Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Na-adị Gị Ka A Na-aghọtahie Gị?

Ọ̀ Na-adị Gị Ka A Na-aghọtahie Gị?

 Ọ̀ Na-adị Gị Ka A Na-aghọtahie Gị?

OBI erughị Antonio ala. Na mberede nakwa n’amaghị ihe kpatara ya, ezi enyi ya bụ́ Leonardo enweghịzi omume enyi n’ebe ọ nọ. * N’oge dịgasị iche, enyi Antonio ahụ azaghachighị ekele ya, mgbe ha abụọ nọkọtakwara ọnụ, ọ na-adị ka e nwere mgbidi gebichiri ha. Antonio malitere ịtụ egwu na ọ ghaghị ịbụ na ya emewo ma ọ bụ kwuo ihe enyi ya ghọtahiere. Ma gịnị ka ọ bụ?

Nghọtahie bụ ihe a na-ahụkarị. Ọtụtụ na-adị obere ma na-adị mfe ndozi. Ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị na-akụda mmụọ karị, nke ka nke mgbe a nọgidere na-enwe mmetụta na-ezighị ezi n’agbanyeghị mgbalị nile e mere iji mee ka ha ghara ịdị. Gịnị mere e ji enwe nghọtahie? Mmetụta dị aṅaa ka ha na-enwe n’ahụ ndị o metụtara? Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ndị ọzọ aghọtahie ihe ị na-eme? Ihe ndị ọzọ na-eche banyere gị ọ̀ dị ihe o mere n’ezie?

Ihe A Na-apụghị Izere Ezere

Ebe ọ bụ na ndị ọzọ apụghị ịma echiche na ebumnobi anyị, n’oge na-adịghị anya, mmadụ gaje ịkọwahie okwu ma ọ bụ omume anyị. Ihe ndị pụrụ ịkpata nghọtahie juru eju. Mgbe ụfọdụ, anyị adịghị enwe nnọọ ike ikwupụta echiche anyị otú anyị si chọọ ikwu ya n’ụzọ doro anya ma kwụrụ ọtọ. Ụzụ a na-eme n’ebe anyị nọ na ihe ndị ọzọ na-adọpụ uche pụrụ ime ka o siere ndị ọzọ ike ige anyị ntị nke ọma.

A pụrụ ịkọwahiekwa omume ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, n’ụzọ na-ezighị ezi, e nwere ike iwere onye na-eme ihere dị ka onye na-enweghị omume enyi, onye na-adịghị enwe mmasị n’ihe, ma ọ bụ onye mpako. Ahụmahụ mmadụ nwere n’oge gara aga pụrụ ime ka mmeghachi omume ya n’ọnọdụ ụfọdụ bụrụ nke mmetụta uche kpaliri kama ịbụ nke o ji ezi uche mee. Ọdịiche ndị e nwere n’ọdịbendị nakwa n’asụsụ pụtara na ndị mmadụ agaghị na-aghọta ibe ha ozugbo otú a tụrụ anya ya. Tụkwasị ya akụkọ a na-akọghị n’ụzọ ihe siri mee na asịrị, o kwesịghịkwa iju anyị anya na nkọwa e nyere ihe ndị e kwuru ma ọ bụ mee na-adị iche mgbe ụfọdụ n’ihe e bu n’obi ná mmalite. N’ezie, ihe a nile adịchaghị akasi ndị chọpụtara na a ghọtahiewo ebumnobi ha, obi.

 Dị ka ihe atụ, Anna ji obi ọcha kwuo okwu banyere otú otu enyi ya na-anọghị ya mgbe ahụ si bụrụ onye a ma ama. Mmadụ kọrọ banyere ihe ahụ o kwuru n’ekwughị ọnọdụ dugara ya n’ikwu ya, mgbe ahụkwa, n’ụzọ juru Anna anya ma gwụ ya ike, enyi ya ahụ ji iwe bo ya ebubo n’ihu ọtụtụ ndị na-ele ha, na ọ na-emere ya anyaụfụ n’ihi mmasị otu nwoke na-egosi n’ebe ọ nọ. A ghọtahiewo ihe Anna kwuru kpam kpam, mgbalị nile o mekwara iji mesie enyi ya obi ike na ya ebughị ihe ọjọọ n’obi kụrụ afọ n’ala. Ọnọdụ ahụ kpatara oké ihe mgbu, o wekwara oge dị ukwuu tupu Anna enwee ike idozicha nghọtahie ahụ.

Otú ndị ọzọ si ewere gị na-adaberekarị n’otú ha si aghọta ebumnobi gị. Ya mere, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ inwe mwute mgbe ndị mmadụ ghọtahiere ebumnobi gị. Ị pụrụ iwe iwe, na-eche na ọ dịghị ihe mere mmadụ ọ bụla kwesịrị iji ghọtahie gị. Nye gị, otú ha si ewere gị dị njọ, gabiga ókè, ma ọ bụ bụrụ ihe na-ezitụghị ezi, ihe ndị a pụkwara iwute gị nke ukwuu—karịsịa ma ọ bụrụ na ị na-eji echiche nke ndị ahụ na-ele gị anya n’ụzọ na-ezighị ezi akpọrọ ihe.

Ọ bụ ezie na otú ndị mmadụ si were gị pụrụ iwute gị, otú o sina dị, o kwesịrị ekwesị ka a kwanyere echiche nke ndị ọzọ ùgwù. Ileghara ihe ndị ọzọ na-eche anya abụghị àgwà ndị Kraịst, anyị agatụghịkwa achọ ka okwu ma ọ bụ omume anyị nwee mmetụta na-emebi ihe n’ebe ndị ọzọ nọ. (Matiu 7:12; 1 Ndị Kọrint 8:12) Ya mere, n’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i mee mgbalị iji dozie echiche na-ezighị ezi mmadụ nwere banyere gị. Otú ọ dị, inwe nchegbu gabigara ókè banyere ịbụ onye a ga-anakwere adịghị arụpụta ihe dị mma, ọ na-eduga n’ịbụ onye na-enweghịzi ùgwù onwe onye ma ọ bụ n’inwe mmetụta nke ịbụ onye a jụrụ ajụ. E kwuwerị, uru ị bara n’ezie adịghị adabere n’ihe ndị ọzọ na-eche.

N’aka nke ọzọ, ị pụrụ ịghọta na e nwere ihe mgbakwasị ụkwụ maka nkatọ a na-akatọ gị. Nke ahụ n’onwe ya kwa pụrụ iwute gị, ma ọ bụrụ na i jiri ọchịchọ obi na obi eziokwu kweta na i zughị okè, ahụmahụ ndị dị otú ahụ pụrụ ịba uru, na-akwali gị ime mgbanwe ndị dị mkpa.

Ihe Ndị Dị Njọ Ọ Na-akpata

Nghọtahie nwere ike ịrụpụta ma ọ bụ ghara ịrụpụta ihe ndị dị njọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị nụ ka mmadụ na-ekwusi okwu ike n’ụlọ nri, ị pụrụ ikwubi na ma ọ́ bụghị onye ekwurekwu ọ̀ bụrụ onye na-eme ka a hụ ya. I nwere ike daa ya. Ọ pụrụ ịbụ na onye ọ na-agwa okwu adịghị anụ ihe nke ọma. Ma ọ bụ, ikekwe otu onye na-ere ihe n’ụlọ ahịa yiri onye ihu na-adịghị atọ ọchị, ma, ọ pụrụ ịbụ na ahụ esichaghị ya ike. Ọ bụ ezie na nghọtahie ndị dị otú ahụ na-eduga n’echiche ndị na-ezighị ezi, o yiri ka ha agaghị akpata ihe ndị dị oké njọ ma ọ bụ na-adịgide adịgide. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, nghọtahie pụrụ ịkpata ọdachi. Tụlee ihe abụọ merenụ n’akụkọ ihe mere eme nke Israel oge ochie.

Mgbe Nehash, bụ́ eze Amọn, nwụrụ, Devid zigara ndị ozi ịkasi nwa ya nwoke bụ́ Hanun obi, bụ́ onye maliteworo ịchị n’ọnọdụ nna ya. Otú ọ dị, a ghọtahiere nleta ndị ozi ahụ mere dị ka ajọ nledo ha bịara iledo ókèala Amọn, nke a mere ka Hanun buru ụzọ wedaa ndị ozi ahụ ala ma mesịa lụso Israel agha. N’ihi ya, ọ dịkarịa ala mmadụ 47,000 nwụrụ—ihe a nile mere n’ihi nghọtahie a ghọtahiere ezi ebumnobi.—1 Ihe E Mere 19:1-19.

N’oge bu nke ahụ ụzọ n’akụkọ ihe mere  eme nke Israel, e doziri nghọtahie ọzọ n’ụzọ dị nnọọ iche. Ebo Reuben na Gad na nkera ebo Manase wuru ebe ịchụàjà ukwu n’akụkụ Osimiri Jọdan. Ndị fọdụrụ n’Israel weere nke a dị ka omume ekwesịghị ntụkwasị obi, nnupụisi megide Jehova. Ya mere, ha gbakọtara iji lụsoo ha agha. Tupu ha emee ihe ọ bụla siri ike, ndị Israel nke ọzọ a zigara ndị ozi iji kwupụta iwe ha n’ihe ahụ ha weere dị ka omume ekwesịghị ntụkwasị obi. Ọ dị mma na ha mere otú ahụ, n’ihi na ndị ahụ wuru ebe ịchụàjà ahụ zaghachiri na ha enweghị ebumnobi ọ bụla nke ịhapụ ofufe dị ọcha. N’ụzọ dị iche, ebe ịchụàjà ahụ gaje ịbụ ihe ncheta nke ikwesị ntụkwasị obi ha nye Jehova. Nghọtahie a pụrụ ịkpatawo mwụfu ọbara, ma amamihe gbochiri ihe ọjọọ dị otú ahụ gaara esi na ya pụta.—Joshua 22:10-34.

Jiri Mmụọ nke Ịhụnanya Mee Ka Ihe Doo Anya

Ọ bara uru ịtụle ihe ndekọ ndị a. N’ụzọ doro anya, ime ka ihe doo anya bụ ihe amamihe dị na ya ime. N’akụkọ ikpeazụ ahụ a tụlere, ònye maara mmadụ ole e chebere ndụ ha nanị n’ihi na akụkụ abụọ ahụ kwurịtara okwu? N’ọnọdụ ka ukwuu, ndụ agaghị adị n’ihe ize ndụ ma ọ bụrụ na ị ghọtaghị ihe bụ ezi ebumnobi onye ọzọ, ma ọ pụrụ itinye ọbụbụenyi n’ihe ize ndụ. Ya mere, ọ bụrụ na i chere na mmadụ mesoro gị ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, ì ji n’aka na ị ghọtara ihe otú ha dị n’ezie, ka ị̀ na-aghọtahie ha? Gịnị bụ ebumnobi onye nke ọzọ? Jụọ ya. Ọ̀ dị gị ka a ghọtahiere gị? Kwurịtanụ ya. Ekwela ka mpako gbochie gị.

Jisọs kwuru ihe magburu onwe ya kwesịrị ịkpali anyị idozi nghọtahie: “Ya mere ọ bụrụ na ị na-eche onyinye gị n’ihu Chineke n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na nwanne gị nwere ihe megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, lawa, buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụ bịakwa chee onyinye gị.” (Matiu 5:23, 24) Ya mere ihe kwesịrị ekwesị ime bụ ịgakwuru onye ahụ nanị gị, n’akpọghị ndị ọzọ. Ọ gajeghị inye aka ma ọ bụrụ na onye ahụ mejọrọ gị eburu ụzọ nụ mkpesa gị n’ọnụ onye ọzọ. (Ilu 17:9) Ihe mgbaru ọsọ gị kwesịrị ịbụ iji mmụọ nke ịhụnanya mee udo. Jiri nwayọọ kọwaa nsogbu ahụ n’ụzọ doro anya, ma dị mfe, n’eboghịkwa ya ebubo. Kọwaa mmetụta ọnọdụ ahụ na-eme ka i nwee. Jirizie obi ọcha gee ntị n’echiche onye nke ọzọ. Adịla ngwa ikwu na onye nke ọzọ bu ihe ọjọọ n’obi. Dị njikere ikwere na o bughị ihe ọjọọ n’obi. Cheta, ịhụnanya “na-ekwere ihe nile.”—1 Ndị Kọrint 13:7.

N’ezie, ọbụna mgbe e doziri nghọtahie, a ka pụrụ inwe ihe mwute ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị ọ kpatara a ka na-edi. Gịnị ka a pụrụ ime? N’ebe ọ dị mkpa, mgbaghara e ji ezi obi rịọ kwesịrị ekwesị n’ezie, tinyere ihe ọ bụla ọzọ a pụrụ ime n’ụzọ ezi uche dị na ya iji dozie okwu. N’ọnọdụ nile dị otú ahụ, onye ahụ e mejọrọ ga-eme nke ọma ịgbaso ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a: ma n’elu ihe ndị a nile yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ́ ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:13, 14; 1 Pita 4:8.

Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị ga na-enwe nghọtahie na mwute. Onye ọ bụla pụrụ imehie ihe ma ọ bụ kwuo okwu n’ụzọ yiri ka ọ̀ bụ na ọ dịghị echebara ndị ọzọ echiche ma ọ bụ ghara inwe obiọma. Bible na-eme ka ọ pụta ìhè, sị: “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na onye ọ bụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru okè, bụrụkwa onye pụrụ ịkwa ahụ ya dum nga.” (Jemes 3:2) Ebe ọ bụ na Jehova Chineke maara nke a nke ọma, o nyewo anyị ntụziaka ndị a: “Ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị: n’ihi na mkpasu iwe nwere ọnọdụ ya n’obi ndị nzuzu. Ọzọ, atụkwasịla obi gị n’okwu nile a na-ekwu; ka i wee ghara ịnụ ka ohu gị na-akọcha gị: n’ihi na ọtụtụ  mgbe obi gị mawooro na gị onwe gị akọchawo ndị ọzọ.”—Eklisiastis 7:9, 21, 22.

“Onye Na-atụzi Obi Nile Ka Jehova Bụ”

Gịnị ma ọ bụrụ na o yie ihe na-ekweghị omume ịgbazi echiche ọjọọ mmadụ nwere banyere gị? Obi ekoropụla gị. Gaa n’ihu n’ịzụlite nakwa n’igosipụta àgwà ndị Kraịst ruo otú ike kwere gị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka imeziwanye ebe ndị ọ dị mkpa ka i meziwanye. Ọ bụghị ndị ọzọ na-ekpebi n’ikpeazu uru ị bara n’ezie dị ka mmadụ. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ‘ịtụzi obi nile’ n’ụzọ ziri ezi. (Ilu 21:2) Ọbụna Jisọs bụ onye a na-agụghị n’ihe, ndị mmadụ ledakwara ya anya, ma nke ahụ emetụtaghị ụzọ Jehova si lee ya anya. (Aịsaịa 53:3) Ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ inwe echiche na-ezighị ezi banyere gị, ị pụrụ ‘ịwụsịrị Jehova obi gị,’ na-enwe obi ike na ọ na-aghọta gị, “n’ihi na Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” (Abụ Ọma 62:8; 1 Samuel 16:7) Ọ bụrụ na ị nọgide na-eme ihe ọma, ndị nweworo echiche ọjọọ banyere gị pụrụ, ka oge na-aga, ịghọta na ha hiere ụzọ ma gbanwee echiche ha.—Ndị Galetia 6:9; 2 Timoti 2:15.

Ì chetara Antonio, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite isiokwu a? O nwere obi ike ịgbaso ndụmọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ, o sokwa enyi ya bụ́ Leonardo kwurịta okwu, na-ajụ ya ihe o mere wutere ya. Gịnị si na ya pụta? O nyeghị Leonardo ọnụ okwu. Ọ zaghachiri na ọ dịghị ihe ọ bụla Antonio mere kpasuru ya iwe ma mesie ya obi ike na ya ebughị n’obi imeso ya ihe n’ụzọ dị iche. Ọ bụrụ na o yiri ka ọ naghị eghecha ya ọnụ, ọ pụrụ ịbụ nnọọ na ọ dị ihe ọ na-eche. Leonardo rịọrọ mgbaghara maka ịkpasu enyi ya iwe n’amaghị ama ma kelee ya maka ime ka ya mara banyere ya. Ọ gbakwụnyere na n’ọdịnihu, ya ga-akpachara anya karị ka ya wee ghara ime ka ndị ọzọ nwee otu echiche ahụ. Ahụ erughị ala nile ahụ miri nnọọ ala, ndị enyi abụọ ahụ bịakwara nwee mmekọrịta chiri nnọọ anya dị ka ha nweburu.

Ọ dịtụghị atọ ụtọ inwe mmetụta nke ịbụ onye a ghọtahiere. Otú ọ dị, ọ bụrụ na i mee ihe nile kwere omume iji mee ka ihe doo anya ma tinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ banyere ịhụnanya na mgbaghara mmehie n’ọrụ, o yikarịrị nnọọ ka ọ̀ ga-arụpụtakwara gị onwe gị ezi ihe.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 E ji aha ndochianya ụfọdụ mee ihe n’isiokwu a.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Iji mmụọ ịhụnanya na nke mgbaghara mmehie na-eme ka ihe doo anya pụrụ ịrụpụta ihe ndị na-enye obi ụtọ