Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Bụbu Ndị Na-arụkọ Ọrụ

Anyị Bụbu Ndị Na-arụkọ Ọrụ

 Akụkọ Ndụ

Anyị Bụbu Ndị Na-arụkọ Ọrụ

DỊ KA MELBA BARRY SI KỌỌ

Na July 2, 1999, mụ na di m nọ ná mgbakọta buru ibu nke Ndịàmà Jehova, dị ka anyị nọworo ọtụtụ puku ugboro n’ime afọ 57 anyị lụrụla di na nwunye. Lloyd nọ na-ekwu okwu ikpeazụ ná mgbakọ distrikti e nwere na Hawaii na Friday ahụ. Na mberede, ọ dara. N’agbanyeghị mgbalị nile e mere iji mee ka o teta, ọ nwụrụ. *

LEE ka ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst nọ na Hawaii bụ́ ndị gbalịrị inyere m aka ịnagide ọdachi a, si dị oké ọnụ ahịa! Lloyd emetụtawo ndụ ọtụtụ n’ime ha, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ gburugburu ụwa.

N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ kemgbe ọ nwụrụ, echewo m banyere afọ ndị dị oké ọnụ ahịa anyị nọkọrọ ọnụ—ọtụtụ bụ n’ọrụ ozi ala ọzọ nakwa n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York. Echetawokwa m ndụ m n’oge m na-etolite na Sydney, Australia, na ihe ịma aka mụ na Lloyd chere ihu iji lụọ ná mmalite nke Agha Ụwa nke Abụọ. Otú ọ dị, ka m buru ụzọ kọọrọ unu otú m si ghọọ Onyeàmà na otú m si zute Lloyd laa azụ na 1939.

Otú M Si Ghọọ Onyeàmà

James na Henrietta Jones bụ nne na nna m na-ahụ n’anya. Adị m nanị afọ 14 mgbe m gụsịrị akwụkwọ na 1932. N’oge ahụ, ụwa nọ n’etiti Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba ahụ. Amalitere m ịrụ ọrụ iji nyere ezinụlọ anyị aka, bụ́ nke gụnyere ụmụnne m ndị nwanyị abụọ m tọrọ. N’ime afọ ole na ole, anọ m na-arụ ọrụ a na-akwụ ezigbo ego na ya, nweekwa ọtụtụ ụmụ agbọghọ ndị na-arụ ọrụ n’okpuru m.

Ka ọ dịgodị, na 1935, nne m natara akwụkwọ e ji amụ Bible n’aka otu n’ime Ndịàmà Jehova, n’oge na-adịghịkwa anya, o kwenyesi ri ike na ya achọtawo eziokwu ahụ. Ndị fọdụrụ n’ime anyị chere na ara achọwala ịgba ya. Otú ọ dị, otu ụbọchị, ahụrụ m akwụkwọ nta aha ya bụ Where Are the Dead?, isiokwu ya kpalikwara mmasị m. Ya mere, agụrụ m akwụkwọ nta ahụ na nzuzo. Nke ahụ wetara oké mgbanwe! Ozugbo, amalitere m iso nne m na-aga nzukọ a na-enwe n’etiti izu bụ́ nke a na-akpọ Model Study (Ọmụmụ Ihe Nlereanya). Akwụkwọ nta aha ya bụ Model Study—ha mesịrị dị atọ—nwere ajụjụ na azịza nakwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche iji kwadoo azịza ndị ahụ.

N’ihe dị ka n’oge ahụ, n’April 1938, Joseph F. Rutherford, bụ́ onye nnọchiteanya si n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, bịara Sydney. Okwu ihu ọha ya bụ nke mbụ m gara gee. E kwesịrị inwewo ya n’Ụlọ Nzukọ Obodo Sydney, ma ndị mmegide nwere ihe ịga nke ọma n’ịhụ na a kagburu ojiji anyị ga-eji ebe ahụ mee ihe. Kama nke ahụ, e kwuru okwu ahụ n’Ọgbọ Egwuregwu Sydney bụ́ nke ka saa mbara. N’ihi mkpọsa a kpọsakwuru okwu ahụ n’ihi mmegide ahụ, ihe dị ka mmadụ 10,000 bịara, bụ́ ọnụ ọgụgụ na-eju anya ma ọ bụrụ na e cheta na ọ bụ nanị Ndịàmà 1,300 ka e nwere n’Australia n’oge ahụ.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ekeere m òkè n’ozi ubi na nke mbụ ya—n’anataghịkwa ọzụzụ ọ bụla. Mgbe ìgwè anyị rutere n’ókèala anyị ga-eme nkwusa na ya, onye na-eduzi ya gwara m, sị, “Lee ụlọ ị ga-arụ n’ebe ahụ.” Ahụ mara m jijiji nke ukwuu nke na mgbe otu nwaada meghere ụzọ, ajụrụ m ya sị, “Biko, gịnị na-akụ?” Ọ bara n’ime ụlọ, lee ihe elekere na-akụ, ma pụta, gwa m. Ebe ahụ ka okwu biri. Alaghachiri m n’ụgbọala anyị.

Otú ọ dị, adaghị m mbà, n’oge na-adịghịkwa anya, anọ m na-eso ndị ọzọ ekerịta ozi Alaeze ahụ n’ụzọ chiri anya. (Matiu 24:14) Na March 1939, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site n’ịbụ onye e mere baptism n’ọ́kwá ịsa ahụ nke onye agbata obi anyị, bụ́ Dorothy Hutchings, bụ́ onye bi n’ụlọ na-esote nke anyị. Ebe ọ bụ na ụmụnna nwoke anọghị ya, n’oge na-adịghị anya e mesịrị m baptism, e nyere m ibu ọrụ ọgbakọ ndị a na-enye ndị Kraịst bụ́ ndị ikom ma ọ bụrụ na ihe dị otú o kwesịrị.

Anyị na-enwekarị nzukọ anyị n’ebe obibi ndị mmadụ, ma mgbe ụfọdụ anyị na-akwụ ụgwọ iji ụlọ ezumezu mee ihe maka okwu ihu ọha. Otu nwanna nwoke mara mma nke na-akatabeghị ahụ si Betel, bụ́ alaka ụlọ ọrụ anyị, bịara n’obere ọgbakọ anyị ikwu okwu. Amaghị m na o nwere ihe ọzọ o bu n’obi bịa—ịmatakwu m. Ee, ọ bụ otú ahụ ka mụ na Lloyd si mata.

Ịmata Ezinụlọ Lloyd

N’oge na-adịghị anya enwere m ọchịchọ ijere Jehova ozi oge nile. Otú ọ dị, mgbe m tinyere akwụkwọ ịsụ ụzọ (ikere òkè n’ọrụ nkwusa oge nile), a jụrụ m ma ọ̀ ga-amasị m ije ozi na Betel. Ya mere na September 1939, ọnwa ahụ Agha Ụwa nke Abụọ malitere, aghọrọ m onye òtù ezinụlọ Betel dị na Strathfield, ógbè dịpụrụ adịpụ nke Sydney.

Na December 1939, emere m njem gaa New Zealand maka mgbakọ. Ebe ọ bụ na Lloyd si New Zealand, ọ gawakwara ebe ahụ. Anyị banyere n’otu ụgbọ mmiri mee njem, anyị matakwara onwe anyị karị. Lloyd mere ndokwa ka m mata mama ya na papa ya na ụmụnne ya ndị inyom ná mgbakọ ahụ e nwere na Wellington, e mesịakwa n’ebe obibi ha dị na Christchurch.

Ịmachibido Ọrụ Anyị Iwu

Na Saturday, January 18, 1941, ndị isi ọchịchị kwọọro ihe dị ka ụgbọala limousine ojii isii gbagote n’alaka ụlọ ọrụ anyị iji weghara ihe owuwu ahụ. Ebe ọ bụ na m nọ na-arụ ọrụ n’obere ụlọ nche nke dị n’ebe e si abata Betel, ọ bụ m bu ụzọ hụ ha. Ihe dị ka awa 18 tupu mgbe ahụ, a gwara anyị banyere mmachibido iwu ahụ, n’ihi ya, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ  na e bupụsịwo akwụkwọ na faịlụ nile dị n’alaka ahụ. N’izu na-esonụ, a tụrụ mmadụ ise so n’ezinụlọ Betel mkpọrọ, gụnyere Lloyd.

Amaara m na ihe dị ụmụnna ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ mkpa karịsịa bụ nri ime mmụọ. Iji gbaa Lloyd ume, ekpebiri m idere ya “akwụkwọ ozi ịhụnanya.” Amalitere m n’ụzọ a tụrụ anya na ụdị akwụkwọ ozi ahụ ga-adị, ma depụtaghachizie isiokwu nile nke Ụlọ Nche n’ime ya ma denyezie aha m dị ka onye ọ hụrụ n’anya. Mgbe ọnwa anọ na ọkara gasịrị, a tọhapụrụ Lloyd.

Alụmdi na Nwunye na Ịnọgide Na-eje Ozi

Na 1940, nne Lloyd bịara nleta n’Australia, Lloyd gwakwara ya na anyị na-eche echiche ọlụlụ. Ọ dụrụ ya ọdụ ka ọ ghara ime otú ahụ n’ihi na ọgwụgwụ nke ihe nile yiri ka ò ruola. (Matiu 24:3-14) Ọ gwakwara ndị enyi ya nwoke banyere nzube ya, ma n’oge nke ọ bụla, ha na-agwa ya alụla. N’ikpeazụ, n’otu ụbọchị na February 1942, Lloyd ji nwayọọ kpọrọ m—tinyere Ndịàmà anọ kweworo nkwa na ha agaghị ekpughe atụmatụ anyị—gaa n’ọfịs a na-edebanye alụmdi na nwunye n’akwụkwọ, anyị wee lụọ. N’oge ahụ, e nweghị ndokwa ọ bụla dị n’Australia maka Ndịàmà Jehova iduzi ememe alụmdi na nwunye.

Ọ bụ ezie na e kweghị ka anyị nọgide n’ozi Betel anyị dị ka di na nwunye, a jụrụ anyị ma ọ̀ ga-amasị anyị ịbanye n’ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Anyị ji obi ụtọ nakwere ebe e kenyere anyị ịga n’ime obodo aha ya bụ Wagga Wagga. A ka machibidoro ọrụ nkwusa anyị iwu, ọ dịghịkwa onye na-enyere anyị aka n’ụzọ ego, ya mere anyị aghaghị ịtụkwasị Jehova ibu anyị n’ezie.—Abụ Ọma 55:22.

Anyị na-agbara ịnyịnya ígwè nwere ebe ịnọ ọdụ abụọ aga n’ime ime obodo, anyị na-ezute ụfọdụ ndị ezi mmadụ, ma soro ha kwurịta okwu ruo ogologo oge. Ọ bụghị ọtụtụ ndị nakweere ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, otu onye nwere ụlọ ahịa nwere ekele nke ukwuu maka ọrụ anyị na-arụ nke na ọ na-enye anyị mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri kwa izu. Mgbe anyị nọworo ọnwa isii na Wagga Wagga, a kpọghachiri anyị Betel.

 Ezinụlọ Betel hapụrụ ọfis dị na Strathfield na May 1942 ma kwaga n’ebe obibi ndị mmadụ. Ha na-esi n’otu ebe obibi gaa n’ọzọ n’izu ole na ole ọ bụla ma ọ bụ karịa iji zere ịbụ ndị a hụrụ. Mgbe mụ na Lloyd laghachiri Betel n’August, anyị sonyeere ha n’otu n’ime ebe ndị ahụ. Ọrụ anyị n’ụbọchị na-abụ ịrụ ọrụ n’otu n’ime ebe obibi akwụkwọ zoro ezo ndị e guzobeworo. N’ikpeazụ, na June 1943, e wepụrụ mmachibido iwu ahụ a machibidoro ọrụ anyị.

Ijikere Maka Ozi Ala Ọzọ

N’April 1947, e nyere anyị akwụkwọ ndejupụta maka ịga Watchtower Bible School of Gilead, nke dị na South Lansing, New York, U.S.A. Ka ọ dịgodị, e kenyere anyị ọrụ ileta ọgbakọ ndị dị n’Australia iji gbaa ha ume n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, anyị natara akwụkwọ ịkpọ òkù ịga klas nke 11 nke Gilead. Anyị nwere izu atọ iji dozie ihe ndị dị mkpa na iji kwakọta ngwongwo anyị. Anyị hapụrụ ndị ezinụlọ na ndị enyi anyị na December 1947 ma soro mmadụ 15 ndị ọzọ si Australia, bụ́ ndị a kpọrọ ịga otu klas ahụ, gawa New York.

Ọnwa ole na ole anyị nọrọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead gafere ọsọ ọsọ, e kenyekwara anyị ije ozi ala ọzọ na Japan. Ebe ọ bụ na o were oge iji nweta akwụkwọ ndị anyị ga-eji gaa Japan, e kenyeghachiri Lloyd ọrụ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova. Ọgbakọ ndị e kenyere anyị ileta malitere n’obodo ukwu bụ́ Los Angeles ruo n’ókè Mexico. Anyị enweghị ụgbọala ọ bụla, ya mere n’izu ọ bụla, Ndịàmà ahụ na-eji ịhụnanya eburu anyị n’ụgbọala site n’otu ọgbakọ gaa n’ọzọ. Ógbè ndị dị na sekit ahụ sara mbara sozi n’akụkụ nke distrikti Bekee atọ na nke Spanish atọ, ọ bụ ihe dị ka sekit iri mejupụtara distrikti nke ọ bụla!

Na mberede, October 1949 ruru, anyị nọkwa na-aga Japan n’ime otu ụgbọ mmiri e jibu ebu ndị agha. E wepụtara otu akụkụ nke ụgbọ mmiri ahụ maka ndị ikom, akụkụ nke ọzọkwa maka ndị inyom na ụmụaka. Nanị otu ụbọchị ọ fọrọ tupu anyị eruo Yokohama, anyị zutere oké ifufe. Ihe àmà gosiri na o fesasịrị alụlụ, n’ihi na mgbe anwụ wara n’echi ya, bụ́ October 31, anyị hụrụ Ugwu Fuji na ebube ya nile. Lee ụzọ dị nnọọ mma ọ bụ isi nabata anyị n’ebe ọhụrụ e nyere anyị ọrụ!

Iso Ndị Japan Rụkọọ Ọrụ

Ka anyị rutere nso n’ọdụ ụgbọ mmiri, anyị hụrụ ọtụtụ narị ndị ntutu isi ha dị oji. ‘Ndị a emegbuola onwe ha n’ụzụ!’ ka anyị chere mgbe anyị nụrụ oké mkpọtụ. Onye ọ bụla n’ime ha yi akpụkpọ ụkwụ e ji osisi mee okpuru ya bụ́ ndị na-ada kpọị kpọị n’elu ebe ndị si n’ụgbọ mmiri na-arịgopụta bụ́ ndị e ji osisi rụọ. Mgbe anyị nọsịrị otu abalị na Yokohama, anyị banyere ụgbọ okporo ígwè gaa n’ebe e nyere anyị ọrụ na Kobe. N’ebe ahụ, Don Haslett, bụ́ onye anyị na ya nọrọ n’otu klas n’ụlọ akwụkwọ Gilead bụ́ onye bịarutere Japan ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, akwụwo ụgwọ maka ebe obibi ndị ozi ala ọzọ. Ọ bụ ụlọ elu nwere okpukpu abụọ bụ́ nke mara mma, buokwa ibu, nke a rụrụ dị ka nke ndị ebe ugwu America—o nweghị arịa ụlọ ọ bụla!

Iji nweta ihe anyị ga na-ehi ụra n’elu ya, anyị gbutere ahịhịa ndị toro eto dị gburugburu ụlọ ahụ ma wụsa ha n’ala ụlọ. Otú ahụ ka ndụ ozi ala ọzọ anyị si malite, n’enweghị ihe ọ bụla ma e wezụga ihe ndị dị n’akpati anyị. Anyị nwetara obere ekwu unyi, bụ́ nke a na-akpọ hibachi, iji na-enye okpomọkụ na iji ya na-esi nri. N’otu abalị, Lloyd hụrụ ndị ozi ala ọzọ abụọ ibe anyị, bụ́ Percy na Ilma Iszlaub, ka ha tọgbọ n’amakwaghị onwe ha. O mere ka ha teta site n’imeghe windo iji mee ka ikuku ndụ, jụrụ oyi bata. Mụ onwe m kwa amaghị onwe m n’otu oge ka m na-esi nri n’ekwu unyi ndị ahụ. O were oge ụfọdụ tupu ihe ụfọdụ amara anyị ahụ!

Ịmụta asụsụ ebe ahụ bụ ihe mbụ, anyị mụkwara Japanese awa 11 kwa ụbọchị ruo otu ọnwa. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị malitere ozi, na-eji otu ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ e deturu edetu eme ihe iji malite okwu. Kpọmkwem n’ụbọchị mbụ m pụrụ n’ozi, ezutere m otu nwanyị mara mma, bụ́ Miyo Takagi, bụ́ onye ji obiọma nabata m. N’oge nletaghachi, anyị na-eji akwụkwọ ọkọwa okwu ndị na-eji Bekee  akọwa okwu Japanese na-adọga ruo mgbe ọmụmụ Bible anyị nwewara ọganihu. Na 1999, mgbe anyị gara maka nraranye nke alaka ụlọ ọrụ a gbasawanyere agbasawanye nke dị na Japan, ahụrụ m Miyo ọzọ, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ m hụrụ n’anya bụ́ ndị m mụụrụ ihe. Afọ 50 agafewo, ma ha ka bụ ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi, na-eme ihe ha nwere ike ime iji jeere Jehova ozi.

Na Kobe n’April 1, 1950, ihe dị ka mmadụ 180 bịara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst nke anyị mere. N’ịbụ ihe ijuanya nye anyị, n’ụtụtụ echi ya, mmadụ 35 pụtara iji kere òkè n’ozi ubi. Onye ozi ala ọzọ nke ọ bụla kpọọrọ atọ ma ọ bụ anọ n’ime ndị ọhụrụ a gaa ozi. Ndị nwe ụlọ agwaghị m okwu—onye ala ọzọ na-adịghị aghọtacha asụsụ ha—kama ọ bụ ndị Japan ahụ bụ́ ndị ọhụrụ mụ na ha so ka ha gwara okwu. Mkparịta ụka ahụ gara n’ihu n’ihu, ma amaghị m ihe ha na-ekwu banyere ya. Obi dị m ụtọ ikwu na ụfọdụ n’ime ndị ọhụrụ a nwere ọganihu n’ihe ọmụma, ha anọgidewokwa n’ọrụ nkwusa ahụ ruo taa.

Ọtụtụ Ihe Ùgwù na Ọrụ

Anyị nọgidere n’ọrụ ozi ala ọzọ anyị na Kobe ruo 1952, bụ́ mgbe e kenyere anyị ọrụ na Tokyo, bụ́ ebe e nyere Lloyd ọrụ nlekọta nke alaka ụlọ ọrụ dị n’ebe ahụ. Ka oge na-aga, ọrụ ya kpọgara ya na Japan nile nakwa ná mba ndị ọzọ. E mesịa, n’otu n’ime nleta o mere na Tokyo, Nathan H. Knorr bụ́ onye si n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile gwara m, sị: “Bịadị, ị̀ maara ebe di gị na-aga na njem nleta zoonu ọzọ ya? Ọ bụ Australia na New Zealand.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ị pụrụ ịgakwa, ma ọ bụrụ na ị ga-agbara onwe gị ụgbọ.” Lee mkpali m nwere! E kwuwerị, o ruwo afọ itoolu kemgbe anyị hapụrụ ụlọ.

Anyị degaara ezinụlọ anyị akwụkwọ ozi ngwa ngwa. Nne m nyeere m aka ịgbata tiketi. Mụ na Lloyd ejiwo ọrụ n’aka n’ọrụ anyị, anyị enweghịkwa ego iji leta ezinụlọ anyị. Ya mere nke a bụ azịza nye ekpere m. Dị ka ị pụrụ ichetụ n’echiche, nne m nwere nnọọ obi ụtọ ịhụ m. O kwuru, sị: “Ana m aga ichekwa ego ka i wee bịa ọzọ n’afọ atọ na-abịanụ.” Anyị bu nke ahụ n’uche mgbe anyị sịrị ka e mesịa, ma ọ dị mwute ikwu na ọ nwụrụ n’ọnwa July sochirinụ. Lee njikọghachi dị ebube m na-enwe olileanya na mụ na ya ga-enwe n’ụwa ọhụrụ ahụ!

Ruo 1960, ọ bụ nanị ọrụ ozi ala ọzọ ka m na-arụ, ma mgbe ahụ, anatara m akwụkwọ ozi nke na-akọwa, sị: “Ndokwa e mere site taa bụ ka ị na-asa ma na-ede ákwà nke ezinụlọ Betel nile.” Ezinụlọ Betel anyị nwere nanị ihe dị ka mmadụ iri na abụọ, ya mere enwere m ike ịrụ ọrụ a nakwa ozi ala ọzọ m.

Na 1962, a kụkpọrọ ụlọ anyị e wuru n’ụdị nke ndị Japan, e wuchakwara Ebe Obibi Betel bụ́ ụlọ elu dị okpukpu isii n’ebe ahụ n’afọ sochirinụ. E nyere m ọrụ inyere ụmụnna nwoke na-eto eto bụ́ ndị bịara Betel ọhụrụ aka ime ka ọnụ ụlọ ha dị ọcha na idozicha ihe nile. Dị ka omenala Japan si dị, a dịghị akụziri ụmụ okoro ime ihe ọ bụla n’ụlọ. Ihe ha tinyere uche na ya bụ agụmakwụkwọ ụwa, ọ bụkwa nne ha na-emere ha ihe nile. N’oge na-adịghị anya ha ghọtara na abụghị m nne ha. Ka oge na-aga, ọtụtụ n’ime ha nwere ọganihu ruo n’iweghara ibu ọrụ ọhụrụ ná nzukọ.

Otu ụbọchị e nwere oké okpomọkụ, otu onye a na-amụrụ Bible bịara mee ngagharị n’ihe owuwu anyị, ọ hụkwara m ka m na-ehicha ọnụ ụlọ ịsa ahụ. O kwuru, sị, “Biko gwa onye manịja ebe a na ọ ga-amasị m ịkwụ ụgwọ ka a kpọta nwa odibo ka ọ na-arụrụ gị ọrụ a.” Akọwaara m ya na ọ bụ ezie na m nwere ekele maka echiche ọma ya, adị m nnọọ njikere  ịrụ ihe ọ bụla e kenyere m ịrụ ná nzukọ Jehova.

N’ihe dị ka n’oge a, mụ na Lloyd natara ọkpụkpọ òkù ịga klas nke 39 nke Gilead! Lee ihe ùgwù ọ bụ na 1964, bụ́ mgbe m dị afọ 46, ịga ụlọ akwụkwọ ọzọ! E guzobere ihe ọmụmụ ahụ karịsịa iji nyere ndị na-eje ozi n’alaka dị iche iche aka ilekọta ibu ọrụ ha. Mgbe ihe ọmụmụ ahụ were ọnwa iri gasịrị, e kenyeghachiri anyị ọrụ na Japan. Ka ọ na-erule n’oge a, anyị nwere ihe karịrị nnọọ ndị nkwusa Alaeze 3,000 ná mba ahụ.

Mmụba ahụ dị ngwa nke na ka ọ na-erule 1972, e nwere ihe karịrị nnọọ Ndịàmà 14,000, e wukwara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ nwere ụlọ elu dị okpukpu ise na Numazu, n’ebe ndịda Tokyo. Site n’ụlọ anyị, anyị na-ahụ nnọọ ọmarịcha Ugwu Fuji nke ọma. A malitere iji akatamkpo ígwè obibi akwụkwọ rotary na-ebipụta ihe karịrị otu nde magazin kwa ọnwa n’asụsụ Japanese. Ma mgbanwe na-aga iwere ọnọdụ n’ebe anyị nọ.

Ná ngwụsị afọ 1974, Lloyd natara akwụkwọ ozi sitere n’isi ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn bụ́ nke kpọrọ ya ije ozi dị ka otú n’ime ndị so n’Òtù Na-achị Isi. Na mbụ, echere m, sị: ‘Nsogbu adịlanụ. Ebe ọ bụ na Lloyd nwere olileanya nke ndụ eluigwe ma mụ onwe m nwere olileanya nke ndụ n’elu ụwa, ka oge na-aga, anyị agaghịzinụ ebikọ. Ikekwe Lloyd kwesịrị ịhapụ m gaa Brooklyn.’ Ma n’oge na-adịghị anya, echegharịrị m echiche ma jiri ọchịchọ obi soro Lloyd gaa na March 1975.

Ngọzi Ndị Anyị Nwetara n’Isi Ụlọ Ọrụ

Ọbụna ka Lloyd nọ na Brooklyn, obi ya ka dị nnọọ n’ubi Japan, ọ na-akọkarịkwa ahụmahụ ndị anyị nweworo n’ebe ahụ. Ma ugbu a anyị nwere ohere ịmatakwu ndị mmadụ. N’ime afọ 24 ikpeazụ nke ndụ ya, e ji Lloyd rụọ ọrụ n’ụzọ dị ukwuu maka ọrụ zoonu, bụ́ nke gụnyere ime njem gburugburu ụwa. Eso m ya gaa gburugburu ụwa ọtụtụ ugboro.

Ileta ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst ná mba ndị ọzọ nyeere m aka ịghọta ọnọdụ ndị ọtụtụ n’ime ha bi ma na-arụ ọrụ na ya. Agaghị m echezọ ihu Entellia dị afọ iri, bụ́ nwata nwanyị m zutere n’ebe ugwu Africa. Aha Chineke masịrị ya, ọ na-ejikwa ụkwụ gaa ije otu awa na ọkara iji gaa nzukọ ndị Kraịst, na-emekwa otu ihe ahụ n’ụla. N’agbanyeghị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ sitere n’aka nne na nna ya, Entellia ararawo onwe ya nye Jehova. Mgbe anyị letara ọgbakọ ha, e nwere nanị otu bọlb na-adịghị enwusi ike nke e kowere n’elu ebe ihe ndepụta ọkà okwu dị—e wezụga ya, ebe nzụkọ ahụ gbara nnọọ ọchịchịrị. N’ọchịchịrị nile ahụ, ọ bụ ihe ịtụnanya ịnụ abụ dị ụtọ nke ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ahụ na-abụ.

Ihe pụtara ìhè ná ndụ anyị mere na December 1998 mgbe mụ na Lloyd so ná ndị nnọchiteanya gara Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” e nwere na Cuba. Lee mkpali anyị nwere n’ihi ekele na ọṅụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ebe ahụ gosipụtara n’ihi ịbụ ndị ụfọdụ ndị si n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn letara! Eji m ọtụtụ ihe m na-echeta ná nzute m zutere ndị m hụrụ n’anya bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi etiku Jehova mkpu otuto, kpọrọ ihe nke ukwuu.

Inwe Ahụ Iru Ala n’Etiti Ndị Chineke

Ọ bụ ezie na mba a mụrụ m bụ Australia, abịara m hụ ndị mmadụ nọ n’ebe ọ bụla nzukọ Jehova zigara m n’anya. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịịrị na Japan, ugbu a m nọwokwara na United States ruo ihe karịrị afọ 25, achọpụtawo m na ọ bụkwa otú ahụ ka ebe a dị m. Mgbe di m nwụnahụrụ m, echiche m abụghị ịlaghachi Australia, kama ọ bụ ịnọgide na Betel dị na Brooklyn, bụ́ ebe Jehova nyeworo m ọrụ.

Anọ m n’afọ ndị nke 80 m ugbu a. Mgbe afọ 61 nke ozi oge nile gasịrị, m ka nwere ọchịchọ ijere Jehova ozi n’ebe ọ bụla ọ hụrụ na o kwesịrị ekwesị. O lekọtawo m anya nke ọma n’ezie. Eji m ihe karịrị afọ 57 ahụ bụ́ ndị m ji soro di m m hụrụ n’anya bụ́ onye hụrụ Jehova n’anya kerịta ndụ m, akpọrọ ihe. Enwere m obi ike na Jehova ga-anọgide na-agọzi anyị, amakwaara m na Ọ gaghị echezọ ọrụ anyị na ịhụnanya ahụ anyị gosiworo n’ebe aha ya dị.—Ndị Hibru 6:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee Ụlọ Nche, October 1, 1999, peeji nke 16 na 17.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na nne m na 1956

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na Lloyd na ìgwè ndị nkwusa nọ na Japan n’afọ ndị 1950

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Mụ na onye mbụ m mụụrụ Bible na Japan, bụ́ Miyo Takagi, ná mmalite afọ ndị 1950 nakwa na 1999

[Foto dị na peeji nke 28]

Mụ na Lloyd ka anyị nọ n’ọrụ magazin na Japan