Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“N’eziokwu Onyenwe Anyị Esiwo n’Ọnwụ Bilie”

“N’eziokwu Onyenwe Anyị Esiwo n’Ọnwụ Bilie”

 “N’eziokwu Onyenwe Anyị Esiwo n’Ọnwụ Bilie”

Cheedị echiche ụdị obi erughị ala ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere mgbe e gburu Onyenwe ha. Olileanya ha yiri ihe nwụrụ nnọọ anwụ dị ka ozu ahụ Josef nke Arimatia tọgbọrọ n’ili. Atụmanya ọ bụla e nwere na Jisọs ga-eme ka ndị Juu nwere onwe ha pụọ n’agbụ ndị Rom enweghịzikwa isi.

A SỊ na ọ bụ ebe ahụ ka okwu gwụrụ, ikekwe ndị na-eso ụzọ Jisọs gaara emiwo ala dị ka ụmụazụ nke ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha bụ Mesaịa. Ma Jisọs dị ndụ! Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, o mere ka ụmụazụ ya hụ ya anya n’oge dị iche iche n’oge na-adịghị anya mgbe ọ nwụsịrị. Ya mere, a kpaliri ụfọdụ n’ime ha ikwupụta, sị: “N’eziokwu Onyenwe anyị esiwo n’ọnwụ bilie.”—Luk 24:34.

A kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jisọs ịgbachitere okwukwe ha nwere n’ebe Jisọs nọ dị ka Mesaịa ahụ. N’ime nke ahụ, ha rụtụrụ aka karịsịa ná mbilite n’ọnwụ ya dị ka ihe akaebe gbara ọkpụrụkpụ banyere ọbụbụ ọ bụ Mesaịa. N’ezie, “ọ bụkwa ike ukwu ka ndị ozi ji agba àmà ha banyere mbilite n’ọnwụ nke Onyenwe anyị Jisọs.”—Ọrụ 4:33.

Ọ bụrụ na ọ dịtụwo mgbe mmadụ ọ bụla gosipụtara na mbilite n’ọnwụ a bụ wayo—ikekwe site n’ime ka otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya kweta na ọ bụ ma ọ bụ site n’igosi na ozu Jisọs nọgidere na-adị n’ili—Iso Ụzọ Kraịst gaara adawo ná mmalite. Ma ọ daghị. N’ịmara na Kraịst dị ndụ, ụmụazụ Jisọs gara ebe nile na-akpọsa mbilite  n’ọnwụ ya, ìgwè mmadụ ghọkwara ndị kweere na Kraịst ahụ bilitere n’ọnwụ.

N’ihi gịnị ka gị onwe gị kwa pụrụ iji kwere ná mbilite n’ọnwụ Jisọs? Olee ihe àmà e nwere na nke a bụ ihe mere eme n’ezie?

Gịnị Mere A Ga-eji Tụlee Ihe Àmà Ahụ?

Oziọma anọ ahụ dum kọrọ banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs. (Matiu 28:1-10; Mak 16:1-8; Luk 24:1-12; Jọn 20:1-29) * Akụkụ ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-ekwu hoo haa banyere omume e mere ka Kraịst si n’ọnwụ bilie.

Ka a sịkwa ihe mere ụmụazụ Jisọs jiworo kpọsaa mbilite n’ọnwụ ya! Ọ bụrụ n’ezie na Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie, nke ahụ bụ ozi kasị ịtụnanya ụwa nụtụworo. Ọ pụtara na Chineke dị adị. Ọzọkwa, ọ pụtara na Jisọs dị ndụ ugbu a kpọmkwem.

Olee otú nke ahụ si emetụta anyị? Jisọs kpere ekpere, sị: “Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ee, anyị pụrụ inweta ihe ọmụma na-enye ndụ banyere Jisọs na Nna ya. Site n’itinye ihe ọmụma dị otú ahụ n’ọrụ, ọ bụrụgodị na anyị anwụọ, a pụrụ ime ka anyị onwe anyị si n’ọnwụ bilie, ebe ọ bụ na e mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie. (Jọn 5:28, 29) Anyị pụrụ inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs n’okpuru Alaeze eluigwe Chineke bụ́ nke dị n’aka Ọkpara ya e mere ka ọ dị ebube, bụ́ Jisọs Kraịst, Eze kachasị ndị eze nile.—Aịsaịa 9:6, 7; Luk 23:43; Mkpughe 17:14.

Ya mere, ajụjụ bụ́ ma Jisọs ò si n’ọnwụ bilie n’ezie dị oké mkpa. Ọ na-emetụta ndụ anyị ugbu a na atụmanya anyị maka ọdịnihu. Ọ bụ ya mere anyị ji agba gị ume inyocha ụzọ ihe àmà anọ na-egosi na Jisọs nwụrụ, e meekwa ka o si n’ọnwụ bilie.

Jisọs Nwụrụ n’Elu Osisi n’Ezie

Ụfọdụ ndị na-arụ eziokwu ụka na-azọrọ na, ọ bụ ezie na a kpọgidere Jisọs n’osisi, ọ nwụghị n’elu osisi n’ezie. Ha na-ekwu na ọ nọọrọ n’ọnụ ọnwụ nakwa na ịjụ oyi nke ili ahụ tụtere ya. Ma, ihe ndekọ nile e nwere na-egosi na ọ bụ ozu Jisọs ka a dọbara n’ili ahụ.

Ebe ọ bụ na e gburu Jisọs n’ihu ọha, e nwere ndị àmà nye eziokwu ahụ bụ́ na ọ nwụrụ n’osisi n’ezie. Ọchịagha hụrụ maka ogbugbu ya gbara akaebe na ọ nwụọla. Ọchịagha ahụ bụ ọkachamara nke ọrụ ya gụnyere ịchọpụta ma Jisọs ọ̀ nwụọla n’ezie. Ọzọkwa, ọ bụ nanị mgbe Gọvanọ Pọntịọs Paịlet nke Rom jidesịrị n’aka na Jisọs anwụọla ka ọ hapụụrụ Josef nke Arimatia ozu Jisọs ka o lie.—Mak 15:39-46.

A Hụrụ Ili ahụ Ka Ọ Tọgbọ Chakoo

Ili ahụ tọgbọ chakoo nyere ndị ahụ na-eso ụzọ ihe akaebe mbụ nke mbilite n’ọnwụ Jisọs, ihe àmà a nọgidekwara bụrụ nke a na-agbaghabeghị agbagha. E liri Jisọs n’ili ọhụrụ, nke a na-elitụbeghị mmadụ na ya. Ọ dị nso n’ebe a nọ kpọgbuo ya, laakwa azụ n’oge ahụ, ọ pụrụ ịdị nnọọ mfe ịchọta ya n’ehieghị ụzọ. (Jọn 19:41, 42) Ihe ndekọ nile nke Oziọma ndị ahụ kwekọrịtara na mgbe ndị enyi Jisọs rutere n’ili ahụ n’ụtụtụ nke ụbọchị nke abụọ ọ nwụsịrị, ozu ya adịghịzi ebe ahụ.—Matiu 28:1-7; Mak 16:1-7; Luk 24:1-3; Jọn 20:1-10.

Ili ahụ tọgbọ chakoo tụrụ ndị iro Jisọs n’anya, dị nnọọ ka ọ tụrụ ndị enyi ya. Ọ dịla anya ndị iro ya kpawara nkata ịhụ na ọ nwụrụ, e liekwa ya. N’ịbụ ndị ruworo ihe mgbaru ọsọ ha, ha tinyere mgbalị idebe ndị nche ma mechie ili ahụ. Otú o sina dị, n’ụtụtụ nke ụbọchị mbụ nke izu ahụ, ọ tọgbọ chakoo.

Ndị enyi Jisọs hà bịara bupụ ozu ya n’ili ahụ? O yighị ka ha mere otú ahụ, ebe ọ bụ na Oziọma ndị ahụ na-egosi na ha nwere oké obi erughị ala mgbe e gbusịrị ya. Ọzọkwa, ndị na-eso ụzọ ya  agatụghị agawo n’ihu iche mkpagbu na ọnwụ ihu n’ihi ihe ha maara na ọ bụ wayo.

Ònye bupụrụ ihe dị n’ili ahụ? O yitụghị ka ọ̀ ga-abụ ndị iro Jisọs bupụrụ ozu ya. Ọ bụrụgodị na ọ bụ ha, n’ezie, ha gaara ebupụtawo ya n’ikpeazụ iji gbaghaa nzọrọ ndị na-eso ụzọ ya na-azọrọ na e mewo ka Jisọs si n’ọnwụ bilie nakwa na ọ dị ndụ. Ma ọ dịtụghị mgbe ihe yiri nke ahụ mere, n’ihi na ọ bụ Chineke mere ya.

Ọtụtụ izu mgbe e mesịrị, ndị iro Jisọs emesighị olu ike iji gbaghaa okwu Pita mgbe ọ gbara akaebe, sị: “Ndị ikom nke Israel, nụrụnụ okwu ndị a: Jisọs Onye Nazaret, bụ́ Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n’ọrụ dị ike na ọrụ ebube na ihe ịrịba ama, nke Chineke mere site n’aka Ya n’etiti unu, dị ka unu onwe unu matara: Onye a, ebe e weere Ya nye site n’izu a kara aka nke Chineke na ọmụma ihe Chineke buru ụzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere [n’osisi, NW] gbuokwa site n’aka ndị na-amaghị iwu anyị: Onye Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie, mgbe Ọ tọpụsịrị ihe mgbu nke ọnwụ: n’ihi na ọnwụ apụghị ijide Ya. N’ihi na Devid na-ekwu okwu banyere Ya, sị, Ana m ahụrịị Onyenwe anyị n’ihu m mgbe nile; . . . ọzọkwa, anụ ahụ m ga-ebikwa n’olileanya: n’ihi na Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Hedis, Ị gaghị enyekwa Onye nke Gị dị ọcha n’obi ka Ọ hụ ire ure.”—Ọrụ 2:22-27.

Ọtụtụ Mmadụ Hụrụ Jisọs ahụ E Mere Ka O Si n’Ọnwụ Bilie

N’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi, onye so dee Oziọma bụ́ Luk kwuru, sị: [Jisọs] jikwa ọtụtụ ụzọ na-adịghị ịgọ agọ chee Onwe ya n’ihu [ndị ozi] ná ndụ mgbe Ọ hụsịrị ahụhụ, ebe O mere ka ha na-ahụ Ya anya n’ogologo [ụbọchị iri anọ], Ọ na-ekwukwa ihe nile banyere alaeze Chineke.” (Ọrụ 1:2, 3) Ọtụtụ ndị na-eso ụzọ hụrụ Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie n’oge dị iche iche—n’ubi, n’ụzọ, n’oge nri, n’akụkụ Oké Osimiri Taịbirias.—Matiu 28:8-10; Luk 24:13-43; Jọn 21:1-23.

Ndị nkatọ na-agbagha ịbụ eziokwu nke mpụta ndị a. Ha na-asị na ọ bụ ndị dere ihe ndekọ ndị ahụ chepụtara ha, ma ọ bụ ha ehota ihe ndị yiri ka ha na-emegiderịta onwe ha na ha. N’ezie, obere ọdịiche ndị dị n’ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ na-egosi na ọ dịghị nkwekọrịta aghụghọ e mere na ya. Ihe ọmụma anyị nwere banyere Jisọs na-asakwu mbara mgbe otu onye edemede nyere nkọwa ndị na-emeju akụkọ ndị ọzọ a kọrọ banyere ihe ụfọdụ merenụ ná ndụ Kraịst n’elu ala.

Mpụta ndị Jisọs pụtara mgbe e mesịrị ka o si n’ọnwụ bilie hà bụ nrọ ndị a mụ anya rọọ? Arụmụka ọ bụla e nwere n’akụkụ a bụ ihe a na-apụghị ikwere na ya, ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ hụrụ ya. N’ime ndị hụrụ ya bụ ndị ọkụ azụ̀, ndị inyom, onye ọrụ gọọmenti, na ọbụna onyeozi ahụ na-arụ ụka bụ́ Tọmas, bụ́ onye e mere ka o kwere nanị mgbe ọ hụrụ ihe akaebe a na-apụghị ịgbagha agbagha na e mewo ka Jisọs si n’ọnwụ bilie. (Jọn 20:24-29) N’ọtụtụ oge, ndị na-eso ụzọ Jisọs amataghị Onyenwe ha e mere ka o si n’ọnwụ bilie n’oge mbụ ha hụrụ ya. N’otu oge, ihe karịrị mmadụ 500 hụrụ ya, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha ka nọ ndụ mgbe Pọl onyeozi ji ihe omume ahụ mee ihe dị ka ihe akaebe mgbe ọ na-agbachitere mbilite n’ọnwụ ahụ.—1 Ndị Kọrint 15:6.

Jisọs ahụ Dị Ndụ Nwere Mmetụta n’Ahụ Ndị Mmadụ

E kwesịghị ile okwu banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs anya dị ka nanị okwu na-akpali ọchịchọ  ịmata ihe ma ọ bụ dị ka nanị okwu a na-enwe mmasị ịrụrịta ụka na ya. Eziokwu ahụ bụ́ na ọ dị ndụ emetụtawo ndị mmadụ n’ebe nile n’ụzọ dị mma. Kemgbe narị afọ mbụ, imerime mmadụ esiwo n’enweghị mmasị n’Iso Ụzọ Kraịst ma ọ bụ imegide ya n’ụzọ nile gaa n’ikweresi ike na ọ bụ ezi okpukpe. Gịnị mere ka ha gbanwee? Ọmụmụ ha mụrụ Akwụkwọ Nsọ gosiri ha na Chineke mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie dị ka mmụọ e kere eke dị ebube n’eluigwe. (Ndị Filipaị 2:8-11) Ha egosipụtawo okwukwe n’ebe Jisọs nọ nakwa ná ndokwa Jehova Chineke mere maka nzọpụta site n’àjà mgbapụta Kraịst. (Ndị Rom 5:8) Ndị dị otú ahụ achọtawo ezi obi ụtọ site n’ime uche Chineke na ibi ndụ kwekọrọ n’ozizi Jisọs.

Tụlee ihe ịbụ onye Kraịst chọrọ mmadụ n’aka na narị afọ mbụ. E nweghị uru nke ịbụ onye a ma ama, inwe ikike, ma ọ bụ akụ̀ na ụba. N’ụzọ dị nnọọ iche, ọtụtụ ndị Kraịst oge mbụ ‘ji ọṅụ nara mpụnara a pụnaara ha ihe nile ha nwere’ n’ihi okwukwe ha. (Ndị Hibru 10:34) Iso Ụzọ Kraịst chọrọ ndụ nke ịchụ ihe n’àjà na mkpagbu nke, n’ọtụtụ ọnọdụ, jedebere n’ịnwụ n’ihi okwukwe.

Tupu ụfọdụ ndị aghọọ ụmụazụ Kraịst, ha nwere atụmanya ndị dị mma n’ihe banyere ịbụ ndị a ma ama na akụ̀ na ụba. Sọl nke Tasọs gụrụ akwụkwọ n’aka onye nkụzi Iwu a ma ama bụ́ Gameliel, ọ malitewakwara ịbụ onye a ma ama n’anya ndị Juu. (Ọrụ 9:1, 2; 22:3; Ndị Galetia 1:14) N’agbanyeghị nke ahụ, Sọl ghọrọ Pọl onyeozi. Ya na ọtụtụ ndị ọzọ jụrụ ịbụ ndị a ma ama na ndị nwere ikike nke ụwa a chere ha n’ihu. N’ihi gịnị? Ọ bụ iji gbasaa ozi nke ezi olileanya bụ́ nke dabeere ná nkwa Chineke nakwa n’eziokwu ahụ bụ́ na e mewo ka Jisọs Kraịst si n’ọnwụ bilie. (Ndị Kọlọsi 1:28) Ha dị njikere ịta ahụhụ maka ihe ha maara na ọ dabeere n’eziokwu.

Otú ahụ ka ọ dị n’ebe ọtụtụ nde mmadụ nọ taa. Ị pụrụ ịhụ ha n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. Ndịàmà ji obi ụtọ akpọ gị òkù ịbịa ememe ncheta ọnwụ Kraịst ha na-eme kwa afọ, bụ́ nke a ga-eme mgbe anyanwụ dasịrị na Sunday, April 8, 2001. Obi ga-adị ha ụtọ ịhụ gị ka ị nọ ya n’ihe omume ahụ nakwa ná nzukọ nile ha na-enwe maka ọmụmụ Bible n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha.

Gịnị ma ị mụtakwuo, ọ bụghị nanị banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs kamakwa banyere ndụ na ozizi ya? Ọ na-akpọ anyị òkù ịbịakwute ya. (Matiu 11:28-30) Mee ihe ugbu a iji nweta ezi ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Ime otú ahụ pụrụ iweta ndụ ebighị ebi n’okpuru Alaeze Chineke nke dị n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Iji nweta ihe àmà banyere izi ezi nke ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ, lee “Oziọma Ndị Ahụ—Hà Bụ Akụkọ Mere Eme Ka Hà Bụ Ifo?” n’Ụlọ Nche nke May 15, 2000.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ọtụtụ nde mmadụ na-achọta ezi obi ụtọ dị ka ụmụazụ Jisọs Kraịst

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 6]

Site na Self-Pronouncing Edition of the Holy Bible, nke nwere nsụgharị King James na nke Revised