Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Pọl Ahazie Onyinye Enyemaka Maka Ndị Nsọ

Pọl Ahazie Onyinye Enyemaka Maka Ndị Nsọ

 Pọl Ahazie Onyinye Enyemaka Maka Ndị Nsọ

IHE ime mmụọ na-adị ezi ndị Kraịst mkpa n’ụzọ bụ́ isi. Otú o sina dị, nchegbu maka ọdịmma anụ ahụ nke ndị ọzọ na-adịkwa ha mkpa. Ọtụtụ mgbe, ha enyeworo ndị nwere ihe isi ike aka. Ịhụnanya ụmụnna na-akwali ndị Kraịst inyere ndị kwere ekwe ibe ha nọ ná mkpa aka.—Jọn 13:34, 35.

Ịhụnanya Pọl onyeozi nwere n’ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ ya nọ kpaliri ya ịhazi ka ọgbakọ ndị dị n’Akaịa, Galetia, Masedonia, nakwa n’ógbè Esia, nakọta ụtụ. Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Olee otú e si hazie ihe enyemaka ahụ? Olee otú e si meghachi omume na ya? Gịnịkwa mere ihe merenụ kwesịrị iji masị anyị?

Ọnọdụ E Nwere n’Ọgbakọ Jerusalem

Mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị, ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu si ebe ndị ọzọ bụ́ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ na Pentikọst nọgidere na Jerusalem ruo oge ụfọdụ iji mụtakwuo banyere ezi okpukpe ahụ. N’ebe ọ dị mkpa, ndị ofufe ibe ha ji obi ụtọ nye aka ibu ibu nke ọnụnọ dị otú ahụ a gbatịkwuru. (Ọrụ 2:7-11, 41-44; 4:32-37) Ọgba aghara obodo pụrụ imewo ka e nwee mkpa ndị ọzọ ka ndị Juu bụ́ ndị na-akwado nnwere onwe mba ha kpalitere nnupụisi na ime ihe ike n’ìgwè. Otú ọ dị, iji hụ na ọ dịghị onye na-eso ụzọ Christ agụụ ga-egbu, e kenyere ndị inyom di ha nwụrụ nọ ná mkpa òkè kwa ụbọchị. (Ọrụ 6:1-6) Herọd kpagburu ọgbakọ ahụ nke ukwuu, n’etiti afọ ndị 40 O.A. kwa, ụnwụ nri kpara Judia aka ọjọọ. A bịa n’ihe metụtara ụmụazụ Jisọs, ihe a nile pụrụ ịkpatawo ihe Pọl kpọrọ “ahụhụ dị iche iche,” “mkpagbu dị iche iche,” na ‘mpụnara a pụnaara ha ihe nile ha nwere.’—Ndị Hibru 10:32-34; Ọrụ 11:27–12:1.

N’ihe dị ka 49 O.A., ọnọdụ ahụ ka dị njọ. N’ihi ya, mgbe Pita, Jemes, na Jọn kwetasịrị na Pọl ga-eche ọrụ nkwusa ya ihu n’ebe ndị Jentaịl nọ, ha gbara ya ume ka o “cheta ndị ogbenye.” Nke ahụ bụ ihe Pọl gbalịsiri ike ime.—Ndị Galetia 2:7-10.

Ịhazi Ụtụ Ahụ

Pọl hụrụ maka ụtụ a tụụrụ ndị Kraịst bụ́ ogbenye nọ na Judia. N’ihe dị ka 55 O.A., ọ gwara ndị Kọrint, sị: “Okwu banyere ụtụ a na-atụrụ ndị nsọ, dị ka m nyere nzukọ Kraịst dị na Galetia iwu, unu onwe unu meekwa otú a. Kwa ụbọchị mbụ n’izu ụbọchị asaa ka unu nile n’otu n’otu debe ihe n’ụlọ na-akpado ya, otú ihe na-agara onye ọ bụla nke ọma . . . [Mgbe ahụ] ndị ọ bụla unu ga-anwapụta, m ga-ewere akwụkwọ ozi ziga ndị ahụ iburu ihe amara unu jee Jerusalem.” (1 Ndị Kọrint 16: 1-3) Otu afọ mgbe e mesịrị, Pọl kwuru na ndị Masedonia na ndị Akaịa na-ekere òkè. Mgbe e zigakwara ihe ndị e nwetara na Jerusalem, ọnụnọ ndị nnọchiteanya si n’ógbè Esia nọ ebe ahụ yiri ka ọ na-egosi na ọgbakọ ndị dị n’ógbè ahụ tụtakwara ụtụ.—Ọrụ 20:4; 2 Ndị Kọrint 8:1-4; 9:1, 2.

Ọ dịghị onye a manyere inye ihe ọ na-agaghị enyeli. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe metụtara ime ka ihe hara nhata ka ihe ọ bụla e nwebigara ókè wee nwee ike imeju ihe fọdụrụ inwe n’etiti ndị nsọ nọ na Jerusalem nakwa na Judia. (2 Ndị Kọrint 8:13-15) “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya,” ka Pọl kwuru, “ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 Ndị Kọrint 9:7.

Onyeozi ahụ gwara ndị Kọrint ezi ihe mere ha ga-eji na-emesapụ aka. Jisọs ‘ghọrọ ogbenye n’ihi ha, ka ha onwe ha wee ghọọ ndị ọgaranya’ n’ụzọ ime mmụọ. (2 Ndị Kọrint 8:9) N’ezie, ha ga-achọ iṅomi mmụọ inye ihe ya. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na Chineke na-eme ka ha bụrụ ọgaranya “ruo afọ ofufo nile,” o kwesịrị ekwesị ka ha nye aka gboo mkpa nke ndị nsọ.—2 Ndị Kọrint 9:10-12.

Àgwà nke Ndị Keere Òkè

Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu banyere onyinye afọ ofufo site n’ịtụle àgwà nke ndị keere òkè n’ihe enyemaka ahụ e nyere na narị afọ mbụ maka ndị nsọ. Ụtụ ahụ gosipụtara ihe karịrị inwe nchegbu n’ebe ndị ogbenye ha na ha na-efekọ Jehova ofufe nọ. O nyere echiche na e nwere nkekọ nke òtù ụmụnna n’etiti ndị Juu na ndị Jentaịl bụ́ ndị Kraịst. Inye na ịnara onyinye na-egosi ịdị n’otu na ọbụbụenyi dị n’etiti ndị Jentaịl na ndị Juu a. Nkerịta ihe ha bụ n’ụzọ ihe onwunwe nakwa n’ụzọ ime mmụọ.—Ndị Rom 15:26, 27.

Ọ pụrụ ịbụ na Pọl akpọghị ndị Kraịst nọ na Masedonia na mbụ ikere òkè—ha onwe ha bụkwa ogbenye ọnụ ntụ. Otú ọ dị, ha ‘weere ọtụtụ arịrịọ na-arịọ ka e nye ha ihe ùgwù nke inye ihe.’ Leenụ, n’agbanyeghị na ha nọ na-enwe “ọtụtụ nnwapụta nke mkpagbu,” ha ji ọṅụ nye ‘karịa ike ha’! (2 Ndị Kọrint 8:1-4) O yiri ka ule dị ukwuu ha na-enwe ọ̀ gụnyere ebubo ndị a na-ebo ha na ha na-ekpe okpukpe megidere iwu ndị Rom. Ya mere, o doro anya na ha ga-enwe mmetụta ọmịiko n’ebe ụmụnna ha bụ́ ndị Judia nọ, bụ́ ndị nọ na-enwe ihe isi ike yiri ndị ahụ.—Ọrụ 16:20, 21; 17:5-9; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:14.

Ọ bụ ezie na Pọl ejiwo ịnụ ọkụ n’obi mbụ ndị Kọrint nwere maka ụtụ ahụ mee ihe iji gbaa ndị Masedonia ume, ịnụ ọkụ n’obi e nwere na Kọrint ebelatala. Ugbu a, onyeozi ahụ hotara mmesapụ aka ndị Masedonia iji kwalie ndị Kọrint. Ọ hụtara ya dị ka ihe dị mkpa ichetara ha na oge eruola ka ha mechaa ihe ha malitere otu afọ tupu mgbe ahụ. Olee ihe meworonụ?—2 Ndị Kọrint 8:10, 11; 9:1-5.

Taịtọs malitere nnakọta ụtụ ahụ e mere na Kọrint, ma nsogbu bilitere nke yiri ka ọ bụ ya mere ka mgbalị ya kụọ afọ n’ala. Mgbe Taịtọs kpọtụsịịrị Pọl na Masedonia, ọ kpọọrọ mmadụ abụọ ọzọ lọghachite iji wusikwuo ọgbakọ dị na Kọrint ike ma nakọtachaa ụtụ ahụ. Ụfọdụ pụrụ ikwuwo na Pọl nwara irigbu ndị Kọrint. Ikekwe ọ bụ ya mere o ji ziga ndị ikom atọ ịnakọtacha ụtụ ahụ ma kwuo ihe mere a ga-eji nabata nke ọ bụla n’ime ha. “Anyị na-eze nke a, ka onye ọ bụla ghara ịta anyị ụta n’oké onyinye amara nke a nke anyị na-eje ozi ya,” ka Pọl kwuru. “N’ihi na anyị buuru ụzọ na-eche ihe ọma, ọ bụghị nanị n’ihu Onyenwe anyị, kama  n’ihu mmadụ kwa.”—2 Ndị Kọrint 8:6, 18-23; 12:18.

Ibuga Onyinye Ahụ

Ka ọ na-erule oge opupu ihe ubi nke 56 O.A., oge ruru ka e wega ego ahụ a tụkọtara Jerusalem. Pọl ga-eso ndị nnọchiteanya nke ndị tụkọtara ego ahụ họpụtara aga. Ọrụ 20:4 na-asị: “Sopata, nwa Pirọs, onye Beria, wee soo ya; ya na Aristakọs na Sekundọs, n’ime ndị Tesalọnaịka; na Gaịọs nke Dabe, na Timoti; na Tikikọs na Trọfimọs, bụ́ ndị Esia.” Ihe àmà na-egosi na Luk, bụ́ onye ọ pụrụ ịbụ na ọ nọchitere anya ndị Kraịst nọ na Filipaị, sokwa ha ebe ahụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ọ dịkarịa ala, ndị ikom itoolu gara ozi a.

“Ego nile e nwetara n’ụtụ ahụ aghaghị ibuwo nnọọ ibu,” ka ọkà mmụta bụ́ Dieter Georgi kwuru, “n’ihi na mgbalị ndị ikpeazụ ahụ, bụ́ ndị metụtara Pọl na ọtụtụ ndị nnọchiteanya, agaraghị eruwo nsogbu na ihe ndị o furu ma ọ bụrụ ọ bụghị otú ahụ.” Ozi ndị ahụ sonyeere Pọl jere abụghị nanị ijide n’aka na e nwere nchebe kamakwa iji gbachitere Pọl maka ebubo ọ bụla banyere akwụwaghị aka ọtọ. Ndị e zigara nọchitere anya ọgbakọ dị iche iche nke ndị Jentaịl n’ihu ndị nsọ nọ na Jerusalem.

Ọ bụrụ na ha ejiri ụgbọ mmiri si Kọrint sere gaa Siria, ndị nnọchiteanya ahụ gaara eruwo Jerusalem ka ọ na-erule oge Ememe Ngabiga. Otú ọ dị, okwu banyere nkata a na-akpa igbu Pọl mere ka ha gbanwee atụmatụ ha. (Ọrụ 20:3) Ikekwe ndị iro ya zubere igbu ya n’oké osimiri.

Pọl nwere ihe ndị ọzọ ọ na-eche. Tupu ọ pụọ, o degaara ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ ikpe ekpere ka ‘a dọpụta ya n’aka ndị na-ekwenyeghị ekwenye ndị nọ na Judia, ka ije ozi ya nke o ji jee Jerusalem wee bụrụkwa ihe ndị nsọ ga-anara nke ọma.’ (Ndị Rom 15:30, 31) Ọ bụ ezie na obi abụọ adịghị ya na ndị nsọ ga-eji obi ekele miri emi nara onyinye ndị ahụ, ọ pụrụ ịbụ na Pọl nwere nchegbu banyere nsogbu mbịarute ya ga-akpata n’etiti ndị Juu n’ozuzu ha.

N’ezie, onyeozi ahụ chetara ndị ogbenye. Ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nsọ ekwughị mgbe e bunyere onyinye ahụ, mbuga e bugara ya kwalitere ịdị n’otu ma mee ka ndị Jentaịl bụ́ ndị Kraịst gosipụta ekele n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha bụ́ ndị Judia nọ maka akụ̀ ime mmụọ ndị ha nwetara n’aka ha. Mpụta Pọl pụtara n’ụlọ nsọ ahụ n’oge na-adịghị anya mgbe o rutesịrị Jerusalem kpaliri ọgba aghara ma mee ka e jide ya. Ma nke a mesịrị nye ya ohere ịgbara ndị na-achị achị na ndị eze àmà.—Ọrụ 9:15; 21:17-36; 23:11; 24:1–26:32.

Onyinye Anyị Taa

Kemgbe narị afọ mbụ, ọtụtụ ihe agbanwewo—ma ọ bụghị ụkpụrụ ndị gbara ha gburugburu. N’ụzọ ziri ezi, a na-eme ka ndị Kraịst mara banyere mkpa ego. Onyinye ọ bụla ha nyere maka ndị nọ ná mkpa kwesịrị ịbụ nke e ji afọ ofufo nye, nke ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke na ụmụ mmadụ ibe ha nọ kpaliri.—Mak 12:28-31.

Usoro enyemaka e ji mee ihe maka ndị nsọ na narị afọ mbụ na-egosi na onyinye ndị dị otú ahụ aghaghị ịbụ nke a haziri nke ọma na nke e leziri anya jiri ịkwụwa aka ọtọ mee. N’ezie, Jehova Chineke maara banyere mkpa dị iche iche, ọ na-emekwara ndị ohu ya ndokwa ka ha wee nwee ike ịnọgide na-eso ndị ọzọ ekerịta ozi ọma Alaeze ahụ n’agbanyeghị ihe isi ike. (Matiu 6:25-34) Ma, anyị nile pụrụ ime òkè anyị, ihe ọ sọrọ ọnọdụ akụ̀ na ụba anyị ya bụrụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ‘onye chịkọtara hie nne agaghị enwe karịa nke ga-ezuru ya; onye chịkọtakwara nta, ọ dịghị ihe ga-afọdụrụ ya inwe.’—2 Ndị Kọrint 8:15.