwuworo banyere uto Ndịàmà Jehova?

 8 Dị nnọọ ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo okwu banyere uto dị ịtụnanya nke Iso Ụzọ Kraịst na narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị ọkà mmụta ekwuwo okwu banyere uto nke ndị Jehova n’oge a. Na United States, ndị ọkà mmụta abụọ gbakọtara aka dee, sị: “N’ime afọ 75 gara aga, Ndịàmà Jehova anọgidewo na-eto n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ịrịba ama, . . . ha emewokwa otú ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ.” Otu mbipụta sitere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa na-ezo aka n’ebe Ndịàmà nọ dị ka “otu n’ime okpukpe ndị kasị eto ngwa ngwa na ndị a kasị akwanyere ùgwù n’ụwa bụ́ nke a maara n’ụwa nile maka mgbaso ọ na-agbasochi ozizi Bible anya.” Otu akwụkwọ ndị Katọlik, nke e bipụtara na Europe, na-ezokwa aka ‘n’uto na-eri ọnụ nke Ndịàmà Jehova.’ Gịnị meworo ka e nwee uto a?

Mmụọ Nsọ Na-arụ Ọrụ Taa

9. (a) Gịnị bụ otu isi ihe mere okwu Chineke ji enwe mmeri taa? (b) Olee otú Jehova si adọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ?

9 Otu isi ihe mere okwu Chineke ji enwe mmeri taa bụ na mmụọ Jehova na-arụ ọrụ n’ụzọ dị ike, dị nnọọ ka ọ rụrụ na narị afọ mbụ. Jisọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.” (Jọn 6:44) Okwu ndị a na-enye echiche na Chineke na-eji nwayọọ adọta ndị nwere obi eziokwu, na-akpali obi ha. Site n’ọrụ nkwusa nke Ndịàmà ya, Jehova na-adọta “ihe a na-achọsi ike nke mba nile”—ndị dị umeala n’obi, yiri atụrụ nke ụwa—ijere ya ozi.—Hagaị 2:6, 7.

10. Mmadụ ndị dịgasị aṅaa meghachiworo omume n’ụzọ dị mma n’ebe okwu Chineke dị?

10 Ọ bụghị nanị na mmụọ nsọ enyewo ndị Chineke ike iji okwu Chineke garuo ebe ụwa sọtụrụ; ọ kpaliwo ụdị mmadụ nile imeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi ọma ahụ dị. N’ezie, ndị nakweerela okwu Chineke si “n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla” pụta. (Mkpughe 5:9; 7:9, 10) A na-ahụ ha n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye, ndị gụrụ oké akwụkwọ na ndị bụ́ iti. Ụfọdụ anakwerewo okwu ahụ n’oge e nwere agha na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ebe  ndị ọzọ meworo otú ahụ n’oge e nwere udo na ọganihu. N’okpuru ụdị ọchịchị nile, n’ọdịbendị nile, site n’ogige ịta ahụhụ ruo n’obí eze, ndị ikom na ndị inyom emeghachiwo omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi ọma ahụ dị.

11. Olee otú mmụọ nsọ si arụ ọrụ ná ndụ nke ndị Chineke, ọdịiche dịkwa aṅaa na-apụta ìhè?

11 N’agbanyeghị ndịrịta iche dị ịtụnanya dị n’etiti ndị Chineke, ha na-ebikọ ọnụ n’ịdị n’otu. (Abụ Ọma 133:1-3) Nke a na-agbakwu àmà na mmụọ nsọ na-arụ ọrụ ná ndụ nke ndị na-ejere Chineke ozi. Mmụọ nsọ ya bụ ihe mkpali dị ike maka ime ezi ihe bụ́ nke na-eme ka ndị ohu ya nwee ike igosipụta ịhụnanya, ọṅụ, udo, obiọma, na àgwà ndị ọzọ na-adọrọ mmasị. (Ndị Galetia 5:22, 23) Taa, anyị na-aghọta nke ọma ihe Malakaị onye amụma buru n’amụma ogologo oge gara aga: “Unu [ga-ahụ] ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.”—Malakaị 3:18.

Okwu Chineke Na-enwe Mmeri n’Ebe Ndị Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Arụ Ọrụ Nọ

12. Mmetụta dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-enwe banyere ọrụ izisa ozi ọma ahụ, oleekwa otú ha na-atụ anya na a ga-esi emeghachi omume n’ebe ọrụ nkwusa ha dị?

12 Ndịàmà Jehova taa abụghị ndị na-aga chọọchị n’ọnụ. Ha na-ekerechi òkè anya n’ọrụ izisa ozi ọma ahụ. Dị ka ndị Kraịst oge mbụ, ha na-eji ọchịchọ obi ha ewepụta onwe ha ime uche Chineke, na-achọ inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere nkwa dị iche iche nke Alaeze Jehova. Ha bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ bụ́ ndị, n’ụzọ kwekọrọ ná mmụọ nsọ ya, na-achịkọta ndị ọzọ ijere Jehova ozi. N’ime nke ahụ, ha na-egosipụta ebere na ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ na-ekweghị ekwe nọ. Ha na-emekwa otú ahụ n’agbanyeghị na ha na-ezute enweghị mmasị, ịkwa emo, na mkpagbu. Jisọs kwadebere ụmụazụ ya maka mmeghachi omume dị iche iche n’ebe ozi ọma ahụ dị. O kwuru, sị: “Ohu adịghị aka onye nwe ya ukwuu. Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu; ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu.”—Jọn 15:20.

13. Ihe ndị dị aṅaa kọrọ ụkọ na Krisendọm jupụtara n’etiti Ndịàmà Jehova?

13 Anyị aghaghị ịbụ ndị myirịta dị n’etiti  Ndịàmà Jehova taa na ndị nakweere ezi Iso Ụzọ Kraịst na narị afọ mbụ, na-akpali mmasị ha. Ihe ọzọ dị ịrịba ama bụ ọdịiche dị n’etiti Ndịàmà Jehova na Krisendọm n’oge a. Mgbe otu ọkà mmụta desịrị banyere ịnụ ọkụ n’obi ndị Kraịst oge mbụ n’izisa ozi ọma, ọ kwara arịrị, sị: “Ọ gwụla ma a gbanwere ụkpụrụ chọọchị ji eme ihe n’oge a ka ọrụ izisa ozi ọma wee ghọọ ọzọ ọrụ nke iwu ji onye Kraịst ọ bụla e mere baptism ịrụ, e gosipụtakwa ya site n’ibi ụdị ndụ dị mma karịa nke kasị mma ndị na-ekweghị ekwe pụrụ ibi, o yikarịghị ka anyị ga-enwe ọganihu dị ukwuu.” Ihe ndị kọrọ ụkọ kpọmkwem na Krisendọm jupụtara n’etiti Ndịàmà Jehova! Okpukpe ha bụ nke dị ndụ, ezigbo okpukpe, na okpukpe nke dabeere n’eziokwu Bible bụ́ nke ha na-enwe mkpali isoro ndị nile ga-ege ntị kerịta.—1 Timoti 2:3, 4.

14. Olee otú Jisọs si were ozi ya, àgwà dịkwa aṅaa ka ndị na-eso ụzọ ya na-egosipụta taa?

14 Jisọs ji ozi ya kpọrọ ihe nke ukwuu, na-eme ka ọ bụrụ nchegbu ya bụ́ isi. Ọ gwara Paịlet, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Ndị Chineke na-enwe ụdị mmetụta Jisọs nwere. N’ịbụ ndị eziokwu Bible dị n’obi ha, ha na-agbalị ịchọta ụzọ ndị ha ga-esi soro ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee kerịta ya. Ụfọdụ n’ime ụzọ ndị a na-egosipụta ịdị nkọ dị ịrịba ama.

15. Olee otú ụfọdụ ndị siworo gosipụta ịdị nkọ n’ikwusa ozi ọma ahụ?

15 N’otu mba dị n’Ebe Ndịda America, Ndịàmà gara n’ebe ndịda nke otu ọwara mmiri na-asọbanye n’Osimiri Amazon iji mee ka ndị mmadụ nweta eziokwu ahụ. Otú ọ dị, mgbe esemokwu mba tiwapụrụ na 1995, a machibidoro ndị nkịtị iwu isi n’osimiri ahụ na-aga. N’ịbụ ndị kpebisiri ike ịnọgide na-enye ndị nwere mmasị mbipụta ndị dabeere na Bible, Ndịàmà ahụ kpebiri ime ka mmiri na-ebuda ozi ahụ. Ha na-ede akwụkwọ ozi ma were ha na ụfọdụ magazin Ụlọ Nche na Teta! tinye n’ime karama plastik. Ha na-atụbazi karama ahụ n’ime osimiri ahụ. Ha nọgidere na-eme nke a ruo afọ anọ na ọkara bụ́ mgbe e mepeghachiri osimiri ahụ ka ndị nkịtị si na ya na-aga. N’ebe nile n’akụkụ osimiri ahụ, ndị mmadụ kelere Ndịàmà ahụ maka akwụkwọ ndị ahụ. Otu nwanyị bụ́ onye a nọworo na-amụrụ Bible ji anya mmiri makụọ ha ma kwuo, sị: “Echere m na agaghị m ahụkwa unu ọzọ. Otú ọ dị, mgbe m malitere inweta akwụkwọ ndị ahụ dị na karama, amatara m na unu echefubeghị m!” Ndị ọzọ bụ́ ndị bi n’akụkụ osimiri ahụ kwuru na ha agụọla magazin ndị ahụ ugboro ugboro. Ọtụtụ ógbè nwere “post ọfịs”—ebe ihe ndị na-ese n’elu mmiri na-agbakọta ruo nwa oge. Ọ bụ ebe ahụ ka ndị nwere mmasị gara site n’oge ruo n’oge iji mara ma e nwere “akwụkwọ ozi” mmiri budatara.

16. Olee otú iwepụta onwe anyị mgbe ụfọdụ si emeghe ụzọ maka ime ndị na-eso ụzọ?

16 Ọ bụ Jehova Chineke na ndị mmụọ ozi ya dị ike na-eduzi ma na-akwado ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ. (Mkpughe 14:6) Site nanị n’iwepụta onwe anyị, anyị na-enwe ohere anyị na-atụghị anya ya mgbe ụfọdụ maka ime ndị na-eso ụzọ. Na Nairobi, Kenya, ndị inyom abụọ bụ́ ndị Kraịst nọ n’ozi ubi rụchara ụlọ ndị e kenyere ha. Otu nwa agbọghọ bịakwutere ha na mberede ma jiri oké mmasị kwuo, sị: “Anọwo m na-ekpe ekpere ka m zute ndị dị ka unu.” Ọ rịọrọ  Ndịàmà ahụ ka ha bịa n’ebe obibi ya ozugbo maka nkwurịta okwu, ha malitekwara iduziri ya ọmụmụ Bible n’otu ụbọchị ahụ. Gịnị mere nwanyị ahụ ji gakwuru ndị Kraịst abụọ ahụ n’ụzọ dị ngwa otú ahụ? Ihe dị ka izu abụọ tupu mgbe ahụ, nwa ya nwụnahụrụ ya. Ya mere mgbe ọ hụrụ otu onye na-eto eto ka o ji traktị bụ́ “Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?” ọ chọsiri ya ike ma rịọ nwa okoro ahụ ka o nye ya ya. Ọ jụrụ, ma tụọrọ ya Ndịàmà nyere ya traktị ahụ aka. N’oge na-adịghị anya, nwanyị ahụ nọ na-enwe ọganihu dị mma n’ụzọ ime mmụọ, ọ bịakwara nwekwuo ike ịnagide ọnwụ dị mwute nke nwa ya.

Ịhụnanya Chineke Aghaghị Inwe Mmeri

17-19. Olee ịhụnanya Jehova gosiworo ihe a kpọrọ mmadụ site n’ihe mgbapụta ahụ?

17 E jikọtara uto nke okwu Chineke n’ụwa nile na àjà mgbapụta Kraịst Jisọs n’ụzọ chiri anya. Dị ka àjà mgbapụta ahụ, ọrụ nkwusa ahụ bụ ngosipụta nke ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị mmadụ n’ebe nile nọ. E nyere Jọn onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

18 Chee echiche banyere ịhụnanya Jehova gosipụtara n’inye ihe mgbapụta ahụ. Ruo ọtụtụ ijeri afọ, Chineke na Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, nke ọ hụrụ n’anya, bụ́ “Isi nke ihe nile Chineke kere,” enwewo mmekọrịta chiri anya. (Mkpughe 3:14) Jisọs hụrụ Nna ya n’anya n’ụzọ miri emi, Jehova hụkwara Ọkpara ya n’anya “mgbe a ka-atọghị ntọala ụwa.” (Jọn 14:31; 17:24) Jehova kwere ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya nwụọ ka ụmụ mmadụ wee nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. Lee ngosipụta dị egwu nke ịhụnanya o nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ nke a bụ!

19 Jọn 3:17 na-ekwu, sị: “Chineke eziteghị Ọkpara Ya n’ụwa ka O kpee ụwa ikpe; kama ka e wee site n’aka Ya zọpụta ụwa.” N’ihi ya, Jehova zitere Ọkpara ya maka ozi ịhụnanya bụ́ nzọpụta, ọ bụghị nke ikpe ma ọ bụ nke amamikpe. Nke a kwekọrọ n’okwu Pita, bụ́: “[Jehova ezubeghị] ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.”—2 Pita 3:9.

20. Njikọ dị aṅaa ka nzọpụta na nkwusa ozi ọma nwere?

20 N’ịbụ onye o furu ihe dị ukwuu iji nye ihe ndabere iwu kwadoro maka nzọpụta, Jehova na-achọ ka ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee rite uru na ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya. Hà ga-esi aṅaa kpọkuo Onye ahụ ha aka-ekweghị na Ya? ma hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha aka-anụgḥ okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị?”—Ndị Rom 10:13, 14.

21. Mmetụta dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe banyere ohere anyị nwere ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ?

21 Lee ihe ùgwù dị ebube ikere òkè n’ọrụ nkwusa na izi ihe a zuru ụwa ọnụ bụ! Ọ bụghị ọrụ dị mfe, ma lee ka Jehova si aṅụrị ọṅụ mgbe ọ na-ahụ ndị ya ka ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-ebi ndụ kwekọrọ n’eziokwu ahụ ma na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ! Ya mere, ihe ọ sọrọ ọnọdụ gị ya bụrụ, kwe ka mmụọ Chineke na ịhụnanya i nwere n’obi gị kwalie gị ikere òkè n’ọrụ a. Chetakwa na ihe anyị na-ahụ a na-arụzu n’ụwa nile na-enye ihe àmà doro anya na n’isi nso Jehova Chineke ga-emezu nkwa ya bụ́ iweta “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” dị ebube nke “ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị mere ndapụ n’ezi ofufe na-apụghị iji kwụsị ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ?

• Olee otú okwu Chineke siworo nwee mmeri n’oge anyị?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka mmụọ Chineke si arụ ọrụ taa?

• Njikọ dị aṅaa ka ihe mgbapụta ahụ na nkwusa ozi ọma nwere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe e sere ese/Foto dị na peeji 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Uto e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze na narị afọ nke 20

Nkezi Ndị Nkwusa (na nde)

6.0

5.5

5.0

4.5

4.0

3.5

3.0

2.5

2.0

1.5

1.0

0.5

1900 1910 1920 1930 1940 1950 1960 1970 1980 1990 2000

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

JEROME

TYNDALE

GUTTENBERG

HUS

[Ebe E Si Nweta Foto]

Gutenberg na Hus: Site n’akwụkwọ bụ́ The Story of Liberty, 1878

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị Mmụta Bible ka ha na-akpọsa ozi ọma ahụ n’afọ ndị 1920

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Gburugburu ụwa, ndị mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi ọma ahụ dị

[Foto dị na peeji nke 18]

Dị ka àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, ọrụ nkwusa ahụ na-eme ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè